You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ụlọakwụkwọ agaghị emepe na Kenya maka idemmiri

Akụkọ ndị kachasị gbapụta ihe n'ụwa n'ọnwa Eprelụ

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Ikechukwu Kalu, Uche Akolisa, Chimezie Ucheagbo

  1. EFCC anwuchiela Olanrewaju Ibrahim a na-akpọ Bobrisky

    Ụlọọrụ na-ahụ maka mpụ na Naịjirịa bụ Economic and Financial Crimes Commission, EFCC anwụchiela onye a ma ama bụ Olanrewaju Ibrahim a na-akpọkwa na Legos.

    EFCC dere n'akara ha na soshal midịa na ha nwuchiri Bobrisky maka ebubo ifesa ego n'ụzọ na-ezighi ezi.

    EFCC kwuru na nwuchi a sotere onyonyo gosiri ebe Bobrisky na-efesa ego n'emume onye a ma ama bụ Eniola Ajao. Ha kwuru na ọ dakwala iwu n'emume ndị ọzọ dị icheiche.

    N'okwu ya; "Bobrisky rutere n'ụlọọrụ ha n'ụtụtụ ụbọchị Wenezde ebe o jiri aka ya nye ha okwu ya".

    Ha kwuru na ha ga-akpụpụ ya ụlọikpe n'oge na-abịa.

  2. Ndeewo Igbo bụ Igbo!

    Anyị ekele unu!

  3. N'ihi nnyocha mpụ: Nosiviwe Mapisa agbaala arụkwaghịm

    Onyeisioche ụlọomeiwu Saụt Afrịka bụ Nosiviwe Mapisa-Nqakula agbaala arụkwaghịm dịka ndị uweojii wụchara n’ụlọ ya n’oge a na-enyocha ya maka ebubo mpụ.

    Mapisa-Nqakula bụ onye a na-ebo ebubo ịnara ngarị maka ịnyepụ ọrụngo n’oge ọ bụụrụ minister nchekwa.

    Ọ gọọla aka na ụkwụ ya n’ebubo ahụ ma kwuo na ihe mere o ji gbaa arụkwaghịm “enweghị ụzọ ọbụla o siri bụrụ ịnabata na aka ya adịghị ọcha.”

    O kwuru na dabere etu nnyocha ahụ siri dị oke mkpa na ya agaghị agakwa n’ihu n’ọrụ ya dịka onyeisioche ụlọomeiwu.

    Nwaanyị ahụ gbara afọ 67, onye sooro buo agha megide ịkpa oke bụụrụ onyeisioche ụlọomeiwu n’afọ 2021 mana tupu mgbe ahụ, ọ bụụrụ minista nchekwa ruo afọ asaa.

    N’izuụka gara aga, ndị ọkaikpe Mapisa-Nqakula gbara akwụkwọ arịrịọ iji chọọ ka ụlọikpe nye iwu ga-akwụsị ndị ọrụ nchekwa ịnwụchi ya dịka ha kwuru na nke ahụ ga-emechu ya ihu.

    N’ụbọchị Tuzde 2 Eprel 2024, ndị ọkaikpe jụrụ ịnabata arịrịọ ahụ dịka ha sịrị na okwu ahụ abụghị nke bịara na mberede ebe ha na-apụghị atụ anya nnwuchi nke na-emebeghị eme.

    Ozi sitere n’akwụkwọ akụkọ Business Day na-ekwu na a na-ebo Mapisa-Nqakula ebubo ịnapụ otu onye nwere ụlọọrụ ego ruru $120,000 (£96,000) iji nye ya ikike ibuga ngwa ndịagha mba Saụt Afrịka.

  4. 'Students loan': Tinubu abịanyela aka n’iwu maka ego mgbazinye ụmụakwụkwọ

    Onyeisiala Bola Tinubu abịanyela aka n’iwu maka ego mgbazinye ụmụakwụkwọ.

    Onyeisiala mere nke a n’obi ọchịchị Naịjirịa dị n’Abuja n’ụbọchị Wenezde 3 Eprel 2024.

    Atụmatụ iwu ahụ akpọkwasara ‘mkpebi maka ịgbanwe iwu ga-arọpụtara ụmụakwụkwọ ego mgbazinye nke afọ 2024' bụ nke ekepụtara iji hiwe akpaego a ga-eji kwadoo ụmụakwụkwọ ndị nọ n’ụlọakwụkwọ dị elu.

    N’ime ọnwa Nọvemba 2023, ụlọomeiwu Naịjirịa kwadọrọ atụmatụ iwu ahụ bụ nke chọrọ ka ehiwe ụkpụrụ a ga-eji na-agbazinye ụmụakwụkwọ Naịjirịa ego.

    Dịka onyeisi ndị ọrụ n’obi ọchịchị Naịjirịa bụ Femi Gbajabiamila siri kwuo, iwu ọhụrụ a bụ ụdị ya nke mbụ na Naịjirịa dịkwa ka ọ ga-enye aka ịhụ na enweghị nwaafọ Naịjirịa ọ bụla agọnarịrị ohere agụmaakwụkwọ.

  5. Ahọpụtala Sonko dịka Prime Minister Senegal

    Onyeisiala Senegal ọhụrụ bụ Bassirou Diomaye Faye ahọpụtala onye ndu pati kachasị ukwuu na-agba gọọmenti mba ahụ ụkwụ bụ Ousmane Sonko dịka Praịm Minista.

    Ousmane Sonko bụ onye zụlitere Faye n’igwu ndọrọndọrọ ọchịchị dịkwa ka a tụrụ ha bụ mmadụ abụọ mkpọrọ tupu ahazie ntụliakaelu n’ọnwa Maachị.

    Onyeisiala pụrụ apụ bụ Macky Sall nyere ha mgbaghara tinyere ọtụtụ ndị ọzọ a tụrụ mkpọrọ maka okwu ndọrọndọrọ ọchịchị.

    Obi ọchịchị Senegal zipụrụ ozi n’ọbaozi X kwuo sị “n’ime awa ole na ole educhara Faye n’iyi ọrụ, ọ họpụtala Sonko dịka Praịm Minista.”

    Sonko bụ onye a kpọrọ aha na mbụ dịka onye ga-eji aha pati na-agba gọọmenti ụkwụ zọọ ọkwa onyeisiala tupu anwụchie ya ma kwupụta ya dịka onye na-etozughị oke isoro zọọ ya bụ ọkwa.

    N’okwu ya dịka educhara ya n’iyi ọrụ n’ụbọchị Tuzde 2 Eprel 2024, Faye kwuru na Senegal ga-abụ mba olileanya nke ọchịchị ọhakarasị ya ga-agbasikwu ike.

  6. Anti-Gay law: Uganda akpụpụla mgbagha iwu megidere agwa a

    Ụlọikpe na-ahụ maka iwu na Uganda ajụla arịrịọ ka akagbu iwu gbochiri mmekọ nwoke na nwoke maọbụ nwaanyị na nwaanyị n' onwa Mee afọ 2023.

    Ụlọikpe ahu mere ka iwu ahụ daa mba dịka ha kwuru na iwu ahu mebiri ikike iwu obodo.

    Nnyochaa onye ntaakụkọ anyị na Nairobi isiobodo Kenya bụ Barbara Plett Usher wetara, kwuru na iwu ahụ bụ nke a katọrọ na mba ụwa niile, kpalitere iwe n'etiti ndị na-edina ụdị ha Bekee kpọrọ LGBTQ n'ịchafụ.

    Iwu ahụ bụ otu n'ime ndị kacha sie ike n'ụwa niile, na-amanye nga mkpụrụ ndụ maka mmekọ nwoke na nwoke nwere nkwenye, na ntaramahụhụ ọnwụ maka omume ndị ọ kọwara dị ka nwoke idina nwoke ibe ya.

    Mana ndị na-akwado iwu na ihe ndị ruuru mmadụ, ekwuola na iwu ahu na-emebi ikike ndị bụ isi nke iwu mba Uganda.

    Ụlọikpe ahụ kwetara n'otu akụkụ mana ọ jụrụ iwepu iwu ahụ ma kagbu akụkụ ụfọdụ na-emegide omume dịka mmekọ nwoke na nwoke, ịghara ikwupụta akụkụ mmekọ nwoke na nwoke na ibunye mmadụ ọrịa na-egbu egbu site na mmekọ nwoke na nwoke.

  7. Eletricity Tariff: Ego a na-akwụ n'ọkụ latrik ga-eji 300% gbalie

    Ọnụ ego a na-akwụ maka ọkụ latrik nwere ike igbali dịka Gọọmenti Etiti na-ebuli ọnụ ahịa gas.

    Gọọmenti etiti Naịjiria ekwuola na ọnụahịa gaas ọhụrụ ụlọọrụ na-emepụta ọkụ ugbua bụzi dọla 2.42 kwa nde 'Metric Million British Thermal Unit' (mbtu) nke dị elu karịa dọla 2.18m mbtu bụ ọnụego gara aga.

    Nnyocha kwuru na Naijiria na-ewepụta ọkụ latrik karịrị pasentị iri asaa site n' ụlọọrụ ọkụ ọkụ nke gas na-agba.

    Ọnụahịa ọhụrụ a nwere ike ibute mgbalite ọnụahịa maọbụrụ na ụlọọrụ na-ahụ maka ọkụ latrik na Naijiria mee nnyocha ego ọkụ ọzọ.

    Ụlọọrụ Gọọmentị Etiti bụ 'Nigerian Midstream and Downstream Petroleum Regulatory Authority'(NMDPRA), mere ka a mara ọnụahịa ọhụrụ nke afọ 2024 na nkwupụta ha mere ụbọchị Mọnde.

    Ozi onyeisi nchịkwa ụlọọrụ NMDPRA bụ Farouk Ahmed wepụtara, kwuru na ha tinyere ọnụ ahịa gaas azụmahịa na $2.92 mbtu, site n' ọnụahịa $2.5m mbtu.

    Cheta na mgbako usoro ọnụahịa ọkụ latrik ọtụtụ afọ nke NERC wepụtara na Jenụwarị afọ 2024 maka ụlọ ọrụ nkesa ọkụ eletrik dabere na ọnụ ahịa gas sitere na mbụ.

    N'ihi ọnụ ahịa ọhụrụ a, e nwere ike inwe nnyocha ọnụahịa ọkụ n'ihi na gaas bụ isi ihe e ji eme ihe na-emepụta ọkụ.

    Ndị na-emepụta gaas gụnyere mba ụwa na ụlọọrụ mmanụ na gaas, akpọọla oku ugboro ugboro maka nynocha na ọnụahịa ngwaahịa, ma kwuo na nke a ga-abụ ihe mkpali ịkwalite ga mmepụta.

    N'ozi Ahmed wepụtara ụbọchị monde, o kwuru na Iwu ụlọọrụ 'Petroleum' afọ 2021 nke Onyeisiala kwadoro na Ọgọst 16 afọ 2021, wee lelee ya na Ọgọst 2021, nyere usoro iwu doro anya maka mkpebi nke usoro ọnụahịa dabere na ahịa maka ahịa gas ụlọ.

  8. Taiwan Earthquake: Alaọmajiji ataala isi ọtụtụ mmadụ na Taiwan

    Mmadụ asaa anwụọla ebe mmadụ 711 merụrụ ahụ mgbe alaọmajijiji mere n'akụkụ ọwụwa anyanwụ dị n'ụsọ okéosimiri ọwụwa anyanwụ mba Taiwan. Ya bụ alaọmajijiji nke ruru n'ogo 7.4, bụ nke kachasị ike ịkụ n'agwaetiti ahụ n'ime afọ 25.

    Akụkọ kwuru na Ụlọ ndị dị n'isiobodo ahụ bụ Taipei na mpaghara gbara ya gburugburu, mara jijiji nke ukwuu.

    A na-atụkwa egwu na ọtụtụ mmadụ tọrọ n'okpuru mkpọmkpọ na 'County Hualien nke dị na akuku ebe etiti ahụ.

    Ozi kwuru na e wedatala ọkwa tsunami nke e nyere maka àgwàetiti Japan dị nso na mpaghara ugwu Philippines.

    Akụkọ kwụrụ na Japan na China na-enyere mba Taiwan aka, ebe onyeisi ala Tsai Ing-wen kwuru na a ga-eziga ndịagha Taiwan n'ọrụ gbatagbata ebe ahụ.

  9. Ụnụ asaala chi?

    Igbo ndị ọma anyị ji eme ọnụ, ụnụ asaala chi?

  10. Bassirou Faye: E duola Onyeisiala kachasị bụrụ nwata iyi ọrụ na Senegal

    E duola Bassirou Diomaye Faye n'iyi ọrụ dịka Onyeisiala nke ise nke mba Senegal n'emume e mere n'obodo Diamniadio dị nso na Dakar, isiobodo mba ahụ.

    Ndịisiala mba dị iche iche gụnyere Onyeisiala Naijiria mabụrụ Onyeisioche otu Ecowas , Bola Tinubu, gara mmemme idu n'iyi ọrụ ahụ.

    N'ọnwa gara aga, Faye gbara afọ 44 meriri na ntuliaka onyeisiala mba Senegal mere, dịka o nwetara pasent 54 vootu a tụrụ merie Amadou Ba.

    N'ụbọchị Fraide, Ọgbakọ Iwu ala mba(Constititunal Council)kwuru na o meriri n'ezie.

    .

  11. Ogbunigwe gbara n’Ikeja Cantonment n'ezie- Ndiagha Naijiria

    Ndịagha Naijiria ekwuola nn'ezie na ọ bụ ọgbụnigwe gbara n’ugbo dị nso n’ogige Ahịa ‘Mammy Market’ dị n’ogige ha n'Ikeja Cantonment, Legọs, ụbọchị Monde .

    Ọnụ na-ekwuru ndịagha Naijiria bụ Onyema Nwachukwu bụ onye kwuru nke a n' ozi mgbasaozi o wepụtara kwuru na ha na-eche na ọ bụ ọkụ e sunyere ahịhịa kpalitere ogbunigwe ahụ ịgba.

    O nweghị ihe ọdachi ọbụla pụtara n'ihe ahụ gbara dịka o siri kọwa.

  12. Congo enwetala Praim Minista nwaanyị mbụ ha

    Onyeisiala mba Kongo bụ Félix Tshisekedi ahọpụtala onye bụbu minista dịka nwaanyị mbụ ga-abụ Praịm Minista na mba ahụ.

    Judith Suminwa Tuluka bụbụ Mịnịsta nhazi obodo na-anọchi anya Sama Lukonde, onye gbara arụkwaghịm n’ọnwa Febụwarị, afọ 2024.

    “A maara m na ọrụ a dị ukwuu ebe ihe mkpọbiụkwụ dị ọtụtụ mana site na nkwado onyeisiala na nke onye ọbụla, anyị ga-eru ebe anyị na-aga,” bụ ihe Tuluka kwuru n’ọgbakọ ndị ntaakụkọ a haziri n’ụbọchị Mọnde abalị mbụ nke Eprelụ afọ 2024, dịka a họpụtachara ya n’ọkwa.

    A họpụtara ya n’ọkwa dịka ọ gasịrị ogologo oge e ji na-achọ inweta nkwekọrịta ndị omeiwu kachasị n’ọnụọgụgụ n’ụlọomeiwu mba ahụ.

    Nke ahụ bụ otu ihe gbara ọkpụrụkpụ a na-eme tupu a họpụta Praịm Minista ọhụrụ ma hiwekwa gọọmenti.

    Pati nọ n’ọkwa ọchịchị bụ 'Union for Democracy and Social Progress' nwetara ndị omeiwu ka n’ọnụọgụgụ dịka ha meriri pati 44 ndị nke ọzọ. Tuluka bụ onye a tụrụ anya ịkpọpụta ndị ha na ya ga-eso rụọ ọrụ n’ime izuụka ndị na-abịa n’ihu.

    Praịm Minista ahụ ga-anọ n’isi gọọmenti, nke ihe mejupụtara ya bụ ndị minista na ndị osote minista.

  13. Diba adanyela na nsogbu maka ịlụ nwata dị afọ 12

    Aka ndị uweojii Ndị uweojii akparala otu nwoke dịbia maka ịlụ nwatakịrị nwaanyị gbara afọ iri na abụọ.

    Vidio na foto nke emume agbamakwụkwọ omenala ha mere ụbọchị Satọdee n'etiti nwata na eze mmụọ bụ Nuumo Borketey Laweh Tsuru XXXIII, bụ ihe kụzuru iwe ụmụ afọ ndị Ghana iwe nke mere ka ndị uweojii mba ahụ nwụchie nwoke ahụ.

    Ọtụtụ ndị mmadụ katọrọ alụmdinanwunye ahụ, wee kpo oku ka ndị uwe ojii na ụlọọrụ gọọmentị mee ihe maka ya.

    Akụkọ kwuru na ndịisi obodo gbachitere emume ahụ, ma kwuo na ndị nkatọ alụmdinanwunye ahụ, aghọtaghị omenala na ọdịnala ha.

    Ndị uweojii Ghana kwuru n'ụbọchị Tuzdee n'ozi ha wepụtara na ha achọpụtala ma chọta nwata ahụ ahụ na nne ya bụ ndị nọ n'okpuru nchebe ndị uwe ojii ugbua.

    Ozi si na ngalaba ụmụnwaanyị na ụmụaka nke Ministri na-ahụ maka ọdịmma ndị mmadụ kwuru na ha na-arụkọ ọrụ iji nye nwatakịrị ahụ nkwado dịka a na-enyocha ya bụ okwu.

    Dịka otu na-alụ ọgụ maka ikike dịịrị ụmụaka a kpọrọ 'Girls Not Bride' si kwuo, alụmdinanwunye ụmụaka ka na-ewu ewu na mba Ghana na-agbanyeghị na a machibidoro ya.

    Ha kwuru na ụmụaka ụmụnwaanyị ndi pasent iri na itenanị (19%) na-alụ dị tupu ha eruo afọ iri na asatọ ebe pasent ise (5%) na-alụ tupu ha eruo afọ iri na ise.

  14. Onyeisiala Tinubu ga-aga emume idu Onyeisiala mba Senegal ọhụrụ n'iyi ọrụ

    Onyeisiala Bola Tinubu ga-ahapụ Abuja na Tuzde gawa obodo Dakar bụ isiobodo Senegal maka emume idu Bassirou Diomaye Faye n'iyi ọrụ dịka Onyeisiala ọhụrụ nke mba ahụ.

    Ozi si n'aka onye ndụmọdụ ya pụrụiche bụ Ajuri Ngelale n'ụbọchị Mọnde kwuru na ọ bụ mba Senegal kpọrọ Tinubu oku maka ọgbakọ ahụ.

    Onyeisiala Tinubu bụ onyeisioche ndị ndu otu Economic Community of West African States (ECOWAS) ga-eso ndị ndu ibe ya si na mpaghara ahụ n'emume idu n'iyi ọrụ ahụ n'ọgbakọ ozuzu a kpọrọ 'Diamniadio Exhibition Centre'.

    Ndị ga-eso ya eme njem ahụ gụnyere minista na-ahụ maka ihe na-eme na mba ndị ọzọ Yusuf Tuggar nakwa ndịisi ọrụ gọọmentị ndị ọzọ.

    A na-atụ anya na Onyeisiala Tinubu ga-alọhachị Naịjirịa ngwa ngwa e mechara emume idu n'iyi ọrụ ahụ.

    Cheta na Bassirou Diomaye Faye nọ na pati na-anọghị n'ọchịchị si n'ụlọmkpọrọ pụta n'otu izuụka tupu e mee ntuliaka na 24 Maachị 2024 mana o mechara merie na ntuliaka ahụ.