You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Kanada akwadoola ịnabata Palestine dịka mba nweere onwe ya

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Julaị 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu

  1. Rụwanda ezigaala ndịagha 6,000 n’ọwụwa anyanwụ DR Kongo

    Otu Mbaụwa bụ United Nations (UN) eboola Rụwanda ebubo itinye aka n’ihe metụtara ndịagha na mpaghara ọwụwa anyanwụ mba DR Kongo.

    Dịka ụlọmgbasaozi redio asụsụ French bụ RFI siri kwuo, Kịgali ezipụla opekatampe ndịagha puku isii na mpaghara ahụ.

    Ozi ahụ e wepụtara ụnyahụ kpughere etu mba Rụwanda siri kwado ndịagha nnupụisi M23 oge ha kpachiri obodo Goma na Bukavu na mmalite afọ a.

    Ozi ahụ kwukwara na Gọọmenti Rụwanda weere ndị nọbu n’otu FDLR n’ọrụ iji rụọrọ ha ọrụ inweta ozi dị mkpa.

    Ozi ahụ kpọrọ aha ụfọdụ ndịagha Rụwanda ọkwa ha dị elu a na-enyo enyo aka ha dị n’atụmatụ ahụ.

    Ndị a kpọrọ aha gụnyere James Kabarebe, onye mba Amerịka taraala ahụhụ n’ọnwa Febụwarị maka ebubo ịkwado ndị otu M23, nakwa ndị Ọchịagha bụ Vincent Nyakarundi na Patrick Karuretwa.

    Ndị otu kansụl ahụ kwuru na ebumnobi Rụwanda bụ ịkpachi mba DR Kongo, weghara ala ha na akụ ndị si na chi, ma nwee ikike n’ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị.

  2. APGA azụọla ikike ịgbasaozi achụmnta vootu n’Anambra Steeti n’ọnụ ego nde naịra 50

    Pati nọ n’ọchịchị n’Anambra Steeti bụ All Progressive Grand Alliance (APGA) azụọla ikike ịgbasaozi achụmnta vootu n’asambodo ‘sign post’ n’Anambra Steeti maka ntuliaka ọkwa Gọvanọ.

    Ha mere nke a site n’ịkwụ ụlọọrụ na-ahụ maka mgbasaozi a n’Anambra Steeti bụ Anambra State Signage and Advertisement Agency (ANSAA) ego dị nde naịra iri ise (N50m).

    Ha kwụrụ ụgwọ ahụ n’ụbọchị abụọ nke ọnwa Julaị dịka onyeisi ụlọọrụ ahụ bụ Odili Tony nyefere onye ndụmọdụ gọvanọ Soludo bụ Alex Obiogbolu asambodo gosiri na ha nwereike ịgbasaozi.

  3. Ụlọelu nwere ogogo atọ adaala ma merụọ ụfọdụ mmadụ ahụ na Legọs

    Ụlọelu nwere ogogo atọ adaala na mpaghara Lagos Island ma merụọ ụfọdụ mmadụ ahụ n’ụtụtụ Tọzde 3 Julaị 2025.

    Ụlọ ahụ dị n’ogbe Asesi Street, n’akụkụ Adeniji Adele Street, dara n’otu ntabianya na-enweghị ihe ọbụla a maara kpatara ya.

    N’otu ozi o wepụtara n’akara ọbaozi Facebook ya, Kọmịshọna mgbasaozi na Legọs steeti bụ Gbenga Omotoso kwuru na e mechiela ụlọ ahụ.

    “A napụtara mmadụ anọ n’ụlọ ahụ dara ada ma bugaa ha ụlọogwụ ozugbo,” ka Kọmịshọna ahụ kwuru.

    Ndị ọrụ nnapụta si n’ụlọọrụ gbatagbata Legọs steeti bụ Lagos State Emergency Management Agency (LASEMA) nakwa ngalaba ụlọọrụ ndị ọzọ agaala n’ogige ahụ maka ọrụ nnapụta.

  4. Praim Minista mba Tanzania ga-arítu na ntụmadị

    Praim Mịnịsta mba Tanzania bụ Kassim Majaliwa ekwuola nay a agaghị azọ ntụliaka ọzọ na ntuliaka ndị nnọchiteanya na-abịa nke pụtara naohere ịhọpụta ya ọzọ agaghị adịkwa.

    Majaliwa kwuburu nay a ga-azọ ọkwa onye ya n’ụlọomeiwu agba nke anọ ya n’Oktoba tupu o kwugharịa n’ọkwa ntụmadị ọ mara ụbọchị Wenezde.

    A họpụtara nwamadi ahụ gbara afọ 64 dịka Praim Minista n’afọ 20215 dịka a na-ele any ana ọ bụ ya ga-anọchi Onyeisiala John Magufuli nwụrụ n’afọ 2021.

    Ọ nọ n’ọkwa ahụ n’okpuru Onyeisiala Samia Suluhu Hassan, bụ onye na-achọ ịnọkwa ọkwa onyeisiala n’okpuru otu pati nọ n’ọchịchị bụ Chama Cha Mapinduzi (CCM).

    Majaliwa, bụ onye na-anọchite mpaghara mba mmiri bụ Ruangwa kemgbe afọ 2010, kwuru na ọ bụ Chukwu nyere ya ntuziaka na mgbebi ahụ.

    Ọ sịrị, "O ruole oge inye ndị ọzọ ohere ijikọ ma wulite ihe anyị rụọrọla.”

    Ọkwa ya na-abịa ka ọ gachara out izuụka Majaliwa kwuru na ya ga-azọ ọkwa ọzọ.

  5. Ngalaba Labour Party Abure nọ n’isi ya enyela Peter Obi ụbọchị abụọ

    Ngalaba Labour Party nke Julius Abure bụ Onyeisi ya enyela Peter Obi elekere iri anọ na asatọ iji gbaa arụkwaghịm.

    Nke a bụ n’ihi mmekọrịta dị n’etiti Peter Obi na otu ndọrọndọrọ ọchịchị African Democratic Congress (ADC) e hiwere ọhụrụ nke David Mark bụ Onyeisi ya.

    N’ozi o wepụtara, ọnụ na-ekwuru ndị otu ahụ bụ Obiora Ifoh sịrị na ha agaghị ekwe ka Obi banye n’otu ọzọ oge ọ ka na-aza onye Labour Party.

    Ozi ahụ kwuru na pati Lebọ anaghị akwado mmadụ ndị amaghị ebe ha kwụ maọbụ ndị aghụghọ.

    Ha gara n’ihu kwuo na onye ọbụla chọrọ ịkwado pati ADC ga-eburịrị ụzọ gbaa arụkwaghịm n’ime ụbọchị abụọ.

    Ndị ngalaba Abure kwuru na ndị banyere n’otu ọhụrụ ahụ bụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị chọrọ ịbanye n’ọkwa n’ụzọ ọbụla ha nwereike ya.

  6. Gụọ ihe Liverpool fc kwuru maka ọnwụ Diogo Jota

    Ndị otu egwu bọọlụ Liverpool nke mba England na-eri uju maka ọnwụ onye otu ha bụ Dioge Jota.

    Diogo Jota na nwanne ya nwoke bụ Andre Silva nwụrụ n’ihe mgberede okporoụzọ na mba Spen.

    Nke a na-eme n’ihe dịka naanị izu ụka abụọ tupuu o mee mmemme ịgba akwụkwọ ya.

    Diogo dị naanị afọ iri abụọ na asatọ mgbe ọ nwụrụ.

    Liverpool n’akwụkwọ ọzị ha dere sị na “anyị agaghị ekwu ihe ọbụla ugbua karịa arịrịọ ka e nyee ezinaụlọ ya, ndị ọnyị nakwa ndị ọrụ Liverpool ohere dịka ha na-achọ ịghọta mkpamkpa a kpara, nakwa nnukwu ọdachị a dakwasịrị ha”.

    “Anyị ga-enye ha niile nkwado zuru oke”.

  7. Lee etu Diogo Jota na-agbara Liverpool siri nwụọ

    Diogo Jota nwụrụ anwụ bụ onye amaama na-agbara otu egwu bọọlụ Liverpool nke mba England ma bụrụkwa onye mba Portugal.

    Diogo na nwanne ya nwoke bụ Andre Silva nwụrụ n’ihe mgbere okporoụzọ na mba Spen.

    Mgbe a gbara ndị ọrụ Guardia Civil nke mba Spen ajụjụ ka ha sị na “ihe anyị maara ugbua bụ na ụgbọala ha abụọ nọ n’ime ya bụ Lamborghini".

    "Ụgbọala ahụ nwere ihe mgbere okporoụzọ mgbe ụkwụ ya gbawara oge ha na-achọ ịgbafere ụgbọala ọzọ”.

    “Ụgbọala ha gbara ọkụ ma gbuo Diogo na nwanne ya bụ Silva mmadụ abụọ nọ n’ime ya”.

    “Ọ mere n’isi ụtụtụ na mpaghara Zamora”.

  8. Peter Obi, Atiku, Amaechi na ndị ọzọ agbakọtala ọnụ n'okpuru pati ADC

    Ọtụtụ ndị so na pati ndị na-anọghị n’ọchịchị gbakọtara ọnụ n’aha pati African Democratic Party (ADC) nwere ọgbakọ ha n’ama ezumezu Yar’Dua dị n’Abuja.

    Ọgbakọ ndị a na-enwe bụ iji kpaa nkata ma chọpụta etu a ga-esi achụpụ pati na-achị ugbua bụ All Progressive Congress (APC) n’ọchịchị.

    Ụfọdụ n’ime ndị a gụnyere Atiku Abubakar, Peter Obi, Malam Nasir El-Rufai, Rotimi Amaechi, David Mark, Rauf Aregbesola.

    Ndị ọzọ so n’ọgbakọ ahụ gụnyere; Dino Melaye, Solomon Dalong, Dele Momodu, Gabriel Suswam, Ireti Kingibe, Emeka Ihedioha nakwa Sadigue Abubakar.

    Ọtụtu ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị si na pati Peoples Democratic Party (PDP), Social Democratic Party (SDP) na Labour Party (LP) bịakwara ọgbakọ ahụ.

    Ndị a họọrọ pati ADC dịka pati ha ga-eji napụta APC ọchịchị na ntuliaka afọ 2027.

    Dịka ọ dị ugbua, Pati ahụ ahọpụtala David Mark gbara arụkwaghịm na PDP dịka onyeisioche ha nwa mgbe nta, ma họpụtakwa Rauf Aregbesola dịka odeakwụkwọ ha.

    Dịka ndị a mechara ọgbakọ a, onye ji aha pati ADC zọọ ọkwa onyeisiala n’afọ 2023 bụ Dumebo Kachikwu pụtara kwuo na chọrọ ịkpachi pati ha n’ike na-esighi n’ezi usoro.

    O kwuru na onyeisi pati ahụ ha zutere bụ Ralph Nwosu abụghịzi onyeisi pati ahụ ugbua na oge ya gụrụ n’ọnwa Ọgọst afọ 2022.

    Ọ gara n’ihu kwuo na ndị a so na ndị mebiri ọnọdụ Naịjirịa chọrọ isi n’azụ ụlọ wụbata n’ime pati ha bụ ADC.

  9. David Mark agbaala arụkwaghịm na PDP

    Onye bụbu Onyeisi ụlọ omeiwu ukwu Naịjirịa bụ Sinetọ David Mark agbahapụla pati PDP n'ihi oke nkewa na-akawanye njọ n'ime otu ahụ.

    N'akwụkwọ ozi ọ degara Onyeisioche PDP na mpaghara Otukpo, Benue Steeti n'ụbọchị 27 Juun 2025, Mark kwuru na ọtụtụ nsogbu dị n’ime PDP nke bụ okwu onye niile kpụ n'ọnụ na-emechu ya ihu.

    “Mgbe mụ na ndị ezinaụlọ m, ndị enyi m, na ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị kparịtachara ụka, ekpebiri m isonye otu ndị pụtara ọhụrụ chọrọ ịnapụ Onyeisiala Tinubu ọchịchị, iji gbapụta obodo anyị ma chekwaa ọchịchị onye kwuo uche ya,” ka Mark kwuru.

  10. A tụọla otu ụkọchukwu nga afọ 53 maka idina nwa nwaanyị n'ike

    Ọkaikpe Olubunmi Abike-Fadipe nke ụlọikpe dị n’Abuja amaala otu nwoke ikpe ma tụọ ya nga afọ iri ise na atọ (53yrs) maka idina nwa ya nwaanyị dị afọ iri na anọ n’ike.

    Ụlọikpe maara onye ụkọchukwu a bụ Ndukwe Ogbu dị afọ iri anọ na ise ikpe n’ebubo atọ gọọmentị Legọs steeti boro ya nke gbagidere ụkwụ n’imetọ nwata.

    Mgbe ọkaikpe na-agụpụta ikpe a, o kwuru na nwoke a enweghi mwute ọbụla na o dinara nwa ya n’ike, ọ rịọghị mgbaghara ma na-achọ ka ụlọikp meere ya ebere na o nwere ụmụaka ndị ọzọ ọ ga-elekọta anya.

    Ọkaikpe gbakwasịrị ụkwụ n’ama nwa ya nwaanyị gbara tinyere nke onye dọkịnta nyochara ya ahụ nakwa nke onye ọrụ ọhanaeze gbara ma kpee nwoke a ikpe.

    Mgbe a na-ekpe ikpe ahụ, nwa nwaanyị gwara ụlọikpe na nna ya na-agba ọtọ bata n’ime mkpuka, yipu ya uwe ma dinaa ya n’ike.

    O kwuru na ihe niile a mere mgbe ọ dị afọ iri na anọ (14yrs).

    O kwuru na nna ya yiri ya egwu ka ọ gwala onye ọbụla.

    Nwata ahụ gwara onye nkuzi ya bụ onye gwara onye ọrụ ọhanaeze, tupu onye ahụ ewepụ ya n’aka ndị uweojii.

    O kwuru na nna ya dinara ya n’ike ọtụtụ ugboro.

    Mgbe ọ na-azara ọnụ ya, Ogbu gwara ụlọikpe na ọ bụ eziokwu na ya na nwa nwaanyị bikọta n’ụlọ nwere mkpuka abụọ, mana na ọ nọghị n’ụlọ mgbe ihe ahụ mere, ma kwuo na isi akpakọchaghị nwa ya ahụ ọnụ, na ọ na-echefukaarị ihe.

    O kwuru na nwunye ya nwụrụ mgbe ụmụ ya ka dị obere, na ụmụaka ya ndị ọzọ nọ n’ụlọ nne nne ha dị n’obodo ha.

    N’ọnwa Febụwarị 2021 ka a kpụpụrụ nwoke a n’ụlọikpe dịka ikpe ahụ malitere n’ọnwa Ọktoba 2021.

    Ọkaikpe kwuru na ịnọ n’ụlọmkpọrọ ya ga-amalite n’afọ 2019 mgbe mbụ a nwuchiri ya.

  11. Ụlọikpe Kachasị enyebeghị mkpebi maka ntuliaka gọvanọ Edo steeti

    Ụlọikpe Kachasị na Naịjiria akwadola ikpe n'okwu metụtara ntuliaka Edo steeti n’etiti Gọvano Monday Okpebholo na Asue Ighodalo.

    Dịka Ọkaikpe ji okwu bụ Garba Lawal nụchara mkpesa ahụ, o kwuru na ọ ga-agwa ndị Ọkaiwu ụbọchị a ga-ekwupụta ikpe.

    Ọkaiwu Ighodalo bụ Ken Mosia kpesaara ụlọikpe ka ha wepụ Okpebolo dịka gọvanọ ma kwupụta ya dịka onye meriri na ntuliaka ahụ.

    N’agbanyeghị mkpesa a, Ọkaiwu ụlọọrụ na ahụ maka ntuliaka na Naịjiria (INEC) bụ Kanu Agabi rịọrọ ụlọikpe ka ọ kagbuo mkpegharị ikpe ahụ kpamkpam.

  12. Helikopta ndịagha Uganda mmadụ 8 nọ n’ime ya dara, gbaa ọkụ na Sọmalịa

    Otu helikopta ndịagha mba Uganda bu mmadụ asatọ adaala ma gbaa ọkụ n'isi obodo Sọmalịa bụ Mogadishu.

    Onye ọrụ n’obi gọọmenti mba Uganda mere ka a mata nke a mgbe ọ gwara ndi BBC okwu.

    Mmadụ atọ gbanarịrị ọkụ ahụ mana ha meruru nnukwu ahụ ebe a ka na-achọ mmadụ ise ndị nke ọzọ achọ kamgbe mpamkpa ahụ kpara n’ọdọ ụgbọelu Aden Adde International Airport dịka ọchịagha Felix Kulaigye si kwuo.

    Ụlọọrụ mgbasaozi nke mba Somalia kwuru sị na oge ọkụ ahụ bidoro, ndị ọrụ gbatagbata bịara gbanyụọ ya.

    N’ozi otu jikọrọ mba Afrịka bụ African Union (AU) wepụtara ka ha kwuru na e dugala mmadụ atọ ndị ahụ meruru ahụ n'ụlọọgwụ ma na-achọkwa ebe ndị nke ọzọ nọ ugbua.

  13. Amerịka ekpebiela ịkwụsị ibuga ụfọdụ ngwaagha na Yukren

    Obi ọchịchị mba Amerịka ekwuola na ọ ga-akwụsịtụ ibuga ngwaagha na mba Yukren dịka ọgu ha na Rọshịa n’agbanwanye.

    Dịka ọnụ na-ekwuchitere obi ọchịchị Amerịka Anna Kelly siri kwuo n’ụbọchị Tuzde 1 Julaị 2025, mkpebi ahụ bụ “maka ibute mmasị mba Amerịka ụzọ” oge niile dịka ụlọọrụ nchekwa Amerịka na-eme nnyocha banyere "nkwado na enyemaka ndịagha" ha na-enye mba ndị ọzọ.

    Cheta na mba Amerịka ezigala ihe ruru ọtụtụ iri puku ijeri dọla n’enyemaka ngwaagha na Yukren kemgbe Rọshịa bidoro mwakpo ya zuru oke na Febụwarị 2022, nke mere ụfọdụ ndị n’ọchịchị Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ji kwupụta na nkwakọba ngwaagh n’Amerịka na-ebelata.

    Mba Yukren ekwubeghị ihe ọbụla gbasara nkwupụta a mana nke a na-abịa obere oge ka Onyeisiala Trump zutere ogbo ya Onyeisiala mba Yukren bụ Volodymyr Zelensky na nzukọ NATO nke ehibere na Netherlands n'izu gara aga.

  14. Jimmy Swaggart anwụọla ka ọ gbachara afọ 90

    Onye mgbasa oziọma mba Amerịka a ma ama na mbaụwa bụ Jimmy Swaggart anwụọla ka ọ gbachara afọ 90.

    Swaggart bụ onye mịnịstrị ya nyụrụ ọkụ ka asịrị metụtara mmekọrịta nwoke na nwaanyị tịwara, nwụrụ n’ụlọ ya dịka ọ rịachara ọrịa obi nke ọ dara n’ike nke mere ka e buga ya ụlọọgwụ na nsonso a, dịka ezinaụlọ ya si kwuo.

    Ozi si n’aka ụlọụka ya kwuru sị, “Ihe karịrị afọ 70, Brọda Swaggart tinyere ndụ ya n’ịgbasa oziọma, ịbụ abụ okwukwe na iduga ndị mmadụ ike nzọpụta nke Jisọs Kraistị nakwa mmirichukwu nke Mụọ Nsọ.”.

    Swaggart malitere izi oziọma n’ihe onyonyo TV n’agbata afọ 1960s ma bụrụ onye ozioma malitere ịgbasa oziọma n’ihe onyonyo TV tupu asịkwa asịkwa metụtara mmekọrịta nwoke na nwaanyị kposaa ya.

    Ya bụ ihe mere n'afọ 1988, oge aha ya n-ewu ewu ka ọkụ ụgụrụ, foto ya ebe ya na otu akwụna nọ na New Orleans gbara n'ọha.

    O mechara rịọ mgbaghara n'anyammiri n'ihe onyonyo TV sị,

    "n'ihu nde kwuru nde m dị m kwụ n'ihu ha , emejoola m ụnụ, mejọọ Dinwenụ. Ana m arịọ ụnụ mgbaghara."

    Ka afọ atọ gachara a nwụdekwara Swaggart ya na akwụna ọzọ na Califonia.

    Ka nke mere , obi etighịzịkwa ya kama ọ sịrị, "Dinwenu gwara m sị na nke agbasaghị gị."

  15. Izrel ekwenyela na nkwụsị ịkwa mgbọ abalị 60 na Gaza – Onyeisiala Trump

    Mba Izrel ekwenyela “n’ọnọdụ dị mkpa” iji nwee nkwekọrịta nkwụsị ịkwa mgbọ nke abalị iri isii na Gaza, Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump kwuru.

    N’ozi o depụtara n’akara soshal midịa ya a kpọrọ Truth Social, Onyeisiala Trump kwuru na mba Amerịka na otu niile "ga-arụkọ ọrụ iji kwụsị agha ahụ" n'oge nkwụsị ịkwa mgbọ ahụ.

    Ọ gara n’ihu kwuo na ndị Qataris na Ijipt, gbara oke mbọ iji ihụ n’udo batara, bụ ndị ga-ewega atụmatụ nkwekọrịta ahụ.

    “Enwere m olileanya… na Hamas ga-ewere nkwekọrịta a, n'ihi na ọ gaghị adị mma - ọ ga-akawanye njọ," Onyeisiala Trump dere.

    Mba Izrel ekwubeghị na ha ekwenyere n’ọnọdụ nkwekọrịta ahụ, ma ndị Hamas ekwubeghị ihe ọbụla ugbua maka ya.

  16. Ụtụtụ ọma ndị be anyị

    Nnọọ n’ọgbakọ BBC Igbo taa Wenezde 2 Julaị 2025.

    Ekpere anyị bụ na ụbọchị taa ga-amịtara anyị mkpụrụ ọma.

    Dịka ụnụ na-esonyere anyị taa, anyị ga na-ewetere ụnụ akụkọ ihe na-eme n’ala Igbo, Naịjirịa na ụwa niile.

    Ndewo.

  17. UK na mpaghara Yurop dị icheiche na-enwe nnukwu ukpomọkụ ugbua

    Etu ọnọdụ si dị ugbua banyere ihu igwe na-egosi na ọtụtụ obodo nakwa mpaghara dị cheiche na-enwe nnukwu ukpomọkụ na Yurop.

    Ukpomọkụ ahụ na-eme na UK nakwa mpaghara Yurop ndị ọzọ dịka Italy, Pọtụga, Spain na ndị ọzọ.

    Ndekọ na-egosi na ukpomọkụ na-eme n’UK ugbua ruru 33.9C (93F) bụ nke kacha ma na-akawanye njọ.

    Ọ gafere 40C na Pọtụga na Spen ka mba abụọ ahụ nwechere ukpomọkụ kacha kwa afọ.

    Mba dịka France, Netherlands, Greece, na Itali bụ nke gburu mmadụ abụọ n’ Italy na mpaghara obodo Bologna na Bardonecchia.

  18. Ụlọikpe atụọla otu nwoke nga afọ asaa maka ebubo nrụrụaka gbasara ire ala

    Ụlọikpe dị elu n’Agbani, Enugwu steeti atụọla otu nwoke a na-akpọ George Amechi Igwesi nga afọ asaa maka ebubo gbasara mpụ maọbụ izu ohi ala nakwa nrụrụaka.

    Ụlọọrụ Economic and Financial Crimes Commission, EFCC mere ka a mata nkea n’akara mgbasaozi soshal mịdịa ha.

    EFCC kwuru na George Amechi Igwesi jiri ụlọọrụ ya bụ Georgeann Enterprises Limited daa iwu Naịjirịa site na ire ala na-abụghụ nke ya ma napụ onye zụrụ ya ego ruru (N11, 400, 000. 00).

    Mgbe ụlọikpe na agụpụta ebubo e boro George Amechi Igwesi ka ọ sịrị ihe ahụ mere n’abalị nke mbụ n’ọnwa Julaị, afọ 2022 ma kwuo na onye o resiri ala ahụ ma napụ ya ego bụ Charles Emeka Okenwa.

    Ọ sị na ala ahụ dị n’Amurri Rd, Agbani, gọọmenti okpuruọchịchị Nkanu West Enugwu Steeti.

    Ụlọikpe kwuru na Igwesi debere ahụ dịka onye nwe ala ahụ tupuu o resi ya Okenwa.

    Ọkaikpe ndị ụlọọrụ EFCC bụ Michael Ikechukwu Ani kpọtara ndị aka ebe ma gosi ụlọikpe akwụkwọ ndekọ dị icheiche bụ nke ụlọikpe nabatara dịka ihe aka abe.

    Na mkpebi ikpe ka Ọkaiwu Mogboh nabatara ọtụtụ ihe e nwetere n’akaebe dịka eziokwu ma ziga George Amechi Igwesi ụlọnga afọ asaa.

  19. Ụmụakwụkwọ na-eme ngagharịiwe megide ịgbanwe aha Politekinik Ibadan

    Ụmụakwụkwọ Politekinik Ibadan na-eme ngagharịiwe n’ọbị ọchịchị gọọmentị nke Oyo steeti megide atụmatụ ịgbanwe aha politekinik ahụ nke aka na-achị steeti ahụ wepụtara.

    Gọvanọ Seyi Makinde kwuru na ọ ga-agbanwe aha politekinik ahụ ma kpọọ ya aha onye bụbu gọvanọ steeti aha ya bụ Omololu Olunloyo.

    Ụmụakwụkwọ ahụ iwe na-ewe kwuru na ha chọrọ ka aka na-achị steeti kagbuo mkpebi ya ma weghachi aha mbụ e jiri mara politekinik ahụ.

    Cheta na Gọvanọ Makinde kwupụtara na ọ chọrọ ịgbanwe aha ụlọakwụkwọ ahụ mgbe ọ gara olili ozu nwoke ahụ a maara dịka onye na-agụ akwụkwọ mgbakọ na mwepụ n’izu gara aga.

  20. Ndị ọrụ ebere akpọọla oku ka emechi otu enyemaka Gaza nke Amerịka na Izrel na-akwado

    Ihe karịrị ndị ọrụ ebere otu narị na iri atọ akpọọla oku ka emechie otu enyemaka Gaza Humanitarian Foundation (GHF) nke mba Izrel na Amerịka na-akwado.

    Nke a bụ maka na ihe karịrị ndị Palestine mmadụ narị ise anwụọla kemgbe otu GHF malitere ọrụ na ngwụcha ọnwa Mee, nke sochiri mgbochi ọnwa atọ nke Izrel mere na Gaza, dịka ụlọọrụ ha siri kwuo.

    N’aka nke ọzọ, ihe ruru mmadụ puku anọ e merụọla ahụ kemgbe ahụ.

    Ụlọọrụ dị iche iche nke gụnyere Oxfam, Save the Children na Amnesty, kwuru na ndịagha Izrel na otu ndị nnupụisi “na-awakpo karị” ndị Palestine na-achọ enyemaka.

    Izrel gọnarịrị ebubo kwuru na ndịagha ya na-akpacha anya awakpo ndị na-achọ enyemaka ma gaa n’ihu ikwuchitere otu GHF.

    Ha kwuru na otu ahụ na-enyere ndị chọrọ enyemaka aka na-esonyeghị n’usoro ndị Hamas wepụtara.