Ụlọikpe amaala Donald Trump ikpe n'ebubo 34 niile e boro ya maka ime mpụ

Akụkọ dị mkpa na Naijiria na mbaụwa n'ọnwa Mee, afọ 2024.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uche Akolisa, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu

  1. Papua New Guinea: Ihe karịrị mmadụ 2,000 tọrọ n'ime ala n'ihi mbuze

    Ọnụọgụgụ ndị bi n'obodo ahụ ruru 3800

    Ebe foto si, Reuters

    Gọọmentị mba Papu New Guinea na-ekwu na ihe karịrị mmadụ 2000 ka mbuze lili na ndụ na mpaghara Enga dị ebe ahụ

    Gọvanọ Enga bụ Peter Ipatas gwara AFP n’obodo ọ metutara rụrụ ọbọdọ isii, ma kọwaa ya dịka ihe na agba anya mmịrị.

    Ndị Red Cross Socielty n’Papau New Guinea kwuru na ndị ọrụ gbatagbata ezigara ebe mkpamkpa ahụ kpara gunyere ndị uweoji, ndị ọrụ ebere na ndị ọzọ.

    N'ụbọchị Frịde, ka Praịm mịnịsta ndị Papua New Guinean bụ James Marape kwụrụ ha a na-agba mbọ iweputa ozu “ndị tọrọ n’ime ala na ịdọzịharị ụlọ mebiriemebi”.

    Serhan Aktoprak na arụrụ ndị UN ọrụ kwụrụ na mbuze ahụ na emetuta ndị ọrụ gbatagbata ịrụ ihe kwesiri ịrụ maka na ha na atụ ụjọ na ọ ga eme ọzọ.

    UN kwukwara na ndị a na-achọ achọ nwereike iru 670 dịka ndị bi ebe ahụ tupu mberede ahụ e mee ruru mmadụ 3800.

    Ihe bụ nsogbu ichọpụta na igwuputa ndị tọrọ n'ime ala bụ enweghi ngwa zuru oke dịka a na-eche na ndị mmadụ ka nọ n'ime ala ruru 32feet.

  2. Onye ọzọ awụọla n’ụlọekpere ndị alakụba dara na Legos

    A na-egwu ala n'ebe ọadachi ahụ mere

    Ebe foto si, LASEMA

    Ndi ọlụ gbatagbata a kpọrọ Lagos State Emergency Management Agency (Lasema) kwuru na onye ọzọ anwụọla n'ọdachi mere n'ụlọkpere ndị alakuba ụnyaahụ.

    Cheta na ụlọ ahụ adgidere ụfọdụ mmadụ gụnyere ụmụaka ma merụọ ndị ọzọ ahụ na Papa Ajao n’ime Mushin dị na steeti ahụ.

    Ndị Lasema mere ka a mata nke a n’akwụkwọ ọzị ha weputara maka etu ọnọdụ sị dị n’ịlọ ahụ dara ada nwere na ekwu na onye ọzọ anwụọla nke mere mmadụ atọ ụgbụọ nwụrụ maka ọdachị ahụ.

    Nke a na-abịa ka onye isi ndị Lasema bụ Olatunde Akinsanya gwachara ndị nta akụkọ na ọ bụ mmadụ abụọ bụ ihe nwụrụ, ebe mmadụ ise meruru ahụ.

    N'ozi ndị Lasema nweputara “n’ikpeazu, ọ bụ mmadụ atọ nwụrụ, ebe mmadu asaa meruru ahụ.

    Ọtụtụ na ndị ahụ meruru ahụ nọ na nnukwu ihe ụfụ”.

  3. Ụgbọoloko si Kaduna aga Abuja agbapụla n’okporoigwe

    Ụgbọoloko si Kaduna aga Abuja agbapụla n’okporoigwe

    Otu ụgbọoloko sitere Kaduna na-aga Abuja agbapụla n’okporoigwe na Jere dị na Kaduna dịka o ruru ihe dịka otu awa ọ malitere njem.

    Nke ahụ mere n’ụbọchị ụka Sọnde 26 Mee 2024 mgbe o jiiri ihe dịka nkeji ise gaa elekere asatọ nke ụtụtụ.

    Ụlọọrụ na-eme nnyocha banyere ihe ọghọm dị iche iche bụ Nigerian Safety Investigation Bureau (NSIB) kọwara nke a dịka eziokwu.

    Onyeisi na-ahụ maka mmekọrịta ọhanaeze n’ụlọọrụ NSIB bụ Bimbo Olawumi Oladeji kwupụtara nke a n’ozi o bipụtara n’akara ọbaozi ụlọọrụ ahụ n’ụbọchị Sọnde.

    Olawumi dere sị “ụlọọrụ NSIB maara banyere ụgbọoloko sitere Kaduna na-aga Abuja ma gbapụ n’okporoigwe na Jere dịka ha merela ọkara njem ha”.

    “E zipụla ndị ọrụ nnyocha gaa n’ebe ahụ ihe ọghọm ahụ mere,” ka Olawumi dere n’ọbaozi ụlọọrụ ya.

  4. Ndị Boko Haram atọrọla mmadụ 160 na Niger steeti

    Ndị Boko Haram atọrọla mmadụ 160 na Niger steeti

    Ebe foto si, AFP

    Ndị obodo Kuchi dị n’okpuruọchịchị Munya nke Naịja steeti enwetala onwe ha n’ọnọdụ anyammiri dịka ndị ojiegbe a na-enyo enyo na ha bụ ndị otu Boko Haram wakporo ha.

    Dịka onyeisioche okpuruọchịchị Munya bụ Aminu Na-jume siri gwa BBC, ọnọdụ ahụ emeela ka ndị bi n’obodo ahụ gbafuo.

    “Ọtụtụ mmadụ agbafuola, anyị ehiwela ogige ndị gbara ọsọ ndụ dị iche iche ugbua bụ ndị na-arụ ọrụ awa asatọ,” ka o kwuru.

    Ọ sịrị na ndị ekperima ahụ gburu mmadụ asatọ ma tọrọ otu narị na iri isii dịka ha tiwara ụlọahịa ndị mmadụ, zuru ihe oriri na ihe ndị ọzọ dị oke mkpa.

    Na-jume sịrị na mmadụ otu narị na iri isii ahụ a tọọrọ gụnyere ụmụnwoke, ụmụnwaanyị, ụmụaka, ndị agadị na onyeeze ndị Hausa obodo ahụ na-ejighị ahụ.

    O kwuru na ọnụọgụ ndị mwakpo ahụ, ikikere ha na ngwaọgụ ha ji gosiri na ha abụghị obere ndị ojiegbe.

    Ọ sịrị na ha ji ọkọlọtọ Boko Haram ma na-ekwukwa okwu ka ndị Boko Haram.

    Ndị obodo Kuchi rịọrọ Gọọmenti Naịjirịa na ndị ọrụ nchekwa ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka iji kwụsị mmekpaahụ ndị ojiegbe n’obodo ha.

  5. Ụmụaka ndị nwaanyị abụọ na-eto eto anwụọla dịka ụlọụka 'mosque' dara na Legọs steeti

    Ụmụaka ndị nwaanyị abụọ na-eto eto anwụọla dịka ụlọụka 'mosque' dara na Legọs steeti

    Ụlọokpukperechi ndị Alakụba adaala, kụgbuo ụmụaka ndị nwaanyị abụọ na-eto eto ma merụọ ndị ọzọ ahụ.

    Nke a mere n’ụbọchị Sonde 26 Mee 2024 na mpaghara Papa Ajao dị na Legọs steeti.

    Odeakwụkwọ ukwu nke ụlọọrụ gbatagbata Legọs steeti (LASEMA) bụ Dr Olufemi Damilola Oke-Osanyintolu kwupụtara nke a n’otu ozi o zipụrụ.

    Akụkọ anyị nwetara na-ekwu na ụlọ ahụ dara n’ihi nnukwu ụgbọala e ji arụ okporoụzọ gara suo ya na-amaghị ama.

    LASEMA kwuru na ekpere na-aga n’ihu n’oge ụlọokpukperechi ahụ dara.

    Onyeisi na-ahụ maka mmekọrịta ọhanaeze n’ụlọọrụ LASEMA gwara BBC na ha awuchiela n’ogbe ahụ ya bụ ụlọ dara maka ọrụ nnapụta.

    Akụkọ kwuru na ụlọokpukperechi ahụ dara n’oge ekpere ehihie.

  6. Otu onye anwụọla, ndị ọzọ emerụọ ahụ dịka ụlọụka ‘mosque’ dara na Lagos

    Ụlọokpukperechi ndị Alakụba adaala na Legọs steeti

    Ụlọokpukperechi ndị Alakụba adaala, kugbuo otu onye ma merụọ ndị ọzọ ahụ.

    Nke a mere n’ụbọchị Sonde 26 Mee 2024 na mpaghara Papa Ajao dị na Legọs steeti.

    Odeakwụkwọ ukwu nke ụlọọrụ gbatagbata Legọs steeti (LASEMA) bụ Dr Olufemi Damilola Oke-Osanyintolu kwupụtara nke a n’otu ozi o zipụrụ.

    Akụkọ anyị nwetara na-ekwu na ụlọ ahụ dara n’ihi nnukwu ụgbọala e ji arụ okporoụzọ gara suo ya na-amaghị ama.

    LASEMA kwuru na ekpere na-aga n’ihu n’oge ụlọokpukperechi ahụ dara.

    Onyeisi na-ahụ maka mmekọrịta ọhanaeze n’ụlọọrụ LASEMA gwara BBC na ha awuchiela n’ogbe ahụ ya bụ ụlọ dara maka ọrụ nnapụta.

    Akụkọ kwuru na ụlọokpukperechi ahụ dara n’oge ekpere ehihie.

    Otu onye anwụọla, ndị ọzọ emerụọ ahụ dịka ụlọụka ‘mosque’ dara na Lagos
  7. Burkina Faso ewerela afọ ise gbatịa oge ọchịchị ndịagha

    Onyeagha na-achị Burkina Faso bụ Kaptịn Ibrahim Traoré

    Ebe foto si, Reuters

    Ọchịchị ndịagha Burkina Faso amaala ọkwa na ha ga-eji afọ ise gbatịa oge ọchịchị ha.

    E kwupụtara nke a n’ụbọchị Satọde n’oge e nwechara nzukọ mkpọtụrụ mba ahụ n’isi obodo ya bụ Ouagadougou.

    Ụlọ mgbasaozi Burkina Faso mere ka anyị mata nke a.

    Onyeagha na-achị mba ahụ bụ Kaptịn Ibrahim Traoré ga-enwekwa ohere isoro zọọ ọkwa onyeisiala a ga-ahazi na ngwụcha afọ ise ahụ.

    Dịka o siri kwuo, nkwekọrịta ọhụrụ nke Kaptịn Traoré bịanyere aka na ya kwuru na oge nnyefe ọchịchị ahụ bụ ọnwa iri isii ga-amalite n’abalị abụọ nke ọnwa Julaị, afọ a.

    N’oge o weghaara ọchịchị ihe dịka afọ abụọ gara aga, Kaptịn Traoré kwere nkwa iweghachi ọchịchị ndị nkịtị n’abalị mbụ nke ọnwa Julaị, afọ a.

    Mana ka ọ dị ugbua, Burkina Faso esonyerela ndị agbataobi ya bụ Mali n’ịgbatikwu oge ọchịchị ndịagha.

    Burkina Faso nọ n’okpuru ọchịchị ndịagha kemgbe ọnwa Jenụwarị 2022 bụ mgbe Lt Col Paul-Henri Damiba napụrụ onyeisiala mba ahụ bụ Roch Kaboré ọchịchị n’ike.

  8. Ibrahim Lamorde bụbu onyeisi EFCC anwụọla

    Lamorde
    Nkọwa foto, Lamorde duru EFCC site n'afọ 2011 rue afọ 2015

    Akụkọ pụtara ugbua na-ekwu na onye bụbu onyeisi ngalaba na-alụsọ mpụ ọgụ na Naịjirịa akpọrọ EFCC bụ Ibrahim Lamorde anwụọla.

    Otu onye nọ nso n'ezinaụlọ ya gwara BBC na ọ nwụrụ na mba Ijipt dịka ọ na-agbake n'obere ọrịa ọ rịachara.

    Lamorde gbara afọ 61 bụbu osote onyeisi ndị uweojii tupu ọ malite idu EFCC n'afọ 2011.

    E meburu onyeisi nwa mgbe nta dịka ewepuchara Farida Wazriri ma mecha mee ya onyeisi kpọmkwem mgbe ụlọomeiwu ukwu nyochara ya ma nye ya ikike.

    Lamorde bụ onye Adamawa steeti bụ onye atọ n'ọnụọgụgụ ndị durula EFCC kemgbe ehibere ngalaba ahụ.

    Cheta na otu Komitii ndị ụlọomeiwu malitere ịnyocha Lamorde dịka e boro ya ebubo izupu ijeri dọlla ise nakwa ihe ndị ọzọ mgbe ọ na-edu ngalaba ahụ.

    Lamorde gọrọ isi onwe ya ma kwuo na ọ bụ akụkọ ọjọọ na-efegharị n'ihi nyocha ọ na-eme otu n'ime ndị boro ya ebubo ahụ.

    N'afọ 2015, Onyeisiala Muhammadu Buhari wepuru ya n'ọkwa tinye Ibrahim Magu..

  9. Anyị achụọla Julius Abure dịka onyeisioche – Labour Pati nke Edo steeti; Ọ bụghị eziokwu – Isi ụlọọrụ Labour pati

    Onyeisioche Labour Pati bụ Julius Abure

    Ebe foto si, Labour Party website

    Ngalaba Labour Pati n’Edo steeti na-ekwu na ya achụọla Julius Abure dịka onyeisioche otu ahụ na Naịjirịa.

    Onyeisioche Labour Pati n’Edo steeti bụ Kelly Ogbaloi kpuhere nke a n’oge ọ na-agụpụta akwụkwọ ozi abụọ e jiri chụpụ Abure n’Arue Ward 3, okpuruọchịchị Esan North East nke steeti ahụ.

    Dịka Ogbaloi siri kwuo, ndị isi ọchịchị Labour pati n’Edo steeti enweghị ihe ọzọ ha maara ha ga-eme karịa ịnabata mkpebi Arue Ward 3, Uromi, okpuruọchịchị Esan North East nke Edo steeti.

    Akwụkwọ iwu Labour Pati

    Ebe foto si, Labour Party website

    Mana ka osiladị, n’ozi Labour Pati bipụtara n’ọbaozi ya n’ụbọchị Satọde 25 Mee 2024, ha kọwara akụkọ ahụ na-ekwu na achụọla Abure na Ward 3, Arue, Utomi, Esan North East nke Edo steeti dịka okwu ụgha.

    Dịka odeakwukwo mgbasaozi otu ahụ na Naịjirịa bụ Obiorah Ifoh siri kwuo, iwu otu ahụ kwuru na ọ bụ naanị nnukwu ogbakọ otu Labour nke ụzọ abụọ n’ime atọ ya kwetara ka achụpụ onyeisi ya ga-enwe ike ime nke ahụ.

    Ọ gara n’ihu kwuo na wọọdụ, okpuruọchịchị maọbụ steeti enweghị ikikere ọbụla n’okpuru iwu ịchụpụ onyeisioche otu ahụ.

  10. A na-agba mbọ ịnapụta ndị tọrọ na mbuze ala na Papua New Guinea

    Ebe mbuze ala ahụ mere

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ebe mbuze ala ahụ mere

    Ndị ọrụ gbatagbata nọ ọrụ n'obodo e nwere mbuze ala na mpaghara Enga dị na Papua New Guinea, ebe a na-atụ egwu na ọtụtụ narị mmadụ nwụrụ.

    Ndị ọrụ gunyere ndị dọkịta na ndịagha ruru ebe ihe ahụ mere mana okporoụzọ na adighị mma na-echere ha aka mgba.

    Oke mbuze ahụ dara liri ọtụtụ ụlọ dị na ugwu Enga.

    Amabeghị mmadụ ole tọrọ n'okpuru mkpọmkpọ ebe ahụ.

    Ụlọọrụ Care Australia kwuru na “ihe luru ụlọ 60 mebiri ebe ndị niile nọ n'ezinaụlọ ndị a ka amaghị aha ha."Akụkọ kwuru na ihe ruru mmadụ 4,000 bị na mpaghara ihe ahụ mere.

    Foto ndi mmadụ nọ ebe mbuze ala ahụ mere

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Foto ndi mmadụ nọ ebe mbuze ala ahụ mere

    Onye na-anọchiteanya mpaghara Enga bụ Amos Akem kwara ndị ntaakụkọ na ala ahụ dara liri ihe ruru mmadụ 300 na ụlọ 1,182.

    Onye ọrụ UN bụ Serhan Aktoprak gwara ụlọọrụ mgbasa ozi AP, na ọnụọgụgụ ndị nwụrụ nwere ike karịa 100.

    Otu onye bi n’akụkụ ihe ahụ mere kwuru na enwghị ụlọ ọbula fọrọ ebe ahụ.Gọvanọ Enga bụ Peter Ipatas kwuru na ihe ahụ metụtara obodo isii.N’okwu ya na Fraịde,

    Praịm Mịnịsta Papua New Guinea ụ James Marape kwuru na ndị ọchịchị na-agba mbọ ị nyere ndị ihe a metụtara aka.

    O kwuru na gọọmentị na ndị isi obodo na-arụkọ ọrụ iji nye "enyemaka na mwughachi akụrụngwa".

    Na’aka nke ozo onyeisiala Amerịka bụ Joe Biden kwuru na obodo ya dị njikere inyere aka n’ihe mberede a.

  11. Ọ bụ 'Accidental Discharge' gburu Onyebuchi Anene n’Abuja - Ndi Uweojii

    Onyebuchi Anene

    Ebe foto si, Buchi Anene/Facebook

    Nkọwa foto, Foto Onyebuchi Anene nwụrụ anwụ

    NdỊ uweojii n’Abuja awuchiela otu onye uweojii a na-akpọghị aha ya a na-eyo eyo na ọ gbapụrụ mgbọ na mberede 'accidental discharge' wee gbuo otu nwaamadi aha bụ Onyebuchi Anene na mpaghara Byazhin dị n'Abuja ubọchi Wenezde 22 Mee 2024.

    Onye na-ahụ maka mgbasa ozi ndi uweojii Abuja bụ SP Josephine Adeh bụ onye kwupụtara nke a. Ọ kọwara na kọmishọna ndị uweojii nke FCT bụ Benneth C. Igweh enyela iwu ka ebido ezi nnyocha ị ji chọpụta ihe kpatara ọnwụ onye ahụ nwụrụ anwụ.

    N’ozi Josephine Adeh, onye uweojii ahụ mgbapụrụ mgbọ mberede ahụ gburu Onyebuchi Anene nọ n'ụlọ mkpọrọ ugbua.

    O kwuru na kọmishọna ndi uweojii Abuja katọrọ agwa onye uweojii ahụ maa ziga ozi nkasiobi nye ezinụlọ Onyebuchi Anene.

  12. Ụlọikpe a kwadola mmeri Hope Uzodinma dịka gọvanọ Imo steeti

    Foto Gọvanọ Hope Uzodimma

    Ebe foto si, Hope Uzodimma/X

    Nkọwa foto, A họpụtara Hope Uzodimma dị ka Gọvanọ n'ọnwa Novemba afọ 2023

    Ụlọikpe na-ahụ maka mkpesa ntuliaka gọvanọ Imo steeti ekwenyela na mmeri Hope Uzodimma na ntụliakaọkwa gọvanọ e mere na 11 Nọvemba 20213 bụ nke ziri ezi.

    Ụlọikpe mere mkpebi taa n'Abuja, jụrụ mkpesa nke onye zọrọ ọkwa gọvanọ na ntụliaka ahụ n’otu pati LP bụ Athan Achonu bụ onye gbara akwụkwọ na-ama aka na mmeri Uzodimma.

    Na mkpebi ọkaikpe atọ nke Ọkaiwu Oluyemi Akintan-Osadebay nọ n’isi ya, kwuru na ntuliaka ahụ wepụtaraUzodimma dị ka gọvanọ bụ nkee mere dị kaiwu ntuliaka obodo si kwado.

    Ụlọikpe ahụ kwukwara na otu pati LP egosighị ihe akaebe na ebubo ha na-ebo na ha meriri na ntuliaka gunyere ebubo na ntụliaka ahụ esoghị usoro iwu ntuliaka.

  13. Ndị ntọrị atọhapụla Fada Basil Gbuzuo n'Anambra steeti

    Fada Basil Gbuzuo

    Ebe foto si, CATHOLIC ARCHDIOCESE ONITSHA

    Ndị ntọrị ahụ tọọrọ onyeụkọchukwu katọlik aha ya bụ Fada Basil Gbuzuo atọhapụla ya.

    Onye na-ahụ maka mgbasa ozi nke gọvanọ Anambara steetị bu Christian Aburime kwuru na ụkọchukwu ahụ a tọọrọ na 15 Mee 2024 na mapaghara Nkpor na Obosi enwerela onwe ya site na mbọ ndị ọrụ nchekwa gọọmentị Anambra gbara tinyere enyemaka ndị obodo.

    Aburine kwuru na “Gọọmentị na-aru ọrụ ịhụ na onye ọbula a tọọrọ na steetị ahụ nweree onwe ya.”

    Ọ gara n’ihu dụọ ndị na-etinye aka na mpụ dị iche iche ka ha kpachara anya n’ihi na gọọmentị Gọvanọ Soludo kwụ chim ikpochapụ ha.

    O kelere ọhanaeze maka enyemaka ha i ji hụ na Anambra steetị nwere ezi udo.

  14. Atụmatụ ịgbanwe abụ njirimaara Naịjirịa agafeela ngụpụta nke abụọ n’ụlọomeiwu

    Ọgbakọ ndịomeiwu

    Ebe foto si, Nigerian Senate/Facebook

    Ndị ụlọomeiwu ukwu Naịjirịa bụ Sịnetị na-atụ arọ ịme iwu ga-ahụ na a gbanwere abụ njirimaara Naịjirịa bụ ‘National Anthem’ ka ọ a na-agụzi nke ochie.

    Nke a na-abịa dịka atụmatụ iwu ahụ agafeela ngụpụta nke abụọ n’ụlọomeiwu Sịnetị n’ụbọchị Tọzde.

    Iwu a bụ nke onyendu ndị Sịnetị bụ Opeyemi Damidele na-enwete ezi nkwado site n’aka ọtụtụ ndịomeiwu.

    E zigala ya n’aka ndị kọmitii na-ahụ maka ikpe ziri ezi, ikike dịịrị onyw nakwa iwu ka ha leba ya anya ma weghachịte azịza ha n’ime izuụka abụọ.

    Ndị omeiwu kwuru na abụ ochie ahụ ga-ewete ịdịnotu, udo, ọganihu karịa nke nọ ugbua.

    Ha gara n’ihu na ọ bụ ndịagha wepụtara abụ njirimaara Naịjirịa a na-agụ ugbua na na e kwesịrị ikposa ya ma tinyere nke ochie gosiri ọchịchọ onye kwuo uche ya.

  15. Igbo ndịome e ji eme ọnụ daalụ nụ ooo!

    Anyị na-anabata unu n'ọgbakọ anyị taa, buru oche gị bịa gere akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ụwa

  16. Ndị ụlọomeiwu Kano Steeti akagbuo ihu kewara obi ọchịchị Emir ụzọ ise

    Ndị Emir Kano Steeti

    Ndị ụlọomeiwu Kano Steeti akagbuo iwu ahụ nke akachichuru steeti ahụ Abdullahi Ganduje hiwere n’afọ 2019, nke kewara obi ọchịchị Emir ụzọ ise.

    Ha tinyere aka n’iwu ọhụrụ a kpọrọ ‘emirate council law 2024’ dịka ọ ga-efechara ngụpụta nke atọ n’ụbọchị Tọzde.

    Ndị omeiwu rụrịtara ụka n’iwu ahụ tupu ha egbebie ịlaghachị n’iwu nke mbụ nyere naanị otu obiọchịchị Emir kamgbe ihe karịrị narị afọ itoolu na steeti ahụ.

    “Anyị akagbuola iwu ahụ kewapụtara ndị Emir ise, nke pụtara na o nweghi Emir nọzi na Kano ugbua.” Onye ndu pati kachasị n’ụlọomeiwu hụ Lawan Hussaini gwara BBC.

    O kwuru na ngwa ngwa gọvanọ tinyere aka n’iwu ahụ, na o nweghi Emir ọbụla a ga-enwe na Kano steeti.

    Ụlọomeiwu Kano Steeti

    Iwu a ndị ụlọomeiwu wepụtara abụbeghi iwu kpọmkwem ruo mgbe gọvanọ Kano Steeti bụ Abba Kabir Yusuf ga-etinye aka na ya.

    Ọ bụghị ndị ụlọomeiwu niile nabatara atụmatụ, Ayuba Labaran bụ onyendu pati ndị kachasị obere n’ụlọomeiwu ji iwu pụọ maka na a chụpụrụ ya n’ihi akwadoghi iwu ahụ.

    O kwuru na e tinyeburu iwu inwe Emir na mpaghara ndị ọzọ maka mwulite ime obobo na-abụghị naanị n’otu mpaghara.

    N’afọ 2019 ka gọvanọ na-achị mgbe ahụ na ndị omeiwu tinyere aka n’iwu ikewapụta ndị Emir anọ ọhụrụ, na-agbanyeghi ụlọikpe jụrụ ịnabata atụmatụ ahụ.

    N’otu aka ahụ, gọvanọ Ganduje wepụrụ Emir nke ugboro iri na anọ na-achị oge ahụ bụ Sanusi Lamido Sanusi ma duo ndị Emir anọ ọhụrụ n’iyi ọrụ.

  17. China o ji ụgbọelu na ụgbọmmiri ndịagha ha eyi Taiwan egwu?

    Ụgbọelu ndịagha mba China na-efegharị n'okemmiri China na Taiwan

    Ebe foto si, Reuters

    Ndịagha China bu ụgbọelu ha na-efegharị n’elu mmiri dị n’agbata ha na ndị Taiwan ụgbụa.

    China sị na ha mere nke a iji gosi ụdịrị ike ha nwere n’ịlụ agha.

    Kemgbe afọ ịrị asaa, ndị China na Taiwan nwere nnukwu nkewa e jiri kewaa ha ụzọ abụọ ma were osimiri ahụ mere oke n’etiti ha abụọ.

    Mana kemgbe 2022 ndịagha China na-eji ụgbọmmiri agha, ụgbọelu-agha agafe oke; nke na-ebute nnụkwụ esemokwu n’etiti mba abụọ ahụ.

    N’afọ gara aga ka ndị Taiwan na-adọ aka na ntị maka ndịagha mmmiri ndị China na-agafe okemmiri dị n’etiti ha abụọ.

    Ihe na-ese okwu

    Otu ihe anyị maara na-eseokwu n’etiti ndi China na Taiwan bụ ọgụ mnwereonwe ndị Taiwan.

    Ndị Taiwan chọrọ inwere onwe ha n’aka China mana China achọghịnkewa na’etiti ha abụọ.

    China chọrọ ka na-ahụta Taiwan dịka otu n’ime mpaghara niile ha nwere dịka otu mba.

    China na Taiwan

    Ebe foto si, Getty Images

    Ihe na-eme ugbua

    Ndị China bụ ngwa agha, ụgbọmmiri agha, ụgbọelu agha na-agafe n’etiti mmiri e ji mere oke ha na ndị Taiwan.

    Dịka ndị Taiwan sị kwụọ, China ji ụgbọmmiri 15 na nke ndị ụweojii na-anọ na mmịrị ruru 16 wee na-egosi ike ha na ebe mmiri ahụ kewere ha abụọ.

    Ndịagha na-echekwa Taiwan kwuru na ha hụrụ ụgbọelu ruru 42 sọ na-gosi ike ndị China n’elu mmiri ahụ.

    Mana Taiwan kwụrụ na ndị China ejighi ngwa agha ha nwere gbaa mgbọ maọbụ tụpụ ogbunigwe kemgbe ha bidoro igosi ike ha na’elu mmiri ahụ.

  18. CBN amachiela ndị Bureau de Change ịkwụ n’okporoụzọ agbanwe ego

    Iwu ọhụru CBN nyere ndị na-agbanwe eg0

    Ebe foto si, CBN/Getty

    Ụlọakụ etiti Naịjirịa bụ Central Bank amachiela ndị na-agbanwe ego a kpọrọ Bureau Du Change ịkwụ n’okporoụzọ agbanwe ego naịra, dọla, paụnd nakwa ndị ọzọ.

    Nke a dị n’akwụkwọ ozi direktọ ụlọọrụ a na-ahụ maka iwu banyere ego bụ Haruna Mustafa wepụtara ma kwuo na mmachi a ga-ebiri ọkụ n’ụbọchị atọ nke ọnwa Juun, 2023.

    Iwu a gara n’ihu machie ndị BDC a ire nakwa ịzụ ọlaedo, ọlaọcha nakwa akụrụngwa ndị ọzọ, izipu ego mba ofesi, iji ego akwado otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị, azụmaahịa ego igwe ‘crypto’ nakwa ndị ọzọ.

    CBN gara n’ihu gwaa ndị BDC ka ha bịa debanyegharịa aha ha n’akwụkwọ maka inwete ikike iji na-agbanwe ego na Naịjirịa ma kwụọ ụgwọ na-eso ya n’ime ọnwa isii.

    Iwu ọhụrụ kwuru na onye ọbụla chọrọ ịgbanwe ego ruru puku dọla iri maọbụ karịa n’aka ndị a ga-ekwupụta ebe o si nwete ya bụ ego.

    Iwu ọhụru ndị a na-abịa n’ime ọnwa ole ma ole onyeisi ụlọakụ etiti bụ Olayemi Cardoso boro ebubo na aka ndị na-agbanwe ego dị n’ime mere dọla ji arị elu orji ma a tụnyere ya naịra.

  19. Igbo ndị ọma ndewo nụ!

    Anyị ji aka na ụbọchị ga-adịrị unu na mma.

    Biko bịa nọnyere anyị n'ọgbakọ BBC Igbo nke taa maka akụkọ ndị gbapụtara ihe.

  20. A hụla otu n’ime ụmụnne atọ ahụ a tọọrọ na Abia Steetị

    Otu n'ime ụmụaka atọ ahụ a tọọrọ

    Ebe foto si, Comrade Osinachi Nwaka

    Nkọwa foto, Foto nwatakịrị ahụ a chọtara

    Onyeisioche okpuruọchịchị Ikwuanọ bụ Comrade Osinachi Nwaka ekwụọla na a hụla otu n’ime ụmụnwanne atọ ahụ a toọrọ n’ubochị 10 Mee 2024 n' obodo Amaoba-Ime oboro dị n’Okpuru Ọchịchị Ikwuanọ nke Abia steetị.

    Dịka onye na-ahụ maka mgbasaozi ya siri kwu, a hụrụ nwatakịrị ahụ aha ya bụ Divine Osinachi gbara afọ isii n' Ekwulobia site na mbọ ndị ọrụ nchekwa ndị uweojji na ndị ozo.

    Cheta na anyi nwetara gi akụkọ n’ụbọchị Fraịde 10 Mee 2024 na onye ọkada tọọrọ ụmụnne atọ ahụ n’oge ọ na-akpọlata ha n’ụlọakwụkwọ dị n’Amaoba Ime Oboro dị n’Ọkpuru Ọchịchị Ikwuano nke Abịa steeti.

    Ụmụntakịrị ahụ gụnyere Gideon Osinachi gbara afọ asatọ, Divine Osinachi gbara afọ isii na Israel Osinachi gbara afọ anọ.

    Mana ka ọ dị ugbua, Mayọ Nwaka na-ekwe nkwa na ndị ọrụ nchekwa na-agba mbọ ị chọta ụmụnne abụọ ahụ fọrọ.

    Ọ kpọrọ oku nye onye ọbula nwere ozi ga-enye aka ịchọta ụmụaka ahụ, mee ka ndị ọrụ nchekwa mara.