You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ụlọikpe Saụt Korịa enyela iwu ka a nwụchie Yoon Suk-yeol a chụpụrụ dịka Onyeisiala

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Disemba 2024.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Jessica Nwankwo, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere

  1. Ụlọọrụ NAFDAC ekposaala ogige ebe a na-akụ mmanya adịgboroja n’ahịa Cemetery Aba

    Ụlọọrụ na-ahụ maka nri na ọgwụ na Naịjirịa bụ National Agency for Food and Drug Administration and Control (NAFDAC) ekposaala ogige ebe a na-akụ ma na-ere mmanya adịgboroja dị iche iche n’ahịa Eziukwu e ji Cemetery n’Aba, Abia Steetị.

    Onyeisi ụlọọrụ a na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ bụ Martins Iluyomade kwuru nke a mgbe o du ndị ọrụ gaa nzem n’ahịa ahụ. Ọ gbarụrụ ihu ma kwuo na nke abụghị mbụ ha na-achọpụta ụdịrị ihe n’ahịa ahụ.

    N’afọ 2023, ụlọọrụ NAFDAC gakwara n’ahịa ahụ ebe ha na ndị ndu ahịa nwere nkwekọrịta na-ha ga-enyere ha ịchọpụta ndị niile na-ere mmanha adịgboroja ndị a.

    Iluyomade kwuru “Anyị bịara ahịa n’afọ gara aga, ugbua anyị abịala ọzọ site n’ama a gbaara anyị na ndị mmadụ amalitekwa ịrụ ma na-ere mmanya adịgboroja n’ahịa.

    “Ọ fọrọ ka m bee akwa, amaghị ihe mere ndị mmadụ ji agba isi akwara ịchọ ego ma na-emebi ndụ mmadụ ihe ya.

    “Ihe anyị hụrụ ebe a taa adịghị iche n’ihe ndị anyị hụrụ n’afọ gara aga, ọ bụ ihe mgbawa obi. O nweghi mmanya ọbụla ịchọrọ na Naịjirịa na a naghị arụpụta ebe a.

    “Ọ na-ara ahụ ịchọpụta ihe dị iche na mmanya adịghoroja ndị a na-arụpụta ebe na ndị ezigbo ya nọ n’ahịa.

    O kwuru na ihe a na-arụpụta ebe a bụ ngwaọgụ e ji ala ndụ igwe mmadụ n’iyi. “Ha na-egbu ndị mmadụ n’igwe.”

    Ọ gara n’ihu kwuo na ụlọọrụ NAFDAC atọọla ntọala etu ọ ga-esi meminaa ndị na-esipụta ma na-ere mmanya na ngwa nri adịgboroja, ma gwaa ndị mmadụ ka ha gbadoo anya tupu ha etinye mmanya ndị a n’ọnụ.

  2. Mba Ukraine egbuola ọchịagha mba Rọshịa na-ahụ maka agha nuklịa

    E jirila ogbunigwe gbuo ọchịagha Igor Kirillov nke mba Rọshịa na-ahụ maka agha nuklịa.

    Akụkọ na-apụta ugbua ụlọọrụ ntaakụkụọ Reuters na AFP kwuru na otu onyeisi na gọọmentị na-achị mba Ukraine kwetere na ọ bụ ha gburu ọchịagha Igor Kirillov.

    E gburu Igor Kirillov n’isiobodo mba Rọshịa mgbe o si n’ụlọ obibi ebe igwe mmadụ bi na-apụta.

    Kirillove na onye na-enyere ya aka nwụrụ n’ogbunigwe ahụ n’ụtụtụ ụbọchị Tuzde.

    Kirillov bụ onyeisi ngalaba na-ahụ maka agha nuklịa nakwa agha dị icheiche e ji akụrụngwa kemịkaalụ na sayensị ndị ọzọ alụ.

    Abalị gara aga ka ụlọọrụ nchekwa na mba Ukraine boro Igor Kirillov ebubo iji ngwagha megidere iwu n’agha dị n’etiti mba Ukraine na Rọshịa.

    Ụlọọrụ nchekwa na mba Ukraine kwuru na ọ bụ Igor na-ahụ maka ndịagha Rọshịa bụ ndị tugoro ngwagha nuklịa ugboro 4,800 kamgbe agha Rọshịa na Ukraine bidoro.

  3. Etu nwata nwaanyị si gbagbuo mmadụ abụọ n'ụlọakwụkwọ ha na mba Amerịka

    Otu nwata akwụkwọ kpọpere egbe gbagbuo otu nwata akwụkwọ, otu onye nkuzi ma merụọ mmadụ isii ahụ n’otu ụlọakwụkwọ ndụ ụka Kraịst dị na steeti Wisconsin nke mba Amerịka.

    Onyeisi ndị uweojii obodo Madison bụ Shon Barnes kwuru na onye gbara egbe a bụ otu nwata nwaanyị dị afọ na-agụ n’ụlọakwụkwọ ahụ.

    Ha kwuru na ọ bụ bịara ụlọakwụkwọ ‘Abundant Life Christain School’ tupu ọ malite ịgba egbe mana a hụrụ ya ka ọ nwụrụ n’ebe ahụ. Ụmụakwụkwọ isii merụrụ ahụ, gụnyere mmadụ abụọ nọ n’ọnụ ọnwụ.

    Ọ bụ nwata akwụkwọ praịmarị nke abụọ bu ụzọ mee mkpesa banyere egbe ahụ a gbara dịka Barnes si kwuo.

    “Taa bụ ụbọchị nwute nye obodo Madison nakwa mba niile,” ka Barnes kwuru. “Anyị kwesịrị ịrụ ọrụ ọfụma n’obodo anyị.”

    O kwuru na ndị uweojii achọpụtabeghi ihe mere nwata akwụkwọ a jiri gbaa egbe a, ndị ezinaụlọ ya na-enyere ndị uweojii aka na nnyocha.

    O kwukwara na o dobeghi anya etu nwata siri nwete egbe.

    Ọ kpọrọ aha nwata gbara egbe a dịka Natalie Rupnow, onye e ji kwa Samantha maara. A sị na ọ nwụrụ site n’ịgba onwe ya egbe.

    A ga-amata kpọmkwem ihe gburu ya ma ọ bụrụ na nnyocha mechaa nnyocha n’ozu ya.

    Ọ bụ n’ihe dịka elekere isii nke mgbede ụbọchị Mọnde ka ndị uweojii nwetere ozi na o nwere egbe a gbara n’ụlọakwụkwọ ahụ.

  4. Igbo mma mma nụ ooo!

    Unu abọọla chi?

    Anyị na-asị gị nnọọ n'ọgbakọ BBC Igbo taa ebe anyị na-ewetere gị akụkọ ndị hiri odo n'ụwa niile.

    Ndewo.

  5. EFCC anwụchiela ndị Chinese, Arab na Filipino dị 193 maka igwu chadum ịntanet

    Aka otu na-ebu agha megide nrụrụaka ego na NIgeria bụ Economic and Financial Crime Commission (EFCC) akparala mmadụ 792 gụnyere ndị Chinese(148), Filipino(40),Kharzartan(2), Pakistani (1), nakwa Indonesia(1) maka igwu ndị ọcha nchadum ego .

    EFCC gwara ndị ntaakụkọ ụbọchị Mọnde na ọ bụ site n'ama a gbaara ha nakwa nnyocha nke ha mere ọtụtụ ọnwa gara aga ka ha si wuchiri ndị ahụ n'isi ụlọọrụ ndị amakekwu ahụ dị No.7, Oyin Jolayemi Street, Victoria Island, Legos na mberede.

    Ndị ụlọọrụ wuruwuru ahụ bụ na-eme ka ha abụ ụlọọụ na-eme ihe metụtara ego na-ewe ụmụamala Naijiria maara 'typing' nke ọma n'ọrụ, nye ha ọzụzụ izuụka abụọ ma bunye ha kọmpụta kara aka.

    Ha na-akuziere ha ka e si egwu ndị Amerịka,Kanada,Meziko na obodo ndịọcha ndị ọzọ wayo site n' ịgwa ha ka ha tinye ego n'azụmahịa 'crypto'.

    Ike ndị enwetara n'ụlọọrụ ahụ gụnyere kọpụta, ekwentị nakwa ụgbọala.

    EFCC kwuru na nnyocha na-aga n'ihu iji mata ma o nwere otu nọ mba ofesi ha na ndị omekome ahụ na-arụkọ.

    Aha ọjọọ eneyerela Naijiria na mba ụwa , na ndị abụghị ụmụamala Naijiria na-abata ala Naijiria eme bụ wayo nke a na-ebo ụmụ Naijiria.

  6. Okonjo-Iweala ezutela Pope Francis na Vatican

    Nzute ahụ mere na nsonso a dịka Onyeisi ụkọchukwu ndị Alakuba na Al Azhar bụ Ahmed Al Tayeb na Popu nwere nkwekọrịta ihibe nzere 'Zayed Award for Human Fraternity' iji na-akwanyere ndị na-arụ ọrụ ebere ugwu pụrụ iche.

    Dịka Okonjo Iweala siri gbaa n'ama n'ozi o wepụtara n'akara X ya ụbọchị Monde, Popu chọrọ ịkpalitere olileanya ndị ntọrọbịa inye aka n'igbo nsogbu dị n'ụwa ebe agụụ ji ọtụtụ ụmụaka mana a na-emefu nde kwuru nde n' agha na ọgbaghara ndị ọzọ.

    Ndị nọ na kọmịtị ga-ahụ maka nzere ahụ gụnyere aka chịbụrụ Senegal bụ Macky Sall, onye bụbụ Praim Mịnịsta Spen bụ José Luis Rodríguez Zapatero, Cardinal Turkson bụ onyeisi ụlọmmụta nke Vatican bụ 'Pontifical Academy of Sciences and Social Sciences' na ndị ọzọ.

  7. Ọ bụghị eziokwu na mba France chọrọ ihibe ụlọọrụ ndịagha ha na Naịjirịa - Ndịagha Naịjirịa

    Isi ụlọọrụ ndịagha Naịjirịa ekwuola na ọ bụghị eziokwu na mba France nwere atụmatụ ihibe ụlọọrụ ndịagha ha na Naịjirịa.

    Akwụkwọozi onyeisi mgbasaozi Nigeria Defence Academy bụ Maj Gen. Edward Buba wepụtara ụbọchị Mọnde 16 Disemba, 2024, kọwara ozi ahụ na-efegharị ma na-ekwu na ndịagha mba France anwụchiela Maiduguri maka atụmatụ ihibe ụlọọrụ ndịagha France na Naịjirịa dịka nke na-enweghị eziokwu dị na ya.

    Ọ gara n’ihu kwuo na onyeisi ndịagha Naịjirịa bụ Ọchịagha Christopher Musa kwuru na ozi ahụ bụ ụgha.

    Maj Gen. Edward Buba kpọrọ oku ka onye ọbụla ghara ige nti n'okwu ahụ ọ kọwara dịka aka ọrụ ndị chọrọ itinye ọgbaaghara n'obodo.

  8. Oke ifufe 'Cyclone Chido' egbuola ọtụtụ puku mmadụ n'obodo Mayotte mba Fransị

    Ọtụtụ ndị mmadụ anwụọla n’obodo Mayotte dị na mba Fransị mmiri gbara gburu gburu mgbe oke ifufe a kpọrọ ‘Cyclone Chido’ nke ikuku ruru ogogo 140mph mere ebe ahụ.

    Onyendu obodo a dọrọ aka na ntị na ndị nwụrụ nwereike iru ọtụtụ puku n’ọnụọgụgụ, ebe ndị ọrụ mba Fransị kwuru na ụlọọgwụ dị n’ebe ahụ emebiela site n’oke ifufe ahụ.

    Ka ọ dị ugbua ndị ọrụ gbata gbata ka na-agba mbọ ịzọpụta ọtụtụ ndị ihe metụtara na Mayotte kamgbe ngwụcha izuụka gara aga.

    Ifufe ahụ fetuchara ihe niile dị n’obere obodo gụnyere ụlọ, osisi, akwammiri, okporoụzọ dgz.

    Onyeisiala mba Fransị bụ Emmanuel Macron ekwuola na e kwesịrị ịgbapụ ọsọ n’ịzọpụta ndị nọ n’obodo dịka o zipuurula ndị ọrụ enyemaka gawa ebe ahụ.

    N’ozi o wepụtara na soshal midia X, Macron kwuru na ọ na-esi etusi etu ihe si eme ebe ahụ ike, ma kwuo na mba Fransị niile na-ekpere ndị obodo Mayotte ekpere.

    Oke ifufe cyclone a ga-abụ nke kachasị akpa ike ga-eme obodo a kamgbe afọ iri itoolu (90yrs) nke ife ya ji mita asatọ rịa elu.

    Obodo Mayotte so n’obodo ndị kachasị daa ogbenye na mba Fransị ebe ọtụtụ mmadụ ruru 300,000 bicha n ‘ime ụlọ akpakara.

    Obodo a dị n’agbata mba Mozambique na Madagascar n’Osimiri India.

  9. ECOWAS ekwetela ka mba Mali, Burkina Faso na Niger si n'otu ha pụọ

    Ndị ndu otu jikọtara mba ndị dị n’ọdịda anyanwụ Afrịka bụ ECOWAS n’ịchafụ anabatala ọpụpụ mba Mali, Burkina Faso na Niger pụrụ n’otu ha.

    Nke a pụtara malite n’ụbọchị 29 nke ọnwa Jenụwarị 2025, mba atọ ndị a agazighi abụ ndị otu ECOWAS.

    Mkpebi a so n’ime ihe ndị ndu otu a kpara maka ya n’ọgbakọ ha mere n’isiobodo Naịjirịa bụ Abuja n’ụbọchị Sọnde.

    N’ozi Onyeisiala otu ECOWAS bụ Omar Touray wepụtara, o kwuru na ha kwanyeere mba atọ ndị ugwu na mkpebi ha.

    Mana e nwere ihe mgbakwụnye dị na mkpebi a – ndịagha weere ọchịchị na mba atọ a ga-eji ọnwa isii hazie onwe ha ma nyefee ọchịchị n’aka ndị nkịtị malite na 29 Jenụwarị ruo 29 Julaị, 2025.

    N’oge a, mkparịtaụka udo ha na otu ECOWAS na-enwe ga na-agakwa n’ihu. Ọ bụrụ na o nwere mba ọbụla n’ime ha chọrọ ịlọghachite n’otu ECOWAS, a ga-anabata ya.

    Ndị ndu ECOWAS kwuru na mkpebi ha si n’usoro iwu na-achịkwa otu nke nabatara mba ọbụla inwere onwe ya.

    N’aka nke ọzọ, mba atọ ndị a ebe ndịagha ji ọchịchị ekwuola na nwafọ mba ọbụla so n’otu ECOWAS nwere ohere ịbata na mba ha na-ejighi akwụkwọ ikike ‘visa’.

    Ndị ndu ha kwuru na mkpebi a bụ maka udo, ezi enyi iji mee ke mmekọrịta dị n’etiti mba Afrịka sikwuo ike.

  10. Igbo ndị ọma e ji eme ọnụ daalụ nụ ooo!

    Obi sara mbara ka anyị ji anabata gị n'ụbọchị ọhụrụ a.

    Anyị na-ekwu na nzọmụkwụ ọbụla ị mere n'izu a ga-ewetere gị ngọzi na ihuọma.

    Jisie ike na-anọnyere anyị n'ọgbakọ BBC Igbo maka akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ụwa.

    Daalụ!

  11. Anyị akwadoghị ọgwụ Lungitox a na-ekwu na-asacha akpa ume - NAFDAC

    Onyeisi ụlọọrụ na-ebu agha megide ọgwụ adịgboroja bụ National Agency for Food and Drug Administration and Control (NAFDAC) bụ Mojisola Adeyeye ekwuola na ha enyeghị ikike nkwado maka ọgwụ mgbọrọgwụ na-asacha akpa ume (lungs) ndị na-aṅụ anwụrụ.

    Adeyeye kwuru nke a n’akwụkwọozi o wepụtara, kọwara na ọgwụ ahụ aha ya bụ ‘Lungitox’ enweghataghị nkwado ụlọọrụ NAFDAC oge ndị rụrụ ya bịara ka idebanye aha ọgwụ ahụ n’ụlọọrụ NAFDAC.

    N’okwu Adeyeye “Ọ bụ eziokwu na ndị rụrụ ọgwụ ahụ bịara ka ha debanye ya ma nweta ikike n’ụlọọrụ anyị, mana anyị anabataghị ọgwụ ahụ maka okwu ụgha kwuru na ọgwụ Lungitox ga-echekwa ma gbochie ọrịa ọbụla dị n’ise anwụrụ.

    O gara n’ihu kwuo na ụlọọrụ NAFDAC kwụrụ chịm ibu agha megide ọgwụ adịgboroja dị n’ụdị ọbụla.

  12. Mba ndị Sahel enyela ụmụafọ mba Ecowas ikike ịbata mba ha na-ejighi ‘visa’

    Ndị ndu ndịagha weere ọchịchị n’ike na mba Burkina Faso, Mali na Niger emepeela ụzọ mba ha nye ụmụafọ si na mpaghara West Afrịka bata na-ejighi akwụkwọ ikike njema a kpọrọ ‘visa’.

    Ha kwuru na nke a bụ iji mee ka mmekọrịta ha na mba ndị a sikwuo ike ma kpọọ oku ka onye ọbụla chọrọ ịbata bịa biri na-enweghi nsogbu ọbụla.

    Nke a bụ ihe kachasị ọhụrụ ndị ndu mba ndị a na-eme iji wulite mmekọrịta n’etiti ha na mba ndị so n’otu ECOWAS.

    N’akwụkwọ ozi otu a kpọrọ Alliance Of Sahel State nke ọchịagha mba Mali bụ Asimi Goita tinyere aka na ya kwuru na ụmụafọ mba ECOWAS nwere ohere ịbata na mba ndị Sahel na-ejighi akwụkwọ ikike ‘visa’.

    “Ụmụafọ mba ECOWAS nwere ikike ịbata, kpagharịa, biri, guzobe ma hapụ mba so na mpaghara Sahel n’usoro iwu e depụtara,” ka ozi ahụ kwuru.

    Ndị ndu ndịagha a kwuru na mkpebi a sitere n’obi nwanne, enyi na ndọnyere ukwu, iji wulite mmekọrịta dị n’etiti ụmụafọ mba Afrịka.

    Nke a na-abịa dịka ndị ndu otu ECOWAS na-akwado ga-enwe ọgbakọ n’ụbọchị Sọnde iji leba anya n’okwu akụnaụba, nchekwa na ịdịnotu.

    Atụmatụ iwepụ ndị ogbo ha so na mpaghara Sahel n’otu ahụ nwereike ịbụ ihe kachasị mkpa ha ga-ekwu n’ọgbakọ ahụ.

    Otu afọ bụ ohere e nyere ka mba ọbụla so n’otu ahụ chọrọ ịpụ ga-agwụ n’ọnwa Jenụwarị 2025.

    N’izuụka gara aga, Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu gwara ogbo ya nke Jamini bụ Frank-Walter Steinmeier na ndụ na ọdịmma nwafọ Mali, Burkina Faso na Niger bụ ihe dị mkpa nye ndị ndu mba ECOWAS, ma sị na ọ bụ site na mkparịtaụka na amamihe ka a ga-eji kpọghachị ndị a chọrọ ịpụ.

    Tinubu bụ onyeisi ọchịchị otu ECOWAS esorola ụzọ udo na mkparịtaụka na-agba mbọ ka mba Mali, Burkina Faso na Niger lọghachite n’otu ECOWAS mana o nwebeghi isi.

  13. Ụlọọrụ ABC News ga-akwụ Donald Trump nde dọla iri na ise maka ịmetọ aha ya

    Ụlọọrụ ntaakụkọ ABC News ekwetela ịkwụ Donald Trump nde dọla iri na ise ($15m) iji tie ya aka n’obi maka akwụkwọ ọ gbara ha n’ụlọikpe mgbe otu onye ọrụ ha kwuru na a maara Trump ikpe idina nwaanyị n’ike.

    Nwamadị a bụ George Stephanopoulos kwuru okwu ahụ ọtụtụ ugboro mgbe ọ na-agbasaozi n’ọnwa Maachị afọ a dịka ọ na-ama otu onye omeiwu aka maka ịkwado Trump.

    Ndị nhazi ikpe n’afọ gara aga kwuru na Trump dara iwu “ịwakpo mmadụ”, bụ nke nwere nkọwa pụrụiche n’iwu na-achị obodo New York.

    N'ụzọ mbụ iji mezie esemokwu ahụ, ABC ga-ewepụta ozi n’ihu akwụkwọ ntaakụkọ iji gosi nnwute ma rịọ mgbaghara n’okwu ahụ Stephanopoulos kwuru.

    Nke a na-abịa dịka Trump gbara ABC na Stephanopoulos akwụkwọ.

    Ụlọọrụ ntaakụkọ ABC ga-akwụkwa otu nde dọla ($1m) bụ nke Trump mefuru n’ịgba ha akwụkwọ n’ụlọikpe.

  14. Ụtụtụ ọma nụ ooo!

    Unu abataala n'izuụka ọhụrụ, bụ oge emume ekeresimesi ji ebiri ọkụ. Ekpere anyị bụ ka ihe ọbụla ị na-achọ n'afọ a ruo gị aka.

    Biko gbalịa nọnyere anyị n'ọgbakọ BBC News Igbo maka akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ụwa.

  15. Mahmood Yakubu ka dị ndụ - INEC

    Ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka na Naịjirịa bụ Independent National Electoral Commission (INEC) ekwuputala na Onyeisioche ha bụ Mahmood Yakubu ka dị ndụ.

    Nke a dị n’ozi odeakwụkwọ mgbasaozi Mahmood Yakubu bụ Rotimi Oyekanmi bipụtara n’ọbaozi INEC n’ụbọchị Satọde 14 Disemba 2024.

    Akụkụ ozi ahụ kwuru sị “anyị anụla maka akụkọ na-efegharị na soshal midịa bụ nke kwuru na Onyeisioche INEC bụ Mahmood Yakubu nwụrụ n’ụlọọgwụ dị na Lọndọn. Ụbọchị mbụ e bipụtara akụkọ ahụ bụ na Mọnde 9 Disemba 2024”.

    “Anyị na-arịọ ọhanaeze ka ha leghara akụkọ ahụ anya n’ihi na Yakubu dị ndụ ma gbasiekwa ike. Ọ gara ọgbakọ mkparịtaụka kọmitii ụlọ omeiwu na-ahụ maka ntuliaka haziri n’ụbọchị Wenezde 11 Disemba 2024 ma nọrọkwa n’isi ọgbakọ ndị nnukwu kọmịshọna INEC nwere n’ụbọchị Tọzde 12 Disemba 2024.”

    Cheta na akụkọ fesara ebe niile na nso nso a ọkachasị na soshal midịa na-ebo ebubo na Onyeisioche INEC bụ Mahmood Yakubu nwụrụ n’otu ụlọọgwụ dị na Lọndọn dịka ọ rịachara obere ọrịa.

  16. Ụlọomeiwu South Korea ewepụla Onyeisiala Yoon Suk Yeol n'ọkwa ọchịchị

    Ụlọomeiwu mba Saụt Korịa nọrọ taa Satọde 14 Disemba, 2024, binye aka ka ewepụ Onyeisiala Yoon Suk Yeol n’ọkwa ọchịchị. Akụkọ anyị nwetara mere ka a mata na ndị omeiwu 204 binyere aka ma kwado atụmatụ iwepụ Onyeisiala Yoon.

    Ihe nke a pụtara bụ Onyeisiala Yoon ga-akwụsịtụ ọrụ ebe Praịm Mịnịsta Han Duck-soo ga-amalite ọrụ dịka Onyeisiala.

    N’agbanyeghị na ụlọomeiwu Saụt Korịa bonyere aka iwepụ Onyeisiala Yoon, ọ bụ ụlọikpe na-ahụ maka iwu mba Saụt Korịa ka ọ dịara ikpebi ka a ga-ewepụ Onyeisiala Yoon n’ọkwa.

    Ọ bụrụ na mmadụ itoolu nọ n’isi ụlọikpe ahụ binyeaka ma kwado mkpebi ụlọomeiwu ahụ, ọ bụ oge ahụ ka a ga-ewepụ Onyeisiala Yoon n’ọkwa.

    A na-ekwu na nke a nwereike inwe ọtụtụ izuụka

    Cheta na ọtụtụ ndị ngagharịiwe agbakọọla n’ogige ụlọomeiwu mba Saụt Korịa dịka ndị omeiwu na-amalite atụmatụ ịwspụ Onyeisiala Yoon Suk Yeol.

    Atụmatụ iwupụ n’ọkwa kpụrụ afọ n’ala n’izu ụka gara aga n’agbanyeghi ọtụtụ oku a na-akpọ ka ọ rịtuo n’ọchịchị.

    N’isi obodo Saụt Korịa bụ Gwanghwamun, ọtụtụ ndị nkwado Onyeisiala Yoon na-eme ngagharịiwe iji gosị nkwado ya.

  17. Ụtụtụ ọma ụmụ Igbo

    Ndewo maka isonyere anyị taa na BBC Igbo dịka anyị na-ewetara gị akụkọ sị mba ụwa niile.

    Ka ụbọchị taa mịtara gị mkpụrụ ọma!!!!!

  18. Ndị mba Sịrịa na-achọ ozu ụmụnne ha e gburu ka a kwaturu ọchịchị Assad

    A madoro foto ndị mmadụ nwụrụ anwụ n'ahụ aja n’ụlọọgwụ Damascus Mustahed.

    Ndị mmadụ na-aga ekiri ndị ahụ ka ha mara na ọ bụ ndị ha maara.

    Mana ọtụtụ ndị ahụ a madoro foto ha nwụrụ n’ajọ ọnọdụ.

    N’ime ha bụ ndị ogbunigwe gbajara imi na ọnụ.

    Ọtụtụ ka anya ha adịghịzị.

    Mana ọtụtụ na ndị ụlọọgwụ ahụ na-ekwu na ndị niile e butere ozu ha ebe ahụ bụ ndị e gburu n’ụlọ nga.

    Ezinaụlọ ndị ahụ chọtara ndị nke ha na-achọ ịmara na ha a ga-enweta ozu onye nke ha ka ha buru ya ga lie ma mee akwamozu ya.

    Dọkịnta Raghas Attar na-arụ ọrụ nnyocha a kpọrọ ‘forensic’ bere akwa mgbe a juru ya etu ọ si ejikọta onwe ya ma na-enwete akụkụ ahụ ndị mmadụ e ji eme enyocha.

  19. Ụtụtụ ọma Igbo ndị ọma

    Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Jessica Nwankwo, Uzoamaka Ewuzie, Michael Ilediagu na Adline Okere ga na-ewetara gị akụkọ na-ewu na mba ụwa niile taa.

    Gaa n'ihu sonyere anyị n'akara Sọshal midịa anyị niile maka akụkọ na ihe niile anyị na-ewetara gị.

  20. America ewepụtala usoro ọhụrụ maka ụmụ Naịjirịa chọrọ Visa mba ahụ bido n’afọ 2025

    Mba Amerịka ewepụtala usoro ọhụrụ maka ndị chọrọ ịga mba ahụ nke ga-ebido n’afọ 2025.

    Usoro ọhụrụ ahụ e wepụtara maka ndị chọrọ ịbị na mba Amerịka ga-eme ka ndị na-achọ Visa ha gaa Legọs steeti ugboro abụọ tupu ajụọ ha ajụjụ ọnụ.

    Ha kwuru na amụma ọhụrụ ahụ bụ maka ndị e kwesịrị ịgba ajụjụ ọnụ na Jenụwarị 1 2025 n’ụlọọrụ nnọchịteanya mba Amerịka dị na Legọs.

    Ha kwuru na mgbanwe ahụ ga-enye ndị chọrọ ịga mba Amerịka ohere iwetecha akwụkwọ ikike niile ha kwesịrị iweta tupu ụbọchị a ga-agba ha ajụjụ ọnụ eruo.

    Ha gbakwunyere na nke ahụ ga-enye aka kwụsị mgbochi niile a na-enwe n’oge a na-emere ha Visa.