Ụlọikpe Saụt Korịa enyela iwu ka a nwụchie Yoon Suk-yeol a chụpụrụ dịka Onyeisiala

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Disemba 2024.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Jessica Nwankwo, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere

  1. Ndị gọvanọ Naịjirịa ezutela maka ‘atụmatụ nnwogharị ụtụisi’

    Ndị gọvanọ Naịjirịa ezutela maka ‘atụmatụ nnwogharị ụtụisi’

    Ebe foto si, NGF

    Otu jikọtara ndị gọvanọ Naịjirịa bụ Nigerian Governors’ Forum (NGF) nwere nzukọ abalị n’isi ụlọọrụ ha dị n’Abụja ebe ha nọọrọ kpaa maka isiokwu dị iche iche nke gụnyere atụmatụ nnwogharị ụtụisi.

    Ndị gọvanọ ahụ ewepụtabeghị ozi gbasara ihe ndị ha kpara na nzukọ ahụ mana ụfọdụ akwụkwọ akụkọ dị iche iche kwuru na atụmatụ nnwogharị ụtụisi bụ otu ihe gbara ọkpụrụkpụ ha lebara anya na nzụkọ ahụ.

    Ndị gọvanọ APC iri na ise (15), ndị gọvanọ Labour Party abụọ na otu onye gọvanọ APGA bịara ya bụ ọgbakọ.

    Cheta na ndị gọvanọ iri na itolu (19) sitere mgbago ugwu egosila na ha anabataghị ụfọdụ mpaghara iwu ahụ ma kpọo oku ka ewezuga ya n’ụlọ omeiwu etiti.

  2. Nwa m nwoke tozuru oke ịbụ kọmịshọna - Oshiomhole

    Nwa m nwoke tozuru oke ịbụ kọmịshọna - Oshiomhole

    Ebe foto si, OfficialAPCNG

    Sịnetọ na-anọchite anya Edo North n’ụlọ omeiwu ukwu etiti bụ Adams Oshiomhole ekwuola na nwa ya nwoke bụ Cyril tozuru oke ịbụ Kọmịshọna ahụike Edo steeti.

    Oshiomhole bụbu aka chịrị Edo steeti kwuru nke a dịka ọtụtụ mmadụ na-akatọ ya maka nwa ya nwoke bụ Cyril Oshiomhole, onye aka na-achị steeti ahụ bụ Monday Okpebholo họpụtara dịka Kọmịshọna ahụike n’ọnwa Nọvemba 2024.

    Ọhanaeze akatọọla nhọpụta ahụ ma hụta ya dịka ụzọ Okpebholo jiri chọọ ịkwụghachi Oshiomhole ụgwọ maka enyemaka ya n’oge ntuliaka.

    Mana oge ụlọmgbasaozi Channels TV na-agba ya ajụjụ, Oshiomhole kwuru na o teela aka nwa ya nwoke jiri tozuo oke ijide ọkwa ọchịchị n’Edo steeti.

    E nweela oge Cyril gbara mbọ ịzọ ọkwa onye omeiwu mana nna ya gbochiri ya n’ihi na ọ bụ gọvanọ n’oge ahụ.

    Oshiomhole sịrị na ugbua bụ oge nwa ya nwoke nwere ịtụnye oke ya na mmepe Edo steeti.

  3. Ndị ojiegbe egbuola ndịagha 90 na mba Nije

    Onye agha na mba Nije

    Ebe foto si, ORTN

    Nkọwa foto, Onye agha na mba Nije

    Ndịagha mmadụ 90 nakwa ndị nkịtị ruru mmadụ 40 a nwụọla n’aka ndi ojiegbe na mba Nije.

    Akụkọ na-ekwu na mkpamkpa ahụ kpara mgbe ndị omekome wakporo obodo a na-akpọ Chatoumane na Anzourou dị na mpaghara Tillaberi.

    Mana n’obodo a na-akpọ Chatoumane, ndị omekome ahụ wakporo ndịagha n’ime ọdụ ahịa, nke mere na ndịagha enweghi ike ịnụso ha ọgu maka na ndị nkịtị juru n’ime ahịa.

    Ndị mmadụ kwuru na ndịagha ruru iri itoolu na otu nwụrụ ebe ndị nkịtị ruru iri anọ na atọ so na ndị nwụrụ n’oge ahụ.

    Etu ọnọdụ si dị ugbua, ndị ọchịchị na mba Niger enwebeghị ihe ha kwuru maka mkpamkpa ahụ.

    Mana n’ọnwa Juun ka ndị omekome gburu ndịagha iri abụọ nakwa ndị nkịtị na mba Burkina Faso.

    Cheta na mba Mali na Burkina faso were nkwekọrịta maka nchekwa mba abụọ ahụ ka ha si n'otu Economic Community of West African States (ECOWAS) nwere nwepu onwe ha.

  4. Kemi Badenoch na Shettima enweela tụmsara maka mpụ dị na Naịjirịa

    Kemi Badenoch na Kashim Shettima

    Ebe foto si, Kashim Shettima and EPA

    Nkọwa foto, Kemi Badenoch na Kashim Shettima

    Osote onyeisiala Naịjirịa Kashim Shettima enyela onyeisi otu ndọrọndọrọ ọchịchị na-anọghị n’ọchịchị na mba UK bụ Kemi Badenoch ndụmọdụ gbasara okwu ọ kwuru banyere Naịjịrịa.

    Shettima gwara Kemi ka o wepu “Kemi” n’aha ya ma ọ bụrụ na ihe gbasara Naịjirịa adịghị amasị ya.

    Cheta na abalị ole na ole gara aga, Badenoch kwuru na mpụ karịrị na mba Naịjirịa bụ ebe a mụrụ ya.

    Kwamgbe kwamgbe ka Kemi na-ekwu okwu banyere ọnọdụ nchekwa dị na Naịjirịa na ihe ọ jiri anya ya hụ mgbe ọ bi na mba ahụ dịka obere nwa.

    Okwu ahụ bụ nke osote onyeisiala Kashim Shettima katọrọ ma gaa n'ihu sị ya wezụga onwe ya ma ọ bụrụ na ya enweghị ezi ntụkwasị ọbị na ịhụnanya ebe mba Naịjirịa nọ.

    Mana mgbe a gwara ọnụ na-ekwuru Kemi Badeboch ihe osote onyeisiala Naịjirịa bụ Kashim Shettima kwuru ka ọ sịrị na Kemi “kwụsiri ike na n’ihe o kwuru” banyere mpụ dị na Naịjirịa.

    “Kemi na-ekwu eziokwu. Ọ na-ekwu ya otu ọ dị. Ọ ma nta okwu arụ”.

    A mụrụ Badeboch na Wimbledon dị na mba UK n’afọ 1980.

    Ọ toro na Legọs dị na Naịjirịa nakwa mba Amerika ebe nne ya bụ ọkammụta na mahadum.

    Badeboch lọghachịtere mba Uk oge ọ dị naanị afọ iri na isii ebe ọ gara binyere ọyị nne ya tupu ọ nweta ụlọ nke ya.

  5. Etu e si zọpụta nwata dị afọ 11 abalị atọ ụgbọmmiri ha kpuru

    E ji akwa mkpuchi oyi kpuchie nwata ahụ dịka a zọpụtara ya

    Ebe foto si, Compass Collective

    Nkọwa foto, E ji akwa mkpuchi oyi kpuchie nwata ahụ dịka a zọpụtara ya

    A zọpụtala otu obere nwa nwaanyị dị afọ 11 dịka o jidesiri 'tube tire' ike ma nọọ abalị atọ n'oke osimiiri 'Mediterranean' dịka ụgbọmmiri bu ya na ndị njem ndị ọzọ kpuru.

    Ndị ọrụ gbatagbata si ụlọọrụ abụghị nke gọọmentị a kpọrọ 'Compass Collective' kwuru na ha na-agbaga ịza oku gbatagbata ọzọ a kpọrọ ha oge ha nụrụ mkpu akwa nwata ahụ.

    Nwatakịrị ahụ a kpọghị aha ya, onye Sierra Leone, so na mmadụ 44 si Sfax dị na mba Tunisia zọpụ njem mbiara mbịara ịsi ụzọ azụ ụlo banye Yurop mana ụgbọmmiri ha kpuru.

    A na-eche na ndị ọzọ nile nọ n'ụgbọmmiri ahụ anwụọla.

    Kwa afọ, puku kwuru puku ndị mbịara mbịara na-anwụ dịka ha na-eme njem isi oke osimiri 'Mediterranean' aga mba ndị dị na Yurop.

  6. Ndeewo Igbo ndị ọma!

    Michael Ilediagu, Chinonso Ugorji, Jessica Nwankwo, Uzoamaka Ewuzie na Adline Okere ga na-ewetara unu akụkọ na-ewu kwa mba ụwa niile taata.

    Anyị na-asị gị, ka ụbọchị a wetara gị ihuọma.

  7. A gbachiela ọdọụgbọelu Nnamdi Azikiwe International Airport Abuja maka ụgbọelu gbabara n’ọhịa

    A gbachiela ọdọụgbọelu Nnamdi Azikiwe International Airport Abuja maka ụgbọelu gbabara n’ọhịa

    Ebe foto si, Ministry of Aviation

    Otu ụgbọelu na-ebu ibu agbabala n’ime ọhịa dị n’ọdọụgbọelu Nnamdi Azikiwe International Airport Abụja.

    Ụgbọelu ahụ ndị nwe ya bụ ụlọọrụ Allied Air Cargo nke akara ya bụ 5N-JRT gbapụrụ n’okporo ụgbọelu ma banye n’ọhịa mgbe ọ jiiri ihe dịka nkeji ise gaa elekere iri nke ụtụtụ (10:05am) n’ụbọchị Wenezde 11 Disemba 2024.

    N’ozi Onyeisi ngalaba mgbasaozi bụ Obiageli Orah binyere aka na ya, ọ sịrị “Ụgbọelu Allied Air Cargo mmadụ ise dị n’ime ya nke akara ya bụ 5N-JRT gbapụrụ n’okporo ụgbọelu nke iri abụọ na abụọ dị n’ọdọụgbọelu Nnamdi Azikiwe International Airport Abụja mana e nweghị onye merụrụ ahụ.”

    Ọ sịrị na a napụtara mmadụ ndị ahụ ma kpọgaa ha n’ụlọọgwụ Federal Airport Authority of Nigeria (FAAN) iji lelee ha ahụ ma mara ma ahụ adịkwa ha mma.

    Ka o sinadị, ndị ọrụ gbatagbata nọ n’ogige ahụ ugbua tinyere ndị nnyocha ihe mberede iji hazie ọnọdụ ihe niile ma hụkwa na emepeghachiri ọdọụgbọelu ahụ ngwangwa.

  8. Onyeisiala Tinubu anabatala Onyeisiala mba Germany n'obi ọchịchị dị n'Abuja

    Tinubu na Steinmeier

    Ebe foto si, Getty Images

    Onyeisiala Bola Tinubu anabatala Onyeisiala mba Jamini bụ Frank-Walter Steinmeier n’obi ọchịchị gọọmentị dị n’Abuja n’ụbọchị Wenezde.

    Steinmeier batara na Naịjirịa n’abalị Tuzde n’ọdọụgbọelu dị n’Abuja ebe minista na-ahụ maka isiobodo FCT bụ Nyesom Wike nabatara ya.

    Njem a ọ bịara na Naịjirịa ga-ewe ụbọchị atọ ebe ọ ga-enwe mkparịtaụka na emume dị iche iche. Ọ ga-ezute onyeisiala Naịjirịa ma zutekwa Alieu Omar Touray bụ onyeisi otu jikọtara mba dị n’Ọdịda Anyanwụ Afrịka bụ ECOWAS nakwa ndị ọzọ.

    A na-atụkwa anya na Steinmeier na Tinubu ga-enwe mkparịtaụka banyere mmekọrịta Naịjirịa na mba Jamini.

    Ọ nọchaa n’Abuja, Steinmeier ga-aga na Legọs ebe ya na

  9. Nwaokorobịa ewerela mma sụgbuo nne ya na Bayelsa steeti

    Nwaokorobịa ewerela mma sụgbuo nne ya na Bayelsa steeti

    Ebe foto si, Getty Images

    Nwaokorobịa gbara afọ iri abụọ na abụọ (22) a matara aha ya dịka Godwin, onye obodo Elebele dị n’Okpuru ọchịchị Ogbia na Bayelsa steeti ka a na-ebo ebubo na o ji mma sụgbuo nne ya dịka ọ gbachara ọnyụpa iji ya gwọọ ọgwụ ego.

    Dịka akụkọ siri kọọ, nwaokorobịa ahụ a na-enyo enyo lọghachiri n’obodo ahụ izuụka ole na ole gara aga dịka ọ nọchara ọtụtụ ọnwa na steeti gbara ha agbataobi bụ ebe ọ gara ịmụta ka e si egwu chandum, a maara dịka Yahoo Yahoo maọbụ HK.

    Oge ọ na-akọwa nke a dịka eziokwu, Onyeisioche ndị ntorobịa Elebele bụ Precious Okala gwara ndị ntaakụkọ na a kpọrọ ya mgbe ọ kụrụ elekere isii nke uhuruchi (6pm) n’ụbọchị ahụ ya bụ njinji jiri.

    Ọ sịrị na dịka ọ wụchiri ebe ahụ, ọ hụrụ ozu nwaanyị ahụ ka ọ tọgbọ n’oruru ọbara ya dịka ndị ntorobịa obodo jichiri nwa ya nwoke.

    Okala kwuru na “ndị agbataobi nụrụ mkpọtụ n’ụbọchị ahụ n’etiti Godwin na nne ya ma nụkwa na ọ sụrụ ya mma n’afọ bụ nke butere ọnwụ ya.”

    Ka o sinadị, e nyefeela nwaokorobịa ahụ a na-enyo enyo n’aka ndị uweojii Bayelsa steeti.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Bayelsa steeti bụ Musa Mohammed ekwuola na e nyefeela okwu ahụ n’aka ngalaba ndị uweojii Criminal Investigation Department (CID) maka ime nnyocha miri emi.

  10. Igwe mmadụ anwụọla site n'ọrịa anwụnta bụ ‘dengue fever’ na mpaghara Amerịka

    Dengue fever

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Dengue fever

    Igwe mmadụ na mba dị iche iche na Saụt Amerịka nakwa mba dị n'etiti Amerịka ebutela ọrịa sị n’anwụnta a kpọrọ ‘dengue fever’ dịka ụlọọrụ na-ahụ maka ngalaba ahụike bụ Pan American Health Organisation (Paho) si kwuo.

    Mmadụ ruru nde ịrị abụọ na isii (12.6m) butere ọrịa ahụ ebe mmaọ̄ụ 7,700 nwụrụ maka ya.

    Paho na-ekwu na nke a bụ mbụ ọrịa na-agbasa na mpaghara ụwa ahụ kemgbe o bidoro n’afọ 1980.

    Mba ọrịa ahụ kpụụ ọkụ n’ọnụ bụ ebe ndị mmadụ kachasị nwụọ gunyere Brazịl, Argentina, Kolombia, nakwa Mexico.

    Dengue bụ nje na-esite n’anwụnta bụ nke na-eme mmadụ nnukwu ahụ ọkụ ma gbuo ọtụtụ.

    Ihe e ji ama onye butere ọrịa dengue gunyere oke ahụ ikpo ọkụ, isi ọwụwa, anya ịfụ ụfụ, akwara na-ebe nkeji ọkpụkpụ ịfụ ụfụ na ihe ndị ọzọ.

    Onyeisi ụlọọrụ Paho bụ dọkịnta Jarbas Barbosa na-arịọ ka mba niile nọ na mpaghara Amerika niile gbakọọ aka ọnụ busoo ọrịa ahụ agha ma kwuo na ọ bụ ụmụaka ka ọrịa ahụ kachasị egbu.

    Na Guatamala, mmadụ pasenti iri asaa butere ọrịa ahụ bụ ụmụaka, mana ọtụ n’ime mmadụ atọ butere ya na Mexico, Costa Rica na Paraguay bụ ụmụaka na-erubeghị afọ iri na ise.

  11. Ndị uweojii na Saụt Korịa awakpoola ụlọọrụ Onyeisiala Yoon Suk Yeol

    Yoon Suk Yeol, Onyeisiala mba Saụt Afrịka

    Ebe foto si, Reuters

    Ndị uweojii na Saụt Korịa awakpoola ụlọọrụ Onyeisiala mba ha bụ Yoon Suk Yeol dị na Seoul, site n’atụmatụ ya inyefe ndịagha ọchịchị bụ nke kụrụ afọ n’ala.

    Mwakpo a bụ ihe kachasị ọhụrụ mere kamgbe akụkọ banyere ọchịchị mba Saụt Korịa malitere iwu n’izuụka a.

    Onyeisiala Yoon gbara isi akwara nọgide n’ọchịchị na-agbanyeghi vootu a tụrụ ka achụpụ ya nakwa oku ndị mmadụ na-akpọ ka ọ rịtuo n’ọkwa.

    O nwere ọtụtụ nnyocha a na-eme ya site na ngalaba gọọmentị dị iche iche maka ebubo mpụ na ibuso gọọmentị agha.

    N’aka nke ọzọ, onye bụbu minista nchekwa na mba Kin Yong-hyun weere ọnọdụ na nkwupụta ọchịchị ndịagha nwara ka ọ kwụọ ụdọ dịka ọ nọ n’ebe e ji ya n’abalị Tuzde.

    Ka ọ dị ugbua, Kim nọ n’ime ụlọ ebe e ji ya eji mana “o nweghi nsogbu ahụike ọbụla”, ka ministri ahụ gwara ndị omeiwu.

    A nwụchiri ya n’ụbọchị Sọnde.

    Ọtụtụ ndị ọrụ gọọmentị ha na Yoon rụkọọrọ ọrụ agbaala arụkwaghịm n’ihi atụmatụ inyefe ndịagha ọchịchị.

    Mba ahụ ugbua nọ n’ọnọdụ gbagharịa na ndọrọ ndọro ọchịchị.

    Odoghi anya ma Yoon ọ ka nwere ikike, ndị na-eme ngagharịiwe ka juru n’okporoụzọ na-akpọ oku ka ha rituo n’ọkwa.

  12. Igbo mụrụ nze mụọ ọzọ, unu abọọla chi?

    Onye a hụrụ ụbọchị gara aga ka a hụkwa ya taa.

    Anyị na-anabata unu n'ọgbakọ BBC Igbo bụ ebe anyị na-ewetere unu akụkọ ndị gbara ọkpụrụkpụ n'ụwa.

    Nọnyere anyị n'uju taa.

  13. Gọvanọ Alex Otti agụpụtala ma nyefee ụlọ omeiwu Abịa steeti ‘bọjet’ 750bn

    Gọvanọ Alex Otti agụpụtala ma nyefee ụlọ omeiwu Abịa steeti ‘bọjet’ 750bn

    Ebe foto si, Getty Images

    Aka na-achị Abịa steeti bụ Alex Otti agụpụtala ma nyefee ụlọ omeiwu steeti ahụ atụmatụ mkpata na mmefu ego afọ 2025.

    Ọ bụ n’ụbọchị Tuzde 10 Disemba 2024 ka ọ gụpụtara bọjet ahụ ọnụego ya dị narị ijeri naịra asaa na iri ise (750bn).

    Otti kwuru na bọjet ahụ ga-eleba anya n’ọrụ okporoụzọ, ụlọọgwụ ebe a na-azụ ndị ọrụ ahụike, ịrụzigharị ụlọọgwụ ọhanaeze anọ na ịkwaju ha akụrụngwa ha ji arụ ọrụ, nakwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ.

    Gọvanọ Alex Otti agụpụtala ma nyefee ụlọ omeiwu Abịa steeti ‘bọjet’ 750bn

    Ebe foto si, Getty Images

  14. Onyeisiala Tinubu ahọpụtala Babatunde Ogunjimi dịka nnukwu onye ọgụkọego Naịjirịa

    Babatunde Shamseldeen Ogunjimi

    Ebe foto si, Bayo Onanuga/X

    Nkọwa foto, Babatunde Shamseldeen Ogunjimi

    Onyeisiala Bola Tinubu ahọpụtala Babatunde Shamseldeen Ogunjimi dịka nnukwu onye ọgụkọego Naịjirịa (Accountant General of the Federation) AGF.

    Ọnụ na-ekwuru Onyeisiala bụ Bayo Onanuga kwuputara nke a ụbọchị Tuzde, Disemba 10 ma kwuo na Ogunjimi ga-amalite ọrụ ozugbo n’ihi na onye bụ nnukwu onye ọgụkọego Naịjirịa ugbua bụ Oluwatoyin Sakirat Madein anaala ezumike nka.

    Onyeisiala Tinubu kpọrọ oku ka e nwee ezi nyefe akụrụngwa ọrụ iji hụ na Ogunjimi malitere ọrụ iji kwado atụmatụ akụnaụba gọọmenti etiti nwere.

    Onyeisiala Tinubu kwuru na o nwere olileanya na Babatunde Ogunjimi ga-enweta mgbanwe n’ọkwa ọhụrụ a. Ogunjimi arụọla ọrụ dịka onyeisi n’ụlọọrụ AGF nakwa onyeisi ego na mịnịstrị na-ahụ maka mmekọ mba ofesi.

  15. Ụlọikpe amachiela Edgar Lungu ịzọ ọkwa Onyeisiala mba Zambia ọzọ

    Edgar Lungu

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Edgar Lungu

    Ụlọikpe ukwu mba Zambia amachiela ony bụbu Onyeisiala bụ Edgar Lungu ịzọ ọkwa Onyeisiala na ntuliaka afọ 2026.

    Ụlọikpe ahụ kwuru na Lungu gbara afọ 68, achịaala ugboro abụọ nke iwu mba Zambia kwuru.

    Cheta na a họpụtara Lungu dịka Onyeisiala n’afọ 2015 ka ọ chịtọpụ ọnwa iri abụọ fụdụrụ n’ọchịchị Onyeisiala Michael Sata nwụrụ n’ọkwa n’ọnwa Ọktoba 2014.

    Lungu kwuru na ụlọikpe ekwesighị ịgụnye ọnwa iri abụọ ahụ maka ọ nọghị n’ọkwa ruo afọ ise iwu mba Zambia kwuru mana ụlọikpe ekwetaghị ma nye iwu ka a tụgharịa ikpe ụlọikpe nyere Lungu ikike ịzọ ọkwa onyeisiala n’afọ atọ gara aga oge Hakainde Hichilema meriri ya.

    Ụlọikpe ukwu ahụ kwuru na “Ka ọ dị ugbua, Lungu achịala ugboro abụọ dịka Onyeisiala, iwu mba Zambia gbochiri ya ịzọ ọkwa Onyeisiala ọzọ”.

    N’ọnwa gara aga, Lungu gara zụrụ akwụkwọ iji zọọ ọkwa Onyeisiala na pati Tonse Alliance maka ntuliaka afọ 2026.

  16. Ndị ndu Naịjirịa mere nrụrụaka kwesịrị ka a tụọ ha nga - Peter Obi

    Ndị ndu Naịjirịa mere nrụrụaka kwesịrị ka a tụọ ha nga - Peter Obi

    Ebe foto si, Peter Obi/X

    Onye jiri aha Labour Party zọọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka 2023 bụ Peter obi ekwuola na ndị ndu Naịjirịa a chọpụtara na aka ha dị na nrụrụaka kwesịrị ka e nye ha ntaramaahụhụ kwesịrị ekwesị.

    Obi kwuputara nke a n’ozi o bipụtara n’ụbọchị Tuzde 10 Disemba 2024 iji cheta ụbọchị e ji ebu agha megide nrụrụaka na mbaụwa.

    Dịka o siri kwuo, nrụrụaka abamiela n’ogogo ọchịchị Naịjirịa niile kemgbe ọtụtụ afọ.

    O kwuru na Naịjirịa ahụtala onwe ya n’ajọ ọnọdụ akụnaụba n’ihi ụgwọ ndị ha ji nke ihe kpatara ya bụ ọtụtụ ego gọọmenti na-agbaziri.

    “Onye nke 145 Naịjirịa na-agba n’ime mba 180 na-eme nrụrụaka egosila etu nrụrụaka siri metụta Naịjirịa n’ebe ọ dị ukwuu. E kwesịrị ibu agha megide nke a ọ bụrụ ma anyị chọrọ ịga n’ihu,” ka Peter Obi kwuru.

    Ọ gbakwunyere na Naịjirịa so n’ime mba iri na otu (11) dị n’Afrịka ndị na-ahụsi anya n’ihi ọchịchị ọjọọ n’ime afọ iri (10) gara aga.

    Dịka Obi siri kwuo, ọnọdụ dị etu a agaala n’ihu na-egbochi ọganihu Naịjirịa.

  17. NLC Ebonyi steeti akwụsịla abụbọ ọrụ ha gbara maka ụgwọọnwa opekatampe ọhụrụ

    Nwoke ji ọkọlọtọ NLC

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Nwoke ji ọkọlọtọ NLC

    Otu Nigeria Labour Congress (NLC) na Trade Union Congress (TUC) n’Ebonyi steeti akwụsịla abụbọ ọrụ ha gbara ụbọchị Mọnde 2 Disemba, 2024, maka na gọọmenti steeti ahụ akwụghị ha ụgwọọnwa opekatampe ọhụrụ N70,000.

    Ndị isi NLC na steeti ahụ kwuru na ha kpebiri ịkwụsị abụbọ ọrụ ahụ ka mechara ọgbakọ.

    Ha kwuru na gọọmenti Gọvanọ Francis Nwifuru egosịla na ọ chọrọ ka ha na ya nwee nkwekọrịta banyere okwu ụgwọọnwa opekatampe ọhụrụ maka ndị ọrụ Ebonyi steeti.

    NLC Ebonyi steeti kelere ndị ọrụ steeti ahụ ma gwa ha ka ha laghachi n’ọrụ ha dị iche iche dịka ha na gọọmenti na-aga n’ihu inwe ọgbakọ iji hụ na ndị ọrụ Ebonyi steeti nwetara ihe ruru ha.

  18. Aka akparala Luigi Mangione n'ebubo igbu onyeisi otu ụlọọrụ ahụike n'Amerịka

    Luigi Mangione dị afọ iri abụọ na isii

    E bola otu nwoke dị afọ 26 ebubo iji egbe gbagbuo Brian Thompson bụ onyeisi ụlọọrụ ahụike a kpọrọ UnitedHealthcare n’obodo New York mba Amerịka n’izuụka gara aga.

    A kpaarala nwamadị a bụ Luigi Mangione n’otu ụlọ oriri dị n’obodo Altoona steetị Pennsylvania n’ụbọchị Mọnde dịka otu onye bịara iri nri matara onye ọ bụ.

    A hụrụ egbe n’aka nwamadị a si n’otu ezinaụlọ a ma ama na Maryland, a hụkwara otu akwụkwọ e ji aka dee ihe nke gosiri “mkpalite mmụọ na echiche obi” dịka ndị uweojii si kwuo.

    A kpụpụrụ Mangione n’ụlọikpe dị na Pennsylvania ebe e boro ya ọnụ ebubo ise ma jụụ ịgbapụta ya.

    Dịka elekere ole na ole gachara, ndị na-eme nnyocha na New York boro Mangione ebubo igbu mmadụ nakwa ebubo anọ ndị ọzọ.

    Nwamadị a Mangione gburu bụ Thompson dị afọ 50 ka a gbachara egbe n’ụbọchị Wenezde n’ihu ụlọ ndina a kpọro Hilton n’etiti obodo Manhattan ebe ụlọọrụ ya na-enwe ọgbakọ ndị oji ego achụ nta ego.

    Ndị uweojii kwuru na e gburu ya n’ụzọ a haziri ọfụma ma tụọ arọ ya.

  19. Igbo ndị ọma ndewo nụ!

    Anyị na-anabata gị n'ọgbakọ BBC Igbo n'ụbọchị taa.

    Biko nọnyere anyị maka akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ụwa gbaa gburu gburu.

  20. Ụlọikpe enyela Dele Farotimi ntọhapụ beelu

    Dele Farotimi

    Ebe foto si, Dele Farotimi/Instagram

    Nkọwa foto, Dele Farotimi

    Ụlọikpe ukwu dị n’Ado-Ekiti isi obodo Ekiti steeti, enyela Dele Farotimi ntọhapụ beelu.

    E nyere ya ntọhapụ beelu n’ụtụtụ Mọnde 9, Disemba 2024 ma gwa ya kwụọ nde naịra iri ise (N50 million) ma nweta onye njide aka nwere ala ga-akwụrụ dị ka ihe nkwekọrịta.

    Omoyele Sowore ji aha pati African Action Congress (AAC) zọọ ọkwa Onyeisiala na ntuliaka afọ 2023 mere ka a mata mpkebi ụlọikpe a n’akara soshal midia X.

    Ọkaiwu Dele Farotimi bụ Festus Emiri kwuru na ihe ndị ọzọ ụlọikpe gwara ha ka ha mee iji nweta ntọhapụ beelu ahụ bụ na onye njide aka ahụ ga-abụ onye bi n’Ekiti steeti ma bụrụkwa onye nwere akwụkwọ na-egosi na ọ kwụla ụgwọ ụtụisi ala ruo afọ atọ.

    Ụlọikpe ahụ kwuru na onye ahụ ga-enye ụlọikpe akwụkwọ gosịrị na ọ bụ nwe ala ahụ nakwa ihe ndị ọzọ ebe a gwara Dele Farotimi ka o nye ụlọikpe akụwkwọ ikike ime njem ya.