You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
'Etu e si gbuo mmadụ ise n'ike n'Awka-Etiti n'ụbọchị Tọzde'
Ndị obodo Awka-Etiti agwala BBC Igbo etu ndị ojiegbe aga amaghị ndị ha bu jiri wakpo ma gbuo mmadụ atọ na-agara onwe n'ụzọ, ebe ndị agha bịara ibuso ha ọgụ gbagbukwara mmadụ abụọ.
Ogbugbu mmadụ a mere n'ehihe Tọzde ma tinye obodo ahụ na gbagharịa.
Dịka ndị obodo siri kwuo, ndị egburu mbụ bụ ndị ugwu bi n'obodo ahụ.
Nwoke na nwaanyị ha sị ndị agha gburu dịka ha gbatara obodo ahụ bụ ndị Awka-Etiti. Nke a bụtere mmadị ise nwuru n'ike n'ọgbaghara ahụ.
Nke a na-abịa dịka ndị mmadụ zitere BBC Igbo onyonyo ha sị sitere obodo ahụ.
Onyonyo ndi na-egosi ozu otu nwoke na otu nwaanyi. Ebe nwoke ahụ nọ n'ime ụgbọla, nwaanyi ahụ gbọtọrọ n'ala.
Ụfọdụ ndị na-ekwu okwu n'onyonyo ahụ na-asị "ọ bụ ndị agha gburu ha".
Ndị ọzọ na-asịkwa na ndị a ka si ụlo a na-adọsa ozu alọta oge ha jekwu ọdachị a.
Otu onye Akwa-Etiti gwara BBC Igbo na ihe a mere n'eziokwu.
Ọ sị: "Ọ bụ na Umuneocha nke Awka-Etiti ka o mere. Ndị mmadụ na-agba ọzọ. Nwoke a jikwa ụgbọala ya agba ọsọ oge mgbọ tụrụ ya n'ime ụgbọala ya. Ọ bụ ụlọ ọgwụ St Francis ka o si alọta. Ọ bu nne ozu nne ya ka o bu gaa ụlọ ọgwụ ahụ. Nwoke bụ onye Iluowelle"
Onye ahụ achọghị ka ekwuo aha ya sịkwa na ọ bu eziokwu na ndị ahụ si ebe a na-edewe ozu alọta oge ihe a mere.
Mana, ọ sị na ha amaghị ndị mere ihe a dịka o mere ka ndị ojiegbe gburu mmadụ anọ n'obodo ahụ were kpata ọsọ ahụ suru.
"Ndị ahụ e gburu mbụ bụ ndị mbịarambịa bi n'Akwa-Etiti."
'Ndị ojiegbe aga gburu ndị ugwu'
Otu onye si na ya so buru ozu ndị ahụ egburu n'okporo ụzọ gawa ụlọ ozu gwara BBC Igbo na ha bụ ndị ugwu.
Ọ sị: "Ndị ahụ bụ ndị ugwu bi Awka-Etiti. Anyị ma ndị ha bụ. Anyị maka ezinaụlọ ha."
'Ndị agha gburu ndị Awka-Etiti abụọ'
Onye ahụ hụru ihe mere kwuru na ọ bụ eziokwu na ọ bụ ndị agha gburu mmadụ abụọ ndị Awka-Etiti ahụ.
Ọ sị: "Ka ndị Unknown Gunmen a gburu ndị ha gburu, ndị mmadụ mailtere gbawa ọsọ. Ndị ahụ nọ n'ime Sienna a gbara egbe dị mmadụ atọ. Otu onye n'ime ha pụtara n'enweghi ihe mere ya, mana onye na-anya ụgbọala ahụ na onye nwaanyị o butere n'ụzọ nwụrụ."
Ọ sị na ọ bụ ịgbapụ ebe ahụ ka ha na-eme tupu ndị ahu ha sị bụ ndị agha jiri gbaa ha egbe were gbuo ndị nwụrụ."
Onye ọzọ sị na mgbọ tụrụ ya
Ihe onyonyo ọzọ mmadụ zitere BBC Igbo na-egosi nwoke na-ekwu na ndị agha gbara ụgbọala ya egbe.
Enyo ụgbọala ahụ onye ahụ gosiri n'enyonyo a kụrisi akụrisi ebe ọbara dị n'oche ihe ya.
BBC enwebeghị akaebe na ọ bụ na Tọzde ka e sere onyonyo ahụ.
Ebe okwu dị ugbua?
Ndị obodo gwara BBC Igbo na ndị nwe ozu ebụrụla ha gawa ụlọ ozu, ebe ndị ugwu abịala maka nke ụmụnne ya dị n'ụlọ ozu.
Ha sịkwa na ndị uweojii abịala n'ebe ihe a mere, mana ha anọteghị aka "maka uwe ha anaghị enye ha nchekwa".
N'agbanyeghi ihe ndị obodo kwuru, Tochukwu Ikenganyịa bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambara gwara BBC Igbo n'ụtụtụ Satọde na ya enwetebeghị ozi banyere ihe a mere.
BBC Igbo na-agba mbọ inwete ọnu na-ekwuru ndị agha bụ Onyemma Nwachukwu ka okwu nke ha ma maka mkpa mkpa kpara.
Ọkachasị etu ọ na-adịghị n'akwụkwọ ozi o wepụtara n'ụtụtụ a.
Awka-Etiti sonyere n'obodo egburu mmadụ n'ime izu abụọ n'Anambara Steeti dịka ndị ojiegbe amabeghị ndị ha bụ egbusisi mmadụ dịka ha na-ekwu na ha achọghị ka emee ntuliaka na steeti ahụ.