Ndị uweoji agwaala Joe Ajaero bụ onyeisi otu jịkọrọ ndị ọrụ nNaịjirịa ka ọ bịa zara ọnụ ya maka ebubo ịkwado ndị na-eyi ọha egwu, itisa obod, iso ndị omekome na ihe ndị ọzọ.
Ụlọọrụ ndị uweoji mere ka a mata nke a n’akwụkwọ ọzị Amamu Mu’azu binyere aka bụ nke ha jị akpọ Joe Ajaero ka ọ bịa zara ọnụ ya.
N’akwụkwọ ozi ahụ bụ nke ndị uweoji dere n’abalị Mọnde 19 Ọgọst 2024 ka ha nọ sị Joe Ajaero nọrọ n’ụlọọrụ ha taa n'elekere iri nke ụtụtụ.
Ha kwuru na ọ bụrụ na Ajaero abịaghị n’ụlọọrụ ha, na ha ga-enweta ikike ịnwụchi ya.
Na nzaghachi, otu Jịkọrọ ndị ọrụ Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress (NLC) kwuru na e nwee ihe mere onyeisi ha bụ Joe Ajaero maọbụ onye otu ha n’aka ndị uweoji, na ha ga amalitae abụbọọrụ ozugbo ozugbo.
NLC mere ka amata nke oge ha mechere nzụkọ gbatagbata maka nyocha ndị uweoji kwuru na ha na-eme n’isi onyeisi ha.
NLC sị na abụbọ ọrụ ahụ ga-amalita na-etiti abali ga-efota echi.
N’akwụkwọ ozi osote onyeisi NLC bụ Ado Sani Minijibir binyere aka, “nyocha ndị uweoji a edoghị anya. Ọ dịka aka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị a dị na ya”.
Ha kwuru na “kama ndị uweoji ga-arịọ ebere maka ịwakpọ ụlọọrụ anyị, ndị Uweoji malịtara ịkpagbu anyị”
“Ihe a bụ naanị etu ha sị chọọ imechi ndị ọrụ ọnụ ma mechie ndị isi otu jịkọrọ ndị ọrụ ọnụ”.
“Anyị ga-eje hụ ndị uweoji, zaa oku ha kpọrọ”
Ndị NLC gị ohere ahụ katọọ ebubo niile ndị uweoji boro onyeisi ha ma kọwaa dịka etu ndị mmadụ sị chịọ itisa otu ha.
Ha gwara gọọmenti ka ha kwụsị nyocha ahụ ndị uweoji na-eme.
- Agaghị m enwe ohere bịa taata zaa ọnụ m maka ebubo ahụ - Ajaero
Onyeisi otu jịkọrọ ndị ọrụ (NLC) bụ Joe Ajaero agwaala ndị uweoji na ya ama nwe ohere taata ịbịa zaa ajuju gbasara ebubo ahụ ndị uweoji kwuru na ha na-enyocha.
Joe Ajaero bụ onye gị onye ọka iwu ya bụ Femi Falana were degara onyeisi ndị uweoji akwụkwọ rụtụrụ aka na ya wetere akwụkwọ ọzị ịbịa n’ụlọọrụ ndị uweoji naanị abalị garaaga.
Ọ kwuru na ya agaghi enwe ohere ịbịa n’ụlọ ọrụ ndị uweoji ruo n’ụbọchị Wenesde, Ọgọst 29 bụ oge ya ga-akwado ịza ajuju gbasara ebubo e boro ya.
Ajaero gara n’ihu gwa ndị uweoji ka ha doo ya anya, ma kọwara ya ọfụma ihe niile gbasara ebubo ahụ.