You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ụlọikpe Saụt Korịa enyela iwu ka a nwụchie Yoon Suk-yeol a chụpụrụ dịka Onyeisiala

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Disemba 2024.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Jessica Nwankwo, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere

  1. A na-eme nnyocha banyere ndị mmadụ tọrọ atọ n'ime ụlọmkpọrọ Saydnaya dị na Syria

    Ndị ọrụ ochekwa mba Syria a maara dịka White Helmets ekwuola na ha na-enyocha akụkọ kwuru na e nwere ndị a tụrụ mkpọrọ e zoro ezo n’ụlọmkpọrọ Saydnaya.

    Ha kwuru na ha ezigala ndị ọrụ gbata gbata ise n’ụlọmkpọrọ ahụ ma kwuo na e nwere onye maara maka ụlọmkpọrọ ga-enyere ha aka na nnyocha ahụ.

    Ụlọmkpọrọ Saydnaya bụ otu ụlọmkpọrọ a tọhapụrụ ndị nọ n’ime ya oge ndịagha nnupuisi nwere ọnọdụ na mba Syria.

    Ndị ọchịchị Damascus kwuru na ha na-agba mbọ ime ka ndị ọzọ nọ n’ụlọmkpọrọ nwere onwe ha ọkachasị ndị na-enweghịike iku ume maka na ha anaghị enweta ikuku.

    Obi ọchịchị Damascus arịọla ndị bụbu ndịagha na ndị ọrụ nchekwa ụlọmkpọrọ ahụ ka ha nye ndịagha nnupuisi igodo ụlọmkpọrọ dị n’okpuru ụlọmkpọrọ ahụ iji mee ka mmadụ rurupuku narị e ji eji nwere onwe ha.

  2. Donald Trump aṅụọla iyi ịkwụsị ụmụaka mba ọzọ a mụrụ n'Amerịka ịbụ nwafọ

    Donald Trump ahọpụtara dịka onyeisiala mba Amerịka ekwuola na ọ ga-agbaghara ndị ahụ so mee ngagharịiwe n’ụlọomeiwu mba ha bụ ‘Capitol’ ngwa ngwa o weere oche ọchịchị.

    Na mkparịtaụka ya na ụlọọrụ mgbasaozi NBC nwere, Trump kwuru “Ndị a bi n’ọkụ mmụọ.”

    O kwuru na ọ ga-agbaghara ndị a mana a ga-eleba anya n’ihe ha mere n’otu n’otu iji mana na ọ ga-eme nke ahụ ngwa ngwa.

    Trump ṅụkwara iyi na ọ ga-egbochi atụmatụ ikike mere ụmụaka ndị mbịara mbịa mụrụ na mba Amerịka ịbụ nwafọ ha.

    Kama ọ sị na ya na pati Democrat ga-arụkọ ọrụ iji hụụ na e nyeere ụmụaka ndị batara n’Amerịka na-enwehji akwụkwọ aka inwete akwụkwọ.

    Trump kwuru na ọ ga-eji ikike o nwere dịka onyeisiala gbanwee iwu a nyere nwata a mụrụ n’Amerịka ịbụ onye mba ahụ.

    Iwu a kpọrọ ‘Birthright citizenship’ malitere na mgbanwe iwu mba Amerịka nke ugboro 14 – nke kwuru na nwata ọbụla a mụrụ n’Amerịka ga-abụ nwafọ ha na-agbanyeghi na nne na nna ya abụghị ndị Amerịka.

    “Anyị ga-ahụ na a gbanwere ya,” ka Trump kwuru. “Anyị nwereike ịga jụọ ndị mmadụ ajụjụ. Mana anyị kwesịrị ịkwụsị ya.”

    Trump gakwara n’ihu kwuo na ọ ga-emezu nkwa o kwere n’ịchụpụ ndị mbịara mbịa na-enweghi akwụkwọ zuruoke nke gụnyere ndị ezinaụlọ ha bụ ndị Amerịka.

    “Achọghị m ikewa ezinaụlọ,” ka o kwuru, “otu ụzọ m nwereike isi mee ka m ghara ikewa ezinaụlọ bụ site n’ichịkọta ha ọnụ ma chụlaa ha.”

  3. Ụmụibe unu abọọla chi?

    Obi sara mbara ka anyị ji anabata unu n'izuụka ọhụrụ ma na-asị ka ụbọchị taa maara gị na mma.

    Cheta na-anọnyere anyị n'ọgbakọ BBC Igbo maka akụkọ ihe ndị dị mkpa n'ụwa gbaa gburu gburu.

    Daalụ!

  4. Onyeisiala Tinubu ekeleela John Mahama na mmeri ya na ntuliaka Onyeisiala Ghana

    Onyeisiala Naịjirịa Bola Tinubu ekeleela John Dramani Mahama nke pati (NDC) na mmeri ya na ntuliaka ọkwa onyeisiala Gana. Nke a na-abịa dịka osote onyeisiala Gana bụ Mahamudu Bawumia kwuru na ya kpụrụ afọ n’ala na ntuliaka ahụ.

    Akwụkwọozi si n’obi ọchịchị Onyeisiala Tinubu kwuru na ọ na-atụ anya na mmekọ dị n’etiti Gana na Naịjirịa ga-aga n’ihu ma nweta udo na mba dị na mpaghara Ecowas.

    Onyeisiala Tinubu gara n’ihu kelee ụmụafọ Gana maka etu ha si pụta n’igwe bịa tụọ vootu ha na ntuliaka ahụ. O kelekwara Muhamadu Bawumia maka ịnabata mpụtara ntuliaka ahụ tupu ụlọọrụ Electoral Commission (EC) kwuputa mpụtara ntuliaka ahụ.

    A na-atụ anya mpụtara ntuliaka ahụ n’aka ụlọọrụ EC.

  5. Pati NDC ekwuola na ọ bụ ha na-emeri na ntuliaka mba Gana

    Pati na-anọghị n’ọchịchị na mba Gana bụ NDC ekwuola na ọ bụ ha na-emeri na ntuliaka ọkwa onyeisiala mba ahụ.

    Ọnụ na-ekwuru pati a bụ Sammy Gyamfi na mgbasaozi o mere kwuru na obi siri ha ike na ha ga-emeri na mpaghara atọ bụ ebe a kachasị azọ vootu.

    Mpaghara ndị a gụnyere Mankraso, Obuasi East ma Tepa.

    Gyamfi kwuru na ha meriri n’oche ọchịchị anọ ha jibu na mbụ na mpaghara Ashanti ma tinyekwuo oche ọchịchị atọ nke mere oche ọchịchị asaa.

    O kwuru “ọ bụrụ na anyị merie na mpaghara atọ a bụ ebe a na-azọsi ike, anyị ga-emericha na ha, iji mee ya oche ọchịchị 10 na mpaghara ahụ bụ ebe pati NPP na-achị ugbua gbara mgbọrọgwụ.”

    Ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka na mba Gana akpọpụtabeghi mpụtara ntuliaka ahụ.

    Mana Pati a na-ewesara ụlọọrụ a iwe ma boo ha ebubo na ha na-egbu oge n’ịkpọpụta mpụtara ntuliaka ahụ.

  6. Osote Onyeisiala mba Gana ekwetela na ọ kụrụ afọ n’ala na ntuliaka ọkwa onyeisiala

    Osote Onyeisiala mba Gana bụ Mahamudu Bawumia ji aha pati na-achị ugbua azọ ọkwa onyeisiala ekwetala na John Mahama bụbu onyeisiala mba ahụ meriri ya na ntuliaka nke afọ a.

    Nke a na-abịa na-agbanyeghi na ụlọọrụ ‘Electoral Commission’ (EC) na-ahụ maka ntuliaka akpọpụtabeghi mpụtara ntuliaka ahụ.

    Osote Onyeisiala Bawumia kwupụtara nke a na mgbasaozi o ma sị na o mere nke a site na mpụtara ndị ọ hụrụla.

    Mba Gana mere ntuliaka ọkwa onyeisiala n’ụbọchị Satọde iji họpụta onyeisiala ọhụrụ nakwa ndị ụlọomeiwu.

  7. Ndịagha nnupuisi kwuru na ha akpachiela isiobodo Damascus nke mba Syria

    Onyendu ndịagha nnupuisi na mba Syria ekwuola na ndịagha ya akpachiela Damascus bụ isiobodo mba ahụ.

    Abu Mohammed al-Jawlani kọwara mmeri ahụ dịka ihe nnukwu akụkọ, ma gwaa ndịagha ya ka ha ghara imerụ onye ọbụla wụsara ngwa ọgụ ya ahụ.

    Ndịagha nnupuisi a nọọrọ na mbụ kwuo na ha akpachiela obodo Homs, mbụ obodo nke atọ kachasị ukwuu na mba ahụ.

    Dịka akụkọ si kwuo, ndịagha nnupuisi a kwuru na ha abaalan’isiobodo Damascus, dịka Onyeisiala ha bụ Bashar al-Assad gbara ọsọ gbaga ebe a na-amaghị ebe ọ bụ.

    Mkpachi nke ndịagha nnupuisi a so n’otu Hayat Tahrir al-Sham (THS) bụ ezigbote ihe ịdọla aka azụ nye Onyeisiala Bashar al-Assad, dịka o kewara isiobodo Damascus site n’obodo ndị ọzọ mepere emepe na mba ahụ.

    Ndịagha nnupuisi a kwuburu na ha na-erute nso n’obodo Damascus site na mpaghara ugwu, ọwụwa anyanwụ nakwa ndịda – ebe ndịagha Syria na-enweghi ike igbochi ha.

    Homs bụ ebe ndị na-ama ọchịchị gọọmentị aka nwere ezi agba na mbido agha nke malitere n’afọ 2011.

    Ndịagha nnupuisi jichiri ọchịchị n’ụfọdụ mpaghara obodo ahụ ruo afọ atọ mgbe gọọmentị weghaara ọchịchị n’obodo niile ahụ site na nkwekọrịta enyemaka United Nation n’afọ 2014.

    A na-ahụtazi ọchịchị Assad dịka nke chọro ịda, dịka obere ikike fọọrọ ya, dịka ọ dị ugbua, akụkọ kwuru na a maghị ebe onyendu a nọ.

    Kepu kepu na-ekwu na ndịagha nnupuisi a eruola na mpụta isiobodo Damascus, wakpoo ụlọ mkpọrọ a ma ama bụ Sednaya ma tọhapụ ndị e ji n’ụlọmkpọrọ ahụ.

    Ụfọdụ ndị bi n’obodo kwuru na ha nụrụ ụda egbe n’isiobodo ha.

    Enwekwara ụfọdụ akụkọ na-ekwu na ndịagha Syria ahapụla ụfọdụ obodo ndị ha jibu e ji gbaa ọsọ.

    O dobeghi anya ma ndịagha nnupuisi a ọ ga-aga n’ihu na-akpachi obodo dị iche iche na-enweghi ndị ga-ama ha aka n’ihu.

    Na mbụ ndị na-eme ngagharịiwe kwaturu akpụrụ akpụ nna Onyeisiala Assad nwụrụ anwụ bụ Hafez ma kpụrụ ya na-aga n’okporoụzọ.

    Nke a na-egosi iwe na obi adịghị mma – ihe na-enweghi ike ime n’ụbọchị ole ma ole gara aga.

    Nke a gosiri na e nwere ike inwe ndị nnupuisi n’isiobodo.

    Obi dị otụtụ ndị mmadụ ụtọ n’ihe a ndịagha nnupuisi mere.

    Mana na mba dịka Syria nke nwere nkewa, o nweghi onye nwereike ịgba ama ihe ọzọ ga-eme.

    Ọ dịka ọtụtụ ndị mmadụ ọ ga-anabata ka ọchịchị Assad bịa na njedebe – nke ọ dịka ọ fọtụrụ nwa obere ihe.

    Mana abụrụ, gọọmentị nke a gafee, kedụzie ihe ozọ?

    Otu agha nnupuisi HTS a nwere mmekọrịta ya na otu na-eyi ndụ egwu a kpọrọ Al Qaeda ma na-achọ igosi onwe ha ka ndịagha obodo kamgbe ọtụtụ afọ.

    Ọtụtụ ndị mmadụ enweghi ntụkwasịobi n’ebe ha nọ, na-ekwu na ha bụ otu ọjọọ, na egwu na-atụ n’ihe ọzọ nwereike ime.

  8. Ka ụbọchị taa maara gị na mma ooo!

    Obi ọma ka anyị ji anabata gị n'ọgbakọ BBC n'ụbọchị ụka a ma na-asị ka ihe ọma rute gị aka taa.

    Biko gbajụụ n'ọbaoxxi BBC Igbo maka akụkọ ndị nwereike imetụta gị n'ụwa gbaa gburu gburu.

    I meela.

  9. Ntuliaka emechiela dịka ngụkọ vootu bidoro na Ghana

    Ntuliaka nke ọkwa onyeisiala emechiela na mba Gana dịka ngụkọ vootu malitere.

    Ngalaba na-ahazi ntuliaka na mba ahụ bụ EC bụ naanị ndị nwere ikike ịkpọpụta mpụtara ya bụ ntuliaka dịka ndị mmadụ na-atụ anya ịnụ olu ha ugbua.

    Ka ihe si kwụrụ ndị isi ọgbọ ntuliaka dị icheiche na-agụkọ, na-edokọ ma na ahazi vootu niile ndị a tụrụ atụ iji ma otu ndọrọndọrọ meriri na ebe ha meriri.

    Patị nke nọ n'ọchịchị ugbua bụ NPP kwuputakwara na obi adịghị ha mma dịka etu ndị mmadụ esighi pụta n'uju ịtụ vootu na ya bụ ntuliaka.

    Ebe ngalaba haziri ya bụ ntuliaka kwukwara na ndekọ nke ha gosiri na ọ bụ naanị pasentị 50 n'ọnụọgụgụ ndị niile tozuru ịtụ vootu bụ ihe pụtara mee ntuliaka.

    Vootu ndị atụrụ gara n'ihu ọfụma n'udo n'ihe dịka ebe niile mana ọgbaghara dapụrtara n'obodo Nyankpala dị n'Ugwu mba ahụ butere ọnwụ otu onye.

    Ndị uweojii kwuru na ha anwụchiela mmadụ anọ maka ya bụ ihe mere.

  10. Onyeisiala South Korea agbanahụla mwepụ

    Ndị omeiwu South Korea adaala mba iwepụ onyeisiala ha n’ọkwa n’ihi ikikere o tinyere n’aka ndịagha.

    Atụmatụ iwu ndị omeiwu ahụ wepụtara iji gosi na ha akwadoghị ihe Yoon Suk Yeol mere enwetazughị ọnụọgụ vootu narị abụọ (200) ha chọrọ iji bufee ya dịka ọ fọdụrụ naanị vootu atọ ka o zuo oke.

    Cheta na Yoon Suk Yeol mere ihe tụrụ ọha n’anya n’abalị Tuzde bụ oge o kwuputara na ya enyefeela ndịagha ikikere n’ihi iyi egwu mba North Korea.

    Mana o mechara doo anya na ọ bụghị iyi egwu mba ọzọ kpatara o ji nwee mkpebi ahụ kama ọ bụ n’ihi ndọrọndọrọ ọchịchị nke onwe ya.

  11. Ndị uweojii Ghana anwụchiela mmadụ anọ maka otu onye nwụrụ na ntuliaka

    Ndị uweojii mba Ghana ekwuola na ha anwụchiela mmadụ anọ aka ha dị n'egbe agbapụrụ gburu otu onye ma merụọ onye ozọ ahụ na mba ahụ.

    N'ozi nke ha wepụtara n'akara X bụbu Twitter, ha sị na ya bụ ihe mere na mpaghara Nyankpala dị n'ugwu mba ahụ.

    Ha kwuru "e burula ozu onye nwụrụ anwụ gawa ụlọ ozu dịka onye merụrụ ahụ na-anata ọgwụgwọ ugbua".

    Dịka ihe si kwụrụ ndị agha nọzi n'obodo ahụ ugbua dịka nyocha ndị uweojii na-aga n'ihu.

    Akụkọ kwuru na ọgbaghara dapụtara mgbe otu onye patị ya anọghị n'ọchịchị na-aga ịme mkpesa n'aka ndị uweojii mana ndị nkwado patị nọ n'ọchịchị kwụsịrị ya.

    Ọ bụ ebe ahụ ka ọgụ si daa tupu amalite ịgba egbe n'ebe ahụ. A kwara mgbọ ahụ ihe ruru elekere iri atọ tupu e mee ihe maka ya.

  12. Ndị uweojii akpachiela ndị ojiegbe, napụta ha ụgbọala n’Anambra steeti

    Ndị ọrụ nchekwa Anambra steeti akpachiela ndị ojiegbe n’okporoụzọ siri Umuchu gawa Amesi na Uga.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambra steeti bụ Tochukwu Ikenga sịrị na ọ bụ n’oge abalị Tọzde 5 Disemba 2024 ka a kpachiri ndị ojiegbe ahụ.

    Ngwongwo a napụtara ha gụnyere ụgbọala Hilux na-acha anụnụ anụnụ nwere akara GDD 440 TJ bụ nke a na-enyo enyo ha napụrụ mmadụ n’ike.

    Dịka Ikenga siri kwuo, aka kpaara ndị ojiegbe ahụ ka ha wakpochara ndị uweojii ebe ha na-eche nche n’Ajali dị n’Okpuru ọchịchị Orumba.

    Ọ sịrị na ndị ojiegbe ahụ na ndị uweojii kwakọrịtara mgbọ dịka mgbọ egbe tụtara ndị uweojii abụọ bụ ndị na-anara ọgwụgwọ n’ụlọọgwụ ugbua.

    Ọ kọwakwara na ndị ojiegbe ahụ mụnyere ụgbọala abụọ ndị uweojii ji arụ ọrụ ọkụ n’ụbọchị ahụ ha mere mwakpo.

  13. Ndị ojiegbe atọhapụla onye ntaakụkọ n’Imo steeti ka ọ kwụchara 6m

    Ndị ojiegbe atọhapụla onye ntaakụkọ ụlọmgbasaozi News Agency of Nigeria (NAN) bụ Maazị Gregory Madu ka ezinaụlọ ya kwụchara nde naịra isii na ụma isii (6.6m).

    Otu onye BBC Igbo gbara ajụjụ kwuru na ọ bụ n’ụbọchị Satọde 7 Disemba 2024 ka a tọhapụrụ Gregory Madu oge ezinaụlọ ya kwụchara ego ntọhapụ ahụ.

    Cheta na ndị ojiegbe tọọrọ nwaamadị ahụ n’ụbọchị Tọzde 5 Disemba 2024 oge ọ gara ilele ala na mpaghara Irette dị n’Okpuru ọchịchị Owerri West n’Imo steeti ma kpọọ n’ekwentị ka enye ha ego ntọhapụ.

    Oge anyị kpọrọ ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ ndị uweojii Imo steeti bụ Henry Okoye n’ekwentị, ọ sịrị na ụlọorụ ha nwetara ozi na ndị ojiegbe tọọrọ Maazị Gregory bụ nke mere ha ji zipụ ndị uweojii maara nke ekwe na-akụ ka ha napụta ya ma nwụchie ndị tọọrọ ya.

    Mana ka ọ dị, ọ sịrị na ya enwetabeghị ozi na atọhapụla ya ma ya fọdụzie na ezinaụlọ ya kwụrụ nde naịra isii na ụma isii.

  14. Ntuliaka ọkwa Onyeisiala Ghana: Anyị na-atụ anya na ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị ga-erube isi nye iwu – Goodluck Jonathan

    Onye bụbu Onyeisiala Naịjirịa bụ Goodluck Jonathan ekwuola na ọ na-atụ anya ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-azọ ọkwa Onyeisiala mba Gana ga-erube isi nye iwu ma nweta udo.

    Goodluck Jonathan bụ onyeisi ndị otu Ecowas gara ịhụ ka ntuliaka ahụ si aga, kwuru nke a oge ọ gwara ndị ntaakụkọ okwu na mpagharaAyawaso West Wuogon.

    O kwuru na otu Ecowas na ndị ọnụ na-eru n’ọkwu ga-arụkọ ọrụ ma gbochie nsogbu ọbụla nwereike ịpụta na ntuliaka a.

  15. Ihe ndị tụrụ vootu na Ghana na-atụ anya ya n'aka onye ọbụla nwetara mmeri

    Dịka ntuliaka ọkwa Onyeisiala na-aga n’ihu na Gana taa bụ Satọde7 Disemba, 2024, ọtụ ndị tụrụ vootu ekwuola ihe ha na-atụ anya n’aka onye ga-anọchi Nana Akufo-Addo dịka Onyeisiala Gana.

    Bridget Asante gbara afọ iri abụọ na ise kwuru na nke bụ oge mbụ ọ na-atụ vootu. O kwuru na ya tụrụ onye bụ uche ya vootu ma kwuo na ọ na-atụ anya na onye ọbụla nwetara mmeri na ntuliaka a ga-enweta ezi mmepe mba Gana ma mee ka obi dị ndị ntorobịa mma.

    Ụfọdụ ụmụnwaanyị na-azụahịa kwuru na ha na-atụ anya na onye ga-emeri na ntuliaka a ga-eme ka Gana dị mma ma hazie ajọ ọnọdụ akụnaụba nke ha kwuru na o mere ka ọnụahịa ihe niile rịa.

  16. Otu nwaanyị di ime enwetela onwe n’ụlọọgwụ ka ndị ọrụ EFCC wakporo ụlọ ha n'Abia Steeti

    Otu nwaanyị dị ime n’Abia steeti enwetela onwe ya n’ụlọọgwụ ka ndị ọrụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) wakporo ụlọ ya dị n’Umuahia ụbọchị Fraịde 6 Disemba 2024.

    Di nwaanyị ahụ ma bụrụkwa onye ji ego achụ ego Ebuka Ezeanyagu, kwuru na ndị ọrụ EFFC ahụ bu egbe wuchiri ma kụtuo ugboaja ụlọ ha ma ghara ikwu ihe ha ji wakpo ụlọ ya nakwa onye zitere.

    Ezeanyagu kwuru na ndị ọrụ EFCC ahụ mekpere ya na nwunye ya ahụ nke mere ka nwunye di ime afọ asatọ nweta onwe ya n’ụlọọgwụ.

    Ọ kọwara na a napụrụ ha ekwenti ha ma nyochaa ka e nwere ihe na-egosi nrụrụaka ọbụla dị n’ime ya.

    Ezeanyagu gara n’ihu kọwaa na ha nyeghachiri ha ekwenti ka ha na-ahụghị ihe nrụrụaka ọbụla n’ime ya ma rịọ ha mgbaghara tupu ha apụọ.

    BBC zigara onyeisi mgbasaozi EFCC iji nụrụ ọnụ mmiri okwu ya mana ọ zaghị anyị oku.

  17. Ndị mba Ghana amalitela itu vootu na ntuliaka ọkwa Onyeisiala

    Ndị mba Gana amalitela itu vootu na ntuliaka ọkwa Onyeisiala. Akụkọ kwuru na mmadụ ruru nde iri na asatọ (18 million) debanyere aha ha dịka ndị ga-atụ vootu iji họpụta Onyeisiala ọhụrụ nakwa ndị omeiwu.

    E nwere otu nwaanyị n’ime mmadụ iri na abụọ (12) na-azọ ọkwa Onyeisiala na ntuliaka a. Mana a na-ekwu na mmadụ abụọ isi kara aka na ntuliaka a bụ Osote Onyeisiala bụ Mahamadu Bawumia na onye bụbu Onyeisiala bụ John Mahama.

    BBC chọpụtara na tupu ntuliaka amalite, ọtụtụ mmadụ kwụrụ n’ahịrị ma jikere ibinye aka na ntuliaka a. Ndị mmadụ kwuru na ajọ ọnọdụ akụnaụba mba Gana nwereike imetụta ntuliaka a.

    Onye ọbụla nwetara mmeri na ntuliaka a ka a na-ekwu na ajọ ọnọdụ akụnaụba bụ ihe ga-echere ya aka mgba.

    Onyeisioche ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka bụ Jean Mensa kwuru na ụlọọrụ ya dị njikere ịhazi ntuliaka n’ụzọ ziri ezi.

    Jean Mensa kwuputara nke a oge ọ na-enye ndị ọrụ ya ntuziaka tupu ntuliaka amalite. O kwuru na ọrụ ụlọọrụ ya bụ ịhazi ntuliaka na ọ bụghị ịkwado onye ọbụla na-azọ ọkwa Onyeisiala.

  18. Ụtụtụ ọma ndị be anyị

    Ka ụbọchị taa gaziere gị dịka ị na-esonyere anyị maka akụkọ gbara ọkpụrụkpụ na mba ụwa niile.

    Ndewoo...........

  19. Ndị ojiegbe egbuola ụkọchukwu na nwaanyị ọzọ na Taraba

    Ndị uweojii Taraba steeti ekwuola na mmadụ abụọ anwụọla na mwakpo abụọ dị iche nke ndị ojiegbe mere na steeti ahụ.

    Abdullahi Usman bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ gwara ụlọntaakụkọ Channels na ndị ahụ ji mma ukwu gbarie ụzọ ụlọ ahụ ma gbaa otu nwaanyị na-agụ akwụkwọ egben’azụ nke pụtara ya n’afọ.

    “Dịka ha kurichara ụzọ ebe ahụ ndị bi na ya bụ ụlọ ji ụjọ gbapụta mana n’ihe ịtụ anya, o nweghi onye ndị ahụ tọọrọ dị ka ndị mmadụ si chee”.

    Ọ bụ n’akụkụ Jebanbur dị na Jalingo bụ isi obodo Taraba steeti ka nke a mere.

    N’akụko yiri ya, ndị ojiegbe gbagbukwara otu onye ụkọchukwu n’ụlọ ya n’atọrọghi onye ọbụla bụ ihe ịtụanya dịka Usman onye ụweojii si kọwa.

    O kwukwara na mmadụ abụọ ahụ nwụrụ n’ụlọọgwụ dịka a na-agba mbọ ịzọ ndụ ha.

    Ha kwuru na ha amalitela nyocha banyere ihe na-eme ma kwuo na ha agaghị ezuike rue mgbe ha chọpụtara ndị kpara mkpa mkpa a.

  20. Ọrịa Lassa fever egbuola mmadụ 23 n’Ebonyi steeti

    Gọọmenti Ebonyi steeti ekwuola na ọrịa Lassa fever egbuola mmadụ iri abụọ na atọ (23) na steeti ahụ.

    Aka na-achị Ebonyi steeti bụ Francis Nwifuru kpuhere nke a n’ụbọchị Tọzde 5 Disemba 2024 n’ọgbakọ Mịnịstrị na-ahụ maka ahụike na steeti ahụ haziri n’Abakiliki.

    Nwifuru kwuru na a chọpụtara ọrịa ahụ n’ime mmadụ iri anọ na asatọ (48) oge e nyochara mmadụ narị atọ na iri itolu na anọ (394) site n’ọnwa Jenụwarị ruo Disemba afọ 2024.

    Ka o sinadị, Gọvanọ ahụ kwuru na Gọọmenti Ebonyi steeti na-agba mbọ ịrụnye ụlọọgwụ n’ime mpaghara zoonu atọ e nwere na steeti ahụ iji kwalite nlekọta ahụike ndị bi n’ime obodo.