You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ụlọakwụkwọ agaghị emepe na Kenya maka idemmiri

Akụkọ ndị kachasị gbapụta ihe n'ụwa n'ọnwa Eprelụ

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Ikechukwu Kalu, Uche Akolisa, Chimezie Ucheagbo

  1. Kenneth Gbagi bụbu Minista agụmakwụkwọ anwụọla

    Ezinụlọ Kenneth Gbagi ekwupụtala maka ọnwụ ya.

    N'ozi nwa ya nwoke bụ Emuoboh Gbagi binyere aka na ya si kwuo, Kenneth Gbagi, onye bụbu minista na-ahụ maka agụmakwụkwọ nwụrụ ụbọchị Satọde 4 Mee.

    Ọ gbara afọ 62. Gbagi bụbu minista na-ahụ maka agụmakwụkwọ n'okpuru ọchịchị Goodluck Jonathan.

    Ọ zoro ọkwa gọvanọ Delta steeti n'otu Social Democratic Party (SDP) na ntuliaka afọ 2023.

    Ihe ndị ịkwesiri ịma maka Kenneth Gbagi

    Kenneth Gbagi bụ onye a mụrụ na Septemba 1961 n’obodo Sapele dị na Delta steeti.

    Ọ tara ahụhụ zụọ onwe ya n’ụlọakwụkwọ Pramarị nakwa Sekọndrị.

    Ọ rụrụ obere oge tupu ọ gawa mba ofesi ịgụ Mahadum.

    Ọ gụrụ Political Science na Mahadum Sans Thomas nakwa Phillipine College of Criminology.

    Gbagi laghachiri Naịjitịa ebe ọ rụrụ ọrụ na Police College dịka onye nkuzi Criminology.

    Ọ laghachiri gụọ ‘Law’ na Mahadum Legọs.

    Ọ zọrọ ọkwa Gọvanọ Delta steeti n’okpuru otu SDP.

    Ndị uweoji na-achọ ya n’afọ 2022 ịbịa zara ọnụ ya na ọ gbara ndị ọrụ ya anọ ọtọ ma gosiputa ihe ebe niile maka akụkọ na ha zuru ohi.

    Ọ gwara BBC Pidgin mgbe ahụ na ụdịrị ihe ahụ emeghi kama na ọ bụ ọrụ ndị ilo ya iji metọ aha ya.

  2. Egbe bere ugo bere

    Nke si ibe ya ebela, ka nku kwaa yaa!!

  3. Ọkụ agbagbuola mmadụ 16 n’ihe mberede okporoụzọ Enugwu steeti

    Ọkụ agbagbuola mmadụ 16 n’ihe mberede okporoụzọ Enugwu steeti

    Ihe mberede mere n’Ekwegbe nke dị n’ụzọ si Opi gaa Nsukka n’Enugwu steeti tara ịsị mmadu ịrị na isii.

    Ụmụnwoke iri na anọ na ụmụnwaanyị abụọ ka a hụrụ ozu ha dịka ọkụ gbapịara ịhụ ha nke na amataghịzi ndị ha bụ.

    Akụkọ kwuru na ihe mberede ahụ mere n’ụbọchị Tuzde 30 Eprel 2024.

    N’akwụkwọ ozi nke ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Enugwu steeti bụ Daniel Ndukwe wepụtara, ihe mberede ahụ metụtara ụgbọala Toyota Hummer bọs nwere akara Bauchi Steeti DAS 215 XA e dere Masha Allah n’ahụ ya.

  4. Ụlọikpe Ghana agaghị amanye onyeisiala ịbịanye aka n’iwu megidere LGBTQ

    Ụlọikpe ukwu dị n’isi obodo Ghana bụ Accra akachapụla atụmatụ a na-eme ịmanye onyeisiala mba ahụ bụ Nana Akufo-Addo ịbịanye aka n’iwu tara akpụ megide mmadụ ndị ụdị ekere ha na-amasị bụ LGBTQ n’ịchafụ Bekee nke ụlọomeiwu mba ahụ kwadoro n’ọnwa Febụwarị.

    Iwu ahụ kwupụtara ihe ruru mkpọrọ afọ atọ maka onye ọ bụla a chọpụtara na ụdị ekere ya na-amasị.

    N’ọnwa Maachị, ụlọọrụ onyeisiala Ghana kwuru na ya agaghị abịanye aka n’iwu ahụ ruo mgbe ụlọikpe kachasị chabiri ikpe banyere etu o siri daba n’ụkpụrụ iwu.

    Mịnịstrị na-ahụ maka ego adọọla aka na ntị na mba ahụ nwere ike tụfuo ohere ịnweta ego nkwado ruru $3.8bn (£3bn) n’aka ụlọakụ mbaụwa bụ World Bank ya bụrụ ma etinye iwu ahụ n’ọrụ.

    Ka osiladị, ọtụtụ ndị omeiwu na ụmụafọ Ghana na-amanye Akufo-Addo ka ọ bịanye aka n’iwu ahụ.

    Ọkaikpe Ellen Lordina Serwaa Mireku nọọrọ n’ụbọchị Mọnde 29 Eprel 2024 kwadoo mkpebi ụlọọrụ onyeisiala dịka nchabi ikpe ya kwuru na ọ bụ nke na-ezighị ezi ịmanye Akufo-Addo ịbịanye aka n’iwu ahụ.

  5. Ndụ mmiri, ndụ azụ!

    Onye rụọ ya rie, onye rụrụ ụlọ ya biri n'ime ya.

    Mmiri zọọrọ onye niile taa!!!

  6. NFF ahọpụtala Finidi George dịka onye ndu otu Super Eagles

    Ndị isi ngalaba bọọlụ na Naịjirịa bụ NFF ebinyela aka na akwụkwọ ga-eme ka Finidi George bụbu ọgbaabọọlụ Naịjirịa ka ọ bụrụ onye ndu otu ahụ kpọm kwem.

    Cheta na George anọbuola n'ọkwa ahụ dịka onye ndu n'asọmpị enyi na enyi abụọ nke Naịjirịa gbara n'ọnwa gara aga.

    O nobukwala ihe ruru ọnwa iri abụo dịka osote José Santos Peseiro tupu Jose ahapụ ọkwa ahụ mgbe Naịjirịa ruru ọkwa nke abụọ n'asọmpị iko mba Afrịka na mbido afọ a.

    Aha Finidi malitere iwu dịka o duuru otu Enyimba nke Abia steeti na mmeri Premier Lig nke Naịjirịa afọ gara aga.

    Ọ bụ onye a ma a n'ịgba bọọlụ bụ nke ndị mmadụ bidoro lebe anya mgbe enyere ya ọkwa ịbụ onye ndu otu Enyimba n'afọ 2021.

  7. Nwaeze Harry na nwunye ya Meghan Markle na-abịa Naịjirịa

    Nwaeze mba Briten bụ Harry na nwunye ya Meghan Markle ga-abịa Naịjirịa mee njem nlegharị anya n'ọnw mee.

    Nke a bụ site n'ozi ọchịagha Naịjirịa zigara di na nwunye ahụ.

    Ozi ahụ kwuru nke onye nkwuchiteọnụ ndịagha Naịjirịa bụ Tukur Gusau binyere aka kwuru; 'njem ahụ bụ iji gbagidesie ụkwụ ike n'emume asọm,pi Invictus ma lekwaa anya ma Naịjiria enwereike ihazi ya bụ egwuregwu.

    N'afọ gara aga, Naịjirịa gara egwruegwu Invictus mbụ ma nweta nzere ọla edo na ọla nchara wee bụru mba mbụ si Afrịka na-aga egwuregwu ahụ.

    Egwuregwu Invictus bụ nke Nwaeze Harry malitere n'afọ 2014 iji kwalite ndịagha dara n'agha.

    Oge Naịjirịa gara egwuregwu ahụ n'afọ gara aga na mba Jamini, mịnịsta na-ahụ maka nchekwa gosiri mmasị ka e kpokoba asọmpi ahụ na Naịjirịa dịka Gusau siri kwuo.

    E kwubeghi ụbọchị Harry na Meghan ga-abịa kpomkwem mana a na-atụ anya na ha ga-ezute ndịagha Naịjirịa ma gaa legharịa anya n'obodo dị icheiche.

  8. Ụmụakwụkwọ na Kenya ka ga-anọ n'ụlọ maka idemmiri

    Gọọmentị na Kenya ekwuola na ha ka na-ebuzuga ụbọchị mmepe ụlọakwụkwọ na mba ha otu izuụka maka ide mmiri na-emekpa ha ahụ.

    Ihe karịrị mmadu 80 anwụọɔa n'ide mmiri ahụ kamgbe ọ malitere.

    Nchọpụta gosiri na idemmiri ahụ metụtatara ọtụtụ ụlọakwụkwo na mba ahụ dịka mịnịsta na-ahụ maka agụmakwụkwọ bụ Ezekiel Machogu siri kwuo.

    "Mkpamkpa mmiri ozuzo kpara n'ụfọdụ ulọakwụkwọ bibiri ihe nke ukwuu nke mere na ọ gaghị adị mma itinye ndụ ụmụntakarịrị ụmụakwụkwọ na nsogbu ịsị ha lọghachite n'ụlọakwụkwọ tupu anyị emezie ihe", n'okwu ya.

    A kwadoburu imepe ụlọakwụkwọ niile taa bụ abalị 29 ọnwa Eprel mana ọ ga-abụzị n'abalị 6 ọnwa Mee.

    E jikwa ụfọdụ ụlọakwụkwọ mere ebe mgbaba maka ndị mmiri chụpụrụ n'ụlo ha.

    Etu ọ dị ugbua, ndị e kwuru nwụrụ erụọla mmadụ 83 dịka e mechara chọpụtakwuo ozu 13 ndị ọzọ n'ebe dị icheiche na mba ahụ. Ọnụọgụgụ ahụ nwekwara ike ịgbali elu karịa ka mmiri ka na-ezokwa.

    Ihe karịrị mmadụ 130,000 enweghizi ebe obibi maka idemmiri ebe a na-achọ ihe karịrị mmadụ 12 acho.

    Kenya na mba ndị ọzọ dị n'Ọwụwa anyanwụ Afrịka ahụshila anya maka nnukwu mmiri ozuzo na-eme ebe ahụ kamgbe ọtụtụ izuụka.

    Ihe ruru mmadụ 100,000 enweghizi ebe obibi na Burundi ebe mmadụ 150 anwụọla na Tanzania.

  9. I kwere ka i kweghi n'ilu?, Ya gazierie onye niile n'izuụka a!!

  10. Ndị uweojii anwụchiela ndị otu nzuzo 16 n'Anambara steeti

    Ndị uweojii anwụchiela ndị otu nzuzo 16 n'Anambara steeti, ebe mmadụ 21 gbara ọsọ.

    Onye uweojii na-ahụ maka mmekọrịta ọha na eze, n'Anambara steeti bụ Tochukwu Ikenga, e kwụola na ndị ọrụ uweojii steeti ahụ achọpụtala ma nwụchie ndị omekome a ma ama na-erubeghị dị ọnụọgụgụ 16 bụ ndị na-enweta ọgbaaghara n'Awka, isi obodo Anambra Steeti.

    O kwuru na mmadụ 21 ndị ọzọ bụ ndị gbara ọsọ a na-achọ achọ. N'okwu Ikenga, onyeisi ndị uweojii na steeti ahụ bu CP Aderemi Adeoye enyela iwu ka ekpochapụ mpụ na steeti Anambar.

    Ka ọ dị ugbu a, e nyela ndị otu Special Anti Cult Squad (SPACS) iwu ka ha gba mbọ ịchọta ma wuchie ndị otu nzuzo ahụ gbara ọsọ.

    Ọ kpọrọ oku ka ndị isi obodo na ndị okpukperechi ma kwupụta ajọ omume dị n'ime obodo ha hụrụ.

  11. Suleja jailbreak: 'Ụfọdụ ụlọmkpọrọ dị na Naịjirịa a taala nchara'

    Otu onye ọkacharamara n'okwu nchekwa bụ Patrick Agbambu akpọọla oku ka Gọọmenti Etiti tinye uchu n'ihe banyere nchekwa ụlọmkpọrọ Naịjirịa.

    Agbambu bụ onyeisioche, otu 'Security Watch Africa Initiatives', mere ka amata na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere n'ekwentị banyere mgbapụ ndị mkpọrọ ruru 119 n'ụlomkpọrọ ‘Medium Security’ dị na Suleja, Niger steeti na nsonso a

    N'okwu ya, Agbambu kọwara na ọ di mkpa ka gọọmenti gba mbọ lebaye anya na ọnọdụ ụlọ mkpọrọ Naịjirịa nke ọ kọwara dịka nke kagoro nkà. O kwuru na ụlọ mkpụrụ kwesịrị ịnabata mmadụ 250 ka e tinyere mmadụ 500 n'ime.

    O kọwara na nke bụ ihe kwesịrị ka e leba anya n'ime ya. O mere ka a mata na ndị ọrụ nchekwa ụlọ mkpọrọ kwesịrị inwe ezi nkwado na ozuzu kwa mgbe kwa mgbe iji kwado ha maka ihe mberede ọ bụla.

    Banyere okwu Mịnịsta na-ahụ maka ime ime obodo, Olubumi Tunji-ojo banyere ịkwaga ụlo mkpọrọ ‘Medium Security’ dị na Suleja, Niger steeti, Agbambu kwuru na ya akwadoghi okwu n'ihi na ọ gaghị amita mkpụrụ ọ bụla.

    Lee mgbapụ/mwakpo mere n’ụlọ mkpọrọ Naịjirịa na nsoso a:

    N'isi ụtụtụ Jenụwarị 25 afọ 2021, ndị oji egbe wakporo ụlọ ọrụ mgbazi Nigeria (NCS) dị n’owerri, Imo steeti, tọhapụrụ ihe karịrị ndị mkpọrọ 1,800 ma hapụkwa mbibi n'azụ ha.

    5 Eprel afọ 2021, ndị mkpọrọ 1,844 gbapụrụ n’ụlọ mlpọrọ owerri, Imo steeti, ka ndị ji egbe wakporo ụlọ ọrụ ahụ.

    Akụkọ kwuru na a na-atụ aka na o bụ ndị otu Indigenous People of Biafra (IPOB) kpara agwa ahụ.

    Ụbọchi Tọzde 8 Julaị afọ 2021, mmadụ anọ na-eche ikpe gbapụrụ n'ụlọ mkpọrọ Jos, Plateau steeti.

    N’onwa Septemba 13 afọ 2021, a wapkoro ụlọ mkpọrọ Kabba Correctional Centre di na Kogi steeti, ebe a tọhapụrụ ihe karịrị ndị mkpọrọ di ọnuọgụgụ 2,400.

    Dị ka ndị ọchịchị si kwuo, a nwụchiri mmadu 114 n'ime ndị ahụ gbapụrụ agbapụ.

    Ọzọkwa mere na Ọktoba 22 afọ 2021 mgbe ndị oji egbe wakporo ụlọ mkpọrọ Abolongo di n’Oyo State.

    Ndị mwakpo ahụ tọhapụrụ ndị mkpọrọ 837 na usoro a.

    E mechara nwụchie 262, ebe mmadụ 575 bụ ndị a ka na-achọ achọ. . N’ọnwa Nọvemba 28 afọ 2021, ndị mkpọrọ 262 gbapụrụ n’ụlọ Jos correctional centre, Plateau steeti, ka ndị ji egbe wakporo ebe ahụ.

    E gburu ndị mkpọrọ itoolu, ebe mmadụ 252 nọ n'ụlọ mkpọrọ dịka ndị ọrụ gọọmentị siri kwuo.

    Na 2 Jenụwarị n’afọ 2022, ndị mkpọrọ atọ gbapụrụ na Mandala Custodial Centre, Ilorin, isi obodo Kwara steeti.

    Ọzọ dịka ibe ya mere na 13 Mee afọ 2022 mgbe ndị mkpọrọ atọ gbapụrụ n'ụlọ mkpọrọ Agbor, Delta steeti ka oke mmiri ozuzo kpochapụrụ mgbidi ugwu nke ụlọ mkpọrọ ahụ.

    Ka ọ dị ugbu a, ndị mkpọrọ 879, gụnyere ndị na-eyi ọha egwu dị 64, gbapụrụ n'ụlọ mkpọrọ Kuje, FCT dị n’Abuja ụbọchi Tosde 5 Julaị afọ 2022.

    Ndị otu Islamic State West Africa Province, ISWAP, bụ ndị kwuru na ọ bụ ha kpatara mwakpo ahụ.

  12. Eleme Fire: 'Nwaanyị dị ime, nwa ya so na ndị ọkụ gbagburu'

    Otu n'ime ndị zọtara ndụ ha n'ọkụ gbara n'okporoụzọ Aleto- Eleme na Rịvas steeti akọọla ihe ọ hụrụ na ọdachi ahụ a sị tara isi ọtụtụ ndị mmadụ ụbọchị Fraide.

    Ihe ruru mmadụ ise nwụrụ, ebe ụgbọala karịrị 50 gbara ọkụ dịka ọkụ nwuru na kpachikpachi 'okporoụzọ Eleme dị na Rivas Steeti.

    Idowu Obalola, onye ya na nwunye ya na ụmụ ha atọ zọtara isi ha kwuru na na ọ bụ ụka ka ha na-ala were zute kpachikpachi okporoụzọ.

    O kwuru na ọ bụ ekweghị ekwe butere ya bụ ọdachi.

    N'okwu ya, otu onye ọkwọụgbọala bu mmanụ kwụ na-eche n'kpachikpachi okporoụzọ, nnukwu ụgbọala 'trailer' bịara suo ya n'azụ, mmanụ ụgbọala kwafuru.

    " A gwara onye ọbụla ha gbanyụọ ụgbọala ha mana otu ụgbọala 'truck' kwuru na ya agaghị echeli."

    "Ọ gbanyere ingini ya, ọkụ nwuru."

    Oge m hụrụ na o nweghị ihe m ga-emeli, m kpọrọ nwunye m na ụmụ m atọ, anyị tipu ọsọ."

    Obalola zọtara ndụ ya na ezinaụlọ ya mana ụgbọala Toyota Highlander ha ji gbapịara n'ọkụ ahụ.

    Onye ntaakụkọ BBC Pidgin gara ebe ahụ hụrụ ozu mmadụ atọ gụnyere nwaanyị dị ime, nwa ya na otu onye ọzọ nakwa ụgbọala dị 61.

  13. NSCDC anwụchiela ndị ọrụ nchekwa adịgboroja n'Anambara steeti

    Ndị ọrụ NSCDC Anambara Steeti adọla aka ná ntị nye ndị ọrụ nchekwa nzuzo nke iwu na-akwadoghị na steeti.

    Onyeisi NSCDC na steeti ahụ bụ Comdt. Olatunde Maku nyere ịdọ aka ná ntị a na nsonso a, ka ọ na-egosipụta mmadụ asatọ a na-enyo enyo bụ ọrụ nche nzuzo na-enweghị ikike n'Awka, isi obodo Anambara Steeti.

    N'ozi onye na-ahụ maka mmekọrịta ọha na eze nke NSCDC n'steeti ahụ bụ Edwin Okadigbo binyere aka, e jidere ndị a mgbe ndị ndị ọrụ NSCDC nwetere ozi maka ọrụ ndị ụlọ nchekwa na-enweghị ikike na-aru na steeti ahụ.

    O kwuru na ndị ahụ a nwụchiri gụnyere ndị ọrụ atọ RSS, e jidere na Kwata Junction, Awka dị ka: Eze Emmanuel Uche gbara afọ 34, Patrick Nwoye Joseph gbara afọ 27 na Okafor Chibuike gbara afọ 21, ebe Tochukwu Chukwuemeka dị afọ 27, onye ejidere na ụzọ St Joseph Awka.

    Mmadụ anọ nke ọzọ a na-enyo enyo gụnyere Kingsley Asuauo dị 20, Blessed Mfonu dị afọ 21, Ikechukwu Emeka dị afọ 21 na Amu Emmanuel dị afọ 23 ka e jidere ebe ha na-ahụ maka nchekwa ụlọoriri na ọṅụṅụ.

    E nwetakwara egbe anọ na akụrụngwa nchekwa ndị ọzọ n'aka ha.

    O kwuru na e mesịa nyocha, a ga-akpupu ha ụlọikpe.

    Okadigbo kọwara na ọ bụ naanị ụlọọrụ NSCDC were ike inye ikike na ilebanye anya na nlekọta ụlọọrụ ndị nchekwa onwe na Naijiria ma kpọọ oku ka ndị obodo kpọtụrụ ụlọọrụ NSCDC maka ihe gbasara ndị ụlọọrụ nchekwa iji chọpụta ndị nwere ikike ịrụ ọrụ ahụ.

  14. A gbagbuola nwaanyị Iraqi na-ewu ewu na Tiktok

    A gbagbuola otu nwaanyị na-ewu ewu na soshal midia bụ Om Fahad n’ihu be ya na Baghdad n’ụbọchị Fraide, dịka akwụkwọ akụkọ mba ahụ si kwuo.

    Ministrị na-ahụ maka ihe na-eme n’ụlọ(Interior Ministry) kwuru n’akwụkwọ mgbasaozi ha wepụtarana o mere n’ezie sị, “ Ndị amaghị ndị ha bụ agbagbuola out nwaanyị ama n’igwe soshal midia.”

    Ozi ahụ kwukwara na e hiwela otu pụrụ iche inyocha etu o si nwụọ.

    Akụkọ kwuru na ọ bụ otu onye kwọ ọgbatumtum ji egbe gbara Fahad, onye ezi aha ya bụ Ghufran Sawadi, egbe.

    Otu onye ọrụ nchekwa na Iraq gwaraụlọ ntaakụkọ AFP na onye kpara mkpamkpa ahụ mere ka ọ bụ ndị a na-eji ọgbatumtum ebugara ndị mmadụ nri.

    Nke na-abịa dịka ụlọntaakụkọ Amerịka nwe a kpọrọ Al Hurra kwuru na emerụrụ nwaanyị ọzọ ahụ na mwakpo ahụ tara isi Fahad.

    Fahad ghọrọ onye a ma ama na Tiktok maka ịna-ewepụta ihe onyonyo ebe oyi akwa tapara n’ahụ na-agba egwu nke dọtara ya ọtụtụ ndị na-eso ya.

    A tụburu ya mkpọrọ ọnwa isii n’afọ gara aga maka ikesa ihe onyonyo nke ụlọikpe kwuru na-awụ nye aja na garị n’okwu iji ejiji n’ụzọ kwesịrị ekwesị.

    Nke a na-abịa dịka gọọmentị hiwere kọmiti inyocha soshal midia mata ndị na-etinye ihe onyonyo adịghị mma ma taa ha ahụhụ.

    Na nsonso a, esemokwu dapụtara n'etiti Fahad na onye ọzọ na-ewukwa ewu na soshal midia bụ Dalia Naeem e ji "Iraqi Barbie" mara n'ihi ọtụtụ ugboro ọwarala ahụ e ji achọ mma.

    Naeem majaburu Fahad sị na ọ ga-agba ama ndị welitere isi n'ọchịchị mba Ịraq ha na Fahad na-adị na mma.

  15. Igbo mma mma nụ

    Igbo mma mmanụ o!

    Sonyere anyị maka akụkọ ndị dị mkpa n'ụwa taa.

  16. Ihe karịrị ụgbọala 50 agbaala ọkụ n'Eleme, Porthacourt

    A mabeghi mmadụ ole nwụrụ na nnukwute ọkụ gbapụtara n'abalị ụbọchị Fraịde na steeti Rivers.

    Ihe karịrị ụgbọala 50 na ọtụtụ gwongwororo bibiri na ya bụ ọkụ.

    Akụkọ na-ekwu na otu ụgbọaka tanka na-ebu mmanụ gbawara n'ime kpachi kapachi ụzọ ebe ụgboala juru n'abalị Fraịde.

    BBC chọpụtara na ihe ahụ mere n'akụkụ ụlọaku Ecobank nọ n'akụkụ Indorama petrochemical dị n'Eleme.

    Oke kpachi kpachi dị n'ụzọ Eleme n'okporo zọ Saụt-West maka ihe ahụ mere.

    Ụzọ ahụ na-enwekarị ọtụtụ njem ụgbọla adị icheiche ọkachasị gwongworo ndị na-ebu ngwaọrụ.

    Ụzọ ahụ dị naanị kilomita abụọ n'etiti Potakọt - e sikwa ya aga Akwa Ibom site n'Ogoni nakwa Abịa site n'akụkụ Tai-Aloji.

    Ọtụtụ onyonyo na-efegharị na soshal midịa gosiri etu ọkụ ahụ si dị njọ gbarie ọtụtụ ụgbọala ndị nọ n'ime kpachikpachi.

    A mabeghi ka o nwere ndị nwụrụ n'ọkụ ahụ.

  17. Onye tetara ụra nwetara ngọzị.

    Ya gaziere gị ka ị na-aaga egbo mkpa gị taa.

  18. Fuel scarcity: Ọ bụ nsogbu akụrụngwa butere ụkọ mmanụ ụgbọala - NNPC

    Ụlọọrụ mmanụ Naịjirịa bụ Nigerian National Petroleum Company maọbụ NNPC n’ịchafụ ekwuola na e nweghị mgbanwe ọbula n'ọnụahia mmanụ ụgbọala.

    NNPC dọọrọ ndị mmadụ aka na ntị megide iji maka ụjọ na-azụ mmanụ ụgbọala n’ebe ọ dị ọtụtụ, na-ebute oke ahịrị n'ọdụmmanụ.

    N’ụbọchị Tọzde 25 Eprel 2024, a hụtara ogologo ahịrị ụgbọala n’ọdụmmanụ dị icheiche e nwere n’Abuja, Nasarawa steeti na Niger steeti n’ihi ụkọ mmanụ ụgbọala.

    Dịka NNPC siri kwuo n’otu ozi ọ wepụtara, ihe butere ụkọ mmanụ ahụ bụ nsogbu akụrụngwa e ji ekesa ya.

    Ka o siladị, ụlọọrụ ahụ kwuru na ya egboola ya bụ nsogbu.

    Ọ gbara ụmụafọ Naịjirịa ume ka ha zeghara ịji maka ụjọ zụọ mmanụ ụgbọala n’ebe o buru ibu n’ihi na “mmanụ ụgbọala juru ebe niile.”

    Cheta na onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu nọọrọ n’ụbọchị e duru ya n’iyi ọrụ wezuga ego eji ebelata ọnụahịa mmanụ ụgbọala dịka otu akụkụ mbọ ọ na-agba ime ka ọnọdụ akụnaụba Naịjirịa sikwuo ike.

  19. US TikTok ban: Anyị agaghị ere Tiktok - ByteDance

    Ụlọọrụ nwe ọbaozi TikTok bụ ụlọọrụ mba Chaina a kpọrọ 'ByteDance' ekwuola na ha enweghị mgbe ha chọrọ ire ụlọọrụ ahụ dịka ụlọọmeiwu Amerịka nyere iwu ka e ree ụlọọrụ ahụ nke ha machiri na mba Amerịka.

    N'ozi ụlọrụ ahụ wepụtara n'akara ha dị n'ọbaozi nke ha a kpọrọ a Toutiao, ha kwuru sị,"ByteDance enweghị atụmatụ ọbụla ire TikTok,"

    TikTok asaghị ozi nke BBC zigara ha n'okwu a.

    Na mbido izuụka, TikTok kwuburu ha ha ga agbagha iwu ahụ machiri ha n'ụlọikpe.

    Ozi si ByteDance n'abịa n'ọsịsa akụkọ e dere n'websait ụlọọrụ Technuzu nke kwuru na a na-ele anya ile ma a ga-ere TikTok nke nọ na AMerịka ma e wepụ akọrọgwa 'algorthm' o ji arụ ọrụ.

    Ozi ByteDance wepụtara kwuru sị, "Akụkọ si n'ụlọntaakụkọ mba ndị ọzọ nke kwuru na ByteDance ga-ere TikTok abụghị eziokwu."

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden binyere aka n'iwu ịmachi TikTok na mba ahụ maọbụ ndị nwe Tiiktok iresi ndị ọzọ ụlọọrụ ọbaozi ahụ n'ụbọchị Wenezde.

    Mbnba Amerịka na ụfọdụ mba ndị ọzọ dị na Ọdịda Anyanwu Yurop na atụ uche na otu pati 'Chinese Communist Party' nwere ikike n'ebe ụlọọrụ 'ByteDance' na ozi ndị mmadụ nọ n'ọbaozi Tiktok ha ji.

    TikTok agọọla ugborougboro na Gọọmentị mba Chaina enweghị ikike ọbụla ebe ha nọ,

  20. Ndewoonu, Igbo ndị ọma

    Ndewoonu, Igbo ndị ọma.

    Taa maara ụnụ mma!