Volodymyr Zelensky awụchiela Washinghton DC maka mkparịtaụka ya na Onyeisiala Donald Trump

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Febụwarị 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere

  1. Ndịagha Izrel apụọla na mpaghara Netzarim kewara Gaza ụzọ abụọ

    Ndị mmadụ na-alaghachi n'ụlọ ha

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Ndị mmadụ na-alaghachi n'ụlọ ha

    Ndịagha Izrel ewezugala ahụ na mpaghara Netzarim ogige ndịagha kewara mpaghara Nọt na Saụt Gaza.

    Ọtụtụ narị ndị Palestinia malitere iburu ngwongwo ha laghachi mpaghara Nọt Gaza ebe e nwere ọtụtụ mbibi oge gara aga dịka ndịagha ahụ wezugara onwe.

    Nwezuga ndịagha ahụ na-abịa dịka e nwere nkwekọrịta ịkwụzị ịkwa mgbọ n’ụbọchị Sọnde 19 Jenụwarị 2025 nke mere ka atọhapụ mmadụ 21 Izrel na ndị Palestenia dị 566 a nwụchiri.

    A na-ekwu na na ngwụcha agba nke mbụ nkwekọrịta ahụ nke ga-abịa n’ime izuụka atọ na-abịa, a ga-atọhapụ mmadụ 33 a nwụchiri na mmadụ 1,900 a tụrụ mkpọrọ. Mba Izrel kwuru na mmadụ 8 n’ime mmadụ 33 ahụ anwụọla.

  2. Mgbe onye Izrel so na mmadụ atọ ndị Hamas tọhapụrụ zutere ezinaụlọ ya

    Otu onye Izrel zutere ezinaụlọ ya

    Ebe foto si, Israel Defense Forces

    Nkọwa foto, Otu onye Izrel zutere ezinaụlọ ya

    Mba Izrel na Hamas emezula ngbanwe nke ise ndị ejieji na ndị mkpọrọ bụ ihe dị na nkwekọrịta nkwụsị ọgụ na Gaza nke malitere n'ọnwa garaaga.

    Ụbọchị taa malitere mgbe ndị Hamas tọhapụrụ ndị Izrel mmadụ atọ were kpọpụta ha n'elu ogbo dị na Gaza n'ihu nnukwu igwe mmadụ. Mmadụ atọ ndị ahụ alọghachila Izrel ugbu a.

    N’aka nke ọzọ, ndị Izrel tọhapụrụ ndị mkpọrọ Palestine mmadụ narị iri asatọ na atọ (183), nke mmadụ iri na asatọ n’ime ha bụ ndị atụrụ mkpọrọ ndụ.

    Otu n’ime ndị Izrel atọ ahụ atọhapụrụ bụ Eliyahu Sharabi, onye ya na nne ya na nwanne ya nwaanyị zukọtara mgbe ọ laghachitere mba Izrel.

    E jidere nwoke a dị afọ iri ise (52) na Kibbutz Be’eri ya na nwanne ya nwoke bụ Yossi, onye enwetala ozi maka ọnwụ ya kemgbe.

    Nwunye ya bụ onye a mụrụ na mba UK bụ Lianne na ụmụ ya nwaanyị abụọ bụ Noiya na Yahel, ka egburu n'ụlọ ha mgbe ndị Hamas wakporo Izrel na Ọktoba 7.

    Dịka ndị mgbasa ozi Izrel siri kwuo, Praịm Mịnịsta mba Izrel bụ Benjamin Netanyahu zigara ndị nọchite anya ya na Doha, mba Kataa, maka inwe mkparịtaụka gbasara ihe ọzọ a ga-eme banyere nkwụsị ọgụ na Gaza.

  3. Mmadụ 30 efuola n’ihi mbuze ugwu mere na Chaịna

    Mmadụ 30 efuola n’ihi mbuze ugwu mere na Chaịna
    Nkọwa foto, Mmadụ 30 efuola n’ihi mbuze ugwu mere na Chaịna

    A malitela ịchọ ihe ruru mmadụ iri atọ (30) na-efu efu dịka mbuze ugwu mere na ndịda ọdịda anyanwụ mba Chaịna.

    Dịka ụlọọrụ mgbasa ozi steeti Chaịna siri kwuo, mbuze ugwu a mere n’obodo Jinping dị na mpaghara Sichuan mgbe o jiri nkeji iri ise gafee elekere iri na otu, ma lie ụlọ iri ebe ọtụtụ ndị bi n’ebe ahụ tọrọ atọ.

    E kwuru na-ewubela ụlọọrụ iwu n'ebe ahụ ihe a mere dịka ozi sitere n'ụlọọrụ nlekọta ihe mberede nke steeti ahụ siri kwuo.

    Onyeisiala mba Chaịna bụ Xi Jinping enyela iwu ka a chọpụta ndị ahụ tọrọ atọ.

    Ọtụtụ narị ndị ọrụ mberede a malitela ịchọ ndị lanarịrịnụ, dịka ozi sitere na Mịnịstrị na-ahụ maka njikwa ihe mberede nke Chaịna bụ China's Ministry of Emergency Management siri kwuo.

    Onyeisi ọchịchị mba Chaịna bụ Li Qiang a kpọọla oku maka ime nyocha nke ihe egwu ala nwere ike dị na mpaghara ndị dị nso.

  4. A hụla ụgbọelu Alaska ahụ na-efu efu na ozu mmadụ atọ - Ndị nchekwa US Coast Guard

    Ụgbọelu ahụ bụ obere ụgbọelu Cessna Caravan craft

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ụgbọelu ahụ bụ obere ụgbọelu Cessna Caravan craft

    Ndị nchekwa US Coast Guard ekwuola na ha ahụla ebe obere ụgbọelu Alaska ahụ na-efu efu kpọkara ya na ozu mmadụ atọ nwurụ anwụ n’ụbọchị Tọzde.

    Ha kwuru na e kwenyere na ozu mmadụ asaa ndị ọzọ nọ n’ime ụgbọelu ahụ, mana ha enweghị ike ịbanye n’ime ya n'ihi ọnọdụ ụgbọelu ahụ.

    Dịka ndị ọchịchị siri kwuo, mmadụ iri nọ n’ime ụgbọelu Cessna Caravan craft, nke ụlọọrụ ụgbọelu Bering Air nwe, mgbe a malitere ịchọ ọnọdụ ya ihe dịka maịlị iri na abụọ (19km) n'ikpere mmiri n’ụbọchị Tọzde 7 Febụwarị 2025.

    Ndị nchekwa Coast Guard kwuru na mkpọmkpọ ebe ụgbọelu ahụ dị maịlị iri atọ na anọ (34) na ndịda-ọwụwa anyanwụ nke obodo Nome, ebe ọ si Unalakleet gawa.

    Onye odeakwụkwọ ụgbọ njem na mba Amerịka bụ Sean Duffy kwuru na ụlọọrụ National Transportation Safety Board na-eme nyocha banyere ihe mere, site na nkwado nke ụlọọrụ Federal Aviation Administration.

    Ọ gwara ndị mmadụ ka ha tinye mkpụrụ obi mmadụ iri ahụ nwụrụ anwụ n’ihe mberede ugbọelu ahụ n’ekpere.

  5. Ihe mere ebe tanka bu mmanụ ụgbọala dara n’Anambra steeti

    Ndị na-eku mmanụ ụgbọala
    Nkọwa foto, Ndị na-eku mmanụ ụgbọala

    Tanka e ji ebu mmanụ ụgbọala dara n’Ọnịcha n’Anambra steeti, mana ọtụtụ ndị mmadụ katara obi na-eku mmanụ ụgbọala n'ebe ahụ.

    Ihe a mere n’ebe a na-akpọ Army-Gate dị n'Onịcha, n'Anambra steeti.

    Ndị hụrụ mgbe tanka ahụ dara gwara onye ntaakụkọ BBC Igbo na ọkwọụgbọala tanka ahụ si n’ime ya rituo mana nwa nkeke oge ọ pụrụ ka tanka ahụ dara.

    Ụlọọrụ ndị na-agbanyụ ọkụ
    Nkọwa foto, Ụlọọrụ ndị na-agbanyụ ọkụ
    Ndị na-eku mmanụ ụgbọala n'ebe tanka dara
    Nkọwa foto, Ndị na-eku mmanụ ụgbọala n'ebe tanka dara
    Ndị na-agbanyụ ọkụ
    Nkọwa foto, Ndị na-agbanyụ ọkụ

    Ha sị na ndị na-agbanyụ ọkụ bịara ngwangwa mee ka tanka ahụ hara ịgba ọkụ.

    Onye ntaakụkọ BBC Igbo kwuru na nke na-agbawa obi bụ na ọtụtụ ndị mmadụ kara obi na-eku mmanụ ụgbọala na-atụghị egwu na ọkụ nwereike ịgba ha.

  6. Hamas adịla njikere ịtọhapụ ndị mba Izrel mmadụ atọ

    Ndị Hamas

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Ndị Hamas

    Kemgbe mba Izrel na ndị na-enyị ọha egwu a na-akpọ Hamas kwụsịrị ịkwakọrịta mgbọ na mpahara Gaza, ma nweputa usoro ha ga-eji nwete udo, ha ebidora ịtọhapụ ndị nga ha jidere n'oge agha.

    Ma mba Izrel na ndị otu Hamas na-atọhapụ ndị ha jị na nga.

    Ka a na-atụ anya na ndị Hamas ga-atọhapụ ndị mba Izrel mmadụ atọ ha tọọrọ, a na-atụkwa anya na mba Izrel ga-atọhapụ ndị Palestine mmadụ 183 ha tụrụ nga.

    Ndị mba Izrel mmadụ atọ Hamas tọhapụrụ

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Ndị mba Izrel mmadụ atọ Hamas tọhapụrụ

    Ụlọọrụ mba Izrel na-ahụ maka ụlọnga ekwuola na ha enwepụtara ndekọ gbasara ndị Palestine mmadụ 183 ha chọrọ ịtọhapụ.

    Ha sị na ha ga-akpọrọ mmadụ 183 ahụ duga ha n’ebe a ga-atọhapụ ha dị na mpaghara Ofer na Ktziot ma ọ bụrụ na ndị Hamas atọhapụ mmadụ atọ ndị mba Izrel.

    Izrel ekwetara ịtọhapụ ndị Palestine mmadụ 1900 ma ndị Hamas tọhapụ ndị Izrel mmadụ 33.

    Otu onye n'ime ndị Palestine 183 Izrel tọhapụrụ

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Otu onye n'ime ndị Palestine 183 Izrel tọhapụrụ

    Ndị Hamas mechere tọhapụla mmadụ atọ ndị mba Izrel.

    Aha ndị hamas tọhapụrụ bụ Or Levy, Ohad Ben Ami na Eliyahu Sharabi.

    N’aka nke ọzọ ndị Izrel tọhapụrụ ndị Palestine mmadụ 183.

  7. Ọtụtụ mba akwadola ụlọikpe ICC nke Onyeisiala Donald Trump machiri

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump

    Ọtụtụ mba akwadola ụlọikpe mba ụwa bụ International Criminal Court (ICC) dịka Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump machiri ndị ọrụ ụlọikpe a.

    Ọtụtụ mba bụ ndị otu ulọikpe a nke gụnyere UK, Germany na France, jikọtara aka wepụta ozi ahụ n’ubọchị Fraịde 7 Febụwarị 2025, ma na-ekwu na ụlọikpe a bụ "ngalaba dị mkpa nke usoro ikpe ziri ezi nke mbaụwa".

    Ụlọikpe a dị na Hague ekwela nkwa na ha ga-aga n'ihu na-ekpe ikpe ma buo onyeisiala mba Amerịka ebubo na ọ na-emebi ọrụ "inwe onwe ya na nke na-adịghị ele mmadụ anya n'ihu".

    Mba Amerịka na Izrel anabataghị ikike nke ICC dịka naanị ụlọikpe zuru ụwa ọnụ nwere ikike ịgba akwụkwọ maka mpụ mkpochapụ agbụrụ “genocide”, mpụ megide mmadụ na mpụ agha.

    Cheta na iwu ọhurụ onyeisiala mba Amerịka bụ Trump boro ụlọikpe a ebubo "omume ezighi ezi na enweghị isi".

    Mana ICC enyela akwụkwọ ikike ijide Praịm Mịnịsta mba Izrel bụ Benjamin Netanyahu maka ebubo mpụ agha na Gaza, nke Izrel gọrọ agọ.

    Ụlọikpe ahụ a malitekwala ime nnyocha n'ime ụmụamaala mba Amerịka.

  8. Ndị ọchịchị Alaska amalitela ịchọ obere ụgbọelu na-efu efu

    Ụgbọelu na-efu efu bụ obere ụgbọelu Cessna Caravan craft

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ụgbọelu na-efu efu bụ obere ụgbọelu Cessna Caravan craft

    Ndị ọchịchị mba Amerịka amalitela ịchọ obere ụgbọelu bu mmadụ iri e kwuru na ọ na-efu efu n’Alaska.

    Ndị nchekwa US Coast Guard nke mpaghara Alaska kwuru na Cessna Caravan craft nọ maịlị iri na abụọ (19km) si Unalakleet na-aga Nome mgbe a malitere ịchọ ọnọdụ ya.

    Obodo abụọ a, nọ ihe dịka kilomita 146 n’etiti ibe ha n'ofe Norton Sound.

    Ndị ọrụ steeti kwuru na ndị ọrụ nnyocha na nnapụta a malitela ọrụ iji ruo n’ebe nke ikpeazụ a hụrụ ụgbọelu ahụ.

    Ha kwuru na a maara ha ọkwa maka ụgbọelu "gafere" nke ụlọọrụ ụgbọelu Bering Air nwe mgbe ọ kụrụ elekere anọ nke ehihie (16:00) na Tọzde.

    Dịka ozi sitere na ngalaba nchekwa ọha nke Alaska ‘the Alaska Department of Public Safety’ kwuru, mmadụ iri nọ n'ụgbọelu ahụ gụnyere ndị njem itoolu na onye ọkwọ ụgbọelu.

    Enweghị ozi ọbụla e nwetara ozugbo gbasara onye nọ n'ụgbọelu ahụ.

  9. Gọọmentị Naịjirịa na-akwado igbanwe usoro agụmaakwụkwọ 6-3-3-4

    Ụmụakwụkwọ sekọndrị

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ụmụakwụkwọ sekọndrị

    Gọọmentị etiti Naịjirịa na-akwado ịgbanwe usoro agụmakwụkwọ 6-3-3-4 ma were 12-4 dochie anya ya.

    Dịka Mịnịsta na-ahụ maka agụmakwụkwọ bụ Tunji Alausa si kwuo, a ga-eji usoro agụmakwụkwọ ọhurụ bụ (12-4) nwere gbanwe usoro agụmakwukwọ praịmarị na sekọndarị bụ (6-3-3-4).

    O kwuru na ngbanwe a ga-eme ka ụmụakwụkwọ gụzuo isi agụmakwukwọ afọ iri na abụọ tupu ha gaa ịgụ afọ anọ n’ụlọakwụkwọ dị elu.

    Ụlọ ọmụmụihe

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ụlọ ọmụmụihe

    O kwuru na ọtụtụ mba ndị mepere emepe anabatala usoro agụmakwụkwọ afọ iri na abụọ (12), nke na-eme ka ụmụakwụkwọ nweta ntọala siri ike tupu ha agụwa ọpụrụiche na mahadum.

    O kwuru na ndozigharị a ga-akwalite usoro agụmakwụkwọ n’obodo Naijirịa, ma gaa n’ihu kwuo na gọọmenti na-ezube iwebata mgbanwe na mmepe usoro ọmụmụ, mbanye ndị nkuzi, mgbasawanye akụrụngwa, na atụmatụ ego.

    Alausa kwadokwara atụmatụ ga-ahụ n’ụmụakwụkwọ ga-eru afọ iri na isii (16) dịka afọ kacha nta ụmụaka ga-eji malite agụmakwụkwọ mahadum.

  10. ICC akatọọla iwu ọhụrụ onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump nwepụtara

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump

    Otu ụlọikpe mba ụwa a na-akpọ International Criminal Court (ICC) akatọọla iwu ọhụrụ onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump wepụtara.

    Iwu ọhụrụ ahụ machiri ndị ọrụ ụlọikpe ICC na ezinaụlọ ha ịwata akwụkwọ visa mba Amerịka nakwa ihe ndị ọzọ.

    Trump mere nke a ma bo ụlọikpe ICC ebubo ime nyocha n’isi ụmụamaala mba Amerịka nakwa ndị ọyị ha n’ụzọ megidere ha.

    ICC katọrọ iwu ọhụrụ Donald Trump ahụ ma kwuo na ọ chọrọ imegide ntọnaala ụlọikpe ahụ ịkwụrụ onwe ya, ma nụọ iyi na ha ga na-arụ ọrụ ha n’agbanyeghị iwu megidere ndị ọrụ ha.

    Cheta na n’ọnwa Novemba afọ 2024 ka ụlọikpe ICC nyere iwu ka a nwuchie Praịm mịnịsta mba Izrel bụ Benjamin Netanyahu nakwa ndị isi otu Hamas maka mpụ agha ha mere n'agha Gaza.

    ICC na-ekpe ikpe gbasara igbu mmadụ n’igwe n’oge agha, mpụ megidere ikike mmadụ na mpụ agha dị icheiche.

    Ọzọ bụ na ICC bụ ụlọikpe nke mba ụwa mana mba Amerịka na mba Izrel esoghị n’ime ha.

  11. Onyeisiala mba Malawi enyela ndịagha iwu ka ha pụọ na mba DR Kongo

    Oge ndị nnupụisi weghaara isi obodo Goma

    Ebe foto si, AFP

    Nkọwa foto, Oge ndị nnupụisi weghaara isi obodo Goma

    Onyeisiala mba Malawi bụ Lazarus Chakwera enyela ndịagha iwu ka ha kwado iwezuga onwe ha n'ọrụ nchekwa udo ha na-eme na mpaghara ọwụwa anyanwụ DR Kongo.

    Ndịagha mba Malawi sonyere otu jọkọrọ mba dị icheiche dị na mpaghara ahụ a na-akpọ Southern African regional bloc's military mission (SAMIDRC) e zijere DR Kongo ka ha nyere aka buso ndị nnupụisi agha.

    Ka ndị nnupụisi M23 weghaara Goma bụ isi obodo ugwu Kivu, n'izu gara aga ka e gburu ndị nchekwa udo ruru mmadụ iri abụọ.

    Ndị ahụ e gburu gụnyere ndịagha si mba Saụt Afrịka ruru iri na anọ na ndịagha mba Malawi mmadụ atọ.

    Onyeisiala mba Malawi bụ Chakwera kwuru na Wednezde na mkpebi ya bụ maka “ịsọpụrụ nkwupụta ịkwụsị agha nke ndị otu ahụ”, n'agbanyeghị n’ọgụ ka na-aga n'ihu.

    O kwuru na mwepụ ndịagha ga-emepe ụzọ maka mkparịtaụka otu a ga-esi enweta udo na-adịgide adịgide.

  12. Mịnịsta mba Izrel akwadola atụmatụ Onyeisiala Trump ma gwa ndịagha ka ha kwado ndị Palestine na-ahapụ Gaza

    Ogige a tụrụ ogbunigwe na Gaza

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Ogige a tụrụ ogbunigwe na Gaza

    Mịnịsta na-ahụ maka nchekwa na mba Izrel bụ Israel Katz akwadola atụmatụ Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump nke na-ekwu ka mba Amerịka weghaara, rụgharịa Gaza ma bigharịa mmadụ nde abụọ na otu narị puku (2.1 million) bụ ndị Palestine na mba ọzọ bi na ya.

    Ọ gara n’ihu gwa ndịagha mba Izrel ka ha kwado ndị bi na mba ahụ chọrọ ịhapụ Gaza ka ha pụọ.

    Katz kọwara na ndị Gaza nwere ikike “ọpụpụ na mbata” ma kwuo na mba ndị na-akatọ agha Izrel na Hamas 'nwereike' ịnabata ha.

    Cheta na Onyeisiala Trump kwuru na Amerịka ga-atụgharị Gaza na a kwụsị ọgụ mana ndị ọchịchị Palestine ajụla atụmatụ a dịka ha kwuru na ọ ga-emebị iwu mbaụwa ma kwuo na mba Gaza anọghị n’ahịa.

    Chetakwa na ndịagha Izrel malitere ibibi Hamas maka mwakpo a na-enwetụbeghị ụdị ya ndị Hamas mere n’Izrel na 7 Ọktoba 2023, nke gburu ihe dị ka mmadụ puku na narị abụọ ebe anwụchiri mmadụ narị abụọ na iri ise na otu ndị ọzọ.

    Ihe karịrị mmadụ 47,550 anwụọla ebe 111,600 merụrụ ahụ na Gaza kemgbe ahụ, dịka ụlọọrụ ahụike ndị Hamas na-ahụ maka ya na mpaghara ahụ si kwuo.

  13. Onyeisiala Bola Tinubu achụọla onyeisi mahadum University of Nigeria Nsukka n’ọrụ

    Ọkankụzi Polycarp Emeka Chigbu

    Ebe foto si, University of Nigeria

    Nkọwa foto, Ọkankụzi Polycarp Emeka Chigbu

    Onyeisi Bola Tinubu ewepụla onyeisi mahadum University of Nigeria Nsukka bụ Ọkankụzi Polycarp Emeka Chigbu.

    Ozi Bayo Onanuga bụ ọnụ na-ekwuru Onyeisiala Tinubu wepụtara kwuru na Onyeisiala Tinubu họpụtara Ọkankụzi Oguejiofor T. Ujam dịka onye ga-anọchi Ọkankụzi Polycarp Emeka Chigbu.

    N’aka nke ọzọ, Onyeisiala Tinubu wepụrụ Ọkankụzi Aisha Sani Maikudi dịka onyeisi mahadum University of Abuja a maara ugbua dịka Yakubu Gowon University.

    Onyeisiala Tinubu họpụtara Ọkankụzi Lar Patricia Manko dịka onye ga-anọ dịka onyeisi mahadum ahụ ruo ọnwa isi.

  14. A ga-amalite ikpe otiegwu Sean ‘Diddy’ n’ọnwa Mee 2025

    Foto Sean Diddy

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Foto Sean Diddy

    A ga-amalite ikpe otiegwu mba Amerịka a ma ama bụ Sean “Diddy” Combs n’ọnwa Mee 2025, onye e boro ebubo ịtụ mgbere nwoke na nwanyị na mpụ nrụrụaka.

    A na-ekpe ya ikpe ndị ọzọ nke gụnyere ikpe ndị sịrị na otiegwu ahụ merụrụ ha ahụ site n'inye ha ọgwụ ike, mmanya ọkụ na mmegbu anụ ahụ.

    Combs ekwupụtala na ikpe amaghị ya ma kagbuo ebubo ndị ahụ ma kwuo na ọ bụ ego ya ka ndị ahụ chọrọ.

    O bụrụ na a maa ya ikpe, Combs ga-enweta ndụ n’ụlọ mkpọrọ na opekatampe afọ iri na ise maka ịzụ ahịa mmekọrịta nwoke na nwaanyị.

    N'ikpe mpụ gọọmentị etiti na-ekpe Combs, ha na-ebo Combs ebubo ịgba izu nzuzo, ịzụ ahịa mmekọahụ na njem iji tinye aka na-ịgba akwụna.

    A na-ebokwa ya ebubo ịtọọrọ mmadụ, ịgba ọgwụ ike na ịmanye ụmụnwaanyị ka ha na-enwe mmekọahụ, mgbe ụfọdụ site na iji egbe maọbụ yi ha egwu ime ihe ike.

    Combs bụ onye e jikwa aha dị iche iche mara nke gụnyere Puffy, Puff Daddy, P Diddy, Love na Brother Love, malitere ịgụ hip-hop na 1990s.

  15. Justice Azuka: Ndị uweojii ahụla ozu onye omeiwu Anambra Steeti a tọọrọ n’Ekeresimesi

    Justice Azuka: Ndị uweojii ahụla ozu onye omeiwu Anambra Steeti a tọọrọ n’Ekeresimesi

    Ebe foto si, Justice Azuka/Facebook

    Ndị uweojii Anambra Steeti ekwuola na ha ahụla ozu onye omeiwu ahụ aha ya bụ Justice Azuka, a tọọrọ n’Ugwunabankpa Road dị n’Ọnịsha dịka ọ na-aga njem n’ụbọchị 24 Disemba, 2024.

    Ozi si n’aka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenga kwuru na a hụrụ ozu onye omeiwu ahụ n’ụtụtụ Tọzde 6 Febụwarị 2025 n'akụkụ akwammiri Niger nke abụo.

    O kwuru na ọ bụ ndị nchekwa si n'ụlọọrụ nchekwa dị iche iche gụnyere ndị uweojii na AVG Operatives bụ ndị na-agba mbọ ịchọpụta onye omeiwu ahụ na-anọchite anya Onitsha North, hụtara ozu onye omeiwu ahụ a tọọrọ.

    O kwuru na ndị uweojii ewerela ọnọdụ n’ebe ahụ a hụrụ ozu onye omeiwu ahụ ka ha nwee ike nwụchie ndị a na-enyo enyo aka ha dị n’ọnwụ Justice Azuka.

  16. Ndị Palestine na mba ndị Arab ajụla atụmatụ Trump ka Amerịka were ọnọdụ na Gaza

    Ndị Palestine na mba ndị Arab ajụla atụmatụ Trump iwere ọnọdụ na Gaza

    Ebe foto si, Getty Images

    Onyeisiala Palestine bụ Mahmoud Abbas ekwuola na ya achọghị iji ntị nụ gbasara atụmatụ Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump ime ka Amerịka were ọnọdụ na Gaza ma zigaa ndị Palestine ruru nde abụọ na otu ụma (2.1m) bi n’ime ya ebe ọzọ.

    Ọ sịrị “anyị agaghị ekwe ka ikike ụmụ amaala anyị bụrụ nke a ga-emetọ,” ma dọkwaa aka na ntị na Gaza bụ “mpaghara mba Palestine gbapụtara ihe”.

    Hamas, bụ ndị agha dara n’etiti ha na Izrel butere oke ihe isiike kwuru na atụmatụ Trump ahụ ga-etinye “ose n’ọnya” dị na mpaghara ahụ.

    Ọtụtụ mba dị na mpaghara ahụ dịka Ijipt, Jọdan na ndị na-agbakọrọ Amerịka aka ajụla atụmatụ ahụ dịkwa ka otu mbaụwa bụ UN dọrọ aka na ntị megide “ụdị mkpochapụ agbụrụ ọbụla”.

    Odeakwukwo otu mbaụwa bụ Antonio Guterres kwuru na Gaza bụ otu akụkụ ọdịnihu mba Palestine gbapụtara ihe.

    Ọ gwara ọgbakọ a haziri na New York na ikike ụmụafọ Palestine nwere ibi dịka mmadụ n’ala ha bụ nke na-achọ ifulahụ ha.

  17. E tikara ụlọmkpọrọ, dinaa ụmụnwaanyị karịrị 100 n’ike ma gbaa ha ọkụ na DR Kongo – UN

    E tikara ụlọmkpọrọ, dinaa ụmụnwaanyị karịrị 100 n’ike ma gbaa ha ọkụ na DR Kongo – UN

    Dịka otu mbaụwa bụ UN siri kwuo, e dinara ndị mkpọrọ nwaanyị karịrị otu narị (100) n’ike ma gbaa ha ọkụ na ndụ oge e tikara ụlọmkpọrọ dị na Goma nke mba DR Kongo.

    Ọtụtụ ndị mkpọrọ riri mbọmbọ n’ụlọmkpọrọ Munzenze n’ụbọchị Mọnde 3 Febụwarị 2025 oge ndịagha M23 malitere ịkpachi obodo ahụ.

    Dịka UN siri kwuo, ndị mkpọrọ nwoke metọrọ ndị nke nwaanyị dị n’agbata otu narị na iri isii na ise (165) na otu narị na iri isii na asaa (167) oge ahụ e tikara ya bụ ụlọmkpọrọ.

    Ha kwuru na ọtụtụ n’ime ụmụnwaanyị ahụ bụ ndị e gburu oge ndị mkpọrọ mụnyere ụlọmkpọrọ ahụ ọkụ.

    Ka o sinadị, BBC enwebeghị ike chọpụta ma ozi ahụ ọ bụ eziokwu.

  18. Igbo kara aka, ụnụ abọọla chi, Ọfọ anyị taa bụ ndụ mmiri, ndụ azụ. Mmiri atala ma azụ anwụla.

    Anyị ji obiụtọ anabata gị na ọgbakọ anyị nke taa na BBC News Igbo.

    Adline Okere na Chinonso Ugorji ga-akwọ ụgbọ nke ụtụtụ a mana Uzoamaka Ewuzie na Michael Ngene ga-emecha sonyere anyị.

    Biko gaa n'ihu nọnyere anyị taa...

  19. Onyeisiala Bola Tinubu agawala njem mba Frans

    Onyeisiala Bola Tinubu na-efere ndị mmadụ aka n'ụgbọelu ya

    Ebe foto si, Nigeria Presidency

    Nkọwa foto, Onyeisiala Bola Tinubu na-efere ndị mmadụ aka n'ụgbọelu ya

    Onyeisiala Bola Tinubu ahapụla Abuja isi obodo Naịjirịa gawa mba Frans maka njem onwe ya.

    Ozi si n’aka ọnụ na-ekwuru onyeisiala bụ Bayo Onanuga kwuru na Onyeisiala Tinubu ga-esi mba Frans gawa Addis Ababa isi obodo Itiopịa maka ọgbakọ AU Summit.

    Ọgbakọ AU Summit bụ nke ga-adn̄ọta ọtụtụ ndị isiala mba Afrịka dị iche iche, ga-amalite ụbọchị Wenezde 12 Febụwarị ruo Sọnde 16 Febụwarị 2025.

    Bayo Ọnanụga kwuru na Onyeisiala Tinubu ga-ezute Onyeisiala mba Frans bụ Emmanuel Macron na njem ya.

  20. E wepụla Obong Nnache Itam dịka kọmịshọna ndị uweojii Anambra Steeti

    Obong Nnache Itam

    Ebe foto si, Police Service Commission

    Nkọwa foto, Obong Nnache Itam

    Ụlọọrụ Police Service Commission (PSC) ewepụla Obong Nnache Itam dịka kọmịshọna ndị uweojii n’Anambra steeti.

    Ozi si n’aka ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ PSC bụ Ikechukwu Ani, kwuru na e tinyela Livingstein Ikioye Orutugu dịka kọmịshọna steeti ahụ.

    Livingstein Ikioye Orutugu bụbu kọmịshọna ndị uweojii Bayelsa steeti.

    Nwegharị a na-abịa dịka ọnọdụ nchekwa Anambra steeti na-akawanye njọ kwa ụbọchị nke mere ka ọtụtụ ndị steeti malite ịjụ ajụjụ banyere ọrụ ndị uweojii steeti ahụ.

    Onyeisioche ụlọọrụ Police Service Commission (PSC) bụ Hashimu Argungu enyela Livingstein Ikioye Orutugu iwu ka ọ rụọ ọrụ ma weghachita ezi nchekwa ndụ na akụnaụba na steeti ahụ.