Ụlọọrụ NAFDAC ekposaala ogige ebe a na-akụ mmanya adịgboroja n’ahịa Cemetery Aba
Ụlọọrụ na-ahụ maka nri na ọgwụ na Naịjirịa bụ National Agency for Food and Drug Administration and Control (NAFDAC) ekposaala ogige ebe a na-akụ ma na-ere mmanya adịgboroja dị iche iche n’ahịa Eziukwu e ji Cemetery n’Aba, Abia Steetị.
Onyeisi ụlọọrụ a na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ bụ Martins Iluyomade kwuru nke a mgbe o du ndị ọrụ gaa nzem n’ahịa ahụ. Ọ gbarụrụ ihu ma kwuo na nke abụghị mbụ ha na-achọpụta ụdịrị ihe n’ahịa ahụ.
N’afọ 2023, ụlọọrụ NAFDAC gakwara n’ahịa ahụ ebe ha na ndị ndu ahịa nwere nkwekọrịta na-ha ga-enyere ha ịchọpụta ndị niile na-ere mmanha adịgboroja ndị a.
Iluyomade kwuru “Anyị bịara ahịa n’afọ gara aga, ugbua anyị abịala ọzọ site n’ama a gbaara anyị na ndị mmadụ amalitekwa ịrụ ma na-ere mmanya adịgboroja n’ahịa.
“Ọ fọrọ ka m bee akwa, amaghị ihe mere ndị mmadụ ji agba isi akwara ịchọ ego ma na-emebi ndụ mmadụ ihe ya.
“Ihe anyị hụrụ ebe a taa adịghị iche n’ihe ndị anyị hụrụ n’afọ gara aga, ọ bụ ihe mgbawa obi. O nweghi mmanya ọbụla ịchọrọ na Naịjirịa na a naghị arụpụta ebe a.
“Ọ na-ara ahụ ịchọpụta ihe dị iche na mmanya adịghoroja ndị a na-arụpụta ebe na ndị ezigbo ya nọ n’ahịa.
O kwuru na ihe a na-arụpụta ebe a bụ ngwaọgụ e ji ala ndụ igwe mmadụ n’iyi. “Ha na-egbu ndị mmadụ n’igwe.”
Ọ gara n’ihu kwuo na ụlọọrụ NAFDAC atọọla ntọala etu ọ ga-esi meminaa ndị na-esipụta ma na-ere mmanya na ngwa nri adịgboroja, ma gwaa ndị mmadụ ka ha gbadoo anya tupu ha etinye mmanya ndị a n’ọnụ.