A nwụchiela mmadụ abụọ maka ebubo ịta Onyeisiala Zambia amoosu

Ebe foto si, Getty Images
Ndị uweojii mba Zambia anwụchiela ụnwoke abụọ maka ebubo ịta Onyeisiala Hakainde Hichilema ammosu.
A nwụchiri ụmụnwoke ahụ aha ha bụ Jasten Mabulesse Candunde na Leonard Phiri na Lusaka, isi obodo Zambia.
Akwụkwọozi ndị uweojii wepụtara kwuru na ọ bụ Nelson Banda nwere ụmụnwoke abụọ ahụ ọrụ iji kpaa nkata jiri ọgwụ meruo Onyeisiala Hichilema ahụ.
Nelson Banda bụ nwanne onyeomeiwu Emmanuel ‘Jay Jay’ Banda onye a nwụchiri n’ọnwa gara aga na Zimbabwe maka ebubo izu ohi, mana ọ gọnarịrị.
Akwụkwọozi ndị uweojii kwuru na ha na-achọ Nelson achọ ugbua.
Ihe e jidere n’aka ụmụnwoke abụọ ahụ gụnyere ọgwụ dị iche iche nakwa anụmanụ ogwumagana. Ha kwuru na Nelson kwere ha nkwa ikwụ ha $73,000 ma ọ bụrụ na ha mezuo atụmatụ ịta Onyeisiala Hichilema amoosu.
E ji ụmụnwoke abụọ nọ n’ụlọ ndị uweojii ebe a na-atụ anya ịkpụpụ ha ụlọikpe n’oge na-adịghị anya.
Ọtụtụ ndị bi na mba Zambia dị na mpaghara ndịda Afrịka kwenyere ma na-atụ egwu amoosu.
















