Samia Suluhu Hassan emeriela ntuliaka Onyeisiala mba Tanzania

Nchịkọta akụkọ niile si na mbaụwa niile

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu

  1. Igwe mmadụ emeela ngagharịiwe maka ọnwụ nwokorobịa n’aka ndị uweojii n’Umuahia

    Kọmịshịọna ndị uweojii n’Abia steeti bụ Danladi Isa gara zute ndị na-eme ngagharịiwe maka ọnwu Wisdom Akobundu Okorie nwụru anwụ n'aka ndị uweojii

    Ebe foto si, AKOBUNDU/Family

    Nkọwa foto, Danladi Isa na Wisdom Akobundu Okorie

    Igwe mmadụ emeela ngagharịiwe maka ọnwụ otu nwoke a na-akpọ Wisdom Akobundu n’aka ndị uweojii n’okpuru ọchịchị Bendel dị n’Umuahia, Abia steeti.

    Ọtụtụ ndị iwe na-enwe mere ngagharịiwe n’isi ụlọọrụ ndị uweojii dị na Bende, nke butere ọnọdụ ndị uweojii iji egbe na anwụrụ anya mmiri chụsasịa ha.

    Mana Okorie Festus bụ nwanne Wisdom kwuru na ihe niile ndị uweojii na-ekwu banyere ọnwụ nwanne ya bụ okwu asị.

    Ọ sị na enweghị mgbe a gwara ezinaụlọ ha na-ahụ adịghị nwanne ya nwoke tupu ha eburu ya gaa ụlọọgwụ ma kwuo na nwanne ya enweghị okwu ọbụla n’aka ndị uweojii maọbụ ọnọdụ ahụike.

    N’okwu ya “a kpọrọ m na nwanne m nọ n’ụlọọrụ ndị uweojii. Tupu m eruo n’ebe ahụ, ha eburula ya gaa ụlọọgwụ na-agwaghị ezinaụlọ anyị ihe mere”.

    Ọ gara n’ihu kwuo “mana anyị chọpụtala na Wisdom anwụọla n’ụlọọrụ ndị uweojii tupu ha eburu ya gaa ụlọọgwụ”.

    Dịka Kọmịshịọna ndị uweojii n’Abia steeti bụ Danladi Isa na-eti ezinaụlọ ihe a metụtara aka n’obi ka o kwuru na e jidela ndị uweojii aka ha dị n’ọnwụ Wisdom ma kwe nkwa na a ga-akpụpụ ha ụlọikpe ma e mechaa nnyocha.

  2. NDLEA ejidela nwoke a na-akpọ ‘Pretty Mike’ nakwa mmadụ 100 ndị ọzọ

    Mike Eze Nwalie Nwogu

    Ebe foto si, Pretty Mike/Instagram

    Nkọwa foto, Mike Eze Nwalie Nwogu

    Ụlọọrụ na-ebu agha megide ọgwụike na Naịjirịa bụ National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA) ekwuola na ha ejidela Mike Eze Nwalie Nwogu ndị mmadụ ji ‘Pretty Mike’ mara.

    NDLEA mere ka a mata nke a n’akwụkwọ mgbasaozi ha kesere ma kwuo na mmadụ ọnụ ọgụgụ ha ruru otu narị so na ndị ha jidere.

    Ha kọwara na e jidere Pretty Mike na mmadụ narị ndị ahụ n’ụlọ oriri na nkwari maka ebubo na a na-ere ma na-eri ọgwụike.

    Dika ha si kwuo, ihe ahụ mere n’isi ụtụtụ n’abalị iri abụọ na isii nke ọnwa Ọktoba, 2025 n’ụlọ oriri na nkwari nke Pretty Mike dị n’ụlọ nke Asaa n’ogbe Akin Adesola, Victoria Island, Legọs.

    Ugbua Pretty Mike na mmadụ narị ndị ahụ e jidere nọ n’ụlọọrụ ndị NDLEA ebe a na-eme ha nyocha banyere ebubo ndị ahụ.

  3. Trump nwere olileanya na Chaịna ga-enyereaka ime ka Rọshịa nwee mkparịtaụka udo na Yukren

    Trump na Xi zutere onwe ha ikpeazụ n'afọ 2019, n'oge ọchịchị mbụ nke Trump dịka onyeisiala.

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Trump na Xi zutere onwe ha ikpeazụ n'afọ 2019, n'oge ọchịchị mbụ nke Trump dịka onyeisiala.

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na ọ ga-achọ ka Chaịna nyereaka ime ihe megide Rọshịa ka ọ na-achọ ịkwụsị agha na Yukren.

    "Achọrọ m ka Chaịna nyere anyị aka na Rọshịa," ka onyeisiala mba Amerịka kwuru n'ụgbọelu Air Force One, ka ọ na-efega Eshịa maka njem izute Xi Jinping nke mba Chaịna na Saụt Korịa.

    N’agbanyeghị, nke a nwekwara ike ịbụ echiche efu.

    Cheta na Chaịna bụ mba nke ya na Rọshịa kachasị inwe mmekọrịta, ọ bụkwa onye nkwado dị mkpa nye Moscow kemgbe e tinyere mmachibido iwu ndị ọdịda anyanwụ maka agha ya na Yukren.

    Okwu Trump na-abịa dịka Kyiv nwechara izu siri ike dịka Amerịka jụrụ inye ya ngwaagha ogbunigwe ‘Tomahawk cruise,’ ndị isi mba Yurop ewepụtaghị ego Rọshịa akpọchiri akpọchi iji nyereaka kwado nchekwa ya na maka mwakpo ndị ọzọ dị egwu.

  4. A napụla onyeisiala mba Madagascar a chụpụrụ n’ọchịchị, ikike ịbụ nwaafọ mba ahụ

    A napụla onyeisiala mba Madagascar a chụpụrụ n’ọchịchị, ikike ịbụ nwaafọ mba ahụ

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndịagha chụpụrụ Andry Rajoelina dịka onyeisiala mba Madagascar n’izuụka gara aga anapụla ya ikike ịbụ nwaafọ mba ahụ.

    Ọ bụ Praịm Minista mba Madagascar ọhụrụ bụ Herintsalama Rajaonarivelo binyere aka n’iwu ahụ.

    Rajaonarivelo rụtụrụ aka n’iwu mba ahụ nke kwuru na nwaafọ Madagascar ọbụla nwetara ikike ịbụ nwaamaala mba ọzọ agaghị enwekwa ikike ịbụ nwaafọ Madagascar.

    Rajoelina dị afọ iri ise na otu nwetara ikike ịbụ nwaamaala mba Fransị afọ iri gara aga, nke mere e ji kpọọ oku ka a napụ ya ikike ịzọ ọkwa onyeisiala n’afọ 2023.

    Ka o sina dị, o geghị ntị n’oku ndị ahụ, dịka ọ gara n'ihu zọọ ọkwa onyeisiala ma nweta mmeri.

    Rajoelina riri mbọmbọ dịka e mere ngagharịiwe ọtụtụ izuụka n’ihu ụkọ mmiri na ọkụ latrik nọrọ ọtụtụ oge, bụ nke mere ndịagha, nke onyendu ha bụ Col Michael Randrianirina ji weghara ọchịchị n'ike.

  5. Trump ahaziela mbinye aka n'akwụkwọ 'nkwekọrịta udo' nke Thailand na Kambodịa

    Thailand na Kambodịa bụ ndị nwere nsogbu okeala nke ogologo oge

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Thailand na Kambodịa bụ ndị nwere nsogbu okeala nke ogologo oge

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ahaziela mbinye aka n’akwụkwọ 'nkwekọrịta udo' n’etiti Thailand na Kambodịa, bụ ndị nwere nsogbu okeala nke ogologo oge.

    Mgbe emume mbinye aka ahụ gasịrị, minista mba ofesi nke Thailand jụrụ ịkpọ ya nkwekọrịta udo, kama ọ gwara BBC na "M ga-akpọ ya ụzọ isi ruo n'udo".

    Cheta na ọ bụ nrụgide azụmaahịa sitere n'aka Onyeisiala Trump mere ka e nwee nkwekọrịta nkwụsị agha na ngwụcha ọnwa Julaị, nke kwụsịrị ọgụ ụbọchị ise nke gburu ihe karịrị mmadụ iri abụọ na abụọ.

    N’aka nke ọzọ, Onyeisiala mba Amerịka emeela ka o doo anya na ọ ga-eji nkwekọrịta azụmaahịa Amerịka manye mba dị iche iche ime udo, dịka onye nta akụkọ anyị si dee.

    Chetakwa na Onyeisiala Trump mere njem otu izu gaa Eshịa nke ga-agụnye izute onye otu ya na Chaịna bụ Xi Jinping mgbe a na-eme emume Apec na Saụt Korea ya na ịga Japan maka izute onye ndu nwaanyị mbụ a họpụtara ọhụrụ na mba ahụ.

  6. Igbo anyị ji eme ọnụ, ụtụtụ ọma ụnụ!

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Sọnde 26 Ọktoba 2025.

    Anyị na-asị ka Chineke kere ihe niile zaa ekpere anyị taa.

    Biko, gaa n’ihu sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ ihe na-eme na Naịjirịa nakwa ụwa niile.

    Sonyekwara anyị n'akara soshal midịa anyị dị iche iche nke gụnyere WhatsApp Chanelụ, Facebook na Instagram maka akụkọ ndị ọzọ dị n'ụdị onyonyoo na foto.

    Ya gazie!

  7. Ụlọikpe dị n’Ebonyi steeti atụọla nwoke mkpọrọ maka idina ụmụntakịrị n’ike

    Ụlọikpe dị n’Ebonyi steeti atụọla nwoke mkpọrọ maka idina ụmụntakịrị n’ike

    Ebe foto si, Getty Images

    Ụlọikpe dị n'Ebonyi steeti enyela iwu ka e tinye nwaakwụkwọ dinara ụmụntakịrị n’ike n’ụlọmkpọrọ afọ iri anọ.

    A mara Nwafor Jacob bụ nwaakwụkwọ sekọndịrị ikpe site n’iwu Ebonyi steeti nke gbakwasịrị ụkwụ n'ikike ụmụaka nke afọ 2010, ngalaba iri atọ na anọ.

    Akụkọ kwuru na Jacob dị afọ iri na asatọ mgbe ihe a mere, dinara ụmụaka ise dị afọ iri, iri na atọ, itoolu na asaa n’ike na ọnwa Janụwarị afọ 2020 n'obodo Onunwafor dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Ezza n'Ebonyi steeti.

  8. Kanada ga-akagbu ozi ha wepụtara nke kpasuru Trump iwe

    Cheta na Trump kagburu mkparịtaụka azụmaahịa ha na Kanada maka mgbasaozi ahụ nke kpasuru ya iwe

    Ebe foto si, Getty Images

    Obodo Ontario dị na Kanada ekwuola na ha ga-akwụsị mgbasaozi Kanada wepụtara nke kwugidere atụmatụ mbulite ụtụisi nke Donald Trump tinyere na ngwahịa si mba ahụ.

    Onye na-elekọta obodo Ontario bụ Doug Ford si na mkpebi a na-abịa dịka ya na Praịm minister Kanada bụ Mark Carney nwechara mkparịtaụka n’ụbọchị Fraịde ka mkparịtaụka azụmaahịa dị n’etiti Amerịka na Kanada nweeike ịga n’ihu.

    Cheta na Trump kagburu mkparịtaụka azụmaahịa mba Amerịka na Kanada maka mgbasaozi ahụ ha mere nke ọ sị kpasuru ya iwe.

  9. Ndị be anyị, ụnụ asaala chị?

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Satọde 25 Ọktoba 2025.

    Ka ụbọchị ta mịtara anyị niile mkpụrụ ọma.

    Biko, gaa n’ihu sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ ihe na-eme na Naịjirịa nakwa ụwa niile.

    Sonyekwara anyị n'akara soshal midịa anyị dị iche iche nke gụnyere WhatsApp Chanelụ, Facebook na Instagram maka akụkọ ndị ọzọ dị n'ụdị onyonyoo na foto.

    Daalụ!

  10. Anyị agaghị anabata vootu e zuru n’ohi – Onyendu otu na-agba gọọmenti ụkwụ na Kameruun

    Anyị agaghị anabata vootu e zuru n’ohi – Onyendu otu na-agba gọọmenti ụkwụ na Kameruun

    Ebe foto si, AFP via Getty Images

    Onyendu otu na-agba gọọmenti ụkwụ na mba Kameruun bụ Issa Tchiroma Bakary, agwala BBC na ya agaghị anabata vootu ndị e zuru n’ohi.

    Bakari kwupụtara onwe ya dịka onye nwetara mmeri na ntuliaka onyeisiala mba Kameruun a haziri n’ụbọchị 12 Ọktoba 2025.

    Mba Kameruun na-eche ugbua ịmata mpụtara ntuliaka ahụ, bụ nke a ga-akpọpụta n’ụbọchị Mọnde.

    O kwuru na ndị otu ya apịakọọla foto niile ha nwetara gbasara mpụtara ntuliaka n’ogige ntuliaka dị iche iche.

    Tchiroma Bakary dị afọ iri asaa na isii bụụrụ minista mba Kameruun tupu ya na Onyeisiala Paul Biya dị afọ iri itoolu na abụọ enwee nghọtahie.

    Ka o sina dị, Biya na-achọ ohere ịbanye n’ọkwa ọzọ, dịka ọ nọọrọ afọ iri anọ na atọ n’oche onyeisiala mba Kameruun.

    Pati nọ n’ọchịchị ekwuola na eziokwu adịghị n’okwu ahụ Tchiroma Bakary kwuru na ọ bụ ya nwetara mmeri na ntuliaka onyeisiala.

    Ụfọdụ ndị ji ọkwa ọchịchị na mba Kameruun kọwara okwu ahụ dịka nke iwu na-akwadoghị, n’ihi na ọ bụ naanị otu Constitutional Council nwere ikike ikwupụta mpụtara ntuliaka.

  11. Trump akagbuola nkwekọrịta azụmahịa dị n’etiti Amerịka na Kanada

    Trump kwupụtara na-akara soshial midia ya na mgbasaozi ahụ bụ “adịgboroja”

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Trump kwupụtara na-akara soshial midia ya na mgbasaozi ahụ bụ “adịgboroja”

    Onyeisiala Donald Trump ekwuola na mkparịtaụka azụmahịa dị n’etiti ya na Kanada 'akwụsịla' n'ihi ozi mgbasaozi Kanada wepụtara nke kwugidere atụmatụ mbulite ụtụ nke Trump tinyere na ngwahịa si mba ahụ.

    Mgbasaozi eji ere ahịa a nke gọọmenti Ontario nọ na Kanada kwadoro gosipụtara ebe Ronald Reagan kwuru na “ụtụ Trump na ngwaahịa na-emeru ndị Amerịka ahụ”.

    Trump kwupụtara n'akara soshal midia ya na mgbasaozi ahụ bụ “adịgboroja”

    Cheta na gọọmenti Trump tinye ụtụ pasenti iri atọ na ise na mbubata ahịa ọbụla si mba Kanada abata Amerịka.

  12. Nwunye Onyeisiala Gana pụrụ apụ anwụọla ka ọ gbachara afọ 76

    Nwunye Onyeisiala Gana pụrụ apụ anwụọla ka ọ gbachara afọ 76

    Ebe foto si, Nana Konadu Agyeman-Rawlings/Facebook

    Nwunye onye bụbu onyeisiala mba Gana bụ Flight Lieutenant Jerry John Rawlings anwụọla.

    Nana Konadu Agyeman-Rawlings nwụrụ n’isi obodo mba Gana bụ Accra ka ọ rịachara obere ọrịa.

    Konadu Agyeman-Rawlings bụụrụ nwunye onyeisiala Gana malite n’ọnwa Juun 1979 ruo n’ọnwa septemba 1979 nakwa site n’ọnwa Disemba 1981 ruo n’ọnwa Jenụwarị 2001.

    Akụkọ kwuru na ọ nwụrụ n’ụlọọgwụ Ridge Hospital dị n’Accra dịka ọ gbachara afọ iri asaa na isii.

    Obi ọchịchị mba Gana kwupụtakwara gbasara ọnwụ nwaanyị ahụ bụbu nwunye onyeisiala n’ozi ha jiri zigara ezinaụlọ ya ozi nkasiobi.

    Konadu Agyeman-Rawlings na di ya nwụrụ anwụ mụtara ụmụ anọ, nke otu n’ime ha bụ onye omeiwu aha ya bụ Dr Zanetor Agyeman-Rawlings.

  13. Eze Charles abụrụla Onyeisi ụka Church of England mbụ ya na Popu ga-ekpe ekpere n’ọha

    Eze Charles abụrụla Onyeisi ụka Church of England mbụ ya na Popu ga-ekpe ekpere n’ọha

    Ebe foto si, Reuters

    Eze mba United Kingdom bụ Eze Charles nke atọ abụrụla Onyeisi Ụka Ịngland mbụ ya na Popu ga-ekpe ekpere n’ihu ọha mmadụ.

    Ihe a bụ nke mbụ a na-ahụ ebe Popu na Eze mba UK na-ekpekọrịta ekpere kemgbe Ụka Ịngland kewapụrụ onwe ya na Rome ihe ruru narị afọ ise gara aga.

    Eze ahụ bụ nnukwu Onyeisi Ụka Ịngland ma bụrụkwa onye nọ kemgbe na-akpọ oku maka ịdịnotu n’etiti otu okpukperechi dị iche iche.

    Eze Charles na Popu Leo buuru ụzọ nyerịta onwe ha onyinye tupu ha abanye na mkparịtaụka.

    Ọ bụ ọnwa ise gara aga ka a họpụtara Popu Leo dịka nwaafọ Amerịka mbụ ga-eru n’ọkwa ahụ.

    Njem a na-abịa dịka a nụchara akụkọ ọjọọ gbasara Prince Andrew, mana Obieze na-agba mbọ ịhụ na ọ kụsasịghị emume ahụ.

  14. A tọrọla onye oziọma si mba Amerịka na Nijie

    A tọrọla onye oziọma si mba Amerịka na Nijie

    Ebe foto si, Getty Images

    Ọtụtụ ndị nchekwa agwala ụlọmgbasaozi ha na BBC na-emekọrịta ihe bụ CBS na a tọọrọ otu onye oziọma si mba Amerịka na Nijie.

    Nwoke ahụ a na-amatabeghị aha ya bụ onye a tọọrọ n’isi obodo mba Nijie bụ Niamey n’ụbọchị Tuzde.

    Akụkọ kwuru na a tọọrọ onye oziọma ahụ n’ihe dịka mita iri itoolu na otu site n’obi ọchịchị mba Nijie bụ ebe e jichiri Onyeisiala Mohamed Bazoum kemgbe a napụrụ ya ọchịchị n’ike n’afọ 2023.

    Ọtụtụ ozi anyị nwetara na-ekwu na nwoke ahụ rụrụ ọrụ dịka onye oziọma maka otu ụlọọrụ enyemaka dị n’Amerịka, ma birikwa na mba Nijie kemgbe afọ 2010.

    Ka ọ dị ugbua, amatabeghị ndị aka ha dị na ntọrị nwaamadị ahụ.

    Ngalaba na-ahụ maka ihe ndị na-eme n’obodo na mba Amerịka kwuru na ha anụla na a tọọrọ nwaafọ Amerịka na mba Nijie.

  15. Ndị uweojii anwuchiela Omoyele Sowore dịka ọ bịara ikpe Nnamdi Kanu

    Omoyele Sowore

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Omoyele Sowore

    Anwuchiela Omoyele Sowore, onye na-agba mbo maka ikike diiri onye ka ọ na-aputa ikpe Nnamdi Kanu mere n'ụlọikpe ukwuu n'Abuja.

    Ndị uweojii ekwubeghị ihe mere ha jiri nwuchịe ya mana ndị mmadụ na-ekwu na ọ bụ maka ngagharịiwe o mere.

    Cheta na n'ụbọchị 20 Ọktoba ka Sowore hazịrị ngagharị iwe maka ntọhapụ Nnamdi Kanu ebe ha nwuchịrị ọkaiwu na nwanne Nnamdi Kanu.

    Ndị uweojii ekwubeghị ihe mere ha jiri nwuchịe ya mana ndị mmadụ na-ekwu na ọ bụ maka ngagharịiwe o mere.

    Ebe foto si, Aloy Ejimakor/X

    Nkọwa foto, Ndị uweojii ekwubeghị ihe mere ha jiri nwuchịe ya mana ndị mmadụ na-ekwu na ọ bụ maka ngagharịiwe o mere.

    Ndị mmadụ boro Sowole ebubo na ọ ya mere eji nwuchie nwanne Nnamdi Kanu na ọkaiwu ya mana ezinaụlọ Nnamdi Kanu si na ebubo ahụ abụghị eziokwu.

    Akụkọ na-efegharị na-enwere ike ị kpọpụ Sowore ga ụlọikpe

  16. Amerịka etinyela mmachi ọhurụ nye Mba Rọshịa ka okwu n’adabaghịrị ha abụọ

    Trump katọrọ Putin maka o jighị atụmatụ inweta udo n’etiti ha na Yukren kpọrọ ihe.

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Trump katọrọ Putin maka o jighị atụmatụ inweta udo n’etiti ha na Yukren kpọrọ ihe.

    Mba Amerịka ekwupụtala mmachi ọhụrụ nye ụlọọrụ abụọ kacha ibu na izụ ahịa mmanụ na Rọshịa iji mee ka Onyeisiala Putin nwere ike ị kwekọrịta atụmatụ udo na Yukren.

    Nkwupụta a na-abịa dịka Trump kwuru n’atụmatụ izute onye otu ya na Rọshịa Putin na Budapest agaghị aga n’ihu.

    Na okwu ya, “Mgbe ọbụla mụ na Putin nwere nzukọ, anyị na-enwe okwu dị mma mana ọ naghị amita mkpụrụ

    Trump katọrọ Putin maka o jighị atụmatụ inweta udo n’etiti ha na Yukren kpọrọ ihe.

  17. Ndị be anyị, ụnụ asaala chị?

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Tọsde 23 Ọktoba 2025.

    Ka ụbọchị ta mịtara anyị niile mkpụrụ ọma.

    Biko, gaa n’ihu sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ ihe na-eme na Naịjirịa nakwa ụwa niile.

    Sonyekwara anyị n'akara soshal midịa anyị dị iche iche nke gụnyere WhatsApp Chanelụ, Facebook na Instagram maka akụkọ ndị ọzọ dị n'ụdị onyonyoo na foto.

    Daalụ!

  18. Uwazurike akpụpụla ndị uweojii Imo Steeti n’ụlọikpe

    Uwazurike boro ha ebubo na ọ bụ n’ihi na ndị mmadụ chọrọ ime ngagharịiwe maka ntọhapụ Maazị Nnamdi Kanu mere ha jiri sị ya bịa ụbọchị ahụ kpọm kwem.

    Ebe foto si, Ralph Uwazurike

    Nkọwa foto, Uwazurike boro ha ebubo na ọ bụ n’ihi na ndị mmadụ chọrọ ime ngagharịiwe maka ntọhapụ Maazị Nnamdi Kanu mere ha jiri sị ya bịa ụbọchị ahụ kpọm kwem.

    Onyeisi otu na-azọ nwere onwe Biafra nke a kpọrọ Movement for the Actualization of the Sovereign State of Biafra (MASSOB) akpụpụla ndị uweojii Imo steeti ụlọikpe ukwu dị n’Owere, ma kwuo na ha ga-akwụ ya nde naịra maka ịnapụ ya ikike dịrị ya n’iwu Naịjirịa.

    Maazị Ralph Uwazurike bụ onye a ma ama n’ọgụ nwere onwe Biafra ka mgbe ọtụtụ afọ kwuru na iwe ya bụ na gọọmenti Imo steeti si n’aka ndị uweojii akpọrọ ‘Tiger Base’ n’Owere detara ya akwụkwọ ụbọchi 16 Ọktoba ka ọ bịa n’isi ụlọọrụ ha dị n’Owere ụbọchị Mọnde 20 Ọktoba 2025 bịa zara ọnụ ya.

    O boro ha ebubo na ọ bụ n’ihi na ndị mmadụ chọrọ ime ngagharịiwe maka ntọhapụ Maazị Nnamdi Kanu mere ha jiri sị ya bịa ụbọchị ahụ kpọm kwem.

    O kwuru na ya nwere ikike dịka nwaafọ Naịjirịa isonye na-ikwupụta obi ya n’ụzọ udo ọbụla ya chọrọ.

    Nke a mere Uwazurike jiri sị na ndị uweojii ga-akwụ ego ruru nde naịra ma rịọ ụlọikpe ka ọ kwụsị ndị uweojii inye ya ụdịrị ntụziaka ahụ n’ọdịnihu.

  19. Ụmụnwaanyị emeela ngagharịiwe n’Enugwu maka nwoke ji mma gbuo nwunye ya

    Ụmụnwaanyị ahụ kpọrọ oku ka gọọmenti taa nwoke ahụ ahụhụ kwesịrị ya dika iwu obodo Naịjirịa siri kwuo.

    Ebe foto si, Onyinye Mama

    Nkọwa foto, Ụmụnwaanyị ahụ kpọrọ oku ka gọọmenti taa nwoke ahụ ahụhụ kwesịrị ya dika iwu obodo Naịjirịa siri kwuo.

    Otu ụmụnwaanyị dị iche iche jikọtara aka ọnụ mee ngagharịiwe maka otu nwoke gburu nwunye ya bụ Onyinyechi Okoh n’Enugwu.

    Mkpa mkpa ahụ mere n’Amodu dị na Nkanu oge nwoke ahụ bụ Maazị Okoh jiri mma gbukasịa nwunye ya oge ọ na-arahụ ụra.

    Ụmụnwaanyị ndị ahụ ji iwe gagharịa n’Enugwu ma gosi ọkọlọtọ di iche uche nke ha depụtara iwe ha.

    Nwaanyị na-elekọta otu a kpọrọ Police Community Relations Committee bụ ọkaikpe Chizoba Sandra Agbo gwara ndị ntaakụkọ na obi gbawara ya dika ọ chọpụtara na nwoke ahụ kwadoro nke ọma were obi ọjọọ gbuo nwunye ya na-arahụ ụra n’udo.

    Ha kpọrọ oku ka gọọmenti taa nwoke ahụ ahụhụ kwesịrị ya dika iwu obodo Naịjirịa siri kwuo.

    Umunwaanyị ahụ dọrọ aka na nti ka onye maọbụ otu ọbụla ghara inọchi ụzọ nwaanyị ahụ nwụrụ anwụ ga-esi nweta ikpe nkwụmọtọ.

    Onyeisi otu Women support Women Human Empowerment and Mentorship Initiative bụ Oriakụ Onyinye Mama Kọwara na nwaanyị ahụ nwụrụ anwụ alaala be nna ya mbụ, tupu nwoke ahụ arịọ ka ọ laghachi, ngwangwa mana ọ lọghachiri, nwoke ahụ egbuo ya.

    Mama kwara arịrị na mmegbu a na emegbu ụmụnwaanyị karịrị akarị.

  20. Rọshịa tụrụ Yukren ogbunigwe metụtara ụmụaka na nkenke awa a kwụsịrị nzụkọ Trump na Putin

    Ebe a tụrụ ogbunigwe na mba Yukren

    Ebe foto si, DSNS Ukraine

    Opekatampe mmadụ asaa awụọla n’ogbunigwe Rọshịa tụrụ Yukren. Ndị nwụrụ gunyere ụmụaka abụọ mana ọtụtụ meruru ahụ.

    Rọshịa tụrụ ogbunigwe ahụ na mpaghara Kharkiv nakwa Kyiv bụ ebe ụmụaka so na mmadụ ọnụ ọgụgụ ha ruru iri abụọ na asaa meruru ahụ.

    Nke a na-eme naanị na nkenke awa ole ma ole gachara Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump kwụsịrị nzụkọ e hibere n'etiti ya na Onyeisiala mba Rọshịa bụ Vladimir Putin.

    Trump kwuru na ya achọghị “nzụkọ na-agaghị amịta ezi mkpụrụ”.