Ụlọọrụ WAEC ekwuola na a kagbughị ule nke afọ 2025
Ụlọọrụ na-ahụ maka ule ndị gụchara ụlọakwụkwọ sekọndịrị bụ West African Examinations Council (WAEC) nke Naịjirịa ekwuola na ha akagbughị ule nke afọ 2025.
Na nzaghachi akụkọ na-efegharị na soshal midịa nke kwuru na ụlọọrụ ahụ kagburu akwụkwọ ule niile nke afọ a, ozi si n’aka ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ ahụ bụ Moyosola Adexina nke o wepụtara na soshal midịa, kwuru na a ga-ewepụta mpụtara ule ahụ tupu ụbọchị Mọnde, 4 Ọgọst, 2025.
Adexina gara n’ihu kwuo na ka ọ dị ugbua, ndị nkụzi enyechaala ụmụakwụkwọ akara edemede nke ule ahụ.
Ọ gwakwara ndị ọhaneze ka ha gbara ozi ọbụla esighị n’akara nke ama ama na ọ bụ nke ndị ụlọọrụ ahụ ọsọ n’ihi na ha na a bụ karị ozi ụgha.