You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ụlọakwụkwọ agaghị emepe na Kenya maka idemmiri

Akụkọ ndị kachasị gbapụta ihe n'ụwa n'ọnwa Eprelụ

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Ikechukwu Kalu, Uche Akolisa, Chimezie Ucheagbo

  1. A nwụchiela ndị Naịjirịa abụọ maka ọnwụ nwata n'Australia site n'iji ịntanetị anapụ ya ego

    E jidela mmadụ abụọ na Naịjirịa maka ebubo na ha nwara iji ụzọ mmekọrịta anụ ahụ anapụ nwa akwụkwọ nke Australia ihe nke butere ọnwụ ya.

    Ndị uweojii Australia kwuru na nwata ahụ kenyere foto ebe ọ gbọ ọtọ ma mmadụ n'ịntanetị tupu ha amalite iyi ya egwu wee na-ana ya ego.

    Mgbe e mere nnyocha, mmadụ abụọ ahụ kpara arụ a ga-aga n'ụlọikpe Naijiria.

    Ndị uweojii na-ekwu na iyi egwu mmekọahụ karịsịa nke ndị na-eto eto na-arị elu n'ụzọ dị egwu.

    Akụkọ banyere afọ nwata nwoke ahụ maọbụ ebe o bi na New South Wales (NSW) bu nke ana enwe pụtaghị maka nchekwa ezi n'ulo ya.

    Ndị uweojii New South Wales kọwara ndị a sị na ha na-eme ihe ike ahụ dịka "ụmụ okorobịa" ma kwuo na ha yiri nwa ahụ egwu si ya na ha ga izigara ndị enyi ya and ezinụlọ ya foto ahu ma ọ bụrụ na ọ kwụghị ha A$ 500 (£ 260; $ 330).

    Onyeisi ndị uweojii na-ahụ maka mpụ kọmputa, bụ́ Matthew Craft, kwụrụna ozi ndị ahụ na-awụ akpata oyi ma na enye nwata nwoke ahụ nsogbu ka ọ kwụọ ego ahụ", ka gwara akwụkwọ akụkọ bụ́ Sydney Morning Herald (SMH).

    Nwatakịrị nwoke ahụ gburu onwe ya n'otu uhuruchi ahụ, ná ngwụsị afọ gara aga.

    Ndị nchọpụta ihe mba Australia sooro ndị otu ọrụ ha na Saụt Afrịka na Nigeria rụkọọ ọrụ wee chọta ndị a na-enyo enyo na ha bụ ndị omekome a n'ógbè ndị ogbenye ebe ihe karịrị nde mmadụ 25 (25 Million) bi.

    SMH kwuru na Ihe akaebe enwetere na ekwentị ndi ahụ gosiri na ha gbara mbọ ịnapụ ndị ọzọ ego na-mbu. Ebubo e boro ha bụ ma ịpụnara nwata nwoke ahụ ego ya, ma ọ bụghị ọnwụ ya.

    Enweela ọtụtụ ikpe na mba Canada na Amerịka n'afọ na-adịbeghị anya maka ọtụtụ ndị na-eto eto gburu onwe ha banyere ihe dị etu a.

    Det Supt Craft kwuru na ha enwetela ọtụtụ ozi maka akparamaagwa a ma rịọ onye ọ bụla nwere ihe ọ hụrụ ka okpọtụrụ ndị uweojii.

  2. Igbo ndị ọma unu abọọla chi?

    Anyị ji ohere a anabata unu n'ọgbakọ anyị n'ụtụtụ taa.

    Biko buru oche gị bịa nọnyere anyị na BBC Igbo maka akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ụwa gbaa gburu gburu.

  3. London to Lagos: Pelumi Nubi agbala ụkwụ na Legọs

    Onye a ma ama n'ịntaneti ka Pelumi Nubi esila London mba Briten gbaa ụkwọ na Legọs ka o ji ụgbọala mee ya bụ njem.

    Pelumi nyara ụgbọala ihe ruru 10,000kilomita ma rute Legọs ụbọchị ụka bụ abalị 7 ọnwa Epureel. Ọtụtụ ụmụ Naịjirịa gbakọrọ na mahadum University of Legọs izute ya na ikele ya.

    Ọ malitere njem iji ụgbọala naanị ya si London gaa Legọs n'abalị 31 ọnwa Jenuwarị afọ 2024 gafee mba iri na asaa tupu o rute Naịjirịa.

    Pelumi jiri aka ya na soshal midịa na-egosipụta ihe niile gbasara njem ahụ. N'abalị 25 ọnwa Maachị o gosiri na ya dabara n'ihe mberede okporụzọ na Laịberịa.

    Ihe mberede ahụ mere na o ruteghi oge o kesiri irute dịka o mebiri ụgbọala ya. Pelumi meruru ahụ mana ọ gbakela were tinyekwa isi n'okporo ụzọ ọzọkwa.

    Pelumi kwuru na njem ahụ bụ iji gosi na ọ bụ ihe pụrụ ime nakwa iji gbaa ndị na-etolite etolite ume na ha ga-emeli ihe ọbụla ha tinyere uchu ha.

    O kwukwara na ọ bụ ụzọ ya ji akwalite ụmụnwaanyị ibe ya ịrọ nrọ ma mee ihe ọbụla ha chọrọ ime.

    Ọtụtụ ndị mmadụ pụtara ịnabata Pelumi bụ onye merela njem gaa ihe ruru mba iri asatọ n'ụwa.

  4. Israel-Gaza: Ọgbatahie nye udo kemgbe ọnwa isi agha dara

    Ka ọnwa isi ndị aghannupuisi wakporo Izrel, agha, óría, agụụ na ọnwụ na-awa ndí Palestine nọ na Gaza agba.

    Izrel kewara ekewa dịka Praim Minista na-agbalị imezu ngwa ya inye ha mmeri kpọkwem.

    Mba Amerịka bụ ezigbo enyi mba Izrel agbakụtala ha azụ nihi etu ha si ebu agha ahụ.

    Iran nụrụ iyi ịbọ Izrel ọbọ maka ogbugbu e gburu otu onyeisiagha Iran na mba Syria dịka nsogbu na-ada n'etiti Izrel na ndịagha nnupuisi Hezboiollah na Lebanon, nke e chere ga-eme ka enwe agha na mba ndị dị na 'Middle East'.

    Ngụkọ gosiri mkpamkpa kpara n'ọnwa Isii a gara aga: e gburu ndị Gaza karịrị 33,000, ọtụtụ nime ha bụ ndị nkịtị, dịka Ministry ahụịke ha si kwuo. Dịka otu 'Save the Children' si kwuo, ụmụaka Palestine 13,800 bụ ihe e gburu, ebe ihe karịrị 12,009 merụụ ahụ.

    Otu Unicef kwuru na e bepụrụ o pekata mpe, ụmụaka 1,000 otu ụkwụ maọbnbụ ụkwụ abụọ.

    Ihe karịrị ndị Izrel 1,200, ọtụtụ n'ime ha ndị nkịtị bụ ndị Hamas gburu oge ha wakporo ebe ha na-eme emume egwu n'abalị asaa nke ọnwa Oktoba afọ 2023. kpụrụ ha gaa Gaza dịka ndị e ji eji.

    Izrel kwuru na mmadụ 130 bụ ndị a ka ji eji ma kwuo na o pekata mpe, mmadụ 34 n'ime ha anwụọla.

    Ozi otu United Nation wepụtara n'ọnwa Maach kwuru na o nwere ozi were anya na e dinara ụfọdụ ndị e ji eji n'ike ma taa ha nnukwu ahụhụ.

    Ozi ahụ kwukwara na e nwere ihe gosiri na mmekpahụ megide ndị e ji eji ka na-aga n'ihu.

    Kibbutz Nir Oz bụ ebe mwakpo ahụ mere n'abalị asaa nke ọnwa Oktoba dị n'agbara Izrel na Gaza.

    Ndị Hamas bekasịrị ngwuru igwe(wire)wakpoo ebe ahụ n'ụzọ ụtụtụ. Ka ndịagha Izrel rutere ebe ah ụ n'ehihie, otu oke n'ime oke anọ mmadụ 400 aghọọla ndị Hamas gburu maọbụ tọrọ.

    Ron Bahat kpọgharịrị Jeremy Bowen,onye ntaakụkọ BBC ebe ihe mere.

    Nwoke ahụ dị agbata afọ 50 toro na Nir Oz.

    Ọ bụ isi oma na ike ọkpọ aka ka Ron na ezinaụlọ ya si nafere dịka ha ji aka kwachite ọnụụzọ ebe mgbaba ha oge ndị Hamas biara.

    Ron tụrụ aka n'ụlọ ndị enyi na ndị agbataobi ya bụ ndị egburu maọbụ ndị a tọọrọ kpọga Gaza.

    N'otu ụlọ dakpọrọ adakpọ, ikpo akwa ụmụaka ọkụ agbaghị kposa, mana ezinaụlọ ahụ anapụtaghị n'ọkụ ahụ.

    Otu ihe ọ prụiche bụ na Nir Oz so na mpaghara ndị kwadoro ka Izrel na Palestine kpee udo.

    Mana ọnwa isii Hamas banyere Nir Oz, Ron ekwenyeghịkwa na nke a ọzọ. "Lee anya, ọ dị m ka e nwee onye ndu ga-eweta ọganihu ebe ahụ, maka n'ikpeazụ, ihe anyị chọrọ udo.

    "Mana onye ọbụla na-akwado Hamas bụ onye iro.

    "Ngwa ngwa, ha hapụrụ ngwagha ha, agha ga-akwụsị."

    "Mgbe ọbụla Izrel hapurụ ngwagha, anyị ga-ekpochapụ. Ya bụ ihe ndịiche dị na ya."

  5. Ndeewonu!

    Ndeewonu, Igbo ndị ọma.

    Sonye anyị maka akụkọ ndị mkpa taa.

  6. Gọọmentị ekwuola na ha ga-ewepụta kaadị njirimaara (NIN) ọhụrụ

    Gọọmentị etiti ekwuola na ha ga-ewepụta akwụkwọ njirimaara ụmụafọ Naịjirịa ọhụrụ a kpọrọ National Identity Card nkem ga-enye ohere ka ha jiri na-azụ ahịa maọbụ na-akwụ ụgwọ n’ịntaneti.

    Akwụkwọ njirimaara nke ụlọọrụ National Identity Management Commission na ụlọakụ etiti tinyere ụlọọrụ na-ahụ iji ịntanetị etinye ego gbakọtara aka mepụta.

    Onyeisi ngalaba ọrụ nke NIMC bụ Kayode Adegoke wepụtara ozi ahụ na Fraịde.

    Ụlọọrụ NIMC kwuru na kaadị njirimaara ọhụrụ ga-arụ ọrụ ndị ọzọ gụnyere iji ya inwete enyemaka site n’aka ụlọorụ gọọmentị nakwa nke ndị mmadụ nwe.

    Ha kwuru na ọ ga-eme ka ụmụafọ Naịjirịa niile soro n’ihe a na-eme ma a bịa n’okwu akụnaụba, inyere ha aka nakwa ịhụ maka mwulite obodo.

    Ha kwuru na ọ bụ naanị ezi ụmụafọ Naịjirịa ndị nwere akara njirimaara NIN ka e nwe ohere itinye akwụkwọ maka inwete nke ọhụrụ.

    Ụlọọrụ NIMC gara n’ihu kwuo na mmadụ nwereike iji kaadị ọhụrụ a adọrọ ego n’ọbaego ya maọbụ were ya kwụọ ụgwọ ihe ọ zụrụ n’ịntanetị.

    Ha kwuru na ebe a ga-etinye akwụkwọ inwete kaadị ọhụrụ a ga-abụ n’ịntanetị, ụlọakụ dị iche iche nakwa ndị ọrụ ha ga-ehiwe n’ebe dị iche iche na Naịjirịa.

  7. Nnamdi Kanu agwala ụlọikpe ka o weghachị ikike ahụ nyere ya nwereonwe n'afọ 2017

    Onyendu otu Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ Nnmadi Kanu e ji eji ugbua agwala ụlọikpe ukwu dị n’Abuja ka o nyeghachị ya ikike inwere onwe ya bụ nke o wepuru n’afọ 2017.

    S’ite n’akwụkwọ ọkaiwu ya bụ Alloy Ejimakor gbara, Kanu gwara ụlọikpe ka ọ kagbuo mkpebi ahụ sịrị ka a anwụchigharị a ya.

    Ọkaiwu ya kwuru na e boro Kanu ebubo ịgbasọ nke a kpọro ‘jump bail’ ma kwuo na Kanu gbapụrụ na Naịjirịa mgbe ndị ọrụ nchekwa wakporo ma chọrọ igbu ya n’ụlọ ya dị n’Abia Steeti.

    Nwanne Kanu bụ Emmanuel gosiri akwụkwọ akaebe iji kwadoo mkpesa ahụ ọkaiwu ya gbara sị ka a tọhapụ nwanne ya.

    Cheta na ụlọikpe tọhapụrụ Kanu n’afọ 2017 n’ebubo ibuagha megide ọchịchị Naịjirịa nke gọọmentị etiti boro ya.

    Mana ụlọikpe a mechara kagbuo ntọhapụ ahụ ma nye iwu ka a nwụchie ya maka na ọ pụtaghị n’ụlọikpe. E mechara nwuchie Kanu ọzọ na mba Kenya n’afọ 2021.

  8. EFCC atụkwasịla ebubo 26 ọhụrụ n’isi Godwin Emefiela

    Ụlọorụ na-ebuagha megide mpụ na nrụrụaka ego bụ Economic and Financial Crime Commission (EFCC) atụkwasịla ebubo ọhụrụ dị iri abụọ na isii n’isi Godwin Emefiele bụbu onyeisi ụlọakụ etiti nke Naịjirịa.

    A ga-akpụpụ Emefiele n’ụlọikpe na Mọnde 8 Eprel, 2024 n’ihu ọkaikpe Rahman Oshodi nke ụlọikpe ukwu dị n’Ikeja Lagọs maka ebubo gụnyere ịnara ego ngarị, ịnara onyinye, akwụkwọ nwete akụnaụba na ihe ndị ọzo bụ nke megidere iwu ‘Corruption Practices’ nke Naịjirịa.

  9. Ndị uweojii ekposaala ndị Shiite na Kaduna

    E nwere ọgbaaghara na Kadụna Steeti mgbe ndị uweojii gbara mbọ ikposa ndị otu Islamic Movement of Nigeria nke onye ndu ya bụ Sheikh Ibrahim Elzakzaky n’oge ha na-azọ njem nkwado nye mba Palestine.

    Ọ bụ ọdịnaala na n’ụbọchị Fraịde ikpeazụ n’ime ọnwa Ramadan, ndị okpukperechi Muslim na-azọ njem ahịrị iji gosi nkwado ha nye ụmụafọ Palestine n’ihi ‘omume ọjọọ’ Israel na-emeso ha.

    Ndị otu Islamic Movement of Nigeria zukọrọ n’ahịa ‘Katsina Market’ dị n’okporoụzọ Ahmadu Bello Way tupu ndị uweojii agbaa mbọ ikposa ha.

    Ọnọdụ ahụ butere ụjọ n’ebe ndị bi n’obodo ahụ nọ tụmadị ndị nwere ụlọahịa n’okporoụzọ ahụ.

    Akụkọ kwuru na ọtụtụ ndị na-atụ mgbereahịa mechiri ụlọahịa ha iji zeghara ihe nwere ike ịdapụta.

    Ndị uweojii Kaduna kwuru na njem ahịrị ndị otu Shiite haziri n’ụbọchị taa adabaghị n’iwu.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Steeti ahụ bụ Mansir Hassan gwara ụlọọrụ Channels TV na ndị otu Shiite pụtara n’ụtụtụ taa “buru ngwaọgụ ma malite ịwakpo ụmụ mmadụ aka ha dị ọcha n’ụdị na ha na-azọ njem ahịrị.”

    Mansir kwuru na “ndị otu ahụ wakporo ndị uweojii n’oge ha gbara mbọ ikposa ha” dịka o kwukwara na ha merụrụ ụfọdụ ndị uweojii ahụ.

    Ọ sịrị na anwụchiela ụfọdụ n’ime ha a na-enyo enyo na ha nwere ngwaọgụ dị njọ dịka a ga-akpọpụ ha n’ụlọikpe n’oge nnyocha kụụrụ ọnụ.

    Mana ka osiladị, ndị otu Sheikh Zakzaky gọrọ aka na ụkwụ ha ma kwuo na ọ bụ ndị uweojii wakporo ha, nke ebumnobi ya bụ igbochị ha ịzọ njem ahịrị.

    Nke a bụ nke mbụ ya ndị otu Shiite na-ahazi njem ahịrị na-agbanyeghị mmachibido gọọmenti etiti machibidoro ha n’okpuru ọchịchị Muhammadu Buhari.

  10. Alaọmajijiji ogogo ya dị 4.8 akpọtụọla na New York

    Alaọmajijiji ogogo ya dị 4.7 emeela na New York nke mba Amerịka.

    Njinji ahụ jiri mgbe o jiiri nkeji iri abụọ gaa elekere ise nke mgbede ụbọchị Fraịde 5 Eprel 2024.

    Dịka ụlọọrụ US Geological Survey siri kwuo, e nwere mmetụta alaọmajijiji ahụ n’ọtụtụ obodo ndị a maara aha ha, ndị gụnyere Boston, New York na Philadelphia.

    Cheta na ọ bụ mkpụrụ ụbọchị abụọ gara aga ka a nọọrọ nwee alaọmajijiji na mba Taịwan.

  11. Ivory Coast amachiela ndị arịrịọ n’Abidjan

    Ndị ọchịchị Abidjan nke mba Aịvrị Kost amaala ọkwa na amachiela ịrịọ arịrịọ n’obodo ahụ iji buo agha megide emeghị ihe n’usoro n’obodo ndị mepere emepe.

    Osote gọvanọ obodo ahụ bụ Vincent N’cho Kouaoh kwuru na amachiela ụdị arịrịọ dị iche iche iji kwalite ọnọdụ obibi ndụ ụmụ mmadụ, wulite nchekwa ha ma kwalite usoro ime njem.

    N’afọ 2013, mịnịstrị na-ahụ maka ihe na-eme na mba Aịvrị Kost machiri ịrịọ arịrịọ n’okporoụzọ dị iche iche mana ha gbara ọnyụpa ibelata ya bụ akparamaagwa.

    Mbọ agbakwara n’ụfọdụ obodo ndị enwere na mba Afrịka sikwara etu ahụ kụọ afọ n’ala.

    E kwupụtara machibido ịrịọ arịrịọ nke ugbua dịka akwaturu ọtụtụ mkpọmkpọ ụlọ ndị arụnyere n’obodo Abidjan.

    Isi obodo Aịvrị Kost bụ otu n’ime obodo ndị kachasị nwee mfachi okporoụzọ na mba Afrịka dịka ọnụọgụ mmadụ bi n’ime ya ruru nde isii.

  12. A maala Bobrisky ikpe maka ịmetọ akwụkwọ ego naịra

    Okaikpe Abimbola Awogboro nke ụlọikpe ukwu dị na legọs amalaa Idris Olanrewaju Okuneye e ji Bobrisky maara ikpe na o metọrọ akwụkwọ ego naira.

    Ọkaikpe a nyere iwu ka a kpọchie ya n'ụlọnga EFCC ruo ụbọchị 9 ọnwa Eprel bu mgbe ọ ga-ekwupụta ntaramahụhụ ya.

    Tupu a maa ya ikpe, Bobrisky rịọrọ ụlọikpe ahụ arịrịọ na ọ maghị maka iwu gbasara mmetọ akwụkwọ ego naira.

    Ọ rịọrọ ka ụlọikpe ahụ gbaghara ya maa kwee nkwa na ọ ga-eme ka ndị mmadụ mara na ọ dịghị mma imetọ akwụkwọ ego naịra.

    Site n’ikpe a a maara ya, Bobrisky nwereike ịnọ ọnwa isii n'ụlọmkpọrọ, maọbụ ọ kwụọ ego dị puku naịra iri ise (N50,000) maọbụ mee ha abụọ.

  13. Ndị ojiegbe awakpoola Kogi Steeti, gbuo mmadụ 19

    Ndị ojiegbe amaghị ndị ha bụ awakpoola obodo Agojeju Odo dị n’okpuruọchịchị Omala nke Kogi Steeti gbuo mmadụ 19 ma mụnye ọtụtụ ụlọ ọkụ.

    Ọ bụ ndị uweojii Kogi Steeti kwupụtara nke a n’ụbọchị Fraịde 5 Eprel 2024 n’otu ozi sitere n’aka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Steeti ahụ bụ William Aya.

    Aya sịrị na ndị ojiegbe ahụ amaghị ndị ha bụ mere mwakpo ahụ n’ụbọchị Tọzde 4 Eprel 2024.

    Dịka Aya siri kwuo, onye uweojii na-elekọta okpuruọchịchị Omala gwara ya na mmadụ 19 nwụrụ n’oge mwakpo ahụ ebe ụfọdụ ndị ọzọ nwetara ihe mmerụahụ.

    O kwuru na kọmịshọna ndị uweojii Kogi Steeti bụ Bethrand Onuoha ezipụla ndị uweojii gaa n’obodo ndị ahụ e mere mwakpo ma kwee nkwa na a ga-anwụchirịịrị ndị omekoome kpara arụ ahụ.

  14. Bobrisky kwetara na ọ dara iwu n'ụfọdụ ebubo EFCC boro ya

    Idris Olanrewaju Okuneye e ji Bobrisky maara ekwetala na ọ dara iwu n'ebubo anọ ụlọọrụ EFCC boro ya nke metụtara ife ego n'ọha.

    Mgbe ọkaikpe Abimbola Awogboro gụchara ebubo ahụ, Bobrisky kwuru na ọ bụ eziokwu na ọ dara iwu n'ebubo anọ ahụ metụtara mmetọ akwụkwọ ego Naira.

    Tupu a gụpụtachaa ebubo isii ndị EFCC boro, Suleiman Suleiman bụ ọkaiwu EFCC rịọrọ ụlọikpe ahụ ka e wepu ebubo nke ise na isii bu ebubo ịtụ mgbere ego.

    Ọkaikpe Abimbola Awogboro mechara wepụ ebubo ise na isii ahụ.

  15. Bobrisky awụchiela n’ụlọikpe maka ebubo ịtụ mgbere nakwa ịmetọ ego Naịjirịa

    Olanrewaju Okuneye e ji Bobrisky maara awụchiela n’ụlọikpe ukwu dị na Legọs iji zara ọnụ ya n’ebubo ụlọọrụ na-ebuagha megide mpụ bụ Economic and Financial Crime Commision (EFCC) boro ya.

    Nwamadị a rutere n’ụlọikpe n’ihe dịka elekere itoolu nke ụtụtụ dịka ndị ụlọọrụ EFCC bụ ndị nwuchiri ya na Tọzde bu ya ya n’ụgbọala.

    A na-atụ anya na ọ bụ ọkaikpe Abimbola Awogboro ga-anọ n’isi ikpe Bobrisky na ụlọọrụ EFCC.

    Ụlọọrụ EFCC boro Bobrisky ọnụ ebubo isii nke gbagidere ụkwụ na ịtụ mgbere ego nakwa imetọsị akwụkwọ ego naịra site n’ifesasị ya.

    Ọkaiwu EFCC bụ Rotimi Oyedepo na ọkaiwu mmadụ asaa ọzọ boro ebubo na o fere ego dị puku narị naịra anọ mgbe ọ gara emume n’ebe a kpọrọ IMAX Circle Mall, Lekki.

    Ha kwukwara na o fere ego dị puku naịra iri ise ma fekwaa puku naịra isi abụọ ugboro abụọ mgbe ọ gara emume na Ikeja nakwa Oniru.

    Ha bokwara ebubo iji ụlọọrụ o mepere n’afọ 2021 ọ kpọrọ ‘Bob Express’ bụ nke a kwụnyere ego dị N127.7m nakwa N53m bụ nke ọ jụrụ ịkọwa etu ego ndị ahụ siri ruo ya aka.

    Ndị EFCC kwuru na agwa ndị dị etu a dara iwu ndị na-achị Naịjirịa ma a bịa n’okwu ego.

  16. Otu mmadụ anwụọla, ọtụtụ ndị ọzọ emerụọ ahụ n’ihi oke ifufe fere na Nasarawa

    Oke ifufe fere na Nasarawa Steeti egbuola otu onye, merụọ mmadụ 15 ahụ ma bibie ụlọ na ngwongwo karịrị 800.

    Ọ bụ n’ụbọchị Sọnde ka oke ifufe ahụ malitere dịka ọ kpara mkpamkpa dị egwu n’okpuru ọchịchị Awe, Doma, Keana na Keffi nke Nasarawa Steeti.

    Akụkọ kwuru na ifufe ahụ bibiri ọtụtụ ngwongwo ndị mmadụ na nke ọhanaeze, ndị gụnyere ụlọakwụkwọ, ụlọokpukperechi, ụlọ anụmanụ nakwa osisi poolu latrik.

    Oke ifufe ahụ na mmiri ozuzo ya na ya so bibikwara ụlọ ndị mmadụ, ụlọahịa na okporoụzọ ma kwatuo ọtụtụ osisi.

  17. E mepeela akwammiri Third mainland nye ndị ọkwọ ụgbọala

    Gọvanọ Babajide Sanwo-Olu nke Legọs steeti ekwupụtala mmepe ụzọ akwammiri Third Mainland n'ụbọchị Tọzde abalị anọ ọnwa Eprel 2024, ka a rụzichaara ya.

    N'ozi o wepụtara n'akara soshal midia X, Gọvanọ Sanwo-Olu kelere Onyeisiala Bola Tinubu na minista na-ahụ maka ọrụ bụ David Umahi maka ezi ọrụ ha rụrụ ma too ndị mmadụ maka ndidi ha nwere n'oge a na-arụzi akwammiri ahụ.

    Ọ gara n'ihu kelee ministri na-ahụ maka ọrụ na Legọs steeti maka mbọ ha gbara iji hụụ na e nweghi mkpachi ọbụla n'okporoụzọ oge ọrụ na-aga n'ihu.

    Gọọmenti Legọs mara ọkwa mmechi akwammiri Third Mainland n'ụbọchị Tuzdee, 9 Jenuwarị 2024 maka ọrụ ndozi.

    Lekwa ihe ọzọ ị kwesịrị ịma maka Akwa mmiri Third Mainland

    Ọrụ bidoro na nkeji nke mbụ akwammiri Third Mainland n'etiti afọ 1976 ruo 1980 ebe nke abụọ malitere n'afọ 1988 ruo afọ 1990.

    Ogologo akwammiri a di kilomita 11.8.

    O bụ akwammiri nke abụọ kachasị ukwuu na mba Afrịka,

    Na nso nso a, e mechiela akwammiri a ugboro ugboro maka ọrụ ndozi.

  18. Agbagbuola ọgbaabọọlụ mba South Africa bụ Luke Fleur

    Agbagbuola otu onye ọgbaabọọlụ na mba Saụt Afrịka bụ Luke Fleurs n’oge ndị ohi gara izu ụgbọala ya.

    Dịka ndị uweojii siri kwuo, ọ bụ n’ụbọchị Wenezde 3 Eprel 2024 ka agbagburu Fleurs n’otu ọdụ mmanụ ụgbọala dị na Johannesburg.

    Nwaamadị ahụ na-agbara otu egwu bọọlụ Kaizer Chiefs bụ onye na-eche ka agbanyere ya mmanụ ụgbọala tupu ndị ojiegbe awụchaa ma nye ya iwu ka ọ pụta n’ụgbọala ya.

    Akụkọ kwuru na otu n’ime ndị omekoome ahụ buuru ụgbọala Fleur rie mbọmbọ n’oge ha gbagbuchara ya.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Gauteng bụ Mavela Masondo gwara ndị ntaakụkọ na “ndị omekoome ahụ tụwara Fleurs egbe, kpọpụta ya n’ụgbọala ya ma gbaa ya egbe na mpaghara obi ya.”

    Otu egwu bọọlụ nwaamadị ahụ gbara afọ 24 bụ Kaizer Chiefs akọwaala ọnwụ ya dịka “nnukwu ihe mwute.”

    Ha kwuru na ndị uweojii na-elebara okwu ahụ anya dịkwa ka ha ga-ewepụta ozi rijuru afọ na mgbe oge ya ruru.

    Minista egwuruegwu bụ Zizi Kodwa kwuru na “obi adịghị ya mma na a tụfuru ndụ mmadụ ọzọ n’ihi ọnọdụ tigbuo zọgbuo.”

    Fleurs sonyere otu egwu bọọlụ Kaizer Chiefs n’afọ gara aga dịka ọ gbachaara SuperSport United.

  19. Anwụchiela mmadụ itoli maka igbu ndị uweojii na Delta Steeti

    Ndị uweojii Naịjirịa anwụchiela mmadụ itoli a na-enyo enyo aka ha dị n’ogbugbu ndị uweojii n’Ughelli nke Delta Steeti.

    Onyeisi ndị uweojii Naịjirịa bụ Kayode Egbetokun kpuhere nke a n’ụbọchị Tọzde 4 Eprel 2024 n’oge ndị isi n’ụlọọrụ ndị uweojii nwere nzukọ.

    O kwuru na mmadụ ndị anwụchiri nọ ugbua na-enye ndị uweojii ozi ndị bara uru, nke ga-enye aka n’inwuchi ndị nke ọzọ aka ha dị n’okwu ahụ.

    E gburu ndị uweojii mmadụ isii n’okeọhịa Ohoro, n’okpuru ọchịchị Ughelli Nọrth nke Delta Steeti n’abalị 23 Febụwarị, 2024.

    Nke a mere dịka ọ gasịrị mkpụrụ ụbọchị ole na ole e gburu ndịagha n’otu Steeti ahụ.

  20. Nwoke mbụ natara akụrụ ezi ahapụla ụloogwụ

    Ụlọọgwụ agwala nwoke mbụ nwetara akụrụ si n'ezi ka o laba.

    Nwoke ahụ bụ Richard "Rick" Slayman gbara afọ 62 nọrọ n'uloọgwụ Massachusetts General Hospital (MGH) izu ụka abụọ ka ka ịwa ahụ ya gara nke ọma.

    Nnwale e meburu na mbụ iji buhgarịa akụru sitere na ezi nye mmadụ kpụrụ afọ n'ala. Mana ọganihu nke usoro a ka ndị ọkammụta sayensị na-eto dịka ihe ịrịbaama n'ihe gbasara mbughari akụkụ ahụ.

    Ụlọogwu MGH bụ ụlọọgwụ nkuzi kacha elu na Harvard Medical School na obodo Boston dị na mba Amerịka, kesara ozi a na nkwupụta mgbasa ozi ha ụbọchị Wednesde.

    N'ozi ahụ, ụlọọgwụ ahụ kwuru na Richard "Rick" Slayman nke Weymouth, Massachusetts, na-arịa oria akụrụ kemgbe ma chọọ ka a gbanwee ya.

    Ndị dọkịta ya gbanwere akụrụ ezi n'ime ahụ ya n'ime oge ịwa ahụ were awa anọ n'ụbọchị Maachị 16.

    Ha kwuru na akụrụ Maazị Slayman na-arụ ọrụ nke ọma na ọ nọkwaghị na dialysis.

    Na nkwupụta ya, Maazị Slayman kwuru na obi di ya ụtọ nke ukwuu n'ihi mgbanwe akụrụ ahụ.

    N'okwu ya "Obi dị m ụtọ ịmaliteghachi iso ezinụlọ m, ndị enyi m, na ndị m hụrụ n'anya na-anọrị n'ihi ọrịa dialysis nke metụtaworo ndụ m ruo ọtụtụ afọ."

    Akụkọ kwuru na o nwetara akụrụ mmadụ site n'aka onye nyere onyinye nwụrụ anwụ, n'afọ 2018, mana ọ malitere kwụsị iru ọrụ nke mere ka ndị dọkịta wete echiche nke inye ya akụrụ ezì. Akụrụ ezì ọhụrụ ọ natara bụ Ụlọogwu Cambridge bụ eGenesis mezigharịrị ya ka ọ dị mma itinye na ahụ mmadụ.

    Akụrụ ezi ọhụrụ ọ natara bụ Ụlọogwu Cambridge bụ eGenesis mezigharịrị ya ka ọ dị mma itinye na ahụ mmadụ