Ụlọikpe Saụt Korịa enyela iwu ka a nwụchie Yoon Suk-yeol a chụpụrụ dịka Onyeisiala

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Disemba 2024.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Jessica Nwankwo, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere

  1. A ga-amalite ịgba ụmụaka ọgwụ mgbochi ọrịa ịba na Naịjirịa taa

    Ka a na-agba nwata ọgwụ mgbochi ọrịa ịba

    Ebe foto si, Getty Images

    Taa bụ Mọnde, ụbọchị abụọ nke ọnwa Disemba 2024, ndị ọrụ ahụike na Naịjirịa ga-amalite atụmatụ ịgba ụmụaka dị n’okpuru ọnwa ise ọgwụ mgbochi ọrịa ịba a kpọrọ ‘R12 malaria vaccine’.

    Atụmatụ a ga-amalite na steeti Bayelsa na Kebbi bụ ebe ọrịa ịba kachasị akpa ike na Naịjirịa.

    Atụmatụ a na-abịa dịka Naịjirịa so n’otu n’ime mba kachasị enwe ọrịa ịba n’ụwa, a na-ahụta ya dịka nnukwu nzọmụkwụ Naịjirịa mere n’ibuagha megide ọrịa a.

  2. Etu ọtụtụ ndị na-ekiri asọmpị bọọlụ si nwụọ na mba Guinea

    Praịm Mịnịsta mba Guinea bụ Mamadou Oury Bah

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Praịm Mịnịsta mba Guinea bụ Mamadou Oury Bah

    Ọtụtụ ndị mmadụ ọnụọgụgụ ha kariri iri na abụọ anwụọla oge ọgbaaghara dapụtara n’asọmpị dị n’etiti otu egwu bọọlụ N'zérékoré na Labé dị na mba Guinea.

    A gbara asọmpị ahụ n'ama egwuregwu dị na mpagara N'zérékoré.

    Praịm Mịnịsta mba ahụ bụ Mamadou Oury Bah kwuru na e nwere ndị a zọgburu mgbe ndị mmadụ na-agba ọsọ maka ọgbaaghara ahụ ma kpọọ oku ka udo lọghachịta na mpaghara ahụ.

    Otu dọkịnta na-achọghi ka a kpọọ aha ya gwara ụlọọrụ mgbasa ozi AFP na ‘ozu ndị mmadụ dọsara’ n’ụlọọgwụ ma kwuo na ọba ozu dị n’ụlọọgwụ ahụ ejula.

    Ụlọọrụ mgbasa ozi na Geuinea na-ekwu na ọgbaaghara bidoro oge ndị uweoji jiri awụrụ-anyammịrị gbaa ndị nkwado otu egwu bọọlụ Labe maka na ha na-atụ onye na-egbu opi bọọlụ okwute n’ime ama egwuregwu.

    Otu onye akaebe gwara ụlọmgbasaozi AFP na “ihe ndị a niile bidoro mgbe ndị na-ekiri bọọlụ nwere nghọtaghe ka e si egbu bọọlụ ahụ, ọtụtụ n'ime ha wakporo ama egwuregwu ahụ’

    Mana ugbua enwebeghi akwụkwọ ozi si n’aka gọọmenti mba ahụ kwuputara ọnụọgụgụ mmadụ ole nwụrụ n’ọgbaaghara ahụ.

    Ihe onyonyo na foto dị icheiche na-efehari n’ịntanet na-egosi ọtụtụ ndị nwụrụ na ndị meruru ahụ nakwa ndị na-agba ọsọ n’ime ama egwuregwu ahụ mana BBC amabeghị ma foto ndị ahụ niile ọ bụ eziokwu.

    Asọmpị ahụ bụ egwuregwu e ji echeta onyeisiala mba ahụ bụ Mamadi Doumbouya bụ onye kwaturu gọọmenti ma were ọchịchị n’ọnwa Seputemba, afọ 2021.

    Cheta n’afọ 2009, e gburu mmadụ 146 mgbe ndịagha gbara egbe ma gbagbuo ndị mmadụ n’ime ama egwuregwu ọzọ dị na mpaghara Conakry oge ndị na-ekweghi na gọọmenti mba ahụ na-enwe ọgbakọ.

    Ọtụtụ ka a gbara egbe, ọtụtụ ka a mara elu n’ike, ebe ndị ọzọ meruru ahụ oge ha na-agba ọsọ.

    Onye agha chiburu mba ahụ ka a tụrụ nga afọ iri abụọ maka mpụ megidere ikike dịịrị onye.

  3. Joe Biden ejirila ikike Onyeisiala gbaghara nwa ya nwoke mpụ ndị o mere

    Joe na Hunter Biden

    Ebe foto si, Reuters

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden ewerela ikike ya dịka onyeisiala gbaghara nwa ya nwoke bụ Hunter Biden ebubo ime mpụ abụọ e boro ya na-agbanyeghi na o kwuru na ọ gaghị etinye ọnụ.

    N’ozi o wepụtara, Onyeisiala kwuru na “a rụrụ nwa ya aka” ma sị na ikpe banyere ebubo ahụ bụ “mmebi ikpe ziri ezi”.

    Hunter Biden kwuburu na ọ bụ eziokwu na ọ dara iwu ụtụisi n’ọnwa Sepụtemba, ebe ikpe makwara ya n’ebubo ịṅụ ọgwụ ike ma burukwa egbe n’ọnwa Juun – nke mere o ji bụrụ nwa Onyeisiala nke mbụ a na-ama ikpe maka ime mpụ.

    Onye a họpụtarala dịka onyeisiala bụ Donald Trump mgbe ọ na-etinye ọnụ n’okwu ahụ sị na “mgbaghara a Joe nyere Hunter, ọ gụnyere ndị a anwụchiri na [Jenụwarị 6] ma tụọ mkpọrọ ọtụtụ afọ? Nke a bụ mmebi ikpe ziri ezi n’ezie!”

    Trump na-ekwu maka ndị nkwado ya wakporo ụlọomeiwu mba Amerịka n’ụbọchị 6 nke ọnwa Jenụwarị 2021 mgbe ha na-achọ ịgbanwe mmeri e meriri Trump na ntuliaka afọ 2020.

    Mgbaghara a Joe Biden nyere nwa ya na-abịa dịka o kwuru ọtụtụ oge na ọ gahị etinye anya n’ikpe banyere nwa ya.

    Joe Biden, nwunye ya na nwa ya n'oge a mara ya ikpe

    Ebe foto si, Reuters

    N’ọnwa Sepụtemba, odeakwụkwọ ụlọọrụ White House kwuru na Biden agaghị enye nwa ya nwoke mgbaghara.

    Mana e ruru n’abalị Sọnde, Onyeisiala Trump kwuru na-agbanyeghi na o kwenyere n’ikpe ziri ezi, “ndọrọ ndọrọ emebiela usoro ya ma mee ka e nwee mmetọ ikpe ziri ezi”.

    “Site n’ụbọchị m weere ọchịchị, ekwuru m na agaghị m etinye ọnụ na mkpebi ọbụla ngalaba ikpe ziri ezi mere, emere m nke a na-agbanyeghi ka m na-ahụ etu e si họpụta nwa m ma maa ya ikpe,” ka o kwuru.

    Na nzaghachị, Hunter Biden kwuru na mmehie ndị o mere n’ọge ọ na-aṅụ ọgwụ ike bụzi ihe a “tụgharịrị ma jiri ya na-emechu ya na ezinaụlọ ya ihu” maka ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

    Agaghị m eleghara mgbaghara a enyere m taa anya, aga m eji ndụ m nyere ọtụtụ ndị na-arịa ọrịa ma na-ata ahụhụ aka,” ka nwamadị a dị afọ 54 gbakwụnyere.

    Nke a abụghị mbụ Onyeisiala mba Amerịka na-enye otu onye ezinaụlọ ya mgbaghara.

    Bill Clinton nyere nwanne ya nwoke, Roger Clinton mgbaghara n’afọ 2001 n’ebubo ime mpụ metụtara ọgwụike n’afọ 1985.

    N’afọ 2020, Donlad Trump gbaghaara Charles Kushner bụ nna di nwa ya nwaanyị, Ivanka. Trump kwuru na nso nso na Kushner ga-abụ onye nnọchiteanya mba Amerịka na mba France.

  4. Ụtụtụ ọma nụ ooo!

    Anyị ji aka na i hiri ụra ma teeta nke ọma n'ụbọchị ọhụrụ a?

    Biko, buru oche gị bịa nọnyere anyị n'ọgbakọ BBC Igbo maka akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ụwa taa.

    Daalụ nụ!

  5. Otu NLC n’Ebonyi steeti amalitela abụbọ ọrụ maka ụgwọọnwa opekatampe N70,000

    Ndị isi otu NLC n'Ebonyi steeti
    Nkọwa foto, Ndị isi otu NLC n'Ebonyi steeti

    Otu Nigeria Labour Congress (NLC) ngalaba Ebonyi steeti amalitela abụbọ ọrụ otu izu ụka maka na gọọmenti enweghị ike ịkwọ ụgwọọnwa opekatampe ọhụrụ gọọmenti wepụtara maka ndị ọrụ Naịjirịa.

    Onyeisioche NLC na steeti ahụ bụ Ọkankụzi Ogugua Egwu gwara ndị nta akụkọ na abụbọ ọrụ ahụ ga-amalite ma ọ kụọ elekere iri na abụọ nke ụtụtụ Mọnde 2 Disemba, 2024.

    O kwuru na ụbọchị Wenezde 27 Nọvemba, 2024, ndị isi otu NLC nyere iwu ka ngalaba ha niile dị na steeti dị iche iche malite abụbọ ọrụ ụbọchị Frịde 29 Nọvemba, 2024 ma ọ bụrụ na gọọmenti steeti ha amaliteghị ịkwụ ọgwọọnwa opekatampe ọhụrụ ahụ.

    Egwu kpọkuru Gọvanọ Ebonyi bụ Francis Nwifuru ka o gee nti n’akwa ndị ọrụ steeti ahụ na-akwa ma nye iwu ka a malite ịkwụ ha ọgwọọnwa ọhụrụ ahụ.

  6. Pati IPC akatọọla mpụtara ntuliaka ọkwa Onyeisiala Namibia

    Ndị ọrụ ntuliaka na-agụkọ vootu na Namibia

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ndị ọrụ ntuliaka na-agụkọ vootu na Namibia

    Otu pati Independent Patriots for Change (IPC) mba Namibia ajụla ma katọọ mpụtara ntuliaka Onyeisiala e mere n’izu ụka gara n’agbanyeghị nsogbu na ọgbaaghara nke mere ka e bugoo oge e ji atụ vootu na mpaghara dị iche iche.

    Akwụkwọ ozi onye ji aha IPC zọọ ọkwa Onyeisiala na ntuliaka haụ bụ Panduleni Itula, kwuru na e nwere ọtụtụ mkpesa ha nwetara nke mere ka o doo anya na emweghị ntuliaka ahụ n’ụzọ iwu kwadoro.

    Panduleni Itula na pati ya bụ IPC na-achọ inwere ọkwa Onyeisiala n’aka pati South West Africa People's Organisation (Swapo) nọ n’ọchịchị kemgbe Namibia nwetara nwereonew n’afọ 1990.

    Netumbo Nandi-Ndaitwah ji aha South West Africa People's Organisation (Swapo) zọọ ọkwa Onyeisiala na ntuliaka ahụ na-atụ anya ị bụ nwaanyị mbụ ga-abụ Onyeisiala mba Namibia.

    A malitere ịtụ vootu ụbọchị Wenezde n’ụfọdụ ebe na mba mana ntuliaka gara n’ihu ruo ụbọchị Satọde maka enwezughị akwụkwọ e ji ebinye aka nakwa nsogbu ndị ọzọ.

    Ka ọ dị ugbua, a malitela ịgụkọ mpụtara ntuliaka ahụ iji mara onye nwetara mmeri.

  7. Pope Francis agwala Lebanon ka ha họpụta Onyeisiala ọhụrụ

    Foto Poopu Francis

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Foto Poopu Francis

    Poopu Francis agwala ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na Lebanon ka ha họpụta Onyeisiala ngwa ngwa iji hụ maka ezi nlekọta obodo.

    Nke bụ okwu Poopu Francis kwuru ụbọchị Sọnde 1 Disemba, 2024 ka o doro ụka n’ogige Saint Peter’s Square.

    O kwuru na ọ dị mkpa ka ihe malite ịga etu okwesịrị na mba ahụ.

    Cheta na onyeisi ụlọomeiwu Lebanon bụ Nabih Berri akpọọla oku ka e mee ntuliaka n’ọnwa Jenụwarị 9, 2024 iji nweta na njedebe ọnọdụ enweghị Onyeisiala kemgbe afọ abụọ na Lebanon.

    Lebanon enweghị Onyeisiala kemgbe ọchịchị Onyeisiala Michel Aoun bịara na njedebe n’Ọktoba 2022.

  8. A gụpụtala ozu mmadụ 54 n’ụgbọmmiri ahụ kpuru na Kogi Steeti - NEMA

    Osimiri Niger bụ ebe ụgbọ mmiri ahụ kpuru

    Ebe foto si, AFP

    Nkọwa foto, Osimiri Niger bụ ebe ụgbọ mmiri ahụ kpuru

    Ụlọọrụ gbata gbata Naịjirịa bụ National Emergency Management Agency (NEMA), ekwuola na ha agụpụtala ozu mmadụ 54 mmiri riri mgbe ụgbọmmiri ha kpuru n’Osimiri Niger dị na mpaghara Kogi Steeti.

    Onyeisi ụlọọrụ NEMA na Kogi steeti bụ Justin Uche gwara BBC na enweghị ezi ngụkọta na-echere ha aka mgba ịchọpụta mmadụ ole mmiri riri.

    N’okwu ya “Enweghị akwụkwọ bekee kpọrọ ‘passenger manifest’ nke kwesịrị inwe aha mmadụ niile nọ n’ụgbọ mmiri ahụ’.

    Uche kwuru na a na-achọ mmadụ ruru otu narị achọ ebe a gbapụtara mmadụ iri abụọ na anọ (24).

    N’aka nke ọzọ, Gọvanọ Usman Ododo na-achị Kogi steeti, enyela iwu ka ụlọọgwụ niile dị na steeti e bugara ndị ihe ahụ metutara nye ha ezi nleta zuru ezu.

    Ozi si n’obi n̄ọchịchị Kogi steeti mere ka amata na gọọmenti Gọvanọ Ododo na otu ụlọọrụ gọọmenti etiti dị iche iche na-arụkọ ọrụ iji hụ na a gbapụtara ọtụtụ ndị ọzọ a na-achọ achọ.

    Gọvanọ Ododo nyere ụlọọrụ gbata gbata steeti ahụ bụ State Emergency Management Agency (SEMA) iwu ka ha nye ezinaụlọ ndị ihe ahụ metutara enyemaka ọbụla kwesịrị.

  9. A gụpụtala ozu mmadụ 27 n'ime mmadụ 200 nọ n'ụgbọmmiri kpuru n'Osimiri Niger

    Ndị gbata gbata na-achọ ndị ka tọrọ n'ime Osimiri Niger

    Ebe foto si, Other

    Ndị ọrụ gbata gbata ekwuola na a gụpụtala ozu mmadụ ruru iri abụọ na asaa (27) so na ndị mmiri riri mgbe ụgbọmmiri ha kpuru n’Osimiri Niger dị na mpaghara Kogi Steeti.

    Ozi si n’ụlọọrụ Gọvanọ Kogi Steeti kwuru na a zọpụtala mmadụ ruru iri abụọ na anọ (24) ebe ha na-anata ọgwụgwọ n’ụlọọgwụ dị iche iche.

    Dịka akụkọ si kwuo, njinji a jiri mgbe otu ụgbọmmiri bu mmadụ karịrị 200 gụnyere ndị azụmaahịa, ndị ọrụ ugbo kpuru n’agbata Dambo na Ebuchi nke mpaghara Niger Steeti.

    Ụgbọmmiri ahụ bu ndị a na-aga n’ahịa a kpọrọ Katcha bụ nke na-azụkaarị kwa izuụka na Niger Steeti.

    A matabeghi kpọmkwem ihe butere okpukpu ụgbọmmiri ahụ. Ọtụtụ ihe akaebe gosiri na ọtụtụ ndị nọ n’ụgbọmiri ahụ eyighi uwe nchekwa a kpọrọ ‘life jacket’ oge ụgbọ ahụ kpuru.

    Ndị ọrụ gbata gbata ka na-achọ ọtụtụ ndị ọzọ ka tọọrọ n’ime mmiri achọ.

    Gọọmentị Kogi Steeti akpọọla oku ka ndị na-ahụ maka njem ụgbọmmiri gbalịa na-amachi ndị njem na-enweghi ezi nchekwa ime njem na mmiri.

    Ndị nọ n'ụgbọmmiri eme njem

    Ebe foto si, NSEMA

    N’otu aka ahụ, Onyeisi ndị uweojii na Naịjirịa bụ Kayode Egbetokun enyela iwu ka e mee nyocha ma chọpụta ihe mere ụgbọmmiri ahụ jiri kpuo.

    N’ozi si n’aka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Olumuyiwa Adejobi pụta, Egbetokun gwara ndị uweojii ngalaba njem ụgbọmmiri a kpọrọ ‘marine officers’ ka ọ gbaa mbọ chọpụta ihe butere ọdachi ahụ.

    Egbetokun gakwara n’ihu tie ezinaụlọ ndị nwụrụ n’ihe mberede a aka n’obi ma kwee nkwa na-aga azọpụta ndị tọọrọ na mmiri ahụ.

    Nke a ga-abụ ugboro atọ ụdịrị ihe mberede a ga-eme na Naịjirịa n’ịme ọnwa abụọ. N’ọnwa Ọktoba, ụgbọmmiri osisi bu ihe ruru mmadụ 300, kpuru ma mie n’Osimmiri Niger, mmadụ 200 nwụrụ.

    N’izuụka gara aga, mmadụ ise nwụrụ mgbe ụgbọmmiri abụọ sọkọtara isi na Delta Steeti, otu ihe ahụ mekwara n’ọnwa Juun afọ 2023 ma gbuo ihe karịrị mmadụ 100.

    Ime njem n’ụgbọmmiri na Naịjirịa ka bụ ihe gọọmentị anaghị elebara anya nke ọma, nke mere ihe mberede ụgbọmmiri ji bụrụ ihe na-emekaarị mana o nweghi onye na-anata ntaramahụhụ.

  10. Igbo mma mma nụ ooo!

    Unu emeela maka ịnọnyere BBC Igbo kamgbe mbido afọ 2024 rute na Disemba - ọnwa ikpeazụ nke afọ.

    Anyị na-asị ka ị nọsie ike dịka anyị na-apịachi afọ ọma a ma na-ewetere gị akụkọ ndị dị mkpa n'ụwa.

    Ekpere anyị n'isi gị bụ ka ihe ọma niile ị na-achọ n'afọ a rute gị aka tupu ọnwa Disemba a akụrụ ọnụ.

    Daalụ! Ụmụibe.