Ihe anyị ma maka akụko nwoke etigburu n'Anambra steeti
Otu nwoke dị afọ ịrị ịsịị ka akụkọ kwuru na umunne ya na ndị nche ogbe tịburu na Nza Ozobulu, Anambra Steeti.
Akuko kwuru na nwoke ahu aka amabeghi aha ya nwere Tankị-Mmịrị dị na be ha ga ree nwere gboo mkpa nke mere ụmụnne ya jịrị nwere ndị nche ogbe nwuchie ya, tiwe ya ịhe.
Ka e tichara ya ịhe ka ọ wuru. Ka o sị dị ugbua, nwetebeghị aha nwoke ahu etigburu ma ọ bụ ndị tigburu ya. Ịhe ndị uweoji kwuru Na oge BBC Igbo kporo ndị uweoji gbasara akụkọ ahụ, Tochukwu Ikenga bụ ọnụ na ekwuru ndị uweoji na Anambra steeti kwuru na ha huru ịhe onyonyo ahụ na efeharị na ịntanentị.
Ikenga gara n’ ịrụ kwụọ na ndị uweoji ewetabaghị mkpesa gbasara ya, ma rịọ ndị ezinaulo ọ metutara ka ha mee mkpesa.
Na okwu ya “anyị ahụla ịhe onyonyo ahụ ebe a kwuru na umunne gburu nwanne ha na Anambra mana anyị enwetabeghị akụkọ nwereịsị banyere ya”.
“Anyị ezigarago ndị obodo e kwuru na mkpamkpa ahụ kpara mana enwebeghị onye pụtara kwuo na ya mara ndị mere ya na onye egburu”.
“Anyị jị ohere a nwere na agwa ndị ezinaulo ọ metutara ka ha puta ma kọwara ọhaneze ịhe mere”