You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Onyeisiala Bola Tinubu ekwuola mwute ya maka n'ọnwụ Ọchịagha Rabe Abubakar nwụrụ n'aka ndị ntọ
Onyeisiala Bola Tinubu ekwputala ezi mwute n'ọnwụ Ọchịagha Rabe Abubakar lara ezumike nka onye nwụrụ n'aka ndị ntọ na Katsina steeti.
Onyeisiala Tinubu kwuru na ọnwụ ọchịagha Rabe bụ ihe ịdọ aka na ntị nye ndị ojiegbe na-akpa mkpamkpa na mpaghara Naịjirịa dị iche iche.
O kwuru na ọchịchị ya agaghị agba ndị ojiegbe ahụ nkịtị ma kwuo na ọ ga-aga n'ihu na mbọ gọọmenti ya na-agba ikpochapụ ndị ojiegbe na Naịjirịa.
Cheta na ozi ndịagha wepụtara n'ụbọchị Satọde 13 Juun 2026, nke ọnụ na-ekwuru ndịagha bụ ọchịagha Samaila Uba binyere aka nay a, kwuputara maka ọnwụ ọchịagha Abubakar.
Uba kwuru na ndịagha achọghị ikwu okwu n'ihu ọha banyere ntọrọ a tọọrọ Rabe Abubakar mgbe ọrụ mgbapụta na-aga n'ihu.
O kwuru na ndịagha na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ gbara rụrụ ọrụ ma gbaa mbọ iji hụ na a tọhapụrụ ọchịagha Abubakar na nwunye mana mbọ ha ahụ amịtaghị mkpụrụ ọbụla.
Ozi banyere ntọrị ọchịagha Rabe Abubakar na nwunye ya pụtara ihe n'ọnwa Mee 2026 oge ndị ojiegbe wakporo ma tọrọ ya na nwunye ya Katsina steeti.
Ndịagha gwara BBC oge ahụ na ha nwtere ozi na Rabe na nwunye ya nọ n'aka ndị ntọ.
Ọnụ na-ekwuru ndịagha bu Ọchịaga Michael Onoja gwara BBC na a gbara mbọ ma rụọ ọrụ iji hụ na ọchịagha Rabe na nwunye nweere onwe ha n'aka ndị ndọ ahụ.
N'agbanyeghị na enweghị ndị otu na-eyi ọha egwu ọbụla kwuru na ọ bụ ha tọọrọ ọchịagha Abubakar na nwunye ya, ndịagha kwuru na ha nọ na-eche ka ndị ntọ ahụ kpọtụrụ ezinaụlọ ya.
Ka ọ dị ugbua, ọnwụ Rabe Abubakar akpaliela okwu banyere ajọ ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa dịka ọtụtụ ụmụakwụkwọ a tọọrọ n'Oyo steeti ka nọ n'aka ndị ntọ ruo taa.
Ndịagha kọwara Abubakar dịka onye rụrụ ọrụ pụrụiche oge ọ nọ n'ọrụ, ma kwuo na ọnwụ ya agaghị emenye ha ụjọ, kama ọ bụ ihe ga-akpali ha ikpochapụ ndị na-eyi ọha egwu na ndị omekome na-enye mba Naịjirịa nsogbu.
Ebe e liri ozu Ọchịagha Rabe Abubakar
Ezinaụlọ ọchịagha Rabe Abubakar kwuru na e liri ozu ya n'ogige ụlọ okpukperechi alakụba dị na G.R.A Katsịna steeti.
Nwa ya nwaanyị ya bụ Bilikisu Rabe Abubakar gwara BBC News na he liri nna ya n'ụbọchị Satọde 13 Juun, 2026 oge o ji nkeji iri na ise gafee elekere isii nke mgbede.
Bilikisu kwuru na ndị ntọ ahụ nyefere ezinaụlọ ha ozu nna ha ka ha lie ya ma kwuo na ezinaụlọ ha nọ n'oke iru uju ugbua.
Ọ gwara anyị na nne ya ka nọ n'aka ndị ntọ ahụ ma rịọ ka gọọmenti Katsina steeti gbaa mbọ ma hụ na a zọpụtara nne ha n'aka ndị ntọ ahụ.
Bilikisu kọwara na ndị ntọ ahụ akpọghị ezinaụlọ ha ma ncha banyere ịkwụ ụgwọ mgbapụta Rabe Abubakar na nwunye ya.
Ihe Onyeisiala Tinubu kwuru
Akwụkwọ ozi Onyeisiala Tinubu wepụtara mere ka o doo anya na ndị ahụ tọọrọ Rabe Abubakar agaghị ala n'efu ma kwuo na gọọmenti ya na ndị ojiegbe agaghị enwe nkwekọrịta ọbụla.
N'okwu ya "Ọ bụ oge ọchịagha Rabe Abubakar na nwunye ya na-ala n'obodo ha ka ndị ojiegbe ahụ wakporo ma tọrọ ha abụọ".
Onyeisiala Tinubu gara n'ihu zigara ezinaụlọ Abubakar ozi iti aka n'obi ọkachasị nwunye ọchịagha Rabe onye ka nọ n'aka ndị ntọ ahụ tọọrọ ya na di ya.
Ozi Onyeisiala Tinubu kwuru na ndị ojiegbe ahụ etinyela ya aka n'anya ma kwuo na gọọmenti ya na ndị ojiegbe ahụ agaghị enwe nkwekọrịta banyere ịtọhapụ ndị ojiegbe gọọmenti nwụchiri ma tụọ mkpọrọ.
Ihe gọọmenti Katsina steeti kwuru banyere ọnwụ ọchịagha Rabe Abubakar
Gọvanọ Katsina steeti Mallam Dikko Umaru Radda ekwuola mwute ya banyere ọnwụ ọchịagha Rabe Abubakar ma zigara ezinaụlọ ya ozi iti aka n'obi.
Gọọmenti Katsina steeti kwuru na ọchịagha Rabe nwụrụ site n'ọrịa shuga na ọrịa ọbara mgbali elu.
Ozi kọmishọna na-ahụ maka nchekwa obodo na ihe gbasara obodo na Katsina steeti wepụtara, kwuru na ọnwụ Rabe Abubakar bụ oke ọdachi dakwasịrị steeti ahụ ma kwuo na gọọmenti kwụrụ chịm na mbọ ha na-agba ikpochapụ ndị omekome na steeti ahụ.
Onye bụ Ọchịagha Rabe Abubakar
Ọchịagha Rabe Abubakar bụ ọchịagha ndịagha Naịjirịa jiri nnukwu ọkwa dị iche iche tupu ọ laa ezumike nka.
Ọchịagha Rabe Abubakar bụ onye okpuru ọchịchị Batsari dị na mpaghara ugwu Katsina steeti.
Rabe rụrụ ọrụ dịka ọnụ na-ekwuru ndịagha Naịjirịa malite n'afọ 2015 ruo n'afọ 2017.
Isiụlọọrụ ndịagha Naịjirịa kọwara ọchịagha Rabe dịka onye rụrụ ọrụ pụrụiche ma gaara Naịjirịa ozi n'ụzọ pụrụiche.
Ọchịagha Rabe rụrụ ọrụ dịka onyeisi na-ahụa maka mgbasaozi n'ụlọọrụ nchekwa Naịjirịa.
Ọ rụrụ ọrụ na mbọ a na-agba iji kpochapụ ndị ojiegbe na Naịjirịa.
Ọ malitere ọrụ n'ụlọọrụ ndịagha Naịjirịa n'afọ 1989.
A họpụtara ya dịka ọnụ na-ekwuru ndịagha Naịjirịa n'ọnwa Ọgọst 2015.