Ụlọikpe amaala Donald Trump ikpe n'ebubo 34 niile e boro ya maka ime mpụ

Akụkọ dị mkpa na Naijiria na mbaụwa n'ọnwa Mee, afọ 2024.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uche Akolisa, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu

  1. Portbale etiputala egwu ọhụrụ na-ekwu maka nnwuchi ndịuweojii

    Habeeb Okikiola a ma dịka 'Portable' adanyela na nsogbu ndị uweojii ugboro ugboro

    Ebe foto si, Portable/Instagram

    Otiegwu a ma ama Habeeb Okikiola, a ma dịka 'Portable' etipụtala egwu ọhụrụ na-erughị otu abalị o ji pụta na mkpọrọ ndịuweojii.

    Ndịuweojii nwuchiburu Portable maka ebubo ịjụ ikwuzu ego maka ụgbọala G-Wagon ọ zụrụ.

    Ihe onyonyo ebe Portable kwụrụ aja dịka ọ na-agba mbọ ịgbalahụ ndị uweojii bịara ịnwụrụ ya wuru ewu na soshal midia ụbọchị Wenezde.

    Akụkọ kwuru na Portable kwụrụ nde naira 13 (N13) n'ime nde naira 27 ọ zụrụ ụgbọala jụ ịkwụ 14 fọrọ afọ,sị na ụgbọala ahụ adịghị mma.

    Mana onye resịrị ya ụgbọala ahụ wegara mkpesa n'aka ndị uweojii nke mere ka ndị uweojii nwuchie Portable.

    Mana dịka ọ nọchara n'aka ndị uweojii otu abalị, n'ụbọchị Tọzde, Portable wepụtara ọ kpọrọ 'Spiderman' nke na-arụtụ aka n'ihe mere ya.

    Nke a abụghị mbụ a na-anwụchi Portable, n'afọ 2023, ndị uweojii Ogun Steeti nwuchiri ya maka ịkpọ ndị uweojii na ịkpasa ha ike.

    Ndị isi ndị uweojii kpọrọ ya oku ka ọ bịa zara ọnụ ya dịka ihe onyonyo ebe ọ ya na ndị uweojii kwatara wuru ewu na soshal midia mana ọ zaghị ha nke mere ka ha nwuchie ya.

  2. NLC ejirila iwe pụọ n'ọgbakọ ha na Gọọmenti Etiti

    Joe Ajaero

    Otu jikọrọ ndịọrụ bụ ‘Nigeria Labour Congress’ (NLC) na ogbo ha bụ ‘Trade Union Congress’ (TUC)ejirila iwe pụọ na mkparitaụka ha na Gọọmenti Etiti banyere ụgwọọnwa opekatempe nke ndị ọrụ.

    Nke a na-abịa dịka Gọọmentị Etiti kwutru na ọ bụ N48,000 ka ha ga-akwụ dịka ụgwọọnwa opekata mpe.

    Ka ọ dị ugbu a, mkparịtaụka ahụ bụ nke a na-enweghị nkwekọrịta ọbụla akubiela Otu NLC kọwara na gọmentị etiti ejighị mkparịtaụka banyere ndị ọrụ Naịjirịa kpọrọ ihe.

    N'okwu ya, onyeisioche NLC bụ Joe Ajaero kwuru, "Na-agbanyeghị mbọ siri ike iji nweta nkwekọrịta ziri ezi n'okwu ụgwọọnwa opekatempe a, Gọọmenti gbara isi akwara maka ya."

    Mgbe BBC Igbo kpọtụrụ onyeisi mgbasa ozi NLC bụ Benson Upah, ụgwọnwa opekatampe Gọọmenti Etiti kwetara ịkwụ dị ka mkparị nye ndị ọrụ Naịjirịa.

    Ọ gara n'ihu kwuo na Gọọmenti Etiti adịghị nkwadobe ime ihe ọbụla banyere ụgwọọnwa opekatempe ahụ.

  3. Ousman Sonko: Ụlọikpe Switzerland atụọla onye bụbu Minista imeụlọ Gambia mkpọrọ afọ 20

    Ousman Sonko

    Ebe foto si, EPA

    Ụlọikpe Switzerland atụọla onye bụbu Minista imeụlọ Gambia mkpọrọ afọ 20 maka mpụ mkpagbu ndị mmadụ n'oge ọchịchị Yahya Jammeh.

    Ousman Sonko gbagara Switzerland n'afọ 2016 tupu Jammeh adaa na ntuliaka onyeisiala mba Gambia,

    Switzerland kp[ụpụrụ ya ụlọikpe site n'iwu nyere ohere ịkpụpụ onye mere mpụ ebe ọbụla n'ụwa ụlọikpe.

    Na mbụ, Ousmane Sonko nwere olileanya inweta ohere ịgbata na Switzerland dịka onye na-agba ọsọ ndụ ndọrọndọrọ ọchịchị dịka e wepụchara ya bn'ọkwa Mịnista na-ahụ maka ihe na-eme n'ụlọ nke Gambia.

    Otu otu wepụtara ihe akaebe nke si na ndị akaebe nke gosiri mkpagbu o mere megide ha.

    Ndị kpụrụ ya ụlọikpe kwuru na Sonko , onye bụbu onyeisi ndị uweojii mba Gambia egbochighị ndị ji ndị ọrụ nchekwa agbagbu ndị na-ekwugide ọchịchị Jammeh.

    Nke a bụ nke ugboro abụọ ụlọikpe mba Switzerland na-ama mmadụ ikpe na mpụ metụtara ịkpagbu ndị mmadụ.

    Nọnwa Juun afọ 2023, ụlọikpe mba ahụ tụrụ onye bụbu onye ndu ndịagha nnupuisi mba Liberia bụ Alieu Kosiah, mkpọrọ afọ 20 maka tigbuo-zogbuo nke gụnyere idina mmadụ n'ike, igbu ọchụ na iri anụ mmadụ.

    Mba nd ị ọzọ dịka Jamini na Amerịka na-ekpe ndị ya na Jammeh chịkọrọ ikpe.

  4. Na Akpọtụ Ugbu A, Praịm Minista mba Slovakia nọ ụlọọgwụ dịka a gbara ya egbe

    Ndị ọrụ nchekwa na-agbagharị dịka onye ahụ gbachara ya egbe

    Ebe foto si, Reuters

    Praịm Minista mba Slovakia bụ Robert Fico nọ n'ụlọọgwụ ugbua anata ọgwụgwọ dịka otu onye gbara ya egbe.

    Akụkọ na-ekwu na a gbara ya egbe n'ihu ụlọọrụ obodo Handlova bụ ebe gọọmentị na-eme nzụkọ.

    Ndị nọ ebe ahụ ihe mere na-ekwu na ha nụrụ ebe agbapụrụ mgbọ ọtụtụ ọge.

    Dịka ihe si kwụrụ, ndị uweojii anwụchiela otu onye maka ihe mere dịka nyocha na-aga n'ihu.

    Onyeisiala mba ahụ bụ Zuzana Caputova tinyere ọnụ n'ihe mere, ọ sị na egbe agbara Fico tụrụ ya n'anya ma katọọ ihe mwakpo ahụ dịka "ihe dị ike jogburu onwe ya"

    O tikwara Fico aka n'obi si ya jisike gbakee n'ahụ ọ merụrụ na mgbọ tụrụ ya.

    Onye bụ Robert Pico?

    Robert Pico

    Ebe foto si, Reuters

    Pico bụ onye laghachiri n'ọchịchị dịka emechara ntuliaka na mba ahụ n'ọnwa Septemba afọ gara aga.

    Ọ bụ onyeisi otu Smer-SSD ma merie dịka o kwere nkwa ịkwụsị ịnyere mba Yukren aka, ọ gọkwara na ọ kwụnyeere ndị mba Rọshịa.

    A kwanyere Pico ọkụ n'ike ịritu n'ọkwa dịka egbuchara onye ntaakụkọ Jan Kuciak n'afọ 2018

    Ndị isi mba ụwa katọrọ ya bụ ọdachi

    Onyeisi Kọmịshọn Yurop bụ Ursula von der Leyen katọrọ ihe ọ kpọrọ "mwakpo jọrọ njọ"

    Praịm Minista mba Romania bụ Marcel Ciolacu sị na mwakpo ahụ tụrụ ya n'anya nke ukwuu ma kpọọ oku ka ejichie ndị aka ha dị na ya.

    Rishi Sunak bụ Praịm Minista nke mba Briten kwuru na akụkọ ihe mere tụrụ ya n'anya dịka o zigara Fico na ezinaụlọ ya ozi itiakan'obi.

    Praịm Minista mba Czech bụ Petr Fiala sị na ihe mere tụrụ ya n'anya ma kwuo ka Fico gbakee ngwangwa.

    Praịm Minista Hungary bụ Viktor Orbán sị na "mwakpo e mere ezi enyi ya bụ Praịm Minista Robert Fico metụtara ya n'ụzọ dị ukwu"

  5. Otu onye anwụọla dịka otu nwoke gbara Mosque' ogbunigwe na Kano

    Ụlọụka Alakuba gbara ọkụ

    Otu onye anwụọla, mmadụ 24 merụrụ ahụ dịka otu nwoke tụnyere ogbunigwe mmanụ ụgbọala n'ụlọ okpukperechi ndị ụka Alakuba n 'obodo Abasawa dị na Kano n'ụzọ ụtụtụ taa bụ Wenezde.

    Ndị uweojii Kano steeti kwuru na ha anwụchiela otu nwoke a na-enyo na ọ bụ ya kpara arụ ahụ ma buga ndị merụrụ ahụ ụlọọgwụ.

    Mana otu onye n'ime ha mechara nwụọ.

    A nwuchiri Shafi’u Abubakar gbara afọ 38 maka ebubo itinye ogbunigwe e ji mmanụ ụgbọala ruo n'ụlọ okpukperechi Alakuba ahụ.

    Akụkọ na-efegharị kwuburu na otu nwoke mụnyere ọkụ n'ụlọ Alakụba kpochibido ndị gara ikpe ekpere ụtụtụ ụzọ nke mere ka akụkụ ụlọụka gbaa ọkụ, ebe ọtụtụ ndị mmadụ tọọ n'ụlụka ahụ merụrụ ahgụ.

    Mana ozi mgbasaozi nke ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Abdulahi Haruna Kiyawa binyere aka ma wepụta kwuru na ha nwetara ozi na ọ bụ ogbunigwe.

    Ozi ahụ sịrị, "N'ebe Elekere 5.20 nke ụtụtụ taa bụ abalị 15 nke ọnwa Mee afọ 2024, e nwere ihe gbara n'ụlọụka Alakụba dị n'obodo Gadan dị n'Okpuru Ọchịchị Gezawa dị na Kano steeti oge ekpere 'Subhi' ebe ndị mmadụ merụrụ ahụ."

    "Kọmishona ndị uweojii zigara ndị ọrụ ha gụnyere ndị ihe gbasaara ogbunigwe were anya ebe ahụ ihe mere, dịka e bugara mmadụ 24 merụrụ ahụ gụnyere ụmụaka, ụlọọgwụ 'Murtala Mohammed Specialist Hospital' Kano, ebe ha na-enweta nleta."

    "A nwụchiri onye a na-enyo bụ isi-ahụrụ-kwaba- okpu n'ihe mere bụ Shafi’u Abubakar gbara afọ 38 bụ onye kwuru na ọ bụ esemokwu ike akụ ezinaụlọ bụ ihe kpalitere iwe ya, sị na ndị ghọgburu ya n'okike akụ ahụ nọ n'ụlọụka ahụ."

    Haruna Kiyawa gara n'ihu gbaa ama na nwa amadi ahụ nọ n'aka ndịuweojii ugbua dịka nnyocha na-aga n'ihu, ma kwuo na ha ga-eme ka ọha mara ihe ha chọpụtara.

    Ụlọụka Alakuba gbara ọkụ
  6. Ndị okpukpere Kraịst emeela ngagharịiwe maka ntọghapụ Leah Sharibu

    Leah maọbụ Liya Sharibu a tọọrọ na Chibok kemgbe afọ 2018

    Ebe foto si, Twitter

    Otu jikọrọ ndị okpukpere Kristi bụ Christian Society Worldwide emeela ngagharịiwe maka ntọghapụ Leah Sharibu.

    Onye kpokọbara ya bụ ọgbakọ bụ Yunusa Nmadu kwuru n'ihe onyonyo na ha na-akpọ gọọmentị etiti oku ịtọhapụ Sharibu ka nọ n'aka ndị Boko Haram dịka ọ gbara afọ 21.

    Nmadu kwuru sị "ihe na-ebe ka na-ebe n'okwu nchekwa, nsogbu nchekwa anapụla anyị ọtụtụ ihe. Kedụ etu anyị ga-esi wulite obodo anyị maọbụrụ na ụjọ na-atụ ndị mmadụ?"

    Akụkọ na-ekwu na Sharibu a nọrọla n'aka ndị Boko Haram lụọ di ugboro abụọ na mụọ nwa atọ.

    Akụkọ kwukwara na ihe mere ejighi tọghapụ Sharibu mgbe a tọghapụrụ ibe ya bụ maka na ọ jụrụ ịjụpụ okwukwe ya

    Ihe ise ị kwesiri ịmara maka Leah Sharibu

    1. Leah Sharibu sọ na ụmụakwụkwọ a tọọrọ na Dapchi, Yobe steeti na afọ 2018.

    2. Leah Sharibu di afọ 21 ugbua.

    3. Atọhapula ndị niile atọọrọ na oge a tọorọ Leah Sharibu mana ọ bụ naanị ya ka nọ na aka ndị ntọ.

    4. Leah na agụ akwụkwọ na ụlọakwụkwọ Gọọmentị nke ụwụagbọghọ na agụ akwụkwọ nka na ụzụ dị na Dapchi, Yobe steeti.

    5. Akụkọ sị na ndị na enyi ọha egwu tọọrọ ya, ma nunye ya dị.

  7. 'E nwere ike ịkpụpụ ụlọọrụ 'Boeing' ụlọikpe maka mkpọkasị ụgbọelu ha'

    Boeing 737 Max

    Ebe foto si, Getty Images

    Ngalaba na-ahụ maka ikpe na mba Amerịka bụ US Department of Justice (DOJ) na-ekwu na ha na-atụle ịkpụbụ ụlọọrụ na-arụpụta ụgbọelu 'Being' ụlọikpe maka mkpọkasị ụgbọelu ha.

    DOJ na-ebo ebubo na ụlọọrụ 'Boeing' dajọrọ nkwekọrịta ha nwere n’afọ 2021 nke mere na a kpụpụghị ụlọọrụ ahụ ụlọikpe maka ebubo mpụ maka mkpọkasị ụgbọelu ha abụọ nke mere n’afọ 2018 n'Indonesia nakwa n’afọ 2019 n' Ethiopia.

    Ihe mberede abụọ ahụ metụtara ụgbọelu Boeing tara isi mmadụ 346.

    Na nkwekọrịta ha nwere, Boeing kwuru ego dị ijeri dọla abụọ na ụma ise(2.5 billion), ebe ndị kpụpụrụ ụlọọrụ ahụ ụlọikpe kwetara ka ụlọikpe kagbuo ikpe ahụ ka afọ atọ gachara.

    Ọtụtụ ndị mmadụ mailtere inyo Boeing dịka ọnụụzọ ụgbọelu ahụ mepere ngwangwa ụgbọelu si ọdọụgbọelu fepụcha, nke mere ka e nwee nnukwu oghere n’ụgbọelu ahụ n’ọnwa Jenụwarị.

    DOJ na-ebo ebubo na Boeing dajoro na nkwekọrịta ha nwere, ebe Boeing na-ekwusi ike na ha adajọghị.

    DOK kwuru sị, “Ụlọọrụ ụgbọelu ahụ ahazighị ma mejupụta nkwekọrịta iji gbochie iwu megide mpụ n’Amerịka n' ọrụ ha.”

  8. ASUU strike: Anyị ga-ezukọ n’ime izuụka abụọ - Osodeke

    Emmanuel Osodeke

    Ebe foto si, ASUU/Instagram

    Otu jikọrọ ndị nkuzi mahadum Naịjirịa bụ Academic Staff Union of Universities (ASUU) ekwuola na ha ga-ezukọ n’ime izuụka abụọ ọ bụrụ ma Gọọmenti Etiti Naịjirịa emezughị nkwekọrịta ha nwere.

    Onyeisioche ASUU bụ Emmanuel Osodeke kpuhere nke a n’ụbọchị Tuzde 14 Mee 2024 n’oge ọ na-agwa onye ntaakụkọ BBC Igbo okwu.

    Ndị otu ahụ na ndị ọrụ mgbasaozi nwere mkparịtaụka na Mahadum Abuja n’ụbọchị Tuzde bụ ebe ha nọọrọ katọọ pasenti 35 gọọmenti gbakwunyere n’ụgwọọnwa ndị ọkammụta tinyere pasenti 25 agbakwunyere n’ụgwọọnwa ndị nkuzi ọzọ na mahadum.

    Ha katọkwara ọjụjụ Gọọmenti Etiti Naịjirịa jụrụ ihiwe kaụnsụl ọchịchị maka mahadum etiti niile dị na Naịjirịa.

    Osodeke kwuru na ASUU enyela gọọmenti Bola Tinubu ezigbo ohere itinye nkwekọrịta ha nwere n’ọrụ ma kwuo na ndị otu ya ga-ezukọ n’ime izuụka abụọ na-abịa n’ihu ọ bụrụ ma enweghị ihe ọbụla ha hụrụ.

  9. Nnaghe Obono Itam: Ihe i kwesiri ịma maka Kọmịshọna ndị uweojii n'Anambra

    Nnaghe Obono Itam

    Ebe foto si, Anambra State Police

    Anambra steeti enwerela kọmịshịona ọhụrụ taa bụ abalị nke ịrị na atọ nke ọnwa Maay n’afọ 2024 aha ya bụ Obono Nnaghe Itam.

    Ọ bidoro ọrụ dịka kọmịshịọna nke 34 na Anambra steeti. Obono na anọchịta anya Aderemi Adeoye bụ onye nke nara ezumuike nka na abalị nke mbụ n’ọnwa may 2024 ka ọ rụchara ọrụ afọ ịrị atọ na anọ.

    Lee ihe ị ga amara maka Obono Nnaghe Itam

    • Obono Nnaghe Itam bụ onye Cross River steeti
    • A mụrụ ya na ụbọchị nke ịrị ịsịị na ịsịị na ọnwa Juun na afọ 1967 na okpuruochichi Yakkur dị na River steeti • Obono Nnaghe Itam bara ọlụ uweojii na abalị ịrị na asatọ Maay na afọ 1992 na Kaduna steetị na ọkwa cadet Assistant Superintendent. Ebe Obono Nnaghe Itam rụbụrụ ọrụ ikwsiri ịmara
    • DPO ụlọ ndị uweoji dị na Akamkpa , Cross River Steeti
    • Ọ rụrụ ọrụ na ọtụtụ ngaraba na ebe a na azụ ndị ụweoji dị na Agbani, Enugu steeti.
    • Ọ bụ onyeisi na ndị na eme nyocha maka ndị na enyi ọha egwu, nyocha dị icheiche na ụlọ ọrụ ndị EFCC dị na Lagos • Ọ bụ onyeisi ọrụ na ụlọọrụ EFCC dị na Port Harcourt
    • Ma bụrụ onye na ahụ maka ka esi ahazi ihe na ụlọọrụ EFCC dị na Abuja
    Nnaghe Obono Itam

    Ebe foto si, Anambra State Police

  10. Mba Yukren nweereonwe ya, dị ike bụ ụzọ kachasị ịbara Putin mba - Blinken

    Onyeisiala mba Yukren bụ Volodymyr Zelensky nakwa odeeakwụkwọ mba Amerịka bụ Anthony Blinken

    Ebe foto si, Pool

    Anthony Blinken bụ odeeakwụkwọ mba Amerịka ekwuola na otu ụzọ isi bara Putin bụ onyeisiala Rọshịa mba bụ ịnwe mba Yukraine dị ike, ma nwereonwe ya.

    O kwuru nke a na njem ọ gara na Yukren n'ụbọchị 14 nke ọnwa Mee n'afọ 2024.

    Blinken ruru ebe ahụ dịka enyemaka si n'ụzọ ngwa agha ruru ọgbọ ọgụ mba ahụ na mba Rọshịa.

    Na nke ya, Zelensky kelere mba Amerịka maka enyemaka ha nyere ya ma kwuo na "Ndi Yukren na-ekele ndị Ameịka maka nke a".

    Ọ sịkwa na ọ dị mkpa na enyemaka ahụ bịara n'oge ma kwuo na ọ dịrị ndị agha ha dịka oge ahụhụ ọ kachasị na mpaghara ọwụwa anyanwụ mba ahụ.

    Zelensky kwukwara na ha ka chọrọ ụgbọelu nke ndị agha na Kharkhiv.

  11. NLC na TUC agbachiela ụlọọrụ NERC na EEDC n'Abia steeti

    NLC na TUC agbachiela ụlọọrụ EEDC

    Ndị ndu otu jikọrọ ndị ọrụ Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress (NLC) na otu jikọrọ ndị ahịa Naịjirịa bụ Trade Union Congress (TUC) n'Abịa steeti sonyeere ndị otu ha gburugburu Naịjịrịa mee ngagharịiwe n'ụlọọrụ na-ekesa ọkụ latrik nakwa ụlọọrụ na-ahụ maka ụzọ e si eji ọkụ latrik eme ihe bụ National Electricity Regulatory Commission (NERC).

    N'isochi ngagharịiwe ahụ, ndị otu NLC na TUC gbachiri ụlọọrụ na-ekesa ọkụ latrik n'ala Igbo bụ Enugu Electricity Distribution Company (EEDC) nakwa nke NERC dịcha n'Ụmụahịa, Abịa steeti n'ụbọchị Mọnde 13 Mee 2024.

    Onye ntaakụkọ BBC Igbo hụrụ ka nke ahụ siri mee kwuru na e ji igodo gbachie ụlọọrụ EEDC. Dịka o siri kwuo, ndị ọrụ EEDC nọ n'akụkụ ụlọọrụ ha na-atụ mgbere ebe ndị nke ọzọ nọ n'akụkụ ụzọ.

    “A hụrụ m ụgbọala ndị uweojii n'ogbe ahụ ma hụkwa ugbọala ndịagha Naịjirịa abụọ a dọbara n’ihu isi ụlọọrụ okpuruọchịchị Umuahia North,” ka o kwuru.

    Ngagharịiwe ahụ bụ maka ego Gọọmenti Etiti Naịjirịa tinyere n'ụgwọ ọkụ latrịk.

    Ọnụụzọ ụlọọrụ EEDC dị n'Abia
  12. Kwụọ kwụọ kwụọ ụgwọ ụtụisi akarịala - Ajero

    Joe Ajero

    Onyeisi otu jikọrọ ndị ọrụ Naịjirịa bụ Joe Ajero ekwuola na ụgwọ ụtụ isi gọọmentị manyere ndị Naịjirịa akarịala.

    O kwuru nke a na ngosi iwe otu ahụ na-eme n'isi ụlọọrụ NERC dị n'Abuja iji gwa gọọmentị ha tụgharịa iwu bugoro ụgwọ ọkụ latrik n'ọnwa Eprelu.

    "Anyị kelere gọọmentị maka etu ha si wepu ụgwọ Cybersecurity ha chọburu itinye mana ụgwọ ọkụ latrik ha bugoro kwesiri ịkwụsị, anyị achọghị nkwụsịtụ, anyị chọrọ mwepu kpam kpam" ka o kwuru.

    Ihe ọzọ o kwuru bụ na ụgwọ opekatampe nke ndị ọrụ na-enweta ezughidi iri nri nkịtị ma ọ fọdụzie ịkwụ ụgwọ maka "ọchịchịrị".

    Ajaero kwukwara na ha bụ ndị ọrụ abịahị ịlụ ọgụ kama ha chọrọ ka ewepụ ụgwọ latrik ebugoro.

    N'ịzaghachi ndị bịara, onyeisioche NERC bụ Sanusi Garba sị ndị bịara ha nwee ndidi.

    "Anyị anụla olu unu, anyị ga-elebanye anya n'ọchịchọ unu ma hụkwa ndị ụlọọrụ ndị na-ekesa ọkụ na-eme ihe ha kwesiri" ka o kwuru.

    Cheta na gọọmentị buliri ụgwọ ọkụ latrik n'ọnwa Eprelu.

  13. Artificial Intelligence ga na-arụzị ọrụ ndị mmadụ nke ga-ebute enweghị ọrụ - Bishop Onaga

    Bishop Onaga

    Taata bụ ụbọchị mmemme ndị Nta-Akụkọ n’ụwa niile ka ndị niile n’arụ ọrụ Nta-Akụkọ n’ụwa dum n’eme emume ụbọchị ha.

    Ya bụ mme mme bụkarị nke Pope Francis ji enye ndụmọdụ ka ọrụ nta-ajụkọ ga esi na adịwanye mma.

    Isi okwu nke afọ a bụ 2024 bụ “Artificial Intelligence and wisdom of the Heart”, atụgharịa ya n’Igbo ọ bụrụ “ Iji obi mmadụ were arụ ọrụ, ugbua sayence “Artificial Intrlligence” na-arụzị ọtụtụ ihe mmadụ n’arụ.

    N’ụka akara maka ya bụ ụbọchị ndị nta akụkọ na Holy Ghost Cathedral Ogui Enugwu, Bishop Callistus Onaga kwuru n’oge ozioma ya, na ọ dị mkpa ka akụrụngwa ghara ịnọchi ndị mmadụ n’ọrụ ha di iche iche n’ụwa niile n’enwe “Digital Revolution”.

    Onaga kwara arịrị na ọ bụrụ na-akpachaghị anya, ndị mmadụ na ibe ha agaghị n’enwe ezigbo mmekọ ma ọ bụ mkparịta ụka n’ihi na ọtụtụ ọrụ bụzị “Artificial Intelligence” na arụzị ha.

    N’ihe gbasara ọrụ, o kwuru na egwu dịkwa makana oge adịghị anya, ọtụtụ ndị nta-akụkọ agaghịzị enwe ọrụ n’ihi na Artificial Intelligence ewerela ọrụ ha.

    Ọ rụtụkwara aka na ya bụ “Artificial Intelligence” ga-ebute ọtụtụ “fake News” ma kwuo ka ndị nta akụkọ gbaara akụkọ-asị ọsọ kpam kpam dịka ha na eme mme mme ụbọchị ha.

    Ndị ọrụ ntaakụkọ
    Ndị ọrụ ntaakụkọ
  14. Azọpụtala ụfọdụ ụmụakwụkwọ CUTECH n'aka ndị ntọ

    Mpụta mahadum ahụ

    Ebe foto si, Confluence University/Facebook

    Gọọmenti Kogi steeti e kwụola na ndị ntaa azọpụtala ụfọdụ ụmụ akwụkwọ mahadum Confluence University of Science and Technology ndị ji egbe tọọrọ n'izu ụka gara aga na mpaghara osara nke steeti.

    N'okwu Komishọna na-ahụ maka mgbasa ozi na steeti ahụ bụ Kingsley Femi Fanwo, ndị nta ime obodo, ndị ọrụ nchekwa na ndị ahụ ji egbe kwatara mgbọ nke mere ka ụfọdụ n'ime ndị ahụ ji egbe gba ọsọ. Ụmụakwụkwọ ahụ azọpụtara nọ n'ụlọ ọgwụ ugbu a.

    Fanwo kwuru na ndị ọrụ nchekwa na-ekpocha ma na-enyocha ọhịa dị na mpaghara ahụ iji chọta ụmụakwụkwọ ndị fọrọ.

    Komishọna ahụ gwara ndị ntaakụkọ na gọọmenti Gọvanọ steeti ahụ bụ Ahmed Usman Ododo, na-agba mbọ ime ka enwe ezi nchekwa ọha na eze steeti ahụ.

    Cheta na akụkọ gbọwara n'ụbọchị Fraide na ndị ntọ wakporo Mahadum Sayensi na Teknuzu dị na Kogi steeti.

    Akụkọ na-ekwu na atọọrọ ihe ruru ụmụakwụkọ itoolu n'ime ndị na-akwado ule n'ụbọchị Monde.

  15. Mmadụ abụọ anwụọla n'ihe mberede ụgbọala tanka na Legọs

    Mmadụ abụọ anwụọla n'ihe mberede ụgbọala tanka na Legọs

    Ebe foto si, Lagos State Fire and Rescue Service/X

    Mmadụ abụọ anwụọla n'ihe mberede ụgbọala gbara ọkụ na mpaghara Surulere nke Legọs steeti.

    Ndị ọrụ gbatagbata Legọs steeti kwupụtara nke a n'ụbọchị Satọde 11 Mee 2024 n'ozi ha wepụtara n'akara ọbaozi X ha.

    Onyeisi ụlọọrụ 'Lagos State Fire and Rescue Service' bụ Margaret Adeseye kwuru na ụlọọrụ ahụ natara oku n'abalị Fraịde maka ihe mberede ụgbọala ahụ mere n'Ijesha na njedebe akwa mmiri 'Cele link bridge' dị na mpaghara Surulere nke steeti ahụ.

    Adeseye kwuru na ndị ọrụ ya ruru ebe ihe mberede ahụ mere ma gbanyụọ ọkụ ahụ. Ọ gara n'ihu kwuo na mmadụ abụọ nwụrụ n'ihe mberede ahụ.

    "Ozu ha gbara ọkụ nke mere na amataghịzi ha." Ndị ọrụ gbatagbata Legọs steeti nyekwara aka n'ụzọ pụrụiche n'oge ahụ. O kwuru na ndị ọrụ gbatagbata na-ekpochapụ mkpọmkpọ n'okporoụzọ ahụ iji mee ka njem okporoụzọ ghara inwe mkpọbiụkwụ ọbụla.

  16. Mbuze ugwu egbuola mmadụ 13 na Uganda

    Mbuze ugwu egbuola mmadụ 13 na Uganda

    Ebe foto si, AFP

    Opekata mpe mmadụ iri na atọ anwụọla n’ime mkpụrụ ụbọchị atọ gara aga dịka e nwechara mbuze ugwu n’ọdịda anyanwụ Uganda.

    Ihe ọdachi ahụ mere na mpaghara Kasese dịka ụlọọrụ na-ahụ maka ihu eluigwe na Uganda dọrọ aka na ntị na a ga-ahụta nnukwu mmiri ozuzo na idemmiri n’ụbọchị ndị na-abịa n’ihu.

  17. Israel akatọọla ikike ọhụrụ UN nyere Palestine

    Israel akatọọla ikike ọhụrụ UN nyere Palestine

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Israel akatọọla ikike ọhụrụ UN nyere Palestine

    Otu mba ụwa bụ United Nations na ntụlịaka ha mere taata bụ ụbọchị Frịde nyere ndị Palistine ikike ọhụrụ. Ikike ahụ ga eme ka ndị Palestine na esoro na enweputa okwu a ga etinye ọnụ na ọgbakọ ndị UN, ma na ekwu ọkwụ na ọgbakọ ndị UN, ma nweike iweputa ndị nnọchịta anya na ọgbakọ ndị UN.

    Ihe Onyeisiala Palestine kwuru maka ya

    Onyeisiala mba Palestine bụ Mahmoud Abbas kwuru na ikike ọhụrụ ahụ enyere mba ọ na achị bụ ihe dị oke mkpa. Na ọkwụ ya “anyị ga ejisike nwete ọkọrọtọ mere ka anyị tozuoke dika mba ndị ọzọ sọ na otu mba ụwa”.

    Ihe Israel kwuru maka ya

    Ka United Nations bụ otu jịkọrọ mba ụwa nyere ndị Palestine ikike ọhụrụ, ndị Israel katọrọ ya ma kọwa ikike ahụ dị ka ịnabata mba na-enyị ọha egwụ na eti ha. Na okwu onye nnọchịta anya ndị Israel na UN bụ Gilad Erdan “Ndị UN anabatala mba na enyi ọha egwu na etiti ha”.

    Ihe Ị kwesiri ịmara

    Ihe fọrọ ka ndị Palestine tọzụọ dịka mba ndị ọzọ sọ na ọgbakọ ndị UN bụ na ọ bụrụ na ndị na ahụ maka nchekwa na mba ụwa a kpọrọ “UN Security Council” nabata ha. Mana kengbe afọ 2012 enwere ikike enyere ndị Palestine na UN mana ha ịtọzụ dị ka mba ụwa ndị ọzọ bụ naanị ndị nchekwa mba ụwa nabata ha.

  18. Ụmụafọ Kenya amalitela ịkụ osisi iji cheta ndị idemmiri gburu

    Ụmụafọ Kenya amalitela ịkụ osisi iji cheta ndị idemmiri gburu

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndị ọchịchị Kenya na-akwado ịkụ osisi gburugburu mba ahụ dịka otu akụkụ ihe omume e ji echeta ndị idemmiri gburu na nso nso a.

    Onyeisiala Kenya bụ William Ruto kpọrọ ụmụafọ mba ahụ ka ha bịakọta ọnụ kụọ osisi, dịka ọ sịrị na idemmiri na ụkọ mmiri ozuzo bụ nsogbu ogbe obibi e kwesịrị ilebara anya.

    N’oge ọ na-ekwu okwu n’emume ịkụ osisi a haziri na Kenya n’ụbọchị Fraịde 10 Mee 2024, ọ gwara ụmụafọ Kenya ka ha kụọ opekata mpe osisi 50 iji nwetazuo ebumnoobi nke ụbọchị taa iji hụ na a kụrụ osisi nde 200 n’ozuzuoke.

    Ndị ọzọ nọ n’ọchịchị gụnyere ndị mịnịsta na-ahazikwa ụdị ihe omume ahụ gburugburu Kenya.

    Na nso nso a oke idemmiri egbuola opekata mpe mmadụ 230 ma chụpụ ihe karịrị mmadụ 250,000 n’ụlọ na mba Kenya.

    Gọọmenti mba ahụ kwupụtara Fraịde 10 Mee 2024 dịka ụbọchị ezumike maka ụmụafọ Kenya iji kụọ osisi ma chetakwa ndị nwụrụ na nsogbu oke idemmiri.

  19. A tọhapụla Daniel Ojukwu, onye ntakụkọ e jibu eji

    Daniel Ojukwu

    Ndịuweojii Naijiria atọhapụla onye ntaakukọ Daniel Ojukwu, bụ e ji eji maka ebubo imegide iwu 'Cybercrime Act, 2015' maka akụkọ o dere nke metụtara ebube mmefu ego dị nde naira 147 nke a sị otu onye ọrụ gọọmentị welitere isi mere, dịka ozi si n'ọbaozi ụlọọrụ 'Foundation for Investigative Journalism(FIJ), bụ ndị ọ na-arụrụ ọrụ ntaakụkọ si kwuo.

    Ntọhapụ Daniel na-abịa ka ọ gachara otu abalị ndị ntaakụkọ ji mee ngagharịiwe maka njichi nwaamadi ahụ bụ onye nọrọ na mkpọrọ ndị uweojii abalị iri.

    Cheta na n'abalị mbụ nke ọnwa Mee, afọọ 2024 ole na ole gara aga, ndị uweojii nwuchiri Ojukwu na Legọs ma kpụga ya Abụja

  20. CUSTECH: A tọọrọla ụmụakwụkwọ mahadum itoolu na Kogi steeti

    Onyonyo ndị bu egbe

    Akụkọ si Kogi steeti na-ekwu na ndị bu egbe awakpoola mahadum Confluence Science and Technology (CUSTECH), dị n'Osara, Okene na steeti ahụ, ma tọrọ ụmụakwụkwọ a mabeghị aha ha.

    Ndị nchekwa gwara ndị ntaakụkọ na ndị a ji egbe wakporo klaasị ebe ụmụakwụkwọ na-agụ akwụkwọ maka ule semester nke mbụ ga-amalite ụbọchị Mọnde, Mee 13.

    Akụkọ kwuru na ya bụ ihe mere n'abalị Tọzdee abalị Mee 2024.

    E kwuru na ọ bụ ụmụakwụkwọ itoolu ka a na achọ achọ.

    N'ozi Komishọna na-ahụ maka mgbasaozi nke steeti ahụ bụ Kingsley Femi Fanwo binyere aka, gọọmenti Gọvanọ Alhaji Ahmed Usman Ododo achịkọla ndị ọrụ nchekwa iji chọpụta ndị kpara mkpa mkpa a.

    Komishọna ahụ mere ka a mata na ndị nta obodo bụ ndị mara ala na-enyere ndị ọrụ nchekwa aka n'ọrụ a.

    Gọọmenti Kogi steeti kwere ụmụakwụkwọ, ezinaụlọ na ọha na eze steeti ahụ nkwa na ha na-agba mbọ ịnweta ezigbo nchekwa.