Ndị uweojii Tanzania adọọla ndị obodo aka na ntị maka ikesa okwu ụgha na soshal mịdịa

Ebe foto si, Reuters
Ndị uweojii na Tanzania adọọla ndị amaala ha aka na ntị maka iji soshịal midia na-ekesasị onyoonyo maọbụ ozi na-abụghị eziokwu nke nwere ike itinye obodo na nsogbu.
Ịdọ aka na ntị a na-abịa dịka ihe oyoonyo na-efegharị na sohịal midia na-egosi ebe otu onyeagha nọ na-akatọ gọọmenti dịka Tanzania na-akwado ime ntuliaka n'izu ụka atọ na-abịa.
Onyeagha ahụ nke kpọrọ onwe ya ‘Capt Tesha” na-ebo gọọmenti ebubo nrụrụ aka, imebi ikike mmadụ nakwa ihe ndị ọzọ.
Ọ gara n’ihu gwaa onyeisi ndịagha Jacob Mkunda ka o mee ihe gbasara ihe ndị ahụ ma kpọọ ndị amaala Tanzania ka ha mee ngagharịiwe na ndị nchekwa nọ ha na-azụ.
Na nzaghachị oyoonyo ahụ, onu na-ekwuchitere ndịagha Tanzania Bernard Masala Mlunga kwuru na onye mere ihe oyoonyo ahụ abụghị ndị otu ha.
Ọ gwara ndị mmadụ ka ha kpachara anya ha etu ha si ekwu okwu ma hapụ ịdọba ndịagha n’ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị.
















