Ulọọrụ ‘National
Bureau of Statistics’ (NBS) ekwuola na Ịrị elu nke ọnụ ngwaahịa Naịjirịa n’afọ
2024 agbagoola pasenti 33.2 n’ime ọnwa Maachị, dịka nke a gosiri na ngwaahịa
jiiri pasenti 1.5 rịa elu ọ bụrụ ma eji ya tụnyere nke ọnwa Febụwarị.
Ihe a bụ nke
kachasị elu Naịjirịa na-ahụta kemgbe ihe ruru afọ iri atọ.
Ịrị elu n’ọnụahịa
ihe oriri dịka achịcha, mmiri ara ehi, nri ndị gbara na mkpụrụ, akwa, anụ, akwụkwọ nri na nri ogbe bụ ya na-akpalite iri elu n’ọnụ ngwaahịa.
Ụgwọ ọkụ latrik na-arị elu sokwa akpalite ịrị elu nke ọnụ ngwaahịa dịka ọtụtụ mmadụ
na-emefu ọtụtụ ego iji kwalite usoro mmepụta ngwaahịa ha tinyere ịgbaara ngwaahịa
ha ụgbọ gburugburu Naịjirịa.
N’agbanyeghị
na akwụkwọ ego Naịra enwetatụla ume, ikike ya anaghị egosi n’ọnụ ngwaahịa.
Naịra
enwetala ume n’ebe Dọla nọ dịka o ruchara Naịra 1,825 maka otu Dọla n’ihe karịrị
otu ọnwa gara aga, bụ nke mere ka ogogo ịkụ afọ n’ala ya ruo ihe dịka pasenti
70.
Ọzọkwa, ụlọakụ
etiti Naịjirịa bụ ‘Central Bank of Nigeria’ (CBN) buliri ego mgbazinye ugboro
abụọ n’ime ọnwa abụọ gara aga iji belata ohere mmadụ nwere inweta ego ma belata
ọnụ ngwaahịa na-arị elu, mana enwebeghị uru ọbụla ahụtara n’ime ha.
Akụnaụba
kachasị baa ụbara na mba Afrịka na-agabiga ọnọdụ akụnaụba kachasị njọ na ndụ ya
bụ nke mere ka ọtụtụ mmadụ bụrụ ogbenye, mee ka ntọrọmmadụ kawanye njọ n’akụkụ
mba ahụ dị iche iche.
Na mbọ ya ịwepụ
ego eji ebelata ụgwọ ọkụ latrik ma kwalite nchekwa ego, gọọmenti nọọrọ n’izuụka
abụọ gara aga jiri ihe karịrị pasenti 300 bulie ụgwọ ọkụ latrik maka ụfọdụ ndị ji
ya eme ihe, dịka nke ahụ metụtara mkpataego ụmụ mmadụ.
Ọtụtụ ụmụafọ
Naịjirịa bụ ndị na-enweghịkwa ike ịzụtanwụ ihe mana gọọmenti kwenyere na atụmatụ
ndị a ga-enye aka mee ka ọnọdụ akụnaụba Naịjirịa kwụrụ n’ụkwụ ya ọzọ.
Ka ọ dị
ugbua, a na-agbanwerịta Naịra 1,140 maka otu Dọla.