Samia Suluhu Hassan emeriela ntuliaka Onyeisiala mba Tanzania

Nchịkọta akụkọ niile si na mbaụwa niile

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu

  1. Ụlọikpe agwala ndị uweojii ka ha kwụsịtụ ijide ndị ọkwọụgbọala n'ihi 'tinted glass permit'

    Onye uweojii bu egbe nọrọ n'ihu ụgbọala

    Ebe foto si, NurPhoto

    Ụlọikpe Ukwu dị na Warri Delta Steeti enye ndị uweojii iwu ka ha gbaa jụụ n’ịmanye ndị mmadụ inwete ikike imechi mpio ụgbọala ha nke a kpọrọ ‘Tinted glass permit’.

    Ụlọikpe a gwara ndị uweojii ka ha kwanyere iwu ụlọikpe ugwu ma kwụsị inwuchi ndị ọkwọụgbọala na-anataghị ikike ahụ ruo mgbe ikpe ha na otu jikọtara ndị ọkaiwu banyere okwu ahụ ga-ebi.

    Onyeisi ndị ọkaiwu na-anọchiteanya otu jikọtara ha bụ Kunle Edun kwuru na iwu a ụlọikpe nyere bụ ụzọ dị mma iji chekwaa iwu Naịjirịa dịka ikpe ahụ ka na-aga n’ihu.

    Cheta na ndị uweojii malitere ijide ndị ọkwọụgbọala nwere mkpuchi mbio ‘tinted glass’ maọbụrụ na ha anataghị ikike na ndị uweojii.

    Ha malitere ime nke a n’ụbọchị abụọ nke ọnwa Ọktoba, 2025 na mpaghara Naịjirịa dị iche iche.

  2. A kpụpụla nwa Robert Mugabe n’ụlọikpe maka ebubo ibugharị ọgwụike

    Nwa Robert Mugabe apụọla n’ụlọikpe maka ebubo ibugharị ọgwụike

    Ebe foto si, AFP via Getty Images

    A kpụpụla nwa onye bụbu onyeisiala mba Zimbabwe bụ Robert Mugabe n’ụlọikpe dị na Harare maka ebubo ibugharị ọgwụike.

    Dịka akwụkwọ ikpe siri kwuo, a nwuchiri Robert Mugabe Jr dị afọ iri atọ na atọ n’ụtụtụ Wenezde 1 Ọktoba oge ọ gbara n’okporo na-ekwesịghị ekwesị.

    Akwụkwọ ikpe ahụ kọwara na ndị uweojii nyochara obere akpa ojii o yi n’ahụ n’oge ahụ ma chọta obere akpa ntụ ọgwụike ‘cannabis’ abụọ.

    N’ozi ndị uweojii wepụtara, ha kwuru na ha anwuchiela mmadụ ise ndị ọzọ a na-enyo enyo ha na Mugabe so atụ mgbere ọgwụike.

    Ka o sina dị, Ọkaiwu Maazị Mugabe gwara BBC na ha na-akwado ịgọnarị ebubo ndị ahụ, dịka o siri arụmarụ gbasara eziokwu dị n’ihe ndị uweojii kwuru.

  3. A nwụchiela ụkọchukwu ghọgburu nwa agbọghọ ma dinaa ya n’ike iji gbanwee ọbara ya site na SS gaa AA n’Ebonyi Steeti

    Ndị uweojii kwuru na nwoke ahụ nọ n'ụlọọrụ ndị uweojii CID Ebonyi steeti azara ọnụ ya dịka a na-eme nnyocha tupu a kpụpụ ya ụlọikpe

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndị uweojii Ebonyi Steeti anwụchiela onyeisi ụlọụka “Champion The Truth” aha ya bụ Ndibueze Onyeagọziri.

    Ndị uweojii kwuru na nwoke ahụ na-akpọ onwe ya ‘Bishọpụ’ ka a e kwuru na o ji aghụghọ dinaa otu nwa agbọghọ n’ike abalị asaa ma kwuo na ọ bụ iji gwọọ ya ọrịa o bu.

    Akụkọ kwuru na ọ bụ maka na nwa agbọghọ ahụ nwere ọrịa bekee kpọrọ ‘sickle cell’, mere Bishopụ Onyeagoziri jiri gwa ya na ọ bụrụ na ọ bia n’ụlọ ya maka ekpere ọgwụgwọ, na o nwereike igbanwee ọbara ya site na SS banye AA.

    ỌN’okwu nwaagbọghọ ahụ ‘ọrịa sickle cell a egbuola ụmụnne m atọ, ọ bụ ya mere m ji kweta ịga n’ụlọ Bishọpụ ahụ mana amaghị m na ebumnobi ya bụ idina m n;ike.

    Ọ gara n’ihu kwuo na n’agbanyeghị na Bishọpụ ahụ dịnara ya n’ike etu o siri masị ruo abalị asaa, ọrịa ya alayịị kama ọ kwanyere njọ. Bishọpụ ahụ gwara na ọ ga-egbu ya ma ọ bụrụ na ọ gwa mmadụ ọbụla na o dinara ya n’ike.

    E kwuru na nwaamadị ahụ gara n’ihu kesaa foto ebe nwaagbọghọ ahụ gba ọtọ na soshal midia.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Joshua Ukandu kwuru na ha nwụchiri nwaamdị ahụ n’ụbọchị Wenezde Ọktoba 1, 2025.

  4. E wepụtala aha ndị Jew abụọ nwụrụ oge onye ojiegbe wakporo Synagogue dị na Manchester, England

    Aha ndị nwụrụ bụ Adrian Daulby afọ 53 nakwa Melvin Cravitz dị afọ 66.

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Aha ndị nwụrụ bụ Adrian Daulby afọ 53 nakwa Melvin Cravitz dị afọ 66.

    Ndị uweojii mpaghara Manchester mba Ịngland ewepụtala aha ndị Jew abụọ nwụrụ oge onye ojiegbe wakporo ogige synagogue dị n'ebe ahụ.

    Aha ha bụ Adrian Daulby dị afọ 53 na Melvin Cravitz dị afọ 66.

    Ndị uweojii kọwara na ha kwenyere na onye mere mwakpo ahụ bụ Jihad Al-Shamie gbara afọ 35, bụ onye amaala Breten mana onye agbụrụ ya bụ mba Siria.

    Akụkọ kwuru na anwụchiela mmadụ atọ ọzọ a na-eyo eyo gbasara mwakpo a.

    Onye ndu ndị okpukperechi Jew na Briten kwuru na mwakpo ahụ bụ “oké ịkpọasị ndị Jew na-adịghị akwụsị akwụsị” dịka Praịm Minista Keir Starmer kwere nkwa na ọ ga-eme ihe niile o nwere ike ichekwa ha.

  5. Ụtụtụ ọma Igbo bụ Igbo

    Anyị ji obi aṅụrị anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ ụbọchị Fraịde 3 Ọktoba 2025.

    Ihe ọbụla itinyere aka n'ụbọchị taa ga aga ọfuma

    Gaa n'ihu sonyere anyị n'akara soshal midia anyị dị iche iche WhatsApp Chanelụ, Facebook na Instagram.

    Ọ bụ Marvelous Obomanu na Michael Ngene ka gị na ha ga anọkọ n'ụtụtụ a, ebe Ikechukwu Kalu na Chinonso Ugorji ga awuchie n'ehihe.

    Ndewo.

  6. Ụlọikpe ajụla ịnabata akwụkwọ a gbara megide ọchịchị gbatagbata Onyeisiala Tinubu manyere na Rịvas steeti

    Gọvanọ Rịvas steeti bụ Siminalayi Fubara, Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu na Onye ọchịchị gbatagbata na Rịvas steeti bụ Vice Admiral Ibok-Ete Ibas

    Ebe foto si, Siminalayi Fubara/X , Tinubu FB na Vice Admiral Ibok-Ete Ibas/screengrab

    Nkọwa foto, Fubara, Tinubu na Ibok-Ete Ibas

    Ọkaikpe James Omotosho nke ụlọikpe dị elu n’Abuja ajụla ịnabata akwụkwọ a gbara megide ọchịchị gbatagbata Onyeisiala Bola Tinubu manyere na Rivas steeti.

    Akwụkwọ ahụ nke Belema Briggs na mmadụ anọ ndị ọzọ gbara n’ụlọikpe na-ekwu na Onyeisiala Bola Tinubu enweghị ikike ịmanye ọchịchị gbatagbata na Rịvas steeti.

    Mana Ọkaikpe James Omotosho kpebiri na ndị gbara akwụkwọ ahụ n’ụlọikpe enweghị ikike n’ihu iwu Naịjirịa ịgba akwụkwọ ahụ.

    Ọ kawara na ọ bụ naanị ụlọikpe kachasị na Naịjirịa ga-ekwu ihe ga-eme n’ikpe ahụ ma kwuo na mmadụ anọ ndị ahụ gbara akwụkwọ ahụ n’ụlọikpe enweghị onye ọchịchị gbatagbata ahụ metụtara maka na ha anọghị n’ọchịchị gọọmenti, maọbụ bụrụ otu onye na ndị omeiwu na steeti ahụ.

  7. Ọ bụ ekwensu gwara m dinaa ụmụnne abụọ n'ike - Ụkọchukwu

    Ọ bụ ekwensu gwara m dinaa ụmụnne abụọ n'ike - Ụkọchukwu

    Ebe foto si, Getty Images

    Pastọ Luke Eze nke ụlọụka “City of Hope Ministry Enugwu” ejirila aghụghọ ikpe ekpere dinaa ụmụnne abụọ n’ike n’obodo Okunito-Amanshiodo dị n’okpuru ọchịchị Ezeagu n'Enugwu steeti.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Enugwu steeti bụ Daniel Ndukwe kwuru na nwoke ahụ gbara afọ iri isii na atọ gwara otu n’ime ụmụnne abụọ ahụ gbara afọ iri na isii ka ọ bịa soro ya mee ekpere.

    O kwuru na oge nwata nwaanyị ahụ batara, ụkọchukwu ahụ nyere ya ọgwụ ka ọ sụọrọ ya n’ikwe, ma mechaa nye ya ọgwụ sị ya ṅụọ, ngwangwa ọ ṅụrụ ya ọ maghịzi onwe ya.

    Ụkọchukwu ahụ gara n’ihu kwaso ya iko etu o siri masị ya.

    Nwanne nwata nwaanyị ahụ nke gbara afọ iri na itoolu gawara n’ụlọụka ichọ nwanne ya nwaanyị, ụkọchukwu ahụ enyekwa ya ọgwụ ahụ ma kwaso ya iko n’ike dịka o mere nwanne ya.

    Ndị obodo kọwara na ọgwụ ahụ o nyere ụmụaka ahụ mere ha etetaghị ụra ruo ka chi bọrọ, nke mere ndị obodo jiri chọwazie ha.

    Ka a chọtara ha n’ụlọụka nwoke ahụ, ọ gọrọ ma sị “ọ bụ ekwensu kwanyere m mee ihe ọjọọ ahụ.”

    Ndị Uweojii kwuru na nwoke ahụ nọ n'aka ngalaba na-ahụ maka ndị omekome bụ CID ugbua n'isi ụlọọrụ ha dị n'Enugwu, bụ ebe ọ na-azara ọnụ ya.

  8. E gbuola ndị Gen Z bidoro ime ngagharịiwe na mba Moroko

    A gbara ụgbọala ndị uweojii na nke ndị nkịtị ọkụ na Moroko

    Ebe foto si, AFP via Getty Images

    Nkọwa foto, Ụgbọala a gbara ọkụ

    Opekatamkpe mmadụ abụọ anwụọla dịka ndị uweojii gbagburu ndị na-eme ngagharịiwe n’ụlọọrụ ha dị na Lqliaa, na mpaghara Agadir, dịka ụlọ mgbasa ozi mba ahụ si kwuo.

    Nke a bụ oge mbụ e gburu mmadụ kamgbe ụmụ Gen Z bidoro ime ngagharịiwe n’ụbọchị Satọde garaaga.

    Ndị mmadụ na-enwe iwe maka na Gọọmenti mba ahụ chọrọ ịrụ ama-egwuriegwu bọọlụ maka asọmpị mba ụwa n’afọ 2030 nke FIFA na-ahazị kama ha ga-emezi ọnọdụ akụnụba ha.

    Ndị Gen Z na-ajụ sị “Ama egwuriegwu adịla mana kedụ ụlọọgwụ?”.

    Otu onye n’ime ha gwara BBC sị na ụlọọgwụ dị n’ime obodo ya dịka ụlọ nga.

    Ụmụ Gen Z na-eme ngagharịiwe ha naanị n'ime abalị kwa ụbọchị mana ndị uweojii kwuru na ha nwere ọnọdụ bụ naanị ịgba egbe ka ha ji zọọ ndụ nke ha.

    Mana ndị na-ahazị ngagharịiwe ahụ na-akpọ onwe ha Genz-212 kwuru na aka ha adịghị n’ọgbaaghara.

    Ọnụ na-ekwuru mịnịsta na-ahụ maka ime obodo bụ Rachid El Khalfi kwuru na ha ejidela mmadụ 409 kamgbe ngagharịiwe ahụ bidoro.

    Ndị uweojii ruru 260 na ndị na-eme ngagharịiwe ruru 20 meruru ahụ, ebe a gbara ụgbọala ndị uweojii dị 40 nakwa ụgbọala ndị nkịtị rụrụ 20 ọkụ.

  9. A chụpụla ndị kpọrọ onwe ha 'agbụrụ Afrịka' n'ọhịa Skọtland

    Kofi Offeh na ndị otu ya

    Ebe foto si, Screengrab

    A chụpụla ndị otu 'agbụrụ Afrịka' kpọrọ onwe ha, "Alaeze Kubala" n'ọhịa dị n'okeala Skọtland.Ndị uweojii na ndị ọrụ na-ahụ maka mbịarambịara mba 'United Kingdom' gara ebe ahụ n'ụtụtụ Tozde nye ha ha ọsọ nke ndị otu ahụ gosiri dịka ọ na-eme n'akara TikTok.A nwuchiri mmadụ abụọ n'ime ha dịka a na-enyo ha maka ịda iwu megide mbịarambịara.Onye ndu otu ahụ bụ nwa afọ Gana a kpọro Kofi Offeh bụ onye na-akpọ onwe ya "Eze Atehene" na ndị na-eso ya na-ekwu na ha na-eweghara ala nke e zuru n'aka ndị nnanna ha ochie afọ 400 gara aga. Ọ gbakwara isi akwara ịnabata iwu nke ụlọikpe nyere banyere ọnịnọ ha n'ọhịa ahụ.

  10. Ndị Jew abụọ anwụọla oge onye ojiegbe mwakporo synagogue dị na Manchester, England

    Onye ojiegbe na mgbe ndị uweojii na-enele ihe dịka ogbunigwe o nyi n'ahụ

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Onye ojiegbe , ndị uweojii na robotu

    Onye ojiegbe awakpoola ụlọekpere ndị Jew (Hebrew Congregation Synagogue) dị na Heaton Park, Mancherster, England.

    Nwoke ahụ a na-enyoenyo na o ji ogbunigwe mara otu onye mma tupuu ndị uweojii na ndị ọrụ gbatagbata abịa n’ebe mkpamkpa ahụ na-kpa.

    Mmadụ anọ meruru ahụ mana nwoke ojiegbe ahụ ka a na-ekwu na mgbọ tụrụ ya.

    Ndị mmagbụ gbakọrọ n'ebe mkpamkpa ahụ kpara

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ebe mkpamkpa a mere

    Meyọ ndị Manchester bụ Andy Burnham kwuru na “ọ dịka ọ bụ onye ojiegbe ahụ ka a gbagburu” ma gwa ndị BBC na ya amabeghị na ọ bụ eziokwu.

    Mana onyeisi ndị uweojii bụ Stephen Watson kwuru na ndị Jew mmadụ abụọ nwụrụ na mkpamkpa ahụ ebe mmadụ anọ ndị ọzọ nọ n’ụlọọgwụ.

    Ọ kọwara na ndị uweojii gburu onye kpara mkpamkpa ahụ ma kelee ndị ekpere na Synagogue bụ ndị kwụsịrị onye ojiegbe ahụ ịbanye n’ime ụlọekpere ha.

  11. Osote odeakwụkwọ mgbasaozi pati ADC n’Imo steeti anwụọla

    Osote odeakwụkwọ mgbasaozi pati ADC n’Imo steeti anwụọla

    Ebe foto si, Emeka Ihedioha, ADC/Facebook

    Osote odeakwụkwọ mgbasaozi pati African Democratic Congress (ADC) n’Imo steeti bụ Ugochimereze Chinedu Asuzu anwụọla.

    Aka chịburu Imo steeti bụ Emeka Ihedioha kwupụtara maka ọnwụ Asuzu n’otu ozi o bipụtara n’akara ọbaozi Facebook ya n’ụbọchị Tọzde 2 Ọktoba 2025.

    “Iru uju jupụtara m n’ahụ oge m nụrụ gbasara ọnwụ erughị eru Ugochimereze Chinedu Asuzu. Oge na-adịbeghị anya ka ọ bịara n’ụlọọrụ m dị n’Abuja, bụ ebe anyị nọọrọ nwee mkparịtaụka rijuru afọ,” ka Ihedioha depụtara.

    Ihedioha kọwara Maazị Asuzu dịka nwaokoroọbịa nwere ọhụ na nnukwu amamihe, ma bụrụkwa onye nwere ezi ịhụnanya n’ihe ọbụla o kwenyere na ya.

    Maazị Ihedioha kpere ekpere ka Chineke kasie ezinaụlọ Asuzu obi, tinyere ndị enyi ya, ndị Pati ADC na ndị ihe ya na-amasị, ma rịọ ka mkpụrụ obi ya zuo ike na ndokwa.

  12. Mmadụ 26 anwuọla n'ihe mberede ụgbọmmiri mere na Kogi Steeti

    Gọvanọ Ododo nyere ndị na-eji ụgbọmmiri eme njem ndụmọdụ ka ha gbalịa iyi uwe mgbochi nke bekee na-akpọ ‘life jacket’ ma kwụsị ịtinye oke ibu na ụgbọmmiri ma ha na-eme njem

    Ebe foto si, NEMA

    Nkọwa foto, Gọvanọ Ododo nyere ndị na-eji ụgbọmmiri eme njem ndụmọdụ ka ha gbalịa iyi uwe mgbochi nke bekee na-akpọ ‘life jacket’ ma kwụsị ịtinye oke ibu na ụgbọmmiri ma ha na-eme njem

    Gọọmenti Kogi steeti ekwuọla na mmadụ iri abụọ na isii nwụrụ n’ihe mberede ụgbọmmiri na steeti ahụ.

    Akwụkwọ ozi kọmishọna mgbasaozi na steeti ahụ bụ Kingsley Fanwo wepụtara, kọwara na ọ bụ ndị azumahịa na-eme njem si n'obodo Ibaji aga ahịa Ilushi dị n'Edo steeti bụ ndị nwụrụ n'ihe mberede ahụ.

    Fanwo kọwara na Gọvanọ Ododo nyere ndị na-eji ụgbọmmiri eme njem ndụmọdụ ka ha gbaa mbọ yiri uwe nchekwa 'Life Jacket" ma kwụsị ibu oke ibu oge ọbụla ha ji ụgbọmmiri eme njem.

    Mana ụlọọrụ na-ahụ maka gbatagbata na Naịjirịa ‘National Emergency Management Agency, NEMA’ kwuru na ụgbọmmiri ahụ bụ mmadụ rụrụ iri asatọ.

    Onyeisi ụlọọrụ NEMA mpaghara Kogi steeti bụ Zubaida Umar kwuru na ndị ọrụ ya zọpụtara ndị njem iri abụọ na anọ dịka a ka na-achọ mmadụ iri anọ na abụọ ndị ọzọ achọ. O kwuru na a hụla ọzu mmadụ iri na anọ.

  13. A malitela ire mmanụ ụgbọala n'Ọwụwa anyanwụ Naịjirịa dịka PENGASSAN kwụsịtụrụ abụbọọrụ ha

    BBC Igbo mere nyocha na ụfọdị steeti ndị dị n’ala ma chọpụta na ndị na-ere mmanụ ụgbọala na steeti Abia na Imo amalitela azụmahịa
    Nkọwa foto, BBC Igbo mere nyocha na ụfọdị steeti ndị dị n’ala ma chọpụta na ndị na-ere mmanụ ụgbọala na steeti Abia na Imo amalitela azụmahịa

    Ụfọdụ ọdọ mmanụ ụgbọala dị na mpaghara ọwụwa anyanwụ amalitela ire mmanụ ụgbọala dịka otu PENGASSAN kwuru na ha akwụsịtụla abụbọọrụ ha malitere n'izuụka a.

    Nnyocha BBC News Igbo mere chọpụtara na ụfọdụ ọdọ mmanụ ụgbọala dị n'Abia na Imo steeti amalitela ire mmanụ ụgbọala.

    Ndị ọkwọụgbọala na ọgbatumtum keke na-abata na azụ mmanụ ụgbọala na-enweghị mgbochi ọbụla.

    Cheta na Festus Osifo bụ onyeisi otu jikọrọ ndị ọrụ mmanụ ụgbọala na Naịjirịa bụ ‘Petroleum and Natural Gas Senior Staff Association of Nigeria (PENGASSAN)’ kwuru na ha kwụsịtụrụ abụbọọrụ dịka ụlọọrụ onye ndụmọdụ nchekwa (NSA) tinyere ọnụ n'esemokwu dị n'etiti ha na ụlọọrụ Dangote.

    Kemgbe abalị abụọ PENGASSAN malitere abụbụọrụ ha, ụfọdụ ndị na-ere mmanụ ụgbọala kwụsitụru ire mmanụ ụgbọala na mpaghara dị iche iche na Naịjirịa.

    Mana e nwere ogologo ahịrị ụgbọala n'ọdọ mmanụ ụgbọala ụfọdụ na-ere oge ahụ.

  14. Lee aha ndị kọmishona Gọvanọ Fubara chụrụ n'ọrụ na Rịvas Steeti

    Lekwa aha ndị kọmishọna ahụ Gọvanọ Fubara chụrụ n'ọrụ

    Ebe foto si, River State Government House

    Nkọwa foto, Lekwa aha ndị kọmishọna ahụ Gọvanọ Fubara chụrụ n'ọrụ

    Gọvanọ Siminalayi Fubara na-achị Rịvas Steeti achụọla ndị kọmishọna o tinyere n'ọrụ tupu Onyeisiala Tinubu akwụsitụ ya ọrụ n'ọnwa Maachị 2025.

    Akwụkwọ ozi odeakwụkwọ mgbasaozi Rivas Steeti bụ Nelson Chukwudi wepụtara mere ka o doo anya na Gọvanọ Fubara chụrụ ndị kọmishọna ahụ na ndị niile ọ họpụtara n'ọkwa dị iche iche dịka ụlọikpe kpebiri na nhọpụta ha megidere iwu.

    Cheta na ụlọikpe ahụ kachasị na Naịjirịa kpebiri na naanị ndị omeiwu atọ ahụ na-erube isi nye Gọvanọ Fubara oge a na-enwe nsogbu ndọrọ ndọrọ ọchịchị na steeti ahụ, enweghị ikike ịkwado nhọpụta ọbụla.

    Ụlọikpe ahụ kwuru na ọ bụ ndị omeiwu 27 a họpụtara na ntuliaka e mere na steeti ahụ bụ ndị nwere ikike ịkwado onye onye ọbụla Gọvanọ chọrọ inye ọkwa na steeti ahụ.

    Aha ndị kọmishọna ahụ Gọvanọ Fubara chụrụ n'ọrụ gụnyere:

    Illamu Arugu, Rowland Obed Whyte, Samuel Anya, Samuel Eyiba, Austin Emeka Nnadozie, Israel Ngbuelu, Evans Bipi, Otamiri Ngubo,, Benibo Alabraba, Emmanuel Frank-Fubara, Charles O. Beke na Collins Onunwo.

    Ndị ọzọ bụ Solomon Eke, Peter Medee, Elloka Tasie-Amadi, Basoene Joshua Benibo, Tambari Sydney Gbara na Ovy Orluideye Chinendum Chukwuma.

  15. Obi ọchịchị White House ekwuola na e nwereike ịchụ ọtụtụ ndị ọrụ gọọmenti etiti ọzọ n'ọrụ

    Oge osote Onyeisiala JD Vance na-agwa ndị ntaakụkọ okwu banyere ọchụchụ n'ọrụ ndị ọrụ gọọmenti etiti ebe odeakwụkwọ obi ọchịchị White House bụ Karoline Leavitt na-ekiri ya.

    Ebe foto si, Getty Images

    Odeakwụkwọ mgbasa ozi Amerịka Karoline Leavitt ekwuola na gọọmenti Amerịka nwere ike ịkwụsi ndị ọrụ gọọmenti etiti ọrụ n’ụbọchị n’abịa.

    Nke a na-abịa dịka ndị ụlọọmeiwu Demokrats na Repụblikans na-ajụ inwe nkwekọrịta iji kwado mmefu ego gọọmentị Donald Trump ji arụ ọrụ.

    Dịka ụbọchị ikpeazu e nyere ka ndị ụlọọmeiwu kwado mmefu ego ahụ gachara n'ụbọchi Wenezde Ọktoba 1, 2025 bụ, a na-atụ anya na a ga-achụ ọtụtụ ndị ọrụ gọọmenti etiti ọrụ.

  16. Ụtụtụ ọma Igbo bụ Igbo

    Anyị ji obi aṅụrị anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ ụbọchị Tọsde 2 Ọktoba 2025.

    Ọfọ anyị na-agọrọ gị bụ ka ihuọma kpọọ gị ihu n'ụbọchị taa

    Gaa n'ihu sonyere anyị n'akara soshal midia anyị dị iche iche WhatsApp Chanelụ, Facebook na Instagram.

    Ọ bụ Marvelous Obomanu na Michael Ngene ka gị na ha ga anọkọ n'ụtụtụ a, ebe Ikechukwu Kalu, Michael Illediagu na Chinonso Ugorji ga awuchie n'ehihe.

    Ndewo.

  17. Mmadụ 30 anwụọla dịka ewumewu ụlọ a na-arụ n'ụloụka dara

    Ụgbọala na-ebu ndị ọrịa

    Ebe foto si, Getty Images

    O pekata mpe mmadụ 30 anwụọla, ebe ihe karịrị mmadụ 200 merụrụ ahụ n'ụtụtụ Wenezde dịka ihe e ji ewu ụlọ dara n'otu ụlọụka na mba Etiopia.

    Puku kwuru puku ndịụka gbakọrọ n'ụlọụka 'Arerti Mariam Church' n'ụzọ ụtụtụ oge ewumewu ahụ dara, dịka Ahmed Gebeyehu bụ onyeisi uweojii n'ebe ahụ si gwa BBC Amharic.

    Igwe mmadụ bịara ụlọụka ahụ dị n'etiti mpaghara Minjar Sheknora area, dịka a na-eme emume Marịa dị Asọ .

    Ahmed kwuru na ọnụọgụgụ ndị nwụrụ nwere ike ịgbalite dịka o kwuru na ndị nwụrụ dị agbata afọ 25 na afọ 80.

  18. PENGASSAN akwụsịla abụbụọrụ ọ gbara site na nkwekọrịta ya na ụlọọrụ Dangote

    Njirimaara otu PENGASSAN na ụgbọala tanka Dangote na-ebu mmanụ ụgbọala

    Ebe foto si, PENGASSAN/DAGOTE/Facebook

    Otu jikọtara ndị ọrụ mmanụ ụgbọala na Naịjirịa bụ ‘Petroleum and Natural Gas Senior Staff Association of Nigeria (PENGASSAN)’ akagbuola abụbụọrụ ha gbara.

    Onyeisi otu a bụ Festus Osifo kwupụtara nke a na mgbasaozi o mere n’Abuja.

    Ọ kọwara na mkpebi a na-eso mkparịtaụka ulọọrụ ndụmọdụ banyere nchekwa na ụlọọrụ Dangote na-esipụta mmanụ nwere.

    Osifo nwuru na-agbanyeghi na o nwere ebe na-edochaghị anya mpụtara mkparịtaụka ahụ kama na otu kagburu abụbụọrụ ahụ n’obiọcha ha.

    Osifo gara n’ihu dọọ aka na ntị na PENGASSAN ga-amalite abụbụọrụ ọzọ ma ọ bụrụ na ụlọọrụ Dangote emeghi ihe dị n’akwụkwọ nkwekọrịta ahụ.

    Cheta na Gọọmentị Naịjirịa kwuru na ha emeela udo n’etiti otu PENGASSAN na ụlọọrụ Dangote.

    Ha kwuru n’ihi nke a na otu PENGASSAN kwetere ịkwụsị abụbụọrụ ahụ ha malitere ịgba n’ụbọchị Mọnde 29 Sepụtemba, 2025.

    Ebe ụlọọrụ Dangote kwetere ịkpọghachite ndị ọrụ ya a chụrụ maka isonye n’otu NUPENG na PENGASSAN ma kwụzuo ha ụgwọ.

    Ha wepụtara ozi banyere nke a na ngwụcha mkparịtaụka dị n’etiti ha nke Mịnịsta na-ahụ maka ọrụ bụ Mohammed Maigari Dingyadi nọ n’isi ya.

    Mkparịtaụka ahụ bịara dịka otu PENGASSAN nwere ndị otu ya iwu ka ha kwụsị inye ụlọọrụ Dangote mmanụ gaasị ụlọọrụ ya ga-eji esipụta mmanụ ụgbọala maka na ọ chọrọ ndị otu ha n’ọrụ.

  19. Saụt Afrịka: Malema nwereike ije nga afọ 15 maka ịgba egbe n’etiti igwe mmadụ

    Julius Malema

    Ebe foto si, Bloomberg via Getty Images

    Nkọwa foto, Julius Malema

    Omeiwu na mba Saụt Afrịka a maama nwereike ije nga afọ iri na ise maka ebubo inwe egbe nakwa ịgba ya n’etiti igwe mmadụ.

    Vidiyo Julius Malema n’afọ 2018 ebe ọ na-agba egbe n’etiti ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị ya n’oge ha mere ncheta afọ ise pụtara ma na-enwu ewu na soshal mịdịa.

    A kpụpụrụ Melama na onye nche ya bụ Adriaan Snyman ụlọikpe mana ụlọikpe tọghapurụ Snyman.

    Malema gwara ụlọikpe na egbe ahụ abụghị nke ya ma kọwaa na ya gbara egbe ahụ iji kpalite mmụọ igwe mmadụ ndị otu ya.

    Majie Twanet Olivier gwara Malema sị “ikpe amaghị gị dịka e si bo gị ebubo” tupuu enyigharịa ikpe ahụ na Januwarị 2026 bụ mgbe a ga-ebido ikpebi ikpe ahụ.

    Malema gwara ndị otu ya sị “ikpe ịma m, ije nga maọbụ ọnwụ bụ ihe nsọpụrụ" ma nnụọ iyi sị na ya ga-eme ka "ikpe ahụ ruo ụlọikpe kachasị na Saụt Afrịka”.

    Chata na ụlọikpe adila na mbụ maa Malema ikpe n’ihe dika ọnwa abụọ garaaga maka okwu ịkpa oke agbụrụ.

  20. Ndị ọrụ gbatagbata na-eme ngwangwa ịzọpụta ndị tọrọ n’ụlọ akwụkwọ dara n’Indonesia

    Ịzọpụta ndị mmadụ tara akpụ maka na ụlọ a nwereike ịdakwa ọzọ

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ebe ụlọ dara

    Opekatampe ụmụ akwụkọ ruru otu narị nwụrụ, ebe ọtụtụ ndị ọzọ meruru ahụ mgbe ụlọakwụkwọ alakụba Al-Khoziny dị na Sidoarjo dara.

    Ọtụtụ ụmụakwụkwọ ụmụnwoke gbakọrọ n’ebe ahụ ikpe ekpere mgbe ọ dara.

    Ndị ọchịchị na mba ahụ kwuru na a ka na-anụ akwa ndị na-eti mkpu ma ndị na-ebe akwa n’ime ụlọ ahụ dara dịka ọtụtụ ezinaụlọ na-eche ka a zọpụta ndị ha hụrụ n’anya.

    Mohammad Syafii kwuru na e nwere ihe mgbagwojuanya banyere ọnu ọgụgụ ụmụakwụkwọ ole nọ n’ụlọ ahụ mgbe ọ dara ma kọwaa na naanị ihe ha bu n’uche ugbua bụ ịzọpụta ndị tọrọ n’ime ya.

    A zọpụtara ụmụakwụkwọ iri na atọ mana abụọ nwụrụ n’ụlọ ọgwụ.