Onye ejije na mba Austrialia Julian McMahon nke ama-ama
maka ọrụ ya n’usoro ihe onyonyo Nip/Tuck
na Charmed anwụọla dịka ọ gbachara afọ iri ise na isii (56)
Nwunye ya, onye kwupụtara onwu ya si na ọ nwuru na mpaghara
Clearwater, Florida n’ụbọchi Wenezde 3 Julaị, 2025 dịka a chọpụtara na ọ na-arịa
ọrịa kansa.
“Julian hụrụ ndụ n’anya. Ọ hụrụ ezinaụlọ ya n’anya. Ọ hụrụ
ndị enyi ya n’anya. Ọ hụrụ ọru ya n’anya. Ọ hụrụ ndị ndu ya n'anya. Ihe ọchịchọ
ya bụ iweta obi ụtọ na ndụ ndị mmadụ o nwere ike,” Kelly Paniagua kwuru nke a dịka ụlọọrụ Deadline si depụta
ya.
Ọrụ McMahon malitere site n’usoro ihe nkiri onyonyo Charmed
tupu ya enweta nkwanye ugwu na Nip/Tuck, ihe nkiri ahụike nke ọ rụrụ ọrụ dị ka
dọkịnta na-awa arụzi ahụ bụ dọkinta Christian Troy.
Ihe nkiri onyonyo ahụ nke na-achu oge isii site na afọ 2003
rue afọ 2010 nwetara ya nhọpụta Golden Globe.
Onye so ya n’ihe onyonyo ahụ bụ Dylan Walsh gwara ụlọọrụ
ntaakụkọ Dealine na "o juru ya anya". "Anyị gbakọrọ ebili mmiri
a onu, ahụrụ m ya n'anya”
"Jules! Amaara m na ị ga-achọ ka m kwuo ihe ga-eme gị ọnụ
ọchị - ihe ọchị niile dị n'ime. N'afọ ndị ahụ niile i nwere azụ m, na chi m,
anyị chịrị ọchị. Obi m dịnyere gị. Zuru ike n'udo."
McMahon, nwa nke onye bụbu Praịm Minista Australia mere
ejije ọrụ praịm minista Australia n’ihe onyonyo Netflix - The Residence - otu
n'ime ihe ngosi ya nke ọ hụrụ
McMahon lụrụ nwaanyi ugboro atọ - onye mbụ bụ onye Australia
na-agụ egwu Dannii Minogue, nwanne Kylie Minogue.