Onyeisi ndị uweojii na Naịjirịa bụ Muhammed Adamu ehiwela ngalaba uweojii ohụrụ ga-anọchi anya SARS e kposara ekposa.
Otu a kpọrọ 'Special Weapons and Tactics' (SWAT) ga na-arụ ọrụ ndị SARS e kposara ekposa na-arụ.
N'ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Frank Mba wepụtara, ọ sị na a ga-eme ndị otu ọhụrụ a nyocha ụbụrụ nakwa ahụike iji mara ma tozuru ịrụ ọrụ ọhụrụ a.
Ha ga-amalite ọzụzụ n'ụlọ ọzụzụ ndị uweojii niile dị na Naịjịrịa ebe ndị nke si na mpaghara ọwụwanyanwụ na Ndịda ga-eme nke ha na Rivers Steetị.
E be ndị uweojii si na mpaghara Ọdịdanyanwụ na ugwu ga-enwe ọzụzụ na Nasarawa nakwa Ila-Orangun.
Gịnị ga-emezi ndị uweojii SARS ugbua?
What about di disbanded SARS?
Onyeisi ndị uweojii bụ Muhammed Adamu enyela iwu ka ndị ọrụ SARS niile e kposara ekposa wuchie n'isi ụlọọrụ ndị uweojii n'Abuja maka ajụjụ, nyocha ụbụrụ nakwa nke ahụike.
Ha ga-agabiga nyocha a tupu a zụgharịa ha ma nabatakwa ha n'ọrụ ndị uweojii.
Adamu sị na nke a dị n'usoro iwu na-achịkwa ndị uwojii na Naịjirịa, isi 18 amokwu nke 10 nke afọ 2020.
Ọ sị na ndị ngalaba uwojii a kpọrọ 'Couselling and Support Unit (PCSU) bụ ndị ahazi ọzụzụ ha a.