Ụlọikpe amaala Donald Trump ikpe n'ebubo 34 niile e boro ya maka ime mpụ

Akụkọ dị mkpa na Naijiria na mbaụwa n'ọnwa Mee, afọ 2024.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uche Akolisa, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu

  1. Aka akparala nwaanyị kụtọrọ nwaodibo ya n'Anambra steeti

    Chidiebere Otenyi, gbara afọ 19 sị na nne ya ukwu budara ya na Pramarị 3

    Ebe foto si, Anambra State Ministry of Women Affairs

    A nwuchiela otu nwaanyị maka ịtụtọ nwa ya na ya bi n' Ezinifite dị n'Okpuru Ọchịchị Anambara steeti.

    Ministry na-ahụ maka ụmụnwaanyị gbara ama na ha nwuchiri Martha Umenweke, gbara afọ 60 man nyefee ya n'aka ndị uweojii maka ịkụtọrị Chidiebere Otenyi, gbara afọ 19 ya na ya bi.

    Ọnụ na-ekwuru Ministry ahụ bụ Chidimma Ikeanyionwu, bụ onye mere ka a mata nke a n'ozi o wepụtara ụbọchị Fraide kwuru na ọ bụ mgbama gbara ha ama e ji nwuchie nwaanyị ahụ ma zọpụta nwaodibo ya.

    Nwata ahụ, onye kwuru na nne ya ukwu na-etikarị ya ihe, kwuru sị, o boro ya ohi izu puku naira iri abụọ na ise(N25,000) nkmana ya ezughị ego ya ọbụla.

    Nwata ahụ bụ onye na-agụ Pramarị 3 kọwara na ọ bụ nne ya ukwu budara ya na Klass ka ọ kpọtara ya otu afọ na ụma gara aga.

  2. Di m na-anyụnye m mamịrị n' ọnụ - Nwata nwaanyị e kechuru di

    Uzichukwu Okoli na Chinudu nweke

    Ebe foto si, Anambra State Ministry of Women Affairs

    chiri nna na di Chioma Okoli Gọọmenti Anambra steeti wuchiri nna Chioma Okoli bụ Uzochukwu Okoli na dị ya bụ Chinedu Nweke maka mmegbu ha megburu Chioma.

    Gọọmentị Anambra steeti mere ka amata nke a na ozi ha nweputara n’ịhụ akwụkwọ nke Chidinma Ikeanyionwu deputara.

    Akwukwo ozi ahu kwuru na “Awuchiri Uzochukwu Okoli na oge nwa ya nwanyi bụ Chịoma Okoli biara mee mkpesa”.

    Kọmịshịọna na-ahụ maka ịhe metutara ụmụnwanyị na ọdịmma ndị mmadu na Anambara steeti bụ Ify Obinabogwara BBC Igbo na ọ bụ ezịokwu na Chioma Okoli wetara ha mkpesa.

    Ọ gara n'ihu sị,“N'abali abuo gara aga ka anyị gara nwuchie nna Chioma Okoli bụ Uzichukwu Okoli na dị ya bụ Chinudu nweke.”.

    A na-atu anya na okwu ha ga akpu na ụlọịkpe na oge na adighi anya.

  3. Egbe bere ugo bere

    Nke si ibe ya ebela, ka nku kwaa yaa!!

  4. Workers Day: Anyị ga-akwụ ndịọrụ ihe ọbụla Gọọọmentị Etiti kpebiri dịka ụgwọọnwa opekatampe- Otti

    Alex Otti, gọvanọ Abia steeti

    Ebe foto si, Abia State Govt

    Aka na-achị Abia steeti bụ Alex Otti ekwuola na ọdịmma ndị ọrụ Oyibo steeti ahu bụihe dị gọọmentị steeti ahụ oke mkpa.

    Otti kwuru nke a n’amaegwuregwu Umuahia Township Statdium’ maka ebe e mere emume nncheta ndịọrụ.

    N’ozi ya,ọ sịrị na Abia steeti ga-abụ steeti ga-ebu ụzọkwụọụgwọọnwa opekatampe nke Gọọmentị Etiti ga-ama amapụta.

    “ Ihe ị ga-ama taa bụ na ọdịmma bndịọrụ ga-abụ®ụ anyị isiokwu.”

    Ndịọrụ Abia steeti

    Ebe foto si, Abia State Govt

    Ndị lara ezumike nka n'Abia steeti

    Ebe foto si, Abia State Govt

  5. Workers' Day: E tinyerela ndịọrụ Oyibo Ebonyi Steeti 10,000 n'ego ụgwọọnwa

    Ndị ọrụ Ebonyi n'ụbọchị ncheta ndịọrụ na steeti ahụ

    Gọvanọ Ebonyi steeti bụ Francis Nwifuru enyela iwu ka a e tinyere ndị ọrụ Bekee na steeti ahụ puku iri naira n'ụgwọ ọnwa ha ma kwee nkwa iwe ndị nkuzi 1000 n'ọrụ.

    Nwifuru kwuru nke a n'amaegwuru 'Pa--Ngele Oruta Township stadium' dị n' Abakaliki, isiobodo steeti ahu n'ụbọchị Wenezde, abalị mbụ nke ọnwa Mee afọ 2024 dịka a na-eme emume ncheta ndịọrụ.

    Ndị ọrụ na Ebonyi steeti nke onyeisi ndị ọrụ na steeti ahụ bụ Ọkammụta Ogugua Egwu rịọburu gọọmentị steeti ahu ka e nye ndị nkuzi ruru ọnụọgụgụ 20,000 ọrụ aka.

    Ọgugua gara n’ihu rịọ ka ka gọọmenti Ebonyi tinye anya na ọnọdụ ndị ọrụ na steeti ahụ.

    Ndịọrụ Ebonyi n'ụbọchị ncheta ndịọrụ na steeti ahụ
    Okolotọ Ndị ọrụ okpuru ọchịchị Ebonyi
    Ndị  ntaakụkọ n'Ebonyi Steeti
  6. New minimum wage: Otu jịkọtara ndị ọrụ enyela gọọmenti Naịjirịa ruo Mee 31

    New minimum wage: Otu jịkọtara ndị ọrụ enyela gọọmenti Naịjirịa ruo Mee 31

    Ebe foto si, Nigeria Labour Congress/Instagram

    Otu jikọtara ndị ọrụ Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress (NLC) na otu jikọtara ndị na-atụ mgbereahịa bụ Trade Union Congress (TUC) eyiela egwu ịbanye mfanyeakanụụkwụ ya bụrụ ma ọchịchị onyeisiala Bola Tinubu emeghị ngwangwa kwadoo ụgwọọnwa opekatampe bụ naịra 615,000 tupu ngwụcha ọnwa Mee.

    Otu ndị ọrụ nyere gọọmenti etiti ruo n’abalị 31 nke ọnwa Mee iji wepụtara ndị ọrụ ụgwọọnwa opekatampe ọhụrụ bara uru.

    Ha mere ka amata nke a n’oge emume ụbọchị ndị ọrụ a haziri n’ogige Eagle Square dị n’Abuja n’ụbọchị Wenezde 1 Mee 2024.

    Onyeisioche NLC bụ Joe Ajaero na onyeisioche TUC bụ Festus Osifo kwuru na ụgwọọnwa opekatampe a na-akwụ ndị ọrụ ugbua bụ naịra 30,000 enweghị uru ọbụla ọ na-abara ha n’ihi ọnọdụ akụnaụba ọjọọ na ọnụ ngwaahịa na-arị elu tinyere ụgwọ ọkụ latrik na ego ụgbọ e buliri elu.

    Ajaero kwuru na “otu NLC na TUC ekwuola ya n’eze wara awa na ọ bụrụ ma a gaa n’ihu na mkparịtaụka maka ụgwọọnwa opekatampe ọhụrụ ruo na ngwụcha ọnwa Mee, anyị agaghị ejide n’aka na ndị ọrụ ga-aga n’ihu na-eme ihe n’ezi usoro.”

  7. Peter Obi na-akpalite mmụọ ndị Igbo imegide ọchịchị Tinubu - Umahi

    Peter Obi na Dave Umahi

    Ebe foto si, Getty Images/Dave Umahi

    Minista na-ahụ maka ọrụ na Naijiria bụ Dave Umahi ekwuola na Peter Obi zọburu ọkwa onyeisiala Naịjirịa na-akpaso ndị Igbo imegide ọchịchị Tinubu.

    O kwuru nke a na nzukọ e nwere iji kwụ ndị nwere ụlọahịa akwaturu maka okporo ụzọ Lagos-Calabar ụgwọ itiakanobi.

    N'ime ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia, Umahi kwuru na mgbe Obi na onwe ya bụ Gọvanọ, na ọ kwaturu ụfọdụ ụlọahịa iji rụ ụzọ nakwa ngalaba dị icheiche.

    "Peter Obi mgbe ọ bụ Gọvanọ Anambra Steeti kwuru na o nwee ụlọ ọbụla nọchiri ya ụzọ na ọ ga-akwatu ya n'akwụghị ụgwọ itiakanobi"

    "Mana maka obi mmadụ ọchịchị Tinubu nwere anyị na-enye ma ndị enweghị ikike ịnọ n'akụkụ okporo ụzọ ọhụrụ ego itiakanobi Ị katọọ mmadụ, ikpe a maa gị, ya bụ ihe ọ na-eme ugbua.

    E chekwa m na ọ na-akpalite mmụọ ọtụtụ ndị ọwụwa anyanwụ nwereike itinye ha na nsogbu maka na ha aghọtaghị, mana ya (bụ Obi) agaghị aga zọpụta ha" ka o kwuru.

  8. Nwuchie ndị niile jụrụ ile mmanụ ụgbọala - Ndị omeiwu

    Ndi kwu n'ahiri azu mmanu ugboala

    Ndị ụlọomeiwu na-enyocha ọnọdụ ụkọ mmanụ ụgbọala dị ugbua agwala ndị ọrụ nchekwa ha nwuchie ndị niile jụrụ ile ya bụ mmanụ.

    N'ozi nke ndị isi oche Kọmitii abụọ na-ahụ maka mmanụ agbịdị na Naijiria bụ Ikenga Ugochinyere na Henry Okojie wepụtara ha si na ha amalitela nyocha na mkparịtauka n'etiti ha na ndị na-ahazi mmanụ ụgbọala na Naijiria

    Ha kwuru na ha chọpụtara na mmanụ ụgbọala ahụ dị n'uju mana ụfọdụ ndị na-ere ya bụ mmanụ ma ụma dobeya iji mee ka ọnụ ahịa ya rịa elu.

    N'ozi ha wepụtara ha kwuru si "anyị na ndị niile ihe a metụtara nọ na mkparịta ụka ugbua iji ghọta ihe na-ebute ahịrị ebe niile.

    "Nyocha anyị gosiri na e nwere mmanụ ụgbọala ruru lita 1.5b nwereike iru abalị iri atọ.

    Ọ bụ ihe mwute ịchọpụta na ọ bụ nsogbu njem bụ ihe mere na mmanụ ụgbọala dị adị anaghị e si n'ụgbọ mmiri bụ ya eru ala."

    Ha kwuru na ụkọ mmanụ ụgbọala ga-ebi n'abalị ole ma ole na-abia.

    Cheta na ngalaba mmanụ agbịdị na Naịjirịa bụ NNPC ekwubuola na ha nwezuru mmanụ ụgbọala oké ga-ezu mmadụ niile na mbido ụkọ mmanụ agbịdị na mbido izu ụka a.

  9. Lee ka 35% gọọmentị etiti tinyere n’ụgwọọnwa si metụta onye pụtara mahadum, bịdọ ọrụ ugbua

    Ndị ọrụ na-eme mkpesa na Naịjirịa

    Ka gọmentị etịtị Naịjirịa kwuru na ha ga eytinye ego na ụgwọọwa opekatampe nke ndị ọrụ na Naịjirịa, onye nta akụkọ anyị mere nyocha maka otu o sị metuta ndị bidoro ọlụ na ogoogo asatọ na ụrọ ọlụ gọọmentị etịtị.

    Gọmentị etịtị kwuru na ha ga agbakụnye bịdọ na pasentị 25 rụọ na pasentị 35 na elu ụgwọọnwa opekatampe ndị ọrụ dịka Emmanuel Njoku bụ onyeisi ụrọọlụ na ahụ ya sị kwuo.

    Ịhe a ga akwụ onye pụtara na mahadum nwere bido oru ụgbụa

    Ọ bụrụ na mmadu gara mahadum nwere nweta ọrụ na ogooga asatọ na ụlọọrụ gọọmentị, ọkacha na ngaraba mbasaozi, ịhe a ga akwụ ya bụ N82,000.

    Onye na achọghị ka akpo aha ya gwara anyị nke a ma kwuo na ọbụrụ na ịtịnye ego erere ndị ọzọ naọ ga abụ ịhe dị ka N96,000.

    Nke a pụtara na ọ bụrụ na ị gbakwụnyere ego ahụ bụ pasentị 35 na elu N82,000, ịhe a ga akwụ onye ahụ bidoro ọrụ ọhụrụ bụ N110,700.

    Ịhe ndị ọrụ na ekwu maka ego gọmentị etịtị tinyere ha

    Ndị ọrụ a gbara ajuju ọnụ taata bụ ụbọchị ndị ọru kwuru na ịtịnye 25 ma ọ bụ 35 pasentị na elu ụgwọọnwa opekatampe bụ ịhe mgbawa obi maka ọnọdụ akanuba Naịjirịa.

    Na okwu Jacob Ogodo “Ọbụghị ịhe ndị ọlụ na atụanya. Ịlee anya ọhụma ị ga ahụ na onweghị ịhe nwereịsị dị na ego ahụ e tinyere”.

    Onyeozo bụ Nkechinyere Okonye kenere onyesiala Naịjirịa maka ịtinye ego ahụ ma kwuo na operempe.

    Lee ka 35% gọọmentị etiti tinyere n’ụgwọọnwa si metụta onye pụtara mahadum, bịdọ ọrụ ugbua

    Ebe foto si, Pius Utomi Ekpei

    “ọbụrụ na ịle anya ịhe gbasara ụgwọ ụlọ, ụgwọ akwụkwọ, ọnụ ahịa ịhe nrị na ịhe ndị ọzọ dị ịcheịche ị ga ahụ na egọ ahụ e tin yere adịghị mma”.

    Ọ gara n’ihu kwụọ “ọbụrụ na gọọmentị hazịe ọnụ ahịa a na ere ịhe nrị na ịhe dị icheịche, mee ka ndị ọrụ nwe ịke ịzụta ya na ọnụ ala, nke ahụ ga amamma”.

    Kedu ihe ụgwọọnwa opekatampe N110,700 ga emere onye ọrụ?

    I lee anya ka ọnọdụ akụnaụba si dị ugbua na Naịjirịa ọtụtụ ndị mmadụ na-ajụ kedụ ihe ụgwọọnwa opekatampe ga-emere onye ọrụ.

    Nnyocha anyị mere n’ime ahịa na-egosi na akpa osikapa ruru N70,000 naịra, otu lita mmanụ ụgbọala nọ n’etiti N800 na N1000 maka otu lita; etu a ka ihe dị icheiche sị dị ọnụ elu n’ime ahịa.

    Ọ bụrụ na ịtụlee ịhe dị icheiche onye ọrụ ga-eji ego mee dịka ụgwọ ụlọ, ụgwọ akwụkwọ, nri, ịzụ akwa, na ihe ndị ọzọ di icheiche, ị ga-amara ka obi ndị ọrụ dị ugbua.

    Ọkammụta n’ihe gbasara akụnaụba na onye nkuzi na Mahadum na-ahụ maka ọrụ ugbo n'Ohaji Egbema, Imo steeti bụ Desmond Echetakwuru na ego ahụ gọọmentị etịtị tinyere agaghị agbanwe ọnọdụ ndị ọrụ.

    “na obodo dị mma, ọ bụrụ na ịhe rịa elu, gọọmentị na ejị pasentị ihe jị nwere dị ngalaọnụ nwere tinyere ndị ọrụ ego na ụgwọọnwa opekatampe ha. Nke a ga enyere ndị ọrụ aka ka ha nwee ịke ị na azụta ịhe ahụ ha na azụtabụ na mbụ”.

    “Mana ọbụrụ na ị jịghị pasentị ịhe jị rịa-elu nweregbakwụnyere ndị ọlụ ego na ụgwọọnwa ha, ịhe ọkpụtara bụ na ndị ọrụ ga anọ n’ịhe ụkọ”.

    Ọ kwuru na ịle anya, gọmentị ejịghị ka ịhe sị rịaelu nwere tinyere ndị ọlụ ego pasentị 25 ma ọ bụ 35. Nke bụ ezịokwu bu na ndị ọrụ nwere ego etinyere ha mana ụrụ ego ahụ bara enweghị-ịsị na ọbụrụ na ịtụlee ịhe ọ ga azụta na ahịa.

  10. Gọọmenti Naịjirịa ejila 35% bulie ụgwọọnwa ndị ọrụ; e ji ebumnoobi ọjọọ mee ya - NLC

    Ndị ọrụ na-akpọ oku maka ezi ọnọdụ ọrụ

    Gọọmenti Naịjirịa akwadoola mbuli ụgwọọnwa ndị ọrụ nọ n’usoro ‘consolidated salary structure’.

    E kwupụtara nke a n’abalị Tuzde 30 Eprel 2024.

    Dịka gọọmenti siri kwuo, a ga-eji 25% na 35% bulie ụgwọọnwa ndị ọrụ nọ n’usoro ‘consolidated salary structure’.

    Ka osiladị, otu jikọtara ndị ọrụ Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress (NLC) ekwuola na 35% agbakwunyere n’ụgwọọnwa ndị ọrụ bụ nke e ji ebumnoobi ọjọọ mee.

    Onyeisioche NLC bụ Joe Ajaero kwuru na otu ndị ọrụ Naịjirịa na-eche ka gọọmenti nye nzaghachi n’atụmatụ ha wepụtara banyere ụgwọọnwa opekatampe ndị ọrụ.

    O kwuru na NLC ga-azaghachi gọọmenti banyere 35% e ji bulie ụgwọọnwa n’oge ya na ngalaba otu ya niile nwechara mkparịtaụka.

    Cheta na NLC na-akpọ oku ka gọọmenti bulie ụgwọọnwa opekatampe ndị ọrụ ruo naịra 615,000.

  11. Ihe mberede okporoụzọ ataala isi mmadụ 17 n’ Enugwu steeti

    Ụgbọala nwere ihe mberede

    Ebe foto si, NPF

    Ihe mberede okporoụzọ ataala isi mmadụ 17 n' Ekwegbe n' ụzọ sị Opi gawa Nsukka dị n’ịme Enugwu Steeti.

    Ụmụnwoke iri na anọ na ụmunwaanyị abụọ ka a hụrụ ozu ha ma ọkụ gbapịara ihu ha nke na amaghazị ndị ha bụ.

    N' akwụkwọ ozi nke ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Enugwu steeti bụ Daniel Ndukwe weputara, o kwuru na ịhe mberede ahụ metutara ụgbọala Toyota Hummer bọs nwere akara Bauchi Steeti DAS 215 XA e dere 'Masha Allah' na ahụ ya.

    Ọ sị na ụgbọala ahụ gbapuru n' okporoụzọ were gaa kurie onwe ya na mgbidi ụlọakwụkwọ mahadum Maduka dị na akụkụ ụzọ.

    “E bugara ozu ndị nwuru anwụ na ụlọọgwụ ebe ndị dọkịnta kwuru na ha anwụọla”.

    “Mana mmadu abụọ ka a zọpụtara na ndụ were buga haa ụlọọgwụ.”

    Mana otu n'ime ndị ahụ ebugara n'ụlọọgwụ nwụrụ n' ụtụtụ Wenezde, Mee 1, 2024, dịka onyeisi ndị na-ahụ maka nchekwa okporoụzọ(FRSC) ngalaba nke Enugu bụ Adeyemi Sokunbi si kwuo.

    Sokunbo sịrị, “Dọkịnta na-agwọ mmadu abụọ bụ ndị ahụ ọkụ gbara mere ka anyị mara na otu onye n’ịme ha nwuru n' ụtụtụ taata."

    " Mana otu onye nke ọzọ ka dị ndụ ma na-enweta onwe ya.”

    N' oge Kọmishọna ndị uweojii na Enugwu bụ Kanayo Uzuegbu gara n'ebe mkpamkpa ahụ kpara kwuru na “a mabeghị ebe ụgbọala ahụ sị na ebe ha na-aga tụpụ ịhe mberede ahụ eme mana ihe ha bụ na ụgbọala dịka ihe nri.”

    O tiri ezinaụlọ ndị o metutara aka n’ọbị ma kpọọ oku ka ọha na eze bịa mara na o nwere onye ha maara na ndị nwuru anwu.

    Adeyemi kpọrọ oku ka ndị mmadu benata njem okporoụzọ na abalị ma dụọ ndị ọkpọụgbọala ndumọdụ ka ha fịee asaa na anya na oge ha na akpọ ụgbọala.

    Ụgbọala

    Ebe foto si, NPF

  12. Ọnwa Mee, ọnwa ngozi

    Ọnwa Mee ga-abụrụ gị ọnwa ngọzị!

    Isee!

    Ọkọlọtọ ndịọrụ Ebonyi Steeti