Ndị Manchester United ji ọkpụ goolu abụọ asataghị asata merie ndị Paris St Germain nke mba Fransị oge ha abụọ zutere n'asọmpi Uefa Champions League n'abalị Tuzde.
Nke a echeterela ndị mmadụ etu Man Utd si merikwaa PSG na be ha n'asọmpi a afọ abụọ gara aga.
Ọ bụ Man Utd bu ụzọ nyete goolu n'agba nke mbụ oge Bruno Fernandez gbakpu penariti e nyere ha.
Anthony Martial ji aka ya nye onwe ha goolu iji saara PSG n'agba nke abụọ.
Mana Marcus Rashford gosiri ihe o ji bụrụ odogwu oge o nyere goolu ọzọ oge ọ fọdụrụ nkeji olemole ka asọmpị ahụ bịa na njedebe.
Man Utd bụzi ndị nke abụọ n'otu G nke asọmpi 'Champions League afọ a; RB Leipzig bụ ndị nke mbụ dịka ha jikwa ọkpụ goolu abụọ a saghị asa merie ndị otu Istanbul Basaksehir.
Lee ka asọmpi 'Champions League' ndị ọzọ a gbara n'abalị Tuzde si gaa:
Zenit St Petersburg 1 - 1 Club Bruges
Dynamo Kyiv 0 - 2 Juventus
Lazio 3 - 1 Borussia Dortmund
Barcelena 5 - 1 Ferenvárosi
RB Leipzig 2 - 0 Istanbul Basaksehir