A nwụchiela ndị Naịjirịa abụọ maka ọnwụ nwata n'Australia site n'iji ịntanetị anapụ ya ego
E jidela mmadụ abụọ na Naịjirịa maka ebubo na ha nwara iji ụzọ mmekọrịta anụ ahụ anapụ nwa akwụkwọ nke Australia ihe nke butere ọnwụ ya.
Ndị uweojii Australia kwuru na nwata ahụ kenyere foto ebe ọ gbọ ọtọ ma mmadụ n'ịntanetị tupu ha amalite iyi ya egwu wee na-ana ya ego.
Mgbe e mere nnyocha, mmadụ abụọ ahụ kpara arụ a ga-aga n'ụlọikpe Naijiria.
Ndị uweojii na-ekwu na iyi egwu mmekọahụ karịsịa nke ndị na-eto eto na-arị elu n'ụzọ dị egwu.
Akụkọ banyere afọ nwata nwoke ahụ maọbụ ebe o bi na New South Wales (NSW) bu nke ana enwe pụtaghị maka nchekwa ezi n'ulo ya.
Ndị uweojii New South Wales kọwara ndị a sị na ha na-eme ihe ike ahụ dịka "ụmụ okorobịa" ma kwuo na ha yiri nwa ahụ egwu si ya na ha ga izigara ndị enyi ya and ezinụlọ ya foto ahu ma ọ bụrụ na ọ kwụghị ha A$ 500 (£ 260; $ 330).
Onyeisi ndị uweojii na-ahụ maka mpụ kọmputa, bụ́ Matthew Craft, kwụrụna ozi ndị ahụ na-awụ akpata oyi ma na enye nwata nwoke ahụ nsogbu ka ọ kwụọ ego ahụ", ka gwara akwụkwọ akụkọ bụ́ Sydney Morning Herald (SMH).
Nwatakịrị nwoke ahụ gburu onwe ya n'otu uhuruchi ahụ, ná ngwụsị afọ gara aga.
Ndị nchọpụta ihe mba Australia sooro ndị otu ọrụ ha na Saụt Afrịka na Nigeria rụkọọ ọrụ wee chọta ndị a na-enyo enyo na ha bụ ndị omekome a n'ógbè ndị ogbenye ebe ihe karịrị nde mmadụ 25 (25 Million) bi.
SMH kwuru na Ihe akaebe enwetere na ekwentị ndi ahụ gosiri na ha gbara mbọ ịnapụ ndị ọzọ ego na-mbu. Ebubo e boro ha bụ ma ịpụnara nwata nwoke ahụ ego ya, ma ọ bụghị ọnwụ ya.
Enweela ọtụtụ ikpe na mba Canada na Amerịka n'afọ na-adịbeghị anya maka ọtụtụ ndị na-eto eto gburu onwe ha banyere ihe dị etu a.
Det Supt Craft kwuru na ha enwetela ọtụtụ ozi maka akparamaagwa a ma rịọ onye ọ bụla nwere ihe ọ hụrụ ka okpọtụrụ ndị uweojii.