Onyeisiala
mba Amerịka bụ Joe Biden ewerela ikike ya dịka onyeisiala gbaghara nwa ya nwoke
bụ Hunter Biden ebubo ime mpụ abụọ e boro ya na-agbanyeghi na o kwuru na ọ gaghị
etinye ọnụ.
N’ozi o wepụtara,
Onyeisiala kwuru na “a rụrụ nwa ya aka” ma sị na ikpe banyere ebubo ahụ bụ “mmebi
ikpe ziri ezi”.
Hunter
Biden kwuburu na ọ bụ eziokwu na ọ dara iwu ụtụisi n’ọnwa Sepụtemba, ebe ikpe
makwara ya n’ebubo ịṅụ ọgwụ ike ma burukwa egbe n’ọnwa Juun – nke mere o ji bụrụ
nwa Onyeisiala nke mbụ a na-ama ikpe maka ime mpụ.
Onye a họpụtarala
dịka onyeisiala bụ Donald Trump mgbe ọ na-etinye ọnụ n’okwu ahụ sị na “mgbaghara
a Joe nyere Hunter, ọ gụnyere ndị a anwụchiri na [Jenụwarị 6] ma tụọ mkpọrọ ọtụtụ
afọ? Nke a bụ mmebi ikpe ziri ezi n’ezie!”
Trump na-ekwu
maka ndị nkwado ya wakporo ụlọomeiwu mba Amerịka n’ụbọchị 6 nke ọnwa Jenụwarị
2021 mgbe ha na-achọ ịgbanwe mmeri e meriri Trump na ntuliaka afọ 2020.
Mgbaghara a
Joe Biden nyere nwa ya na-abịa dịka o kwuru ọtụtụ oge na ọ gahị etinye anya n’ikpe
banyere nwa ya.
N’ọnwa Sepụtemba, odeakwụkwọ ụlọọrụ White House kwuru na Biden agaghị enye nwa ya nwoke mgbaghara.
Mana e ruru n’abalị Sọnde, Onyeisiala Trump kwuru na-agbanyeghi na o kwenyere n’ikpe ziri ezi, “ndọrọ ndọrọ emebiela usoro ya ma mee ka e nwee mmetọ ikpe ziri ezi”.
“Site n’ụbọchị m weere ọchịchị, ekwuru m na agaghị m etinye ọnụ na mkpebi ọbụla ngalaba ikpe ziri ezi mere, emere m nke a na-agbanyeghi ka m na-ahụ etu e si họpụta nwa m ma maa ya ikpe,” ka o kwuru.
Na nzaghachị, Hunter Biden kwuru na mmehie ndị o mere n’ọge ọ na-aṅụ ọgwụ ike bụzi ihe a “tụgharịrị ma jiri ya na-emechu ya na ezinaụlọ ya ihu” maka ndọrọ ndọrọ ọchịchị.
Agaghị m eleghara mgbaghara a enyere m taa anya, aga m eji ndụ m nyere ọtụtụ ndị na-arịa ọrịa ma na-ata ahụhụ aka,” ka nwamadị a dị afọ 54 gbakwụnyere.
Nke a abụghị mbụ Onyeisiala mba Amerịka na-enye otu onye ezinaụlọ ya mgbaghara.
Bill Clinton nyere nwanne ya nwoke, Roger Clinton mgbaghara n’afọ 2001 n’ebubo ime mpụ metụtara ọgwụike n’afọ 1985.
N’afọ 2020, Donlad Trump gbaghaara Charles Kushner bụ nna di nwa ya nwaanyị, Ivanka. Trump kwuru na nso nso na Kushner ga-abụ onye nnọchiteanya mba Amerịka na mba France.