A kwusịla nwafọ Naịjirịa isonye n’egwuregwu Olimpiks maka ebubo ịṅụ ọgwụ ike
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Cynthia Temitayo Ogunsemilore
A kwusịla
nwafọ Naịjirịa na-etiọkpọ aha bụ Cynthia Temitayo Ogunsemilore isonye n’egwuregwu
Paris Olimpiks maka ebubo ịṅụ ọgwụ ike.
Ulọọrụ
na-enyocha ndị na-esonye n’egwuregwu ahụ bụ International Testing Agency (ITA) kwuru
na-enwetara ihe gosiri ọgwụ iwụ megidere n’ime ahụ Temitayo.
Ụlọọrụ
ITA kwuru na nyocha na-aga n’ihu ugbua ma kwuo na a ga-agwa Temitayo mkpebi.
Ka ọ dị
ugbua, Temitayo gbara afọ 22, onye kwesiri iti ọkpọ nke mbụ ya n’egwuregwu
Olimpiks ụbọchị Monde 29, Julaị 2024, enweghịzi ike isonye n’egwuregwu ahụ ruo
oge e mechara nyocha ahụ.
Gọọmenti etiti enyela iwu ka e chekwa oke ala Naịjirịa niile
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Oke ala Naịjirịa na mba Niger
Gọọmenti
etiti Naịjirịa enyeela ulọọrụ Nigeria Immigration Service iwu ka ha tinye ezi
nchekwa n’oke ala Naịjirịa.
Ọnụ
na-ekwuru ụlọọrụ NIS bụ KT Udo kwuru na onyeisi ụlọọrụ ahụ nyere iwu ka ndị isi
NIS na steeti niile gbadoanya ma hụ na-enwere ezi nchekwa n’oke ala Naịjirịa.
Ndụmọdụ a
na-abịa dịka ụmụntorobịa Naịjirịa na-akwado ime ngagharịiwe banyere ihe isiike
na ajọ ọnọdụ akụnaụba Naịjirịa.
Ulọọrụ
NIS kpọrọ oku ka ndị ọrụ niile kwụdosia ike ma hụ na ndị omekome abataghị na
ngagharịiwe ahụ.
Ogbunigwe a
tụrụ n’obodo Golan Heights bụ ebe ndị Isreal na-achịkọta gburu ụmụaka iri na abụọ
mgbe ha na-egwu egwu ma merụọ ọtụtụ ndị ọzo ahụ dị gọọmentị mba Isreal si kwuo.
Isreal
na-arụ akana ọ bụ otu agha nnupuisi mba
Lebanon a kpọro Hisbollah tụrụ ogbunigwe n’ụbọchị Satọde mana otu a sị na aka
ha adịghị na ya.
Tupu ogbunigwe
a agbaa, otu Hisbollah dị na mbụ kwuo na ha tụrụ ogbunigwe igwe anọ n’ebe dị
iche iche mana na ọ bụghị ha tụrụ nke Golan Heights.
Praịm Minista
mba Isreal bụ Benjamin Netanyahu na ndịisi ha ṅụrụ iyi imegwara ndị otu
Hisbollah, nke mere egwu ji atụ ndị mmadụ na nke a nwereike ibute agha n’etiti
ha abụọ.
N’isi ụtụtụ Sọnde ka ndịagha mba Isreala kwuru na ha atụọla ogbunigwe n’ogige asaa bụ ebe ndịagha nnupuisi Hisbollah na-anọ.
Ogbunigwe a gbara na Golan Heights bụ nke kachasị taa isi mmadụ kamgbe mwakpo mere n’ọnwa Ọktoba afọ 2023 na mpaghara ugwu obodo a bụ ebe mba Isreal na-achịkọta.
Gọọmentị mba Iran adọọla Isreal aka na ntị maka mwakpo ọbụla ha na-eme n’obodo Lebanon.
Ọnụ na-ekwuru Praịm mịnịsta mba ahụ bụ Nasser Kanani kwuru na ihe ọbụla ndịagha Isreal na-eme na Lebanon nwereike ibute ọgbaghara na enweghi nchekwa maọbụ agha na mpaghara ahụ.
N’otu aka ahụ Iran dọkwara Isreal aka na ntị dịka ha tụchara ogbunigwe n’ụfọdụ ogige ndiagha nnupuisi Hesbollah.
Ebe ogbunigwe ahụ gbara kpọmkwem
Igbo ndị ọma mma mma nụ ooo!
Anyị na-abata unu n'ọgbakọ BBC Igbo taa ma sị ka ụbọchị a maara gị mma.
E chefukwala ịnọnyere anyị taa maka akụkọ ndị gbapụtara ihe.
Nwoke a ma ama gburu ọtụtụ mmadụ na mba Saụt Afrịka anwụọla
Nkọwa foto, Louis van Schoor nọrọ afọ 12 n'ụlọ mkpọrọ oge a mara ya ikpe maka igbu mmadụ asaa.
Otu onye
a ma ama na-egbu ndị mmadụ na mba Saụt Afrịka anwụọla.
Louis van Schoor, onye a maara dịka The Apartheid Killer, gburu ọtụtụ ọwụwa anyanwụ London na Saụt Afrịka, ebe ọ na-arụ ọrụ dị ka onye nche nzuzo.
Ọnwụ ya na-esote nyocha BBC mere n’izu gara aga banyere mkpamkpa ya niile nke gosiri ndị o gburu n’afọ 1980s.
Nwanne otu onye o gburu gwara BBC na ọ na-atụ anya ka ndị uweojii ga-mpegharị nyocha Louis agbayeghi na ọ nwụọla.
N'ime afọ 1986 na 1989, ọ gbaburu ihe ruru mmadụ 39. Ha niile bụ ndị oji.
A wuchiri ya ma maa ya ikpe n’afọ 1991. E mechara tọghapụ ya ka ọ nọrọ afọ 12 n’ụlọ mkpọrọ.
Oge ọ dị ndụ, o kwuru na ndị niile ya gburu bụ ndị ekperima o jidere mgbe ha na-eme ihe ọjọ.
Van Schoor gbara afọ 72, na-enweta nleta n’ụlọọgwụ maka ihe mere ya ụkwụ tupu ọ nwụọ ụbọchị Tozde 25, Julaị, 2024.
Ka anyị jikọọ aka dozie Naịjirịa, hapụ ime ngagharịiwe - Osote onyeisiala Kashim Shettima
Ebe foto si, Kashim Shettima /X
Nkọwa foto, Kashim Shettima
Osote
onyeisiala Naịjirịa bụ Kashim Shettima agwaala ndị ntorobịa Naịjirịa na ugbua
abụghị oge ime ngagharịiwe kama ọ bụ oge ijikọ aka ọnụ mee ka Naịjirịa dị
mma.
Shettima
kwuputara nke a n’ozi onye na ekwuchitere ya bụ Stanley Nkwocha wepụtara.
Ọ kpọrọ
oku ka ndị ahụ na-akwado ime ngagharịiwe nye gọọmenti onyeisiala Bola
Tinubu oge iji hụ na ihe bidoro gawa nke ọma Naịjirịa.
Barack Obama akwanyerela Kamala Harris aja n'ukwu n'ịzọ ọkwa Onyeisiala
Ebe foto si, Getty Images
Barack Obama akwụdorola Kamala Harris bụ osote onyeisiala mba Amerịka na njem ya ịzọ ọkwa onyeisiala mba Amerịka.
N'ọzị Obama na nwunye ya bụ Michelle Obama weputara ha kwuru na ha kwenyere na Harris nwere "agwa. ahụmịhe nakwa ike nke ọnọdụ pụrụiche a na-achọ".
Obama so n'ihe karịrị ndị Democrat ruru 100 a ma ama bụ ndị Kamala Harris gwara okwu dịka Onyeisiala Joe Biden kwuru na ọ wụsala ọwa na njem izọ ọkwa onyeisiala ya.
N'ozi o weputara mgbe ahụ, Obama bunyere Biden ụkpa ekele mana o nweghi ihe o kwuru maka ikwado Harris.
Dịka ihe si kwụrụ ugbua ọtụtụ ndị otu Democrat akwụnyerela Kamala Harris nke mere ka ọ nwee ike ịbụ onye a ga-ahọpụta ife ọkọlọtọ otu ahụ n'ọgbakọ ha n'ọnwa Ọgọst.
N'ozi ahụ, Obama na nwunye ya kwuru na obi dị ha ụtọ n'ịkwado Harris ma kwe nkwa na ha ga-eme "ihe niile ike ha ruru" ịhụ na o meriri ọkwa ahụ.
"Anyị kwenyere na mkpebi Biden, ịhọpụta Kamala bụ otu n'ime mkpebi dị mma o merela. O zuru ka e emee".
Ha chetakwara ọrụ ya dị icheiche n'okwu ndọrọndọrọ site na mgbe ọ bụ Ọkaịwụ kachasị nke steeti California, onye omeiwu nakwa osote onyeisiala.
"O doro anyị anya na Kamala nwere ihe ọ ga-ewe, o tozuru etozu ịmeri ntuliaka a ma meta ndị mba Amerịka mma".
Mmadụ atọ anwụọla dịka ụlọ dara na Maryland Legọs
Ebe foto si, Lasema
Nkọwa foto, Ụlọ dara na Legọs
Mmadụ atọ anwụọla, ụfọdụ tọrọ n'ime ala ebe ndị ọzọ merụrụ ahụ n'ụlọ a na-ewu ewu dara na 13 Wilson Mba street Arowojobe Estate dị na Maryland, Legọs.
Ụlọọrụ Gbatagbata Legọs bụ LASEMA kwuru na ha enwetala ozu mmadụ atọ, buga ndị merụụ ahụ ụlọọrụ akpọghị aha ya.
Onyeisi Lasema bụ Olufemi Damilola Oke-Osanyintolu onye gbara ama n'ozi mgbasaozi o binyere aka kwukwara na otu onye ka tọrọ n'okpuru ụlọ ahụ nwere mmadụ isiii nọ ọrụ oge ọ dara.
ụlọ ọdịda na-eme na mpaghara dị iche iche na Naijiria ọ kachasị na Legọs.
Ebe foto si, Lasema
Ebe foto si, Lasema
Ndewoonụ o!
Ndewonu o, Igbo ndị ọma anyị ji aba mba!
Bianụ sonyere anyị ebe a maka akụkọ ndị mkpa n'ụwa taa.
Gịnị na-akpọtu n'Aba? Lee ihe anyị chọpụtara
Ndị na-azụ ahịa na ndị bi n'akụkụ Ngwa Road n'Aba dị n'Abia steeti etiela mkpu ụjọ maka ihe ha kpọrọ nwuchi ndị nkịtị bụ nke ha kwuru ndị uweojii steeti ahụ na-eme.
Ụfọdụ ndị gwara onye ntaakụkọ BBC okwu si na ndị uweojii RRS gbapụrụ egbe nke mere ka ndị mmadụ gbasasịa ọsọ ndụ mgbe ha bịara n'ahịa dị nsọ n'ebe ahụ.
Ndị ahịa ebe ahụ na-ebe arịrị maka etu ndị mmadụ si gbaara ahịa ha ọsọ iji hapụ idanye n'aka ndị uweojii na-anwuchiela onye ọ bụla ha hụrụ.
Gilbert Chigozie sị na "ọ dị ka ọgbọ ọgụ, ha nọkatara kwawa mgbọ iji chụsasị ndị mmadụ.
Ihe a ha mere tinyere ndị mmadụ ụjọ n'ahụ dịka ha na-akụ ụfọdụ mmadụ egbe ma na-agbapụ egbe otu mgbe.
Ndị mmadụ cheere na ha ga-apụta dịka ihe ahụ mechara mana ụbọchị so ya bụ Monde e ji eme 'Sit-at-Home'.
Ndị mmadụ achọghị ịpụta kwa mana dịka ehihie ruru ọ dị ka ihe niile adajụọla.
Ha pụtazie na mgbede ịzụchara ahịa ndị uweojii amabata gbapụ egbe ma mebie obere ahịa gbakọrọ na mgbede ahụ.
Ha nwụụrụkwara onye ọbụla aka ga metụtara." ka ọ kọọrọ onye ntaakụkọ anyị.
A na-eche na ọ bụ maka ndị uweojii abụọ ndị omekome gbagburu na mpaghara ahụ n'ụbọchị ụka ka nke a ji me mana o dobeghi anya.
\Maureen Chinaka na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ azabeghi ozi ezigaara ya gbasara ihe a na-eme rue ugbua.
Ụlọọrụ META emechiela akara 63,000 na-egwu ndị mmadụ wayo na Naijiria
Ebe foto si, Getty Images
Meta bụ ụrọọlụ nwe Facebook, WhatsApp na Instagram kwuru na ha wepulu akara Facebook ụmụ Naịjirịa ruru 63,000 maka nrụrụaka igwu ndị mmadụ chamdum.
Ha kwuru na ụmụ Naịjirịa ahụ na-eji okwu ịhụnanya were na-egwu ndị Amerika na ndị ọzọ chandum.
Ha sị na ha wepuru akara facebook rụrụ 2,500 bụ otu mmadụ 20 jị nwere na akpa mkpamkpa ahụ.
“Ha kacha egwu ndị mmadụ chandum na mba Amerika ma na eji njirimara wayo were na-emepe akara facebook”
“Ha ga-eme ka ha na ndị ha wudoro gbara ọtọ na-eme onyonyo bụ nke ha ga-emeche n’ikpeazụ jiri ya na akapụ ha ego.
Ha ga asị na ọ bụrụ na-iwetaghị ego na ha ga ekesasi onyonyo ebe ahụ gị gba atọ na soshal mịdịa”
Ndị na-eme ihe a na Naịjirịa ka ọtụtụ na-akpọ “Yahoo guys”.
Meta kwuru na ha nwere akụrụngwa ọhụrụ ha meputara nke na-enyere aka gbaama maka ndị ahụ na-egwu ndị mmadụ chandum.
Mana ọ dịka ihe ụkọ na oke agụụ dị na Naịjirịa ugbua eso mee ka igwu chandum na-akawayọnjọ n’etiti ndị na-etoeto.
Adọpụtala ozu mmadụ 229 na mbụzeala Ethiopia
Ebe foto si, Reuters
Ndị ọrụ
nnapụta abọpụtala ozu mmadụ narị abụọ na iri abụọ na itoli (229) na mbụzeala abụọ
kpọtụrụ n’ọwụwa anyanwụ Itiopịa.
Ndị ọchịchị
obodo ahụ mere ka BBC mata nke a oge ha nwere mkparịtaụka.
Mbụzeala ndị
ahụ mere n’abalị Sọnde na ụtụtụ Mọnde oge e nwechara mmiri ozuzo na mpaghara ugwu
dị na Gofa.
Ndị ọchịchị
obodo ahụ kwuru na ọrụ nnapụta na-aga n’ihu ebe ọnụọgụ ndị nwụrụ anwụ nwekwara
ike ịrị elu.
Ihe
onyonyoo e setere ebe ahụ gosiri ka ọtụtụ mmadụ gbakọrọ n’ogige ahụ e nwere mbụzeala
dịka ndị ọzọ na-egwupụta ureghure ebe ha na-achọ ndị tọrọ n’ime ala.
Nnukwu onye
ọchịchị Goza bụ Dagmawi Ayele gwara BBC na ndị nwụrụ anwụ gụnyere ndị okenye na
ụmụaka ebe mmadụ iri ndị nke a napụtara na ndụ na-anara ọgwụgwọ n’ụlọọgwụ.
Ụgbọelu akpọkaala na Nepal, gbuo mmadụ 18
Ebe foto si, AFP
Ụgbọelu akpọkaala
na Kathmandu oge ọ na-achọ ifepụ n’ụbọchị Wenezde 24 Julaị 2024.
Ndị uweojii
Nepal gwara ndị ntaakụkọ na ndị njem iri na asatọ (18) nwụrụ dịka anapụtara
onye ọkwọụgbọelu na ndụ.
Ọnụ
na-ekwuru ndị uweojii Nepal bụ Dan Bahadur Karki sịrị na ụgbọelu Saurya
Airlines ahụ bu ndị ọrụ ụgbọelu abụọ na ndị njem iri na asaa oge ọ kpọkara.
Ndịagha
kwuru na ụgbọelu ahụ kpọkara mgbe ọ jiiri ihe dịka nkeji iri na ise gaa elekere
iri na otu nke ụtụtụ (11:15am).
Ha sịrị na
ha na ndị ọrụ nnapụta na-agbakọta aka n’ọrụ enyemaaka na nnapụta ebe ahụ ya bụ ụgbọelu kpọkara.
E kwuru na ụgbọelu
ahụ baara ọkụ ngwangwa ọ gbapụrụ n’okporo ụgbọelu.
Anwụchiela ọtụtụ mmadụ na ngagharịiwe a haziri megide gọọmenti Uganda
Ebe foto si, EPA
Ejichiela ọtụtụ
mmadụ n’isi obodo Yuganda bụ Kampala oge ha sonyechara na ngagharịiwe a haziri megide
nrụrụaka, bụ nke gọọmenti mba ahụ machiri.
Ndị Ọkaiwu
sịrị na ihe ruru mmadụ iri isii (60) tinyere otu onye ntaakụkọ na ndị ntorobịa atọ
nọ n’isi ngagharịiwe ahụ ka akpụpụrụ n’ụlọikpe ma jichie ozugbo n’isochi njem
ha zọọrọ gaa n’ụlọomeiwu Yuganda n’ụbọchị Tuzde.
Onyeisiala
Yuganda bụ Yoweri Museveni, onye chịrịla mba ahụ ihe ruru afọ iri anọ (40) dọrọ
aka na ntị tupu ngagharịiwe ahụ amalite na ndị ahụ na-ahazi ya ji “ọkụ egwuri
egwu”.
E ji iwe
hazie ngagharịiwe ahụ n’ọbaozi soshal midịa n’ihi ebubo mpụ na omekoome rịrị
elu n’etiti ndị ọchịchị ọkwa ha dị elu.
Ihe kpaliri
ngaghrịiwe ahụ bụ nke ndị ntorobịa Kenya haziri, bụ nke mere ka Onyeisiala ha bụ
William Ruto kwụsị atụmatụ ibuli ụtụisi mba ahụ.
Etu ọgbaghara si dapụta na ngagharịiwe ndị ntoroọbịa Bangladesh na-eme
Ebe foto si, Reuters
Ihe ruru
mmadụ otu narị na iri ise (150) anwụọla na mba Bangladesh, mgbe ndị uweojii na ụmụakwụkwọ
mahadum na-eme nghagharịiwe sọkatara ise.
Ụfọdụ ndị nọ
n’ihi ọgụ a kọwaara BBC ihe butere nke a. Otu nwata akwụkwọ kwuru na ha chọrọ
ime ngagharịiwe n’ụzọ udo n’isi obodo ha bụ Dhaka mana ndị uweojii bịara wakpoo
ha ebe ha gbakọtara.
Otu onyendu
ụmụakwụkwọ na-agbake n’ụlọọgwụ kọwara etu ndị sị na ha bụ uweojii si kechie ya
anya ma taa ya ahụhụ.
N’aka nke ọzọ,
otu onye ọrụ ahụike gbata gbata kwuru na ọrụ juru ha aka dịka e butere ọtụtụ ndị
ntoroọbịa nwechara mmerụ site na mgbọ egbe dịka ọgbaghara ahụ na-aga n’ihu.
Ebe foto si, BBC Bangla
A na-ebu ndị ọrụ nchekwa ebubo iji oke aka ike mana gọọmentị na-arụ aka na ọ bụ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-ama ha aka butere ọgbaghara a pụtara mgbe e kere etu a ga-esi nye ọrụ na gọọmentị. Mana Ụlọikpe Kachasị akachapụla usoro inye ọrụ ahụ.
Igwe nziritaozi n’ịntanetị pụrụ kamgbe Tọzde emeela ka ozi dị mkpa ghara si na mba ahụ pụta, dịka e tinyere ọnọdụ onye apụla ezi nke ndịagha na-amanye ya.
Mana e weghachịtụrụ ịntanetị nye naanị ụlọọrụ ndị dị mkpa dịka ụlọakụ, ụlọọrụ tekịnụzụ nakwa ndị ụlọọrụ mgbasaozi.
Nke a bụ ọgbaghara kachasị ibe na-eme na mba ahụ kamgbe ọtụtụ afọ Sheikh Hasina dị afọ 76 weere ọkwa ọchịchị dịka Praịm minister n’ọnwa Jenụwarị, site na ntuliaka dị aṅaa nke ọtụtụ ndị na-ama ha aka gbajọrọ.
Igbo ndị ọma e ji eme ọnụ daalụ nụ oo!
Obi ọma sara asa ka anyị anabata unu n'ọgbakọ BBC Igbo taa.
Na-arịọ ka ị nọsie ike n'ọgbakọ anyị maka akụkọ ndị hiri odo na Naịjirịa nakwa n'ụwa gbaa gburu gburu.
Onyeisiala Bola Tinubu agwaala ụmụntorobịa ka ha ghara ime ngagharịiwe
Ebe foto si, Bola Tinubu/Facebook
Nkọwa foto, Onyeisiala Bola Tinubu
Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu agwaala ụmụntọrọbịa ka ha ghara ime ngaharịiwe ha na akwado maka ihe isiike na ajọ ọnọdụ akụnaụba Naịjirịa.
Mịnịsta na-ahụ maka mgbasa ozi bụ Mohammed Idris kwuru nke a na-ngwụcha ọgbakọ ya na onyeisiala, Bola Tinubu nwere n’Abuja.
N'okwu Idris "Onyeisiala Tinubu akwadoghị ngaharịiwe ahụ, ọ chọrọ ka a ghara ime ya."
Idris gara n'ihu kwuo na "Onyeisiala Bola Tinubu na-agba mbọ ime ka obodo Naịjirịa dị mma.”
Ọ kọwara na-enwere ọtụtụ mbọ gọọmenti na-agba iji dozie Naịjirịa ma kpọkuo ụmụntorobịa ka ha nwere onyeisiala obere ndidi.
Cheta na ọtụtụ ụmụntọrọbịa na-aga n'ihu ekesa ozi na soshal midia banyere ngagharịiwe ahụ ha na-akwado ime maka ihe ịsiike ha na-agabiga nakwa ajọ ọnọdụ akụnaụba Naịjirịa.
Ụlọomeiwu Naịjirịa emeela ka ụgwọọnwa opekatampe N70,000 bụrụ ịwụ
Ebe foto si, Nigerian Senate/Facebook
Ụlọ omeiwu Sịnetị Naịjirịa emeela ka ụgwọọnwa opekatampe 70,000 ka ọ bụrụ n’iwu.
A na-atụ anya na onyeisiala Bola Tinubu ga-ebinye aka n’ịwụ ahụ oge na-adịghị anya.
Cheta na onyeisiala Bola Tinubu degara ụlọ omeiwu akwụkwọ ma ụgwọọnwa opekatampe N70,000 ka ha mee ka ọ bụrụ ịwụ.
Nke a ga ebuli ụgwọọnwụ ndị ọlụ sị na N30,000 nwere bụrụzịa N70,000.
Ọ gara n'ihu gwa ndị omeiwu ka ha gbanwee afọ ole ọ na-enwe tupuu agbanwee ma ọ bụ hazịgharịa ihe gbasara ụgwọọnwa opekatampe ndị ọrụ ka ọ bụrụ naanị afọ atọ.
Onyeisiala Bola Tinubu ezigaala ụlọ omeiwu Naịjirịa akwụkwọ maka ụgwọọnwa opekatampe ọhụrụ
Ebe foto si, Bola Tinubu/Fcaebook
Nkọwa foto, Onyeisiala Naịjirịa Bola Tinubu
Onyeisiala
Naịjirịa bụ Bola Ahmed Tinubu ezigaala ụlọ omeiwu akwụkwọ maka ụgwọọnwa opekatampe ọhụrụ, ka ha tulee ma mee ya ka ọ bụrụ iwu.
Onyeisiala
Bola Tinubu degara ụlọ omeiwu ukwu (Senate) na ụlọ omeiwu nta (House of
Represntatives) akwụkwọ ozi ma rịọ ha ka ha tulee akwụkwọ ahụ iji hụ na
e buliri ụgwọọnwa opekatampe ndị ọrụ ka ọ bụrụ puku naịra iri asaa (N70,000)
Ọ rịọkwara ha ka ha belata oge ọ na-enwee iji megharị ụgwọọnwa opekatampe ka ọ bụrụzie afọ
atọ.
Ihe karịrị mmadụ 50 anwụọla site n'ala mbuze mere n'Ethiopia
Ebe foto si, Reuters
Ihe ruru
mmadụ iri ise anwụọla mgbe ala zere na mpaghara Ndịda Ethiopia dịka ndị ọrụ gọomentị
si kwuo.
Ọdachi a
mere na mgbede ụbọchị Sọnde na ụtụtụ ụbọchị Mọnde dịka oke mmiri zochara na
mpaghara Gofa dị n’ugwu.
Ndị ọrụ nchekwa
ọdịnala kwuru na a na-agbasi mbọ ike ịchọpụta ndị nwụrụ na ndị o metụtara, na ọnụọgụgụ
ndị nwụrụ anwụ nwereike ịgbagokwu elu.
Ihe onyonyo
gosiri ka ọtụrụ narị ndị mmadụ gbakọtara n’ebe ihe a mere ma na-egwu atịtị
na-achọ ndị mmadụ tọrọ n’ime ala.
N’akụkụ ya,
ka a na-ahụta ugwu dara ada nakwa aja ụrọ bọpụtara n’ala.
Meskir
Mitku, bụ onyeisi ọrụ mpaghara Gofa, kwuru na ụmụaka, ụmụnwaanyị na ndị uweojii
so n’ime ndị ihe a metụtara.
“E nwere oke
mmiri ozuzu n’abalị ụbọchị Sọnde, ụfọdụ mmadụ nwụrụ site n’ala mbuze,” ọnụ
na-ekwuru gọọmentị na mpaghara Gofa bụ Kassahun Abayneh kwuru.
N’ụtụtụ Mọnde
mgbe ndị mmadụ gụnyere ndị uweojii gbakọtara ịzọpụta ndị mmadụ mana mbuzo ọ mere
n’ihe dịka elekere 07:00 nke ụtụtụ ma gbuo ndị ahụ gbakọtara ebe ahụ.”
Gofa so n’otu
n’ebe ndị mejupụtara Ndịda Ethiopia ji kilomita 320 dị nso na mpaghara Addis
Ababa bụ isi obodo ahụ.
Ndịda Ethiopia
so n’otu n’ime mpaghara ebe oke mmiri kpara ike nso nso a, gụnyere idemmiri dịka
ụlọọrụ otu United Nations si kwuo.
Nke a abụghị
mbụ ala mbuze na-eme ebe ahụ, ihe ruru mmadụ iri ise nwụrụ n’afọ 2016 mgbe
mmiri ozuzu, idemmiri nakwa ala mbuze mere n’ebe ahụ.