Otu onye ọkacharamara n'okwu nchekwa bụ Patrick Agbambu akpọọla oku ka Gọọmenti Etiti tinye uchu n'ihe banyere nchekwa ụlọmkpọrọ Naịjirịa.
Agbambu bụ onyeisioche, otu 'Security Watch Africa Initiatives', mere ka amata na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere n'ekwentị banyere mgbapụ ndị mkpọrọ ruru 119 n'ụlomkpọrọ ‘Medium Security’ dị na Suleja, Niger steeti na nsonso a
N'okwu ya, Agbambu kọwara na ọ di mkpa ka gọọmenti gba mbọ lebaye anya na ọnọdụ ụlọ mkpọrọ Naịjirịa nke ọ kọwara dịka nke kagoro nkà.
O kwuru na ụlọ mkpụrụ kwesịrị ịnabata mmadụ 250 ka e tinyere mmadụ 500 n'ime.
O kọwara na nke bụ ihe kwesịrị ka e leba anya n'ime ya. O mere ka a mata na ndị ọrụ nchekwa ụlọ mkpọrọ kwesịrị inwe ezi nkwado na ozuzu kwa mgbe kwa mgbe iji kwado ha maka ihe mberede ọ bụla.
Banyere okwu Mịnịsta na-ahụ maka ime ime obodo, Olubumi Tunji-ojo banyere ịkwaga ụlo mkpọrọ ‘Medium Security’ dị na Suleja, Niger steeti, Agbambu kwuru na ya akwadoghi okwu n'ihi na ọ gaghị amita mkpụrụ ọ bụla.
Lee mgbapụ/mwakpo mere n’ụlọ mkpọrọ Naịjirịa na nsoso a:
N'isi ụtụtụ Jenụwarị 25 afọ 2021, ndị oji egbe wakporo ụlọ ọrụ mgbazi Nigeria (NCS) dị n’owerri, Imo steeti, tọhapụrụ ihe karịrị ndị mkpọrọ 1,800 ma hapụkwa mbibi n'azụ ha.
5 Eprel afọ 2021, ndị mkpọrọ 1,844 gbapụrụ n’ụlọ mlpọrọ owerri, Imo steeti, ka ndị ji egbe wakporo ụlọ ọrụ ahụ.
Akụkọ kwuru na a na-atụ aka na o bụ ndị otu Indigenous People of Biafra (IPOB) kpara agwa ahụ.
Ụbọchi Tọzde 8 Julaị afọ 2021, mmadụ anọ na-eche ikpe gbapụrụ n'ụlọ mkpọrọ Jos, Plateau steeti.
N’onwa Septemba 13 afọ 2021, a wapkoro ụlọ mkpọrọ Kabba Correctional Centre di na Kogi steeti, ebe a tọhapụrụ ihe karịrị ndị mkpọrọ di ọnuọgụgụ 2,400.
Dị ka ndị ọchịchị si kwuo, a nwụchiri mmadu 114 n'ime ndị ahụ gbapụrụ agbapụ.
Ọzọkwa mere na Ọktoba 22 afọ 2021 mgbe ndị oji egbe wakporo ụlọ mkpọrọ Abolongo di n’Oyo State.
Ndị mwakpo ahụ tọhapụrụ ndị mkpọrọ 837 na usoro a.
E mechara nwụchie 262, ebe mmadụ 575 bụ ndị a ka na-achọ achọ. . N’ọnwa Nọvemba 28 afọ 2021, ndị mkpọrọ 262 gbapụrụ n’ụlọ Jos correctional centre, Plateau steeti, ka ndị ji egbe wakporo ebe ahụ.
E gburu ndị mkpọrọ itoolu, ebe mmadụ 252 nọ n'ụlọ mkpọrọ dịka ndị ọrụ gọọmentị siri kwuo.
Na 2 Jenụwarị n’afọ 2022, ndị mkpọrọ atọ gbapụrụ na Mandala Custodial Centre, Ilorin, isi obodo Kwara steeti.
Ọzọ dịka ibe ya mere na 13 Mee afọ 2022 mgbe ndị mkpọrọ atọ gbapụrụ n'ụlọ mkpọrọ Agbor, Delta steeti ka oke mmiri ozuzo kpochapụrụ mgbidi ugwu nke ụlọ mkpọrọ ahụ.
Ka ọ dị ugbu a, ndị mkpọrọ 879, gụnyere ndị na-eyi ọha egwu dị 64, gbapụrụ n'ụlọ mkpọrọ Kuje, FCT dị n’Abuja ụbọchi Tosde 5 Julaị afọ 2022.
Ndị otu Islamic State West Africa Province, ISWAP, bụ ndị kwuru na ọ bụ ha kpatara mwakpo ahụ.