Volodymyr Zelensky awụchiela Washinghton DC maka mkparịtaụka ya na Onyeisiala Donald Trump

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Febụwarị 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere

  1. Lee Amanda Azubuike bụ ọchịagha Brigadier General ndịagha na mba Amerịka

    Ọchịagha Amanda Azubuike

    Ebe foto si, Nidcom/ X

    Nkọwa foto, Ọchịagha Amanda Azubuike

    Onyeisi Nigerians Diaspora Commission (NiDCOM) bụ Abike Dabiri-Erewa etoola nwa afọ Naịjirịa a na-akpọ Amanda Azubuike bụ nwaanyị Naịjirịa nke mbụ nwetere ọkwa ọchịagha Brigadier General na mba Amerịka.

    Abike kọwara ọkwa ọhụrụ Amanda Azubuike dịka ihe na-egosi na mba Naịjirịa na-eme nke ọma n’ụwa niile.

    Amanda Azubuike dị afọ iri ise na N’ọnwa Epril, afọ 1989 ka ọ nwetere akwụkwọ ikike ịbụ nwa amaala mba Amerịka.

    A mụrụ Amanda Azubuike na London, United Kingdom ebe nna ya bụ onye Igbo mana nne ya bụ onye amaala mba Zimbabwe.

    Ọ banyere agha mba Amerịka n’afọ 1994 ka ọ gụchara akwụkwọ na mahadum a na-akpọ University of Ventral Arkansas n’afọ 1993.

  2. Anyị gburu ndị isi otu ISIS na ndị ọzọ n’ime mba Sọmalịa – Donald Trump

    Onyeisiala mba Amerịka, Donald Trump

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Onyeisiala mba Amerịka, Donald Trump

    Onyeisiala mba Amerịka ekwuola na ha gburu ndị isi otu na-eyị ọha egwu a na-akpọ ISIS bụ ndị nwere otu obodo na mba Sọmalịa mere ogbe.

    Donald Trump gi akara X soshal mịdịa ya kwuputa nke a ma kọwaa na ọtụtụ ndị na-eyị ọha egwu nwụrụ mgbe ndịagha mba Amerịka tụrụ ogbunigwe n’ogbe ha.

    N’okwu Trump “n’ụtụtụ taata kas m nyere m iwu ka ndịagha mwakpoo mpaghara ogbe ebe ndị isi ndị na-eyị ọha egwu nọ n’ime mba Sọmalịa. Ha nọ ebe ahụ na-azụpụta ndị ọzọ”.

    “Ndị ahụ na-egbu ndị mmadụ. Ha na-emegide mba Amerịka ma na-amaja ndị ọnyị mba Amerịka”.

    Ogbunigwe anyị tụrụ ha gburu ọtụtụ n’ime ha. Ọ metụtaghị ndị nkịtị”

    “Ozi m na-ezigara ndị ISIS na ndị ọzọ chọrọ ịwakpo mba Amerịka bụ na anyị ga-achọpụta unu ebe ọbụla unu zoro ma gbuo unu”.

    Trump gara n’ihe kwuo na ndịagha mba Amerịka na-adị na-atụ ndị omekome ahụ ogbunigwe mana ọ bụ ọchịchị Onyeisiala ha garaaga bụ Joe Biden emeghị ihe ọ kwesiri ime.

  3. "Mmadụ anọ anwụọla n’ogbunigwe Rọshịa tụrụ n’ụlọakwụkwọ dị na Kursk"

    Yukren na Rọshịa na-ebo onwe ha ebubo maka ogbunigwe ahụ

    Ebe foto si, Getty Images

    Onyeisiala mba Yukren bụ Volodymyr Zelensky ekwuola na mba Rọshịa tụrụ ogbunigwe n’otu ụlọakwụkwọ dị na mba ha ebe ndị nkịtị gbakọtara na-ezere ndụ ha.

    Ndịagha Yukren kwuru na e gburu mmadụ anọ ebe ọtụtụ ndị ọzọ - ọkachasị ndị okenye merụrụ ahụ n’obodo Sudzha dị na mpaghara Kursk bụ ebe mba Yukren kpachiri kamgbe ọnwa ise.

    Akụkọ kwuru na a zọpụtara ihe karịrị mmadụ iri asatọ n’ụlọ ahụ a tụrụ ogbunigwe.

    BBC achọpụtabeghi ma ọ bụ eziokwu n’ebubo Yukren boro na mba Rọshịa maara ụma tụọ ogbunigwe ahụ. Rọshịa na-atakwa Yukren ụta maka ogbunigwe ahụ.

    Zelensky depụtara n’akara soshial midia X ma kwuo na nke a gosiri na Rọshịa bụ “mba na-anaghị akwanyere ndụ ndị mmadụ ugwu”.

    Mana ministri nchekwa mba Rọshịa kwuru na ọ bụ Yukren mere mwakpo ha na Satọde ma kọwaa na ọ bụ nkata a kpara ọfụma.

  4. Trump etinyela ụtụisi ọhụrụ na ngwaahịa ndị si mba Kanada, Meziko na Chaịna

    Onyeisiala Trump banyere n'ọchịchị nke ugboro abụọ n'ọnwa Jenụwarị 2025

    Ebe foto si, Getty Images

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump etinyela ụtụisi ọhụrụ na ngwaahịa niile e si na mba atọ gụnyere Chaịna, Meziko na Kanada bụ ha na ha kachasị azụkọ ahịa.

    Trump kwuru na ụtụisi ọhụrụ a ga-amalite n’ụbọchị Tuzde, nke bụ pasentị 25% n’isi mba Kanada na Meziko, tinyekwuru pasentị 10% n’isi mba Chaịna.

    O kwuru na ụtụisi ọhụrụ a ga-adị ire ma ọ bụrụ na mba atọ ndị a elebeghị anya na mkpesa ya banyere ịbata Amerịka n’ụzọ iwu na-akwadoghi nakwa ihe banyere ịtụ mgbere ọgwụike.

    Mba Kanada na Meziko kwuru na ha na-akwado itinye ụtụisi n’elu ngwaahịa ndị si Amerịka abata obodo ha.

    N’afọ gara aga, ngwaahịa ndị si mba ndị a mejupụtara pasentị 40% na ngwaahịa ndị e bubatara na mba Amerịka.

    Trump hụtara ntụkwasị ụtụisi a dịka ụzọ ọ ga-eji wulite akụnaụba mba Amerịka, chekwaa ọrụ ma wulite ego a na-anata n’ụtụisi si n’aka mba ndị agbataobi ha.

    Ndị ọkachamaara n’akụnaụba kwuru na nke a nwereike itinye akụnaụba mba Kanada na Mexico na nsogbu nke nwereike imetụta mba azụmaahịa mbaụwa.

    Onyeisiala mba Meziko bụ Claudia Sheinbaum sị na ọ gwala minister na-ahụ maka akụnaụba ka o were otu aka ahụ tinyekwa ụtụisi na ngwaahịa si Amerịka abata mba ha.

    Praịm minister mba Kanada bụ Justin Trudeau azaghachịla site n’iti ụtụisi pasentị 25% na ngwaahịa ndị si mba Amerịka abata na Kanada.

    Trudeau onye kwuru n’ọnwa gara aga na ọ ga-agba arụkwaghịm, sị na Trump ekewaala mba abụọ a nwere ezi mmekọ kamgbe ọtụtụ afọ.

    N’otu aka ahụ ụfọdụ ndị bi na Toronto dị na Kanada kwuru na Trump na-eleghara mmekọrịta dị n’etiti Amerịka na Kanada anya.

    N’ime izuụka abụọ Trump banyere n’ọchịchị nke ugboro abụọ, ọ na-agbanwegharị atụmatụ akụnaụba mba Amerịka na mmekọrịta ha na mb ndị ọzọ.

  5. Igbo bụ Igbo unu abọọla chi?

    A sị na nke onye chiri ya zere.

    Anyị na-asị unu nnọọ! n'ọgbakọ BBC Igbo maka akụkọ ndị dị mkpa n'ụwa.

    Daalụ!

  6. E gbuola mmadụ ruru 700 n’agha na-ada na mba DR Kongo kemgbe ụbọchị Sọnde – UN

    Ndịagha

    Ebe foto si, EPA-EFE/REX/Shutterstock

    Nkọwa foto, Ndịagha

    Otu na-ahụ maka udo na nchekwa na mba ụwa bụ United Nations ekwuola n’ihe ruru mmadụ narị asaa (700) anwụọla n’agha malitere kemgbe ụbọchị Sọnde n’obodo Goma, nke kachasị n’ọwụwa anyanwụ DR Kongo.

    Ọnụ na-ekwuru otu ahụ bụ Stéphane Dujarric kwuru na mmadụ puku abụọ na narị asatọ (2,800) merụrụ ahụ dịka ndị nnupụisi a kpọrọ M23 weghaara isi obodo nọ n’ugwu nke mpaghara Kivu.

    Akụkọ kwuru na ndị nnupụisi ahụ na-aga n’obodo Bukavu bụ isi obodo ọdịda anyanwụ Kivu.

    Ọgbaghara nọ n’ọwụwa anyanwụ DR Kongo malitere kemgbe afọ 1990 mana ọ gbagoro ngwa ngwa n’izu ndị na-adịbeghị anya.

    Maapụ DR Kongo
    Nkọwa foto, Maapụ DR Kongo

    M23 nke mebere agbụrụ ndị Tutsis, kwuru na ha na-alụ ọgụ maka ikike ndị pere mpe, ebe gọọmentị DR Kongo na-ekwu na ndị nnupụisi ahụ mba Rwanda na-akwado, na-achọ ka enye ha ikike ijikwa akụnaụba nke mpaghara ọwụwa anyanwụ.

    N’ụbọchị Fraịde 31 Jenụwarị 2025, Dujarric kwuru na ọnụ ọgụgụ ndị nwụrụ anwụ sitere na nyocha nke ụlọọrụ na-ahụ maka ahụike na mba ụwa bụ World Health Organization na ndị mmekọ ya, ya na gọọmentị DR Kongo, mere na Sọnde were ruọ na Tọzde.

    O dọkwara aka na ntị na ọnụ ọgụgụ ndị nwụrụ anwụ ga-abawanye n’oge na-adịghị anya.

  7. Ụgbọelu jeetị ọzọ adaala na mba Amerịka gbuo mmadụ isii, meruo ọtụtụ ahụ

    Ụgbọelu dara na Philadelphia dị na mba Amerịka.

    Ebe foto si, Pennsylvania Representative Jared Solomon

    Nkọwa foto, Ụgbọelu dara na Philadelphia dị na mba Amerịka.

    Ụgbọelu jeetị a rụpụtara maka ahụike nke mmadụ isii nọ n’ime ya adaala ma kpọkasịa na mpaghara Philadelphia dị na mba Amerịka.

    Ụgbọelu ahụ dara ma meruo ọtụtụ ndị mmadụ ahụ oge o bidoro gbawa ọkụ ma mee ka ụlọ dị nso n’ebe ọ dara nwuru ọkụ.

    Dịka ụlọọrụ Jet Rescue Air Ambulance si kwuo, ụgbọelu jeetị ahụ bu obere nwa ahụ adịghị, nne ya na mmadụ anọ ndị ọzọ tupuu ọ daa ma gbaa ọkụ ma gbuo mmadụ isii.

    Ụgbọelu dara na Philadelphia na mba Amerịka.

    Ebe foto si, Pennsylvania Representative Jared Solomon

    Nkọwa foto, Ụgbọelu dara na Philadelphia na mba Amerịka.

    Ọnụ na-ekwuru Jet Rescue Air Ambulance bụ Shai Gold kwuru na nwatakịrị ahụ e ji jeetị buru na-arịa ọrịa chọrọ ịwere ndụ ya nke mere ha ji gaa njem mba Amerịka ka o enweta ọgwụgwọ, mana ihe mgberede ahụ mere n’oge ha si Amerịka alọhachị na Tijuana dị na mba Meziko.

    Ndị nọ n’ime ụgbọelu ahụ bụ nwatakịrị nwaanyị ahụ, nne ya, ọnye na-akwọ ụgbọelu, ọnye osote akwọ ụgbọelu, dọkịnta na otu onye ahụike ọzọ.

  8. Hamas atọhapụla ụmụ amaala mba Izrel abụọ

    Oge ndị Hamas nyefere Ofer Kalderon n'aka ndị Red Cross

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Oge ndị Hamas nyefere Ofer Kalderon n'aka ndị Red Cross

    Ndị na-enyi ọha egwu bụ otu Hamas atọhapụla ụmụ amaala mba Izrel mmadụ abụọ ha tọọrọ.

    Aha ndị Izrel mmadụ abụọ ndị ahụ bụ Ofer Kalderon na Yarden Bibas.

    Ugbu a, ha abụọ nọ n’ime oke ala mba Izrel ka ndị ndị Hamas sita n’aka ndị ọrụ gbatagbata Red Cross nyefere ha n’aka gọọmentị mba Izrel.

    Ndịagha mba Izrel kwuru na Ofer na Bibas na-aga na mpaghara Izrel bụ ebe a ga-anabata ha.

    N’aka nke ọzọ, Gọọmenti mba Izrel ga-atọhapụ ndị Palestinian mmadụ 183 ha tụrụ nga.

    Mmadụ 100 n’ime ndị Palestine ahụ si na mpaghara Gaza ebe ọtụ n’ime ka a na-ekpe ikpe ọnwụ n’ime mba Izrel.

  9. Ụgbọala akụgbuola otu onyeagha, merụọ ndị ọzọ ahụ na Legos

    Ụgbọala akụgbuola otu onyeagha, merụọ ndị ọzọ ahụ

    Ebe foto si, @HQNigerianArmy/X

    Nkọwa foto, Ndịagha Naịjirịa na-azọ njem

    Ụgbọala akpọkaala ndịagha na-azọ njem ha na-adị eme ugboro abụọ n’afọ ọbụla, kụgbuo otu onye ma merụọ ndị ọzọ ahụ.

    Ozi isi ụlọọrụ ndịagha Naịjirịa wepụtara site n’aka Olabisi Olalekan Ayeni kwuru na ọdachi ahụ mere n’ụtụtụ Fraịde 31 Jenụwarị 2025 n’akụkụ Myhoung Barracks dị na Yaba nke Legọs steeti.

    O kọwara na njem ahịrị ahụ bụ nke a haziri iji kwalite ikike ndịagha gburugburu Legọs steeti ma bụrụkwa nke a mara ọkwa ya n’ụlọmgbasaozi dị iche iche.

    Ayeni kwuru na ihe ọdachi ahụ mere mgbe onye ọkwọụgbọala gbaara ọnwụ ọnwụ kpọkaa ndịagha ebe ha na-azọ njem ma gbuo otu onyeagha dịka ndị ọzọ nwetara ogogo mmerụahụ dị iche iche.

    Ozi ahụ kwuru na a dọnyela ozu onyeagha nwụrụ anwụ n’ọbaozu ebe ndị nke merụrụ ahụ na-anata ọgwụgwọ n’ụlọọgwụ ndịagha 68 Nigerian Army Reference Hospital dị na Yaba, Lagọs steeti.

    Ozi ahụ gara n’ihu kwuo na Ọchịagha na-elekọta ngalaba ụlọọrụ ndịagha 81 Division bụ General Farouk Mijinyawa ezigaraala ezinaụlọ onyeagha nwụrụ anwụ ozi nkasiobi ma kpeekwa ekpere ka ndị nke merụrụ ahụ gbakee ngwangwa.

    Ka o sinadị, ọ kpọrọ oku ka onye niile dere duu n’ihi na ndịagha amalitela ime nnyocha iji chọpụta ebe mmiri siri banye n’opi ụgbọghọrọ.

  10. Minista eboola Rụwanda ebubo iweghara DR Kongo n'ụzọ iwu akwadoghị

    Minista eboola Rụwanda ebubo iweghara DR Kongo n'ụzọ iwu akwadoghị

    Ebe foto si, Getty Images

    Minista na-ahụ maka mba ofesi na DR Kongo bụ Thérèse Kayikwamba Wagner eboola Rụwanda ebubo iweghara Democratic Republic of Congo na ịkpalite nkwatu ọchịchị dị ugbu a.

    Ọ gwara BBC na nke a sochiri ọtụtụ iri afọ nke enweghị ntaramahụhụ na enweghị ike ijide Onyeisiala Rwanda bụ Paul Kagame maka imebi iwu mba ụwa.

    O kwuru nke a mgbe ndị nnupụisi M23 Rwanda na-akwado weghara obodo Goma nke ọwụwa anyanwụ Kongo ma yie egwu ịga n'ihu na mwakpo isi obodo Kinshasa.

    Ọnụ na-ekwuru mba Rwanda bụ Yolande Makolo gọnarịrị ebubu a ma kwuo na ha zigara ndịagha obodo ha maka ịhụ na-agha abataghị n’obodo ha.

    "Anyị enweghị mmasị na agha, anyị enweghị mmasị na mgbakwunye, anyị enweghị mmasị na mgbanwe ọchịchị," Makolo gwara BBC.

    Otu mpaghara nke nwere mba iri na isii dịka ndị otu ha bụ South Africa Development Community (Sadc), ga-enwe nzukọ pụrụ iche na Fraịde na Zimbabwe iji kparịtaụka maka ọnọdụ nke DR Kongo.

    Otu ahụ ezipụla ndịagha na-ahụ maka udo, nke sitere na mba Saụt Afrịka, na DR Kongo ka ha buso ndịagha nnupụisi M23 ọgụ ma weghachi udo na mpaghara nwere ihe ọ natara chị dị n’ime ala nke dịka ọtụtụ iri afọ ọgbaaghara gasịrị.

    Egburu ndịagha Sadc iri na isii n’ọgụ ha na ndị M23 na gburugburu Goma n'izu garaaga.

  11. Ihe mere Ụlọikpe Mkpegharị jiri kwado mmachibido otu IPOB

    Ihe mere ụlọikpe mkpegharị jiri kwado machibido otu IPOB

    Ebe foto si, Getty Images

    Ụlọikpe Mkpegharị nọ n’Abụja akwadola mmachibido gọọmentị etiti machiri otu Indigenous People of Biafra (IPOB) dịka otu na-eyi ndị mmadụ egwu.

    E kpebiri ikpe ahụ ụnyahụ dịka ọ gara ọtụtụ afọ a na-ekpe ikpe ahụ malitere n’afọ 2017.

    Dịka ụlọikpe kwetara na ikpe ahụ enweghị ume, ọ gara n'ihu iwepụ mkpesa ndị IPOB ma gbado ụkwụ na ọ bụ n’ihi nchekwa obodo na ihe mberede mere o jiri kwado mmachi gọọmentị etiti machiri ya.

    Mana Ọkaikpe Nnamdi Kanu bụ Aloy Ejimakor kwuru na mkpebi Ụlọikpe Mkpegharị agaghị enwe mmetụta ọbụla n'okwu Mazi Nnamdi Kanu, n'ihi na mkpebi ahụ abụghị nke ikpeazụ, maka ndị otu ahụ na-akwado ịga Ụlọikpe kasị elu nke bụ ebe a na-ekpe ikpe ikpeazụ.

    Cheta na ndị Ọkaikpe IPOB tinyere akwụkwọ n’Ụlọikpe Mkpegharị n’ọnwa Ọktoba 2024 iji dogharịa mmachịbido gọọmentị etiti machiri otu ahụ.

    Ha kwuru na usoro e jiri nye iwu mmachibido ahụ megidere ikpe ziri ezi, n'ihi na emeghị ka IPOB mara maka ọkwu ahụ, anụghịkwa ya tupu gọọmentị enye iwu mmachibido ahụ.

    Ha kwukwara na gọọmentị etiti nwetere iwu mmachibido ahụ site na ngwa “ex parte” kama isite n'ikpe ozizi ziri ezi nke onye Ọkaikpe na-enye.