Samia Suluhu Hassan emeriela ntuliaka Onyeisiala mba Tanzania
Nchịkọta akụkọ niile si na mbaụwa niile
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu
Somtochukwu Maduagwu: Kirie etu ụka a kaara nwaada ahụ nwụrụ anwụ si gaa na Pọtakọt
Ezinaụlọ nwaada Somtochukwu Maduagwu nwụrụ anwụ, nna ya bụ Ifeanyi Maduagwu, nne ya, ụmụnne
na ndị ọnyị ha bịara n’igwe nonyere ha n’ụlọụka Corpus Christi dị na Pọtakọt, Rịvas
steeti ebe a nọ kaara ya ụka ọnwụ.
Cheta na Somtochukwu
Maduagwu bụ onye ntaakụkọ ụlọọrụ Arise-Tv ndị ojiegbe mwakporo ma gbuo n’ụlọ ya
n’Abuja.
Ebe foto si, BBC IGBO
Gọvanọ Bayelsa Steeti bụ Douye Diri apụọla n’otu PDP
Ebe foto si, Gọvanọ Douye Diri / x
Nkọwa foto, Douye Diri
Gọvanọ Beyelsa steeti ekwuola na ya apụọla n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị
Peoples Democratic Party (PDP).
Gọvanọ Diri mere ka a mata nke a na Yenagoa, isi obodo Bayelsa
Steeti.
O kwuru na ya na ndị omeiwu steeti ya dị iri abụọ na atọ
ga-eso pụọ na PDP.
Tupu akụkọ a apụta, Gọvanọ Diri ekwubeghi otu ndọrọndọrọ ọchịchị ọzọ ọ ga-abanye
mana cheta na nke a na-eme dịka Gọvanọ Enugwu steeti bụ Peter Mbah hapụrụ PDP
banye na All Progressives Congress (APC).
Di na nwunye ndị Izrel Hamas tọọrọ ahụla onwe ha anya ka ọ gachara abalị 738
Ebe foto si, Israel Defense Forces
Nkọwa foto, Noa Argamani na Avinatan
Di na nwunye ụmụ amaala mba Izrel so na ndị Hamas tọọrọ
ejirila anya ha abụọ hụta onwe ha ka ọ gachara abalị 738 ha nọrọ n’aka ndị ntọ.
Ha abụọ Hamas tọọrọ ma jichie
na mpaghara dị icheiche anọọla ihe karịrị afọ abụọ na-ejighị anya hụta onwe ha.
Hamas tọọrọ Noa Argamani na Avinatan mgbe ha gara ebe a na-eme emume egwu a nakpọ Nova n’Izrel.
Vidiyo ebe
ndị Hamas ji ọgbatumtum tọrọ Argamani n’oge ahụ so na vidiyo wuruewu mana a tọghapụrụ
ya n'ọnwa Juun 8, 2024 mgbe Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump tinyereaka nweta nwekọrịta udo na Gaza.
Argamani bụ
onye kenerere Donald Trump maka etu di ya si nweta ntọhapụ kwuru na ugbua “m na dị m ga-ebido na-enweta
onwe anyị”.
Ndị nche obodo Ụmụleri ejidela mmadụ ise maka ebubo ire anụ nwụrụ anwụ n’Anambra Steeti
Ebe foto si, Facebook screengrab
Nkọwa foto, Mmadụ ise ejidere bụ ndị asị na-esi nri ma na-erekwa anụ ndụ.
Aka ndị
nche obodo Ụmụleri akparala mmadụ ise a na-enyo enyo na ha na-ere anụ nwụrụ anwụ
ejiri chụọ aja na mmiri Omambala dị n’Anambra steeti.
Ya bụ ihe
mere oge ndị nche obodo Umudiana Ụmụleri jidere mmadụ ise na be ha, bụ ndị na-esi
nri ma na-erekwa anụ ndụ.
E kwuru na ndị ahụ ji ụgbọala keke na bọọsụ buru anụ ehi, anụ ọkụkọ, nakwa anụ ewu nwụrụ
anwụ nke ụfọdụ n’ime ha maliterela ire ere.
Ka e siri
kwuo, ndị nche obodo jidere ha n’ihi na anụ ndị ahụ n’ebutezi ijiji.
Ka a gbara
ha ajụjụ ọnụ, ndị ahụ kwuru na ọ bụ na mmiri Omambala, ebe a na-achụ aja dị
iche iche ka ha butere ụfọdụ anụ ndị ahụ.
Ha gara
n’ihu kwuo na ọ bụ Ọnịcha ka ha bu anụ ahụ aga, ebe ha ga-eresị ya ndị na-ere
anụ ndụ nakwa ndị na-esi nri ahịa.
E kwuru na
aha ndị ahụ a na-enyo enyo gụnyere Uchenna Onwurah dị afọ iri abụọ na ise,
Chibogu Ogechi dị afọ iri abụọ na ise, Obalim Chukwujekwu dị afọ iri abụọ na
ise, Onyemaechi chukwuemeka dị afọ iri abụọ na asaa, nakwa Onyibo John dị afọ
iri abụọ na asaa.
E kwuru na
anụ ndị e nwetere n’aka ha gụnyere ehi, ewu na ọkụkọ.
Ndị nche ahụ ji
ohere ahụ yọọ ndị mmadụ ka ha nnyochaa anụ ọbụla ha chọrọ iri maka na mmadụ
nwereike isi n’anụ ahụ adịghị mma bute ọrịa.
Ihe ọmụmụ Maths abụghịzi iwu maka ụmụakwụkwọ nọ na ngalaba 'Arts'
Ebe foto si, Tunji Alausa/X
Nkọwa foto, kwuru na usoro ọhụrụ a metụtara mahadum, politekịnịc, kọleji agụmakwụkwọ, na Innovation Enterprise Academies (IEAs) dị n'ofe Naịjirịa.
Ọ bụkwaghị iwu na ụmụakwụkwọ na-achọ ịbata na ngalaba ‘Arts’
na mahadum Naịjirịa ga-enwete kredit na mgbakọ na mwepụ bekee kpọrọ Mathematics
n’ule asambodo Senior School Certificate Examination (SSCE), dịka ntuziaka Mịnịstrị
na-ahụ maka agụmaakwụkwọ na Naịjirịa degharịrị maka ịbanye ụlọakwụkwọ mahadum
Naịjirịa, si kwuo.
Ọnụ na-ekwuru mịnịstrị ahụ bụ Folasade Boriowo kwuru na n’ozi
mịnịstrị ahụ wepụtara n’ụbọchị Tuzde 14 Ọktoba 2025 na ntuziaka a edegharịrị, bụ
iji wepụ ihe mgbochi, mee ka enwe ọchịchị onyekwuouche n’usoro agụmakwụkwọ
mahadum ma inye ndị ntoroọbịa Naịjirịa ike.
O kwuru na usoro ọhụrụ a metụtara mahadum, politekịnịc, kọleji
agụmakwụkwọ, na Innovation Enterprise Academies (IEAs) dị n'ofe Naịjirịa.
Ọ na-ekwu na ahaghị nhata a bụ n'ihi ihe mgbe ochie na nke
siri ike kwesịrị ịpụ n’ụzọ ka ikpe ziri ezi na oghere bata n’agụmakwụkwọ nke Naịjirịa.
O kwukwara na a kagbuola asambodo National Industrial
Diploma (NID) nke Innovation Enterprise Academies na-enye na mbụ ma jiri
National Diploma (ND) dochie ya.
Nkwupụta ahụ gara n’ihu kwuo na minista na-ahụ maka agụmaakwụkwọ
bụ Tunji Alausa kwuru na mgbanwe ahụ dị mkpa maka ịkwụsị ọtụtụ afọ nke
amachibidoro oghere ndị tozuru etozu enweghị ike ibanye na mahadum.
"Kwa afọ, ihe karịrị mmadụ nde abụọ na-ede ule Unified
Tertiary Matriculation Examination (UTME), mana ọ bụ naanị ihe dịka mmadụ narị
puku asaa ka a na-anabata na mahadum," Alausa kwuru.
A chọpụtala njirimara ozu ndị Izrel mmadụ atọ ebughachitere dịka Trump gwara Hamas ka ha wezuga ngwaagha
A chọpụtala njirimara na aha ozu mmadụ atọ nwụrụ mgbe e jidere
ha nke ndị Hamas bughachitere ndị Izrel.
Ezinụlọ ndị eji eji na ndị a na-achọ achọ kwuru na aha ha gụnyere
Tamir Nimrodi, Etian Levy na Uriel Baruch mana a chọpụtabeghị njirimara maọbụ aha
onye nke anọ.
Nke a na-abịa dịka Izrel dọrọ aka na ntị na ọ ga-amachibido
ihe enyemaka ịbanye na Gaza ma gbuo oge na-ịgbape ụzọ Rafah ruo mgbe Hamas
weghachiri ozu mmadụ iri abụọ na asatọ nwụrụ anwụ.
E weghachighị ozu ndị nwụrụ anwụ ọsọ ọsọ akpalitela iwe n’Izrel,
mana ndị Palestine na-enwewanye nchegbu na igbu oge ahụ nwereike iweta ejighị
n'aka na ọdịnihu nke nkwụsị ọgụ ahụ.
N’aka nke ọzọ, ụlọọrụ Red Cross kwuru na ozu ndị Palestine mmadụ
iri anọ na ise nwụrụ anwụ bụ ndị ejidere n’Izrel alọghachitela na Gaza na Tuzde.
Ka ọ dị ugbu a, onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump
na-ekwu na ọ bụrụ na Hamas ewepụghị ngwaagha "anyị ga-anapụ ha ngwaagha".
Ụtụtụ ọma, Igbo ndị ọma
Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Wenezde 15 Ọktoba 2025.
Anyị na-asị ka ọ dịrị onye ukwu mma ma dịkwara onye nta mma.
Biko, gaa n’ihu sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ ihe na-eme na Naịjirịa nakwa ụwa niile.
Sonyekwara anyị n'akara soshal midịa anyị dị iche iche nke gụnyere WhatsApp Chanelụ, Facebook na Instagram maka akụkọ ndị ọzọ dị n'ụdị onyonyoo na foto.
Ya gazie!
Ndịagha mba Madagaskar achụpụla Onyeisala Andry Rajoelina ma weghara ọchịchị
Ebe foto si, AFP via Getty Images
Nkọwa foto, Otu ndịagha weghara ọchịchị a ma ama ka CAPSAT akwụsila ndị ọrụ ọchịchị onye kwuo uche ya na mba ahụ
Ndịagha mba Madagaska ewerela ọchịchị ma chụpụ Onyeisala Andry Rajoelina.
Nke a na-abịa dịka Rajoelina gbagara ebe ọ ga-enwe nchekwa oge a nwachara imemila ndụ ya dịka ụmụntoroọbịa kpọrọ onwe ha “Gen-Z Mada” na-eme
ngagharịiwe.
Otu ndịagha weghaara ọchịchị a ma ama ka CAPSAT
akwụsịla ndị ọrụ ọchịchị onye kwuo uche ya na mba ahụ nke
gunyere ụlọikpe na ndị na-ahazi ntuliaka ma kwuo na ha ga-eme ntuliaka n’ime afọ
abụọ na-abịa abịa.
Cheta na ndị ọmeiwu mba Madagaskar chọrọ ịchụpụ onyeisiala Andry Rajoelina n'oche, mana ọ jụrụ ajụ. Ka ọ dị
ugbua, o nweghị onye ma ebe ọ nọ.
Kashim Shettima na ndị APC anabatala Gọvanọ Peter Mbah
Nkọwa foto, Shettima si na obi di ya ụtọ na gọvanọ Mbah esila na umbrella bata na pati ji aziza azapụ ihe ọjọọ”
Aka na-achị Enugwu steeti bụ Gọvanọ
Peter Mba ahapụla pati o jiri banye n’ọkwa bụ PDP ma kpọrọ ndị otu ya
niile banye na pati APC.
Osote onyeisiala Naịjirịa bụ Kashim
Shetima na ọtụtụ ndị mmadụ jupụtara n’ogige Okpara Square dị n’Enugwu ịnabata
Mbah.
N’okwụ nnabata ya, Shettima kwuru na oge eruola mgbe ndi Igbo ga-abata ma soro n’ihe a na-eme site n'ịbanye na pati APC.
“Obi dị m ụtọ na Gọvanọ Mbah esila na
mbụlarị bata na pati ji azịza azapụ ihe ọjọọ” ka osote onyeisiala kwuru.
Shettima gara n’ihu kwuo na ọ bụ pati APC
ji ọkwa niile nwere isi n'obodo Naịjirịa, ma sị na ugbua ka ndị Enugwu ga-enweta
oke ruuru ha n'Abuja.
N’ozi ekele ya, Gọvanọ Peter Mbah kwuru na ya banyere APC iji wetara ndị Enugwu ọchịchị zuru oke.
Onyeisi pati APC bụ Ọkammụta Nentawe Yilwatda nyefere Gọvanọ Peter Mban ọkọlọtọ pati APC nakwa azịza iji gosi na
ha anabatala ya na pati ahụ.
Gọvanọ chịburu Enugwu steeti bụ Sullivan Chime
kelere ndị niile bịara ịnọnyere ha na nnukwu mmemme ahụ.
Ndị Gọvanọ niile nọ na pati APC, ndị omeiwu
ukwu na nke nta, nakwa ọtụtụ ndị nwere agba na pati ahụ bịara n’Enugwu ịnabata
Gọvanọ Peter Mba na APC.
Nkọwa foto, Shettima si na ugbua ka ndị Enugwu ga-enweta oke ruru ha na Abuja
Lee iwu ntuliaka ndị omeiwu Naịjirịa chọrọ ịgbanwe tupu ntuliaka 2027
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, INEC
Ndị omeiwu na Naịjịrịa ewepụtara ọtụtụ ihe ha chọrọ igbanwe n'usoro ntuliaka tupu n'afọ 2027.
Mgbawa ndị ahu gunyere ka eme ntuliaka Onyeisiala na Gọvanọ na abalị 185 tupuu ọnwa Mee abalị iri abụọ na itoolu nke afọ 2027. Nke a pụtara na e nwereike ime ya na Nọvamba 2026.
Ha chọrọ ka Permanent Voter Card (PVC)
hara ịbụ naanị ihe onye tozuru ịtụ vootu ga-eji tụọ vootu. Ha chọrọ ka onye ahụ
nweike iji akwụkwọ njiri mara Naịjirịa, akwụkwọ ndeba aha n’obodo bụ National
Identification Number (NIN) nakwa asambodo mgbe a mụrụ mmadụ nwere tụọ vootu
Ha chọrọ ka ọ bụrụ iwuriri na igwe
eletrọnịk na ide n’akwụkwọ nkịtị bụrụ ụzọ e si edekọ ma na-eziga mpụtara na
ntuliaka. Ha chọrọ ka ndị nhazị ntuliaka na-eji eletrọnịk na-eziga mpụtara na
ntuliaka bido n’ebe a tụrụ vootu ruo n’ebe a ga-akpọpụta ya.
Ha na-achọ ntaramahụhụ dịala ndị ụlọọrụ nhazị
ntuliaka ọbụla kesere akwụkwọ vootu na akwụkwọ ndekọ mpụtara nke e binyeghị aka
n’ime maọbụ nke ekwesighị. Onye ahụ ga-eje nga opekatampe out afọ maọbụ kwụọ ụgwọ
otu ijeri naịra maọbụ mee ha abụọ.
Nkọwa foto, Onyeisi ụlọọrụ ahụ kọwaara na ụgwọ ọkụ gbagoro elụ bụ n’ihi ọkụ a na-enye ndị nọ na tarifu band A.
Ndị ngagharịiwe emechiela ụlọọrụ Enugu
Electricity Distribution Company (EEDC) dị na okporoụzọ Bende n'isi obodo Ụmụahịa maka oke ụgwọ ọkụ latrịk ndị mmadụ na-akwụ na steeti ahụ.
E kwuru na iwe ndị ngagharịiwe ahụ bụ maka na ụgwọ ọkụ ụlọọrụ ahụ na-enye ha ugbua dị
elu n’agbanyeghị ụfọdụ mgbenwe ụlọọrụ EEDC mere.
Onyeisi ụlọọrụ ahụ n’Abịa Steeti bụ Festus
Iwuala kwere ndị na-eme ngagharịiwe ahụ nkwa na ha ga-etinye anya na mkpesa ha
wetere ya.
Ọ gara n'ihu kwuo na ndị na-eme ngagharịiwe ahụ bụ
ndị mere ngagharịiwe afọ gara aga maka ha anaghị enwe ọkụ latrik etu ha kwesịrị
mana ugbua e bidoro inye ha ọkụ ọfụma, ha na eti mkpu na ụgwọ ọkụ na-arị elu.
Iwuala kọwaara na ụgwọ ọkụ gbagoro elụ bụ n’ihi
ọkụ a na-enye ndị nọ na tarifu band A.
Ebe foto si, Chidi Asonye
Nkọwa foto, Onyeisi ụlọọrụ ahụ kọwaara na ụgwọ ọkụ gbagoro elụ bụ n’ihi ọkụ a na-enye ndị nọ na tarifu band A.
Gọvanọ Enugwu Steeti apụọla na PDP ma banye APC
Ebe foto si, Peter Mbah/X
Nkọwa foto, O kwuru na mkpebi ya ịbanye APC bụ maka ịjikọ steeti ndị nọ n'ọwụwa anyanwụ na Gọọmenti Etiti ọnụ.
Gọvanọ Enugwu Steeti
agbaala otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị People's Democratic Party (PDP) arụkwaghịm ma banye otu pati All Progressives Congress (APC) nọ n'ọchịchị ugbua.
O kwupụtara nke a n'agbasa ozi o nyere ndị Enugwu ma kwuo na mkpebie ya ịbanye pati APC bụ iji jikọta steeti
ndị nọ na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa na Gọọmenti Etiti.
O kelere patị PDP maka
oghere na nkwado ha nyere ya kemgbe ọ batara pati ahụ.
Ndị so Mbah banye pati APC gụnyere ndị otu ọgbakọ omeiwu nke gọọmenti etiti, ndị otu ọgbakọ omeiwu steeti, ndị isi ọchịchị steeti, ndị isi ọchịchị obodo na ndị kansụl niile, ndị ndọrọndọrọ ọchịchị niile na ihe karịrị pasent iri asatọ nke ndị isi pati.
Ezinụlọ ndị Izrel eji eji nwụrụ anwụ ji iwe eche nlọghachi ozu ndị nke ha
Ebe foto si, Reuters
Nkọwa foto, Ndị Palestine laghachiri na Khan Younis ka ahapụchara ha n'okpuru nkwekọrịta nkwụsị agha
Odobeghị anya ihe ọzọ ga-eme na Gaza ugbua dịka ezinụlọ ndị
Izrel eji eji nwụrụ anwụ ji iwe na-eche nloghachi ozu ndị nke ha.
Nke a na-abịa dịka nkwekọrịta nkwụsị ọgụ kpalitere ntọhapụ ndị
Izrel mmadụ iri abụọ dị ndụ na ọtụtụ narị ndị mkpọrọ Palestine ma mee ka ha zute
ndị ezinụlọ ha.
Ka ọ dị ugbua, ezinụlọ ndị Izrel nwụrụ anwụ na-ekwupụtala n’iwe
na e nyefere ozu naanị mmadụ anọ n'oge mgbanwe ahụ n'ime mmadụ iri abụọ na asatọ
ndị nwụrụ anwụ.
Mana nkwekọrịta
nkwụsị ọgụ nke ndị mgbasa ozi Izrel wepụtara, na-egusi na e nwereike ndị Hamas
na ndị otu Palestine ndị ọzọ agaghị enwe ike ịchọta ebe ụfọdụ ozu nọ n’ime oge
e enyere ha.
Ka ndị a tọhapụrụ n'Izrel na-enwe nnyocha ahụike, ụlọọrụ
mgbasa ozi Izrel na-ekwu maka oke ahụhụ ha nwere nke gụnyere agụụ na mmekpa ahụ.
Na Gaza, ọtụtụ
n'ime narị ndị Palestine ndị Izrel tọhapụrụ n'enweghị ebubo n'oge agha ahụ,
na-ebo ebubo mmekpa ahụ na mmegbu; ụfọdụ ndị a na-atụ anya na ha ga-ezute ezinaụlọ
ha ka a chọpụtara na egbuola.
Ọzọ, Onyeisiala
mba Amerịka bụ Donald Trump na ndị isi mpaghara ahụ bịanyere aka n’akwụkwọ iji
kwado nkwekọrịta nkwụsị ọgụ Gaza ya - ọ laghachitela na Washington DC.
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump na ndị isi mpaghara Middle East bịanyere aka n’akwụkwọ iji kwado nkwekọrịta nkwụsị ọgụ Gaza ya
Onyeisiala mba Madagaska agbaala ọsọ ga zoo na-eti mkpu mgbanwe ọchịchị
Ebe foto si, Reuters
Nkọwa foto, Andry Rajoelina
Onyeisiala mba Madagaska bụ Andry Rajoelina agbagaala “ebe ọ
ga-enwe nchekwa” ka a wachara igbu ya dịka e bidoro ngagharịiwe na mba ahụ ma
na-akpọ oku ka ọ rituo n’ọkwa.
N’ozi Rajoelina ji akara ya na Facebook gbasaa ka ọ sị na “ndịagha na ndị
ndọrọndọrọ ọchịchị gbara mbọ ka ha gbuo m”.
O gara n’ihu kwuo na ọ bụ eziokwu na ya ji ụgbọelu ndịagha
mba Fransị gbapụ na mba ya, mana o kwughị ebe ọ gbagala.
Nsogbu Rajoelina bidoro dịka ụmụ ntorobịa kpọrọ onwe ha “Gen-Z
Mada” bidoro ime ngagharịiwe na-akpọ oku ka ọ pụọ n’ọchịchị.
Ndị be anyị, ụnụ asaala chi!
Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Tuzde 14 Ọktoba 2025.
Anyị na-asị ka ihe ọbụla anyị tinyere aka n’ụbọchị taa gaa nke
ọma.
Biko, gaa n’ihu sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ
ihe na-eme na Naịjirịa nakwa ụwa niile.
Sonyekwara anyị n'akara soshal midịa anyị dị iche iche nke gụnyere WhatsApp Chanelụ, Facebook na Instagram maka
akụkọ ndị ọzọ dị n'ụdị onyonyoo na foto.
Otu jikọtara ndị nkuzi mahadum ọha na Naịjirịa bụ Academic
Staff Union of Universities (ASUU) amalitela ịgba abụbụọrụ ịdọ aka na ntị izuụka
abụọ site n’ụbọchị Mọnde 13 Ọktoba 2025.
ASUU kwuru na nke a bụ maka na gọọmentị emezughị ihe ha chọrọ
kemgbe ogologo oge.
Nke a na-abịa dịka o mere naanị izu ole na ole mahadum
maliteghachiri maka oge agụmakwụkwọ ọhụrụ.
Onyeisi otu ASUU bụ Ọkankụzi Chris Piwuna, kwuru na nke a abụrụla
ihe a na-apụghị izere ezere n’ihi na dịka o si kwuo, gọọmentị emeghị ihe ọbụla
maka ya.
"O nweghị ihe zuru ezu a pụrụ iji kwụsị abụbụọrụ ịdọ
aka na ntị izu abụọ bụ nke ga-ejedebe na mkpụrụ ụbọchị iri na anọ e nyere bụ 27
Ọktoba 2025.
N'ihi ya, ngalaba ụlọọrụ ASUU niile ga-ewepụ aka n’ọrụ site
n’etiti abalị Mọnde 13 Ọktoba 2025,"
N’aka nke ọzọ, Mịnịstrị na-ahụ maka agụmaakwụkwọ ekwuola na
abụbụọrụ ahụ abaghị uru n’ihi na gọọmenti emezuola ọchịchọ ASUU niile.
Minista na-ahụ maka agụmaakwụkwọ na Naịjirịa bụ Tunji Alausa
kwupụtara nke a n’ụbọchị Mọnde 13 Ọktoba 2025 oge ya na ndị ntaakụkọ na-akparịta
ụka n’ụlọmgbasaozi Channels TV.
N’oge gara aga ka mịnịstrị ahụ kwuru na ‘onye rụọ ya erie’ ka
bụ iwu na-achịkọta usoro ndị ọrụ Naịjirịa.
Mali amanyela $10,000 maka ụmụafọ Amerịka na-achọ inweta akwụkwọ njem visa
Ebe foto si, Tribune News Service via Getty Images
Nkọwa foto, Mba Amerịka ewepụtala usoro siri ike maka ndị mbata na ọpụpụ kemgbe Onyeisiala Donald Trump malitere ọrụ na Jenụwarị
Mba Mali ekwuola na ụmụafọ mba Amerịka na-achọ akwụkwọ njem visa mba ha ga-akwụ ụgwọ nkwụghachi
ruru $10,000 (£7,500) maka inwete visa azụmahịa na njem nlegharịanya, n'ihi ihe
yiri nke ahụ ọchịchị Onyeisiala Trump nyere iwu ịmanye n’isi ụmụafọ Mali.
Na nzaghachi, ụlọọrụ nnọchianya mba Amerịka dị na Mali kwuru
na Fraịde na ha manyere ego ahụ iji mee ka Washington sikwuo ike " n’ọrụ chekwaa
okeala Amerịka na ọnọdụ nchekwa mba Amerịka".
Cheta na mịnịstrị na-ahụ maka mba ofesi nke Mali kwuru na Sọnde
na ejikọrọ aka tinye ụgwọ nkwụghachi
ahụ, ma kpebie "ịwepụta usoro visa yiri ya" maka ụmụafọ Amerịka.
Mgbanwe usoro inwete visa a na-abịa n'agbanyeghị mbọ iji
mezie ọnọdụ mmekọrịta mba ụwa dị n'etiti mba abụọ ahụ.
Mmadụ asaa mbụ a tọhapụrụ na Gaza alọghachitala n'Izrel - IDF
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Anyammiri na ọṅụ dị na Tel Aviv ka ntọhapụ ndị eji eji malitere
Ndị IDF ekwuola na a tọhapụla ndị Izrel mmadụ asaa eji eji na
Gaza dịka ha na ndịagha Izrel nọ ugbua.
E kwuru na ndị mmadụ tiri oke mkpu ọṅụ n’ogige ‘Hostages
Square’ ka akụkọ banyere ntọhapụ ahụ pụtara ihe dịka Alice Cuddy si Tel Aviv siri
kwuo.
Ka ọ dị ugbua, Hamas ewepụtala ndekọ nke ndị mmadụ iri abụọ
dị ndụ a ga-atọhapụ taa.
Cheta na e jidere ha na Gaza kemgbe ndị Hamas wakporo Izrel
na 7 Ọktọba n’afọ 2023.
Iji mgbanwee ndị eji eji, Izrel ga-atọhapụ ndị mkpọrọ
Palestine mmadụ narị abụọ na iri ise na ihe karịrị otu puku na narị assa ndị
eji eji.
E kwuru na a na-atụ anya onyeisiala mba Amerịka bụ Donald
Trump na mba Izrel n’oge na-adịghị anya – tupu ọ gawa mba Ijipt isonye n’ọgbakọ
ndị isi mba ụwa mmadụ iri abụọ ga-esonye na ya.
Ka ọ na-aga na mpaghara ahụ, Onyeisiala Trump kwupụtara na
"agha agwụla" na Gaza - ọ bụ ezie na a ka ga-enwe mkparịtaụka banyere
nkwekọrịta Izrel na Hamas.
Igbo ndị ọma, ụtụtụ ọma ụnụ!
Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Mọnde 13 Ọktoba 2025.
Ekpere anyị bụ na izu a ga-amara anyị niile mma.
Gaa n’ihu sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ ihe
na-eme na Naịjirịa nakwa ụwa niile.
Sonyekwara anyị n'akara soshal midịa anyị dị iche iche nke gụnyere WhatsApp Chanelụ, Facebook na Instagram maka
akụkọ ndị ọzọ dị n'ụdị onyonyoo na foto.
Udo dịrị ụnụ!
A na-achọ iweghara ọchịchị n'ụzọ iwu na-akwadoghị na mba Madagaska - Andry Rajoelina
Ebe foto si, AFP via Getty Images
Nkọwa foto, Ndịagha Madagaska
Ụlọọrụ
Onyeisiala mba Madagaska bụ Andry Rajoelina ekwuola na e nwere ndị na-achọ
iweghara ọchịchị mba ahụ n’ụzọ iwu obodo na-akwadoghị maọbụ n’aka ike.
Ka ọ na-ekwucha
ya ka ngalaba ụlọọrụ ndịagha na mba Madagaska a na-akpọ CAPSAT mara ọkwa kwuo
na ha enwerela ikike nhazị ndịagha na mba ahụ ma n’elu ala, na ikuku ma na
mmiri.
CAPSAT bụ
ngalaba ụlọọrụ ndịagha so nyereaka mee ka Rajoelina banye n’ọchịchị n’afọ 2009
n’oge ha nwere ọgbaaghara ndọrọndọrọ ọchịchị Malagasy
Ngagharịiwe
maka oke agụụ, enweghị ọrụ, mpụ na nrụrụaka nakwa etu ọnụahịa ihe nri si arị
elu bidoro na Madagaska na Sepụtemba 25.
Dịka Rajoelina
na-akatọ ihe ndị CAPSAT mere ma kọwaa ya dịka atụmatụ itisa mba ahụ, ndị CAPSAT
kwuru na ha ewepụtara Onyeisi ọrụ ọhụrụ aha ya bụ ọchịagha Demosthene Pikulas.
Ndị na-eme ngagharịiwe gwara BBC na ha ga-akwụsị naanị mgbe Onyeisiala Rajoelina gbara arụkwaghịm ma rituo n'ọkwa.