Onyeisiala Tinubu ga-eje ọgbakọ AQABA na Rome, Itali

Ebe foto si, Bayo Onanuga/x
Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu ga-eme njem Rome bụ isi obodo mba Itali n’ụbọchị Sonde, Oktoba 12, 2025.
Gọọmenti etiti mere ka a mata nke a site n’akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuru Onyeisiala pụrụiche bụ Bayo Onanuga kesere n’akara soshal mịdịa ya.
Dịka ozi ahụ si kwuo “Tinubu na-aga Rome maka ọgbakọ ‘Aqaba Process Heads of State and Government’ bụ ọgbakọ na-etinye anya n’ọnọdụ nchekwa n’ọdịda anyanwụ Afrịka”.
Ọgbakọ ahụ ga-amalịte n’ụbọchị Oktoba 14 ka a na-atụanya na ndị isi ala mba Afrịka dị icheiche na-kwa ndị isi ọrụ nchekwa ma ndịagha n’ọtụtụ mba ga-abịa makwa ndị ọrụ obi ebere dị icheiche.
Ọgbakọ Aqaba bụ nke eze Abdullah nke abụọ mba Jordan wepụtara n’afọ 2015 maka ibuso agha megide ndị na-eyi ọha egwu ma bụrụ ebe a na-akpa banyere usoro a ga-esi kwụsị ndị na-eyi ọha egwu.
Ndị ga-eso Onyeisiala Bola Tinubu mee njem ahụ gunyere mịnịsta na-ahụ maka mmekọ Naịjirịa na mba ofesi nke steeti bụ Bianca Odumegwu–Ojukwu, mịnịsta nchekwa bụ Mohammed Badaru Abubakar, Onye ndụmọdụ onyeisiala banyere nchekwa bụ Nuhu Ribadu, onyeisi ụlọọrụ National Intelligence Agency (NIA) bụ Ambassador Mohammed Mohammed, ma ndị ọzọ.























