Volodymyr Zelensky awụchiela Washinghton DC maka mkparịtaụka ya na Onyeisiala Donald Trump

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Febụwarị 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere

  1. Ọbụghị eziokwu na ọ bụ ọwụwa anyanwụ Naịjirịa ka onye ga-eji aha pati anyị zọọ ọkwa onyeisiala n’afọ 2027 ga-esi - Labọr Pati

    Ọkọlọtọ Labour pati

    Ebe foto si, Labour Party website

    Nkọwa foto, Ọkọlọtọ Labour pati

    Ndị isi otu Labour Pati ekwuola na ọbụghị eziokwu na ọ bụ mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa ka onye ga-eji aha pati ha zọọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka afọ 2027 ga-esi pụta.

    Akwụkwọozi odeakwụkwọ Labour Pati bụ Obiora Ifoh wepụtara kwuru na enweghị oge ọbụla ha kwuru na e nwere mpaghara ga-enwepụta onye ga-eji aha pati ha zọọ ọkwa ọbụla na Naịjirịa.

    Onyeisi pati ahụ Julius Abure kwuru na onye ọbụla nwereike iji aha Labour pati zọọ ọkwa ọbụla na NaỊjirịa. O mere ka o doo anya na Labour Pati abụghị naanị pati ndị ọwụwa anyanwụ Naịjirịa.

  2. Aka A$AP Rocky bụ di Rihanna dị ọcha n'ebubo ịgba mmadụ egbe e boro ya

    Aha onyonyo, Watch emotional moment A$AP Rocky found not guilty

    Aka otiegwu a ma ama bụ A$AP Rocky dị ọcha n’ebubo na ọ gbara onye bụbu enyi ya nwoke egbe.

    Ndị nchabi ikpe na Los Angeles kachapụrụ ebubo ọnụ abụọ dị n’isi nwamadị a ezi aha ya bụ Rakim Mayers nke ntaramahụhụ ya nga ruru afọ iri abụọ na anọ (24yr).

    Nwamadị a kpọrọ Terell Ephron buru ebuo na Rocky gbara ya egbe oge ha na-enwe esemokwu n’okporoụzọ Hollywood n’ụbọchị 6 Nọvemba afọ 2021.

    Rocky bụ enyi nwoke otiegwu Rihanna gọnarịrị ebubo ahụ ma kwuo na egbe ahụ abụghị nke ezi ya, na enyi ya nwoke ahụ chọrọ ịnapụta ya ego.

    A$AP Rocky bụ di Rihanna, ha nwere ụmụ abụọ

    Ebe foto si, Getty Images

    Ngwa ngwa ekwupụtara na aka nwamadị a dị ọcha, e tiri mkpu ọṅụ ma kụọ aka n’ụlọikpe. Rocky gbaara ọsọ ga-amakụọ ezinaụlọ ya nakwa Rihanna bụ ndị n’azụ ya.

    Rihanna na-agakaarị n’ụlọikpe ịnọnyere ya n’oge ọbụla a na-ekpe ikpe ya, mana o duu ụmụ ha abụọ gaa n’ụlọikpe na Tuzde.

    Rocky makọkwara ndị ọkaiwu ya ebe ihe dị ka anya mmiri si ya n’anya na-apụta mgbe e kwupụtara na aka ya dị ọcha nke ugboro abụọ.

    "Ekele dịrị Chineke maka ịzọ ndụ m,” ka o kwuru dịka o kelekwara mmadụ iri na abụọ chabiri ikpe ahụ.

  3. Trump ataala Yukren ụta maka ịmalite agha ha na mba Rọshịa

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump

    Ebe foto si, Reuters

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump arụọla ogbo ya nke Yukren bụ Volodymyr Zelensky aka maka ikwu na akpọghị ha oku isonye na mkparịtaụka mere na Saụdị Arebịa maka ịkwụsị agha ha na Rọshịa.

    O kwuru na ọ tụrụ ya n’anya n’ihe Yukren kwuru ma taa ha ụta maka ịmalite agha ahụ, sị na ha kaara enwe nkwekọrịta n’oge ahụ.

    Mwakpo zuruoke mba Rọshịa wakporo Yukren bụ ihe malitere agha ahụ kamgbe afọ atọ gara aga.

    N’ụbọchị Tuzde, Sergei Lavrov bụ minister mba Rọshịa na-ahụ maka mmekọrịta ha na mba ọzọ na odeakwụkwọ mba Amerịka bụ Marco Rubio nwere mkparịtaụka n’ihu n’ihu n amba Saụdi Arebịa.

    Ha kwekọrịtara ịhọpụ otu ga-enwe mkparịtaụka banyere etu a ga-esi kwụsị agha ahụ.

    Lavrov kwuru na ha agaghị anabata ka enwee ndịagha udo si n’otu Nato ga-agba ụkwụ na mba Yukren n’oge a na-akpa nkata ime udo, dịka ndị ndu mba Yurope si kwuo site n’ọgbakọ pụrụiche ha nwere.

    Ndị ndu mba Yurope na-akwado Yukren n’agha ahụ na-ahụta na Amerịka gbahapụrụ n’isonye na mkparịtaụka ụdọ ahụ ya na Rọshịa na-enwe banyere agha a.

    Mgbe a jụrụ Trump ebumnobi banyere Yukren kwuru na a gbahapụrụ ha na mkparịtaụka ahụ, o kwuru sị “ m nụrụ na obi adịghị ha mma maka na e nyeghi ha oche, e nyere oche kamgbe afọ atọ ma karịa. A kaara ikwubi okwu ahụ na-egbughi oge ọbụla.

    “Ị garaghị ebido ya, ị kaara ịnabata nkwekọrịta udo, nke gaara enyeghachị ha ọtụtụ ala ndị ahụ.

    Na ngwụcha mkparịtaụka ahụ, Trump kwuru na obi juru ya afọ na o nwereike ịkwụsị agha ahụ.

  4. Igbo mma mma nụ ooo!

    Daalụ maka isonyere na anyị n'ọgbakọ BBC Igbo.

    Biko gaa n'ihu na-esonyere anyị maka akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ụwa gbaa gburu gburu.

  5. Mba Amerịka na mba Rọshịa ga-ahọpụta ndị ga-akparịtaụka iji kwụsị agha dị na Yukren

    Mba Rọshịa kwuru na mkparịtaụka ahụ nke nwere awa anọ, mịtara ezi mkpụrụ.

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Mba Rọshịa kwuru na mkparịtaụka ahụ nke nwere awa anọ, mịtara ezi mkpụrụ.

    Mba Amerịka na Rọshịa ga-ahọpụta ndị ga-akparịtaụka iji kwụsị agha dị na Yukren. Nke a na-abịa dịka mba abụọ ahụ nwere mkparịtaụka n’ụtụtụ Mọnde 18 Febụwarị 2025, na mba Saụdi Arebịa banyere agha na-eme na Yukren.

    Mba Rọshịa kwuru na mkparịtaụka ahụ nke nwere awa anọ, mịtara ezi mkpụrụ.

    Mịnịsta mba Rọshịa na-ahụ maka mmekọ mba ofesi bụ Sergei Lavrov zutere Odeakwụkwọ gọọmentị Amerịka bụ Marco Rubio na mkparịtaụka ahụ, mana enweghị mba Yurop ọbụla bịara nzukọ ahụ.

    Marco Rubio kwuru na mpụtara mkparịtaụka ahụ bụ usoro mbụ na mbọ a na-agba iji kwụsị agha ahụ.

    Obi gọọmenti Rọshia bụ Kremlin kwuru na Onyeisiala Vladimir Putin dị njikere ya na Onyeisiala Yukren bụ Volodymyr Zelensky wee mkparịtaụka

  6. Mba Amerịka ga-achụla ndị Naịjirịa dị 201

    Ndị ahụ a ga-achụla gụnyere ndị a tụrụ mkpọrọ nakwa ndị mere mpụ dị iche iche.

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ndị ahụ a ga-achụla gụnyere ndị a tụrụ mkpọrọ nakwa ndị mere mpụ dị iche iche.

    Gọọmenti mba Amerịka ekwuola na ha ga acgụla mmadụ 201 dịka Onyeisiala Donald Trump na-aga n’ihu ibu agha megide ndị na-enweghị akwụkwọ ikike ibi na mba Amerịka.

    Ndị ahụ a ga-achụla gụnyere ndị a tụrụ mkpọrọ nakwa ndị mere mpụ dị iche iche.

    Mịnịsta na-ahụ maka mmekọ mba ofesi bụ Bianca Odumegwu-Ojukwu kwuru nke a oge Ambasadọ mba Amerịka na Naịjirịa bụ Richard Mills kpọtụụrụ ya n’ụlọorụ ya dị na Tafawa Balewa House, Abuja.

    Bianca Odumegwu-Ojukwu kwuru na n’ime mmadụ 201 ahụ, e nyela nkwado ka a chụla mmadụ 85 n’ime ha mana ọ rịọrọ ka nchụla bụrụ nke nwere ugwu.

    Mịnịsta ahụ gara n’ihu rịọ ka e nye ndị ahụ ohere ka ha chịkọlata ngwongwo ha na ihe ndị ọzọ ha nwere na mba Amerịka tupu a chụlata ha.

  7. Popu na-arịa ahụ dobere ya ụlọọgwụ- Vatican

    Popu Francis

    Ebe foto si, Getty Images

    Vatican ekwuola na a na-elata onyeisi ụka Katọlik n'ụwa nile bụ Popu Francis Pope n'ụlọọgwụ maka ' ọnọdụ ahụike tara agbụ'.

    E bugara nnukwu ụkọchukwu ahụ gbara afọ 88 n'ụlọọgwụ Gemelli dị na Rome ebe ọ na-anata ọgwụgwọ nakwa nnyọcha maka ọrịa 'bronchitis'.

    N'ụbọchị Monde, Vatican kwuru na Popu nwere ọrịa nje "polymicrobial infection" ogboro e si eku ume.

    Ha mechara kwuo na Popu amalitela ọgwụgwụ a gwara ya ma nọrọkwa na ọnọdụ dị mman̄

    Ha gbakwara ama na ọ na-arụ ọrụ ma na-agụkwa akwụkwọ ọbụladị dịka ọ nọ n'ụlọgwụ n'ụbọchị Monde.

  8. Mmadụ niile nọ n’ụgbọelu ahụ kụkpọrọ n’ọdụụgbọelu Toronto ji ndụ ha pụta

    Foto gbara n’anwụ na soshal midia gosiri na ụgbọelu ahụ tụgharịrị chilie ụkwụ elu oge ahụ ọ kụkpọrọ

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Foto gbara n’anwụ na soshal midia gosiri na ụgbọelu ahụ tụgharịrị chilie ụkwụ elu oge ahụ ọ kụkpọrọ

    Akụkọ ekwuola na mmadụ niile na-eme njem na ndị ọrụ ụgbọelu ahụ kụkpọrọ n’ọdụụgbọelu Toronto Pearson Airport dị na mba Kanada ji ndụ pụta.

    Ozi si n’aka onye ọrụ Greater Toronto Airports Authority bụ Deborah Flint kwuru na obi dị ha aṅụrị na enweghị onye nwụrụ na njiji ahụ. O mere ka a mata na ọ bụ obere ahụ ka ụfọdụ mmadụ meruru.

    Ndị ọrụ gbatagbata kwuru na otu nwatakịrị na ndị okenye abụọ meruru nnukwu ahụ na njiji ahụ.

    Foto gbara n’anwụ na soshal midia gosiri na ụgbọelu ahụ tụgharịrị chilie ụkwụ elu oge ahụ ọ kụkpọrọ.

    Ọdụụgbọelu Toronto Pearson Airport kwuru na ụgbọelu ahụ bụ nke ụlọọrụ Delta Airlines Flight 4819 bu mmadụ 76 na-eme njem na ndị ọrụ 4, si Minneapolis abata Toronto oge ọ kụkpọrọ.

    Deborah Flint toro ndị ọrụ gbatagbata maka mbọ ha gbara ma kwuo na e bugara mmadụ 18 ụlọọgwụ. Ọ gara n;ihu kwuo na n’ime mmadụ 80 nọ n’ụgbọelu ahụ, mmadụ 22 bụ ndị mba Kanada ebe mmadụ ndị ọzọ si mba ndị ọzọ dị iche iche.

    Ụlọọrụ Transportation Safety Board of Canada ekwuolla na ha ezigala ndị ọrụ nnyocha n’ogige ahụ iji chọpụta ihe kpatara ọdachi ahụ.

    Ndị ọrụ gbatagbata kwuru na otu nwatakịrị na ndị okenye abụọ meruru nnukwu ahụ na njiji ahụ.

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ndị ọrụ gbatagbata kwuru na otu nwatakịrị na ndị okenye abụọ meruru nnukwu ahụ na njiji ahụ.
  9. Amerịka na Rọshịa ga-amalite mkparịtaụka iji kwụsị agha ha na Yukren

    Marco Rubio na ogbo ya nke Saụdi Arebịa

    Ebe foto si, Reuters

    Mba Amerịka na Rọshịa ga-enwe mkparịtaụka n’ụtụtụ a na mba Saụdi Arebịa banyere agha na-eme na Yukren – nke ga-abụ mkparịtaụka ihu na ihu mbụ mba abụọ ga-enwe kamgbe Moscow wakporo Yukren.

    Minista mba Rọshịa na-ahụ maka mmekọrịta ya na mba ndị ọzọ bụ Sergei Lavrov ga-ezute odeakwụkwọ gọọmentị mba Amerịka bụ Marco Rubio n’obodo Riyadh n’ụtụtụ a, mana mba Yukren na mba ndị Yurope agaghị eso na mkparịtaụka ahụ.

    Ihe ọzọ mkparịtaụka a na-achọ ime bụ ịhazi mkparịtaụka ihu na ihu n’etiti Donald Trump na Vladimir Putin n’obodo Riyadh. Ha abụọ nwere mkparịtaụka n’ekwentị n’izuụka gara aga – Trump kwuru “anyị ga-ezute na Saụdi Arebịa”, mana e kwughi ọbụchị ọ ga-abụ.

    Minista mba Rọshịa na-ahụ maka mmekọrịta ya na mba ndị ọzọ bụ Sergei Lavrov

    Ebe foto si, Reuters

    Amerịka kwuru na mkparịtaụka a bụ nzọmụkwụ mbụ iji maara ma Rọshịa “ọ dị njikere n’ezie” ịkwụsị agha ha na-ebuso Yukren, ebe Rọshịa kwuru na nke a bụ iji hazie mmekọrịta ha na mba Amerịka.

    Mana Onyeisiala mba Yukren bụ Volodymyr Zelensky kwuru na ọ gaghị anabata nkwekọrịta ọbụla e mere ya n’azụ nke ọ na-esoghi na ya.

    N’otu aka ahụ ndị ndu mba Yurope chọrọ isonye na mkparịtaụka ahụ - ha nwere ọgbakọ pụrụiche ụnyaahụ bụ ebe Praịm Minista mba Poland bụ Donald Tusk kwuru na o nweghi mkpebi ọbụla e kwesịrị inwe ma ọ bụrụ na ha esoghi na ya.

  10. Igbọ mụrụ nze mụọ ọzọ unu anọọla?

    Obi dị ọcha ka anyị anabata gị n'ọgbakọ BBC Igbo n'ụbọchị taa.

    Biko buru oche gị bịa nọnyere anyị maka akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ụwa.

    Ndewo!

  11. Yurope na Amerịka agaghị enwe nkewa - ‘Chancellor’ mba Jamini bụ Olaf Scholz

    Chancellor mba Jamini bụ Olaf Scholz

    Ebe foto si, EPA-EFE/REX/Shutterstock

    Nkọwa foto, Chancellor mba Jamini bụ Olaf Scholz

    'Chancellor’ mba Jamini bụ Olaf Scholz ekwuola na Yurope na mba Amerịka agaghị enwe nkewa n’ihe gbasara nchekwa mba Yukren.

    Olaf kwuru nke a mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu na mba Fransi bụ ebe ndị ọchịchị na Yurope na-eme ọgbakọ maka agha dị n’etiti Rọshịa na Yukren ọkachasị mkparịta ụka udo nke mba Amerịka na mba Rọshịa chọrọ inwe.

    Chancellor mba Jamini bụ Olaf Scholz  na Macron

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Chancellor mba Jamini bụ Olaf Scholz na Macron

    Olaf Scholz kwuru na nkwado a na-enye mba Yukren ga na-aga n’ihu.

    Mana Praịm mịnịsta mba Britin bụ Keir Starmer sị na ihe mba Yukren chọrọ bụ udo tọrọ atọ ga-adịgịde.

    Starmer sị na Yukren achọghị udo nke ga-eme ka mba Rọshịa lọghachịta azụ bịa nwakpoo ha n’ọdị n’ihu.

  12. Gịnị na-eme n’ụlọ ndị omeiwu na Legọsị steeti ugbua?

    Mojisola Meranda na Mojisola Meranda

    Ebe foto si, Mojisola Meranda/Obasa/X

    Nkọwa foto, Mojisola Meranda na Mojisola Meranda

    Ndị ọrụ nchekwa agbaala ogige ụlọ ndị omeiwu na Legọsị steeti okirikiri maka inye ha ezi nchekwa.

    Nke na-eme dịka onyeisi ndị omeiwu na steeti ahụ bụ Mojisola Meranda batara n'ogige ahụ ka ha nwe ọgbakọ.

    Mana e nwere obere ọgbaaghara mgbe nke mere ndị omeiwu jiri gbuo obere oge tupuu ha ebido inwe ọgbakọ.

    Mojisola Meranda na ndị omeiwu mmadụ 32 dị njichere inwe ọgbakọ mana a mabeghị ihe ha ga-akpa n’ọgbakọ ahụ.

    Cheta na n’ime ọnwa garaaga ka ndị omeiwu na steeti ahụ nwepuru Mudashiru Obasa n’ọkwa dịka onyeisi ụlọ omeiwu na steeti ahụ maka ebubo mpụ ma nwere Mojisola Meranda nochie ya.

    Obasa gbara akwụkwọ n’ụlọikpe dị elu na Legọsị steeti maka etu e si nwepu ya n’ọkwa ma gọọ sị na aka ya dị ọcha n’ebubo mpụ e boro ya.

  13. E jidela mmadụ abụọ maka ebubo izu ohi n’Enugwu steeti

    Ihe e wetere n'aka ndị ahụ a na-ebo ebubo

    Ebe foto si, Nigeria Police

    Nkọwa foto, Ihe e wetere n'aka ndị ahụ a na-ebo ebubo

    Ndị uweojii n’Enugwu steeti ejidela mmadụ abụọ maka ebubo ịzu ohi na mpaghara 9th Mile Corner dị na steeti ahụ.

    Aha mmadụ abụọ ahụ e jidere bụ Chime Valentine Chidiebere (dị afọ 25) na Alior Jideofor Kenechukwu (dị afọ 30).

    Ndị uweojii kwuru na ha jidere mmadụ abụọ ndị ahụ n’oge ha napụrụ mmadụ ọgbatumtum n’abalị isii nke ọnwa Febuwarị, 2025.

    Ha kwuru na ọ bụ mgbe ha jidere Chime na Jideofor ka e nwetere egbe na mgbọ egbe n'aka ha.

    Ha saịrị na nyocha ha mere gosiri na n’ụbọchị Jenuwari 5, 2025 ka mmadụ abụọ ahụ banyere ọgbatumtum n’Okwojo Ngwo, sị onye ọgbayumtum buga ha Amokwe Ngwo, mana ha ruru n’ụzọ kwụsị nwoke ahụ ma gbaa ya egbe n’ụkwọ ma buru ọgbatumtum ya gbalaga.

    Komishịọna ndị uweojii n’Enugwu bụ Kanayo Uzuegbu dụrụ ndị mmadụ ndụmọdụ ka ha nyere ndị uweojii aka ma na-agbara ha ama banyere ndị omekoome ma kwuo na ha dị njikere ịchekwa steeti ahụ.

  14. Ndịagha nnupuisi na DR Kongo akpachiela obodo ọzọ na mba ahụ

    Ọtụtụ mmadụ pụtara n’okporoụzọ ma na-akụrụ ndịagha ahụ aka dịka ụgbọala ha batara obodo ahụ na-enweghị mgbochi ọbụla.

    Ebe foto si, AFP

    Nkọwa foto, Ọtụtụ mmadụ pụtara n’okporoụzọ ma na-akụrụ ndịagha ahụ aka dịka ụgbọala ha batara obodo ahụ na-enweghị mgbochi ọbụla.

    Ndịagha nnupuisi M23 akpachiela ma nwere ọnọdụ n’obodo Bukavu, obodo kachasị ibu na mpaghara ọwụwa anyanwụ mba DR Kongo ma machie obi ọchịchị Gọvanọ mpaghara ahụ.

    Ọtụtụ mmadụ pụtara n’okporoụzọ ma na-akụrụ ndịagha ahụ aka dịka ụgbọala ha batara obodo ahụ na-enweghị mgbochi ọbụla.

    Nke a bụ obodo abụọ ha nwere ọnọdụ na ya ka ha nwechara ọnọdụ n’obodo Goma.

    Gọọmenti mba Kongo agwala ndị obodo ka ha ghara ịpụta n’ụlọ ha iji gbochie mwakpo ndịagha ahụ.

    Otu UN na ọtụtụ mba Yurop adọọla aka na nti banyere mwakpo ahụ nke chụpụgoro ọtụtụ narị mmadụ n’ụlọ ha ma kwuo na nke a nwereike ibute agha na mpaghara ahụ.

    Otu onye bi na obodo Bukavu na-achọghị ka a kpọọ aha ya maka egwu nchekwa ya, gwara BBC na egwu ekweghị ọtụtụ mmadụ pụta n’ụlọ ha.

    O kwuru na ọtụtụ ụmụaka na ndị ntorobia eburula egbe ma na-agba mgbọ n’akụkụ dị iche iche ma na-ezu ohi.

    Ụbọchị Fraịde 14 Febụwarị 2025, ndịagha M23 wakporo ma nwere ọnọdụ n’ọdọụgbọelu ma malite na-abanye obodo ahụ bụ isi obodo mpaghara Saụt Kivu

  15. Ọtụtụ mmadụ anwụọla oge ebe a na-egwuputa ọlaedo zere na Mali

    Ogige ahụ zere ma gbuo ọtụtụ mmadụ ahụ

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ogige ahụ zere ma gbuo ọtụtụ mmadụ ahụ

    Ihe ruru mmadụ 40 anwụọla oge ebe na-egwuputa ọlaedo zere na Kéniéba dị na mpaghara Kayes mba Mali ụbọchị Satọde.

    Akụkọ kwuru na ọtụtụ ndị ahụ nwụrụ bụ ụmụnwaanyị n’ogige ahụ bụ ebe iwu na-akwadoghị ebe.

    Otu onyeisi otu ndị na-egwuputa ihe ọnatarachi gwara ndị ntaakụkọ na ndị ahụ nwụrụ banyere n’ogige ahụ ndị na-egwuputa ihe ọnatarachi hapụrụ iji chọọ ọlaedo mana njiji jiri oge ogige ahụ zere ma gbuo ha.

    A na-ekwu na nke a bụ ugboro abụọ ụdịrị ọdachi a na-eme na mba Mali n’ime izuụka atọ. Cheta na mmadụ 10 nwụrụ oge ide mmiri wakporo ebe a na-egwuputa ihe ọnatarachi n’ọnwa Jenụwarị 2025.

    Ka ọ dị ugbua, amabeghị mmadụ ole nwụrụ n’ọdachi ahụ mere ụbọchị Satọde.

    Mba Mali bụ mba kachasị emepụta ọlaedo n’ụwa niile.

  16. Mba Briten "ga-eziga" ndịagha ha na Yukren maka nchekwa udo

    Zelensky na Starmer

    Ebe foto si, PA Media

    Praịm Minista mba Briten bụ Keir Starmer ekwuola na “ọ dị njikere” itinye ndịagha ha na mba Yukren iji nye aka chekwaa udo na mpaghara ahụ.

    O kwuru na inweta udo ga-anọte aka na mba Yukren dị “oke mkpa ma ọ bụrụ na anyị chọrọ igbochi Putin ime mwakpo ọzọ n’ọdịnihu”.

    Tupuu o sonye n’ọgbakọ pụrụiche ndị Yurope ga-eme n’ụbọchị Mọnde, Maazị Keir kwuru na mba Briten dị njikere inye aka na nchekwa mba Yukren site “n’itinye ndịagha anyị na mba ahụ ma ọ dị mkpa.”

    “Ọ bụghị ihe m ji nwayọọ ekwu,” ka o dere n’akwụkwọ mgbasaozi Daily Telegragh. “Ọ na-emetụ m nke ukwuu n’ihe ọ pụtara itinye ndịagha anyị n’ihu ọrụ.”

    Praịm Minista gbakwụnyere: “Mana ọrụ ọbụla ga-enye aka weta nchekwa na Yukren bụ ọrụ inye aka weta nchekwa na mpaghara Yurope, nakwa nchekwa mba anyị.”

    Nkwụsị agha Rọshịa na-ebuso Yukren “ọ bịa, ọ gaghị abụ naanị nwa mgbe nta tupu Putin awakpoo ọzọ”, ka Maazị Keir kwuru.

    E nwereike iziga ndịagha Briten na ndị ogbo ha si na mba Yurope ndị ọzọ nọ n’akụkụ okeala ebe Yukren kpachiri nakwa nke Rọshịa kpachiri.

    Praịm Minista dị mbụ rụtụaka na ndịagha Briten nwereike isonye n’ichekwa mba Yukren ma ọ bụrụ akwụsị ịkwa mgbọ.

    Ya na Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump nakwado izute na Washington na ngwụcha ọnwa a ma kwuo na nchekwa mba Amerịka ga-eweta ga-enye aka ka e nwee udo maka na ọ bụ naanị Amerịka ga-egbochi Putin ịwakpo Yukren ọzọ.

    Ọgbakọ Maazị Keir na ndị ndu Yurope ndị ọzọ bụ na nzaghachị mkparịtaụka udo Amerịka na Rọshịa na-akwado inwe nke ga-emetụta mpaghara Yurope.

  17. Igbo ndị ọma unu abọọla chi?

    Anyị ji ụkpa ekele anabata gị n'izuụka ọhụru a.

    Na-asị ka ọ dịịrị gị na mma.

    Biko nọnyere anyị n'ọgbakọ BBC Igbo maka akụkọ ndị hiri odo n'ụwa gbaa gburu gburu.

    Ndewo!

  18. Yukren agaghị eso mee mkparịtaụka udo mba Amerịka na Rọshịa kwadọro

    Onyeisiala mba Yukren bụ Volodymyr Zelensky

    Ebe foto si, NBC News

    Nkọwa foto, Onyeisiala mba Yukren bụ Volodymyr Zelensky

    Otu onyeisi na gọọmentị mba Yukren ekwuola na mba ahụ agaghị eso eme mkparịtaụka udo ahụ nke mba Amerịka na Rọshịa chọrọ ka e mee na mba Saudi Arabia.

    Onye ahụ gwara BBC na mba Yukren enwetebeghị akwụkwọ ozi sị ha bịa n’ọgbakọ ahụ ma kwuo na ọ bụ ya mere na ha aghaghị ezịga onye ọbụla.

    Mmadụ abụọ bụ ndị na-arụrụ Onyeisiala mba Amerịka ọrụ na ngaraba mmekọ mba ahụ na mba ụwa bụ Mike Waltz na Steve Witkoff ga-eje mba Saudi Arabia bụ ebe e kwesiri ịnọ mee ọgbakọ ahụ.

    Na mbụ, Onyeisiala mba Yukren bụ Volodymyr Zelensky adọọla aka na ntị sị na mba ha agaghị ekwete n’ihe ọbụla e mere n’azụ ha.

    N’aka nke ọzọ ndị ọchịchị na Yurope ga-enwe ọgbakọ gbatagbata maka nchekwa dịka ha na-atụ anya na mba Amerịka na Rọshịa ka enwe nkwekọrịta banyere agha dị na Yukren.

  19. Netanyahu etuola ebum n’obi Donald Trump banyere Gaza

    Praịm mịnịsta mba Izrel bụ Benjamin Netanyahu na odeakwụkwọ mba Amerịka bụ Marco Rubio

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Netanyahu na Marco Rubio

    Praịm mịnịsta mba Izrel bụ Benjamin Netanyahu etuola ebum n’obi Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump banyere ọnọdụ Gaza.

    Netanyahu kwuru nke a n’oge ọ nabatara odeakwụkwọ mba Amerịka bụ Marco Rubio n’Izrel.

    Netanyahu kwuru na mba Izrel na mba Amerịka na-arụkọ ma dị njikere iweputa “usoro a ga-eji hazie Gaza”.

    Ka Netanyahu na Marco na-agwa ndị ntaakụkọ okwu ka ha kwupụtara nkwekọrịta ha nwere maka ikpochapụ ikike ọbụla ndị otu Hamas nwere ịguzobe gọọmeti mọabụ ịbụ ndị ọchịchị na Gaza.

    Ihe ọzọ ha nwere nkwekọrịta na ya bụ ịkwụsị mba Iran ịweta ngwaagha ‘nuclear’ nakwa ịtinye anya n’ihe na-eme na mba Syria kemgbe a kwaturu ọchịchị Assad.

    Marco Rubio gara Izrel ka nnukwu ogbunigwe mba Amerịka bunyere ha rutere mba ahụ ma kwuo na “ndị Hamas agaghị adị ka ndịgha gọọmenti maọbụ ndịagha nkịtị”.

    Izrel na Amerika katọkwara otu “International Criminal Court” ma sị na ha ji ụlọikpe ahụ ebuso mba Izrel agha nke ha kpọrọ “Lawfare” nakwa ịmetọ aha mba Izrel.

    A na-atụanya na Marco ga-ezute ndị ọchịchị mba Rọshịa na Saudi Aribia maka iwe nkata banyere iwete udo na Yukren.

  20. Etu e si jide nwoke gburu ma bekasịa ozu ọnyị ya nwaanyị dị afọ 23 na Kwara steeti

    Yetunde Lawal e gburuegbu

    Ebe foto si, SIKIRULAI

    Nkọwa foto, Yetunde Lawal e gburuegbu

    Ndị uweojii na Kwara steeti ekwuola etu ha si nwuchie nwoke gburu ma bekasịa ozu ọnyị ya nwaanyị dị afọ iri abụọ n’atọ na steeti ahụ.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Adetoun Edjire-Adeyemi sị na aha nwaanyị ahụ e gburu bụ Yetunde Lawal.

    Ndị uweojii kwuru na ọ bụ mgbe ha wetere ozi na Yetunde na-efu efu ka ha bidoro ime nyocha n’ekwentị Yetunde nke mere ha ji nwuchie nwoke ahụ ha na-enyoenyo dị afọ 29.

    Akụkọ na-ekwu na nwoke ahụ na Yetunde na-akpa n'ekwentị tupuu ọ sị Yetunde bịa n’ụlọ ya ebe ọ nọ gbuo ya ma bekasịa ozu ya.

    Ndị uweojii sị na ezinaụlọ Yetunde bidoro na-achọ ya achọ n’abalị iri nke ọnwa Febuwarị afọ 2025, mana ha jiri naanị abalị anọ chọta ebe ozu ya dị ma hụ etu e si bekasịa ya.

    Yetunde bụbu nwataakwụkwọ n'ụlọakwụkwọ "College of Education" dị n’Ilorin na Kwara steeti tupuu e gbuo ya.