Mmadụ 18 anwụọla na nzọgbu nzọgbu mere n’ọdọụgbọoloko dị na mba India
Nzọgbu nzọgbu mere n’ọdọụgbọoloko dọ na New Delhi nke mba India egbuola mmadụ iri na asatọ ebe ihe karịrị mmadụ iri merụrụ ahụ.
Ọtụtụ puku mmadụ gbakọtara n’ọdọụgbọoloko ahụ n’otu ugboro dịka ha na-azọ ịbanye n’ụgbọoloko ime njem n’abalị Satọde maka na ụgbọoloko ahụ abịaghị n’oge.
Mmadụ anọ n’ime ndị nwụrụ anwụ bụ ụmụaka, iri bụ ụmụnwaanyị dịka akwụkwọ ndị ọrụ gọọmentị wepụtara si kwuo.
Praịm Minista mba India bụ Narendra Modi sị na “ọ na-eti ezinaụlọ ndị o metụtara aka n’obi” n’ozi o wepụtara na soshal media X.
Ụdịrị nzọgbu ndị mmadụ a na-emekaarị n’India, ebe e nwere ọtụtụ igwe mmadụ na-agbakọta n’emume dị iche iche gụnyere okpukperechi nakwa ebe ọzọ.
Nke a na-abịa n’ime izuụka ole ma ole mmadụ iri atọ nwụrụ site na nzọgbu nzọgbu mere n’ọgbakọ okpukperechi na Kumbh Mela ebe ọtụtụ ndị Hindu na-agbakọta asa ahụ na mmiri nsọ.

Ebe foto si, Reuters
Na Delhi, anya hụrụ ka o si mee gwara BBC Hindi na “igwe mmadụ” gbakọtara n’ọdọụgbọoloko ahụ e ji eme njem aga Kumbh Mela nke a na-eme n’obodo Prayagraj dị nso na steetị Uttar Pradesh. Ọtụtụ narị mmadụ nọ ebe ahụ na-eche ụgbọoloko ha ji aga ebe ndị ọzọ.
Dịka ndị ọrụ si kwuo, ụgbọoloko abụọ adịla mbụ gbuo oge n’ịbịa mgbe ha kwesịrị, ebe nke atọ na-aga na Prayagraj na-eche ka ọ pụọ.
Otu onye kwuru na ndị mmadụ karịrị n’ọdọụgbọoloko ahụ nke mere na ọ banyenwughi n’ime ya.
Otu nwoke nwunye ya nwụrụ na nzọgbu ahụ kwuru na igwe mmadụ “enwehi nchịkọta” dịka ha na-achọ ịbanye n’ụgbọoloko ahụ.
KPS Malhotra bụ osote kọmishọna uweojii na njem ụgbọoloko kwuru na ha na-eme nnyocha banyere ihe butere nzọgbu nzọgbu ahụ.
"Nke a mere maka na ụgbọoloko abụọ abịaghị n’oge nke mere ka ọtụtụ ndị mmadụ gbakọta n’ọdọụgbọoloko a,” ka o kwuru.
Ndị na-ama gọọmentị aka akatọọla gọọmentị maka ọdachi a ma kwuo na ha kụrụ afọ n’ala n’ọchịchị ha.






















