EFCC enyela ndị mba ofesi nnukwu ego a napụrụ ha na wayo

Ebe foto si, EFCC
Ụlọọrụ Economic and financial crime commission (EFCC) enwerela ego ruru $132,362.43 e gwuru ndị mba ofesi na wayo nyeghachị ha.
Ndị e gwuru wayo ahụ sị na mba Amerịka, Spain na Swiss.
Onyeisi ụlọọrụ EFCC bụ Ola Olukoyede mere nke a n’abalị garaaga n’isi ụlọọrụ ha dị na Jabi, Abuja.
Ola Olukoyede kwuru na nke a bụ ka ha gosi na Naịjirịa abụghị mba ndị na-egwu wayo ga-anọ.
Onye nnọchịtaanya mba Spain na Naịjirịa bụ Maria Higon Velasco ka EFCC nyere ego ruru $100,011.43 ka o nwere ya nye onye e gwuru wayo bụ Chantai Helene Lavancy, a maara na mbụ dịka Chantai Helene Maeder.
Charles Smith bụ onye ọrụ na ngaraba ọkaiwu n’ụlọọrụ Federal Bureau of Investigation, FBI, nke mba Amerịka ka EFCC nyere ego nke onye mba ahụ e gwuru wayo bụ Maria Jesus Brockell.
Ọzọkwa bụ EFCC nyere Charles Smith ego ruru $7,527 e gwuru Michael Smith na wayọ, ma nyekwa ya ego nke Marva Marrow ruru N32,639,358.11.























