You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ndị uweojii Naịjirịa akpọọla Joe Ajaero oku ọzọ

Akụkọ niile dị mkpa na mba ụwa niile n'ọnwa Ọgọst 2024.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Jessica Nwankwo, Chinonso Ugorji, Michael Ngene, Ikechukwu Kalu, Michael Ilediagu, Adline Okere, Uche Akolisa

  1. Egbuola ndị uweojii abụọ n'ọgbaghara ndị Shiites na ndị uweojii n’Abuja

    Ndị uweojii abụọ na otu onye ji ego achụ ego anwụọla ebe mmadụ abụọ ọzọ meruru ahụ n'ọgbaghara dapụtara n'etiti ndị Shiite nke otu Islamic Movement of Nigeria (IMN), ndị na-eso Sheik Ibrahim El-Zakzaky, n'ahịa Wuse dị n'Abuja.

    Akụkọ kwuru na aha onye ahụ ji ego achụ ego bụ Amiru nwụrụ ka a gbara ya egbe n'obi mgbe ndị uweojii na-achụ ndị Shiites ahụ na-eme ngagharịiwe.

    Otu onye hụrụ ihe mere jụrụ ka a kpọ aha ya kwuru na e bugara nwoke ahụ n’ụlọọgwụ Wuse Zone 3 ebe ọtụtụ ndị uweojii merụrụ ahụ n’esemokwu ahụ nọ.

    Ndị na-eso otu IMN na-eme ngagharịiwe nke ha na-akpọrọ Arbaeen, bụ ụbọchị iri anọ ka ọgbakọ Ashura gachara.

    Ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n’Abuja bụ Josephine Adeh kwuputara na ogbugbu egburu ndị ọrụ ha abụọ na imerụ mmadụ abụọ ọzọ ahụ yana ọkụ a gbara ụgbọala atọ ndị uweojii n'ọgbaghara ahụ bụ nke na ọdịghị mkpa. Ọ gara n’ihu kwuo na ọ ghọtaghị ihe mere otu Shiites ahụ ji wakpo ndị uweojii.

    Mana ozi anyi nwetara n’aka ndị otu Shiites nke Sheikh Sidi Munir Mainasara binyere aka kwuru na ọ bụ ndị uweojii wakporo ha ma gbuo ụfọdụ ndị otu ha ma wuchie ụfọdụ.

    Sheikh Sidi Munir Mainasara kwuru na ndị meruru ahụ na-enweta nleta n’ụlọọgwụ ebe ọ gara n’ihu kwuo na ọ ga-ewepụta aha ndị otu ha ndị uweojii wuchiri.

  2. A nwụchiela onye hiwere ọbaozi Telegram n’ọdọụgbọelu France

    Ndị uweojii Fransị anwụchiela onye hiwere ọbaozi Telegram bụ Pavel Durov n’otu ọdọụgbọelu dị na mgbago ugwu Paris.

    Ndị ntaakụkọ kwuru na e jichiri Durov oge ụgbọelu nke onwe ya dara n’ọdọụgbọelu Le Bourget Airport.

    Dịka ndị ọrụ nchekwa siri kwuo, a nwụchiri nwaamadị ahụ bụ akajiakụ gbara afọ iri atọ na itoli (39) n’ihi mpụ dị iche iche ndị metụtara ọbaozi o mepụtara e ji ezikọrịta ozi bụ Telegram.

    Ndị ntaakụkọ kwuru na nnyocha a na-eme Durov bụ n’ihi enweghị ndị nchịkọta dịka a na-ebo ya ebubo na e nweghị ihe ọbụla o mere iji gbochie ndị omekoome na-eji ọbaozi ya eme ihe.

    A mụrụ Pavel Durov na Rọshịa mana o bi na Dubaị. Ọ bụ onye nwere ikikere nwaamaala nke mba United Arab Emirates nakwa Fransị.

  3. A nwụchiela mmadụ isii maka ịnyụ maamịrị n’okporoigwe

    Gọọmenti Legọs steeti anwụchiela mmadụ isii maka ịnyụ maamịrị n’okporoigwe dị n’ihu ọgbara ụlọahịa nke ndịagha Naịjirịa dị n’Oshodi.

    Ọ bụ kọmịshọna na-ahụ maka ogbe obibi na Legọs steeti bụ Tokumbo Wahab kpuhere nke a n’ozi o bipụtara n’akara ọbaozi X ya n’ụbọchị Satọdee 24 Ọgọst 2024.

    Ọ sịrị na a nwụchiri mmadụ isii ndị ahụ n’ụbọchị Satọde dịka gọọmenti Legọs steeti na-ebu agha megide ajọ akparamaagwa gburugburu steeti ahụ iji hụ na e nwere ogbe dị ọcha.

  4. Ndị uweojii anwụchiela ndị ntọrị a na-enyo enyo n’Imo steeti

    Ndị uweojii sitere n’ụlọọrụ ndị uweojii Imo steeti anwụchiela mmadụ ise a na-enyo enyo ịbụ ndị ntọrị na-eyi egwu na mpaghara Obinze, Avu na obodo ndị ọzọ gbara ha agbataobi.

    Ọ bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti bụ Henry Okoye kwuru nke a n’otu ozi ọ wepụtara n’ụbọchị Satọde 24 Ọgọst 2024.

    Ọ sịrị na a na-enyo ndị omekoome ahụ enyo maka ntọrị otu nwaanyị gbara afọ iri abụọ na isii (26) site n’ụlọ ya dị n’Obinze, Okpuru ọchịchị Owerri West n’Imo steeti.

    Dịka Okoye siri kwuo, ndị ntọrị ahụ a na-enyo enyo gụnyere Umaru Usman gbara afọ iri anọ (40) ma bụrụ nwaafọ Mauree dị na Sokoto steeti; Tukur Yau gbara afọ iri abụọ na ise (25) ma bụrụ nwaafọ Dawakin Kudur dị na Kano steeti; Musbau Sabo gbara afọ iri na asatọ (18) ma bụrụ nwaafọ Warsaw dị na Kano steeti; Abdul Ibrahim gbara afọ iri atọ (30) ma bụrụ nwaafọ Sokoto steeti na Jubrin Idris gbara afọ iri atọ na ise (35) ma bụrụ nwaafọ Sokoto steeti.

    Ọ gara n’ihu kwuo na ndị uweojii wakporo ogige ndị ekperima ahụ dị n’Avu, nwụchie mmadụ ise n’ime ha ma napụta nwaanyị ahụ ha tọọrọ.

    Ngwongwo anapụtara ha bụ ndị ekperima gụnyere otu egbe pump action, mgbọegbe ise, mkpọ dagger 2, otu mma egbutu na ọtụmọkpọ ọjọọ dị iche iche.

    Okoye kwuru na ha ka na-eme nnyocha iji nwụchie ndị otu ha fọrọ afọ ma kpọpụ ha n’ụlọikpe.

  5. Ndị uweojii anwụchiela nwaanyị zoro mgbọegbe 124 n’ime mmanụ nri

    Ndị uweojii Nasarawa nọọrọ n’ụbọchị Fraịde 23 Ọgọst 2024 nwụchie otu nwaanyị aha ya bụ Hauwa Sani maka izo mgbọegbe otu narị na iri abụọ na anọ (124) n’ime galọn mmanụ nri.

    Ọ bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Nasarawa bụ Ramhan Nansel depụtara nke a n’akara ọbaozi X ụlọọrụ ahụ n’ụbọchị Satọde 24 Ọgọst 2024.

    Ọ sịrị na ndị uweojii nwụchiri nwaanyị ahụ ma napụtakwa ya puku Naịra iri asaa na asatọ na narị ise (78,500) na otu ekwentị oge ọ na-agba mbọ ibuga ngwaọgụ ahụ Katsịna steeti.

    Kọmịshọna ndị uweojii Nasarawa bụ Shehu Nadada enyela iwu ka enyefee nwaanyị ahụ a na-enyo enyo na ihe akaebe ndị anapụtara ya n’isi ụlọọrụ ndị uweojii dị n’Abụja maka ime ezi nnyocha.

  6. Israel atụọla ogbuniigwe na Lebanon dịka Hezbollah jiiri mgbọ rocket zaghachi ha

    Izrel esila n’elu tụọ ogbuniigwe n’ebe ha chere bụ ebe mgbazo otu Hezbollah na Lebanọn.

    Ụlọọrụ ndịagha Izrel kwuru na ha mere nke ahụ oge ha chọpụtara na ndị otu Hezbollah na-eme atụmatụ iwakpo mba ha.

    Hezbollah kwuru na ha amalitela “agba nke mbụ” na mwakpo ha na-eme Izrel site n’ịtụ ọtụtụ ogbuniigwe Katyusha rocket n’ebe ndị Izrel nọ.

    Dịka Hezbollah siri kwuo, ha enwetazuola ebumnoobi ha nke ụbọchị taa.

    Minista nchekwa Izrel bụ Yoav Gallant ekwupụtala ọnọdụ gbatagbata mkpụrụ ụbọchị abụọ gburugburu Izrel.

    Ọnọdụ ọgbaaghara a sochiri onye ọchịagha Hezbollah e gburu na Beirut ihe dịka otu ọnwa gara aga.

  7. Ndị uweojii mba Fransị amalitela nyocha ihe gbara n'otu Synagogue n'ebe ahụ

    Ndị uweojii mba Fransị amalitela inyocha ihe dara nnukwu ụda dịka ogbunigwe n’akụkụ Synagogue dị na mpaghara Le Grande-Motte dị na mba ahụ.

    Ndị ma anya okwu ahụ kwuru na o nwereike ịbụ akaọrụ ndị na-eyi ọha egwu bụ ndị chọrọ igbu ndị mmadụ.

    Ndị uweoji kwuru na ụgbọala abụọ gbara ọkụ na akụkụ Yaacov Synagogue na mpaghara ogbe ahụ ma kwuo na otu n’ime ụgbọala ahụ were mkpọ gaasị e zoro n’ime ya.

    Ndị uweoji gwara ndị ntaakụkọ Fransị na onye ha hụrụ n’ihe onyonyo ndị nchekwa jị uwe ọkọrọ Palestine na ihe nwereike ịbụ obere egbe.

    Onyeisi agbụrụ ndị Jew na mpaghara ahụ bụ Yonathan Arfi kwuru na ‘ihe ahụ bụ mbọ ha gbara ka ha gbuo ndị Jew” ma kwukwa na ndị omekoome ahụ chọrọ ịwakpo ndị na-eme ekpere n’ụtụtụ Satọde.

    Onye uweojii meruru ahụ n’oge unnukwu ụda ahụ dara ka n’ụlọọgwụ maka ahụ o meruru.

    Mana onyeisi ekpere ndị Jew bụ Rabbi na mmadụ ise ndị ọzọ bụ ndị nọ n’ime ụlọ ekpere ha oge ihe ahụ gbawara.

    Onyeisiala mba Fransị bụ Emmanuel Macron akọwaala ihe mere dịka “iyi ọha egwu”.

    Onye hụrụ ebe ihe mere kọọrọ BBC na "dịka anyị na-abịa nso, ihe ọzọ anyị hụrụ bụ ụda mara ebe niile jijiji, dịka ọkụ na-enwu n'eluigwe".

  8. Gọọmenti Enugwu akwatuọla ogige ndị ntọ dị na steeti ahụ

    Gọọmenti Enugwu steeti kwaturu ọtụtụ ụlọ bụ nke ha kwuru na-eji ya mere ọnọdụ ebe ndị ntọ na-edobe ndị ha tọọrọ n’mpụga steeti ahụ.

    Gọọmenti Enugwu mere ka amata nke an’akwụkwọ mgbasa ozi ha deputara n’abalị garaaga.

    Ha kwuru na ha kuturu ọtụtụ ụlọ ahụ dị na Nkwubor layout dị na Emene Nike nakwa ọzọ dị na Ogbeke Nike bụ ogbe abụọ dị n’okpuru ọchịchị Enugu East.

    Ha kwuru na gọọmentị kụrịrịr ụlọ ndị ahụ n’ụbọchị wenesde ma hụ ngwa agha dị icheiche nakwa ụlọ bụ nke e ji azụ ọkụkọ, ezi nakwa ugbo were ụbara abirika.

    Onyeisi ndị Enugu Capital Territory Development Authority, ECTDA, Uche Anya kwuru na ha na -akụrị ụlọ ndị ahụ maka iwu steeti ahụ kwuru na-enweghị ebe ndị omekome ga-eji mere ebe mgbaba.

    “Gọọmentị na-agbambọ ibenata mpụ dị icheiche. Ọtụtụ ndị mmadụ ka ndị omekome tọọrọ ma kpụta ha ebe a.

    Otu onye na ndị ha tọọrọ gunyere nwanyị nke ha tọọrọ n’akụkụ mahadum Naịjirịa dị na Nsukka”.

    “Anyị na-agwa ndị were ụlọ, ha abịakwala sị anyị na ha amaghị ihe na-eme n’ụlọ ha, na ha nọ n’Saụt Afrịka, China ma ọ bụ Germany.

    Ọ bụrụ na e were ụlọ gị mee ebe a na-edobe ndị a tọọrọ, mee ihe ọjọọ, gọọmentị ga-achọrọ gị bịa”

    Anya kwuru sị na ihe na-eme n’Nkwubor Emene Nike na-agba anya mmịrị maka na ndị ntọ rụrụ ụlọ nga n’okpuruala bụ ebe ha na-ezo ndị ha tọọrọ.

    Ọ kwukwara na ha chọpụtara ọtụtụ ngwa agha dịka AK47 na akụrụngwa ndị ọzọ bụ nke mmadụ nkịtị ekwesighị iwe n’ụlọ.

    “Nke a mere anyị gị akụrị ụlọ ahụ dịka ndị Gọvanọ sị nye iwu n’usoro akwụkwọ iwu Enugwu steeti”.

    Ọ gara n’ihu kwuo na “Gọvamenti ga-ewere ala ndị ahụ a kuriri ụlọ ma rụọ ihe ga-abara ọha uru”.

    “Gọmenti ga-ewere ebe ahụ niile a kuriri were rụọ ebe ụmụaka ga-egwuegwu, ụlọọgwụ, na ihe ndị ọzọ.

  9. Ụmụakwụkwọ 20 ndị ji egbe tọọrọ na Benue Steeti enwerela onwe ha

    Ndị uweojii ekwuola na a tọhapụla ụmụakwụkwọ 20 ahụ na ndịọzọ ndị ji egbe tọọrọ na Benue Steeti.

    Onye na-ekwuru ndị uweojii Naịjirịa bụ Muyiwa Adejobi kwuputara nke a n’ozi o wepụtara n’akara soshal midia X.

    O kwuru na ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndịọzọ rụrụ iji napụta ụmụakwụkwọ n’ime ọhịa ntunkon dị na Benue steeti.

    Adejobi kwuru na-enweghị ego ọbụla a kwụrụ iji zọpụta ụmụakwụkwọ ahụ.

  10. Onye nkuzi otu egwuregwu bọọlụ Heartland FC bụ Christian Obi anwụọla

    Otu egwuregwu bọọlụ Heartland FC ekwuputala ọnwụ onye nkụsi ha bụ Christian Obi onye nwụrụ n;ihe mberede okporoụzọ ụbọchị Fraịde 23 Ọgọst, 2024.

    Ihe mberede ahụ taara isi Christian Obi mere oge otu egwuregwu ahụ si Owerri isi obodo Imo Steeti na-aga Abakaliki iji sonye n’asọmpi TICO/SELECT Ifeanyi Ekwueme Preaseason Tournament.

    Ozi Heartland FC wepụtara kwuru na otu ụgbọala ha ji eme njem kụpọrọ ụgbọala truck dịka ọ na-achọ izere ụgbọala na-abia ha n’ihu.

    E bugara Christian Obi na ndị otu bọọlụ ahụ meruru ahụ n’ụlọọgwụ dị na Okwelle n’okpuruọchịchị Onuimo ebe ọ nọrọ wee nwụọ.

    Ozi ha gara n’ihu kwuo na e bugara ndị ahụ otu egwuregwu ahụ meruru ahụ n’ụlọọgwụ University Teaching Hospital (FUTH) maka ezi nleta, ebe e tinyere ozu Christian Obi n’ọba ozu FUTH.

    N’aka nke ọzọ, ụlọọrụ na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ na Naịjirịa bụ Nigeria Football Federation ekwuputala mwute ha n’ọnwụ Christian Obi onye nwụrụ n’ihe mberede okporoụzọ ahụ.

    Onyeisi NFF bụ Ibrahim Musa Gusau kasiri ezinaụlọ Christian Obi, ndị enyi ya nakwa otu egwuregwu Heartland FC obi ma kpe ekpere ka obi ya zuoike na ndọkwa.

    Christian Obi bụ onye otu egwu bọọlụ Naịjirịa U-20 ritara ọla nchara n’egwuregwu World Youth Championship n’afọ 1985.

    O so n’otu egwu bọọlụ Naịjirịa sonyere n’asọmpi Seoul Olimpik n’afọ 1988.

  11. Otu Heartland FC enweela mberede okporoụzọ

    Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na ụgbọala otu bọọlụ Heartland FC adanyela na mberede okporoụzọ taa dịka ha na-aga Abakaliki.

    BBC ghọtara na ọ bụ asọmpị Ifeanyi Ekwueme nke na-eme n'Abakaliki ka ha na-akwado ịga mgbe nke a mere.

    Dịka ihe si kwụrụ ugbua, amabeghi ma o nwere onye nwụrụ na ya bụ ihe mere n'Umunna dị nso n'Okigwe Imo steeti.

    Ndị merụrụ ahụ na ya bụ ọdachi nọ n'ụlọọgwụ ugbua anata ọgwụgwọ.

    BBC Igbo ka na-agba mbọ ịnweta ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo steeti gbasara okwu a.

  12. Peter Obi akpọọla ọkụ ka gọọmenti soro ụzọ iwu kwadoro n'okwu ha na Joe Ajaero

    Onye zọrọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa na ntụliaka afọ 2023 bụ Peter Obi akpọọla ọkụ ka gọọmenti soro ụzọ iwu kwadoro n'okwu ha na onye otu jikọrọ ndị ọrụ Naịjirịa a kpọrọ Nigeria Labour Congress bụ Joe Ajaero.

    N'ozi Peter Obi wepụtara n'aka a soshal midịa X ya, o kwuru na ebubo ahụ e boro Joe Ajaero na ọ na-akwado ndị na-eyi ọha egwu bụ nnukwu ebubo kwesịrị ka e soro ụzọ iwu kwadoro mee nyochaa dị na ya.

    Ọ gara n'ihu kwuo ka gọọmenti hụ na ọkpụkpụ oku ahụ ha kpọrọ Ajaero abụghị iji kagbuo ya kama ya bụrụ maka ezi nyocha.

    Peter Obi doro ndị ọrụ Naịjirịa aka na ntị ka ha soro ụzọ iwu kwadoro n'ihe ọbụla ha chọrọ ime dịka okwu a na-aga n'ihu.

  13. Kamala Harris anabatala ikike otu Democrats nyere ya iji zọọ ọkwa onyeisiala mba Amerịka

    Osote onyeisiala mba Amerịka bụ Kamala Harris anabatala ikike e nyere ya ka dịka onye ga-eji aha Democrats zọọ ọkwa onyeisiala Amerịka na ntụliaka a ga-eme n'ọnwa Nọvemba 2024.

    N'ozi nnabata ya, Kamala Harris mere ka a mata na ọ ga-enweta ezi mgbanwe ma mee ka mba Amerịka jikọọ onwe ha ọnụ ma dị n'udo.

    Harris ji ohere ahụ kọwara ndị Amerịka onwe ya ọzọ ma gwa ndị nkwado ya nakwazi ndị Amerika niile ka ha nye ya kwado ha iji hụ na mba Amerịka gara n'ihu.

    Kamala Harris gbara afọ 59, bụ nwaanyị ojii mbụ a họpụtara dịka onye ga-eji aha Democrats zọọ ọkwa onyeisiala.

    Cheta na onyeisiala Joe Biden wezụgara onwe ya izọ ọkwa onyeisiala maka ọnọdụ ahụike ya.

  14. Benjamin Kalu nwereike ịgba ụlọ mgbasaozi wepụtara ozi ya akwụkwọ n'ụlọikpe

    Akụkọ na-ekwu na osote onyeisi ụlọomeiwu nta Naịjirịa bụ Benjamin Kalu chọrọ ịgba ụlọ mgbasaozi ahụ wepụtara akụkọ kwuru na otu pati APC ga-enwere ọkwa ọchịchị n'Abia steeti na ntụliaka afọ 2027.

    Cheta na ozi ahụ pụtara na soshal midịa n'izu a ebe Benjamin Kalu kwuru na o nwere etu o dị na ya bụ onye nke isii na Naịjirịa onye otu pati ọzọ a na-achị steeti ya bụ Abia.

    Ka ozi a pụtara, ọtụtụ mmadụ na otu gụnyere Peoples Democratic Party katọrọ ma kagbuo okwu ahụ dịka ihe na-ekwesịghị ekwesị.

    Mana ka ọ dị ugbua, ọkaiwu Benjamin Kalu bụ K.C. Nwufor kwuru na ha na-akwado ịgba ụlọ mgbasaozi ahụ akwụkwọ n'ụlọikpe n'ihi na ozi ha wepụtara abụghị ihe Benjamin Kalu kwuru.

  15. O nweghị ihe jikọrọ Wale Tinubu n'ụlọọrụ anyị - NNPC asaala Atiku

    Akụkọ bidoro fegharịwa site na mgbe Paul Ibe bụ ọnụ na-ekwuru onye bụbu osote Onyeisiala Naịjirịa bụ Abubakar Atiku boro Wale Tinubu ebubi maka ịbụ onye kachasị nwee ego n'ụlọọrụ NNPC. NNPC wee sakwa ya ka ha sị na "o nweghị ihe jikọrọ Wale Tinubu n'ụlọọrụ anyị".

    Olufemi Soneye bụ onye na-ekwuchitere ụlọọrụ NNPC sị na ejila anya hụ ma ji ntị nụ ihe Paul Ibe dere banyere etu o ji wee boo Wale Tinubu, mana "ha chọrọ ka wa nụ na o nweghị ihe dị etu a"

    Atiku site n'aka odee akwụkwọ ya sị na “ndị aghụghọ awakpoola ụlọọrụ NNPC naa ndị mwakpoo a n'ebubo ya gbara Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Ahmed Tinubu.

    N'ime ọsịsa ha dị n'akara nọmba itoolu, ha jiri nwayọ saa Atiku banyere ebubo ys ma kọwaa na

    Ha sị na ego ahịa niile a na-atụbanye n'ụlọọrụ NNPC na-eso n'usoro nke anya niile ga-ahụ.

    Ha wee kọwakwa etu Wale Tinubu si nwee oke gafere 45% n'ụlọọụ ndị o nwere n'afọ ha bidoro okwu orire ụlọrọụ mmanụ ụgbọala Oando na OVH bụ azụmahịa dị icheiche o nwere makwa na ha gaghị eso tinye ọnụ n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị na Naịjirịa.

  16. Gọọmenti Naịjirịa ebuliela ọnụego passport Gọọmenti Naịjirịa ekwuola na ha ga-ebuli ọnụego e ji enweta akwụkwọ njirimara

    Ọnụ na-ekwuchitere ụlọọrụ Nigeria Immigration Service bụ Kenneth Udo kwupụtara nke a n'ozi ọ wepụtara n'ụbọchị Wenezde 21 Ọgọst 2024.

    Ozi ahụ kwuru na mbuli ọnụego passport ga-amalite n'abalị mbụ nke ọnwa Septemba, afọ 2024.

    Dịka o siri kwuo, ụlọọrụ Immigration mere nke a iji hụ na akwụkwọ passport Naịjirịa gara n'ihu bụrụ ọkaibe.

    Ozi ahụ sịrị na passport ndị nke nwere ihu akwụkwọ iri atọ na abụọ (32) ga-abụ puku Naịra iri ise (50,000) karịa puku Naịra iri atọ na ise (35,000) ọ bụbu n'oge gara aga ebe ndị nke nwere ihu akwụkwọ iri isii na anọ (64) ga-abụzi otu narị puku Naịra (100,000) karịa puku Naịra iri asaa (70,000) ọ bụbu n'oge ochie. Ka osiladị, ụlọọrụ Immigration kwuru na ọnụego e ji enweta passport agbanweghị na mba ndị ọzọ.

  17. Ọka nwere nsị ebutela ụjọ na Zambia dịka nkịta 400 nwụrụ

    Ụmụ nkịta dị narị anọ (400) anwụọla na Zambịa n'ime otu ọnwa gara aga oge ha richara nri ọka nwere nsị n'ime ya ebe a na-atụ egwu na ụmụ mmadụ nwereike ịnọ n'ize ndụ.

    Oge ọ na-ekwupụta nke a, minista ahụike Zambịa bụ Elijah Muchima sịrị na nri ọka iri abụọ na ise (25) e nwetara n'ụlọọrụ na-emepụta ha gosiri na ogogo nsị 'aflatoxins' dị ha n'ime dị ọtụtụ.

    Ọka bụ nri bara ụbara na Zambịa, nke a mere Muchima jiri kwuo na ihe a chọpụtara na nnyocha ahụ bụ nke e kwesịrị ilebara anya nke ọma n'ihi ọtụtụ mmetụta o nwere n'ahụike ụmụafọ mba ahụ. Ụlọọrụ ahụike mbaụwa bụ World Health Organisation (WHO) ekwuola na nsị aflatoxins nwereike ibutere mmadụ kansa imeju.

    Ndị ọchịchị Zambịa malitere ime nnyocha na nri ọka a na-ekesa na mba ahụ oge onye ntaakụkọ nke ụlọmgbasaozi Diamond TV chọpụtara na ọtụtụ nkịta nwụrụ oge ha richara ọka nwere nsị aflatoxins n'ime ya.

    Ministri ahụike Zambịa ekwubeghị na mmadụ anwụọla site n'ọka ahụ nwere nsị mana ụlọọrụ Zambia National Public Health Institute kwuru na ha na-agba mbọ ugbua ịchọpụta ma ọka ahụ na-adịghị mma enweela mmetụta n'ahụike ọhanaeze.

  18. Kwụsị ịkpagbu, ịmaja Joe Ajaero na otu NLC na Naịjirịa - Otu jikọrọ ndị ọrụ n'Afrịka

    Otu jikọrọ ndị ọrụ n'Afrịka niile bụ ITUC agwaala gọọmenti Naịjirịa ha kwụsị ikpagbu na mmegbu ha na-emesa otu NLC, TUC na ndị isi ha.

    Otu ahụ dọrọ aka na ntị maka nke a n'ozi ha weputara n'ụbọchị Tuusde.

    N’akwụkwọ ozi ahụ, ITUC-Afrịka zipuru nke ode akwụkwọ ha bụ Akhator Joel Afolabi Odigie binyere aka, ha gwara gọọmenti Naịjirịa ka akwụsị mkpagbu na ịmaja ndị ịsị otu jikoro ndị ọrụ.

    “Anyị ahụla etu ndị uweoji sị degara Joe Ajaero akwụkwọ ka ọ bịa zara ọnụ ya maka ebubo ịyị ọha egwu na ihe ndị ọzọ, nakwa ka ha sị kwuo na ha ga-awuchi ya n’akwụkwọ ozi ahụ Adamu Mu’azu binyere aka”.

    “Ihe nke a bụ gọọmenti iji ike ha nwere na-akpagbu ndị ọrụ ma megide ikike diaara ha” ka ITUC kwuru.

    Ha gwakwara gọọmenti Naịjirịa ka ha kwanyere ikike dịara mmadụ ugwu ma nye ndị ịsị ndị ọrụ ohere ịkwụpụta obi ha na-enweghị ụjọ.

    “Ọ bụrụ na-akwụsịghị ihe ndị a, ọ ga emebi ugwu Naịjirịa nwere na-etiti mba ụwa, ọ kachasị n’ngaraba azụmahịa”.

    Cheta na ndị uweojii akpọbuola Ajero ka ọ bịa zara ọnụ ya maka ebubo ikwado iyindụegwu nke Ajero zaghachiri ha na ọ ga-aza oku ahu n'izuụka na-abịa.

  19. Ndị na-akwọ ụgbọala egosila iwe ha n’Imo steeti n’ihi mmanụ ụgbọala dị ọnụ

    Akụkọ tiwara n’ụbọchị Tuzde 20 Ọgọst 2024 na ndị na-akwọ ụgbọala bọọsụ n’Imo steeti na-eme ngagharịiwe n’ihi ọnụahịa mmanụ ụgbọala e buliri elu.

    Ọnọdụ ahụ tinyere ndị njem n’ọnọdụ amaghị nke a ga-eme dịka ha ji ụkwụ a gara mkpa ha tụmadị ndị nke ji okporoụzọ Orji/Okigwe eme ihe.

    Ụfọdụ mmadụ kwuru na ndị na-akwọ ụgbọala mere ngagharịiwe ahụ maka na ndị njem ekweghị abanye n’ime ụgbọala ha n’ihi ụgwọ njem ha buliri elu.

    Oge BBC kpọtụụrụ onyeisioche otu jikọrọ ndị ọrụ okporoụzọ National Union of Road Transport Workers (NURTW) n’Imo steeti bụ Hon. Samuel Ude, ọ sịrị na ọ bụghị ngagharịiwe ka ndị na-akwọ ụgbọala mere.

    Dịka o siri kwuo, ndị na-akwọ ụgbọala n’okporoụzọ Orji gosiri iwe ha banyere ihe ndị na-eme n’oge ugbua tinyere ọnụahịa mmanụ ụgbọala e buliri elu bụ nke mere ka ha gbakwunye ego n’ụgwọ njem site na narị naịra abụọ na iri ise (250) ruo narị naịra anọ (400).

    Ka osiladị, Ude kwuru na ya ezutela ndị ọkwọụgbọala ahụ ma rịọ ha ka ha tụgharịa uche n’ihi na nsogbu ọnọdụ akụnaụba metụtara onye niile.

    Ọ gwara ha ka ha belata ụgwọ njem ka ọ bụrụzie narị naịra atọ (300) maka ndị si Owerri aga Orji na ndị si Orji aga Owerri.

  20. Onyeisiala Gabon akwụsịla ndị ọchịchị ịga ezumiike na mba ofesi

    Onyeisiala nchereoge Gabọn bụ Gen Oligui Nguema egbochiela ndị ọchịchị mba ahụ ịga mba ofesi maka ezumiike ma belata oge ezumiike ha ka ọ bụrụ naanị otu izuụka.

    O kwupụtara iwu ọhụrụ ndị a na tivii oge ọ gachara gburugburu mba ahụ iji mata ọnọdụ ndị ha na-achị.

    Ụfọdụ mmadụ na-ekwu sị e nwere ike Gen Nguema na-eme ka ndị mmadụ hụ ya n’anya maka ịzọ ọkwa onyeisiala na ntụliaka a ga-ahazi n’ime afọ na-abịa abịa.

    Kemgbe Gen Nguema weghaara ọchịchị n’ike na Gabọn, ọ gbaala nnukwu mbọ ime ka ndị obodo ahụ mata na ihe niile ọ na-eme bụ maka ọdịmma ha.

    Ka osiladị, o kwupụtabeghị n’ihu ọhanaeze ma o nwere mmasi isoro zọọ ọkwa onyeisiala Gabọn na ntụliakaelu mba ahụ ga-ahazi n’afọ 2025.