Awakpoola ndị na-agba gọọmenti Uganda ụkwụ dịka ha na-akwado ịhazi ngagharịiwe

Ebe foto si, Bobi Wine/X
Onyendu otu na-agba gọọmenti Yuganda ụkwụ bụ Bobi Wine ekwuola na ndị ọrụ nchekwa dị n’isi obodo mba ahụ bụ Kampala awakpoola isi ụlọọrụ pati ya.
O kwuru na ndị nchekwa ahụ mere nke a n’abalị ga-abọ ụbọchị ha kwadoro ime ngagharịiwe megide gọọmenti Yuganda.
Dịka o siri kwuo “ndịagha na ndị uweojii emeela isi ụlọorụ pati National Unity Platform (NUP) ụlọ ndịagha ma nwụchiekwa ụfọdụ ndị isi pati anyị n’ike.”
Ndị uweojii ekwubeghị ma ọ bụ eziokwu na anwụchiri ndị pati NUP mana ha kwuru sị ha azọpụla njem ndị kwesịrị ekwesị iji gbochie ịchịkọta ụmụ mmadụ maka ngagharịiwe ahụ.
Onyeisiala Yuganda bụ Yoweri Museveni dọrọ aka na ntị n’ụbọchị Satọde na ndị na-ahazi ngagharịiwe ahụ ji “ọkụ egwuri egwu”.
Ndị ntorobịa Yuganda anọrọla na-achọ nkwado n’ọbaozi ịntaneetị maka ngagharịiwe ahụ ha chọrọ iji kpọọ oku ka akwụsị nrụrụaka na ọchịchị ọjọọ.
Ka o siladị, nwaamadị ahụ na-eti egwu bụ Bobi Wine, onye ezigbo aha ya bụ Robert Kyagulanyi gọrọ agụgọ na NUP na-ahazi ngagharịiwe na Yuganda kama o kwuru na pati ya na-akwado mbọ ọbụla a na-agba ime ngagharịiwe megide nrụrụaka na ọchịchị ọjọọ.



















