Onyeisiala
mba Ukraine bụ Volodymyr Zelensky ekwuola na ndịagha ha buzi ọgụ banye na mba Russia bụ ndị
na-ebuso ha agha.
Nke a dị na
mgbasaozi o mere n’abalị Satọde.
Ọ gara n’ihu
kelee ndịagha Ukraine ma kwuo na ya na onyeisi ndịagha ha bụ Oleksandr Syrskyi nwere
mkparịtaụka banyere mwakpo a ha na-eme na mba Russia.
“Ukraune
na-egosi na ha nwereike iweghachite ikpe ziri ezi ma kwanye onye na-ebuso ha agha
ọkụ n’ike,” ka Zelensky kwuru.
Mana o kwughi
na ọ bụ mpaghara Kursk nke Russia ebe ndịagha Ukraine kpachiri ọtụtụ obodo ma
na-eyi egwu ịkpachi obodo mepere emepe.
Kamgbe ndịgha Ukraine weere ọnọdụ n’obodo Kursk nke mba Russia, ọtụtụ ndị bi ebe ahụ akwakọrọla pụọ dịka ọ na-ara ha ahụ ịkwụsị ndịagha Ukraine.
Ihe karịrị mmadụ 76,000 esila n’obodo ahụ pụọ dịka e tinyere ọnọdụ gbata gbata n’okeala atọ dị na mpaghara ahụ.
Mwakpo ọhụrụ a mgba Ukraine na-eme ụbọchị Tuzde mana ha gafeela ihe karịrị 10km n’ime mba Russia – nke kachasị na mwakpo ịbanye mba Russia ha mere kamgbe Russia wakporo ha n’ọnwa Febụwarị afọ 2022.