Egbuola nnukwu onyendu Hamas, Ismail Haniyeh n’Iran

Akụkọ ndị kachasị mkpa n'ụwa n'ọnwa Julaị 2024

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uche Akolisa, Jessica Nwankwo, Michael Ilediagu

  1. E ehigharịala mmachi keke nkwọghari keke n'abali n'Abia steeti

    Keke

    Gọọmentị Abia steeti ehigharịala mmalite mmachi nkwọgharị keke n'abali ka ọ bụrụ n'abalị mbụ nke ọnwa Ọgọstụ afọ 2024.

    Gọọmentị steeti ahụ tinyeburu iwu ka keke kwụsị ịgba n'Aba nakwa Umuahia, Abia steeti malite n' Elekere asaa nke abalị rue Elekere isiii nke ụtụtụ bido taa bụ abalị mbụ nke ọnwa Juun afọ 2024.

    Kọmishona na-ahụ maka mgbasaozi steeti ahụ bụ Okey Kalu onye mara ọkwa mgbanwe ahụ n'ozi o binyere aka ma wepụta n'ụbọchị Monde, kwuru na mbugharị e bugharịrị mmalite mmachi ahụ bụ iji nye ohere ka ndị o metụtara na ọha ndị Abia steeti nwee ohere hazie onwe ha.

    Cheta na nsonso a, Gọọmentị Abia steeti tinyere iwu na keke agaghịkwa na-agba n'abalị dịka ha boro ebubo na ndị omekome jizi ya akwara ngwaọrụ n'abalị.

  2. Mwakpo Borno: Gịnị mere Boko Haram ji eji ụmụnwaanyị agba ogbunigwe?

    Boko Haram

    Ebe foto si, Getty Images

    Mwakpo abụọ mere na Borno steeti n'Ugwu Naijiria na abalị ole na ole ebutela egwyu na ịtụ uche na he Gọọmentị kwuru na ha akwaaala nku ndị Boko Haram na Naijiria.

    O pekata mpe mmadụ 18 nwụrụ dịka ụmụnwaanyị mere mwakpo n'obodo Gwoza dị na Maiduguri, isiobodo Borno bụ akwụ ndị Boko Haram.

    Nke abụ nke ugboro atọ n'ọnwa Anọ ndị Boko Haram gbara ogbunigwe gburu mmadụ ma merụọ ọtụtụ arụ.

    Mwakpoo ndịa mere na nsonso a mere ọtụtụ na-ajụ ma ndị agha Jihad nwogharị ma kpawakwa ike ọzọ.

    Ọkụ ndị inyom ahụ gara agwa ọkụ na nsonso a mere ọtụtụ ji ajụ ma ndị Boko Haram achọrọ iji ụmụnwaanyị akpa ike.

    BBC Hausa lere anya n'etu Boko Haram si eme mwakpo ma tulekwa uche ndị ọkachamara n'ihe gbasara nchekwa.

    Mwakpo Boko Haram

    Mwakpo Boko Haram pụtara ihe n'anya ụwa n'afọ Eprelu afọ 2014 oge ndịagha nnupuisi jihad tọọrọ 276 n'ụlọakwụkwọ n'obodo Chibok, nso Gwoza.

    Ihe karịị ụmụaka 100 ka bụ ihe a na-achọ achọ.

    Ka a tọchara ụmaka ụmụnwaanyị ahụ, otu ahụ mekwara amwakpo ọzọ n'ọnwa Juun bụ nke ha ji nwaanyị mmee ka ọ gachara afọ atọ ha gbara ogbunuigwe mbụ ha.

    Kemgbe ahụ, kepukepu na-efegharị na-ekwu na ọ bụ ụmụnwaanyị ndị Chibok a tọọrọ ka ndị Boko Haram jizi agba ogbunigwe.

    Kemgbe ahụ atụmatụ ijji ụmụnwaanyị esunye ụlọ ọkụ mabụ etinye ọgbunigwe arịala elu.

    Akụkọ gosiri na ha kacha eji ụmụnwaanyị agba ogbunigwe karịa ndị agha nnupuisi ndị ọzọ enwerela.

    O nweghị ụzọ e nwere ike isi kọwaa ihe mere na Ndị Boko Haram na-eji ụmụnwaanyị agba ogbunigwe maọbụ ịkpa arụ iyi ndụ egwu karuiia na ikekwe, ọ bụ n'ihi ejiji akwa mwuda n'esi n'isi rue n'ụkwụ ha kpọrọ 'hijab' nke mere ka ọ na-adịrị ha mfe izo ogbuniigwe.

    Ụmụnwaanyị enweghị uwe, anaghịkwanụ ajụkarị ha ajụjụ maọbụ nyochaa ha etu e si enyocha ụmụnwoke.

    Ngụkọ e mere na nsonso a gosiri na ụmụnwaanyị mere ihe karịị ọkara mwakpo Boko Haram merela.

  3. Ntuliaka France: Ndị 'Far right' akala nweta vootu n'agba nke mbụ

    Marine Le Pen

    Ebe foto si, Reuters

    Ndị otu 'Far- Right na mba Fransị enwetala vootu kachasị n' agba nke mbụ ntuliaka ụlọoemiwu mba ahụ mere na nsonso a.

    Ndị nkwado otu 'Natioal Rally(RN)' nke Marine Le Pen bụ ndị achọghị ndị mbịarambịara nwụrụ dịka pati ahụ nwetara pasent vootu 33.1%, ebe ndị 'Left-Wing' nwetara nani pasent 28, ebe ndị pati Macron bụ onyeisila nwetara nani vootu 20.76.

    Onye ndu otu Pati RB bụ ordan Bardella gbara afọ 28 kwuru sị, “Ebumnobi m bụ ịbụ Praim Minista ndị Fransi nile ma ọ bụrụ ha ndị Fansị nye anyị vootu ha."

    Ndị 'Far Right emeritubeghị n'agba nke mbụ na ntuliaka ụlọomeiwu mba Fransị.

    Alain Duhamel bụ onye ọnụ na-eru n'okwu kwuru na o menwuru bụ ihe iriba ama.

    Ihe Marine Le Penna Jordan Bardella chọrọ bụ ka ha nweta ọnụọgụgụ kachasị n'oche 289 n'ime 577 nke ụlọomeiwu mba ahụ.

    Ọ bụụ na ha enwetaghị oche kachasị n'ọnụọgụgụ, Ụlọomeiwu mba Franasi ga-eko n'elu ; otu RN agaghị enweta ohere ịhụ na atụmatụ ha dịka o si metụta ndị mbịarambịara , mgbubi ụtụisi nakwa idebe iwu agaghị aga dịka ha chọrọ.

    Praim Minista Fransi Emmanuel Macron bụ onye chọrọ okwu dịka ọ kpọrọ oku ka e mee ntuliaka ahụ mana ugbua otu meriri, o sịrị na " ya bụ ihe kacha mma ime."

  4. Ndeewo nụ o1

    Ndeewo nu o, Igbo ndị ọma anyị ji biri!

    Soro anyị ebe a maka akụkọ ndị ndị mkpa n'ụwa gbaa gburugburu.