Portbale etiputala egwu ọhụrụ na-ekwu maka nnwuchi ndịuweojii

Ebe foto si, Portable/Instagram
Otiegwu a ma ama Habeeb Okikiola, a ma dịka 'Portable' etipụtala egwu ọhụrụ na-erughị otu abalị o ji pụta na mkpọrọ ndịuweojii.
Ndịuweojii nwuchiburu Portable maka ebubo ịjụ ikwuzu ego maka ụgbọala G-Wagon ọ zụrụ.
Ihe onyonyo ebe Portable kwụrụ aja dịka ọ na-agba mbọ ịgbalahụ ndị uweojii bịara ịnwụrụ ya wuru ewu na soshal midia ụbọchị Wenezde.
Akụkọ kwuru na Portable kwụrụ nde naira 13 (N13) n'ime nde naira 27 ọ zụrụ ụgbọala jụ ịkwụ 14 fọrọ afọ,sị na ụgbọala ahụ adịghị mma.
Mana onye resịrị ya ụgbọala ahụ wegara mkpesa n'aka ndị uweojii nke mere ka ndị uweojii nwuchie Portable.
Mana dịka ọ nọchara n'aka ndị uweojii otu abalị, n'ụbọchị Tọzde, Portable wepụtara ọ kpọrọ 'Spiderman' nke na-arụtụ aka n'ihe mere ya.
Nke a abụghị mbụ a na-anwụchi Portable, n'afọ 2023, ndị uweojii Ogun Steeti nwuchiri ya maka ịkpọ ndị uweojii na ịkpasa ha ike.
Ndị isi ndị uweojii kpọrọ ya oku ka ọ bịa zara ọnụ ya dịka ihe onyonyo ebe ọ ya na ndị uweojii kwatara wuru ewu na soshal midia mana ọ zaghị ha nke mere ka ha nwuchie ya.

























