You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Ụlọikpe Saụt Korịa enyela iwu ka a nwụchie Yoon Suk-yeol a chụpụrụ dịka Onyeisiala

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Disemba 2024.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Jessica Nwankwo, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere

  1. A nwụchiela mmadụ abụọ maka ebubo ịta Onyeisiala Zambia amoosu

    Ndị uweojii mba Zambia anwụchiela ụnwoke abụọ maka ebubo ịta Onyeisiala Hakainde Hichilema ammosu.

    A nwụchiri ụmụnwoke ahụ aha ha bụ Jasten Mabulesse Candunde na Leonard Phiri na Lusaka, isi obodo Zambia.

    Akwụkwọozi ndị uweojii wepụtara kwuru na ọ bụ Nelson Banda nwere ụmụnwoke abụọ ahụ ọrụ iji kpaa nkata jiri ọgwụ meruo Onyeisiala Hichilema ahụ.

    Nelson Banda bụ nwanne onyeomeiwu Emmanuel ‘Jay Jay’ Banda onye a nwụchiri n’ọnwa gara aga na Zimbabwe maka ebubo izu ohi, mana ọ gọnarịrị.

    Akwụkwọozi ndị uweojii kwuru na ha na-achọ Nelson achọ ugbua.

    Ihe e jidere n’aka ụmụnwoke abụọ ahụ gụnyere ọgwụ dị iche iche nakwa anụmanụ ogwumagana. Ha kwuru na Nelson kwere ha nkwa ikwụ ha $73,000 ma ọ bụrụ na ha mezuo atụmatụ ịta Onyeisiala Hichilema amoosu.

    E ji ụmụnwoke abụọ nọ n’ụlọ ndị uweojii ebe a na-atụ anya ịkpụpụ ha ụlọikpe n’oge na-adịghị anya.

    Ọtụtụ ndị bi na mba Zambia dị na mpaghara ndịda Afrịka kwenyere ma na-atụ egwu amoosu.

  2. Ụtụtụ ọma ndị be anyị

    Nnọọ dịka ị na-esonyere anyị n'ọgbakọ BBC Igbo taa.

    Anyị ga-enwetara gị akụkọ niile gbara ọkpụrụkpụ na mbaụwa taa.

  3. Anyị achụọla ọrịa Marburg ọsọ ụkwụ eru ala na Rwanda – Mịnịstrị Ahụike

    Mịnịstrị na-ahụ maka ahụike na Rwanda ekwuola na ha achụọla ọrịa marburg ọsọ ụkwụ eru ala na mba ahụ.

    Cheta na ọrịa marburg kpara mkpamkpa na Rwanda ebe akụkọ kwuru na mmadụ 60 ebutela ọrịa marburg nke tiwara na mba ahụ n’ọnwa Septemba 2024, ebe mmadụ iri na ise anwụọla.

    Ndị ọrụ ahụike na Rwanda kwuru na ha rụrụ ọrụ iji gbochie nfesa ọrịa ahụ n’ụlọọgwụ dị iche iche ebe e nnyochara onye ọrịa ọbụla gosịrị njimara ọrịa ahụ.

    Njirmara ọrịa marburg gụnyere oke ahụ ọkụ, ike ọgwụgwụ, nkụwụ ahụ nakwa ọbara ịgba mmadụ n’ahụ

  4. A na-eto nwata akwụkwọ gbara atụmatụ nrụrụaka n’anwụ na mba Kenya

    Ndị mba Kenya etoola nwata akwụkwọ na-agụ maka azụmahịa bụ Nelson Amenya maka ịgba n’anwụ atụtụmatụ nrụrụaka dị na gọọmenti Kenya.

    N’agbanyeghị na e nwere ọtụ iwu na-egbochi nrụrụaka na mba Kenya, akụkọ kwuru na ọtụtụ ọrụ kọntrakt gọọmenti Kenya nyere ụfọdụ ụlọọrụ, juputara na nrụrụaka.

    Amenya gbara afọ iri atọ na otu, na-agụ akwụkwọ na mba France, gbara n’anwụ na soshal midia ya na e nwere akwụkwọ nkwekọrịta dị n’etiti gọọmenti Kenya na ụlọọrụ Andani Group bụ ụlọọrụ mba India n’ọnwa Julaị, 2024.

    Nkwekọrịta a ka Amenya kwuru n ọ bụ gbasara ndị isi ọdụụgbọelu Jomo Kenyatta International Airport (JKIA), ndị e kwesịrị ikwụsị ọrụ kemgbe.

    Amenya kwuru na ọ chọpụtara na akwụkwọ nkwekọrịta ahụ gosịrị atụmatụ kọntrakt ego ya ruru ijeri dọla abụọ $2bn nke bụ iji nyefee ụlọorụ Adani Group ikike ịhụ ka ihe si aga n’ọdọụgbọelu ahụ maka afọ iri atọ n’abịa iji wụlite ọnọdụ ya

    Ọ gara n’ihu kwuo na ihe mere o jiri gbaa atụmatụ a n’anwụ bụ maka na ọ chọpụtara na nkwekọrịta ahụ bụ nke ga-enweta ajọ mmetụta nye ọnọdụ akụnaụba mba Kenya maka na ego niile ga-abanye n’akpa ụlọọrụ Adani Group.

  5. Ụlọikpe enyela Yahaya Bello ntọghapụ belụ, machie ya ịga mba ofesi

    Ụlọikpe ukwu nọ n’isi obodo Naịjịrịa enyela aka chịburu Kogi Steeti bụ Yahaya Bello ntọghapụ belụ nke ọnụego ya pụtara narị nde naịra ise (500m).

    A na-ekpe Bello ikpe maka ebubo nrụrụaka ọnụego karịrị ijeri naịra iri na ụma anọ (10.4bn).

    Onye Ọkaikpe bụ MaryAnne Anenih nyere iwu ka Bello nyefee ụlọikpe akwụkwọ paspọtụ ya ka ọ ghara inwe ike hapụ obodo Naịjịrịa karịa mgbe ụlọikpe nyere ya ikike.

    Chetakwa na Bello, Shuaibu Oricha na Abdulsalam Hudu nọ n’ụlọikpe azara ọnụ ha maka ebubo ruru iri na isii nke gụnyere izu nzuzo, mpụ na inwe ihe onwunwe e nwetara n´ụzọ iwu na-akwadoghị.

    Ọ bụ ụlọọru na-ebu agha megide mpụ na nrụrụaka ego na Naịjịrịa bụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) gbara Bello na ndị ọzọ akwụkwọ n’ụlọikpe n’ụbọchị 27 Nọvemba 2024.

    Onye Ọkaikpe bụ Anenih a jụbuola inye Bello ntọghapụ belụ nke o tiyere n’ụbọchị Disemba 10 maka na o tinyere akwụkwọ belụ tụpụ e jide ya.

  6. Afrịka CDC achọpụtala na ịba butere ọrịa amaghị aha ya na DR Congo

    Dịka ụlọọrụ na-ahụ maka ahụike na mpaghara Afrịka siri kwuo, a chọpụtara na o nwereike ịbụ ọrịa ịba butere ọrịa amaghị aha ya gburu ọtụtụ mmadụ ruru ọnụọgụ iri asatọ na ndịda-ọdịda anyanwụ mba Kongo.

    E kwuru na ndị na-aria ọrịa a amaghị aha ya na-ahụta mgbaama gụnyere ahụọkụ, isi ọwụwa, ike iku ume ya na ụkọ ọbara.

    Ọtụtụ ndị e lere ahụ ha gosiri na ndị butere ọrịa amaghị aha ya bu ụzọ bute ọrịa ịba nke anwụta na-ebunye ndị mmadụ na mpaghara Afrịka ebe oke agụụ na enweghị erimeri juru ebe niile nke na-eme ka ọnọdụ ahụ were kawanye njọ.

    Mgbakasị ahụ banyere ọrịa a na-akawanye njọ kemgbe otu nwoke na-egosipụta ahụọkụ ọbara ọgbụgba nwụrụ.

    Onye Dọkịta aha ya bụ Ngashi Ngongo nke si n'ụlọọrọ na-ahụ maka ahụike a na-akpọ Africa Centres for Disease Control and Prevention (Africa CDC) gwara ndị ntaakụkọ n'ụbọchị Tọzde, na ihe mere ka ụjọ banye ọtụtụ ndị mmadụ n’ahụ nke mere ka ụfọdụ mmadụ were gbasawa akụkọ na e nwere ike inwe nje 'virus' ndị mmadụ na-ebute ya na ọrịa ịba.

    E kwukwara na a ga-enwere ihe sitere n’ahụ nwoke ahụ nwụrụ anwụ gawa n’isi obodo ha bụ Kinshasa ị ga tụlee ya.

  7. Onyeisiala Bola Tinubu ekwuola ka e nyochaa ihe butere nzọgbu ụmụaka 35 n’Ibadan

    Onyeisiala Bola Tinubu egosila enweghị obiụtọ n’ihi ihe ọdachi mere n’ọgbakọ ụmụaka a haziri n’isi obodo Oyo steeti bụ Ibadan.

    O nyere ụlọorụ gọọmenti ndị ọ dị n’aka ntụziaka ka ha mee ezigbo nnyocha iji chọpụta ihe butere ọnọdụ ọjọọ ahụ.

    Tinubu gwakwara Gọọmenti Oyo steeti ka o tinye atụmatụ ndị kwesịrị ekwesị iji hụ na ụdị ọdachi ahụ adapụtaghị ọzọ.

    Ka o sinadị, o zigaara Gọọmenti Oyo steeti na ezinaụlọ ndị ọdachi ahụ metụtara ozi nkasiobi ma rịọ ka mkpụrụobi ụmụaka niile nwụrụ anwụ zuo ike n’udo.

    Cheta na a zọgburu ụmụaka iri atọ na ise (35) na Islamic High School dị n'Ibadan bụ ebe Wings Foundation na ụlọ ntaakụkọ Agidigbo Fm jikọrọ aka hibe mmemme enyemaka maka ụmụaka.

  8. Mụ na al-Assad ekwubeghi okwu kemgbe a kwaturu ọchịchị ya na mba Syria – Putin

    Onyeisiala mba Rọshịa Vladimir Putin etinyela ọnụ n’ihe mere na mba Sịrịa na Ukraine n’ime afọ 2024.

    Vladimir Putin bụ onyeisiala mba Rọshịa mere ka a mata nke a n’ọgbakọ ọ were n’abalị garaaga bụ ebe ọ nọ gwa ndị mba ahụ okwu gbasara ihe niile mere n’afọ a.

    Putin kwuru na kemgbe a chụpụrụ Bashar al-Assad n’ọkwa ọchịchị dịka onyeisiala mba Sịrịa na ha abụọ ekwubeghị okwu.

    N’ajụjụ niile a jụrụ Putin, otu ihe ọ kwuru gbasara nkwatu a kwaturu ọchịchị Bashar al-Assad na Sịrịa bụ na ọ bụghị ihe ihere dịara mba Rọshịa maọbụ ịda mba dịara mba Rọshịa.

    Ọ kwuru na mba Rọshịa na ndị na-achị mba Sịrịa ugbua na-akpa nkata maka ọdụ ndịagha abụọ Rọshịa were na mba ahụ.

    N'aka nke ọzọ, onye ntaakụkọ BBC bụ Steve Rosenberg juru Putin ajụjụ gbasara etu ọnụdụ mba Rọshịa dị ugbua na etu ọ dị n’afọ iri abụọ na ise garaaga dịka onye bụbụ onyeisiala mba Rọshịa bụ Boris Yeltsin sị hapụ ya?

    Putin zara ya sị “n’oge ahụ Boris na-achị, ihe niile na-eme mba Rọshịa dịka ha a na-achọ ịgbasa dịka otu mba, n’oge ahụ anyị nọ n’ụzọ ịtịsa dịka mba nọọrọ onwe ha, mana ugbua anyị akwụrụla chịmchịm”.

  9. Igbo ndị ọma, unu abọọla chi?

    Anyị awụchiela ọzo n'ọgbakọ anyị n'ụbọchị taa.

    Biko nọnyere anyị maka akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ụwa

  10. Ndị uweojii anwụchiela Naomi Ogunwusi maka mmemme ebe azọgburu ụmụaka 35 n'Oyo steeti

    Ndị uweojii Oyo steeti ekwuola na ha anwụchiela Naomi Ogunwisi nakwa mmadụ asaa ndị ọzọ maka ụmụaka iri atọ na ise nwụrụ mgbe azọgburu ndị mmadụ n’otu mmemme na steeti ahụ.

    N’ozi ha weputara n’ụbọchị Wenzde, ha kwuru na ọ bụ ụmụaka iri atọ na ise nwụrụ na ya bụ ọdachgi mere na Islamic High School bụ ebe Wings Foundation na ụlọ ntaakụkọ Agidigbo Fm jikọrọ aka hibe mmemme enyemaka.

    Ndị uweojii kwuru na ha enyefela okwu ahụ n’aka akụkụ ha na-enyocha ogbugbu nakwa ekperima.

    Ọnụ na-ekwuru ha na steeti ahụ bụ Iyaganku kwuru na ọ bụ osote Kọmịshọna ndị uweojii bụ onye bu ụzọ na nyocha ahụ.

    N’otu aka ahụ Gọvanọ steeti ahụ bụ Seyi Makinde ezigarala ndị ihe ahụ metụtara ozi iti aka n’obi.

    “Ka mkpụrụ obi ndị nwụrụ zuru ike na ndokwa” ka o kwuru ma kwuo na ọdachi ahụ dakwasịrị ha bụ ihe mgbawa obi.

  11. E gbuola ndịagha mba Nọt korịa ruru mmadụ 100 n’Ukraine n’ime otu ọnwa

    E gbuola ndịagha Nọt Korịa ruru otu narị n’ime otu ọnwa ka ha gara sonyere ndị Rọshịa n'ibuso ndị mba Ukraine agha.

    Praịm mịnịsta mba Saụt Korịa bụ Lee Sung-kwon mere ka a mata nke a mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu.

    Lee Sung-kwon kwuru na ndịagha ruru mmadụ puku nọ n’ụlọọgwụ ugbua maka na e merụrụ ha ahụ n’agha.

    Ọ kwuru na ndị merụrụ ahụ gụnyere ndị gbanitere n’ọkwa na gọọmenti mba Nọt Korịa.

    N’onwa Ọktoba afọ a, mba Nọt Korịa zigara ndịagha ruru puku iri ka ha yere aka n’agha mba Russia na Ukraine.

    N’ubọchị Monde, ọnụ na-ekwuru Pentagon nke mba US kwuru na e gburu ọtụtụ ndịagha Nọt Kọrịa maọbụ meruo ha ahụ.

    Mana BBC amabeghị na ihe ha kwuru a bụ eziokwu.

    A sị na e gburu ndịagha Nọt Korịa ahụ na mpaghara Kursk dị na Rọshịa mgbe ndịagha Ukraine wakporo ha.

    A na-ekwu na ndịagha Nọt Korịa e zigara ịnụ agha na mba Ukraine enweghị ihe ha maara gbasara ịnụ agha.

    Ọtụtụ n’ime ha bụ ndị ji naanị otu izu ụka nwere mee ihe ọmụmụ n’aka ndịagha Rọshịa tupuu ha agaa n’ihu ọgụ.

  12. Ụlọikpe atụọla Dominique Pelicot nga maka ime ka mmadụ 50 maa nwunye ya elu n’ike

    Ụlọikpe na mba Fransị amaala di Dominique Pelicot ikpe maka ime ka mmadụ 50 maa nwunye ya elu n’ike.

    Dominique dị afọ iri asaa na abụọ ka ụlọikpe tụrụ nga afọ ịrị na abụọ maka ihe ọ mere nwunye ya bụ Gisèle Pelicot.

    Ka ụlọikpe na-atụ mmadụ iri ise ahụ nga, ọtụtụ n’ime ha wetere afọ isii, ndị ọzọ wetere afọ iri, mana ụlọikpe nyere Dominique Pelicot afọ ịrị na abụọ.

    Cheta na Dominique kwetere na ihe ya mere nwunye ya “bụ arụ” ma kwuo na ya bụ “onye na-ama nwanyị elu n’ike, mana ya abụghịzị udiri mmadụ na-eme mpụ ahụ ọzọ”.

    Jean-Pierre Marechal bụ onye nke abụọ ụlọikpe mara ikpe maka iso maa nwunye Dominique elu n’ike.

    Onye ọzọ ụlọikpe mara ikpe bụ Charly Arbo dị afọ iri atọ. Arbo so na ndị kacha bụrụ nwatakịrị na ndị niile mara nwumye Dominique elu n’ike.

    Mana ọkaiwu na-anọchite anya Dominique Pelicot kwuru na Dominique nwere abalị iri ịma na ya ọ ga-eje ụlọikpe mkpegharị dịka iwu mba Fransị sị kwuo.

  13. Onyeisiala mba Rọshịa bụ Vladmir Putin ga-ekwu okwu maka ihe na-eme na mba ahụ

    Onyeisiala mba Rọshịa Vladmir Putin ga-agwa ndị mba ahụ okwu gbasara ihe mere na ọnọdụ mba ahụ kemgbe afọ a.

    N’oge gara aga, Putin na-enwe ụzọ abụọ ọ si agwa ndị obodo ya okwu, na ngwụcha afọ niile.

    Otu n’ime ya bụ i ji ekwentị na-aza ajuju, ebe nke ọzọ bụ ime mgbasa ozi n’ụlọọrụ ndị ntaakụkọ ebe a ga na-agba ya ajụjụ ọnụ.

    Kemgbe abalị ole na ole gara aga ka ọtụtụ ndị mmadụ na mba Rọshịa na-ede ajụjụ ha were ma na-edegara ya Putin.

    Ọtụtụ n’ime ihe ndị mmadụ na-aju gunyere ihe gbasara ahụike, ọnụ ahịa na-arị elu na ihe gbasara mba ụwa.

    A na-atụ anya na ndị ntaakụkọ dị icheiche na mba ụwa ga-enwe ohere i jụ ajụjụ.

    Ihe a na-atụ anya bụ na ndị mmadụ ga-aju ajuju maka agha Rọshịa na Ukraine nakwa ihe na-eme na mba Sịrịa, ọ kachasị etu e si chụtuo onye bubu onyeisiala mba Sịrịa bụ Bashar al-Assad n’ọkwa ọchịchị.

  14. Igbo mụrụ nze mụọ ọzọ, unu abọọla chi?

    Anyị awụchiela ọzo n'ọgbakọ anyị n'ụbọchị taa.

    Biko nọnyere anyị maka akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ụwa.

  15. Etu gọọmenti ga-esi mefuo ego dị na ‘bọjet’ afọ 2025

    Onyeisiala Bola Tinubu egosila ụlọ omeiwu Naịjirịa atụmatụ mkpata na mmefu ego afọ 2025 nke ọnụego ya dị taarị naịra iri anọ na asaa na ụma iri itolu na isii (47.96tr).

    Oge ọ na-egosi ụlọ omeiwu atụmatụ mkpata na mmefu ego ahụ, Tinubu kwuru na taarị naịra anọ na ụma iri itolu na otu (4.91tr) n’ime ya ga-abụ maka iji kwalite ụlọọrụ nchekwa dị iche iche nakwa iji chekwaa okeala.

    O kwukwara na taarị naịra anọ na ụma isii (4.06tr) ga-abụ maka akụrụngwa e ji enyere ndụ aka, ndị gụnyere okporoụzọ sitere Legọs gawa Calabar na okporoụzọ sitere Sokoto gawa Badagry.

    Dịka o siri kwuo, a ga-etinye taarị naịra abụọ na ụma iri anọ na asatọ (2.48) n’ihe gbasara ahụike iji hụ na e nyere ụmụafọ Naịjirịa ezi nlekọta ahụike.

    N’otu aka ahụ, agụmaakwụkwọ ga-eketa taarị naịra atọ na ụma iri ise na abụọ (3.52tr).

    Tinubu kwukwara na ọchịchị ya ga-akwado ndị ọrụ ugbo site n’ịkwalite ha iji hụ na ha kọpụtara ihe oriri ebe ọ bara ụba.

  16. Ụlọikpe kachasị na Ghana akagbuola akwụkwọ ndị a gbara megide LGBTQ

    Ụlọikpe kachasị na mba Ghana ewezugala ikpe abụọ na-agba ụkwụ megide iwu ọhụrụ megidere LGBTQ.

    Ụlọikpe kachasị na mba Ghana ewezugala ikpe abụọ ahụ nọ n’ụlọikpe nke chọrọ ịkwụsị onyeisiala mba Gana ibinye aka n’iwu megidere LGBTQ na mba ahụ.

    Cheta na n’ọnwa Febụwarị afọ a ka ndị omeiwu mba Gana mere iwu megidere nwoke na nwoke maọbụ nwaanyị na nwaanyị inwe mmekọ maọbụ biri dịka di na nwunye.

    Ka ndị omeiwu wepụtachara iwu ahụ ma zịgara ya onyeisiala ha ka ọ binye aka, ndị mmadụ gbara akwụkwọ ma chọrọ ka ụlọikpe kachasị na Ghana kagbuo iwu ahụ.

  17. CBN amachiela ndị POS ịtụ mgbere ego karịrị N1.2m kwa ụbọchị

    Ụlọakụ etiti Naịjirịa (Central Bank of Nigeria, CBN) enweputara iwu ọhụrụ machịrị ndị na-eme azụmahịa POS ịtụ mgbere ego karịrị otu nde na narị naịra abụọ (N1.2m) kwa ụbọchị.

    CBN mere ka a mata nke a n’ozi ọhụrụ ha weputara maka usoro ndị POS ga-eji na-atụ mgbere bụ nke onyeisi na ngaraba CBN na-ahụ maka ịkwụ ụgwọ bụ Oladimeji Yisa Taiwo binyere aka.

    CBN kwuru na bido n’ọnwa Juli 2024, e nwere POS karịrị nde atọ na-arụ ọrụ, ebe e nwere POS ruru nde anọ bụ nke e debenyere akara ha dịka ndeko Nigeria Interbank Settlement System Plc si dị.

    CBN kwukwara na ndị mmadụ agaghị enwere ego karịrị narị puku ise (N500,000) n’otu izu ụka na POS.

    Ọzọ bụ na ụlọakụ niile ga-eme ka ndị mmadụ hara iwere ego karịrị otu narị pupu naịra (N100,000) kwa ụbọchị.

    CBN kwuru na ihe mere ha ji bido ụdịrị atụmatụ ahụ bụ ka ha mee ka akwụkwọ ego hara ịkarị ndị mmadụ n’aka ma wetuo ọnụ ọgụgụ ego na-adịghị n’ụlọakụ.

  18. Etu m si gbanahụ ọnwụ mgbe m gara na mba Iraq - Pope Francis

    Nkata a kpara ka e gbuo Pope Francis bụ Onyeisiala ụka Katọlik n’ụwa mgbe o mere njem na mba Iraq bụ nke a kụsasịrị site n’ama ndị ọrụ nchekwa mba Briten gbara dịka akwụkwọ a na-ede banyere ndụ Pope Francis si kwuo.

    Pope dere na, mgbe o rutere na Baghdad n’ọnwa Maachị 2021, a gwara ya na ndị ogbunigwe mgbagbuonwe abụọ na-achọ ịwakpo ọgbakọ nke o kwesịrị iso na ya.

    E mechara jide mmadụ abụọ chọrọ ịtụ ogbunigwe ahụ ma gbuo dịka Pope kwuru na mkpirisi nke ụlọọrụ ntaakwụkwọ Itali wepụtara.

    Njem ya ahụ nke were ụbọchị atọ n’oge ọrịa coronavirus na-akpa ike bụ nke mbụ onye ji ọkwa Pope na-eme na mba Iraq bụkwa nke e kekpọrọ ọnọdụ nchekwa.

    Tupu njem ahụ, enwere ọtụtụ ọgbaghara na akụkọ ọgbaghara na mba Iraq nke ndị okpukperechi alakụba Shia na Sunni na-ebuso onwe ha agha.

    Nke ahụ mere ka ndị okpukperechi Kraịst na mba ahụ dị obere n’ihi mkpagbu na mwakpo ndị oyi ndụ egwu nakwa ndịagha nnupuisi alakụba na-eme ha.

    N’akwụkwọ ahụ Pope dere, o kwuru na onye ọbụla dọrọ ya aka na ntị banyere ime njem na mba Iraq mana o gbara isi akwara gawa.

    O kwuru na ọ bụ ndị ọrụ nchekwa mba Briten chọpụtara nke a ma gwa ndị uweojii mba Iraq bụkwa ndị mere ka ndị nchekwa ya mata nke a.

    “Otu nwagbọghọ bu ogbunigwe n’ahụ ya ma na-achọ ịbata na Mosul ka ọ gbagbuo onwe ya n’oge Pope bịara njem,” ka o kwuru.

    “Otu ụgbọala bukwa ogbunigwe ji oke ọsọ na-agbata dịka ọ na-achọkwa ịgba ogbunigwe ahụ.”

    Pope kwuru na ọ jụrụ onye nchekwa ya maka ihe mere ndị ahụ chọrọ ịwakpo.

    “o ji ntabi okwu: Ha anọzighi ya’. Ndị uweojii Iraq gbochiri ha ma gbagbuo ha,” ka o dere.

    A ga-ewepụta akwụkwọ Pope ahụ a kpọrọ ‘Olileanya’ n’ụbọchị 14 Jenụwarị 2025.

  19. Igbo ndị ọma daalụ

    Anyị awụchiela ọzo n'ọgbakọ anyị n'ụbọchị taa.

    Biko buru oche gị nọnyere anyị maka akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ụwa.

  20. Ecowas ekwuola na ha ga-ewepụta ego nke ha n’afọ 2027

    Otu Economic Community of West African States (Ecowas) ekwuputala ebumnobi ha inweputa ego ha kpọrọ ACO a ga-eji na-azụ ahịa n’etiti mba so na Ecowas.

    Mba niile so na Ecowas nwere nkwekọrịta a n’ọgbakọ agba nke 66 ha nwere n’Abuja, isi obodo Naịjirịa.

    Cheta na mba Ecowas niile kpebiri inwe ego nke ha n’afọ 2020 mana nfesa ọrịa Covid mere ka atụmatụ ahụ gbaa ọyịpa.

    Mana ugbua, ha ekwetala inwepụta ego ahụ n’afọ 2027 nke ha kwuru na ọ ga-enweta agamnihu azụmahịa na mba niile so n’otu Ecowas.