You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ụlọakwụkwọ agaghị emepe na Kenya maka idemmiri

Akụkọ ndị kachasị gbapụta ihe n'ụwa n'ọnwa Eprelụ

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Ikechukwu Kalu, Uche Akolisa, Chimezie Ucheagbo

  1. Ihe anyị ma maka akụko nwoke etigburu n'Anambra steeti

    Otu nwoke dị afọ ịrị ịsịị ka akụkọ kwuru na umunne ya na ndị nche ogbe tịburu na Nza Ozobulu, Anambra Steeti.

    Akuko kwuru na nwoke ahu aka amabeghi aha ya nwere Tankị-Mmịrị dị na be ha ga ree nwere gboo mkpa nke mere ụmụnne ya jịrị nwere ndị nche ogbe nwuchie ya, tiwe ya ịhe.

    Ka e tichara ya ịhe ka ọ wuru. Ka o sị dị ugbua, nwetebeghị aha nwoke ahu etigburu ma ọ bụ ndị tigburu ya. Ịhe ndị uweoji kwuru Na oge BBC Igbo kporo ndị uweoji gbasara akụkọ ahụ, Tochukwu Ikenga bụ ọnụ na ekwuru ndị uweoji na Anambra steeti kwuru na ha huru ịhe onyonyo ahụ na efeharị na ịntanentị.

    Ikenga gara n’ ịrụ kwụọ na ndị uweoji ewetabaghị mkpesa gbasara ya, ma rịọ ndị ezinaulo ọ metutara ka ha mee mkpesa.

    Na okwu ya “anyị ahụla ịhe onyonyo ahụ ebe a kwuru na umunne gburu nwanne ha na Anambra mana anyị enwetabeghị akụkọ nwereịsị banyere ya”.

    “Anyị ezigarago ndị obodo e kwuru na mkpamkpa ahụ kpara mana enwebeghị onye pụtara kwuo na ya mara ndị mere ya na onye egburu”.

    “Anyị jị ohere a nwere na agwa ndị ezinaulo ọ metutara ka ha puta ma kọwara ọhaneze ịhe mere”

  2. Sineto Ayogu Eze anwụọla dịka ọ gbara afọ 65

    Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na Ayogu Eze bụbụ Sinetọ anwụọla.

    Otu onye ọrụ gọọmentị Enugwu steeti achọghị ka akpọọ aha ya gwara BBC o na ọ nwụrụ n’ụtụtụ ụbọchị Tọzde dịka ọ rịachara ọrịa obere oge.

    Eze tupu ọnwụ ya nọchiri anya Enugwu North n’ụlọọmeiwu n’afọ 2007 rue afọ 2015.

    Ọzọ bụ na aka chiburu Enugwu steeti bụ Chimaroke Nnamani tinyere ya n’ọkwa Kọmịshọna mgbasaozi na omenala n’afọ 1999.

    Eze zọkwara ọkwa Gọvanọ Enugwu steeti ugboro abụọ n’afọ 2015 n’okpuru otu PDP mana o tozughi ife ọkọlọtọ otu ahụ.

    O sizi na PDP febanye APC ebe ọ zọrọ ya bụ ọkwa ọzọ mana ngalaba INEC etinyeghi aha ya na ndị ga-eso zọ ọkwa n’afọ 2019.

  3. Mmadụ 118 ndị nọ mkpọrọ na Suleja esila ebe ahụ gbalaga

    Na abalị wenesde ka ndị nga dị 118 gbapuru na ụlọ nga dị na Suledja Niger steetị.

    Ha gbapuru na ụlọ mkpọrọ ahụ ka mmịrị ọzuzọ kwatuchara mgbidi ụlọ nga ahụ.

    Ọnụ na-ekwuru ndị ọrụ-nga na Abuja bụ Adamu Duza kwuru na ọ bụ ezikwu na ndị nga gbapuru.

    N'akwụkwọ ọzị Adamu nyere ndị nta akuko, o kwuru na ndi ọrụ nchekwa awuchiela mmadu ịrị sọ wee gbapu na nga.

    N'okwu ya “nnukwu mmịrị ọzụzọ zọrọ na abalị wednnesde, epril 24th, 2024 kpara mkpamkpa n'ụlọ nga dị na Suleja, Niger steeti nwere mebie mgbidi ụfọdụ nke mere ndị nga jịrị gbapụ”.

    Mana akwụkwọ ọzị ahụ emeghị ka amara na ọ bụ ndị Boko Hara nọ na ụlọ nga ahụ gbapuru ma ọ bụ deputa aha ndị gbapuru.

    “Ndị ọrụ nchekwa-nga maara ọtụtụ ụlọ arụrụ na ụlọ nga bụ nke arụrụ na oge ndị ọcha na achị Naịjirịa, ịhe karịrị afọ 70 garaaga”

    Nke a abụghị nke mbu ndị nga na esị na nga agbapu na ụlọ nga dị na Naịjirịa.

  4. EFCC enyeghachila Enugwu steeti akụ na ụlọ ndị a napụtara Chimaraoke Nnamani

    Ụlọọrụ na-ebu agha megide nrụrụaka na Naijiria bụ ‘ Economic and Financial Crimes Commission’, (EFCC) enyeghachila Enugwu akụ naụlọ ruru 14 bụ ige=he gọọmentị Etiti napụtara aka chịburu steeti ahụ bụ Chimaroke m=Nnamani.

    Onyeisi EFFCC bụ Ola Olukoyede bụ onye Nyere akgọvanọ steeti ahụ ugbua bụ Peter Mba akwụkwọ akụ ndị a n’ụbọchị Wenezde n’abalị 24 nke ọnwa Eprelụ, afọ 2024.

    Akụ ndị ahụ a napụtara gụnyere: ụlọ, igwe mgbasaozi Redio na TV, ụlọgwụ, na ihe ndị ọzọ.

    Cheta n’ọnwa Julai afọ 20215, ọkaikpe Jọstịs

    Mohammed Yinusa nke Ụlọikpe Ukwu nke Etitiu dị na Legọs mara ụlọọrụ anọ a sị Nnamani nwe; Rainbownet Nig Ltd, Cosmos FM, Capital City Automobile Nig Ltd na ‘Renaissance University Teaching Hospital,’ ikpe , ma sị ka ha nyeghachi ihe ha nwere gọọmentị.

    Nke a na-abịa dịka ụlọọrụ ndị a kwetara na ebubo EFCC boro ha.

  5. Kenya flood: Idemmiri achụpụla ihe ruru mmadụ 40000 n'ụlọ ha

    Otu United Nations ekwuola na o pekata mpe mmadụ 32 anwụọla , ebe ihe karịrị mmadụ 40,000 na mba Kenya hapụrụa ụlọ ha gbaa ọsọ ndụ n'ihi oke idemmiri.

    Okporoụzọ ghọrọ osimmiri n'isiobodo Kenya bụ Nairobi, dịka otu onye ọrụ gọọmentị si kwuo.

    Oke mmiri ozuzo zoro abalị ole na ole were bute oke idemmiri ahụ kpara mkpamkpa.

    Ụfọdụ ndị mmadụ larụrụ n'elu ụlọ ha dịka mmiri tochiri ebe nile.

    Mmiri tochiri okporoụzọ, mee njem okporoụzọ dịka e nwere kpachikpachi okporoụzọ.

    Edwin Sifuna, na-elekọta mpaghara Nairobi bụ onye tinyere mpaghara mmiri tochiri ebe nile , ndị mmadụ tọ n'elu ụlọ ha sịrị, " ọnọdụ ihe na-eme na Nairobi dị egwu. Anyị na-ebeku enyemaka gbagbata n'ihi na ihe nke a akarịala anyị."

  6. Etu ndịuweojii Jamini si nwụchie ụmụ nwoke Naịjirịa 11 na-egwu ụmụnwaanyị wayo

    Ndị uweojii mba Jamini ekwuputala na ha anwụchiela mmadụ 11 si n'otu ha kpọrọ 'Nigerian Mafia' bụ ndị eboro ebubo ịgwu ụmụ nwaanyị wayo ịlụ ha.

    Dịka ha si kwuo, o ruola afọ abụọ kemgbe ha na-enyocha ndị ahụ ha si so n'otu 'Black Ax' a ma dịka Neo Black Movement of Afrịka (NBM).

    Ha kọwara na mpụ nke otu ahụ kachasị e me na mba Jamini bụ igwu ndị mmadụ wayo ịlụ ha nakwa i si n'azụ ụzo ebupu ego.

    Etu ha si arụ ọrụ ha bụ ị kwe mmadụ nkwa ọlụlụ ma siri ebe ahụ na-anapụ ndị ahụ ego site n'akụkọ ụgha dị icheiche. Na ngwụcha, ego ahụ na-emecha ruo Naịjirịa site n'ụzọ nzuzo dị icheiche nke ndị ma maka ego na-enyere ha aka e me.

    "N'afọ 2023, e nwere mkpesa karịrị 450 bụ ndị e ji ụzọ a napụ ego naanị na mpaghara Bavaria nke pụtara ego karịrị nde Yuro ise na ụma atọ (€5.3m)" ka ha dere n'ozi ahụ ha wepụtara.

    Ha si na ndị niile a nwụchiri bụ ụmụ nwoke si afọ 29 rue afọ 53 bụ ndị ji akwụkwọ njirimara ndị Naịjirịa.

    Ha sikwa na ihe ndị akaebe a napụrụ ndị a gụnyere ekwentị nakwa igbe na-edebe ngụkọ bụkwa nke ha bụ ndị uweojii jichiri.

  7. UNN akwụsịtụla onyenkụzi e boro ebubo na o dinara nwaakwụkwọ nwaanyị ọrụ

    Mahadum Naịjirịa dị na Nsụkka, Enugwu steeti bụ UNN n’ịchafụ Bekee akwụsịla onyenkụzi e bọrọ ebubo na ọ na-akwaso nwaakwụkwọ nwaanyị iko ọrụ.

    Nwoke ahụ aha ya bụ Mfonobong David Udoudom ka ndị na-elekọta ụlọakwụkwọ ahụ sịrị ya kwụsịtụ ọrụ dịka onyenkụzị ruo mgbe e mechara nyocha banyere ebubo e boro ya.

    N’akwụkwọ ozi nke ọnụ na-ekwuru UNN bụ Okwu Omeaku bịanyere aka, mahadum ahụ kwuru na “ọrụ akwụsịtụrụ Mfonobong David Udoudom ga-adị ire ruo mgbe e mechara nyocha banyere ebubo ahụ.”

    “UNN so na mahadum nwere iwu megidere ịkwaso ụmụakwụkwọ iko, ọ haziri ka ụmụakụkwọ na ndị nkụzi si emekọ nakwa etu umunwoke na umnwaanyị na-arụrụ ha ọrụ sị emekọrịta”

    “Anyị nwere mmasị ichekwa ụmụakwụkwọ anyị megide ịkwaso ha iko, ịnapụ ha ihe n’ike bụ ihe na-adịghị n’iwu.”

    “Anyị ga-ata Mfonobong David Udoudom ahụhụ ya bụrụ ma nnyocha anyị na-eme achọpụta na aka ya dị n’ebubo e boro ya.”

    Oge anyị gbara ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Enugwu steeti bụ Daniel Ndukwe ajụjụ banyere akụkọ kwuru na anwụchiri Mfonobong David Udoudom, ọ sịrị na ya anụbeghị maka ya.

    N’okwu ya “ejighị m akụkọ maọbụ nụ na ndị uweojii jidere nwoke ahụ.”

  8. Hadi Sirika: Ọ bụ oku ka anyị kpọrọ ya, anyị anwụchighị ya - EFCC

    Ụlọọrụ na-ebu agha megide mpụ na nrụrụaka ego na Naịjirịa bụ ‘Economic and Financial Crimes Commission’ (EFCC) akpọọla onye bụbu mịnịsta na-ahụ maka njem ụgbọelu bụ Hadi Sirika oku ma na-agba ya ajuju ọnụ.

    Akụkọ kwuru na EFCC na-enyocha ego na-efu mgbe Hadi Sirika nọ n’ọkwa ebe akụkọ ọzọ kwuru na eboro ya ebubo imefu ego ruru ijeri naịra asatọ.

    Mana oge BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuru EFCC bụ Dele Oyewale n’ekwentị ọ sịrị na ọ bụ eziokwu na Hadi Sirika zara oku EFCC kpọrọ ya n’abalị ụnyaahụ.

    N’okwu ya “ọ bụ eziokwu na anyị kpọrọ ya, ọ bịa n’ụlọọrụ anyị. Ọ bịara n’abalị ụnyaahụ. Ndị ọrụ anyị na-ahụ maka nyocha gbara ya ajụjụ ọnụ.”

    Ọ gara n’ihu kwuo na ya amaghị ma Hadi Siriki ọ ka nọ n’ụlọọrụ EFCC ruo ugbua. “Nke a bụ nke m ga-achọpụta, mana a ma m na ọ nọ n’ụlọọrụ anyị n’abalị ụnyaahụ.”

    Mgbe a juru ya ihe mere EFCC jiri kpọọ Hadi Siriki oku, Dele sịrị “anyị na-enyọcha ihe o mere mgbe ọ nọ n’oche ọkachasị ihe gbasara egọ mana ugbua, ndị na-eme nnyocha n’ụlọọrụ anyị na-agba ya ajụjụ ọnụ.”

    Dele kwuru na ya agaghị ekwu ego ole e bọrọ Hadị Siriki n’ebubo maka na a ka na-eme nnyocha gbasara ya.

  9. Hadi Sirika nọ n'aka EFCC ugbua

    Onye bụbụ Minista ụgbọelu na Naijirịa bụ Hadi Sirika nọ n'ụlọorụ ngalaba EFCC azara ọnụ ya ugbua.

    Ọnụ na-ekwuru EFCC bụ Dele Oyewale gwara BBC n'ekwentị na ha kpọrọ Sirika oku ka ọ bịa zara ọnụ ya maka etu o si rụ ọrụ dịika Minista mgbe ọ nọ n'ọkwa.

    Oyewale sị "Ọ bụ eziokwu na ọ nọ n'ụlọọrụ anyị mana anwụchighi ya, a kpọrọ ya oku, o jiri aka ya bịa".

    Akụkọ na-efegharị na-ekwu na ọ bụ maka ego ruru ijeri naira asatọ metụtara mgbape ụlọọrụ ọdọụgbọelu bụ \Air Nigeria' ka EFCC ji eme Sirika nyocha.

    Mana Oyewale kwuru na ọ bụ maka ọrụ niile ọ rụrụ dịka minista, na o nweghi nke e bidoro aka iji kpọ ya oku.

    "Ya na ndị ọrụ anyị na-eme nyocha ka nọ ugbua" ka Oyewale kwuru n'ekwentị.

  10. Bobrisky agbaala akwụkwọ mkpegharị ikpe maka mkpọrọ a tụrụ ya

    Bobrisky agbaala akwụkwọ mkpegharị ikpe n’ụlọikpe n’ihi ikpe a mara ya maka imetọ akwụkwọ ego Naịra.

    N’akwụkwọ mkpegharị ikpe ahụ sitere n’aka onye ọkaikpe ya bụ Bimbo Kusanu, Idris Olanrewaju Okuneye a maara nke ọma dịka ‘Bobrisky’ gwara ụlọikpe ka ọ kachapụ mkpọrọ ọnwa isii a tụrụ ya ma were nha naịra 50,000 dochie anya ya maka ebubo niile e boro ya n’otu n’otu.

    O kwuru na ụlọikpe nyere ya ntaramaahụhụ kachasị ukwuu na-agbanyeghị na enwebeghị oge a mara ya ikpe maka ịda iwu n’oge gara aga.

    Ọ bụ n’abalị 12 Eprel 2024 ka ọkaikpe Abimbola Awogboro nke ụlọikpe ukwu etiti dị na Legọs nọọrọ tụọ Bobrisky mkpọrọ ọnwa isii maka ikweta na ya metọrọ akwụkwọ ego Naịjirịa bụ naịra.

  11. Naịjirịa eruola inwe uweijii stetti - Goodluck na Shettima, 'Naịjirịa etozubeghi' - IGP

    Naịjirịa bara n'ọgbọ ndị kwe na ndị ekweghi n'ọgbakọ iji kparịta maka atụmatụ inwe uweojii steeti a kpọrọ 'National dialogue on state policing' nke ụlọomeiwu nta kpokobara n'Abuja ụbọchị Mọnde.

    Ebe ụfọdụ ndị chịburula Naịjirịa kwụnyere ka Naịjirịa nwee ndị uweojii steeti, onyeisi ndị uweojii bụ Kayode Egbetokun gbara isi akwara kwuo na Naịjirịa etorubeghi nke ha ji adị njikere maka uweojii steeti.

    Onyeisiala Tinubu bụ onye malitere ọgbakọ ahụ kwuru ka onye ọbula tulee uru na ọghọm di n'akụkụ ọbụla onye kwụ ma kwuo na ọchịchị chọrọ ịgbanwe ọrụ uweojii na Naịjirịa.

    Etu ọ dị, ndị kwenyere ka e nwee uweojii na steeti gụnyere aka chịburu Naịjirịa bụ Goodluck Jonathan, onyeisi ụlọ omeiwu sineti bụ Godwill Akpabio, mịnịsta okwu ndị uweojii dị n'aka bụ Sinetọ Ibrahim Gaidam, Ọọnị nke Ife nakwa onye bụbụ bịshọp ụka Katọlik n'Abuja, John Cardinal Onaiyekan.

    N'akụkụ nke ya, onyeisi ndị uweojii nke otu onye osote ya bụ Ben Okolo kwuru na Naịjirịa etozubeghi inwe ndị uweojii e kesara ekesa.

    N'okwu ya; "ọ bụ nkwenwe ndị isi na ndị ndu ndị uweojii na Naịjirịa etozugbeghi inwe ndị uweojii icheiche".

    Cheta na atụmatụ iwu ikesa ndị uweojii Naịjirịa gafere agba agụmagụ nke abụọ dịka e kpokobara otu ga-eleba anya n'atumatụ ikewa uweojii.

  12. 'Anyị enyochawala onyonyo ebe ebe e megburu nwatakwụkwọ anyị' - Lead British International School

    Ndị isi ụlọakwụkwọ Lead British International School dị n'isis obodo Naịjirịa bụ Abuja etinyela ọnụ n'otu onyonyo na-ewu na soshal midịa na-egosi ebe nwata akwụkwọ ha na-ama nwantaakwụkwọ ibe ya ụra.

    Ọtụtụ ụdị onyonyo ndị ahụ gbara ma na-ewu na soshal midịa ebe otu onye na X akara ya bụ @moyeeeeeee tinyere onyonyo ndị ahụ ma kwuo na ya chọrọ ka ha wuo ewu maka na ya chọrọ ka e nyochaa mmegbu otu nwataakwụkwọ megburu nwaanyị ọzọ nọ na klaasị ya n'ụlọakakwụkwọ ahụ.

    N'ihi onyonyo ndị ahụ, ụlọakwụkwọ ahụ wepụtara akwụkwọ mgbasaozi ebe ha kwuru n'akara ha na Facebook katọọ omume mmegbu n'ụlọakwụkwọ ha ma kwuo na ha amalitela nyocha banyere ya bụ ihe mere.

    N'okwu ha, "Lead British International School, Abuja nọ na mwute gbasara okwu mmegbu pụtara na nsonso a ma anyị chọrọ ka ọha mara na anyị anaghị eledara okwu ahụ anya".

    Gịnị dị n'ime onyonyo ahụ?

    N'ime otu onyonyo ahụ, o gosiri ka otu nwatakwụkwọ nwaanyị na-ama nwataakwụkwọ nwaanyị ọzọ ụra na-ajụ ya, "onye gbawara m obi?".

    Onyonyo ọzọ gosikwara ka ụmụakwụkwọ abụọ ndị ọzọ na-amakwa nwata akwụkwọ nwaanyị ahụ ụra otu oge ebe otu nwataakwụkwọ nwoke nọ ya n'akụkụ na-ekwu "emebiri m mmekọrịta ya."

    Onye a na-amakwanụ ụra ekwughi ihe ọbụla ka a na-eti ya ihe, ọ nọ na-anara ụra.

    Onyonyo ndị ọzọ apụtakwala n'ịntanetị na-egosi mmegbu n'ụlọakwụkwọ ahụ mere ọtụtụ ndị mmadụ ji na-aba mba n'ịntanetị.

    Mana ụlọakwụkwọ ekwuola na ha ga-elebara ya anya, mee nyocha banyere ya, nyere ezinaụlọ nwata nwaanyị ahu aka ma lebara iwu ha megidere mmegbu anya.

    ha kwukwara ka onye ọbụla mara ihe banyere okwu ahụ kpọtụrụ ha.

  13. Eke kere igwe kee ụwa kenye gị ngọzị

    Ya gaziere gị taa ka ị na-eso anyị.

  14. Afrịka niile zụko n'Abuja maka ọgbakọ 'anti-terrorism summit'

    Ndị isi Afrịka ezukoola n'Abuja bụ isis obodo Naịjirịa maka ọgbakọ itinye anya na nsogbu iyi ndụ egwu.

    Abalị abụọ ga-eme ya bụ ọgbakọ megide iyi ndụ egwu n'Afịka.

    Onyeisiala Naịjiria bụ Bola Tinubu mepere ọgbakọ ahụ nke isiokwu ya bụ 'ịkwalite mmekọrịta n'etiti mba ndị Afrika na iwulite ngalaba ndị ga-achụ iyi ndụ egwu osọ'

    E kpokobara ọgbako ahụ iji kwalite agha a na-ebuso ndị na-eyi ndụ egwu na mba dị icheiche n'Afrịka site na mmekorịta ndịagha mba Afrịka, nakwa ibelata etu ngwagha na ego si mba ndị na-akwado ndị na-eyi ndụ egwu abata na mpaghara Afrịka.

    Nke a na-abịa ka ọtụtụ mba n'Afrịka na-agabiga ụdị nsogbu nchekwa dị icheiche n'aka ndị ji okpukperechi eyi ndụ egwu dịka ndị jihad, atụmadị na mpaghara Sahel.

    Ndị ndu si mpaghara Sahel nakwa ndị ọkachamara n'okwu nchekwa nakwa ụfọdụ ndị so na World Council bụ ndị ga-eso n'ọgbakọ ahụ.

  15. Ntuliaka ime ụlọ pati APC n'Ondo Steeti ga-agakwa n'ihu taa

    Gọvanọ Kogi steeti Usman Ododo onye bụ onyeisi kọmiti chikọbara ntụliaka imeụlọ nke pati All Progressives Congress (APC) n’Ondo Steeti, ekwuola na ntuliaka ga-aga n'ihu taa bụ21 Eprel, 2024.

    O kwuru na ntuliaka nke ga-amalite n’elekere 12 nke ehihie bụ maka na e meghi ntuliaka na wọọdụ 13 nke okpuruọchịchị Okitipupa n'ihi na ngwa ọrụ ntụliaka abịaghị n'oge.

    Ka ọ dị ugbua, ufọdụ ndị na-azọ ọkwa gọvanọ nke pati ahụ n’Ondo steeti ajụla ntuliaka praịmarị ahụ nke Usman Ododo bụ gọvanọ Kogi lekọtara.

    Pati ahụ nọrọ ụbọchị Satọdee 20 Eprel chikọba ntụliaka iji họpụta onye ga-eji ọkọlọtọ APC azọ ọkwa gọvanọ steeti ahụ n'abalị iri na isii nke ọnwa Nọvemba.

    Mgbe ha na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'Akure, isi obodo steeti ahụ, Gbenga Edema, Olusola Oké, Wale Akinterinwa na Dayo Faduyile na mmadụ anọ n'ime ndị na-azọ ọkwa ahụ, kpọrọ oku ka e yigharịa ntuliaka ahụ n'ihi na ọtụtụ aghụghọ dị na ya.

    N'okwu ha, ngalaba pati ahụ haziri ntuliaka ahụ gburu oge n’iwepụta akụrụngwa e ji eme ntuliaka ahụ. Ha kpọrọ oku ka a kagbuo ntụliaka ahụ ma megharịa ya.

  16. Ihe onyonyo gosiri na ogbunigwe Isreal tụrụ mebiri ihe n'ọdọụgbọelu Isfahan nke Iran

    Foto Satellite e wepụtara n'ime awa 24 gara aga gosipụtara ọtụtụ ihe ogbunigwe Isreal tụrụ n'ụtụtụ Fraịde n'ọdọụgbọelu Iran mebiri.

    Nnyocha BBC Verify mere ka anyị mara n'gbunigwe ahụ mebiri ngwaagha nchekwa abụọ n'ọdọụgbọelu dị n'Isfahan.

    Ndị ọrụ Amerịka kwuru na Isreal ekwubeghi ihe ọbụla banyere mwakpo ahụ - ma ọ bụ ha mere ya ma ọ bụghị ha, dịka esemokwu dị n'etiti mba abụọ ahụ na-abawanye.

    Kamgbe akụkọ banyere mwakpo ahụ mere n'ụbọchị Fraịde n'Isfahan, ebe a na-emepụta ngwaagha nuklia mba Iran, a na-aṅụ kepu kepu banyere oke mmebi mere ebe ahụ.

    Iran kwuru na mwakpo a gụnyere ngwaagha 'drones' ndị nchekwa ikuku gbaturu.

    Ọ bụ ezie na amabeghị ihe ngwaagha e jiri mee mwakpo ahụ, foto satelite achọpụtala ihe mmebi n'ọdọụgbọelu Iran.

    BBC Verify mere nnyocha a sete foto satellite ha nwetara ụbọchị Fraịde.

  17. Igbo ndị ọma daalụ nụ ooo!

    Anyị ji obi ọma na obi ụcha anabata unu n'ọgbakọ anyị n'ụtụtụ a.

    Buru oche gị bịa nọnyere anyị maka akụkọ ndị gbapụtara ihe.

  18. 'Etiokwe eriokwe' Tunde Onakoya azụọla okwe chess elekere 58 maka Guiness World Record

    Nwamadị a ma ama na-azụ okwe chess bụ Tunde Onakoya emechiela atụmatụ nwale ọ na-eme ịzụ okwe chess elekere 58 iji nweta ndekọ ọhụrụ Guiness World Record.

    Ọtụtụ ndị mmadụ gara ebe o mere nwale ahụ na Times Square dị na mba Amerịka ikele ya ma kụọrọ ya aka maka atụmatụ ahụ.

    Onakoya kwuru na nwale ahụ o mere bụ iji nweta ego ruru otu nde dọla maka ụmụaka ndị ọ na-enweghi ka ọ ha n'Afrịka inweta agụmakwụkwọ.

    O kwuru n'akara ya na soshal midịa n'abalị 17 ọnwa Eprel na ya ga-agbalị ịzụ okwe elekere 58 na-enweghi nke a gbara ya.

    Tunde nwere agba n'egwuregwu Chess na mpaghara Afrịka nakwa na mbaụwa.

  19. Amerịka akpọọla oku ka udo chịa ka akụkọ kwuru na Israel atụọla Iran ogbunigwe

    Kemgbe ndị Iran tụchara Izrel ogbunigwe na drọọnụ ọnụ ọgụgụ ya karịrị 300 na ụbọchị nke 13 na ọnwa Eprelụ, ndị Izrel fọrọ ntụtụ taa na ha ga atugwara ha. Iran tụrụ Izrel ogbunigwe ahụ maka ịwakpọ e be ndị nnochita anya ha dị na Syria bụ ebe ogbunigwe ndị Izrel gburu mmadụ 13 na ụbọchị nke mbụ na ọnwa Eprel.

    N'ịsị ụtụtụ taata bụ Fraide ka e nwetara ozi na ọ dịka ndị Izrel a tụrụ ogbunigwe na Iran.

    Ndị ọrụ gọọmentị abụọ gwara BBC na CBS News na Israel tụrụ Iran ogbunigwe.

    Ụlọọrụ mgbasaọzị ndị Iran kwuru na ogbunigwe dara n' ebe dị ịche-ịche na mpaghara Isfahan.

    Ma kwukwaa na ndị nchekwa Iran gbarịrị droonu atọ Ha kwuru na ogbunigwe ahụ emetuteghị ọgịge ndị agha ha na ebe ha na ọdụ nuklia ha. Ndị agha Israel na ogbo ha na Amerịka ekweghị ekwu ọkwụ maka ịhe a.

    E kwuru na anụrụ ụda ogbunigwe na akụkụ ọdụ ụgbọelụ Iran dị na Isfahan. Isfahan bụ mpaghara ọbọdọ dị na Iran e be e nwere ọtụtụ ọgịge ndị agha, ebe a na emepụta ngwa-agha mịzịị na kwa nuklia Ka ndị Israel na esị ọnwụ na ha ga atụgwara ndị Iran ogbunigwe, ọtụtụ ndị ịsịala na mba ụwa na adọ ha aka na ntị ka ha dajụọ.

  20. Ndị ụka 'Chosen' ise anwụọla n'ihe mberede okporoụzọ n'Imo steeti

    Ndị uweojii Imo steeti ekwuola na ọ bụ mmadụ ise ndị ụka 'Lord's Chosen Church' nwụrụ n'ihe mberede mere n'Owere n'ụtụtụ Fraide.

    Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na ihe mberede mere dịka nnukwu ụgbọala 'Lord's Chosen Church' bu ndị ụka ha aga ọgbakọ ozioma ọha na ụgbọalala na-ebu aja kụkọtara isi n'ebe Orogwe dị n'okporoụzọ awara awara si Owere gawa Ọnịcha ka ya bụ ọdachi kpọtụrụ.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojiii steeti ahụ bụ Henry Okoye, kwuru na mmadụ ise nwụrụ.

    O kwuru na e bugala ụlọọzu ma buga ndị merụrụ ahụ gụnyere ndị ọzọ merụrụ nnukwu ahụ n'ụlọọgwụ.

    Okoye sịrị, "Ọ bụ ihe mwute mere. Ndị otu anyị gara ebe ahụ inye aka gbapụta ndị mmaọ̄ụ."

    "Mmadụ ise anwụọla kpọmkpwem."

    "E bugawala ozu ha ụlọozu."

    "Ndị ọzọ merụrụ ahụ e bugala ha ụlọọgwụ."