Mmadụ anọ
n’ime ndị chọrọ isi n’Osimmiri abanye na UK anwụọla n’oge ụgbọmmiri ha kpuru.
Ndị
uweojii mba Fransị bụ ndị nọ n’ọrụ n’ọwammiri ahụ mere ka a mata nke a.
Ha kwuru
na e mere ka ha mata na ụgbọmmiri bu ndị na-achọ ịbanye n’England kpuru n’ebe
Boulogne-sur-Mer dị na mpaghara Ugwu nke France mana oge ha ruru ebe ahụ, ha chọpụtara
na mmadụ anọ awụọla.
Ndị Uweoji ahụ kwuru na ha zọpụtara mmadu 63.
Ha kwukwere na ụgbọelu helikọpta na ndị na-akụ azụ so nye aka n’ịzọpụta ndị
mmadụ.
Mmadụ
karịrị 13,000 esila n’ọwammiri ndị England ahụ wee gafee n’afọ a.
N’abalị iri
na asatọ nke ọnwa Juun, mmadụ ruru 882 esila n’ọwammịrị ahụ wee banye
n’England. Ndeko sị na Gọọmenti UK kwuru na nke a so na nke a kachasị n’afọ
a.
Na mbido
ịzuụka a, odeakwụkwọ gọọmentị UK siri na ha nwere usoro ọhụrụ iji kwụsị ụgbọmmiri
na-abanye na mba ahụ ma kwụọ na ha wepụtara onyeisi ọhụrụ maka ichekwa okeala
ha.
Igbo ndị ọma e ji eme ọnụ ndewo nụ ooo!
Anyị na-asị ka ụbọchị a maara unu na mma.
Buru oche bịa n'ọgbakọ BBC Igbo maka akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ụwa.
Ụgwọọnwa Opekatempe: Ọ bụ N250,000 ka anyị chọrọ - NLC, TUC
Ebe foto si, NLC/ASIWAJU BOLA AHMED TINUBU
Nkọwa foto, Joe Ajaero, Bola Tinubu na Festus Osifo
Ndị isi otu jịkọrọ ndịọrụ bụ Nigeria Labour
Congress (NLC), Trade Union Congress (TUC) na onyeisiala Bola Ahmed Tinubu nọrọ taa Julai 11,
nwe ọgbakọ ebe ha kwusiri ike na ọ bụ N250,000 ka ha chọrọ dịka ụgwọọnwa opekatempe
ndịọrụ Naịjirịa.
N'okwu ya, onyeisiala kwuru na ya chọrọ ka e nye ya oge tupu ya ezigara
ndị ụlọomeiwuNaịjirịa mkpebi ya n’okwu
ahụ.
Oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu ka ha nwechara ọgbakọ ahụ, onyeisi NLC bụ Joe Ajaero, kwuru na ha ka gbadoro ụkwụ ka N250,000 bụrụ ụgwọọnwa opekatempe ndịọrụ Naịjirịa.
N’aka nke ọzọ, minista na-ahụ maka ọrụ bụ
Nkeiruka Onyejeocha kwuru na e nwere olileanya na a ga-enwe
ezi mkpebi n'oge na-adịghị anya banyere ụgwọọnwa opekatempe ahụ.
Ọ bụ nrụrụaka mere gọọmenti ji achoghị ị kwụ ụgwọọnwa opekatempe – Onyeisi NLC
Ebe foto si, NLC
Nkọwa foto, Joe Ajaero
Onyeisi otu
jịkọtara ndịọru n’Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress bụ Joe Ajaero e kwuola
na ọ bụ nrụrụaka mere gọọmenti ji achọghị ịkwụ ndịọrụ ụgwọọnwa opekatempe ha
na-akpọ oku ya kemgbe.
Ajaero mere
ka amata nke a na mmemme otu na-ebu agha megide nrụrụaka bụ Economic and
Financial Crimes Commission mere n'Abuja iji gbasaa ozi megide nrụrụaka.
N’okwu ya,
Ajaero kwuru na onye ọbụla kwesiri ijikọta aka buo agha megide nrụrụaka nke ọ kọwara
dịka ọgbatauhie nye ezi mmepe obodo.
Ọ gara n’ihu
kwe nkwa na otu NLC dị njikere i nye EFCC nkwado na-mbọ ha na-agba ikpochapụ nrụrụaka
n’obodo Naịjirịa.
Ụlọikpe atụọla otu onye nga maka iji TikTok kparịa Onyeisiala mba Uganda
Ebe foto si, AFP
Ụlọikpe
na mba Uganda atụọla onye na-eme TikTok nga maka ịkparị Onyeisiala mba ahụ.
Edward
Awebwa ka a kpụpụrụ ụlọikpe maka ikesa okwu-asị na ikpọasị megide Onyeisiala bụ
Yoweri Museveni,nwunye ya bụ Janet
Museveni na nwa ya bụ Muhoozi Kainerugaba.
Ụlọikpe
kwukwara na Edward kesara okwu na-akpasụ iwe oge ọ na-asị na a ga-etinyekwu ụtụịsị
na mba ahụ.
Ọ gwara ụlọikpe
ka e mere ya ebere ma kwuo na ebubo e boro ya bụ eziokwu.
Mana Ọkaikpe
bụ Stella Maris Amabilis sị na “Edward egosighi na o nwere nwute n’ihe o mere
ma sị na e kwesịrị ịta ya ahụhụ”.
A tụrụ
ya nga afọ isii kwa otu ọnụ ebubo n’ebubo anọ e boro ya ma kwuo na ọ ga-akpọrọ
ndị a n’otu oge.
N’afọ
2022, odeakwụkwọ bụ Kakwenza Rukirabashaija ka a tụrụ nga maka ịkparị Onyeisiala
na nwa ya nwoke n’akara Twitter nke bụzi X.
Ọ gbapụrụ
gbalaa mba Germany ka ọ nọchara otu ọnwa na nga ma kwuo ma e tiri ya n’ụlọ nga.
Stella
Nyanzi bụ odeakwụkwọ ka a tụkwara nga maka ịde edemede kparịrị Onyeisiala
Uganda bụ Museveni.
Onyeisiala
Uganda bụ Museveni achịala mba ahụ kamgbe 1986, ihe ruru afọ ịrị na anọ tupu amụọ
Edward.
Mana n’afọ
2022 ka Musevenibinyere aka n’ịwụ nke
ndị mba ahụ na-akatọ ma kwụọ na o megidere ịwụ ikike dịịrị onye.
N’afọ
gara aga ka ụlọikpe kpebiri na mpaghara ịwụ ahụ nke kwuru maka “Ikesa okwu na-akpasu
iwe” adịghị n’ịwụ.
Mana
onye na-akpọ oku maka ikike dịịrị mmadụ bụ Michael Aboneka kwuru na ọ bụkwa ịwụ
ahụ nọ n’ụlọikpe ka e ji tụọ Edward nga.
Ọ gwara
BBC Newsday na onyeisiala mba Uganda na ezinaụlọ ha kwesịrị ịma na ndị ha na-achị ga ma-ekwu maka ha oge ọbụla.
O kwuru
“ọ bụrụ na ha achọghị ka ndị mmadụ na-ekwu maka ha, ha ga-akwado ịtụ ndị Uganda
niile nga”.
A nwụchiela onye a na-enyo enyo gburu nwunye onye ọrụ BBC na ụmụaka ya abụọ
Ebe foto si, Supplied
Ndị
uweojii na North London anwuchiela Kyle Clifford bụ nwoke ahụ a na-enyo enyo ji ụta
gbagbuo ụmụnwaanyị atọ.
A chọpụtara
na ụmụnwaanyị atọ ahụ e gburu bụ nwunye na ụmụaka onye oru BBC bụ John Hunt. Aha
ha bụ Carol Hunt dị afọ 61, Hannah Hunt dị afọ 28 na Louise Hunt dị afọ 25.
A hụrụ
ozu ha atọ n'ebe a gbara ha ụta.
Ndị
uweojii jidere Kyle Clifford dị afọ ịrị abụọ na isii n'akụkụ ebe a na-eli ozu
na North London.
Tupuu ndị
uweojii anwuchie Kyle Clifford, ha bu ụzọ gbaa ụlọ niile dị n'akụkụ ebe a na-eli ọzụ dị na Lavender Hill gburu gburu ma jiri ụgbọelu
na-efegharị n'akụkụ ebe ahụ.
Gọọmentị dara iwu imetọ ikike dịịrị onye n'oge ngagharịiwe EndSars - Ụlọikpe ECOWAS
Ebe foto si, Getty Images
Ụlọikpe
Ecowas ekwuola na Gọọmentị Naịjirịa dara iwu megide ikike dịịrị onye n’oge ngagharịiwe
EndSars
Ụlọikpe otu
ECOWAS ebiela ikpe ma kwuo na gọọmentị Naịjirịa dara iwu megide ikike dịịrị onye
nke Obianuju Udeh na mmadụ abụọ ọzọ.
Ụlọikpe a
kwuru na ha dara iwu dị na ngalaba 1,4,6,9,10 na 11 dị n’akwụkwọ nkwekọrịta otu
ECOWAS nke gbagidere ụkwụ na mmetọ ikike nchekwa, ikwu okwu, inwe ọgbakọ, ntaramahụhụ
na ihe ndị ọzọ.
Obianuju
Udeh, Perpectual Kamsi na Dabiraoluwa Adeyinka gbara gọọmentị akwụkwọ ma kwuo
na e metọrọ ikike dịịrị ha n’oge ngagharịiwe EndSars na Lekki Toll Gate n’afọ
2020.
Mana ọkaikpe
Koroma Sengu ji ikpe ahụ kụchapụrụ ebubo na e metọrọ ikike ibi ndụ mmadụ atọ a.
Ọ gara n’ihu
nye iwu ka Gọọmentị Etiti kwụọ ndị a nde naịra abụọ n’otu n’otu maka imetọ
ikike dịịrị ha n’ụzọ dị iche iche.
Mana gọọmentị
etiti gọrọ na onweghi ihe ọbụla ha mere kama na ndị a gbakọtara na Lekki Toll
Gate n’ụzọ iwu na-akwadoghi n’aha ime ngagharịiwe udo.
Ha kwukwara
na ndị ọrụ nchekwa nke gọọmentị rụrụ ọrụ ha n’ụzọ kwesịrị ekwesị na-adaghị iwu ọbụla.
N’ikpeazụ ụlọikpe
nyere iwu ka gọọmentị kwụọ ndị a ụgwọ iti aka n’obi maka imetọ ikike dịịrị ha.
Onyeisiala Tinubu na ndị ndu NLC/TUC ga-enwe ọgbakọ
Ebe foto si, Bola Tibubu/X
Onyeisiala
Bola Tinubu na ndịisi otu jikọtara ndị ọrụ Bekee ga-enwe ọgbakọ n’ụbọchị Tọzde
Onyeisiala
Bola Tibubu na ndị ndu otu jikọtara ndị ọrụ Bekee gụnyere NLC na TUC ga-ezukọ n’Abuja
na Tọzde maka mkpebi banyere ụgwọ opekatampe ndị ọrụ.
Otu n’ime
ndị ndu a mere ka ndị ntaakụkọ mata nke a, kwuru na Onyeisiala kpọrọ ha oku
maka ọgbakọ ahụ ga-adị n’obi ọchịchị ya bụ Aso Villa.
A na-atụ
anya na Onyeisiala Tinubu ga-ekpebi ego ole ọ ga-akwụ ndị ọrụ dịka ụgwọ
opekatampe site na N62,000 gọọmentị kwetere ịkwụ nakwa ego ole ụlọọrụ ndị mmadụ
nwe ga-akwụ.
A ga-atụlekwa
N250,000 ndị ọrụ na-esi ọnwụ ka gọọmentị na-akwụ ha.
Ọgbakọ a
na-abịa n’ime otu ọnwa Onyeisiala kwuru na ọ ga-ezigaara ndị ụlọomeiwu akwụkwọ
mkpebi banyere ụgwọ ọnwa ahụ ka ha mee ka ọ bụrụ iwu.
E gbuola Carol Hunt bụ nwunye onye ọrụ BBC na ụmụ ya abụọ na mba Briten
Ebe foto si, Supplied
Onye ọlụ na BBC bụ John Hunt ka eji ụta gbagbụọ wunye na ụmụ ya abụọ na Bushey dị nsọ na Watford.
Aha wunye ya Carol Hunt dị afọ 61 ebe ụmụ ya abụọ dị afọ 25 na 28 .
E gburu ha atọ na ụbọchị Tusde na ihe dịka elekere 19:00 BST bu mgbe a kporo ndi uweojii n'ulo ahu biara hu na ha emeruola ezigbo ahu ma mechaa nwuo n'ebe ahu tupu e buru ha gawa uloogwu.
Onyeisi ndị uweoji na Hertfordshire bụ CH Supt Simpson kwuru na aha onye ha na enyoenyo gbagburu mmadụ atọ ahụ bụ Kyle Clifford.
“Anyị etinyela ihe niile anyị were ime ka anyị chọta Kyle Clifford na Nọt London nakwa Bushey”.
Ndị uweoji kwuru na Kyle Clifford jị ụta gbụọ mmadụ atọ ahụ ma gwa ọhanaeze ka ha fie asaa na anya maka na kyle ka gi ụta ahụ ma nweike ịgbụ onye ọzọ.
Ha gwakwara ndi oha mmadu ha abiala nwoke ahu bu Kyle Clifford nso.
Ada Onyeisiala Kameruun egosila ụwa na ya na nwaanyị ibe ya na-enwe mmekọ
Ebe foto si, Brenda Biya/Instagram
Ada Onyeisiala
mba Kameruun ekwuola na ihe mere o jiri gbaa onwe ya n’anwụ dịka onye ya na
nwaanyị ibe ya na-enwe mmekọ bụ na o nwere olileanya na ọ ga-agbanwe ihu
machiri ụdịrị mmekọ ahụ na mba ha.
Brenda Biya
gwara ndi ntaakụkọ akwụkwọ La Parisien na e nwere ọtụtụ ndị nọ n’ọnọdụ ya, na ọ
chọrọ ịkpalite mmụọ ndị dị etu a.
Nwagbọghọ a
dị afọ iri abụọ na asaa wepụtara foto ebe ọ na-esusu nwaanyị ọzọ na soshal
midia n’izuụka gara aga bụ nke bọlitere ọtụtụ okwu na Kameruun.
“Isi
na-agbaka m n’ebe ịnọ, ma achọrọ m ka ụwa mara,” ka o kwuru n’ọbaozi Instagram
na foto ebe ọ na-amakọ onye a na-agba nkiri na Brazil bụ Layyons Valenca.
Na mkparịtaụka
ya na La Parisien, o kwuru na o meela ka ezinaụlọ ya niile mata tupu o kesaa
foto ahụ n’intanetị.
“Ịgba onwe
m n’anwụ bụ ohere iji zisaa ozi dị oke mkpa,” ka o kwuru.
Ọ gakwụnyere
na iwu ahụ machiri mmekọrịta mmadụ na ụdịdị ya nke dị tupu nna ya abanye n’ọkwa
Onyeisiala “ezighi ezi, enwere m olileanya na akụkọ m ga-agbanwe ya”.
Nna ya bụ
Paul Biya dị afọ 91 malitere ịchị Kameruun kamgbe 1982 ma soro ndịisiala kachasị
nọtee aka n’ọkwa na mba Afrịka.
Nwada Biya kwuru
na ya na enyi ya nwaanyị a nke Brazil malitere ime ọyị kamgbe ọnwa asatọ, na ha
agaala mba Kameruun ugboro atọ mana o nweghi onye ọ gwara na ha na-ayị.
Nwada a na-eti
egwu kwuru na o nwetele ọtụtụ ozi nkwado nakwa nkatọ kamgbe o kwupụtara mmekọ
ya na enyi ya nwaanyị a.
O kwuru na
nne na nna nakwa nwanne ya nwoke akpọọla ya n’ekwentị ka o wepụ foto ahụ na
soshal midia mana ọ gbara ha nkịtị.
Mmekọrịta
mmadụ na ụdịdị ya bụ ihe megidere iwu na mba Kameruun nka ga-eduga onye dara
iwu a nga afọ ise.
Onyeisiala
na nwunye ya ekwubeghi ihe ọbụla banyere nke a.
Anwuchiela Joachin Chikaodi Mbonu dị afọ ịrị anọ na abụọ bụ onye na-ere ọgwụike a na achọachọ na obodo ya dịka ndị NDLEA wetere Mpurummiri, egbe na ihe ndị ọzọ oge ha wakporo Imo, Port Harcourt jidekwa ndị ọzọ ana enyoenyo.
Na akwụkwọ ozi ndị NDLEA weputara ha kwuru na ha wuchiri Joachin Chikaodi Mbonu n’ụlọ ya dị na Umuomi, Uzogba-Ezenomi dị na okpuruochichi Ikeduru n’Imo Steeti.
“Ndị otu ya na ere ọgwụike na Imo nakwa Rivers steeti ma buru ndị na ere nnukwu mpkụrụmmịrị na mpaghara Ndịda ọwụwa anyanwụ nakwa Ndịda ndịda Naịjirịa”.
NDLEA kwukwara na ha wuchikwara Kenneth Chibuike Ofoegbu dị afọ ịrị atọ na anọ oge e jidere ọga ha ma hụ mkpụrụmmịrị, egbe na ọgwụike ndị ọzọ na aka ya.
Ha kwuru na Mbonu nọ n’ụlọ nga ndị NDLEA ebe gọọmentị etiti ga anapụ ya ụlọ ya abụọ dị n’Imo steeti.
“Mbonu sị na Saụt Afrịka gbalaga afọ ole ma ole gara aga mgbe e bidoro na eme nyocha n’ịsị gbasara ọgwụike”.
Onyeisi ndị NDLEA bụ Mohamed Buba Marwa kenere ndị ọrụ ya gara ọrụ ahụ wuchie ndị na ere ọgwụike ahụ ma kọwa na ha mere nyocha n’isi ndị ahụ n’ụzọ dị icheiche tupuu awuchie ha.
Marwa kwuru na enweghi ebe onye ọbụla na ere ọgwụike ga ezo na Naịjirịa.
Favour Okenyi Okechukwu: Etu e si hụ ozu nwa akwụkwọ UNN a na-achọ achọ
Ebe foto si, UNN/Facebook
A hụla ozu otu nwata akwụkwọ nwaanyị mahadum 'University of Nigeria Nsukka' (UNN) a na-achọ achọ achọ.
Anya ikpeazụ a hụrụ Favour Okenyi bụ tupu a chọwa achọ ya bụ ụbọchị Tuzde izuụka gara aga dịka ọ gachara Klas lawa.
Akụkọ na-efegharị na soshal midia kwuru na nwetara ozu nwata agbọghọ ahụ nọ afọ mbụ ya na ngalaba 'Medical Laboratory Science' n'azụ ebe obibi ụmụakwụkwọ ụmụnwoke 'Eni-Njoku male hostel dị n'ogige mahadum ahụ ụbọchị Fraide.
Mana ndịsi mahadum ahụ kwuru na "ọ bụ n'ọwammiri dị n’akụkụ ama egwuruegwu Akanu Ibiam nke dị n’ime mahadum anyị ka a hụrụ ozu nwa ada ahụ".
N'ozi mahadum nke ọnụ na-ekwuru mahadum UNN bụ Okwu Omeaku binyere aka ma wepụta ụbọchị Monde, o kwupụtara obi mgbawa mahadum ahụ n'ihi ọnwụ erughị eru nwa akwụkwọ ha.
Ọ gara n'ihu kwuo sị, ““Mahadụm anyị na-ewe iwe maka ọnwụ nwatakịrị a ma na-eti ezịnaụlọ ọ metutara aka n’obi.”
“Ndị isi mahadum anyị na ndị ọrụ nchekwa na-etiko isi ọnụ ịchọpụta ka nwa a sịrị bụrụ onye nwụrụ anwụ ma weputa ụzọ a ga eji kwụsị ụdịrị ihe dị etu ime ọzọ na ọdị n’ịhụ”.
Ọ gara n’ihu rịọ oha na eze, ọ kachasị ndị nwere ihe ha ma gbasara ọnwụ Okenyi Favour Okechukwu ka ha wetara ozi nye ndị ọrụ nchekwa.
Ndeewo!
Ndeewonụ, ndị ọma!
Sonye anyị ebe a maka akụkọ dị mkpa.
ECOWAS ga-enwe nzukọ n’Abuja dịka Niger, Mali na Burkina Faso pụrụ n’otu ahụ
Ebe foto si, Getty Images
Ndị ndu mba
ndị e nwere n’ọdịda anyanwụ Afrịka ga-enwe nzukọ n’ụbọchị Sọnde na Naịjirịa dịka
ụfọdụ mba dị na mpaghara ahụ na-agabiga nsogbu ndọrọndọrọ ọchịchị.
Nzukọ ahụ
ga-adị n’ime otu mkpụrụ ụbọchị mba Nijie, Mali na Bọkịna Faso kwupụtara na ha
na ECOWAS enweghịzi mmekọ.
A tụrụ anya
na nzụkọ ahụ ga-adị n’Abụja ga-eleba anya n’ọpụpụ mba atọ ndị ahụ n’otu ECOWAS tinyere
nhiwe otu nchekwa pụrụ iche ga-ebu agha megide ọnọdụ enweghị nchekwa na
mpaghara ahụ.
Ụfọdụ ndị
ndu mba ndị e nwere na mpaghara ahụ kpọrọ ya bụ ọgbakọ taa iji dozie esemookwu
dị n’etiti ha na ndịagha ji ikikere ọchịchị na mba atọ.
Na nzukọ ndị
ndu Mali, Nijie na Bọkịna Faso nwere n’ụbọchị Satọde na Yamaị, onyeisi ndịagha
Nijie bụ General Abdourahamane Tiani kwuru na mba atọ ndị ahụ agaghị alaghachi
ECOWAS oge ha bochara otu ahụ ebubo ịgbakọọrọ Fransị aka.
Ndịagha mba
atọ ahụ chụpụrụ ndịagha Fransị na mba ha dị iche iche ma laghachi ka ha na mba Rọshịa
na-emekọ ihe.
Amerịka bụ
mba ikpeazụ na-ewezuga ndịagha ya na Nijie dịka mba ahụ kagburu mmekọrịta ya na
Amerịka.
Ụlọikpe agwaala Minista ochie ya kọwaa etu o si mefu 729bn n'ọchịchị Buhari
Ebe foto si, SADIYA UMAR FAROUQ
Otu ụlọikpe ukwu agwaala onye bụbu Minista ọdịmma mmadụ, gbatagbata nakwa mwulite obodo bụ Sadiya Umar Farouq ịbịa nye nkọwa etu o si mefu ego ruru 729bn bụ nke ọ sị ọ kwụrụ mmadụ nde 24.3 nọ n'ụbịam n'afọ 2021.
Ụlọikpe ahụ gwakwara Farouk ya weputa aha ndị niile ritere ego ahụ, ebe ha bi, njirimara ha nakwa steeti ndị so rite ya bụ ego na mmadụ ole a kwụrụ ụgwọ kwa steeti.
Nke a pụtara ihe dịka osote onyeisi otu SERAP bụ otu na-azọ ikike ruru onye akpọrọ Kolawole Oluwadare gbara ama kwuo na ọ nabatala akwụkwọ mkpebi ahụ n'ụbọchị Fraide gara aga.
Kolawole sị na Ọkaiwu Dipeolu na mkepi ya kwuru na "E ji ikike dị n'ime Freedom of Information inye onye ọbụla nke gụịnyere otu SERAP nkọwa agwa Minister ya weputa etu o si mefu N729bn bụ nke enyere ndị Naịjirịa nọ n'ụbịam ruru 24.3 n'afọ 2021".
Ihe ozọ Ọkaiwu ahụ si Minista ahụ kọwaa bụ echiche dị n'ikenye ndị Naịjirịa nde 24.3 naira puku ise kwa otu onye nke pụtara ikesa pasentị ise n'ime bojeetị Naịjirịa afọ 2021.
Ndị uweojii a dọọla aka na nti megide ọgbakọ 'Ncheta ụbọchị' ndị otu nzuzo
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Ndị uweojii
Ndị
uweojii a dọọla ọhanaeze aka na nti banyere akụkọ na ndị otu nzuzo na-akwado mmeme ncheta ụbọchị ndị otu nzuzo ụbọchị Sunde Julaị 7, 2024.
Ndị
uweojii kọwara mmeme ahụ dịka nke iwu megidere maa kpọ oku ka onye ọbụla maọbụ ndị na-akwado mmeme sepụ aka na ya.
Ndị
na-ekwuchitere ndị uweojii na Legọs, Anambra na Rivers steeti mere ka a
amata na ha dị njikere izute ndị maọbụ onye ọbụla e jidere na-ahazi mmeme ahụ.
Ha dọrọ
ndị ụlọ oriri na ọṅụṅụ dị iche iche ka ha kpọ ya mkpa ị hụ na enweghị ndị mere
mmeme dị etu ahụ n’ogige ha n’ihi na e nwere ntaramahụhụ dịrị ndị nupuru isi na
ndụmọọdụ a.
A dọrọ
ndị nne na nna aka na nti ka ha hụ na ụmụaka ha abụghị ndị na etinye aka na mpụ ọbụla.
Agụụ ga-anyụ mmadụ nde 82 na Naịjirịa ịkpakwụ n'afọ 2030 - United Nations
Ebe foto si, Getty Images
Otu United
Nations ekwuola na ụmụafọ Naịjirịa ruru ọnụọgụgụ nde 82 nwereike ịhụta onwe ha
n’ọnọdụ agụụ na ụbịam site ugbua na-eru ngwụcha afọ 2030.
Ngalaba otu
a na-ahụ maka nri na ọrụ ugbo a kpọrọ UN’s Food and Agricultural Organisation
kwuru na ozi si na nyocha na-eme kwa afọ gosiri ọnọdụ enweghi nri nwereike ịkawanye
njọ.
“Gọọmentị
Naịjirịa na ndị ọnụ na-eru n’okwu emeela nyocha banyere nri nke a na-eme kwa afọ.
Mpụtara nyocha ahụ gosiri na mmadụ nde 82 ga-anọ n’agụụ na ngwụcha afọ 2030,”nke
a bụ Taofiq Braimoh bụ onye ọrụ ahụ kwuru n’ọgbakọ ha mere n’Abuja.
Ọ gara n’ihu
kwuo na ụfọdụ ihe butere nsogbu ụkọ nri na Naịjirịa gụnyere mgbanwe ihu eluigwe,
ọnọdụ nchekwa ọjọọ nakwa ụmụ ahụhụ ndị na-eme ka ọrụ ugbo ghara ime ọfụma.
Amụma a otu
United Nations buru na-abịa dịka ọnụahịa nri na Naịjirịa rịrị elu nke ukwuu nke
merela ka ọtụtụ ezinaụlọ belata aka na nri ndị na-azụ.
N’akụkọ pụtara
na nso nso a, ụlọọrụ ngụkọ na Naịjirịa kwuru na ọnụahịa nri ji pasentị 40.66% gbagoo
elu n’ọnwa Mee nke na-ebeghi mbụ kamgbe ọtụtụ afọ.
Onyeisiala
Naịjirịa bụ Bola Tinubu entinyebuola ọnọdụ gbata gbata na nri, iji gboo nsogbu ụkọ
nri mana nsogbu a ka dịkwa ire.
Ụlọelu ogogo abụọ adaala n’Aba
Ụlọelu
ogogo abụọ a ka na-arụ arụ adaala n’azụ ụlọụka St John’s Anglican Church Osusu
dị n’okpuruọchịchị Aba North nke Abịa steeti.
Ozi anyị
nwetara kwuru na ụlọelu ahụ a na-akụ gbamgbam dara mgbe ọ kụrụ ihe dịka elekere
asatọ nke abalị (8pm) n’ụbọchị Fraịde 5 Julaị 2024 mana enweghị onye ọ kụgburu.
Otu onye hụrụ
ka o si mee kwuru na onye nwe ụlọ ahụ gachara lee ka ọrụ si aga na ya nkeji ole
na ole tupu ụlọ ahụ adaa.
Dịka o siri
kwuo, ihe e chere butere ọdịda ụlọ ahụ bụ ejighị akụrụngwa ndị rijuru afọ oge a
na-arụ ya.
Ka o siladị,
ụlọọrụ na-ahụ maka nhazi obodo n’Abịa steeti bụ Aba South Town Planning Authority
amachiela ụlọ ahụ iji gbochie ndị mmadụ ịbanye n’ogige ya.
Onye ọrụ Aba
South Town Planning Authority na-achọghị ka a kpọọ ya aha kpuhere na agwala ndị
bi gburugburu ụlọ ahụ ka ha kwapụ dịka ha ga-amalite ikutu mpaghara ụlọ ahụ fọrọ
afọ.
Cheta na
ihe a bụ otu ọnwa ụlọelu ogogo atọ a ka na-arụ arụ dara n’okpuruọchịchị
Ugwunagbo nke Abịa steeti ma kụgbuo ndị ọrụ ise.
Ahọpụtala Massoud Pezeshkian dịka onyeisiala Iran
Ebe foto si, Reuters
Ahọpụtala Massoud
Pezeshkian dịka onyeisiala ọhụrụ nke mba Ịran dịka o merichara Saeed Jalili nke
otu Conservative.
Okwe ntụliaka
ahụ gosiri na Pezeshkian nwetara pasenti vootu iri ise na atọ na ụma atọ (53.3%)
iji merie Jalili nwetara pasenti vootu iri anọ na anọ na ụma atọ (44.3%) nke ọnụọgụ
vootu karịrị nde iri atọ (30m) a tụrụ na Ịran.
A haziri ntụliaka
ahụ dịka onye bụbu onyeisiala Iran bụ Ebrahim Raisi nwụrụ na mkpọka ụgbọelu
helikọpta n’ime ọnwa Mee.
Pezeshkian gbara
afọ iri asaa na otu (71) bụụrụ dọkịta na-awa obi nakwa onye omeiwu Ịran tupu
ahọpụta ya dịka onyeisiala.
O kwere
nkwa na ya ga-eweta udo na ịdịnootu ma hụkwa na Ịran kwụsịrị iwezuga onwe ya
iche na mbaụwa.