You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Kanada akwadoola ịnabata Palestine dịka mba nweere onwe ya

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Julaị 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu

  1. Ihe mere m ji kee nri na mmemme – Peter Obi

    Peter Obi bubụ Gọvanọ chiri Anambra steeti ma jiri otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị Lebọ Patị zọọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2023 enyela nkọwa banyere foto na-enwu enwu gosiri ebe ọ na-eke nri n’ebe a na-eme mmemme.

    Peter Obi jiri aka soshal midia ya nye nkọwa ma kwuo na ọ bụ ndị iro ya kesere onyonyoo ahụ ma kweta na ya maara na ọ ga-abụ okwu a kpụ n’ọnụ tupuu ya eme ya.

    N’okwu ya “Foto gosiri ebe m na-eke nri n’ọgbakọ pụrụiche bụ ihe a na-akọ maka ebe niile ugbua maka na ndị ndu anyị enwepụla agwa na obi ụmaala na ngaraba ị ga ozi”.

    “Ọtụtụ na-ahụ ya ka ihe mgbagwojuanya na m na-eke nri na mmemme”.

    “Mana ka ọ doo anya, mmemme ahụ abụghị maka m, mana ọ bụ mmemme e ji agwa ụwa niile na ihe gbasara ị bụ onye ndu bụ ị ga ozi. Ndị nwere nnukwu akụnụba ekwesighị ichefu ndị na-enweghị”.

    Peter Obi kọwara na mgbe ya gara mmemme ahụ n’Imo steeti na-enweghị onye nụrụ maka ya mana ọ bụ ndị ọzọ na-esoghị na ngaraba mgbasa ozi ya kesere ya na soshal mịdịa.

    Obi sị na mmemme ahụ a na-akpọ “Jubilee of Hope” bụ nke ndị nwere akụnụba na-abịa agara ndị na-enwghị ozi.

  2. Ogbunigwe ndịagha Izrel egbuola ụmụaka na-eku mmiri na Gaza

    Mmadụ iri gunyere ụmụaka isii so na ndị nwụrụ mgbe mgba Izrel tụrụ ogbunigwe na mpaghara etiti Gaza n’ụbọchị Sonde.

    Ndị ọrụ gbatagbata mere ka a mata nke ma mee ka a mara na e tinyela ozu ha n’ọba ozu dị n’ụlọọgwụ Nuseirat's al-Awda dịka dọkịnta na-arụ ebe ahụ si kwuo.

    Ndị hụrụ ihe mere kọwara na ọ bụ ụmụaka bu ihe e ji echu mmiri kwụ n’ahịrị n’ahịrị na-eche ịgbara mmiri n’ụgbọala tanka n’ebe mgbaba ndị na-agba ọsọ ndụ dị na al-Nuseirat ka e gburu.

    Mana ndị agha mba Izrel kwuru na ha ga-eme nyocha banyere nke a ma kweta na ha nụrụ ihe mere.

    Israel Defense forces (IDF) kwuru na ha na-agba mbọ ime ka ndị nkịtị nakwa ndị aka ha dị ọcha hara ịnwụ n’agha dị na Gaza.

  3. Ụlọọgwụ Gaza kwuru na e gburu mmadụ 24 n'akụkụ ebe enyemaka dịka ndị akaebe na-ata IDF ụta

    Ụlọọgwụ Nasser dị na mpaghara ndịdị Gaza ekwuola na e gburu mmadụ iri abụọ na anọ n’akụkụ ebe a na-ekesa ihe enyemaka.

    Ndị Palestine nọ n’ebe ahụ mgbe ihe mere kwuru na ndịagha Izrel malitere ịgba ndị mmadụ na-achọ nri egbe n’ụbọchị Satọde 12 Julaị 2025.

    Ndịagha nchekwa Izrel (IDF) kwuru na ọ nweghị "ndị a ma ama merụrụ ahụ" site na ọkụ IDF dị nso na saịtị ahụ.

    Ọzọ, onye ọrụ ndịagha Izrel kwuru na ha gbara egbe ịdọ aka na ntị iji chụsasịa ndị ha kwenyere na ha bụ ihe iyi egwu.

    BBC achọpụtabeghị n’onwe ya ma nkwupụta nke akụkụ abụọ ọ bụ eziokwu n’ihi n’Izrel anaghị anabata ụlọọrụ mgbasa ozi mba ụwa, gụnyere BBC, ịbanye na Gaza.

  4. EU na Meziko akatọla tarifu pasent 30 nke Onyeisiala Trump chọrọ itinye na mbubata ha niile

    Otu jikọtara mba dị na Yurop bụ (EU) na Meziko akatọla tarifu pasent 30 nke Onyeisiala mba Amerịka chọrọ itinye na mbubata ha niile malite n’Ọgọst 1.

    Miziko katọrọ ihe ọ kpọrọ “nkwekọrịta na-ezighi ezi” nke onyeisiala Trump ma na-ekwusi ike na ọchịchị nke onwe ya enweghị nkwekọrịta.

    N’aka nke ọzọ, onyeisi EU bụ Ursula von der Leyen kwuru na ha ga-etinye "usoro mgbochi nha anya", ma ọ bụrụ na ohere pụta. Ha abụọ kwuru na ha chọrọ ka ha na mba Amerịka nwee mkparịtaụka banyere ụtụisi ọhụrụ a.

    Mana Onyeisiala Trump ndọrọ aka na ntị na ya ga-etinye ụtụisi dị elu ma ọ bụrụ na ndị ha mba Amerịka na-azụkọ ahịa tinye tarifu mmegwara.

    Cheta na Onyeisiala Trump kwupụtakwara ụtụisi ọhụrụ na mbubata niile si Japan, Saụt Korea, Kanada, Brazil malite n’ọnwa ọzọ.

  5. Ụtụtụ ọma ndị be anyị

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Sọnde, 13 Julaị, 2025.

    Anyị na-asị ka Chineke zaa ekpere anyị niile n’ụbọchị taa.

    Biko, na-esonyere anyị dịka anyị na-ewetara unu akụkọ ihe na-eme na Naịjirịa, Afrịka nakwa ụwa niile.

    Udo dịrị gị!

  6. Onyeisiala Trump ekwuola na ọ ga-etinye tarifu pasenti 30 na mbubata niile si mba Yurop na Mekziko

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na mmalite Ọgọst 1, 2025, Amerịka ga-etinye tarifu pasenti 30 na mbubata niile si mba Yurop na Mekziko.

    Ọ dọrọ aka n’ntị na ọ ga-ewelite ụtụ isi mbubata ahụ elu ma ọ buru na otu n’ime ndị mmekọ ahịa mba Amerịka kpebie imegwara.

    Mba iri abụọ na asaa (27) ndị mejupụtara otu Yurope – ndị kacha azụ Amerịka ahịa kwuru na mbido izu a, na ha n’atụ anya ị nwe nkwekọrịta zụrụoke n’etiti ha n’Amerịka tupu 1 Ọgọst.

    Trump na izu a kwupụtara na ọ ga-etinye ụtụ isi ọ hụrụ na mbubata niile si mba Japan, Saụt Korea, Kanada nakwa Brazil na mmalite Ọgọst 1, 2025

  7. Gọvanọ Sanwo-Olu na osote ya atụọla vootu na ntuliaka okpuru ọchịchị Legọs Steeti

    Aka na-achị Legọs steeti bụ Babajide Sanwo-Olu na osote ya bụ Kadri Hamzat atụọla vootu ha na ntuliaka okpuru ọchịchị a na-eme na steeti ahụ.

    Gọvanọ Sanwo-Olu toro ụlọọrụ Lasiec maka ezi nhazi ntuliaka ahụ ma kpọọ oku ka ndị mmadụ pụta tụọ vootu ha iji họpụta ndị isioche ọhụrụ okpuru ọchịchị ha dị iche iche.

    Akụkọ kwuru na ọtụtụ mmadụ apụtaghị tụọ vootu na ntuliaka ahụ mana ndị pụtara kwuru na ntuliaka ahụ na-aga etu o kwesiri.

  8. Ntuliaka okpuru ọchịchị Legọs Steeti: Lee ihe i kwesịrị ịma

    Ihe karịrị nde mmadụ asaa na Legọs steeti ga-anọ n'ụbọchị Satọde 12 Julaị, 2025 binye aka na ntuliaka okpuru ọchịchị a ga-eme na steeti ahụ.

    Ntuliaka a bụ ij họpụta ndị isioche okpuru ọchịchị 20 steeti ahụ nakwa ndị kansịlọ 37.

    A ga-eme ntuliaka a n’ogige polling unit 13, 325 dị n’ime wọọdụ 376 na Legọs steeti.

    Ụlọọrụ Lagos State Independent Electoral Commission (Lasiec) kwuru na dị njikere ime ntuliaka ahụ.

    Lasiec kwuru na ha ga-eji akụrụngwa Bimodal Voters Accreditation System (BVAS) nyochaa ndị ga-ebinye aka na ntuliaka ahụ ma jirikwa ya nweta mpụtara ntuliaka ahụ n’ogige polling units dị iche iche.

    Ndị uweojii kwuru na a machiri ụgbọala ọbụla ịgba n’ụzọ malite n’elekere atọ nke ụtụtụ ruo elekere atọ nke ehihie ụbọchị Satọde 12, Julaị, 2025.

  9. Nnyocha mbụ achọpụtala ihe mere ụgbọelu Air Indịa ji kpọkaa ma gbuo mmadụ 260

    Nnyocha mbụ e mere achọpụtala na ọ bụ akụrụngwa mmanụ ụgbọelu kwụsịrị ịrụ ọrụ bụ ihe mere ụgbọelu Air Indịa ji kpọkaa ma gbuo mmadụ 260 na mpaghara Ahmedabad.

    Akụkọ kwuru na akụrụngwa kwụsịrị ịrụ ọrụ gbanyụrụ injin ụgbọelu ahụ.

    Nchọpụta a kwuru na igwe nzikọrịta ozi dị n’ụgbọelu ahụ gosiri na ndị ọkwọ ụgbụelu ahụ na-ajụ onwe ha ajụjụ ihe mere akụrụngwa ji ghara ịrụ ọrụ.

    Ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ Air Indịa kwuru na ụlọọrụ ha na-enyere ndị na-eme nnyocha ahụ aka iji hụ na a chọpụtara ihe niile banyere nkpọka ụgbọelu ahụ dịka ọ gara n’ihu tie ezinaụlọ ndị nwụrụ na njiji ahụ aka n’obi.

    Cheta na mmadụ 260 nwụrụ n’ụgbọelu ahụ kpọkara ebe Vishwashkumar Ramesh bụ naanị onye ji ndụ ya pụta n’ụgbọelu ahụ.

  10. Ụkọ mmanụ ụgbọala na oke ogbunigwe nwereike ịme ka ụlọọgwu kachasị na Gaza kwụsị ịrụ ọrụ

    Ndị dọkinta ahụike adọọla aka na nti ma kwuo na ụkọ mmanụ ụgbọala nakwa ogbunigwe mba Izrel na-atụ nwereike imetụta ọrụ ha n’ụlọọgwụ kachasi na mpaghara Gaza.

    Akụkọ kwuru na ụlọọgwu Nasser Medical Complex kwụsiri ịnabata ndị ọrịa n’ụbọchị Tọzde Julaị 10, 2025 maka ndị akaebe kwuru na ha hụrụ ndịagha Izrel bu ngwaagha ha n’abata na ogige ebe a na-eli ozu dị nso n’ụlọọgwụ ahụ. E kwuru na ndịagha ahụ gbara mgbọ n’ogige ndị gbara ọsọ ndụ.

    Ka ọ di ugbua, ndị ọrụ ahụike na ọtụtụ ndị ọrịa na-eweta nleta nọ n’ụlọọgwụ ahụ dịka akụkọ kwuru na ụkọ mmanụ ụgbọala nwereike ime ka ụlọọgwụ ahụ kwụsị ọrụ.

    Ndịagha Izrel enwebeghị ihe ọbụla ha kwuru banyere ebubo a.

  11. Onyeisiala Trump agaala Texas ebe idemmiri gburu mmadụ 120 dịka a na-achọ ihe ruru mmadụ 160 achọ

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump agaala Texas ebe idemmiri gburu otụtụ mmadu ruru otu nari na iri abụọ (120) dịka aka na-achọ mmadụ 160 achọ.

    Onyeisiala Trump na nwunye ya ga-ezuta ndị rụrụ ọrụ gbatagbata nakwa ndị idemmiri ahụ metụtara na ezinaụlọ ha na Kerrville.

    Ndị ga-eso Onyeisiala Trump gaa Kerrville gụnyere Gọvanọ Texas bụ Greg Abbott, Sinetọ John Cornyn na Sinetọ Ted Cruz.

    Cheta na oke idemmiri wakporo mpaghara etiti Texas ebe ọtụtụ ụlọ obibi ndị mmadụ, okporoụzọ na ụgbọala kpuru n'idemmiri ahụ.

    Akụkọ kwuru na ụmụnwannyị na ndị ọrụ ruru iri abụọ na asaa (27) gara nzukọ ndị kraịst na Camp Mystic so na ndị nwụrụ n’idemmiri ahụ

  12. Amerịka ekwela nkwa inye mba Yukren ngwaagha nchekwa ikuku

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na ọ ga ezịgara mba Yukren ngwaagha iji nyere ha aka n'ọgụ ha na mba Rọshia.

    Ngwa agha ọgụ ndị ahụ gụnyere akụrụngwa nchekwa ikuku bụ Patriot Air defence na bekee.

    Nkwụputa a n'abia dịka onyeisiala mba Yukren bụ Volodymyr Zelensky kwuru na ha na Onyeisiala Trump nwere mkparịtauka dị mma dịka Trump kwere ya nkwa ị zitere ya ngwaagha ndị ahụ.

    N'aka nke ọzọ, Onyeisiala Trump kwuru ọ ga-ewepụta ozi banyere mba Rọshịa ụbọchị Mọnde 14 Julaị, 2025 mana enweghị onye ma ihe ozi a bụ maka ya.

  13. Cynthia Chukwudah e kwuru mụnyere enyi ya nwoke ọkụ abụghị nwataakwụkwọ anyị - Mahadum Uniport

    Mahadum University of Port Harcourt ekwuola na Cynthia Chukwudah e kwuru na ọ mụnyere enyi ya nwoke bụ Sunny Amadi ọkụ abụghị nwataakwụkwọ ha.

    Akwụwkwọ ozi ọnụ na-ekwuru mahadum ahụ bụ Sammy Kpenu wepụtara, mere ka o doo anya na nnyocha ha mere chọpụtara na nwaanyị ahụ abụghị nwataakwụkwọ mahadum ahụ.

    Mahadum ahụ gara n’ihu tie ezinaụlọ nwaamadị ahụ nwụrụ aka n’obi ma kwuo na ha kwụrụ chịm inyere ndị uweojii aka na nnyocha ha na-eme.

    N’aka nke ọzọ, nwaada Cynthia Chukwudah ekwuola na ya na Sunny Amadi na-emebu enyi kama na ha nwere esemokwu nke mere ka ha kwụsị ime enyi.

    N’ihe onyonyo vidio anyị nwetara, Cynthia Chukwudah kwuru na nwaamadị ahụ malitere ịkpọ ya n’ekwentị ugboro ugboro ma gwa ha na ọ chọrọ ịzụtara ya nri.

    N’okwu ya “N'abalị ahụ ihe ahụ mere, ọ bịara n’ụlọ m mụnye ọkụ kandụl, agwara m ya pụọ n’ụlọ m mana o kweghị, ọ bụ oge ahụ ka anyị malitere ịba mba”.

    Ọ gara n’ihu kwuo na e nwere obere bọtụlụ mmanụ ụgbọala dị n’ime ya Sunny ji bịa n’ụlọ ya n’abalị ahụ, o kwuru na ọ bụ oge ya na Sunny na-aba mba ka Sunny gbara bọtụlụ ahụ ụkwụ nke mere ka ụlọ ya wuru ọkụ.

    “Ọkụ ahụ merụrụ m ahụ tupu mụ agbapụ ọsọ, amaghị m ihe bụ ebumnobi Sunny Amadi ụbọchị ahụ mere o ji buru mmanụ ụgbọala bịa n’ụlọ m”.

    Ndị uweojii kwuru na ha na-eme nnyocha iji chọpụta nke bụ eziokwu n'okwu a.

  14. Onyeisiala Trump ekwuola na ọ ga-etinye tarifu pasenti 30 na mbubata niile si mba Kanada

    Onyeisiala Donald Trump na-achị Amerịka ekwuola na malite Ọgọst 1, 2025, Amerịka ga-etinye tarifu pasenti 30 na mbubata niile si mba Kanada. Nke a na-abịa dịka a na-atụ anya na mba abụọ a ga-enwe nkwekọrịta azụmahịa ọhụrụ.

    Onyeisiala Trump kwuru nke a n’ozi o wepụtara n’akara soshal midia ya ma kwuo na o nwereike itinye tarifu pasenti 15 maọbụ 20 na mbubata si mba ụfọdụ ha na ha na-azụ ahịa.

    Praịm Minista mba Kanada bụ Mark Carney kwuru na gọọmenti ya ga-aga n’ihu na-echekwa ndị ọrụ ya na azụmahịa ha niile n’agbanyeghị okwu Trump nakwa olileanya nkwekọrịta mba abụọ a.

    Akụkọ kwuru na Onyeisiala Trump ezgala akwụkwọ ozi 20 banyere tarifu ọhụrụ a. O kwuru na n’oge adịghị anya, ọ ga ekwpụta tarifu ole ọ ga-etinye na mbubata si mba Yurop.

  15. Ndị uweojii amalitela nnyocha banyere nwataakwụkwọ Uniport dị ime e kwuru na ọ mụnyere enyi ya nwoke ọkụ

    Ndị uweojii amalitela ime nnyocha ọkụ ahụ gbagburu nwaamadị aha ya bụ Sunny Amadi na mpaghara Choba, Rivas Steeti.

    Akụkọ kwuru na Sunny Amadi gbara afọ 29 nwụrụ oge enyi ya nwaanyị mụnyere ya ọkụ.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Grace Iringe-Koko kwuru na Sunny Amadi nwụrụ n’ụlọọgwọ ebe enyi ya nwaanyị e kwuru na ọ dị ime, na-eweta nleta n’ụlọọgwụ.

    Iringe-Koko kwuru na n’agbanyeghị na ha na-eme nnyocha iji chọpụta ihe kpatara ọkụ, akụkọ kwuru na Sunny na enyi ya nwaanyị ahụ na-enwe esemokwu.

    Ka ọ dị ugbua, ndị uweojii nwere olileanya na ọ bụrụ na enyi ya nwaanyị ahụ gbakee, ọ ga-enyere ha aka chọpụta ihe kpatara ọkụ ahụ gburu enyi nwoke.

  16. Naịjirịa ekwuola na ha agaghị anabata ndị Venezuela Amerịka chụpụrụ

    Minista Naịjirịa na-ahụ maka mmekọ mba ofesi bụ Yusuf Tuggar ekwuola na Naịjirịa agaghị anabata ndị Venezuela Amerịka chụpụrụ n'agbanyeghị mgbochi visa na ịdọ aka ná ntị mbuli tarifu Amerịka.

    Tuggar kwuru na Naịjirịa nwere ọtụtụ nsogbu cheere ya ugbua ma kọwaa na Naịjirịa adịghị njikere ịnabata ndị ahụ Amerịka chụpụrụ.

    N’okwu ya, “Naịjirịa nwere ihe ruru mmadụ nde narị abụọ na nde iri ise, anyị achọghị ịnabata mmadụ 300 si Venezuela a chụpụrụ n’Amerịka”.

    O kwuru na atụmatụ ibelata akwụkwọ njem ‘visa’ a na-enye ndị Naịjirịa, bụ atụmatụ Amerịka ji chọọ ịmanye Naịjirịa ka ha nabata ndị ha chụpụrụ.

    Cheta na ozi nke ngalaba na-ahụ maka ihe na-eme n'obodo na mba Amerịka wepụtara na weebụsatị ya n'ụbọchị Tuzde 8 Julaị 2025, kwuru na mba Amerịka ga na-enye ụmụafọ Naịjirịa akwụkwọ njem ga-abụ naanị ọnwa atọ nakwa ohere ịbanye n'Amerịka otu ugboro.

    Ha gara n'ihu kwuo na iwu ọhụrụ a nke a kpọrọ "iwu nzaghachi" bụ iji kwụghachi ụmụafọ Naịjirịa ihe mba Naịjirịa na-eme ụmụafọ Amerịka na-achọ akwụkwọ njem visa.

    Ngalaba ahụ kwuru na ọ bụ usoro na-aga n'ihu nke e nwereike innyocha maọbụ gbanwee oge ọ bụla.

  17. Ndịagha Izrel egbuola ụmụaka kwụ n’ahịrị ị nara ọgwu na mpaghara Gaza

    Ihe ruru mmadụ iri na ise (15) gunyere ụmuaka asatọ na ụmụnwaanyi abụọ anwuọla dịka ndịagha mba Izrel wakporo ha oge ha nọ n’ahịrị n’ụlọgwu nọ n’etiti Gaza ịnara ihe oriri.

    Site na ihe onyonyo ụlọọgwụ al-Aqsa Martyrs nọ na mpaghara Deir al-Balah ahụrụ ọzu ọtụtụ ụmụaka na ndị ọzọ ka ha gbọtọ n’ala dịka ndị dọkịta na-enyocha ndị meruru ahụ.

    Ndị otu enyemaka na Amerịka bụ Project Hope, bụ ndị na-ahụ maka ụlọọgwụ ahụ kwuru na mwakpo a bụ nnukwu mmebi iwu mba ụwa. Mana ndị agha Israel kwuru na ha gburu "onye na-eyi ọha egwu Hamas" dịka ha tara ụta maka mwakpo ahụ metụtara ndị nkịtị

  18. Egbuole mmadụ ọzọ na mpaghara ọchịchị ime obodo Edda n’Ebonyi steeti

    Otu nwoke ana-akpọ Udu Nnachi Uzor anwụọla dịka ọtụtụ mmadụ merụrụ ahụ n'Ekoli, n'okpuru ọchịchị Edda nke Ebonyi steeti ka ndị omekome wakporo obodo ahụ n’ụbọchị Wenezde 9 Julaị, 2025.

    Nke a abụghị nke mbụ a ga-enwe mwakpo n'ime obodo nke butere ọnwụ mmadụ, cheta na ọnwa gara aga, ndị omekome mere mkpamkpa ma gbuo otu onye dịka ọtụtụ ihe onwunwe ndị mmadụ mebiri ka ha gbara egbe ahara ahara.

    N'ịkọwapụta ihe mere otu onyeisi obodo, Etta Egor boro ebubo na ndị otu vigilante a na-akpọ 'Catch am' bụ ndị na-ebute ọgba aghara na-enweghị isi na Ekoli-Edda.

    Mgbe anyị kpọturu onu na ekwuchitere ndị uweojii n’Ebonyi steeti, DSP Joshua Ukandu o kwuru na ha anwụchiela mmadụ abụọ maka ogbugbu a.

    “Nnyocha na-aga n'ihu iji kpughee ndị na-akpa mkpa mkpa a”

  19. Mba Briten na Frans ga-enwe nkwekọrịta iji gbochi ndị na-enweghị visa maọbụ ikike ịbata obodo ha

    Praịm Minista mba Briten bụ Keir Starmer na Onyeisiala mba Frans Emmanuel Macron ga-enwe nkwekọrịta iji gbochie ndi na-eji ugbọmmiri abata mba ha na-enweghị visa maọbụ ikike ịbata.

    Na nkwekọrịta a na-akpọ "otu n'ime, otu pụta", Mba Briten ga-anabata ndị gbapụrụ n'obodo ha na-achọ nchekwa maka iweghachi ụfọdụ ndị mbịarambịa na mba France.

    Ka ọ na-eme ugbu a, BBC ahụla ihe kariri narị abụọ na iri ise (250) ka ha lọghachiri dika a na-atụ anya na-aga ezipu ihe dịka mmadụ iri ise na izu ọbula

  20. Zerenụ ọgwụ obara ndị a- Nafdac

    Ụlọọrụ na-ahụ maka nri na ọgwụ bụ ' National Agency for Food and Drug Administration and Control' (NAFDAC) adọọla ụmụ Naijiria aka na ndị ka ha zere ụfọdụ ọgwụ ọbara si mba Amerịka dịka CINCINNATI (WKRC) so na ọgwụ ndị a kpọchghara azụ na mba ahụ.

    A na-ere ọgwụ a ndị a n'ọdọahịa Walmart,Amazon, na Target mana ngalaba na-ahụ maka nchekwa ndị na-azụ ihe bụ the United States Consumer Product Safety Commission nyere ntuziaka ka a kwụsị iresị ya ndị mmadụ maka mmerụahụ maọbụ ọnwụ ọ na-ebutere ụmụaka.

    Dịka 'United States Consumer Product Safety Commission' si kwuo, ọgwụ ọbara ruru 60,000 gụnyere nke a kpọrọ Daily Prenatal Multi, Ultamins Women’s Multivitamin, nakwa Ultamins Women’s 50+ Multivitamin.

    Ndị ọrụ o metụtara chọpụtara na ọgwụ ahụ enweghị ihe nchekwa zuru oke nke pụtara na ụmụaka nụọ ya, ha nwere ike ịnwụ.

    Ha kwuru na nwata ṅụrụ ọgwụ ahụ na ntumadị nwere ike inwe nsogbu ọgbụgọ, ọbara mgbatu ala, mmebi imeju maọbụ ọnwụ.