Papua New Guinea: Ihe karịrị mmadụ 2,000 tọrọ n'ime ala n'ihi mbuze

Ebe foto si, Reuters
Gọọmentị mba Papu New Guinea na-ekwu na ihe karịrị mmadụ 2000 ka mbuze lili na ndụ na mpaghara Enga dị ebe ahụ
Gọvanọ Enga bụ Peter Ipatas gwara AFP n’obodo ọ metutara rụrụ ọbọdọ isii, ma kọwaa ya dịka ihe na agba anya mmịrị.
Ndị Red Cross Socielty n’Papau New Guinea kwuru na ndị ọrụ gbatagbata ezigara ebe mkpamkpa ahụ kpara gunyere ndị uweoji, ndị ọrụ ebere na ndị ọzọ.
N'ụbọchị Frịde, ka Praịm mịnịsta ndị Papua New Guinean bụ James Marape kwụrụ ha a na-agba mbọ iweputa ozu “ndị tọrọ n’ime ala na ịdọzịharị ụlọ mebiriemebi”.
Serhan Aktoprak na arụrụ ndị UN ọrụ kwụrụ na mbuze ahụ na emetuta ndị ọrụ gbatagbata ịrụ ihe kwesiri ịrụ maka na ha na atụ ụjọ na ọ ga eme ọzọ.
UN kwukwara na ndị a na-achọ achọ nwereike iru 670 dịka ndị bi ebe ahụ tupu mberede ahụ e mee ruru mmadụ 3800.
Ihe bụ nsogbu ichọpụta na igwuputa ndị tọrọ n'ime ala bụ enweghi ngwa zuru oke dịka a na-eche na ndị mmadụ ka nọ n'ime ala ruru 32feet.






















