NJC enyela iwu ka e nyochaa ọkaikpe 27 nke steeti na gọọmenti etiti Naịjirịa
Otu ndịọrụ ikpe Naịjirịa bụ National Judicial Council (NJC) ehibela otu kọmiti 4 ga-enyocha ọkaikpe 27 nke gọọmenti etiti na nke steeti maka nrụrụaka.
Ozi onyeisi ngalaba mgbasaozi NJC bụ Soji Oye wepụtara kwuru na atụmatụ ahụ pụtara ihe n’ọgbakọ ha nwere nke ọkaikpe ukwu Naịjirịa bụ Olukayode Ariwoola nọ n’isi ya.
Soji Oye kwuru na e nwetara akwụkwọ mkpesa 22 e dere maka ndị ọkaikpe 27 ahụ.
N’ime akwụkwọ mkpesa 22 ahụ, NJC kwuru na 18 enweghị isi ọbụla.
Otu NJC gara n’ihu dọọ ọkaipe O. M. Olagunju nke ụlọikpe ukwu Oyo steeti aka na nti banyere ikpe ọ na-ekpe. A gwara ya ka ọ ghara ikpe ikpe na-ezighị ezi.
NJC kwuru na a na-elebanyere ọkaikpe 5 anya maka ikpe gbara mmiri ha na-ekpe ma kwuo na ha nwereike inweta ntaramahụhụ maọbụrụ na ha agbanweghị.
Ọgbakọ ahụ bụ nke ikpeazụ ọkaikpe Olukayode Ariwoola ga-anọ n'isi ya dịka ọkaikpe ukwu Naịjirịa tupu ọ naa ezumuike nka.