Gọvanọ Willie Obiano bụ aka na-achị Anambara steeti achụọla James Nwafor bụbu onyeisi otu Special Anti-Robbery Squad (SARS) Awkwuzu n'ọrụ dịka onye enyemaka pụrụiche ya.
Don Adinuba bụ kọmishọna mgbasaozi nke Anambara steeti gwara BBC Igbo nke a n'ekwentị.
Nke a na-eso okwu Gọvanọ Obiano gwara ndị bu ngagharịiwe maka nkwụsị SARS garuo n'obi gọọmentị n'ụtụtụ Tọzde bụ Ọktoba 15, na a ga-anapụ Nwafor ọrụ ya ma kwuo ka a gbaa ya akwụkwọ n'ụlọikpe.
Obiano kwuru na ọ na-anụ maka mmegbu ndị SARS na-eme ndị ntorobịa na Naịjirịa, ma too Onyeisiala Muhammadu Buhari ike maka ikposa SARS dịka ndị ntorobịa si chọọ ma gee atụmatụ anọ ha wepụtara maka imezi ngalaba ndị uweojii.
Obiano gara n'ihu kwuo na ọ ga-ehibe otu ga-elebanye anya n'ihe banyere akụkọ mmegide ndị SARS a megidere ndị mmadụ n'afọ ole na ole gara aga.
Ọ họpụtara otu nke Ọkaikpe V.N Umeh nọ n'isi ya bụ ndị ọ sị ga-ekpokọta ihe ha chọpụtara n'afọ 30 na-abịa.
Ndị ga-esonye na ya bụ ọgbakọ gụnyere:
-
Ndị na-anọchite anya otu ụmụakwụkwọ Anambara steeti
-
Ndị isi na-anọchite anya ndị ntorobia si na Sinetorial Zoonu atọ dị na steeti ahụ
-
Otu onye na-efe ala nna ya na steeti ahụ
-
Onye ga-anọchite anya ndị ntorobia nke Ohaneze Ndigbo
-
Onyeisioche ndị ụka Kraịst na steeti ahụ
-
Onye na-anọchite anya Achibishọpụ nke Katọlik Dayọsis Ọnịcha
-
Onye na-anọchite anya ndị ichie n'Anambara steeti
O kwuru na otu a ga-enyocha ebubo oke ogbugbu a na-ebo James Nwafor oge ọ bụ onyeisi SARS n'Awkwuzu.
O kwuru na ọ bụrụ na a chọpụta na ikpe mara ya, na a ga-akpụpụ ya ụlọikpe.
Gọvanọ Obiano gakwara n'ihu gwa Kọmishọna uweojii steeti ahụ na ya nyochagharịa ndị niile ndị uweojii ji eji na steeti ahụ, iji hụ na ikike dịịrị onye ọbụla rutere ha oge ọbụla.