You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ụlọakwụkwọ agaghị emepe na Kenya maka idemmiri

Akụkọ ndị kachasị gbapụta ihe n'ụwa n'ọnwa Eprelụ

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Ikechukwu Kalu, Uche Akolisa, Chimezie Ucheagbo

  1. Moderna akwụsịla atụmatụ iwube ụlọọrụ mmepụta ọgwụ mgbochi Covid na Kenya

    Ụlọọrụ na-emepụta ọgwụ mgbochi coronavirus bụ Moderna akwụsịtụla atụmatụ iwube ụlọọrụ ya na Kenya.

    O nweburu atụmatụ ịmalite nkesa ọgwụ mgbochi Covid-19 na mba Afrịka n’ime afọ 2023 mana ugbua, Moderna na-ekwu na enwebeghị mba ọbụla dị n’ime Afrịka kpọrọla oku maka ọgwụ mgbochi kemgbe afọ 2022.

    Ụlọorụ ahụ kwuru na enweela nnukwu ịda mba banyere etu ndị mmadụ ji achọ ọgwụ mgbochi Covid-19 bụ nke mere o jiri nwee mkpebi ibelata ọnụọgụ ụlọọrụ ya iji belata oke mmefu.

    Moderna na-emefu ihe dịka $4.5 (£3.6) n’ime afọ a maka nchọcha na mmepụta ọgwụ mgbochi ndị ọhụrụ tinyere ọgwụ mgbochi maka HIV na ọrịa nriba ‘cancer’.

    Ezigbo uru dị n’ọgwụgwọ ọrịa ‘cancer’ bụ nke gụnyere ọtụtụ ọnụọgwụ maka onye ọrịa ọbụla karịa ọgwụ mgbochi coronavirus.

  2. Etu 'unknown gunmen' si gbuo onye uweojii, gbaa ụgbọala ha ọkụ n'Ebonyi

    Ndị uweojii Ebonyi steeti ekwuola na ha na-ama imi n'ala nchọta ma nwuchie ndị omekome gbagburu onye otu ha na steeti ahụ ụbọchị na nsonso a.

    N'ụtụtụ ụbọchị Tozde, ndị omekome bu egbe a mabeghị ndị ha bu wakporo ndị uweojii nọ ọrụ n' Ishieke Junction' dị n'Abakaliki, Ebonyi steeti, gbuo otu onye uweojii ma gbaa ụgbọala ha ọkụ.

    Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na ndị omekataraihedaụjọ ahụ bu ụgbọala Siena na-acha ntụ ntụ wakporo ndị uweojii n'ebe Elekere asaa nke ụtụtụ.

    Ọnụ na-ekwuru ndịuweojii steeti ahụ bụ Joshua Ukandu, onye kwuru na ya bụ ọdachi mere n'ezie kọwara na, "Ndị omekome ahụ wụrụ ndị uweojii ahụ mgbọ, ha sakwara ha, ma nye ndị omekome ahụ ọsọ."

    'Mana otu onye uweojiinwụrụ , ebe a gbara ụgbọala uweojii ọkụ."

    Ọ gara n'ihu kwuo na Kọmishọna uweojii ezipụla ndị otu ha ịchọ ndị ahụ kpara mkpamkpa ahụ ma rịọ ọha ndị mmadụ ka ha wetara ha ozi ga-enyere ha aka ịkpachi ha.

  3. America amachiela ndị nnọchịteanya ha ịgagharị n' Israel

    Ndị mba Amerịka amachiela ndị be ha ịga na mpaghara ụfọdụ n'Izrel maka egwu na ndị Iran nwere ike iwakpo Izrel.

    Ụlọnnọchiteanya Amerịka n' Izrel gwakwara ndị ọrụ ha ka ha ghara ime njem pụọ n’ime Jerusalem, Tel Aviv maọbụ Beersheba.

    Ndị Iran efoola ntutu taa kwuo na ha ga-awakpo Israel maka ịtụ ogbunigwe n’ụlọọrụ nnọchiteanya ha dị na Syria n’abali iri na otu gara aga nke gburu mmadu iri na atọ.

    Odeakwukwo gọọmentị mba United Kingdom akpọọla ogbo ya n' Iran wee rịọ ka udo dị.

    Mana ndị Izrel ekwetabeghi na ọ bụ ha tụrụ ogbunigwe ahụ na Syria mana ndị mmadụ na-arụ ha aka na ha maara ihe mere ebe ahụ.

    Ndị na-eyi ọha egwu nke Iran na-akwado dịka Hamas, Hezbollah na Lebanon nakwa ndịọzọ na-awakpo mba Israel na mpaghara niile.

    N’ụbọchị Wenezde ka onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden dọrọ aka na ntị na ndị Iran na-akwado ịwakpo Israel ma kwuo na ya ga-enye ndị Izrel nchekwa na-egbochị ọgbunigwe.

    Praịm Mịnịsta Izrel bụ Benjamin Netanyahu kwuru na Izrel ga-awakpo mba ọbụla wakpọrọ ha ma merụọ ha ahụ.

  4. Ndịagha Russia agaala Niger maka inye ndịagha ha ọzụzụ

    Ndị ọzụzụ ndịagha Rọshịa awụchaala Nijia maka ọzụzụ ndịagha mba ahụ.

    Nke a na-eme dịka Mosko na-aga n’ihu na-amụba ikikere ya na mpaghara Sahel Afrịka nọ na nsogbu.

    Ndịagha ọkachamara wụchara n’isi obodo Nijia bụ Nịami n’ụbọchị Wenezde 10 Eprel 2024 dịka a hụrụ ka ha si n’ụgbọelu ebupụta ngwaọrụ ha.

    Otu n’ime ndị ọzụzụ ahụ gwara ụlọọrụ mgbasaozi Nijia bụ TV RTN sị “anyị nọ ebe a inye ndịagha Nijia ọzụzụ...ya na ịkwalite mgbakọaka ndịagha n’etiti Rọshịa na Nijia.”

    Dịka onye mgbasaozi ụlọọrụ ahụ siri kwuo, ndị ọzụzụ ahụ na-ewetakwa ụkpụrụ esi enye nchekwa n’elu.

    Ọbịbịa ha bụ nke sochiri nkwekọrịta ọchịchị ndịagha Nijia na Rọshịa nwere na nso nso a iji kwalite mgbakọaka n’okwu nchekwa.

    Mba ahụ dị n’ọdịda anyanwụ Afrịka chewere ihu na Mosko kemgbe ndịagha weghaara ọchịchị n’ike n’afọ gara aga.

    Nijia ekposaala mmekọrịta ndịagha nakwa ụdị mmekọrịta niile nke ya na France nwere kemgbe dịkwa ka mba ndị gbara ya agbataobi dịka Mali na Burkina Faso na-agbakwuru Rọshịa maka nkwado iji buo agha megide ndị otu jihad na-eyi ndụ egwu.

  5. Etu e si jiri mma na 'acid' wakpo Korra Obidi na London

    Ọgba egwu a ma ama bụ Korra Obidi nọ n'ụlọogwụ ugbua na-anata ọgwụgwọ dịka mmadụ ji mma na 'acid' wakpo ya n'obodo London dị na mba Briten.

    Korra n'onwe ya dere n'akara Instagram ya na ọ nọ n'ụlọọgwụ ma kelee ndị mmadụ maka nkwado ha nyere ya mgbe ihe ahụ mere.

    Akụkọ gbawara mgbe nwanne Korra bụ osite Nancy Umeh gara n'akara soshal midia ya tie mkpu na mmadụ wakporo nwanne ya na mpụta ụlọ ebe ọ nọ na London.

    Umeh kwukwara sị "a kpọọla m ndị uweojii ha zinye m n'aka ndị uweojii London ha agawala ebe nwanne m nọ"

    Korra n'onwe ya gosiri ihe onyonyo ebe ọ nọ n'ala ebe akwa dịka ndị mmadụ gbara ya okirikiri ma nye ya mmanya shuga ka o jiri sapụ ihu ya dịka ọ na-eche ụgbọala ụlọọgwụ ka ha bịa buru ya.

    Korra si na ọ bụ otu nwata nwaanyị onye ojii wakporo ya ebe ọ na-agbasa ozi, sụo ya mma ma wụọ ya acid n'ihu.

    Ọ rịọkwara ndị mmadụ ka ha zitere ya ozi ma o nwee ihe ha ma maka nwaanyị ahụ wakporo ya.

  6. O.J. Simpson anwụọla n'afọ 76

    Onye bụbu ọtụụ bọọlụ mba Amerịka bụ Orenthal James Simpson anwụola dịka ọ gbara afọ 76 ka ezinaụlọ ya kwuru.

    N’ozi ha wepụtara n’akara Twitter ha, ha sị na ọ nwụrụ site n’ọrịa Kansa ma nwụọ n’ụlọ ya dịka ụmụ ya na ụmụ ụmụ ya gbara ya okirikiri.

    O.J. Simpson bụ onye a ma maka etu o si gbanahu ebubo e boro ya igbu nwunye ya bụ Nicole Brown nakwa enyi Nicole ọzọ n’afọ 1995.

    N’afọ 2008, Simpson gara nga maka ebubo iji egbe ezu ohi mana e mechara tọghapụ ya n’afọ 2017.

  7. Ụloikpe Vietnam amaala nwaanyị ikpe maka mpụ ego ruru $44bn

    Ụloikpe mba Vietnam amaala otu nwaanyị ikpe ọnwụ maka mpụ ego dị ijeri dọla 44( ($44).

    Ụlọikpe ahụ di n'obodo Ho Chi Minh mara Truong My Lan dị afọ 67 ikpe ọnwụ ụbọchị Tọzde maka izu ego otu n'ime ụlọakụ kachasị na mba ahụ ohi afọ 11.

    A maara Truong My Lan ikpe maka inara ego dị puku ijeri naira iri ise na ise ($44bn) na mgbazinye ego n'aka ụlọakụ 'Saigon Commercial Bank'.

    Truong My Lan bụ otu n'ime ụmụnwaanyị ole na ole na Vietnam a maarala ikpe ọnwụ maka mpụ metụtara ọrụ oyibo.

    Mkpebi ọzọ ụlọikpe nyere bụ na ọ ga-eweghachite puku ijeri naira iri atọ na atọ ($27bn),mana ndị ọkaiwu kwuru na ọ gaghị ewetali ego ahụ.

    Ụfọdụ mmadu na-ekwu na ntaramahụhụ ọnwụ ahụ bụ ụzọ ụlọikpe ahụ siri chọọ itinye egwu n'ahụ Truong My Lan ka a mara ma ọ ga-enye aka ka a chọta ijeri kwuru ijeri ego na-efu efu.

    Onye odeakwụkwọ ukwu otu Kọmunist bụ Nguyen Phu Trong kwuru n'ikpe ahụ kacha dị egwu n' agha megide nrụrụaka na mba Vietnam.

    Agha ahụ bụ nke mere ka ndị isi ala abụọ na ndị osote Praịm Minista abụọ gbaa arụkwaghịm, ebe ọtụtụ narị ndị ọrụ gọọmentị bụ ndi a tụrụ mkpọrọ.

    Truong My Lan malitere ndụ ya dịka onye mgbere nwere ọdọaahịa ebe ọya na nne ya na-ere ihe ntecha ụmụnwaanyị.

    Mana ọ malitere rewe ma zụwa ala dịka otu Kọmisti Pati malitere ịhazigharị akụnaụba n'afọ 1986.

    N'agbata afọ 1990s, Truong My Lan mepere ọtụtụ ụlọ oriri na nkwarị na ụlọ nri.

  8. Ihe atọ mere FIFA anaghị akpọ ndị ogbuopi Naịjirịa ọrụ

    Otu mbaụwa na-ahụ maka egwuruegwu bọọlụ bụ FIFA ewepụtala aha ndị ogbuopi ga-eso gbuo opi n’asọmpi egwuruegwu Olympics nke ga-amalite n’ọnwa Julaị na Paris, mba France.

    Otu ahụ wepụtara aha ndị ogbuopi iri na abụọ ga-anọchiteanya mba Afrịka n’egwuruegwu ahụ.

    N’ime aha ndị ogbuopi ahụ ewepụtara, enweghị nke bụ nwaafọ Naịjirịa na-agbanyeghị na mba ahụ na-eto n’ike n’ike n’ihe banyere egwuruegwu bọọlụ.

    Ọ bụkwa ụdị ihe a ka e mere Naịjirịa n’oge asọmpi iko mbaụwa a haziri na Qatar n’afọ 2022.

    Ka osiladị, BBC jụrụ onye bụụrụ ogbuopi Naịjirịa ruru n’ogogo FIFA bụ Ibrahim Umar Fagge ajụjụ banyere ihe mere e ji eleghara ndị ogbuopi Naịjirịa anya n’ụdị egwuruegwu ndị ahụ gbara ọkpụrụkpụ.

    Ọ sịrị “e nwere ọtụtụ ihe mere ede jiri bee nwịị, nke mbụ bụ na ọ bụrụgodu na onye ntorobịa nwee ohere ị bụ onye ogbuopi FIFA, ha agaghị enweta ọzụzụ ndị kwesịrị ekwesị nke ga-eme ka ha gbuo opi n’egwuruegwu ndị gbara ọkpụrụkpụ dịka iko mbaụwa.

    “Nke abụọ bụ na ọtụtụ ndị ogbuopi nwere nsogbu ahụike nke mere na ha agaghị enwe ike ruo n’ebe a chọrọ.

    “E nwekwara nsogbu afọ ole ha gbara, ọtụtụ n’ime ndị ogbuopi anyị akaala nka. Etu obi ha si akụ nakwa etu ọbara si agazu ha ahụ ga-etinye ha n’ihe izendụ ọ bụrụ ma ha gaa n’ihu na-agba ọsọ.

    “Nke ikpeazụ bụ na Naịjirịa enwebughị akụrụngwa na-enyere onye ogbuopi aka a na-akpọ ‘Video Assistant Referee maọbụ VAR’ n’asụsụ Bekee,” ka Ibrahim Umar kwuru.

    Dịka iwu FIFA siri kwuo, mmadụ ọbụla agaghị egbu opi n’asọmpi gbara ọkpụrụkpụ ewezuga ma onye ahụ ọ maara nke o riri n’ụzọ esi eji VAR eme ihe.

  9. Luke Fleurs: Anwụchiela mmadụ isii maka ogbugbu onye ọgbaabọọlụ mba South Africa

    Anwụchiela mmadụ isii maka ogbugbu onye ọgbaabọọlụ mba South Africa bụ Luke Fleurs.

    Nwaokorobịa ahụ gbara afọ iri abụọ na anọ na-agbara otu egwu bọọlụ Kaizer Chiefs bụ onye ndị ohi ụgbọala gbagburu n’izuụka gara aga n’otu ọdụ mmanụ ụgbọala dị na Johannesburg.

    N’ozi ha wepụtara, ndị uweojii kwuru na mmadụ isii ahụ a na-enyo enyo bụ ndị anwụchiri na Soweto n’ụtụtụ Wenezde 10 Eprel 2024.

    Ndị uweojii kwuru na ha kwenyere na “ndị ahụ a na-enyo enyo so n’otu na-ezu ohi ụgbọala” na mpaghara Gauteng.

    Ha kwukwara na ha ebughachitela ụgbọala onye ọgbaabọọlụ ahụ nwụrụ anwụ n’ụbọchị Mọnde.

    Fleurs bụ onye kwụ n’ahịrị na-eche ka agbanyere ya mmanụ ụgbọala tupu ndị ojiegbe awụchaa ma nye ya iwu ka ọ pụta n’ụgbọala ya.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Gauteng bụ Mavela Masondo gwara ndị ntaakụkọ n’ụbọchị ahụ na “ndị omekoome tụwara Fleurs egbe, kpọpụta ya n’ụgbọala ya ma gbaa ya egbe na mpaghara obi ya.”

  10. Israel-Gaza War: Israel, Chịsanụ chịsa ọwa na Gaza- Biden

    Onyeisiala mba Amerịka Joe Biden akpọọla Izrel oku ka ha kweta ka agha ha megide Hamas kwụsịtụ izuụka isii maọbụ asatọ, nke na-arụtụ aka na obi adịghịzị Amerika mma maka ihe na-akpọtụ na Gaza.

    Ozi a dị iche n'ihe Biden kwuburu na mkparịtaụka bụ ebe o kwuburu na ọ dịịrị Hamas ikweta ka e nwee nkwụsịtụ agha nwa mgbe nta nakwa inwe nkwekọrịta maka ndị e ji eji.

    Biden sịrị na Praim Minista Izrel bụ Benjamin Netanyahu na-adahie n'ụzọ o si ebu agha ahụ.

    Ọ sịrị, " Ekwetaghị m n'usoro ya."

    Ọ kpọrọ mba ahụ oku ka ha kweta ka ha na Hamas nwee nkwekọrịta ịkwụsị agha.

    Biden kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ụlọntaakụkọ mba Spen nwere tupu mkparịtaụka banyere nkwụsịtụ ọgụ nke onye onyeisi CIA.

    Biden kpọkwara oku ka e nwee ohere ibubata nri na ọgwụ na Gaza, sị na o nweghị ihe kwesịrị igbochi nke ahụ.

    Alo nkwụsịtụ ọgụ a na-atụ ya gụnyere ntọhapụ ndị Izrel mmadụ 40 ndị e ji eji na Gaza iji gbarakwa isi mmadụ Palestine 900 nọ na mkpọrọ Izrel.

    Hamas kwuru na ha na-atụle ya bụ okwu.

  11. Anwụchiela onye nwe ụlọ oriri maka ịtagbu otu nwaokorobịa n’ahụhụ n’Imo Steeti

    Ndị uweojii anwụchiela onye nwe ụlọ oriri ‘Our Guest House’ dị n’Umulogho n’okpuruọchịchị Obowo nke Imo Steeti bụ Maazị Ibe Obasi n’ihi ebubo igbu nwaokorobịa gbara afọ iri abụọ na ise maka izu ohi ekwentị.

    Ibe Obasi gbara afọ iri atọ na asatọ bụ onye a na-ebo ebubo igbu Ebuka Udemba, onye Umuokpa dị n’okpuruọchịchị Obowo nke Imo Steeti.

    N’oge BBC Igbo kpọtụụrụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo Steeti bụ Henry Okoye, ọ kọwara na nnyocha ndị uwojii mere gosiri na nwaokorobịa ahụ nwụrụ anwụ bụ onye akpọchiri n’imeụlọ igweọkụ ‘generator’ nke ụlọ oriri ‘Our Guest House’ bụ ebe anwụrụ ọkụ nọọrọ kugbuo ya.

    Ọ gara n’ihu kwuo na “enyefeela nwaamadị ahụ a na-enyo enyo n’aka ngalaba ndị uweojii na-eme nnyocha banyere mpụ bụ ‘State Criminal Investigation Department (SCID)’ dị n’Owerri maka ime nnyocha miri emi n’okwu ahụ.’

    O kwukwara na nwaadị ahụ enyela ndị uweojii ozi rijuru afọ nke ga-enyere ha aka inwuchi mmadụ ndị ọzọ aka ha dị n’okwu ahụ.

    Okoye sịrị na kọmịshọna ndị uweojii n’Imo Steeti bụ Aboki Danjuma agwala osote onyeisi ya na-ahụ maka SCID ka o mee nnyocha rijuru afọ iji chọpụta ihe butere ọnwụ nwaokorobịa ahụ ma hụkwa na anwụchiri mmadụ niile aka ha dị n’ọnwụ ya.

    N’ụbọchị Mọnde 8 Eprel 2024 ka anyị nwetara ozi na otu onye nwe ụlọ oriri jiiri anwụrụ ọkụ si n’igweọkụ 'generator' gbuo otu nwaokorobịa n’ihi ebubo izu ohi ekwentị.

  12. ‘Hepatitis’ na-egbu mmadụ 3500 kwa ụbọchị tinyere Naịjirịa – WHO

    Otu ọrụ ahụike mbaụwa bụ World Health Organization maọbụ WHO n’ịchafụ Bekee ekwuola na mmadụ karịrị 3500 na-anwụ kwa ụbọchị gburugburu ụwa n’ihi ụrịa imeju, dịka ọ sịrị na nke a na-amapụ obi n’ihi na ọnụọgụgụ ya ka na-agbago elu.

    WHO kpọrọ oku ka ewepụta atụmatụ a ga-eji buo agha megide ọrịa ndị na-emetụta imeju.

    Ịba ọcha n’anya bụ nke a hụtara dịka ọrịa nke abụọ kachasị dị njọ ma na-egbukwa egbu gburugburu ụwa.

    Onye ntaakụkọ BBC kwuru na ihe karịrị nde mmadụ 350 gburugburu ụwa nwere ụdị nrịnrịa ịba ọcha n'anya B maọbụ C bụ nke nwere ike bute ọrịa nriba imeju bụ 'liver cancer' nakwa nje ọrịa ọjọọ ndị ozọ.

    WHO kwuru na ụzọ mmadụ abụọ n’ime atọ ndị butere ọrịa ahụ dị na Bangladesh, China, Ethiopia, India, Pakistan, Indonesia, Naịjirịa na Russia.

    E nwere ezigbo ọgwụ ndị dị ọnụ ala eji agwọ ọrịa ahụ mana ọ bụ naanị pasenti atọ ndị nwere ụdị ịba ọcha n'anya nke B na-anata ọgwụgwọ.

  13. Ụlọikpe etinyela ụbọchị a ga-ekpe Ganduje ikpe n’ihi ebubo izukọrọ ego ọhanaeze

    Ụlọikpe ukwu dị na Kano etinyela abalị 17 Eprel 2024 dịka ụbọchị a ga-ekpe aka chiburu Kano Steeti bụ Abdullahi Umar Ganduje, nwunye ya na mmadụ isii ndị ọzọ ikpe n’ihi ebubo izukọrọ ego ọhanaeze.

    Mmadụ ndị ahụ a kpọrọ aha ga-awụcha n’ụlọikpe n’ihi ebubo mpụ asatọ, ndị gụnyere ịnara ngarị, izukọrọ ego nakwa imefu ego na akụnaụba gọọmenti aghara aghara.

    N’akwụkwọ ahụ a gbara n’ụlọikpe, mmadụ ndị ga-azara ọnụ ha n’ebubo ahụ gụnyere Abdullahi Umar Ganduje, Hafsat Umar, Abubakar Bawuro, Umar Abdullahi Umar, Jibrilla Muhammad, Lamash Properties Ltd, Safari Textiles Ltd na Lesage General Enterprises.

    Gọọmenti Kano Steeti sịrị na ya enwetala ndị akaebe iri na ise ga-agba ama megide mmadụ asatọ ahụ a na-enyo enyo n’ihu ụlọikpe.

    Etinyela abali 17 nke ọnwa Eprel dịka ụbọchị a ga-anụrụ ikpe ahụ n’ihu ọkaikpe Usman Na’aba nke ụlọikpe ukwu Kano Steeti.

    Onye ọkaikpe ukwu Kano Steeti ma bụrụkwa kọmịshọna ikpe ziri ezi bụ Haruna Isah Dederi akọwaala na ọ bụ eziokwu na Ganduje, nwunye ya na mmadụ isii ndị ọzọ ga-awụcha n’ụlọikpe n’ụbọchị ahụ a kpọrọ aha.

  14. Jacob Zuma enwetala mmeri n’ụlọikpe isoro zọọ ọkwa na ntụliakaelu South Africa

    Onyeisiala Saụt Afrịka pụrụ apụ bụ Jacob Zuma enwetala ikike isonye na ntụliakaelu a ga-ahazi na mba ahụ n’ime ọnwa Mee.

    Nke a na-abịa dịka ụlọikpe na-ahụ maka ntụliakaelu tụgharịrị mmachi amachiri ya isoro zọọ ọkwa n'oge ntụliakaelu.

    N’ime ọnwa gara aga, ụlọọrụ na-ahazi ntụliakaelu na Saụt Afrịka machiri Zuma isonye na ntụliakaelu maka ịgbanahụ amamiikpe ụlọikpe.

    Zuma, onye gbara afọ 81 bụ onye nọ kemgbe na-achụ nta vootu n’okpuru pati ọhụrụ bụ uMkhonto we Sizwe (MK).

    Dịka onye amabu ama na pati ji ọkwa ọchịchị ugbua na Saụt Afrịka bụ ‘African National Congress’ (ANC), Zuma bụ onye aha ya na-eko achịcha ma bụrụkwa onyeisiala malite n’afọ 2009 ruo 2018 bụ mgbe ọ rịturu n’ọkwa ọchịchị n’ihi ebubo mpụ na nrụrụakaego.

    A tụrụ ya mkpọrọ ọnwa iri na ise n’afọ 2021 n’ihi na ọ jụrụ ịgba akaebe n’oge a na-enyocha ya maka mpụ na nrụrụakaego, mana ka osiladị ọ gara mkpọrọ naanị ọnwa atọ n’ihi ọnọdụ ahụike ya.

  15. Naịjirịa eweghachitela $24m site na nnyocha Betta Edu

    Ulọọrụ na-ebu agha megide mpụ na nrụrụakaego na Naịjirịa bụ Economic and Financial Crimes Commission maọbụ EFCC n’ịchafụ Bekee ekwuola na Naịjirịa eweghachitela ijeri Naịra iri atọ ($24m; £19m) dịka akụkụ nnyocha a na-eme mịnịsta akwụsịtụrụ ọrụ.

    Ego ndị ahụ ka enyopuru n’akpaego karịrị iri ise.

    Mịnịsta na-ahụ maka ọrụ obi ebere na mbelata ụbịam ọnụntụ bụ Betta Edu bụ onye akwụsịtụrụ ọrụ n’ọnwa Jenụwarị n’ihi ebubo itinye ego ọhanaeze dị $640,000 n’akpaego nke onwe ya.

    Onyeisiala Tinubu nọọrọ mgbe ahụ nye iwu ka e mee nnyocha na mịnịstrị ya.

    N’oge ahụ, Dr Edu gbara afọ 37 gọrọ aka na ụkwụ ya n’ebubo nrụrụakaego ahụ e boro ya.

    Ụlọọrụ ya kwuru na o nyere nkwado ka akwụbanye ego n’akpaego nkịtị nke na-abụghị nke ya maka ‘ikesaara ndị ogbenye na ndị ụwa na-atụ n’ọnụ.”

    N’oge nnyocha ahụ fọdụrụ ihe ntakịrị ka o ruo izuụka isii, EFCC kwuru na ya achọtala ‘ọtụtụ akụkụ’ n’okwu ahụ nke ọ ga-enyocha.

    “Ka ọ dị ugbua, anyị na-enyocha akpaego karịrị iri ise anyị nyopuru ego ndị ahụ n'ime ya. Nke ahụ abụghị egwu ụmụaka. Nke ahụ bụ nnukwu ihe,” ya ka onyeisioche EFCC bụ Ola Olukoyede kwuru n’ozi ụlọọrụ ya wepụtara na nso nso a.

    Ọ gwara ụmụafọ Naịjirịa ndị na-achọ iti aka n’obi ka ha nye ụlọọrụ ya ohere ịpịakọta nnyocha ha.

    O kwuru sị “anyị na-eleba anya n’ọtụtụ nchọpụta ndị anyị nwetara n'oge anyị na-eme nnyocha. Ya bụrụ maka ịhụ ndị mmadụ n’ụlọmkpọrọ, ọ dị mma ka ha chere, ihe niile nwere usoro esi eme ya.”

    Olukoyede sịrị na ego ndị ahụ eweghachitere ‘abaalarị n’akpaego gọọmenti etiti Naịjirịa.”

    Ịkwụsịtụ onye mịnịsta ọrụ bụ ihe rara ahụ omume na Naịjirịa.

  16. Anwụchiela ndị otiegwu na Uganda maka ‘ịkpagharị’ Museveni

    Anwụchiela mmadụ asatọ na-eti egwu na mba Uganda maka inye mkpesa na okwu onyeisiala ha kwuru na ngwụcha izuụka gara aga dị oke ogologo.

    Onyeisiala bụ Yoweri Museveni hụtara mkpesa si n’aka otu n’ime ndị ahụ na-eti egwu dịka mkpagharị.

    Nke a mere n’abalị Satọde n’oge Museveni na-ekwu okwu na mmemme ncheta afọ agbamaakwụkwọ 50 nke onye bụbu Praịm Minista mba ahụ bụ Amama Mbabazi na nwunye ya bụ Jacqueline Mbabazi.

    Dịka ndị ọrụ nchekwa siri kwuo, ndị otu egwu ‘Crane Performers Band’ jiiri olu asụsụ ha bụ Runyankole nye mkpesa ahụ.

    A sị na ndị otu egwu ahụ kwuru “Rutabandana Waturusya Rugahamuzindaro,” nke pụtara “onye ogologo akụkọ, ike agwụla anyị, hapụ igwe okwu.”

    Ka ọ dị ugbua eji ndị otiegwu ahụ n’ụlọọrụ ndị uweojii ‘Kampala Central Police Station.’

    Dabere n’akwụkwọ ikpe enwetara n’ụlọọrụ mgbasaozi dị na Uganda, agbaala ndị otiegwu ahụ akwụkwọ n’ụlọikpe maka ịkpagharị onyeisiala.

    Mana ka osiladị, ndị otu egwu ahụ na ndị uweojii ekwubeghị okwu ọ bụla banyere ya bụ ọnọdụ.

  17. Vatican bụ isi Katọlik ekwuola ebe ha kwụụ banyere itepu ime, mgbanwe okike na ihe ndị ọzọ

    N’akwụkwọ ozi a kpọrọ ‘ugwu dịrị mmadụ (Dignitas Infinita)’ ha wepụtara, Vatican kwuru na akwadoghi mmadụ ịgbanwe okike ya maọbụ etu chukwu sị kee ya, nwaanyị i buru nwa onye ọzọ n’afọ ma mụọ ya, nakwa itepu afọ ime.

    Pope Francis onye binyere aka n’akwụkwọ ahụ, huru ogbenye, ịtụ mmadụ mgbere, na isi na mba banye na mba ozo dịka ihe na-echere ugwu dịịrị mmadụ aka mgba.

    Ọtụtụ mgbe ka a na-akatọ Pope maka nkwenye ya n’ọtụtụ ihe dị iche iche n’ụka Katọlik.

    Ndị na-ekweteghi n’etu Pope si ahụta ihe ndị a kwuru na ọ na-eduhie ụka Katọlik apụ n’ihe e ji maara ha.

    Mana ndị na-ahụta ihe ndị a ka Pope si ahụta ya na-ekwu na o nwebeghi ezi ihe omimi o mere banyere mgbawe ha chọrọ ịhụ na nzukọ ụka Katọlik.

    N'afọ 2023, Pope Francis kwuru na e nwereike ime ndị gbanwere onwe ha sị na nwoke bụrụzie nwaanyịbaptizim n’ụka Katọlik ma ọ bụrụ na ime nke ahụ ebuteghi asịrị maọbụ “ọgbaghara".

    O kwekwara ka ndị ụkọchukwu gọzie ndị di na nwunye na-enwe mmekọahụ n'ọnọdụ ụfọdụ, n'agbanyeghi na Vatican na-ele alụm di na nwunye anya dị ka nwoke na nwaanyị.

    N'afọ gara aga, Pope duziri ụlọọrụ nkuzi dị ike nke Vatican, na nwoke ọhụrụ na-eduzi ya bụ onye nọ Pope nso, Kadịnal Victor Manuel Fernández, ileba anya na mgbagwoju anya nke "ajụjụ ọhụrụ" na-eche ndị mmadụ ịhu n'ụwa taa.

    A gbara Kadịnal Fernández ajuju maka akwụkwọ o dere ma bipụta na ngwụcha afọ 1990 nke gbasara mmekọ ahụ nke mmadụ n'uju.

    N'ezie, n'okwu ndị dị ka njikọ nwoke na nwaanyị na ọrụ nke ụmụnwaanyị n’ụlọụka, Pope dị ka onye na-emesapụ aka n'olu, na-enweike inwe mgbanwe ụfọdụ bara uru n’ọdịnihu.

  18. Mmadụ karịrị 100 anwụọla n’ihi oke okpomọkụ na mba Mali

    Ihe karịrị mmadụ otu narị anwụọla site n’oke ikuku okpomọkụ dakwasịrị mba Mali n’ọnwa gara aga dịka akụkọ si kwuo.

    N’izuụka gara aga, obodo Kayes dị na mpaghara south-western nwere okpomọkụ ruru 48.5°C.

    Ọ ga-abụ okpomọkụ kachasị ibe n’akụkọ mba Afrịka n’ọnwa Eprel, dịka ndị ọrụ na-ahụ maka mgbanwe ihu igwe bụ meteorologists si kwuo.

    Ụlọọgwụ Gabriel-Toure dị n’isiobodo Bamako na-abatara mmadụ 102 ndị na-arịa ọrịa okpomọkụ, ma nwụọ site n’ọrịa ahụ ngwa ngwa e butere ha a nabatara ha.

    Ọtụtụ n’ime ha karịrị afọ 60 ma na-arịa ọrịa ndị dị aṅaa dịka Djibo Mahamane Django bụ onyeisi ngalaba anaesthesia nke ụlọọgwụ ahụ si kwuo.

    Ụfọdụ ụlọọrụ ntaakụkọ ọdịnala kwuru na ndị nwụrụ anwụ n’ime ụbọchị atọ karịrị 250.

    Ndị ọrụ ahụike agwala ndị mmadụ ka ha na-anọ nso n’ebe mmiri nọ, nwee ikuku ma gbochie ebe ụmụakwụkwọ na-agụ akwụkwọ maka na ọrịa a kachasị emetụta ụmụaka na ndị okenye.

    E belata oge ụmụakwụkwọ praịmarị na sekọndịrị ji agụ akwụkwọ iji chekwaa ha maka okpomọkụ ọjọọ a.

    E kwuru na ọnọdụ okpomọkụ ọjọọ a sitere n’ọnọdụ ihu gwe a kpọrọ El Nino nke na-ebuli okpomọkụ osimmiri nakwa ikuku.

    Ndịagha ji ọchịchị na mba Mali ekwubeghi ihe ọbụla banyere nke a.

  19. A gbatịala ụbọchị ezumike ka ọ bụrụzie Tuzde, Wenezde na Tọzde izuụka a

    Gọọmentị etiti nke Naịjirịa agbatịala ụbọchị ezumike maka emume Eld-El-Fitr nke ndị okpukperechi Mọslem ka ọ bụrụzie Tuzde 9, Wenezde 10 nakwa Tọzde 11 Eprel 2024.

    Nke a bụ ozi si n'aka mịnịsta na-ahụ maka ihe na-eme n'ime obodo bụ Olubunmi Tunji Ojo, nke kwuru na ọ bụ iji nye ndị a ohere ịgbazu emume ha.

    Cheta na e tinyeburu ụbọchị ezumike ahụ ka ọ bụrụ naanị na Tuzde na Wenezde.

    Mana ọ dịka a hụghị ihu ọnwa n'ụbọchị Tuzde na Saudi Arabia nke pụtara na emume imechi obubu ọnụ ha ga-abụzi na Wenezde nke mere gọomentị etiti jiri gbatịa ụbọchị ezumike ruo Tọzde.

  20. Gọvanọ Edo Steeti ahọpụtala osote ọhụru dịka ụlọomeiwu chụpụrụ Philip Shaibu

    Ụlọomeiwu Edo Steeti achụọla osote gọvanọ ha bụ Philip Shaibu n’ọkwa ọchịch n’ọgbakọ ha mere n’ụbọchị Mọnde na Benin.

    Ngwa ngwa nke a mechara, Gọvanọ Steeti ahụ Godwin Obaseki họpụtara Omobayo Marvellous Godwin ka ọ nọchie anya Shaibu.

    Omobayo dị afọ 38, gụrụ akwụkwọ na ngalaba ‘Electrical Electronics Engineer’ ma nwee ahụmihe ngalaba mmanụ agbidi.

    Ọ zọrọ ọkwa ịnọchiteanya mpaghara Akoko-Edo n’ụlọomeiwu nta n’aha Labour Pati na ntuliaka afọ 2023.

    Ọchụchụ Shaibu sitere na mkpebi kọmitii nke ọkaikpe steeti bụ Daniel Okungbowa hiwere mere ka ha mee nyocha banyere ebubo ịkpa akwa adịghị mma.

    Nke a na-abịa dịka ụlọikpe ukwu dị n’Abuja na-akwado ileba anya n’akwụkwụ Shaibu gbara iji maa atụmatụ ndị ụlọomeiwu Edo Steeti nwere maka ịchụpụ ya.

    Mana Shaibu ekwuola na ọ na-abataghị ọchụchụ ahụ ndị omeiwu steeti chụpụrụ ya ma kwuo na ọ bụ mwakpo ọchịchị onye kwuo uche ya.

    Ọ gara n’ihu kwuo na ihe butere nke a bụ maka na ọ chọrọ ịzọ ọkwa gọvanọ Edo Steeti.