Mba America ekwuola na aka Russia nwereike ịdị n’ụgbọelu Azerbaijan kpọkara

Ebe foto si, EPA
Ọnụ na-ekwuru mba Amerịka bụ John Kirby, ekwuola na ihe obodo ha hụrụ na-egosi na mba Rọshịa ga-ama ihe mere ụgbọelu Azerbaijan jiri kpọkaa n’abalị 25 Disemba n’afọ 2024, ma gbuo mmadụ iri atọ na asatọ (38).
Kirby akọwachaghị ihe mba Amerịka hụrụ nke ọma mana ọ gwara ndị ntaakụkọ na mba Amerịka ebidola inyocha ihe mere ụgbọelu ahụ.
Etu e siri kwuo, ụgbọelu ahụ sitere n’ikuku Rọshịa gbawa ọkụ mgbe ọ chọrọ ịda n’obodo Chechnya tupu e chegharịa ya ihu n’osimiri gaa Kazakhstan, ebe ọ kpọkara.
Kremlin ekweghị ekwu okwu banyere ihe ahụ mere mana onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka ụgbọelụ na mba Rọshịa ekwuola na ihe mere na Chechnya na-agbagwoju anya n’ihi ogbunigwe mba Yukren tụrụ na mpaghara ahụ.
Kirby kwukwara na mba Amerịka ahụla ọtụtụ foto ugbọelu kpọkara akpọka a na-ekesa.
Mba Azerbaijan nwe ụgbọelu ahụ eboghị Rọshịa ebubo mana Mịnịsta na-ahụ maka njem kwuru na ihe mere ụgbọelu ahụ sitere na nnyonye anya ndị amaghị aha ya.






















