Ndi amakaekwu agbabuola onye omeiwu na mba Gana
Na Ghana akụkọ na-eru anyị ntị ugbua bụ na ndị omekome gbagburu otu onye omeiwu mba ahụ.
Ndị ajọ mmadụ a gbagburu Ekow Quansah Hayford n'ụzọ ebe o sị emume ịchụnta votu patị ha alọta n'isiututu Fraịde.
Akụkọ kwuru na ndị amakaekwu mmadụ isii ji egbe nwakporo ya bụ nwaamadị na-anọchị anya ndị Mfantseman ka ọ na-alọta ebe elekere nke mbụ ụtụtụ Fraịde.
Ọbaozi ntaakụkọ ndị Joy Online si na ya bụ nwaamadị kọwaara ha onwe ya tupu ha agbaa ya ọnụ egbe abụọ sị ya na ọ bụ ya bụtere nsogbu dị na Gana.
Redio Citi Fm kwukwara na ha gbakwara draịva ya egbe, mana ọ na-anata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ ugbua. Onweghị ihe metutara mmadụ atọ ndị ọzọ so ha.
Cheta na ntuliaka ndị Gana na-abịa n'ụbọchị asaa nke ọnwa Disemba.