Ụlọikpe Saụt Korịa enyela iwu ka a nwụchie Yoon Suk-yeol a chụpụrụ dịka Onyeisiala

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Disemba 2024.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Jessica Nwankwo, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere

  1. Amnesty International eboola ndịagha Naịjirịa ebubo igbu mmadụ 10,000

    Amnesty International eboola ndịagha Naịjirịa ebubo igbu mmadụ 10,000

    Ebe foto si, AMNESTY INTERNATIONAL

    Otu na-ahụ maka ikike mmadụ bụ Amnesty International eboola ebubo na ndịagha Naịjirịa egbuola ihe ruru mmadụ puku iri (10,000) kemgbe ha malitere ibuso ndị Boko Haram agha.

    Onyendu Armnesty International na Naịjirịa bụ Isa Sanusi kwuputara nke a n’ọgbakọ ya na ndị ntaakụkọ nwere n’isi obodo Borno steeti bụ Maiduguri.

    O bokwara ndị Boko Haram na ndịagha ebubo imetọ ikike ruuru mmadụ na mpaghara ugwu Naịjirịa.

    Dịka o siri kwuo, ndịagha na-emetọ ikike ruuru mmadụ dịka ha na-arụ ọrụ ha na mpaghara ugwu.

    Ọ gbarụrụ ihu gbasara etu ndịagha siri gọpụ onwe ha oge Armnesty International gosiri ha nchọpụta ha mere tupu ewepụta ya n’ihu ọhanaeze.

    Sanusi kwuru na ndị otu ahụ agbaala akwụkwọ n’Ụlọikpe mbaụwa bụ International Court of Justice dị na Hague gbasara ebubo ịmetọ ikike mmadụ na mpaghara north east nke Naịjirịa.

    Na nzaghachi, isi ụlọorụ ndịagha Naịjirịa kọwara ebubo ahụ dịka nke na-atụ n’anya nakwa nke enweghị ebe ọ dabara.

    Ha kwuputara nke a site n’ozi Onyeisi mgbasaozi ha bụ Major General Edward Buba wepụtara n’ụbọchị Fraịde 6 Disemba 2024.

    Ha kpọrọ ụlọọrụ Amnesty International oku ka ha bịa n’ụlọorụ ha kọwapụta ebubo ha nke ọma.

  2. Onyeisiala Saụt Korịa ekwuola na ya agaghị arịọ ndị omeiwu biko

    Ndị ọchịchị mba Saụt Korịa

    Ebe foto si, BBC/Jake Kwon

    Nkọwa foto, Ndị ọchịchị mba Saụt Korịa

    Akụkọ si n’ụlọọrụ Onyeisiala mba Saụt Korịa bụ Yoon Suk Yeol na-akọwa na ọ gbanweela obi ya ma kwuo na ya agaghị arịọ ndị omeiwu biko n'agabnyeghị na ha chọrọ iwepu ya n’oche dịka onyeisiala.

    N’aka nke ọzọ, Han Dong-hoon bụ onyeisi otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-achị mba Saụt Korịa zutere Onyeisiala Yoon Suk Yeol n’isi ụtụtụ taa bụ Fraịde 6 Disemba, 2024.

    Han Dong-hoon jiri ohere ahụ dụọ Onyeisiala Yoon ndụmọdụ ma gwa ya ka o gwa ụmụamaala mba ahụ okwu kọwara ha etu ọnọdụ ọchịchị sị dị ugbua.

    Cheta na Onyeisiala Yoon ekwubeghi okwu kemgbe ọ gbanwere obi ya n'iwu inyefe ọchịchị n’aka ndịagha mba Saụt Korịa.

    Mana Yoon kwuru na oge erubeghi mgbe ya ga-esigara ụmụamaala mba Saụt Korịa okwu.

    Etu ọnọdụ sị dị ugbua, a machịrị ndị ọchịagha mmadụ iri ime njem mba ofesi maka etu ha siri kpaa agwa mgbe Onyeisiala Yoon nyere iwu ka ndịagha nwere ọchịchị.

  3. Lee ihe ndị ị ga-eme maka nchekwa obodo - Ndị uweojii Anambra steeti

    Lee ihe ndị ị ga-eme maka nchekwa obodo - Ndị uweojii Anambra steeti

    Ebe foto si, Getty Images

    Dịka otu akụkụ mbọ ha na-agba ịkwalite nchekwa na udo n’Anambra steeti, ndị uweojii ekwuputala ihe ndị e kwesịrị ime tụmadị n’oge a Ekeresimesi na-abịaru nso.

    Nke a dị n’ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenga wepụtara n’ụbọchị Tọzde 5 Disemba 2024.

    Ọkpụrụkpụ ihe anọ ndị uweojii kwuru ndị mmadụ ga-eme gụnyere:

    • Onye ebukwala ụgbọala anaghị ahụ ndị nọ n’ime ya anya: Ndị uweojii kwuru na ha agaghị anabata ka mmadụ ọbụla buru ụgbọala anaghị ahụ ndị nọ n’ime ya anya ewezuga ma ọ dị mkpa. Nke a bụ n’ihi na ndị ekperima na-eji ụdị ụgbọala ahụ awakpo ndị nchekwa na steeti ahụ.
    • Kpachapụ anya maka ihe ndị na-agba ọkụ: Ndị uweojii na-adọ onye niile aka na ntị ka ha zere ihe ndị nwere ike ibute ọkụ ọgbụgba ọkachasị dịka a na-abanye n’oge ụgụrụ.Dịka ha siri kwuo, ihe ndị a gụnyere ịgba ọhịa ọkụ aghara aghara, ịtụsa osisi sịga a ṅụfọrọ aṅụfọ aghara aghara, amaghị ka e si eji ihe ndị ji ikikere ọkụ latrik arụ ọrụ eme ihe nakwa ihe ndị ọzọ. Ha kwukwara na amachiela ịgba ihe ọgbụgba bụ ‘knockout’ na steeti ahụ n’oge Ekeresimesi na afọ ọhụrụ n’ihi na o na-etinye ụjọ n’obi ndị mmadụ ma na-ebutekwa ihe ọghọm ndị ọzọ dị iche iche.
    • Wepụ aka n’iti onye dara iwu ihe: Ndị uweojii na-agwa mmadụ niile ka ha wepụ aka n’igbu maọbụ iti onye dara iwu ihe a na-akpọ ‘jungle justice’ n’olu Bekee. Ha dọrọ aka na ntị kwuo ka akpọgaa onye ọbụla a na-enyo enyo dara iwu n’ụlọọrụ ndị uweojii ọbụla dị ha nso.
    • Ndị ọkwọụgbọala rube isi n’iwu okporoụzọ: Ụlọọrụ ndị uweojii ahụ nyere ndị na-akwọ ụgbọala ndụmọdụ ka ha gbaa mbọ na-erube isi n’iwu okporoụzọ oge niile.
    Lee ihe ndị ị ga-eme maka nchekwa obodo

    Ebe foto si, Getty Images

  4. Ụmụagbọghọ Sweden na-akwụsị ọrụ, nọrọ n’ụlọ maka ịmaaka “soft girl”

    Vilma Larsson

    Ebe foto si, Vilma Larsson

    Nkọwa foto, Vilma Larsson

    N’ịmaaka ọhụrụ na-ewu ewu na mba Sweden, ụmụnwanyị lụrụ di ma ọ bụ ndị nwere ọyị nwoke na-akwụsị ọrụ ha ma nọrọ n’ụlọ.

    Nke a bụ ihe ọhụrụ na-ewuru ndị na-eto eto na soshal midịa na mba ahụ.

    Nwaada Vilma Larsson dị afọ iri abụọ na ise na-aru ọrụ n’ọlọọrụ dị icheiche ma ebe a na-arụpụta ihe mana ọ kwụsịrị ọrụ ya kemgbe otu afọ gara aga ma kwuo na kemgbe ahụ ka ya bidoro na-enwe obiụtọ.

    “Ndụ m dị mfe ugbua. Anaghị m enwe mgbakasị ahụ. Adịghị m enwe ike ọgwụgwụ na ndọkasị ahụ”.

    Ka enyi nwoke Vilma Larsson na na-arụ ọrụ, naanị ihe Vilma na-eme bụ ịga ebe a na-akpụ ụzụ, na-esi nri ma na-aga ebe a ga aṅụ kọfị.

    Vilma na enyi ya nwoke na enwe aṅụrị ma na-aga ebe dị icheiche na Cyprus.

    Ọ sị na enyi ya na-akwụ ya ụgwọ ọnwa ma kọwaa na ya na-eji soshal mịdịa dị ka Instagram, Youtube na tiktok nwere na-egosi ka ya si ebi ndụ ọhụrụ ma na-akpọ onwe ya ‘soft girl’.

    Ms Göransson kọwara ihe ndị a mụrụ site na afọ 1997 ruo 2012 na-ekiri na soshal mịdịa nwere mgbanwe ọ na-eme na ndụ ha.

    Mana ọ bụrụ na ọ bụ ihe nkiri na akwado oriri na nkwari karịa ọrụ ka ndị a na-ekiri mara na nke ahụ ga eso mgbanwe ka ha si akpa agwa.

    Ms Göransson “ịrụ ọrụ adịghịzị apụta nke ọma n’ihe nkiri a na-ahụ na soshal mịdịa ugbua, ọ bụ mmadụ ichekwa onwe ya na ahụ mmadụ ịdị mma ka ha na-ahụkarị”.

    Onye na ahụ maka akụnụba bụ Shoka Ahrman kwuru na ya ekweteghị na igwe ụmụnwanyị na mba ahụ ga-akwụsị ọrụ ha ruo mee ka ọ metuta ọnọdụ akụnụba ha.

  5. A gbagbuola onye na-akwado otu egwu bọolụ Arsenal oge ha meriri Manchester United

    A gbagbuola onye na-akwado otu egwu bọolụ Arsenal oge ha meriri Manchester United

    Ebe foto si, Farish Magembe

    Onye ọrụ nchekwa agbagbuola nwaokorobịa na-akwado otu egwu bọọlụ Arsenal na Yuganda oge ọ na-aṅụrị ọṅụ maka mmeri ha meriri Manchester United.

    Onye ọzọ nwetakwara mmerụahụ oge onye ọrụ nchekwa ahụ gbara egbe aghara aghara n’ebe igwe mmadụ na-ekiri egwuruegwu bọọlụ na Lusaka dị na mba Yuganda.

    Njinji ahụ jiri oge egwuruegwu bọọlụ ahụ na-akwado ịkụrụ ọnụ n’abalị Wenezde 4 Disemba 2024.

    Onye ntaakụkọ bi n’obodo ahụ gwara BBC na onye na-elekọta ụlọ oriri a nọ na-ekiri egwuruegwu bọọlụ ahụ gara kpọọ ya bụ onye ọrụ nchekwa ka ọ bịa nyere ya aka n’ihi nnukwu mkpọtụ ndị nkwado otu egwu bọọlụ ndị ahụ na-eme mana ha egeghị ntị n’ịdọ aka na ntị e nyere ha ka ha dere duu.

    Onye nọ ebe ahụ oge o mere gwara ndị ntaakụkọ na onye nwe ụlọ oriri ahụ gara gbanyụọ igwe ọkụ e ji na-ekiri egwuruegwu bọọlụ ahụ dịka nke ahụ kpasuru ndị mmadụ iwe ma mee ka ha malite ime mkpọtụ karịa.

    Ọ bụzi oge ahụ ka ya bụ onye nche malitere ịgbapụ mgbọ aghara aghara.

    Nwokorobịa ahụ gbara afọ iri atọ (30) a matara aha ya dịka John Ssenyonga nwụrụ ozugbo mgbọ tụtara ya dịka e bugara onye nke ọzọ na-akwado Arsenal aha ya bụ Lawrence Mugejera ụlọogwụ maka ọgwụgwọ.

    Ka o sinadị, onye nche ahụ na onye nwe ụlọ oriri eriela mbọmbọ kemgbe njinji ahụ jichara dịka ndị uweojii nọ ugbua na-achọ ha.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na mpaghara ahụ bụ Twaha Kasirye sịrị na ndị uweojii chọtara egbe n’ogige ebe ahụ e gburu mmadụ.

  6. Praịm Mịnịsta mba France bụ Barnier agbaala arụkwaghịm

    Michel Barnier

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Michel Barnier

    A na-atụ anya na onyeisiala mba France bụ Emmanuel Macron ga-agwa ụmụ amaala mba ahụ okwu dịka Praịm mịnịsta ha bụ Michel Barnier gbara arụkwaghịm.

    Ọchịchị Barnier dịka praịm mịnịsta bịara n’isi njedebe mgbe ndị omeiwu mere ntuliaka gbasara iwepu ya n’ọkwa, bụ nke ọtụtụ ndị omeiwu kwadoro ma nwepu ya.

    Cheta na nke a na-eme n’ọnwa atọ onyeisiala mba France bụ Emmanuel Macron họpụtara Michel Barnier dịka praịm mịnịsta mba ahụ.

    Ihe butere nsogbu e jiri nwepu Barnier n’ọkwa ọchịchị bụ mgbe ọ jiri ikike ọ nwere dịka praịm mịnịsta nwere mee ka mmefe ego ụlọọrụ ya bụrụ iwu n’agbanyeghi na ndị omeiwu ebinyeghi aka na ya.

    Ndị omeiwu ruru 331 binyere aka na vootu iwepu Barnier n’ọkwa ọchịchị mana iwu kwuru na ọ bụ naanị vootu ndị omeiwu mmadụ 288 kwesiri iwepu ya n’oche.

    Ha nyere Barnier ohere itinye akwụkwọ arụkwaghịm ma kagbuo mmefe ego ụlọọrụ ya ahụ bụ nke na-ese okwu.

    Dịka iwu mba France si dị, arụkwaghịm Michel Barnier gbara emetutaghi ọkwa ọchịchị Emmanuel Macron dịka Onyeisiala mba France.

  7. Ọrịa ụkwara si n'ikuku a maghị aha ya egbuola mmadụ 76 na mba DR Congo

    Onye ọrụ ahụike

    Ebe foto si, AFP

    Nkọwa foto, Onye ọrụ ahụike

    Ihe ruru mmadụ iri asaa na itoolu (79) anwụọla na mba DR Congo ka ha butere ọrịa ụkwara si n'ikuku a maghị aha ya na mpaghara ndịda-ọdịda anyanwụ na mba ahụ.

    Mịnịstrị na-ahụ maka ahụike na mba DR Congo kwuru na ndị nwụrụ n’ọrịa ahụ nọ n’etiti afọ iri ise na afọ iri na asatọ.

    Ihe ruru mmadụ narị atọ (300) butere ọrịa ahụ.

    Ihe e ji amara onye butere ya gunyere ahụ ikpo ọkụ, isi ọwụwa, ụkwara, imi mpuchị na iku ume ịhịa-ahụ na ihe ndị ọzọ.

    E zigala ndị ọrụ gbatagbata ka ha ga mara ihe na-eme na mpaghara Kwango bụ ebe ọrịa ahụ kpụ ọkụ n’ọnụ.

    Cephorien Manzanza bụ otu onyeisi ndị ọrụ gwara ụlọọrụ mgbasaozi Reuters na ụjọ na-atụ ha maka mmadụ ole nwereike ibute ọrịa ahụ dịka ọnụ ọgụgụ ndị bu ya si arị elu.

    Onye ọrụ otu ahụike nke mba ụwa bụ World Health Organisation (WHO) n’Afrika gwara BBC na ha ezigala ndị ọrụ ha n’ime obodo ebe ọrịa ahụ bidoro.

    Onye omeiwu na mba ahụ kwuru na ndị mmadụ bidoro na-ada n’ọrịa ma na anwụ bido n’abalị iri ruo na abalị iri abụọ na ise nke ọnwa Nọvemba afọ a.

    O kwuru na “ụlọọgwụ Panzi enweghizi ọgwụ ilekọta ndị dara n’ọrịa a. Anyị na-arịọ ka e nyere anyị aka”. Cheta na DR Congo ataala ahụhụ kemgbe ọnwa Jenuwarị maka ọrịa mpox bụ nke mmadụ ruru 14,500 butere ya n’etiti ọnwa Januwarị ruo Juli afọ a.

    Ọzọ, n’ihe na-erubeghị otu afọ ka DR Congo takwara ahụhụ n’aka ọrịa ebola.

  8. Ndeewo nu ndị Igbo!

    Ka ụbọchị taa gaziere unu nke ọma ka anyị si ewetara unu akụkọ si na mba ụwa niile.

  9. Ndị Ọkaiwu Donald Trump chọrọ ka ụlọikpe kagbuo ikpe a mara ya

    Ndị Ọkaiwu Trump chọrọ ka ụlọikpe kagbuo ikpe a mara ya

    Ebe foto si, Getty Images

    Ọkaiwu na-ekwuchite ọnụ Donald Trump ezigaala akwụkwọ ha ji arịọ ka akagbuo mkpebi ụlọikpe mere maka nwaamadị ahụ a họpụtara dịka onyeisiala ọhụrụ Amerịka.

    A na-ebo Donald Trump ebubo iri ngarị tupu ahọpụtagharịa ya dịka onyeisiala Amerịka.

    Onyendu ndị Ọkaiwu Trump bụ Todd Blanche sịrị na ọ bụrụ na ụlọikpe adaa mba ịkagbu mkpebi ahụ ha nwere na ọ ga-emetụta atụmatụ Trump iweghara ọchịchị.

    Ọ kwukwara na ọ ga-egbochi ya ịlekọta ihe dum gbasara gọọmenti Amerịka.

    N’ọnwa Mee, ụlọikpe chọpụtara na Trump tinyere aka n’akwụkwọ adịgboroja iji kpuchie ụgwọ ọ kwụrụ nwaanyị a ma ama na-emepụta onyonyoo ndị gba ọtọ.

    Ebubo ahụ bụ nke ntaramaahụhụ ya bụ mkpọrọ afọ anọ.

  10. Onye dibia gwọrọ 'ọdeshi' ewerela egbe merụọ onwe ya ahụ

    Onye dibia gbara onwe ya egbe

    Ebe foto si, FCT Police command

    Ndị uweojii n’Abuja ekwuola na otu nwoke dibia a kpọrọ Ismail Usman ji ebe gbapuo onwe ya afọ dịka ọ na-anwale ọgwụ ọdeshi ọ gwọrọ.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n’Abuja bụ Josepgine Adeh kwuru na nwetere banyere nke a n’ụbọchị 23 Nọvemba, 2023 n’obodo Kuchibuyi.

    Ngwa ngwa ndị uweojii wụchiri n’ebe ahụ, ha buuru Usman gawa n’ụlọọgwụ ebe ọ na-anata ọgwụgwọ.

    Mgbe e nnyochara ụlọ ya, ahụrụ egbe na mgbọ nakwa ọtụtụ ọtụmọkpọ ọgwụ dị iche iche, dịka ha kwuru na a ga-akpụpụ ya n’ụlọkpe maka ibu egbe n’ụzọ iwu na-akwadoghi.

    Kọmishọna ndị uweojii n’Abuja bụ Olatunji Disu nyere ndị mmadụ ndụmọdụ ka ha gbachapụ n’ihe ọbụla ha na-eme.

  11. A malitela atụmatụ ichutu Onyeisiala mba Saụt Korịa n’ọkwa ọchịchị

    Ndị omeiwu na mba Saụt Korịa

    Ebe foto si, EPA

    Ndị omeiwu na-agba gọọmenti ụkwụ na Saụt korịa amalitela atụmatụ ichutu Yoon Suk Yeol bụ Onyeisiala mba ha n’ọkwa ọchịchị.

    Nke a bụ ihe ọhụrụ na-eme ugbua kamgbe onyeisiala mba ahụ bụ Yoon Suk Yeol manyere ọchịchị ndịagha.

    Ndị omeiwu na-anọghị n'ọchịchị ya jirị awa atọ wee kwụsị atụmatụ ndịagha iwere ọchịchị.

    Mana ndị omeiwu ka ga-eme ntuliaka ma tulee atụmatụ ichutu Yoon Suk Yeol n’ọkwa.

    Cheta n’afọ 2022 ka Yoon banyere n’ọkwa dịka onyeisiala ma bụrụ onye a ma ama na ndọrọ ndọrọ ọchịchị oge ọ bụ onye na-ekpe ọha ikpe.

    A maara ya nke ọma oge o kpere onye bụbụ Onyeisiala mba ahụ bụ Park Geun-hye ikpe ma wepu ya n’ọkwa n’afọ 2016 maka ebubo mpụ.

    Kemgbe Yoon banyere n’ọkwa dịka Onyeisiala, a na-enyo ọchịchị ya enyo dịka ihe jupụtara na mpụ.

    Nke a so n’ihe mere na gọọmenti ya nọ n'ọchịchị abụghị ihe igwe mmadụ na-akwado na mba ahụ.

  12. Mba Namibia ahọpụtala nwaanyị mbụ dịka onyeisiala ha

    Netumbo Nandi-Ndaitwah, nwaanyị mbụ bụ onyeisiala na mba Namibia

    Ebe foto si, Reuters

    Netumbo Nandi-Ndaitwah si n’otu South West African People’s Organisation (Swapo) nọ n’ọchịchị abụrụla nwaanyị mbụ a họpụtara dịka onyeisiala mba Namibia na ntuliaka were otu izuụka.

    Ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka kwuru na o nwetere vootu karịrị pasentị 57% iji merie ebe onye na-ama ya aka bụ Panduleni Itula nwetere naanị pasentị 26%.

    Site na nsogbu ime njem nakwa agbakwụnye ụbọchị atọ n’oge ntuliaka ahụ n’ụfọdụ ebe, Itula nọọrọ na Satọde kwuo na pati ya agaghị anabata mpụtara ntuliaka ahụ ma boo ebubo na e nwere nrụrụaka.

    N’ihi nke a, ọtụtụ pati ndị na-anọghị n’ọchịchị gbahapụrụ ọgbọ ebe a na-akpọpụta mpụtara ntuliaka ahụ na mgbede Tuzde dịka akwụkwọ ntaakụkọ Namibia si kwuo.

    “Mba Namibia atụọla vootu maka udo na nguzosike”, ụlọọrụ ntaakụkọ Reuters sị na Nandi-Ndaitwah kwuru nke a dịka a kpọpụtachara mmeri ya.

    Pati Swapo anọọla n’ọkwa ọchịchị na Namibia kamgbe afọ 1990 rute ugbua.

    Nandi-Ndaitwah ji ọkwa osote Onyeisiala ugbua bụ onyendu a tụkwasịrị obi dịka ọ nọrọla n’ọkwa dị elu na gọọmentị kamgbe afọ iri abụọ na ise.

    Ngwa ngwa e duru ya n’iyi ọrụ, ọ ga-esonye ogbo ya Samia Suluhu Hassan dịka ụmụnwaanyị bụ ndịisiala na mba Afrịka.

  13. Igbo mma mma nụ ooo!

    Ka ụbọchị taa maara anyị niile na mma.

    Biko gbalịa nọnyere anyị n'ọgbakọ BBC Igbo maka akụkọ ndị gbapụtara ihe na Naịjirịa, Afrịka nakwa mbaụwa.

    Daalụ nụ!

  14. Onyeisiala South Korea enyefeela ikikere ọchịchị n'aka ndịagha

    Onyeisiala Saụt Korịa Yoon Suk Yeol

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Onyeisiala Saụt Korịa Yoon Suk Yeol

    Ndị Saụt Korịa amalitela ime ngagharịiwe ka Onyeisiala Yoon Suk Yeol nyefere ikikere ọchịchị n'aka ndịagha.

    Nke a na-abịa dịka ọgbaaghara dapụtara n’etiti pati Onyeisiala Yoon bụ Peoples Power Party na pati ndị chọrọ inwere ọchịchị maka akwụkwọ atụmatụ mkpata na mmefu ego afọ 2025.

    N’ihe ịtụ n’anya o mere, Onyeisiala Yoon pụtara n’ihe onyonyo kwuo na o nyefere ndịagha ọchịchị iji chekwaa mba Saụt Korịa n’aka ndị chọrọ imebi ya.

    Ozi si n’aka onyeisi ndịagha kwuru na ihe niile banyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị abịala na njedebe mana ndị omeiwu n’aga n’ihu na-agbakọ n’ụlọomeiwu.

    Pati nọ n’ọchịchị na pati chọrọ inweree ọchịchị kwuru na ha ga-egbochi ọchịchị ndịagha.

    Ndị na-eme ngagharịiwe n'ogige ụlọomeiwu Saụt Korịa

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Ndị na-eme ngagharịiwe n'ogige ụlọomeiwu Saụt Korịa
    Ndị uweojii nọ n'ogige ụlọomeiwu Saụt Korịa

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ndị uweojii nọ n'ogige ụlọomeiwu Saụt Korịa
    Ndị na-eme ngagharịiwe n'ogige ụlọomeiwu Saụt Korịa

    Ebe foto si, YONHAP NEWS AGENCY

    Nkọwa foto, Ndị na-eme ngagharịiwe n'ogige ụlọomeiwu Saụt Korịa
  15. NLC akatọọla okwu Govanọ Ebonyi steeti kwuru banyere ndị ọrụ gbara abụbọ ọrụ

    Onyeisi NLC Joe Ajaero na Gọvanọ Francis Nwifuru na-achị Ebonyi steeti

    Ebe foto si, NLC/Francis Nwifuru/Instagram

    Nkọwa foto, Onyeisi NLC Joe Ajaero na Gọvanọ Francis Nwifuru na-achị Ebonyi steeti

    Onyeisi otu jikọrọ ndị ọrụ Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress, Joe Ajaero akatọọla okwu Gọvanọ Francis Nwifuru kwuru banyere ịchụ ndị ọrụ gbara abụbọ ọrụ maka na gọọmenti akwụghị ha ụgwọọnwa opekatampe ọhụrụ N70,000.

    Cheta na Gọvanọ Francis Nwifuru nọrọ ụbọchị Mọnde kwuo na ọ ga-achụ ndị ọrụ steeti ahụ gbara abụbọ ọrụ n’ọrụ ma ọ bụrụ na ha alaghachighị n’ọrụ n’ime abalị atọ.

    Ozi Joe Ajaero wepụtara taa mere ka a mara na mkaprịtaụka ha na Gọvanọ Nwifuru nwere banyere ị malite ịkwụ ndị ọrụ ụgwọọnwa opekatampe ọhụrụ nke gọọmenti etiti kwuputara kemgbe ọnwa asaa gara aga amịtaghị mkpụrụ ọbụla.

    Ọ gara n’ihu kwuo na ihe Gọvanọ Nwifuru kwesiri ime bụ ikpọ ndị ọrụ ka ha nwee mkparịtaụka ma nwee nkwekọrịta banyere etu a ga-esi kwụọ ndị ọrụ Ebonyi steeti ụgwọọnwa opekatampe ọhụrụ ahụ.

    Ajaero kpọkuru ngalaba ndị ọrụ niile nọ n’Ebonyi steeti ka ha malite abụbọ ọrụ ma ghara ige nti n’ihe Gọvanọ Nwifuru kwuru banyere ịchụ ndị gbara abụbọ ọrụ n’ọrụ maka na iwu Naịjirịa kwadoro ndị ọrụ ịgba abụbọ ọrụ.

  16. Etu EFCC si kpachie ọnụụlọ ‘duplex’ ruru 753 e nwetere n'ụzọ mpụ n’Abuja

    Ụlọọrụ EFCC kwuru na mkpachi ụlọ ndị ahụ bụ nke kachasị ukwuu ha na-eme n’otu ugboro kamgbe e hiwere ha n’afọ 2003.

    Ebe foto si, EFCC/X

    Ụlọikpe ukwu dị n’Abuja enyela ụlọọrụ na-ebuagha megide mpụ na nrụrụaka bụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) ikike ịkpachi ọnụụlọ ‘duplex’ ruru 753 bụ nke a natara otu onye ọrụ gọọmentị a na-enyocha maka ime mpụ ego.

    Ọkaikpe Jude Onwuegbuzie nyere iwu ahụ n’ikpe ọ chabiri n’ụbọchị 2 Disemba, 2024 ma sị ka EFCC kpachie kpamkpam ụlọ ndị a nọ n’obosara ala dị 150,500sqm dị na Cadastral Zone nke Lokogoma dị n’Abuja.

    Ụlọọrụ EFCC kwuru na mkpachi ụlọ ndị ahụ bụ nke kachasị ukwuu ha na-eme n’otu ugboro kamgbe e hiwere ha n’afọ 2003.

    Ọnụụlọ duplex ruru 753

    Ebe foto si, EFCC/X

    Ha kwuru na mbọ ha gbara ka a kpachie ụlọ a bụ site n’ọrụ ha nke bụ ịhụ na ndị mere mpụ na nrụrụaka agaghị erite uru ọbụla site na mpụ ndị ha mere dịka iwu nke Naịjirịa si dị.

    N’ikpe ahụ, ọkaikpe Onwugbuzie kwuru na onye ọrụ gọọmentị a natara ụlọ ahụ egosighi ihe akaebe ọbụla ga-eme ka a ghara ịkpachi ụlọ ndị a, nke e cheere na o nwetere site n’ụzọ mpụ na nrụrụaka.

    Ụlọ ndị a kpachiri n'Abuja

    Ebe foto si, EFCC/X

    Ụlọọrụ EFCC kwuru na ha na-enyocha onye ọrụ gọọmentị nwee ụlọ ndị a maka na ndụ onye ahụ na-ebi nakwa akụnaụba ndị o nwere adabaghị n’ụzọ o si enwete ego ya.

    Mana ha akpọghị aha onye ọrụ gọọmentị a sị nwe ụlọ ndị a, maọbụ ọkwa onye ahụ ji n'ụlọọrụ gọọmentị.

  17. Unu anọọla nke ọma? Ụmụibe!

    Daalụ maka ịnọnyere anyị n'ọgbakọ BBC Igbo taa

  18. Ụgwọọnwa Opekatampe: Gọvanọ Ebonyi steeti ekwuola na ọ ga-achụ ndị gbara abụbọ ọrụ n’ọrụ

    Gọvanọ Francis Nwifuru na-achị Ebonyi steeti

    Ebe foto si, Francis Nwifuru/Instagram

    Nkọwa foto, Gọvanọ Francis Nwifuru na-achị Ebonyi steeti

    Gọvanọ Francis Nwifuru na-achị Ebonyi steeti ekwuola na ọ ga-achụ ndị ọrụ steeti ahụ gbara abụbọ ọrụ n’ọrụ ma ọ bụrụ na ha alaghachighị n’ọrụ n’ime abalị atọ.

    Cheta otu jikọrọ ndị ọrụ steeti ahụ nke Oguguo Egwu nọ n’isi ya, nyere iwu ka ndị ọrụ steeti malite abụbọ ọrụ maka ụgwọọnwa opekatampe N70,000 ọhụrụ gọọmenti etiti kwuru ka steeti na-akwụ ndị ọrụ na Naịjirịa gbaa gburu gburu.

    Gọvanọ Nwifuru nyere ntuziaka a n’obi ọchịchị steeti ahụ dị n’Abakaliki ụbọchị Mọnde 2 Disemba, 2024 ma kwuo na o nyela iwu ka e dekọta aha ndị ọrụ ọbụla na-abịa ọrụ iji chọpụta ndị na-erupu isi nye iwu ya dịka Gọvanọ steeti ahụ.

    Cheta na anyị nwetara gị akụkọ na Oguguo Egwu kwuru na atụmatụ abụbọ ọrụ ahụ ntuziaka onyeisi otu Nigeria Labour Congress (NLC) bụ Joe Ajaero nyere ngalaba NLC na Naịjirịa niile.

  19. Naịjirịa amalitela ịgba ọgwụ mgbochi ọrịa ịba

    Ndị ọrụ ahụike na-agba nwatakịrị ọgwụ mgbochi
    Nkọwa foto, Ndị ọrụ ahụike na-agba nwatakịrị ọgwụ mgbochi

    Naịjirịa bụ mba kachasi nwee mmetụta ọrịa ịba, amalitela ikesa ọgwụ mgbochị ọrịa ịba iji zọọ ndụ.

    A bịa n’ọnụọgụgụ ọrịa ịba e nwere na mba ụwa niile, Naịjirịa nwere pasenti 27 ma nwee pasenti 31 na ndị ọrịa ịba gbugoro, nke a bụ dịka akwụkwọ nnyocha World Malria Report nke afọ 2023.

    Ihe ruru mmadụ narị abụọ (200,00) nwụrụ site n’ọrịa ịba na Naịjirịa n’afọ 2023 ebe ụmụaka gbara na-erughị afọ ise bụ ndị ọ kacha gbuo.

    Naịjirịa nwetara ọgwụ mgbochi ọrịa ịba nari asatọ (800,000) n’ọnwa Ọktoba 2024, mana e bidoro ikesa ọgwụ mgbochi a na Bayelsa na Kebbi, steeti ebe abụọ kachasị nwee ndị bu ọrịa ịba na Naịjirịa tupu amalite ikesa ya na steeti ndị ọzọ n’ọnwa ole na ole na-abịa.

    Happiness Idia Wilson bụ nwaanyị mbụ a gbara nwa ya ọgwụ mgbochi ọrịa ịba na Bayelsa steeti
    Nkọwa foto, Happiness Idia Wilson bụ nwaanyị mbụ a gbara nwa ya ọgwụ mgbochi ọrịa ịba na Bayelsa steeti

    Otu nwaanyị bụ Happiness Idia Wilson, bụ nwaanyị mbụ na Bayelsa steeti a gbara nwa ya dị ọnwa iri na otu ọgwụ mgbochi a, kwuputara obi aṅụrị ya ma kpọọ oku ka e nwee ọgwụ mgbochi ndị ọzọ na-enyere aka maka nchekwa ụmụaka.

    O kwuru na ọ ga-agwa ndị nne dịka ya ka ha kpọrọ ụmụaka ha bịa gbaa ọgwụ mgbochi ọrịa ịba maka n o kwenyere na ọ na-arụ ọrụ.

    Kọmịshọna na-ahụ maka ahụike na Bayelsa steeti bụ Ọkankụzi Seiyefe Brisibe kwuru na ọgwụ mgbochi a ga-arụ ọrụ ma ọ bụrụ na e mee ihe ndị ọzọ e kwesịrị ime iji chekwaa ụmụaka.

    Ndị ọrụ ahụike na-enye ọgwụ mgbochi ọrịa ịba
    Nkọwa foto, Ndị ọrụ ahụike na-enye ọgwụ mgbochi ọrịa ịba

    Ndị ọrụ ahụike na-ekwu na ọ dị mkpa ka onye ọbụla a gbara ọgwụ mgbochi jiri ụgbụ anwụnta (mosquito net) n’ehi ụra nakwa ọgwụ na-egbu anwụnta (insecticides) iji chekwaa onwe ha site n’rịa ịba.

    Ọkankụzi Brisibe kwuru na steeti ya na-aga ịgbasaozi iji mee ka ndị nọ n’ime obodo ghọta uru ọ bara ịgba ọgwụ mgbochi a.

    Ọgwụ mgbochi ọhụrụ a a kpọrọ R21/Matrix-M, bụ ọgwụ mgbochi ọrịa ịba ụlọọrụ World Health Organization (WHO) na-akwado ma bụrụkwa nke e kwuru na ọ dị ire pasenti 75 igbochi ọrịa ịba. Nke mbụ bụ ọgwụ mgbochi RTS/S.

    Mana WHO kwuru na ọ bụ naanị otu ọgwụ ọrịa ịba ka mba ọbụla nwereike inye, ọbụghị ha abụọ.

    Ọ bụ ụlọọrụ Jenner Institute dị na mahadum Oxford University, nke Adrian Hill nọ n’isi ya rụrụ ọgwụ mgbochi R21/Matrix-M. A na-agbaya ụmụaka ruru ọnwa ise.

    Na mbido afọ Ivory kost na DR Kongo malitere inye ndị obodo ha R21/Matrix-M.

  20. Ndị uweojii agbaala ndị mbịarambịa ruru 113 na-eme mpụ ịntaneti n’anwụ

    Ndị mbịarambịa a nwụchiri maka ebubo ime mpụ ịntanetị

    Ebe foto si, Nigerian Police Force

    Ndị uweojii Naịjirịa agbaala ndị mbịarambịa ruru mmadụ otu narị na iri na atọ bụ ndị e jidere maka iji ịntanetị eme mpụ dị iche iche n’anwụ n’ụlọọrụ ha dị n’Abuja.

    Onyeisi ndị uweojii na Naịjirịa bụ Kayode Egbetokun kwuru nke a mgbe ọ na-eto ndị uweojii ngalaba Zone 7 nakwa ụlọọrụ na-ebuagha megide mpụ n’ịntaneti dị n’Abuja maka ịnwụchi ndị a.

    A nwụchiri ndị a n’ụbọchị atọ nke ọnwa Nọvemba, 2024 na mpaghara Jahi dị n’Abuja mana ndị uweojii akpọghị mba ndị a si aha.

    Dịka a na-eme nnyocha, a napụtara ọtụtụ ngwa ọrụ ha ji arụ ọrụ gụnyere; ekwentị, igwe kọmputa, igwe na-enye ịntanetị, ụgbọala nakwa ihe ndị ọzọ.

    Akụrụngwa ndị a natara n'aka ndị a

    Ebe foto si, Nigerian Police Force

    Mpụ ndị a na-eme n’ịntanetị gụnyere izuru ozi banyere ndị mmadụ, ịgbasa azụmaahịa adịgboroja, igwu chandum nakwa mpụ ndị ịntanetị ndị ọzọ.

    Ndị uweojii kpụpụrụ mmadụ 113 n’ụlọikpe Ukwu dị n’Abuja ma chọpụtakwa na aka ndị a dịka n’ịtụ mgbere mmadụ nakwa ịda iwu na-achịkwa mbata na ọpụpụ mmadụ na mba ndị ọzọ.

    Onyeisi ndị uweojii kwere nkwa na ọ dị njikere ka ya na ndị ọrụ nchekwa mba ndị ọzọ rụkọọ ọrụ iji hụụ na a tara ndị a ahụhụ ruuru ha ma chekwaa ndị Naịjirịa.