Ọ bụ naanị Chineke pụrụ ịgbanwe obi m ịzọ ọkwa onyeisiala – Biden
Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala
mba Amerịka bụ Joe Biden ekwuola na ọ bụ naanị “Chineke bi n’igwe” pụrụ ime ka ọ
gbanwee obi ya gbasara ịzọ ọkwa onyeisiala nke ugboro abụọ.
Biden kwuru
nke a oge onye ntaakụkọ na-agba ya ajụjụ iji mee ka obi ruo ndị mmadụ ala banyere
njikere ọ dị ịzọ ọkwa onyeisiala Amerịka.
Oge ọ
na-ekwu okwu n’ụlọmgbasaozi ABC News n’ụbọchị Fraịde, Biden kwuru na ya agaghị anwale
ụbụrụisi ya ma gosi ọhanaeze iji mee ka ha mata na ya tozuru oke ịlaghachi n’ọkwa.
“A na m
anwale ụbụrụisi m ụbọchị niile. Ụbọchị niile ka m na-eme ya bụ nnwale. Ihe
niile m na-eme bụ nnwale,” ka ọ gwara onye ntaakụkọ bụ George Stephanopoulos.
Ọ gara n’ihu
kwuo na ya echeghị na e nwere onye ọzọ tozuru oke karịa ya ma kwuo na ihe mere
o meghị nke ọma na nrụrịtaụka a haziri izuụka gara aga bụ n’ihi ike ọgwụgwụ na “oyi
ọjọọ”.
Ụgbọoloko agbapụla n’okporoigwe na Delta steeti
Otu ụgbọoloko
na-agba n’okporoigwe sitere Warri gawa Itakpe agbapụla n’okporoigwe na Delta
steeti.
Nke a mere
n’ụbọchị Tọzde 4 Julaị 2024 mgbe ọ kụrụ ihe dịka elekere asaa nke abalị na
mpaghara Abraka dị n’okpuruọchịchị Ethiope East nke Delta steeti.
Ozi anyị
nwetara kwuru na ụgbọoloko ahụ si Itakpe dị na Kogi steeti na-aga Ujevwu dị na
Delta steeti tupu otu mpaghara ya agbapụ n’okporoigwe n’akụkụ ọdọ ụgbọoloko dị
n'Abraka.
Oge BBC
Igbo kpọtụụrụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Delta steeti bụ Bright Edafe, ọ kọwara
ya dịka eziokwu ma kwuo na enweghị onye nwụrụ n’ihe mberede ahụ.
A maala ndịagha DR Congo 25 ikpe ọnwụ maka ịgba ọsọ n’ihu agha
Ebe foto si, Reuters
A maala ndịagha
mmadụ 25 na DR Congo ikpe ọnwụ maka ịgba ọsọ n’ihu ọgụ n'oge ha na ndị nndupụisi
M23 na-akwakọrịta mgbo.
Ụlọikpe ndịagha
DR Congo dị na Nọt Kivu mara mmadụ 25 ahụ ikpe ọnwụ ma kwụọ na ha zuuru ngwa ahịa n'ụlọahịa ndị mmadụ oge ha na-agba ọsọ.
Mmadụ anọ
na ndị a mara ikpe ọnwụ ahụ ka ụlọikpe tọhapụrụ nwụnye ha n’ebubo eboro ha maka ịnata di ha ihe ndị ha zuru n'oyi.
Mana ọkaịwụ
mmadụ abụọ na ndị a mara ikpe ọnwụ ahụ kwuru na ya ga-akpụpụ ndịagha DR Congo n’ụlọikpe
mkpeghari.
E wepu mmadụ
ịrị abụọ na ise ahụ, e nwere onye nke ụlọikpe ndịagha ahụ tụrụ nga afọ ịrị, ma tọhapụ
otu onye ọzọ.
N'ọnwa
Mee, ụlọikpe ndịagha DR Congo dị na mpaghara Goma makwara ndịagha mmadụ asatọ
ikpe ọnwụ maka ịgba ọsọ n’ihu ọgụ mgbe ha ndịagha nnupuisi na-akwakọrịta mgbọ.
Mmadụ
asatọ ahụ kwuru na ha ga-aga n'ụlọikpe mkpegharị.
Ndị
nnupuisi M23 emeriela ndịagha DR Congo n'ọtụtụ nkwakọrịta mgbọ ma napụ ha obodo
dịcha mkpa na mpaghara Kanyabayonga.
A na-ebo
mba Rwanda ebubo na ha kwadoro ndịagha nnupuisi M23 mana gọọmentị mba Rwanda gọrọ
agụgọ sị na aka ha dị ọcha.
Otu United Nation (UN) kwuru na ọnọdụ mpaghara Nọt Kivu dị na DR Congo bụ ihe e
kwesiri itinye anya.
N'izuụka
gara aga, mmadụ karịrị 150,000 gbara ọsọ ndụ, ha gbapụrụ na'ụlọ ha bụ nnukwu
ihe iche aka mgba maka na e nwere mmadụ karịrị Nde 2.8 bụ ndị na-enweghị ulọ na
mpaghara Afrịka ahụ.
UN kwukwara
na Nọt Kivu abụghị ebe dị mma maka ọrụ enyemaka maaọbụ ọrụ gbatagbata.
N’ụbọchị Sọnde
ka e gburu ndị ọrụ enyemaka na-rụrụ ndị Tearfund ọrụ n'oge a wakpọrọ ụgbọala ha n'obodo Butembo.
DR Congo na-enweta ihe ịsọ-ngọngọ n'agha ha na-ebuso ndịagha nnupuisi M23 na ndị nnupuisi ndị ọzọ.
DR Congo nwere nnukwu nghọtahe n’etiti ndịagha
ha.
Ndịagha DR
Congo na-akpa agwa ka ndị azụghị azụ na ndị na-enweghị ugwu.
Ha na-ebe akwa na
ego gọọmentị na-akwụ ha dị obere ma na-ekwu na ha enweghị ezigbo ngwa agha.
Adọpụtala ozu ndị njem 89 n’osimiri Atlantic
Ebe foto si, Reuters
Ndị nchekwa
egberemmiri Mọrịtenịa adọpụtala ozu ndị njem iri asatọ na itolu (89) n’otu ụgbọmmiri
kpuru n’osimiri Atlantik n’ụbọchị Mọnde.
A napụtara
mmadụ itolu nke gụnyere otu nwatanwaanyị gbara afọ ise mana ọtụtụ ndị ọzọ ka
na-efu efu.
Ndị nyara
ndụ kwuru na ụgbọmmiri ahụ e ji akọ azụ nke nwere otu narị mmadụ na iri asaa
(170) n’ime ya malitere njem n’okeala Senegal na Gambịa izuụka gara aga.
Ka o siladị,
ụgbọmmiri ahụ kpuru dịka ọ gafechara mpaghara ọdịda anyanwụ nke egberemmiri Mọrịtenịa.
Mọrịtenịa bụ
ụzọ ngafe a maara nke ọma maka ndị njem chọrọ isite ọdịda anyanwụ Afrịka banye
Yurọp.
A sị na
puku kwuru puku ụgbọmmiri hapụrụ mba ahụ n’ime afọ gara aga.
Ebe ndị
njem ahụ na-enwetekarị onwe ha bụ na Kanarị Aịland dị na Spen.
Gọọmenti
Spen kwuru na ihe ruru mmadụ puku iri anọ (40,000) wụchiri na mba ahụ n’ime afọ
gara aga.
Ụlọọrụ Ca-minando
Fronteras charity kwuru na ihe karịrị ndị njem puku ise (5,000) nwụrụ oge ha
na-agba mbọ isi na mmiri garuo Spen n’ime ọnwa ise mbụ nke afọ 2024.
Ihe mberede okporoụzọ ataala isi otu onye n'Anambra steeti
Ebe foto si, FRSC Anambra steeti
Nkọwa foto, Nnukwu ugbọala ahụ dara
Ọnụ
na-ekwuru ụlọọrụ Federal Road Safety Corps (FRSC) n'Anambra steeti bụ Margaret
Onabe e kwuola na ihe mberede okporoụzọ mere taa bụ abalị 4 Julaị 2024 na Tanza dị
n'okporoụzọ awara awa si Nteje Awka gawa Ọnitsha nke steeti ahụ, ataala isi otu
onye ma merue otu onye ọzọ ahụ.
Onye hụrụ
mgbe mberede ahụ mere kwuru na nnukwu ụgbọala ahụ dara mgbe taya ya gbara.
Ndị uweojii
nọ na mpaghara ogidi bugara ozu onye ahụ nwụrụ n'ụlọ ọba ozu ebe onye
ahụ meruru ahụ na-anata nleta n'ụlọọgwụ.
Onyeisi ụlọọrụ
Federal Road Safety Corps (FRSC) n'Anambra steeti bụ Adeoye Irelewuyi dọrọ ndị
ọkwọrụgbọala aka na nti ka ha dobe ụgbọala aha n’ọnọdụ dị mma tupu ha malite
njem.
Ụlọikpe mkpegharị a kagbuola nchụpụ a chụpụrụ ndị ụlọomeiwu Rivers steeti
Nkọwa foto, Foto Gọvanọ Fubara na Amaewhule
Ụlọikpe Mkpegharị dị n'Abuja a kagbuola nchụpụ ụlọikpe
ukwu Rivers steeti chụpụrụ Martin Amaewhule na mmadụ iri abụọ na anọ ndị ọzọ dịka
ndị ụlọomeiwu Rivers steeti.
Ndị ọkaiwu atọ nke ụlọikpe mkpegharị ahụ kwuru na ụlọikpe ukwu Rivers steeti enweghị ikike inye iwu nchụpụ ndị ahụ.
Ụlọikpe ahụ kwuru na ngalaba 272(3) nke iwu Naịjirịa
nyere naanị ụlọikpe ukwu etiti ikike ikpebi ma oche onye ụlọomeiwu a tọgbọrọ
chakoo.
Dịka ụlọikpe ahụ siri kwu, iwu megidere ụlọikpe
ukwu steeti ị kpe ikpe banyere oche onye ụlọomeiwu.
Agaghị m ahapụ ịzọ ọkwa Onyeisiala mba Amerịka - Joe Biden
Ebe foto si, EPA
Onyeisiala
mba Amerịka bụ Joe Biden agbaala isiakwara ma kwuo na o nweghi iki ịhapụ ịzọ ọkwa
onyeisiala mba ha nke afọ a.
O kwuru nke
a n’ụbọchị Wenezde mgbe ya na ndịisi pati ya bụ Democratsna ndị otu achụmnta vootu ya zutere bụ ebe ọ mere
ka obi ruo ha ala banyere ọnọdụ ya.
Nke a na-abịa
dịka kepu kepu na-ekwu na nwamadị a nwereike ịgbatu n’ịzọ ọkwa ahụ ka osote ya bụ
Kamala Harris nọchie anya ya n’ihi etu o si tajagharịa ọnụ na nrụrịtaụka ya na Donald
Trump na-ama ya aka mere n’izuụka gara aga.
Mana Biden
gwara ndị pati ya na ndị otu ya na ọ ka kwụ chịm n’ịzọ ọkwa ahụ dịka Harris
kwere nkwa ịkwụ ya n’azụ. Ọ bụ m ka a họpụtara na pati Democrats. O nweghi onye
na-akwapụ m. Agaghị m apụ,” ka ọ gwara ndị otu ya.
Otu okwu ahụ
dịka n’ozi e zigaara ndị nkwado achụmnta vootu ‘Biden-Harris’. Ka m kwuo ya ka
o doo ewu na ọkụkọ anya: Ana m azọ ọkwa,” Ka Biden kwuru n’ozi ahụ ma gbakwụnye
aga m azọ ọkwa a ruo n’ọgwụgwụ”.
Ọtụtụ ndị
mmadụ na-ajụ ma nwamadị a dị afọ 81 ọ ga-aga n’ihu n’ịzọ ọkwa onyeisiala na-agbanyeghi
etu o si ghara ime ọfụma na nrụrịtaụka ya na Trump mere bụ nke ọ tajagharịrị ọnụ
dịka onye na-amaghị ihe ọ na-ekwu. Nke a butere ntụgharị uche n’etiti ndị pati
Democrats ma Biden ọ ga-enwenwu ike ịzọ ọkwa a ma merie.
Igbo mụrụ nze mụọ ọzọ daalụ nụ ooo!
Obi ọma ka anyị ji anabata unu n'ụbọchị taa n'ọgbakọ BBC Igbo.
Anyị na-asị ka ụbọchị a maara unu na mma ooo!
Jisie ike nọnyere anyị n'ọgbakọ BBC Igbo maka akụkọ ndị gbapụtara ihe.
EFCC adọọla ndị chọrọ ime ngagharịiwe megide ụlọọrụ aka na ntị
Ebe foto si, EFCC
Ụlọorụ
na-ebuagha megide mpụ na nrụrụaka ego bụ Economic and Financial Crime
Commission (EFCC) adọọla ọhanaeze aka na ntị maka ndị otu na-achọ ịhazi ngagharịiwe
megide ụlọọrụ ha.
N’ozi ọnụ
na-ekwuru ha bụ Dele Oyewale wepụtara, kwuru na ndị otu a na-agbasa ozi na
soshal midia na-akwanye ndị ntoroọbịa ọkụ n’ike ka ha buru ‘ngwa ọgụ’ megide ụlọorụ
EFCC n’ụbọchị ole ma ole na-abịa abịa.
O kwuru na
ngagharịiwe ahụ bụ iji megide agha ụlọọrụ ha na-ebu megide ndị na-eji ịntanetị
ezu ego mmadụ ibe ha.
Ụlọọrụ a ji
ohere ahụ rịọ ndị nne na nna, ndị na-elekọta ụmụntoroọbịa na ndịisi ụlọakwụkwọ
mahadum dị ich iche ka ha gbaa mbọ hụụ na ụmụaka ha esoghi na ndị na-akwado ime
ngagharịiwe ahụ bụ nke ha sị bụ ibuagha megide ụlọọrụ EFCC.
N’okwu ya na mmemme ahụ. Gọvanọ Soludo kwuru na
ebumnobi gọọmenti ya bụ ị nwe okpuruọchịchị ga-arụ ọrụ ma nweta ezi mmepe.
Aha ndị ahụ e duru n’iyi ọrụ gunyere Ifeanyi
Chiweze (Okpuruọchichị Anambra East), Fidelis Nnazo, (Okpuruọchichị Anambra West),
Romanus Ibekwe (Okpuruọchichị Anaocha), Chinedu Okafor (Okpuruọchichị Awka
South), Alphonsus Ofumele (Okpuruọchichị Ayamelum), Chijioke Ozumba (Okpuruọchichị
Dunukofia), Stanley Nkwoka (Okpuruọchichị Idemili North), Chinedu Ononiba (Okpuruọchichị
Njikoka), Val Ezeogidi (Okpuruọchichị Nnewi South), Franklin Nwadialo (Okpuruọchichị
Ogbaru), Anthony Nwora (Okpuruọchichị Onitsha North), Casmir Nwafor (Okpuruọchichị
Orumba North) and Shedrack Azubuike (Okpuruọchichị Orumba South).
Ebe foto si, Chukwuma Soludo/Facebook
Nkọwa foto, Gọvanọ Soludo na ndị e duru n'iyi ọrụ
Ndị ọzọ bụ Chibuike Ofobuike (Okpuruọchichị Aguata),
Thankgod Aniagor (Okpuruọchichị Awka North), Amaka Obi (Okpuruọchichị Idemili
South), Emeka Orji (Okpuruọchichị Onitsha South), Anayo Orjiakor (Okpuruọchichị
Ihiala), Chris Obiora (Okpuruọchichị Nnewi North) Chimezie Obi (Okpuruọchichị Ekwusigo)
and Emma Nweke (Okpuruọchichị Oyi).
Etu idemmiri si kpaa ike na mpaghara Lagos dị iche iche
Ebe foto si, Screen shot
Oke
idemmiri nke sitere na mmiri ozuzo emeela ọtụtụ ndị bi na Legọs ịwa n’ụtụtụ ụbọchị
Wenezde 3 Julaị, 2024.
Ọtụtụ ndị
bi na Legọs tetara n’ụra ka ha bilie gawa ọrụ mana ha zutere oke idemmiri n’ụlọ
ha nakwa n’okporoụzọ ha dị iche iche.
Nke a na-abịa
dịka mmiri malitere izo n’ime abalị Tuzde bọtara ụbọchị Wenezde ma zoro rute n’ehihie
Wenezde, ma tochie okporoụzọ nakwa ụlọ ndị mmadụ.
Ụfọdụ ebe
ndị a metụtara na Legọs gụnyere, okporoụzọ Iyana Oworo gawara akwammiri ‘third
mainland, ọtụtụ ebe dị na Lekki, Ajah, okporoụzọ si Ketu gawa Ikorodu.
Ebe foto si, Screen shot
Ebe ndị ọzọ o metụtara gụnyere Oshodi, Gbagada, ụfọdụ mpaghara Surulere nakwa ebe ndị ọzọ.
Idemmiri gbochiri ọtụtụ ndị ịga n’ụlọọrụ ha nakwa ụlọakwụkwọ ha, dịka ndị mmadụ kwụcha n’okporoụzọ na-eze mmiri.
Ụgbọala ọtụtụ ndị mmadụ mebikwara emebi dịka ụfọdụ ha bụ ndị idemmiri rikpuchara.
Ụlọọrụ na-ahụ maka gbata gbata na Legọs kwuru na onye ọbụla na-enweghi ebe dị mkpa ọ na-aga n’oge udu mmiri a kwesịrị ịnọ n’ụlọ maka izute idemmiri.
Mba Sierra Leone eweputala ịwụ ọhụrụ machịrị ịnụ ụmụaka
Ebe foto si, Sierra Leone presidency
Mba Sierra Leone eweputala ịwụ machịrị ịnụ nwatakịrị na erubeghị afọ ịrị na asatọ.
E mere ka amata nke a n’emume wunye onyeisiala mba ahụ bụ Fatima Bio mere n’isi mba ha bụ Freetown.
Na emume ahụ bụ nke ndị ọbịa dị icheiche ọkachasị wunye onyeisiala ndị Cape Verde na Namibia bụ ndị nọ ma kirie oge onyeisiala mba Sierra Leone bụ Julius Maada Bio binyere aka n’akwụkwọ ịwụ.
Iwụ ahụ manyere ahụhụ a ga ata onye ọbụla nụrụ nwatakịrị nwanyị na erubeghị afọ ịrị na asatọ.
Ahụhụ onye ahụ ga ata bụ ịga nga afọ ịrị na ise ma ọ bụ ụgwụ ụgwọ rụrụ $4000 ma ọ bụ a taa ya ahụhụ abụọ ahụ.
Nwata nnwanyị na agụ akwụkwọ na Mahadum bụ Khadijatu kwuru na ya nabatara ịwụ ahụ ma kọwa na ọ ka amashị ya na ịwụ ahụ pụtara n’oge tupu nnwanne ya nwanyị anụọ dị na afọ ịrị na anọ.
Khadijatu dị afọ ịrị abụọ na isii kwuru na “Ọ ka amasị m na ịwụ a pụtara n’oge. Ọ ka enyere m aka zọpụta nwanne m nwanyị, ndị enyi m na ndị agbataobi m”.
Sierra Leone bụ obodo omenala ebe ọ na adịlị nne na nna mfe ime ka nwa ha nwanyị nụọ dị na nwatakịrị n’ike.
Nwada Barrie ka a nunyere dị oge ọ dị afọ ịrị. Barrie ekweghị anụ nwoke ahụ nke mere o gị sị na ezịnaụlọ ha gbapụ oge nne na nna ya kpọrọ ya asị ma kwụọ na ọbụghịzị nwa ha.
Barrie nwere ezichi maka na ọ wetara onyenkuzi na akụlụ ya ụgwọ akwụkwọ nakwa onye ọlụ obiebele sị na UN bụ nke nyere ụlọ obibi.
Ebe foto si, Sierra Leone Presidency
Barrie kwuru na ịwụ ọhụrụ ahụ bụ ihe ga ahịa ahụ maka na ọtụtụ ndị nọ n’ime obodo amaghị maka ya.
A ga agbasa ọzị rụọ n’ime obodo ga ndị mmadụ mara, nke a ga eme ka ịwụ ahụ dịrị ire.
Ọ kwuru na “onye ọbụla mara ahụhụ onye dara ịwụ ahụ ga ata, obodo a ga adị mma”
Mịnịsta na ahụ maka ahụike na mba ahụ kwuru na ịtọ n’ime ụmụnwanyị anọ nụrụ dị oge ha erubeghị afọ ịrị na asatọ bụ nke mere ọtụtụ gị anwụ na afọ ime – nke a mere Siera Leone otu na mba kachasị bụrụ ebe nwanyị dị ime na nwa na awụ.
Iwụ ahụ mekwara ka ataa nwoke ahụ na anụ nwatakịrị ahụhụ, nne na nna nwa nwanyị ahụ, nakwa ndị niile bịara na oge a na eme emume ịgbamụakwụkwọ ha.
Nwunye onyeisiala mba Sierra Leone bụ onye kwadoro ịwụ nakwa ịwụ machịrị ịkpasọ ụmụanwanyị agwa ọjọo dịka ịwakpọ ha chọrọ ka emume oge dị ya ga ebinyeaka na ịwụ ahụ daa ụda.
Kemgbe ndị omeịwụ mere ka ịwụ ahụ bụrụ ịwụ na ịzụ ụka ole ma ole garaaga, ndị nta akụkọ adịghị ekwu maka ya.
Gọọmentị ewepụla ụtụisi ‘withholding tax’ n’isi ndị ọrụ ugbo na ndị azụmaahịa nta
Ebe foto si, Getty Images
Gọọmentị Naịjirịa
etinyela aka n’akwụkwọ ka ndị ọrụ ugbo na ndị azụmaahịa obere kwụsị ịkwụ ụtụisi
a kpọrọ ‘withholding tax’.
Nke a dị n’akwụkwọ
ozi Onyeisioche kọmitii na-ahụ maka nwogharị ụtụisi bụ Taiwo Oyedele wepụtara n’akara
soshal midia X.
Oyedele kwuru
na mkpebi a so n’atụmatụ nwogharị ụtụisi nke gọọmentị na-eme iji gboo nsogbu dị
n’usoro ụtụisi na Naịjirịa.
Ndị ọzọ nke
a ga-emetụta gụnyere ndị nwere azụmaahịa na-anaghị enwete nnukwu uru na ya bụ
ndị a ga-ebelata ụtụisi ha na-akwụ, ụlọọrụ ndị na-arụpụta ihe nakwa ndị na-arụ ọrụ
ugbo.
Gịnị bụ ụtụisi
a a kpọrọ ‘withholding tax’?
Nke a bụ ụtụisi
agbakwụnyere iji hụụ na ndị ọrụ ngo, ndị na-atụ ngwaahịa, ndị na-arụpụta ihe
nakwa ndị nwere ụlọ so na ndị ga na-akwụ ụtụisi. Ọ bụ na-akpa gọọmentị ka a
na-akwụ ya bụ ụtụisi.
A malitere ịwụ
ụtụisi a n’afọ 1977, e mere iji hụụ na ego ga na-abata n’akpa gọọmentị kwa mgbe
kwa mgbe nakwa iji belata usoro ndị mmadụ ji agbanahụ ịkwụ ụtụisi.
Ego ole a
na-akwụ n’ụtụisi ‘withholding tax’ na-amalite na pasentị ise ruo pasentị iri
(5-10%) ma a tụlee ụdịrị azụmaahịa onye ahụ mere. Ụtụisi a na-apụta ihe ma a kwụọ
ndị dịka ụgwọ ụlọ, ego mmụta, nakwa azụmaahịa dị iche iche.
Aka PDP Enugwu dị na nga atụrụ Bright Ngene - Labour party Enugwu
A tụọla Bright Ngene bụ onye meriri na ntuliaka ịnọchite anya ndị Enugwu south Urban Constituency n’ụlọ Omeiwu Enugwu nga afọ asaa.
Ndị otu Labour Party nke Casmir Agbo nọ n’isi ya wepụtara ozi bo ebubo n’aka gọmenti Enugwu dị na ikpe agbụghọ Majistrate Onwu kpere na ụbọchị 28th June 2024 nke kpụbara ya n’ụlọ ikpe.
Cheta, na ntuliaka March 18th 2024 ka mazi Bright Ngene nke Labour pati nọ wee merie onye otu ya nke PDP Sam Ngene site na inweta votu 5,862 ebe PDP nwetara 2,098 nke nyere LP mmeri.
Mana ka mgbe ahụ INEC ekweghị enye Bright Ngene akwụkwọ ugo mmeri ya. INEC kwuru na a ga-emegharị ntuliaka na Polling unit asatọ dị na Uwanị Enugwu.
Ka mgbe ahụ eyiela ya bụ ntuliaka ugboro atọ mana otu aeụ n’ezi.
Nke mbụ eyiri bụ na 3rd February 2024, ọ kpụrụ afọ n’ala n’ihi na INEC Enugwu kwuru na asambodo akpọrọ “Original Result Sheet” furu efu nke REC Enugwu Dr Chukwuemeka Chukwu na EO Enugwu south bụ Francis Chigbu kwuru.
Nke abụọ eyigharịrị ntuliaka ahụ bụ na 14th February 2024, n’ụbọchị ahụ ndị Labour Pati boro ebubo na pdp kụsara ntuliaka ahụ kwuo na “Result Sheet” ahụ bụ nke adịgboroja.
N’ ụbọchị abụọ ahụ, ndị omekome na agba egbe na achụsasị ndị mmadụ.
Nke atọ eyigharịrị ya wee bụrụ na 8th June, mana dịka abụọ ndị ọzọ, ya bụ ntụliaka emeghị.
Ugbua Labour Pati ebola Gomenti Enugwu na PDP ebubo n’aka ha dị n’ikpe ezighi na ịtụ nga ọsọsọ atụrụ Mazi Bright Ngene n’esoghi iwu obodo.
Akwụkwọ ozi ahụ, Onye isi Labour Pati n’Enugwu bụ Casmir Agbo na onye mgbsaozi bụ Onuorah Odo zipuru kwuru hoohaa na ha na akpọku ndị isi ndị Ọkaikpe nụ NJC ka o lebe anya n’ikpe ahụ Magistrate Onwu kpere, wee kwuo na Labour Pati na adọnyere Mazi Bright Ngene Ukwu ka onweta Ikpe nkwụmọtọ ma pụta na nga ga were oche ya na Enugwu state House of Assembly dịka onye meriri na ntuliaka ịnọchite anya ndị Enugu south Urban Constituency.
BBC Igbo na-agba mbo i nuru olu otu PDP gbasara okwu a.
Ya bụ oche Enugwu south tọgbọrọ chakoo ka mgbe March 18th 2023.
Ụlọomeiwu Sịneti Naịjirịa akpọọla oku ka gọọmeti gbatara ndị nwere nsogbu oke idemmiri ọsọ enyemaka n’Abia steeti
Ebe foto si, NIGERIA SENATE/FACEBOOK
Nkọwa foto, Ụlọomeiwu Naịjirịa
Ụlọomeiwu Sịneti Naịjirịa akpọọla oku ka gọọmenti gbatara obodo oke idemmiri mebiri n’Abia
steeti ọsọ enyemaka.
Sinetọ Orji
Uzor Kalu onye na-anọchiteanya Abia North n’ụlọomeiwu sịneti kpọrọ oku a na
nzukọ ụlọomeiwu ahụ mere taa bụ Julaị 2, 2024.
N’okwu
ya “Ịdemmiri a gburu ọtụtụ mmadụ, mebie ụtụtụ ulọ na ụzọ jikọrọ obodo na obodo.”
Ọ gara n’ihu
kwuo na ebe idemmiri ahụ kacha metụta bụ ụlọakwụkwọ praịmarị dị na mpaghara okoko-item,
ụlọakwụkwọ praịmarị dị n’okposi, ụlọ mgbasa ozi radio, mahadụm na ọtụtụ ụlọ ndị
ọzọ dị n’kpuruọchịchị Bende nke steetị ahụ.
Onyeisi ụlọomeiwu Imo steeti achụọla mmadụ anọ
Ebe foto si, Supplied
Ọgbaghara dara n'ụlọomeiwu Imo steeti dịka onyeisi ụlọomeiwu bụ Chike Olemgbe chụrụ ibe ya anọ.
Olemgbe kọwara na ọ bụ maka mmadụ anọ ahụ kpara nkata imebi ọchịchị ya ma chụpụ ya n'ọkwa.
Ọ sị na ọ bụ na nzukọ imeụlọ nke ndị isi ụlọomeiwu ahụ ka emere mkpebi a.
Ndị omeiwu ahụ gụnyere Dominic Ezerioha( Oru West), Samuel Otuibe ( Ezinihitte Mbaise) Samuel Otuibe ( Ahiazu Mbaise) and Chidiebere Ogbunikpa ( Okigwe).
Olemegbe gara ihu kwuo na ndị ọchịchị ya agaghị anabata nnupuisi nakwa ịkpa nkata n'ụzọ ọbụla.
Ọ kposakwara Kọmitii niile nke ndị ahụ bụ ndị isi ha n'ọgbakọ ahụ nke nwere ọtụtụ ndị nchekwa.
Anapụtala mmadụ 3 n’ụlọ dara n’Abuja
Ebe foto si, @JOSSY_DANNYKING/X
Ụlọọrụ ndị
uweojii dị n’Abuja ekwupụtala na ụlọelu nwere okpukpo anọ dara na mpaghara
Garki.
N’otu ozi ọ
wepụtara, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n’Abuja bụ Josephine Adeh siri na ụlọelu ahụ
dara n’ime abalị Mọnde 1 Julaị 2024.
Ọ sịrị na
ngwangwa ha natara oku ekwentị gbasara nke ahụ, kọmịshọna ndị uweojii n’Abuja bụ
Benneth Igwe zipụrụ ndị ọrụ ya n’ebe ahụ ozugbo.
Dịka ozi ahụ
siri kwuo, anapụtara mmadụ atọ n’ebe ahụ ụlọ dara ma bugaa ụlọọgwụ ozugbo maka
ezi nlekọta.
Ozi ahụ
kwuru na ndịagha agwala ụlọọrụ na-ahụ maka ọnọdụ gbatagbata na Naịjirịa ka ha nọrọ
n’isi ọrụ nnapụta n’ogige ahụ.
Ndịagha awakpoola ndị na-eyi ndụ egwu n’Imo steeti, napụta ha ngwaọgụ dị iche iche
Ebe foto si, Nigerian Army/X
Ndịagha e
zipụrụ maka ibu agha megide iyi ndụ egwu n’Imo steeti anwụchiela ndị ndu otu dị
iche iche na-eyi ndụ egwu ma napụta ha ngwaọgụ dị iche iche.
Ụlọorụ ndịagha
Naịjirịa kwupụtara nke a n’ozi ha bipụtara n’akara ọbaozi X ha n’ụbọchị Mọnde 1
Julaị 2024.
Dịka ozi ahụ
siri kwuo, ndịagha na otu ọrụ nchekwa ndị ọzọ jikọtara aka wakpoo ogige ndị otu
Indigenous People of Biafra (IPOB) na ngalaba ndịagha ya bụ Eastern Security
Network (ESN) dị n’okpuruọchịchị Orlu n’Imo steeti ma nwụchie ndị ndu ha bụ Izuchukwu
Emejuru e ji ‘Kingkong’ mara tinyekwara Chibuzor Chikwe a maara nke ọma dịka ‘Onyema’.
N’otu aka
ahụ, ndịagha wakpokwara ebe mgbazo onye a na-enyo enyo ị bụ onyendụ IPOB/ESN n’Ezeinyen
Okwe Umucheke dị n’okpuruọchịchị Onuimo n’Imo steeti bụ Chinemerem, onye a
na-etu ‘Bam Bam’.
Ozi ahụ
kwuru na ndịagha gbagburu Chinemerem oge ọ gbara mbọ i buru ngwaọgụ ya ma nwụchie
ọtụtụ ndị otu ya.
Ndịagha
kwuru na ha na ndị a na-enyo enyo na ha bụ ndị otu IPOB/ESN kwakọrịtara mgbọ n’ebe
mgbazo ha dị n’Amausa okpuruọchịchị Okigwe n’Imo steeti nke mere ka ha ghahapụ
ngwaọgụ ha dị iche iche rie mbọmbọ.
Ihe anapụtara
ndị ekperima ahụ gụnyere egbe dị iche iche, mgbọegbe, okpu na-acha ndụ ndụ, akpụkpọụkwụ
ndịagha na ngwongwo ndị bara oke uru ha napụrụ Eze Ogberuru.
Ndị nwụrụ na mwakpo ogbunigwe na Gwoza eruola 32 - Osote onyeisiala Shettima
Ebe foto si, Kashim Shettima/Twitter
Osote onyeisiala Naịjirịa bụ Kashim Shettima ekwuola na ndị nwụrụ n'ogbunigwe a tụrụ na Gwoza eruola 32.
O kwuru nke a dịka ọ gara nleta ndị ihe ahụ metụtara ka nọ n'ụlọ ọgwụ anata ọgwụgwọ.
N'ime mmadụ 42 e buru bịa ụlọọgwụ, osote onyeisiala kwuru na mmadụ 14 esila n'ụlọọgwụ laa ebe mmadụ 26 ka na-anata ọgwụgwọ.
"E ji m ohere a ekele gọọmentị Borno steeti, ndị ọrụ gbatagbata maka enyemaka ha nyere n'ihe mere" ka Shettima kwukwara.
O zigaara ezinaụlọ ndị ihe ahụ metụtara ozi itiakanobi ma nyekwa ndị niile ka dị ndụ enyemaka ego
Ndị ọrụ Customs ejichiela ngwaagha ruru N13.9bn na Rivers steeti
Ebe foto si, Nigeria Customs/X
Ụlọọrụ Customs
ejichiela ngwaagha dị iche iche nke ọnụego ya ruru ijeri naịra iri na atọ na ụma
itoli (N13.9bn) na Rivas steeti.
Oge ọ
na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n’ọdọ ụgbọmmiri Onne Port dị na Rivas steeti, onyeisi
ụlọọrụ Customs na Naịjirịa bụ Bashir Adeniyi kpuhere na igbe container ogologo
ya ruru fiit iri anọ (40 feet) nke akara ndebanyeaha ya bụ MAEU165396 bụ nke e
ji site mba Turkey na-atụbata ha bụ ngwaagha.
Ndị Customs
jichiri igbe container ahụ oge onye na-atụbata ya gbara mbọ ịgbanarị usoro e si
eme ihe, ma mgbe e nyochara ya, a chọpụtara na ihe juru n’ime ya bụ ụdị egbe dị
iche iche nke ruru yunit narị asatọ na iri anọ na anọ (844 units) tinyekwara
mgbọ dị otu narị puku na iri na abụọ na narị ise (112,500).
Dịka Bashir
siri kwuo, ngwaahịa ndị e ji zochie ngwaagha ndị ahụ gụnyere ụzọ, oche, ihe ndị
e ji etinye mmiri n’ụlọ na akpa akpụkpọanụ.
Ka o siladị,
anwụchiela ma jichie mmadụ atọ ndị a na-enyo enyo aka ha dị n’ịtụbata ya bụ
ngwaagha dịka a na-eme nnyocha iji chọpụta ihe bụ ebumnoobi ha.