You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ụlọikpe Saụt Korịa enyela iwu ka a nwụchie Yoon Suk-yeol a chụpụrụ dịka Onyeisiala

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Disemba 2024.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Jessica Nwankwo, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere

  1. Mba America ekwuola na aka Russia nwereike ịdị n’ụgbọelu Azerbaijan kpọkara

    Ọnụ na-ekwuru mba Amerịka bụ John Kirby, ekwuola na ihe obodo ha hụrụ na-egosi na mba Rọshịa ga-ama ihe mere ụgbọelu Azerbaijan jiri kpọkaa n’abalị 25 Disemba n’afọ 2024, ma gbuo mmadụ iri atọ na asatọ (38).

    Kirby akọwachaghị ihe mba Amerịka hụrụ nke ọma mana ọ gwara ndị ntaakụkọ na mba Amerịka ebidola inyocha ihe mere ụgbọelu ahụ.

    Etu e siri kwuo, ụgbọelu ahụ sitere n’ikuku Rọshịa gbawa ọkụ mgbe ọ chọrọ ịda n’obodo Chechnya tupu e chegharịa ya ihu n’osimiri gaa Kazakhstan, ebe ọ kpọkara.

    Kremlin ekweghị ekwu okwu banyere ihe ahụ mere mana onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka ụgbọelụ na mba Rọshịa ekwuola na ihe mere na Chechnya na-agbagwoju anya n’ihi ogbunigwe mba Yukren tụrụ na mpaghara ahụ.

    Kirby kwukwara na mba Amerịka ahụla ọtụtụ foto ugbọelu kpọkara akpọka a na-ekesa.

    Mba Azerbaijan nwe ụgbọelu ahụ eboghị Rọshịa ebubo mana Mịnịsta na-ahụ maka njem kwuru na ihe mere ụgbọelu ahụ sitere na nnyonye anya ndị amaghị aha ya.

  2. Igbo Chukwu gọziri agọzi, ụnụ asaala chi eee

    Anyị awụchiela ọzọ iwetara gị akụkọ dịka o si akpọtụ na mpaghara ụwa dị iche iche taa.

    Gaa n'ihu sonyere anyị!

  3. Ụgbọala nri mbụ abatala Sudan kemgbe agha bidoro

    Ụgbọala nri abatala isi obodo mba Sudan bụ Khartoum. Nke a bụ ụgbọala nri na-abata Sudan kemgbe agha malitere n’ọnwa Eprel, 2023.

    Nchọpụta otu United Nations mere kwuru na agha ahụ dị n’etiti ndịagha na otu Rapid Support Forces (RSF), ebutela oke agụụ na Sudan.

    Onye ọrụ enyemaka bụ Duaa Tariq gwara BBC na oge ụgbọala nri ahụ batara mpaghara ndịda Khartoum, a nụrụ mkpu ọṅụ na ọchị ebe niile.

    Cheta na ndị ọrụ enyemaka ekwuola na mgbochi ụzọ sitere n’agha ahụ gbochiri ha ibubata nri n’ebe ahụ.

    Otu UN, ndị ọrụ gọọmenti Sudan na ndịagha nwere nkwekọrịta nke mere ka ibubata nri ahụ dị mfe.

    Ụgbọala nri ahụ batara dị 28. Otu Unicef bụ ndị zitere ụgbọala ise, kwuru na ha bugara nri n'ụlọọgwụ Al Bashayer Hospital na ụlọọrụ ahụike ndị ọzọ dị na Khartoum.

  4. Ecowas ekwuola na ebubo mba Niger boro Naịjirịa bụ ụgha

    Otu Economic Community of West African States (Ecowas) ekwuputala nkwado ha nye Naịjirịa na mba ndị otu ha ndị ọzọ banyere ebubo iyi egwu mba Nije boro Naịjirịa.

    Nke a na-abịa dịka Ọchịagha na-achị Nije bụ Abdourahamane Tchiani boro Naịjirịa ebubo na ya na mba Fransị na-akpa nkata inweta nsogbu na mba Nije.

    Akwụkwọozi Ecowas wepụtara mere ka a mata na eziokwu adịghị n’ebubo ahụ.

    Ozi ahụ kwuru na “Naịjirịa bụ mba na-agba mbọ inweta udo n’Afrịka gbaa gburugburu. Ọrụ MNJTF mịtara mkpụrụ maka nnukwu mbọ Naịjirịa gbara. Nke gosịrịezi atụmatụ Naịjirịa nwere maka mwulite udo n’Afrịka.

    Ecowas kpọrọ oku ka mba Afrịka niile jikọọ aka mwulite udo ma sepụ aka n’ebubo dị etu a nke nwereike ibute nsogbu n’Afrịka.

  5. Ị maara maka nwa Gọvanọ Jigawa steeti ahụ nwụrụ na mberede okporoụzọ?

    Ọdachi dakwasịrị ezinaụlọ aka na-achị Jigawa steeti bụ Gọvọnọ Umar Namadi, dịka nwa ya nwoke bụ Abdulwahab Umar Namadi nwụrụ n’ihe mberede okporoụzọ.

    Ihe mberede ahụ mere otu nkpụrụ ụbọchị nne Gọvanọ Namadi bụ Hajiya Maryam Namadi nwụchara.

    Dịka akụkọ sị kwuo, Abdulwahab na ndị enyi ya si Kafin Hausa eme njem aga Dutse oge ụgbọala ha nọ na ya kụkpọrọ.

    Ndị enyi ya merụrụ ahụ nọ n’ụlọọgwụ Dutse General Hospital enweta nleta ebe ozu Abdulwahab dọrọ n’ọba ozu ugbua.

    Otu onye ezinaụlọ Gọvanọ Namadi na-achọghị ka akpọ aha ya kwuru na ihe mberede ahụ bụ ihe ọmaa jiji nye ezinaụlọ ha.

    N’okwu ya “Gọvanọ Namadi ka na-eru uju ọnwụ nne ya nwụrụ ọtụ ụbọchị gara aga tupu ọdachi nke dakwasị ha”.

    Ka ọ dị ugbua, ọtụtụ ndị obodo Dutse na Kafin Hausa na-aga n’ụlọ Gọvanọ Namadi iji tie ha aka n’obi maka njinji a.

    Otu enyi ezinaụlọ ya bụ Alhaji Musa Ibrahim kọwara Abdulwahab lara mmụọ dịka nwata nwere obi umeala ma bụrụ onye nwere ezi ọdịnihu.

  6. Ihe ruru mmadụ atọ anwụọla n’ihe mberede okporụzọ na Norway

    Ndị uweojii ekwuola n’ihe ruru mmadụ atọ anwụọla n’ọdachi ihe mberede okporoụzọ mere na mba Norway.

    Ihe mberede ahụ mere na mpaghara Hadsel nke n'ugwu ọdịda anyanwụ nke oke osimiri.

    Ozi ndị ọchịchị wepụtara kwuru na ụgbọala ahụ gbapụrụ na-okporoụzọ nwee daba n’ime ọdọ mmiri Asvatnet.

    Akụkọ kwuru na ụgbọala ahụ bu mmadụ iri ise na asatọ nke ọtụtụ n'ime ha bụ ndị mba ofesị oge ihe mberede ahụ mere.

    Ndị uweojii kwuru na mmadụ meruru nnukwu ahụ ebe ebugara ndị ọzọ meruru ahụ ụlọọgwụ maka nleta.

    Ha kwuru na ebupula mmadụ niile nọ n'ụgbọala ahụ ebe ndị ọrụ nchekwa nọ n'ogige ahụ ugbua.

  7. Ụlọomeiwu Saụt Korịa ebinyela aka iwepụ Han Duck-soo dịka Onyeisiala

    Ụlọomeiwu mba Saụt Korịa ebinyela aka iwepụ onye nọ dịka Onyeisiala bụ Han Duck-soo. Nke a na-abịa n’ime izuụka abụọ ụlọomeiwu ahụ chụpụrụ Onyeisiala Yoon Suk Yeol.

    Ndị omeiwu 192 binyere aka ka e wepụ Han Duck-soo n’agbanyeghị na ọ bụ naanị vootu 151 bụ zuruoke iwepụ ya.

    Cheta na Praịm Mịnịsta Han Duck-soo nwere ọkwa Onyeisiala oge Ụlọomeiwu mba ahụ nọrọ ụbọchị Satọde 14 Disemba, 2024, binye aka ka ewepụ Onyeisiala Yoon Suk Yeol n’ọkwa ọchịchị. Ọ bụ ndị omeiwu 204 binyere aka ma kwado atụmatụ iwepụ Onyeisiala Yoon.

    Ka ọ dị ugbua, Han ga-akwụsịtụ ọrụ dịka Onyeisiala ngwangwa ụlọomeiwu gwara ya mpụtara mkpebi ha.

    Dịka nke Yoon, ọ bụ ụlọikpe iwu mba Saụt Korịa ga-ekpebi ma kwuo ka a ga-ewepụ ya n’ọkwa. Ụlọikpe nwere abalị 180 iji kpebi nke a.

  8. Ụnụ abọọla chi ụmụ Igbo

    Anyị ji obi ọcha anabata gị n'ọgbakọ BBC Igbo taa.

    Sonyere anyị dịka anyị ga na-ewetara gị akụkọ si n'akụkụ mbaụwa dị iche iche taa.

    Daalụ nụ...

  9. Atiku Abubakar akatọọla ogbunigwe ndịagha Naịjirịa tụrụ ndị nkịtị na Sokoto steeti

    Onye bụbu Osote Onyeisiala Naịjirịa bụ Atiku Abubarka akatọọla etu ndịagha Naịjirịa si tụọ ogbunigwe ma tụgbuo igwe mmadụ na Sokoto Steeti.

    Ka Gọọmenti Sokoto steeti na-ekwu na ogbunigwe ahụ tụgburu ndị nkịtị, ndịagha Naịjirịa na-ekwu na ọ bụ ndị na-enyi ọha egwu a kpọrọ Lakurawa ka ha tụrụ ogbunigwe.

    Atiku Abubakar kwuru na agbanyeghi na ọ dị mkpa ịtụ ndị na-eyi ndụ egwu ọgbụnigwe mana e kwesiri ịtụ udiri ọgbụnigwe ahụ etu ọ gaghị emetuta ndị nkịtị.

    N’okwu o wepụtara na soshal mịdịa X, Atiku kwuru na “ụdịrị ogbunigwe a tụrụ n’obodo Gidan Sama na Rumtuwa dị na Sokoto steeti bụ ihe onye ọbụla kwesiri ịkatọ”.

    “Igbu ndị aka ha dị ọcha, ụmụ nne na ụmụ nna anyị abụghị ihe onye ọbụla ga-akwado”.

    “Ihe dị etu a ga-eme ọtụtụ ndị mmadụ aghara ịma ihe dị iche n’etiti ndịagha Naịjirịa na ndị omekome na-enyi ndụ egwu. Anyị kwesiri ịkwụsị ụdịrị igbu ndị mmadụ etu a”.

    Atiku nyere ndụmọdụ ka “e nwe ihe a mụtara n’ihe mere n’oge gara aga na Naịjirịa. Mee ka ndụ onye ọbụla bụrụ ihe a kpọrọ mkpa ma kwụsị ime ka ezinaụlọ dị iche iche na-eru uju maka ọnwụ onye ha hụrụ n’anya e gburu”.

    Gọvanọ Sokoto Steeti bụ Ahmed Aliyu agaala njem nleta n'obodo abụọ ahụ ndịagha ụgbọelu Naịjirịa tụrụ ogbunigwe ma were ijeri naịra iri abụọ tie ezinaụlọ ha aka n’obi.

  10. Onyeisi WHO nọ n’ọdọụgbọelu mba Yemen mgbe Isreal tụrụ ogbunigwe ebe ahụ

    Onyeisi ngalaba ahụike World Health Organization bụ Tedros Adhanom Ghebreyesus nọ n’ọdọụgbọelu dị n’obodo Sanaa mba Yemen mgbe ndịagha mba Isreal tụrụ ogbunigwe ebe ahụ.

    Ogbunigwe a bụ nke gbara na mgbede ụbọchị Tọzde mebiri ụfọdụ akụrụngwa n’ọdọụgbọelu ahụ.

    Ghebreyesus kwuru “Dịka anyị na-achọ ịbanye n’ụgbọelu isi na Sanaa pụọ, n’awa abụọ gara aga, a malitere ịgba ogbunigwe n’ọdọụgbọelu ahụ.

    “Otu n’ime ndị na-eso ọdọụgbọelu anyị merụrụ ahụ. Ihe ruru mmadụ abụọ ka a sị nwụrụ.

    “Ụlọelu nziritaozi n’ọdọụgbọelu, ebe ndị chọrọ ime njem na-anọ dị nso n’ebe anyị nọ - tinyere ọkporoụzọ ebe ụgbọelu si agba ọsọ mebichara emebi.

    O kwuru na ọ bịara Yemen ịkpa nkata ka a tọhapụ otu onye ọrụ United Nations e ji eji ma lee ka ọnọdụ ndị ọrụ enyemaka si aga na mba ahụ.

    Tedros kwuru na ya na ndị ọrụ ya ga-anọ n’ọdọụgbọelu ahụ ruo mgbe a ga-emezicha ihe ndị e mebiri tupu ụgbọelu ha efepụ.

    Dịka ọtụ ugbua, ihe ruru mmadụ atọ anwụọla ebe mmadụ iri na anọ merụrụ ahụ n’ogbunigwe ahụ.

    Ndị ọrụ nchekwa mba Isreal kwuru na ha tụrụ ogbunigwe n’ọdọụgbọelu Sanaa ahụ ebe ngwagha ndị otu a kpọro ‘Houthis’ ji arụ ọrụ dị.

    Ha kwuru na ha tụkwara ogbunigwe n’igwe ọkụ latrik dị na Hezyaz na Ras Kanatib ma tụọkwa n’ọdọmmiri dị n’akụkụ Yemen ebe ngwagha ndị otu a nọcha.

    Ogbunigwe a mba Isreal tụrụ na-abịa dịka ndị otu Houthis tụrụ ogbunigwe na Tel Aviv mba Isreal ma merụọ ọtụtụ ndị mmadụ ahụ n’izuụka gara aga.

    Ogbunigwe ahụ dara n’ọgbọ ebe a na-egwuri egwu n’ụbọchị Satọde dịka mgbọ ndịagha mba Isreal gbara ka ha gbochie ya kụrụ afọ n’ala.

    Nke a mere mba Isreal jiri atụ ogbunigwe aghara aghara na mba Yemen bụ ebe ha cheere ndị otu Houthis na-edosa ngwagha ha.

    Praịm Minista mba Isreal bụ Benjamin Netanyahu fooro ntụtụ taa na ọ ga-ememina ndị otu Houthis ma kpochapụ ha.

  11. Nne Naomi arịọla ka a gbaghaara nwa ya nwaanyị na nzọgbu nzọgbu mere n'Ibadian

    Nwanyị ụkọchukwu bụ Olifunmilayo Ogunseyi bụ nne onye amụma Naomi Ogunseyi ebeela akwa arịrị ma rịọ ka a hara imemịna nwa ya nwaanyị.

    N’ihe onyonyo e tinyere n’akara Instagram Naomi bụ ebe nne ya nọ na-akọwa ihe mere n’ụbọchị ahụ mmadụ ruru iri atọ na ise nwụrụ na nzogbu-nzogbu mere n’ebe ha na-eke osikapa.

    Cheta na ka mmadụ ndị ahụ nwụchara, ndị uweojii kpụụrụ Naomi, kpụpụ ya n'ụlọikpe nke nyere iwu ka e tinye ya n'ụlọnga na nchere oge ruo n’ọnwa Jenuwarị afọ 2025.

    Tupuu nzọgbu nzọgbu ahụ emee, Naomi gara n’ụlọọrụ redio ga maa ọkwa sị na ya ga-enyere ụmụaka ruru puku ise aka.

    Nke a mere igwe mmadụ ji juputa n’ebe ọ na-eke osikapa ahụ kpatara nzọgbu nzọgbu gburu mmadụ iri atọ n’ise ahụ.

    Nne Naomi na-ekwu sị “afọ 2025 bụ afọ iri Naomi na-eguzobe mmemme ọ ji enyere ụmụaka na ụmụnwaanyị aka. Ọ na-eme ya afọ niile na-enweghị nsogbu”.

    Ọ gara n’ihu rịọ ka e meere nwa ya nwaanyị ebere maka na aka ya dị ọcha.

  12. Ndị uweojii anwụchiela otu onye omekome n'Anambra Steeti

    A nwụchiela otu onye omekome akụkọ kwuru na ọ na-ezu ohi ma na-atọ ndị mmadụ n’obodo Ihiala dị n’Anambra steeti.

    Akụkọ anyị nwetara na’aka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambra steeti bụ Tochukwu Ikenga, kpọrọ aha onye omekome ahụ dịka Pablo Manu gbara afọ 38 si Delta steeti. Ihe e nwetara n’aka ya gụnyere egbe na mgbọ egbe dị iche iche, otu ụgbọala Lexus nakwa ọtụtụ akara ụgbọala.

    Ikenga kwuru na ọ bụ mbọ ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa AVG gbara mere ka a nwụchie onye omekome ahụ dịka ha nwetara ozi banyere mkpamkpa ya na mpaghara ahụ.

    Kọmishọna ndị uweojii na steeti ahụ bụ Nnaghe Obono Itam toro mbọ ndị ọrụ nchekwa ahụ ma rịọ ka ọhanaeze nyere ndị uweojii aka n’ọrụ ha iji nweta ezi nchekwa obodo ọkachasị oge emume ekeresimesi a.

  13. Ndị ntaakụkọ ise anwụọla na Gaza site n’ogbunigwe mba Isreal tụrụ

    Ụlọọrụ mgbasaozi na Palestine ekwuola na ndị ntaakụkọ ha mmadụ ise nwụrụ site n’ogbunigwe mba Isreal tụrụ na mpaghara etiti Gaza Strip.

    Ndị ntaakụkọ ‘Quds Today’ busara ụgbọala ha n’ihu otu ụlọọgwụ al-Awda ebe nwunye otu n’ime ha na-achọ ịmụ nwa n’ogige ndị gbara ọsọ ndụ a kpọrọ Nuseirat.

    Ụlọọrụ mgbasaozi ahụ wepụtara ihe onyonyo na-egosi ebe ụgbọala na-agba ọkụ nke nwere akara ndị ‘ntaakụkọ’ n’ahụ ya.

    Ndị ọrụ nchekwa mba Isreal kwuru na ha “kpachapụrụ anya tụọ ogbunigwe n’ụzọ amamihe” n’otu ụgbọala bu ndị otu na-eyi ndụ egwu a kpọro ‘Palestinian Islamic Jihad (PIJ). Ha kwukwara na ha kpachapụrụ anya iji belata ndị nkịtị imerụ ahụ.

    BBC enwebeghi ike ịchọpụta ma ihe ndị a na-ekwu ọ bụ eziokwu.

    Ụlọọrụ ntaakụkọ Quds Today na otu PIJ so wakpoo mba Isreal n’ụbọchị 7 Ọktoba n’afọ 2023 nwere mmekọrịta.

    Ọ bụ nwakpo ahụ butere ọgụ a na-aga n’ihu n’obodo Gaza ugbua.

    N’akụkọ nke ọzọ, mmadụ ise nwuru site n’ogbunigwe mba Isreal tụrụ na Gaza n’ụbọchị Wenezde.

  14. Ndị uweojii amalitela ịchọ onye omeiwu a tọrọ n’Anambra Steeti

    Ndi uweojii Anambra steeti ekwuola na ha amalitela ịchọ onye omeiwu na-anọchiteanya mpaghara Onitsha Nọt 1 n'ụlọomeiwu steeti ahụ bụ Justice Azuka, a tọrọ n’abalị Tuzde 24 Disemba, 2024.

    Ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenga wepụtara, kọwara na ndị omekome a maghị aha ha tọrọ onye omeiwu ahụ n’ụzọ Ugwunapampa n'abalị Tuzde, oge ọ na-alọta ụlọ ya.

    Ikenga kwuru na ndị uweojii amalitela ọrụ iji ịchọta onye omeiwu ahụ ma nwụchie ndị omekome ahụ tọọrọ ya.

    Justice Azuka, onye ndọrọ ndọrọ nọ na Labour Pati bụ onye na-anọchiteanya Onitsha Nọt 1 n’ụlọomeiwu Anambra steeti.

    Cheta na ụlọikpe kpebiri na ọ bụ Justice Azuka meriri na ntuliaka e mere n’afọ 2023 ka ụlọọrụ INEC kpọpụtara Douglas Egbuna nke pati PDP dịka onye meriri na ntuliaka.

  15. Onyeisiala Ghana enyela ndị Afrịka ikike ịbata Ghana na-enweghị akwụkwọ ikike visa

    Onyeisiala Gana bụ Nana Akufo-Addo ekwuola na onye mba ọbụla n’Afrịka nwereike ịbata Gana na-enweghị akwụkwọ ikike ime njem a kpọrọ visa.

    Nkwuputa a pụtara na mba Gana esonyela mba Afrịka ndị ọzọ dịka Rwanda, Seychelles, Gambia na Benin bụ ndị nyere ndị si mba Afrịka ndị ọzọ ikike dị etu a.

    Onyeisiala Akufo-Addo mere ka a mara nke a dịka oge ya dịka onyeisiala na-abịa na njedebe.

    Cheta na John Mahama meriri Onyeisiala Akufo-Addo na ntuliaka ọkwa Onyeisiala mba Gana e mere ụbọchị Satọde 7 Disemba , 2024. Ga-edu John Mahama n’iyi ọrụ dịka Onyeisiala Gana Tuzde. 7 Jenụwarị, 2025.

  16. Mmadụ karịrị 1,500 agbapụla n’ụlọmkpọrọ mba Mozambique

    Ndị uweojii mba Mozambique ekwuola na mmadụ karịrị otu puku na narị ise e jirila ohere ngagharịiwe na-eme na mba ahụ nwee gbapụ n’ụlọmkpọrọ.

    Onyeisi ndị uweojii aha ya bụ Bernardino Rafael kwụrụ na mmadụ iri atọ na atọ nwụrụ ebe mmadụ iri na ise ndị ọzọ merụru ahụ oge ndị ọrụ nchekwa na ndị a tụrụ mkpọro nwere esemokwu.

    O kwụrụ na ndị uweojii ejidela ihe ruru mmadụ otu narị na iri ise ndị mkpọrọ gbara ọsọ.

    Cheta na ngagharịiwe malitere na mba Mozambique ụbọchị Monde 23 Disemba, 2024 mgbe ụlọikpe kachasị elu na mba ahụ kpebiri na ọ bụ otu pati Frelimo turu ugo na natuliaka ọkwa onyeisiala e mere n'ọnwa Ọktoba 2024 na mba ahụ.

    Pati Frelimo anọọla n’ọchịchị kemgbe afọ 1975.

  17. Ụtụtụ ọma ndị ọma ihe ọma na-amasị

    Anyị na-asị gị nnọọ n'ọgbakọ BBC Igbo.

    Anyị ga-enwetara gị ọkpụrụkpụ akụkọ si mbaụwa niile taa.

    Ndewoo....

  18. Onyeisiala Bola Tinubu arịọla ka e cheta ndị nọ n’ihe ụkọ n’oge Ekeresimesi

    Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Ahmed Tinubu akpọọla oku ka e cheta ọtụtụ ndị mmadụ nọ n’ihe ụkọ n’oge mmemme Ekeresimesi nke afọ a.

    Tinubu kwuru nke a n’ozi Ekeresimesi 2024 ya bụ ebe ọ kenere ndị ọkpụkpere Christ ma tinye ọnụ n’ihe mere n’Ibadan, Ojika na Abuja bụ ebe ndị mmadụ nwụrụ ebe a na-eke osikapa.

    N’okwu ya “Ekeresimesi bụ oge na-akwalite ịhụnanya, udo na ị dị n’otu. Ọ bụ ihe na-egosi na ife ga-abịa ma n’oge ọchịrị gbara ebe niile, ma nwetere anyị ntụkwasị obi”.

    “Ihe mere n’Ibadan, Okija ma na Abuja bụ ihe mgbanwa obi. Anyị na-ezigara ezịnaụlọ ọ metutara ozi ịtị aka n’obi ma rịọ Chukwunna ka ụdịrị ihe dị etuahụ hara ime na ndụ anyị ọzọ”.

    “Ka anyị na-eme mmemme Ekeresimesi, cheta ndị nọ n’ihe ụkọ. Enweghị ihe dị iche ebe ha nọ na ebe anyị nọ. Ọtụtụ n’ime ha bụ ndị agbataobi anyị, ndị ụlọọrụ anyị maọbụ ndị anyị na-ahụ kwamgbekwamgbe”.

    Onyeisiala Tinubu ji ohere ahụ kwuo na Gọọmenti etiti ga-eme ka ezigbo nchekwa dị n’okporoụzọ niile dịka ndị mmadụ na-eme njem Ekeresimesi.

    Ọ sịkwara na Gọọmentị weputara ụgbọoloko ga-ebu ndị njem n’efu n’ụzọ ụgbọoloko ruru 144 na Naịjirịa niile.

    N’ikpeazụ, Tinubu kwuru na ihe niile gbasara ọnọdụ akụnụba na-egosi na Naịjirịa ga-adị mma ma rịọ ka ụmụ Naịjirịa tụkwasị obi n’ọganịrụ mba ahụ.

  19. Pope Francis arịọla ka udo chịa n'ụwa niile n'ozi Ekeresimesi ya

    Onyeisi ụka Katọlik bụ Pope Francis enyela ndị ụka Kraịst ozi Ekeresimesi nke afọ 2024.

    Pope Francis nọ na St. Peter’s Basilica dị na Rome, na mba Italy wee zie ọzị ahụ.

    Pope ji ohere ahụ kpọọ oku ka agha kwụsị na mpaghara ụwa dị iche iche ọkachasị na mba Ukraine n'etiti Ọwụwa Anyanwụ nke Asia nakwa na Gaza bụ ebe ndị Izrel na-ebuso ndị Hamas agha.

    N’ozi ahu, Pope Francis kwuru sị “ngwa agha dere juu ma kwụsị na mba Ukraine”.

    Cheta na mba Rọshịa nwakporo mba Ukraine n’ihe ruru afọ abụọ garaaga.

    Pope ji ohere ahụ kpọọ oku ka udo dị n’etiti mba Rọshịa na Ukraine.

    Pope dị afọ 88 kpọrọ oku ka ndị niile ọnụ na-eru n’okwu weta ọnọdụ udo n’ebe ahụ.

    Pope kpọkwara oku ka agha kwụsị na mpaghara Gaza ma gwa ndị Hamas ka ha tụhapụ ndị Izrel ha tọọrọ.

  20. Nwunye Onyeisiala agwala ụmụafọ ka ha nwee ndidi

    Nwunye Onyeisiala Naịjirịa bụ Oluremi Tinubu akpọọla oku ka ndị Naịjirịa nwee ndidi ma kwuo ka ihe dị n’ihu ka.

    Oluremi Tinubu gbara ama a n’ozi Ekeresimesi o zigara ụmụafọ Naịjirịa n’emume Ekeresimesi nke afọ 2024.

    N’okwu ya “Nkwa m na-ekwe unu bụ na di m bụ Onyeisiala Bola Tinubu dị njikere inweta mgbanwe ọnọdụ Naịjirịa ma nweta ezi ndụ nye ndị Naịjirịa”. O kwuru na ụfọdụ atụmatụ mgbanwe a Onyeisiala mapụtara amalitela ịmịta mkpụrụ.

    Ọ gara n’ihu kpọọ oku ka ndị Naịjirịa nwee olileanya ma nyere aka na-agba ibe ha ume.