Otu United Nations ga-akwụsị enyemaka ikesa nri na mpaghara Ugwu Naịjirịa
Ngalaba ụlọọrụ United Nations na-ahụ maka enyemaka ike ihe nri a na-akpọ World Food Programme ekwuola na ha ga-akwụsị enyemaka ikesa nri ha na-eme na mpaghara Ugwu nke Naịjirịa.
Na nkwupụta ha mere n’ụbọchị Wenezde 23 Julaị, 2025 mkpebi a bụ maka ụkọ ego nakwa ogụ a na-alụ na mpaghara Ugwu nke na-akpali aguu ebe ahụ.
Onye na-ahụ maka ụlọọrụ World Food Programme na Naịjiria bụ David Stevenson si na ezinaụlọ ndị mmadụ bi na mpaghara ugwu na-agba mbọ ihu na ha gbanahụrụ aguu dịka ọ si na aguu na-emekpa mmadụ ruru nde iri atọ na otu ahụ na Naịjirịa.