Onye oti egwu a ma ama bụ Davido achụọla nwa ọrụ ya a kpọrọ Lil Frosh maka ịkụza enyi ya nwaanyị anya.
Ụlọọrụ ya a kpọrọ Davido Music Worldwide (DMW) sị na ha mere nke a site na nyocha ha mere banyere agwa Lil Frosh kpara.
Ha sị dịka iwu na-achị otu iti egwu ha sị dị na ha anaghị anabata ụdị akparama agwa.
Cheta na akụkọ pụtara n'ụbọchị Mọnde maka etu Lil Frosh si akụ enyi ya nwaanyị ihe tinka na-akụ pan.
Onyonyo nwa agbọghọ ahụ pụtara na soshal midia nke gosiri ya ebe o bu anya ikputu.
Ndị mmadụ malitere ịkpọ oku ka ndị uweojii nwuchie ya bụ nwaokorobịa ma kpụpụ ya ụlọikpe.
Otu onye aha ya bụ @dahtgirl_ajex na Twitter tinyekwara ihe onyonyo na-egosi ebe Lil Frosh na-arịọ enyi ya nwaanyị mgbaghara dịka ọ kụchara ya ihe.
Lil Frosh bụ nwata nwaokorobịa a mụrụ n'afọ 1998 na Legọs.
Ọ gụrụ akwụkwọ elementịrị nakwa sekọndịrị na Legọs, mana ọ gabeghi mahadum.